Ndị Na-eto Eto Ndị ‘Tụkwasịrị Jehova Obi’
ỌBỤGHỊ nanị ndị ntorobịa ka ịma mma dịịrị, ọ bụghịkwa ndị agadi nwere amamihe nanị ha. (Tụlee Ilu 11:22; Eklisiastis 10:1.) Kama nke ahụ, ndị nwere ịma mma na-adịgide adịgide na ezi amamihe bụ ndị tụkwasịrị Jehova obi na ndị ji obi ha nile na-ekwu banyere ya, sị: “Chineke m ka ị bụ.”—Abụ Ọma 31:14; Ilu 9:10; 16:31.
Gburugburu ụwa, e nwere ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mara mma, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, bụ́ ndị na-egosipụta amamihe ha site n’ijere Chineke ozi na ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere Sabrina dị afọ asatọ.
Sabrina bi na Germany ma bụrụkwa onye nọ na klasị nke abụọ n’ụlọ akwụkwọ. Ọ bụ onye mbụ n’ime Ndịàmà Jehova banyere n’ụlọ akwụkwọ ya. N’ụzọ dị mwute, ọ bụ onye ụmụ akwụkwọ ibe ya na-enyekarị mkparị ruo ụbọchị onye nkụzi gwara ụmụ akwụkwọ ka ha weta akwụkwọ kasị amasị ha na klasị. Sabrina kpebiri iweta Akwukwọm nke Akukọ Bible. N’abalị bu ụzọ, ọ bụ ezie na ahụ erughị ya ala, ọ kwadebere nke ọma maka klasị. Ebe ọ bụ na e nwere 26 ụmụ akwụkwọ na klasị ya, ọ maara na ọ pụrụ ịbụ na ya agaghị enwe oge buru ibu. Ma o kpebisiri ike na ya agaghị ekwe ka onye ọ bụla gbochie ihe ngosi ya, o jikwa n’aka na Jehova ga-enyere ya aka. N’ụbọchị a kara aka, onye nkụzi jụrụ maka onye wetaworo akwụkwọ ma chọọ ibu ụzọ gosi ya. N’ụzọ dị ịtụnanya, nanị Sabrina wetaworo otu. O guzoro n’ihu klasị ahụ ma malite ikwu okwu, na-agụpụta ihe ma na-egosikwa foto ndị sitere n’akwụkwọ ahụ, na-akọwa na ihe nile dabeere na Bible. Ná mmechi ọ jụrụ sị: “Ònye ka ọ ga-amasị inweta akwụkwọ nke a?” O nyere onye nkụzi otu, n’ime ụbọchị ole na ole ndị na-esochikwa, o nyere ụfọdụ n’ime ndị klasị ya akwụkwọ iri ndị ọzọ. Nanị ihe onye nkụzi ahụ kwuru banyere ihe omume ya bụ: “Ahụtụbeghị m ihe yiri ya.” O nyere Sabrina akara kasị mma maka ọrụ ya.
N’eziokwu, ọtụtụ Ndịàmà na-eto eto bụ ndị nkwusa nwere obi ụtọ nke ozi ọma ahụ n’ụlọ akwụkwọ. Ihe atụ ọzọ bụ Erika, otu onye nkwusa dị afọ 11 na Mexico. A kụziworo ya ịhụ Jehova n’anya site na nwa ọhụrụ. Ihe omume ụlọ akwụkwọ ya pụrụ nnọọ iche. Otu n’ime ihe omume ya bụ ịkwadebe otu isiokwu maka ọrịa AIDS na iri ahụ nke ụtaba na mmanya na-egbu egbu. Ọ kwadebere nke ọma, na-eji magazin Teta! na-eme ihe, nwetakwa akara ndị kasị elu. Onye nkụzi ya jụrụ ya ebe o si nweta ihe ọmụma ya o wee nye ya magazin ndị nwere isiokwu ndị a. E mesịa, onye nkụzi ahụ ji magazin ndị a soro ndị klasị ahụ dum kwurịta isiokwu ndị ahụ. N’ihi àgwà Erika, ùgwù ọ na-akwanyere ndị nkụzi, na akara ndị dị elu ya, o ruru eru inweta onyinye dị iche iche, akara mmụta diploma, na onyinye ịgụ akwụkwọ n’akwụchaghị ụgwọ. Ka o sina dị, o chere na ihe kasị ukwuu ọ rụzuru abụwo na ya gosipụtara onwe ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, nwee ike inyefe akwụkwọ Bible, buliekwa aha Chineke elu.
E nwekwara Shannon, nwata nwoke dị afọ iri, onye bi na New Zealand. O nwere nanị otu anya dị mma; ọrịa cancer kpọrọ anya nke ọzọ mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ. Mgbe Shannon dị afọ asaa, nne ya malitere isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya ọ malitesịrị ihe ọmụmụ Bible ya, ọ malitere isoro otu nwoke na-ebikọ ọnụ n’enweghị abamuru nke alụmdi na nwunye wee kpebie ịkwụsị ọmụmụ ihe ya. Shannon rịọrọ ka ọmụmụ Bible nke ya gaa n’ihu. E meere ya ihe ọ chọrọ. Ndịàmà ahụ nọgidere na-abịa, e mesịakwa mmadụ atọ dum ahụ nọ n’ezinụlọ ahụ mụrụ Bible ma nwee ọganihu ime mmụọ. Mgbe ha gbasịrị akwụkwọ dị ka iwu kwadoro, e mere nne Shannon na di mama ya baptism.
Otu ụbọchi Shannon na nwunye onye nlekọta sekit nọ na-ejekọ ozi ubi. Otu onye nwe ụlọ ajụọ Shannon: “Gịnị mere gị n’anya?” “Ọrịa cancer bịara m na ya, o wee dị mkpa ka a ghụpụ ya,” ka ọ zara. “N’isi nso Jehova gaje inye m nke ọhụrụ n’ime Paradaịs, ọ bụkwa nke ahụ ka anyị bịara ịkọrọ gị banyere ya.”