Á Mụrụ Jisọs Mgbe Snow Na-ada?
“OKÉ Ọdịda Snow Akwụsị Usoro Ime Ihe na Jerusalem” na “Ọdịda Snow Nọgidere Na-aga n’Ihu Emee Ka Ebe Ugwu Maa Jijiji.” Isi akụkọ ndị dị otú a n’akwụkwọ akụkọ The Jerusalem Post ghọrọ ihe maara ndị Israel na-agụ akwụkwọ ahụ na 1992, n’ihe ghọrọ otu n’ime oge oyi ndị kasị njọ n’Israel na narị afọ nke a.
Ka ọ na-erule January, mita 7 ruo 12 nke snow kpuchitere ọnụ ọnụ Ugwu Heamọn, oge oyi ahụ agwụwabeghịkwa. Site na Golan Heights ruo Ebe Ugwu Galili gbadata gafere Jerusalem na nso Betlehem (nke a na-ahụ n’ihu peji), ọbụna n’ebe ndịda banye na Negeb, ugboro ugboro a na-akwụsịtụ ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị na usoro ime ihe n’Israel site n’aka onye ọbịa dị nwayọọ na nke dị nro, ma na-akpa ike. Otu isiokwu Jerusalem Post kwuru, sị: “Oké ọdịda snow nwere ihe ịga nke ọma ụnyaahụ ime ihe rọketị Katyusha na-ezo ka mmiri na-emelighị n’izu gara aga, na-eme ka ógbè ụfọdụ ghọọ aga aga ma mee ka ndị bi na ha tọsie ike n’ụlọ ha.”
Ọ bụghị nanị ndị bi n’obodo ukwu ka ajọ oge oyi ahụ kpataara nsogbu. A nụrụ akụkọ nke ọtụtụ narị ehi na ụmụ ehi, nakwa ọtụtụ ọkụkọ, ndị oyi tụgburu mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ oyi n’abalị rịrị elu gafere ọ̀tụ̀tụ̀ ebe ihe na-amalite ịkpụkọ. Dị ka à ga-asị na snow ahụ ezubeghị, oké mmiri ozuzo na-atụ oké oyi malitekwara nke ya. Otu ụbọchị, ụmụ okorobịa abụọ na-azụ atụrụ, ma eleghị anya na-agbalịsi ike ịzọpụta atụrụ ha ole na ole ndị dabara n’oké idei mmiri, bụ ndị mmiri ahụ na-achị ọkụ ọkụ buuru n’onwe ha ma gbagbuo ha.
Ọ bụ ezie na nke a abụghị otú oge oyi na-adịkarị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ, magazin ndị Israel bụ́ Eretz kọrọ, sị: “Ihe ndekọ ọnọdụ ihu igwe e nwetaworo ma dekọọ n’ala Israel n’afọ 130 gara aga na-ekpughe na snow na Jerusalem bụ ihe omume na-ewere ọnọdụ karịa otú a pụrụ ịtụ anya ya . . . N’agbata 1949 na 1980, obodo Jerusalem nwere oge oyi iri abụọ na anọ snow dara na ha.” Ma nke a ọ̀ bara uru nanị maka mmụta ọnọdụ ihu igwe na ihe mmasị ụmụ mmadụ, ka ò nwere ihe dị ịrịba ama ọ pụtara nye ndị na-amụ Bible?
Gịnị Ka Ọ Pụtara nye Ndị Na-amụ Bible?
Mgbe a na-ekwu banyere ọmụmụ Jisọs, ọtụtụ mmadụ na-ahụ n’anya uche ha onyinyo nke ụlọ anụ na-akpali mmetụta uche nke a na-egosikarị n’oge Krismas. N’ebe ahụ ka nwa ọhụrụ bụ́ Jisọs dina, e kpuchie ya ákwà n’ụzọ na-ekpo ahụ ọkụ, nne ya na-echekwa ya nche, ebe snow na-ekpuchite mbara ala dị gburugburu. Echiche nke a ọtụtụ mmadụ nwere ò kwekọrọ ná nkọwa Bible nke ihe omume ghọrọ ihe akụkọ?
Luk so dee Bible na-akọ akụkọ e ji nlezianya dee nke ọmụmụ Jisọs: “Ndị ọzụzụ atụrụ dị n’otu ala ahụ na-anọ n’ọhịa, na-echekwa ìgwè atụrụ ha n’abalị. Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị wee guzo ha nso, ebube nke Onyenwe anyị mụbakwara ha gburugburu: ha wee tụọ egwu nke ukwuu. Mmụọ ozi ahụ wee sị ha, Unu atụla egwu; n’ihi na lee, ana m ezi unu ozi ọma nke oké ọṅụ nke ga-adịrị ndị Israel nile: n’ihi na taa n’obodo Devid [Betlehem] ka a mụrụ nye unu Onye nzọpụta, Nke bụ Kraịst Onyenwe anyị. Nke a ga-abụkwara unu ihe ịrịba ama Ya; Unu ga-ahụ Nwa ọhụrụ e kere n’ákwà okike, na-edinakwa n’ihe a na-etinye nri anụ ụlọ. Ná mberede ìgwè usuu ndị mmụọ ozi nke eluigwe wee nọnyere mmụọ ozi ahụ, na-eto Chineke, sị, Otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti mmadụ ndị ihe ha dị Ya ezi mma.”—Luk 2:8-14.
Ọ bụrụ na ị ga-agụrụ onye Israel nkịtị taa ihe ndekọ a ma jụọ ya oge nke a pụrụ ịbụ n’ime afọ, o yikarịrị ka ọ ga-aza sị, “Ihe dị ka n’agbata April na October.” N’ihi gịnị? Azịza ya dị mfe. Malite na November ruo March bụ oge oyi, nke mmiri ozuzo, n’Israel, December 25 dịkwa nnọọ n’oge oyi. Ndị ọzụzụ atụrụ agaghị na-anọ n’èzí, na-elekọta ìgwè anụ ha n’ọhịa n’abalị. N’ịtụle akụkọ ndị ahụ dị ná mmalite isiokwu a, ị pụrụ ịghọta nke ọma ihe kpatara ya. Betlehem, ebe a mụrụ Jisọs, dị n’ala dị n’ebe ugwu, ọ bụkwa nanị kilomita ole na ole site na Jerusalem. Ọbụna n’afọ ndị ọnọdụ ihu igwe na-esichaghị oké ike, ọ na-atụ oyi nke ukwuu n’abalị n’oge oyi.—Maịka 5:2; Luk 2:15.
Ilenye anya n’akụkọ ihe mere eme n’oge a mụrụ Jisọs na-egosipụta eziokwu bụ na a mụghị ya n’oge snow na-ada na December. Nne Jisọs, Meri, ọ bụ ezie na ime ya eruwo ọmụmụ, aghaghị ime njem site n’ebe o bi na Nazaret gaa Betlehem. Ya na Josef mere otú ahụ iji mezuo ihe a chọrọ maka ịgụ ụba mmadụ ọnụ nke onye ọchịchị Rom bụ́ Siza Augustus, nyere iwu ya. (Luk 2:1-7) Ndị Juu, ebe ha na-ajụ ọchịchị Rom na oké ụtụ isi ya, na-achọrị inupụ isi. N’ihi gịnị ka Rom ga-eji mara ụma kpasuo ha iwe site n’ikwu ka ọtụtụ ndị mee njem ka e wee debanye aha ha n’oge ihu igwe sịkarịsịrị ike na nke dị aghụghọ nke oge oyi? Ọ̀ bụ na ezi uche adịghị ya karị na a ga-enyeworị iwu ime nke a n’oge nke na-enye ohere maka ime njem, dị ka n’oge opupu ihe ubi ma ọ bụ n’oge mgbụsị akwụkwọ?
Mgbakọ Ndị Dabeere ná Bible
Ihe àmà akụkọ ihe mere eme na ndị a na-ahụ anya na-akachapụ December, ma ọ bụ ọnwa ọ bụla ọzọ nke oge oyi, dị ka nke kwesịrị ihe ndekọ nke ọmụmụ Jisọs. Ọzọkwa, Bible na-ekpughe site n’amụma oge nke ọ bụ n’afọ mgbe a mụrụ Jisọs. Olee ebe o mere nke a?
N’akwụkwọ Daniel, isi nke 9, anyị na-ahụ otu n’ime amụma ndị kasị dị ịrịba ama banyere Mesaịa ahụ. Ọ na-akọwa ma ọbịbịa ya ma ya ịbụ onye e bipụrụ n’ọnwụ, nke nyere àjà mgbapụta iji kpuchie mmehie ma guzobe ihe ndabere maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi inweta “ezi omume ebighị ebi.” (Daniel 9:24-27; tụlee Matiu 20:28.) Dị ka amụma nke a na-ekwu, a ga-emezu nke a dum n’ime oge ga-ewe 70 izu nke afọ, na-amalite n’afọ 455 T.O.A., mgbe e nyere iwu ahụ bụ ka e wughachi Jerusalem.a (Nehemaịa 2:1-11) Site ná nkebi oge dị n’amụma a, a pụrụ ịghọta na Mesaịa ahụ ga-apụta ná mmalite nke izu nke 70 nke afọ. Nke a weere ọnọdụ mgbe Jisọs wepụtara onwe ya maka baptism na 29 O.A., na-amalitezi ọrụ ya dị ka Mesaịa. “Ná nkera izu ahụ,” ma ọ bụ mgbe afọ atọ na nkera gasịrị, a ga-ebipụ Mesaịa ahụ n’ọnwụ, si otú ahụ na-eweta ngwụsị nye uru nke àjà nile a na-achụ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu Mosis.—Ndị Hibru 9:11-15; 10:1-10.
Amụma nke a na-ekpughe na ogologo oge nke ozi Jisọs bụ afọ atọ na nkera. Jisọs nwụrụ n’oge Ememe Ngabiga, Nisan 14 (dị ka kalenda ndị Juu si dị), n’oge opupu ihe ubi nke 33 O.A. Ụbọchị dabakọrọ n’afọ ahụ ga-abụ April 1. (Matiu 26:2) Ịgụghachi azụ afọ atọ na nkera na-egosi na baptism ya bụ na 29 O.A., ná mmalite nke October. Luk na-eme ka anyị mara na Jisọs gbara ihe dị ka 30 afọ n’oge baptism ya. (Luk 3:21-23) Nke a ga-apụta na ọmụmụ Jisọs bụkwa n’ihe dị ka ná mmalite nke October. N’ikwekọ n’ihe ndekọ Luk, ndị ọzụzụ atụrụ n’oge ahụ n’afọ ka ‘ga-anọkwa n’ọhịa, na-eche atụrụ ha n’abalị.’—Luk 2:8.
Olee Ebe O Sitere?
Ebe ọ bụ na ihe àmà na-ezo aka ná mmalite October dị ka mgbe a mụrụ Jisọs, gịnị mere e ji eme ememe ya na December 25? Akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica na-egosi na a nabatara ememe nke a ọtụtụ narị afọ mgbe a mụsịrị Jisọs: “N’ime narị afọ nke 4 ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na chọọchị ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ji nwayọọ nwayọọ nabata ememe nke ọmụmụ Kraịst na December 25. Na Jerusalem, nguzo megide Krismas dịtere anya karị, ma e mesịrị nakwere ya.”
N’ihi gịnị ka omenala ahụ ji bụrụ nke ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst nakweere n’ụzọ dị mfe otú ahụ ọtụtụ narị afọ mgbe Kraịst nwụsịrị? The New Encyclopædia Britannica na-emekwu ka isiokwu ahụ pụta ìhè: “Omenala ndị a ma ama e jikọrọ ha na Krismas etolitewo site n’ọtụtụ ebe dị ka ihe sitere n’ihe ndabakọ nke ime ememe ọmụmụ Kraịst na oriri ndị ọgọ mmụọ nke ịkọ ugbo na ife anyanwụ n’etiti oge oyi. N’ala ndị Rom, Saturnalia (December 17) bụ oge ime oriri na mgbanwerịta nke onyinye. A na-elekwa December 25 anya dị ka ụbọchị a mụrụ chi ihe omimi nke Iran bụ́ Mithra, Anyanwụ nke Ezi Omume.”
Ihe a dum ọ̀ bụ n’ezie ‘ihe ndabakọ’? Ee e ma ọlị! Ọ bụ eziokwu nke akụkọ ihe mere eme na n’ime narị afọ nke anọ O.A., n’okpuru Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ́ Constantine, Alaeze Ukwu Rom nwoghara site n’ịbụ nke na-akpagbu Iso Ụzọ Kraịst gaa n’ịbụ nke na-akwado “Iso Ụzọ Kraịst” dị ka okpukpe a na-anakwere. Ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụba mmadụ, ndị na-enweghị nghọta banyere ihe Iso Ụzọ Kraịst pụtara n’ezie, na-anakwere okpukpe ọhụrụ a, ha malitere ime ememe ndị maara ha ahụ nke ndị ọgọ mmụọ n’ùtú aha “ndị Kraịst” ha nwetara ọhụrụ. Olee ụbọchị ga-akasị kwesị ekwesị ime ememe ọmụmụ Kraịst karịa December 25, bụ́ nke a kawororịị akara dị ka ụbọchị ọmụmụ nke “Anyanwụ nke Ezi Omume”?
Ò Nwere Ihe nke ahụ Mere?
Ajụjụ adịkebeghị ya na ndị mbụ na-eso ụzọ Jisọs, ndị a zụlitere dị ka ndị Juu, emeghị ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ ya. Dị ka akwụkwọ Encyclopaedia Judaica na-ekwu, “ememe ụbọchị ọmụmụ bụ nke a na-amaghị ama n’ememe omenala ndị Juu.” Ndị Kraịst mbụ agaraghị nnọọ anabata ememe dị otú ahụ. Kama ime ememe ọmụmụ ya, ha ga-akwanyere iwu Jisọs nyere nke ime ememe ncheta ọnwụ ya ùgwù, bụ́ nke ha nwere ụbọchị ya n’ụzọ a na-adịghị agbagha agbagha, ya bụ Nisan 14.—Luk 22:7, 15, 19, 20; 1 Ndị Kọrint 11:23-26.
Ọtụtụ narị afọ tupu Kraịst, a dọrọ ndị Juu, ndị bụ mgbe ahụ mba Chineke họpụtara, aka ná ntị n’ụzọ amụma banyere ọgwụgwụ nke ndọrọ ndị Babilọn ga-adọrọ ha laa n’agha, sị: “Wezụganụ onwe unu, wezụganụ onwe unu, sinụ n’ebe ahụ pụọ, unu emetụla ihe rụrụ arụ: sinụ n’etiti ya pụọ: dịnụ ọcha, unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke Jehova.” (Aịsaịa 52:11) Ha gaje ịlọghachi n’ala nke aka ha iweghachi ezi ofufe Jehova. Ọ ga-abụ ihe ezi echiche na-adịghị ya ka ha nabata omenala ndị na-adịghị ọcha nke ndị ọgọ mmụọ na ụdị okpukpe dị iche iche ndị ha hụworo na Babilọn.
Ọ bụghị ihe ijuanya na e nyeghachiri iwu nke a maka ndị Kraịst na 2 Ndị Kọrint 6:14-18. N’ọnọdụ mba ndị Juu jụrụ Kraịst, ndị na-eso ụzọ ya ghọrọ ndị na-anọchite anya ezi ofufe. Ha nwere ibu ọrụ nke inyere ndị ọzọ aka isi n’ọchịchịrị ime mmụọ pụta banye n’ìhè nke eziokwu. (1 Pita 2:9, 10) Olee otú ha pụrụ isi nwee ike ime nke a ma ọ bụrụ na ha agwakọta nkụzi Kraịst na omenala na ụbọchị ezumike ndị mmalite ha bụ n’ikpere arụsị?
N’agbanyeghị otú ọ pụrụ ịdị na-adọrọ mmasị ihe ka n’ụmụ mmadụ, ime ememe “Krismas Ọcha” bụ otu ihe ahụ ya na ‘imetụ ihe na-adịghị ọcha aka.’ (2 Ndị Kọrint 6:17) Onye nke hụrụ Chineke na Kraịst n’anya n’ezie aghaghị izere ya.
E wezụga na mmalite ha bụ n’ememe dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ, anyị ahụwokwa na Krismas adịghị anọchite anya eziokwu, ebe a mụrụ Jisọs n’October. Ee, n’agbanyeghị onyinyo pụrụ ibilite n’uche mmadụ, a mụghị Jisọs ma ọlị mgbe snow na-ada.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ntụle zuru ezu karị nke amụma a, lee akwụkwọ nta bụ́ Will There Ever Be a World Without War? peji nke 26, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 4, 5]
Jerusalem snow kpuchitere, dị ka a na-ahụ ya site n’akụkụ ọwụwa anyanwụ
[Ebe E Si Nweta Foto]
Garo Nalbandian
[Foto dị na peeji nke 6]
Snow n’akụkụ mgbidi Jerusalem
[Foto dị na peeji nke 7]
Nanị n’oge e nwere okpomọkụ ka ndị ọzụzụ atụrụ pụrụ isoro ìgwè atụrụ ha nọrọ n’abalị n’akụkụ ugwu dị iche iche, dị ka a na-ahụ n’okpuru
[Ebe E Si Nweta Foto]
Garo Nalbandian