Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 36
  • Olee Mgbe A Mụrụ Jizọs?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Mgbe A Mụrụ Jizọs?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Gịnị mere e ji agba Krismas n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba?
  • Olee Mgbe A Mụrụ Jizọs?
    Teta!—2009
  • Á Mụrụ Jisọs Mgbe Snow Na-ada?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Krismas?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Gịnị Mere Ụfọdụ Ndị Anaghị Agba Krismas?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 36

Olee Mgbe A Mụrụ Jizọs?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl ekwughị ụbọchị a mụrụ Jizọs. Lee ihe akwụkwọ ụfọdụ kwuru iji gosi na o kwughị ụbọchị a mụrụ ya:

  • “A maghị ụbọchị a mụrụ Kraịst.”—New Catholic Encyclopedia.

  • “O nweghị onye ma kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Kraịst.”—Encyclopedia of Early Christianity.

Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ekwughị ụbọchị a mụrụ Jizọs, ma o nwere ihe abụọ o kwuru mere n’oge a mụrụ Jizọs mere ọtụtụ ndị ji mata na ọ bụghị n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba ka a mụrụ ya.

A mụghị Jizọs n’oge oyi

  1. Ideba aha n’akwụkwọ. Obere oge tupu a mụọ Jizọs, Siza Ọgọstọs nyere iwu “ka e deba aha elu ụwa dum mmadụ bi n’akwụkwọ.” Onye ọ bụla ga-aga “n’obodo nke ya” deba aha ya. Ihe a nwere ike ime ka ụfọdụ ndị gaa ije otu izu ma ọ bụ karịa iji gaa deba aha n’obodo ha. (Luk 2:1-3) Ọ ga-abụ na ihe Ọgọstọs bụ n’obi tie iwu a bụ ka e si na ya na-anata ndị mmadụ ụtụ isi nakwa ka esi na ya nweta ndị ga-abụ ndị agha. Ma, o nweghị onye obi ga-adị ụtọ ime ogologo njem a. N’ihi ya, o yighị ka Ọgọstọs ọ̀ ga-asị ka ndị mmadụ mee ụdị njem a n’oge oyi, n’ihi na ọ ma na ọ ga-emekwu ka iwe wee ha.

  2. Ndị ọzụzụ atụrụ. N’oge a mụrụ Jizọs, ndị ọzụzụ atụrụ “bi n’ọhịa. Ha na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị.” (Luk 2:8) Otu akwụkwọ a na-akpọ Daily Life in the Time of Jesus kwuru na ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha na-anọ n’èzí “n’izu bu ụzọ tupu izu Ememme Ngabiga [ya bụ, ná ngwụcha ọnwa Mach]” ruo n’etiti ọnwa Nọvemba. O kwukwara na “ha na-anọ n’ụlọ n’oge oyi; n’ihi ya, oge e ji agba Krismas, ya bụ n’oge oyi, agaghị abụ oge a mụrụ Jizọs, n’ihi na Akwụkwọ Nsọ sị na ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọhịa n’oge ahụ.”

N’ihe dị ka n’ọnwa Ọktoba

Ọ bụrụ na anyị ebido n’oge Jizọs nwụrụ, ya bụ, n’Ụbọchị Ememme Ngabiga na Naịsan 14, n’oge opupu ihe ubi afọ 33, gụrụ laa azụ, o nwere ike inyere anyị aka ịmata ọnwa ọ ga-abụ ya ka a mụrụ Jizọs. (Jọn 19:14-16) Jizọs dị afọ iri atọ mgbe o bidoro ikwusa ozi ọma. O zikwara ozi ọma afọ atọ na ọkara. N’ihi ya, ọ ga-abụ n’ihe dị ka n’ọnwa Ọktoba n’afọ 2 (Tupu Oge Ndị Kraịst) ka a mụrụ Jizọs.—Luk 3:23.

Gịnị mere e ji agba Krismas n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba?

Ebe ọ bụ na anyị ahụla na ọ bụghị n’abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Disemba ka a mụrụ Jizọs Kraịst, gịnịzi mere ndị mmadụ ji agba Krismas n’oge ahụ? Otu akwụkwọ a na-akpọ Encyclopædia Britannica sịrị na ọ ga-abụ na ndị isi chọọchị họọrọ abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba “ka o nwee ike ịdaba n’oge ndị Rom na-ekpere arụsị ji eme ememme ‘ụbọchị ọmụmụ anyanwụ’” n’oge oyi. Akwụkwọ ọzọ a na-akpọ Encyclopedia Americana kwuru na ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ sịrị na ihe mere ndị isi chọọchị ji họrọ ụbọchị ahụ bụ “iji mee ka ndị ọgọ mmụọ a tọghatara ọhụrụ nwekwuo mmasị n’okpukperechi Ndị Kraịst.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya