Ị̀ Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù Mgbe Ị Na-enye Ndụmọdụ?
LEE ka o si dị mma, baakwa uru ịbụ onye e ji nkwanye ùgwù nye ndụmọdụ! “Ndụmọdụ obi ọma, nke ọmịiko, nke ịhụnanya na-eme ka e nwee mmekọrịta dị mma,” ka Edward kwuru. “Mgbe i chere na onye ahụ na-enye ndụmọdụ na-asọpụrụ gị, na-akwanyekwara gị ùgwù site n’igosi ịdị njikere ịṅa ntị n’ihe i nwere ikwu n’okwu ahụ, ndụmọdụ ahụ na-adị mfe karị ịnakwere,” ka Warren na-ekwu. “Mgbe onye na-enye ndụmọdụ ji nkwanye ùgwù na-emeso m, ọ na-adịrị mfe ijekwuru ya, na-achọ ndụmọdụ ya,” ka Norman kwupụtara.
Iru Eru Ebumpụta Ụwa nke Mmadụ Nwere Ịnata Nkwanye Ùgwù
N’ezie, a na-anabata ndụmọdụ na-ekpo ọkụ, nke enyi, na nke ịhụnanya. Ịdụ ndị ọzọ ọdụ n’ụzọ ị chọrọ ka e si dụọ gị bara uru. (Matiu 7:12) Ezi onye ndụmọdụ na-ewepụta oge ịṅa ntị ma na-achọ ịghọta onye nke a na-adụ ọdụ—echiche ya, ọnọdụ ya, na mmetụta ya—kama ịdị na-eme nkatọ ma na-ama ikpe.—Ilu 18:13.
Ọ dị mkpa ka ndị ndụmọdụ taa, gụnyere ndị okenye ndị Kraịst, mụrụ anya ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù mgbe ha na-enye ndụmọdụ. N’ihi gịnị? Kpọmkwem n’ihi na àgwà a na-ahụkarị n’ọha mmadụ bụ imeso ndị ọzọ n’enweghị nkwanye ùgwù. Nke a na-efe efe. Ọtụtụ mgbe, ndị ị tụrụ anya inweta mmeso dị ùgwù n’aka ha bụ kpọmkwem ndị na-adịghị eme otú ahụ, ọ sọ ya bụrụ ndị ọkachamara, ndị ndú okpukpe, ma ọ bụ ndị ọzọ. Iji maa atụ, n’ụlọ ọrụ ịchụ mmadụ n’ọrụ na-akpaghasị uche ma na-eweta nrụgide nye ma onye nwe ọrụ ma onye e were n’ọrụ. Ọ na-ebibi ùgwù onwe onye, karịsịa ma ọ bụrụ na e mesoo onye a chụrụ n’ọrụ n’ụzọ na-adịghị ùgwù. Ndị nlekọta ọrụ n’ọnọdụ a aghaghị ịmụta ụzọ isi zie “ozi ahụ dị ike ka e wee ghọta ya nke ọma n’ekwughị ọtụtụ okwu na n’ụzọ nkà dị na ya, ma ghara ịkpa ùgwù onye ahụ aka,” ka akwụkwọ akụkọ The Vancouver Sun na-akọ. Ee, mmadụ nile kwesịrị ịbụ ndị e mesoro n’ụzọ dị ùgwù.
Nzukọ Ezumezu nke òtù United Nations kpọsara sị: “Ihe nile bụ mmadụ nweere onwe ha site n’ọmụmụ harakwa nhata n’ùgwù na ihe ndị ruuru ha. E kenyere ha echiche na akọ na uche, ha kwesịkwara imeso ibe ha ihe ná mmụọ nke ịbụ ụmụnna.” Ebe ọ bụ na a na-awakpo ịdị ùgwù nke mmadụ, ọ bụ ezi ihe mere Akwụkwọ Iwu United Nations na okwu mmeghe nke Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ denyere àgwà nke a. Ha kwadoro “okwukwe n’ihe ndị bụ isi ruuru mmadụ, n’ịdị ùgwù na ịba uru nke onye bụ mmadụ.”
Jehova Kenyere Mmadụ Ùgwù
Jehova bụ Chineke nke dị ùgwù. Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ kwuru n’ụzọ ziri ezi sị, “Ebube na ịma mma dị n’ihu Ya,” na, “Onye tinyeworo ebube [Ya] n’eluigwe.”—1 Ihe Emere 16:27; Abụ Ọma 8:1.
Dị ka Chineke nke dị ebube na Ọkaaka Eluigwe na Ala, ọ na-enye ihe nile o kere eke ùgwù, n’eluigwe na n’ụwa. Onye pụrụ iche n’ime ndị e nyere nsọpụrụ otú a bụ Ọkpara ya e mere ka ọ dị ebube nke na-achị achị, Eze ahụ bụ́ Kraịst Jisọs. “Ebube na ịma mma ka ị na-atụkwasị ya,” ka Devid dere n’ụzọ amụma.—Abụ Ọma 21:5; Daniel 7:14.
Ọ bụ ihe mwute na e metọwo ihe nke a bụ isi nke ruuru mmadụ nke ukwuu n’akụkọ nile nke ihe mere eme. Otu mmụọ ozi dị ike, onye sitere n’omume ya ghọọ Setan Ekwensu, mara izi ezi, ezi omume, na ikwesị ekwesị nke ọkaaka Chineke aka. N’ime nke ahụ o gosiri enweghị nkwanye ùgwù maka Jehova, kparịakwa aha Ya dị ebube mgbe ọ na-ama ikike Ya ịchị isi aka. Ọ tụkwasịrị onwe ya ùgwù gabigara ókè. Dị ka Ekwensu, ndị ọchịchị ukwu, dị ka Nebukadneza nke oge Bible, etuwo ọnụ banyere ‘ume na ịdị ebube’ ha. Ha awakpowo ịdị ùgwù Jehova, na-atụkwasị onwe ha ùgwù ezi echiche na-adịghị ya. (Daniel 4:30) Ịchịisi mmegbu nke Setan, nke a manyere ụwa ihe a kpọrọ mmadụ amanye ịnọ n’okpuru ya, awakwasịwo ma nọgide na-awakwasị ịdị ùgwù nke mmadụ.
Ọ̀ dịtụwo mgbe e mebiri ùgwù gị? Mgbe a na-enye gị ndụmọdụ, è mewo ka ọ dị gị ka ụta ọ̀ dịịrị gị gabiga ókè, menye gị ihere, kparịa gị, ma ọ bụ wetuo gị ala? “Ahụghị m nchegbu, ọmịiko, na ịdị ùgwù. E mere ka m yie onye na-abaghị uru,” ka André na-ekwu, na-agbakwụnye, sị: “Nke a dubara ná mmetụta nke uche mgbakasị na obi erughị ala, ọbụna nkụda mmụọ.” “O siri ike ịnakwere ndụmọdụ site n’aka onye i chere na o bughị ọdịmma gị kasị mma n’obi,” ka Laura na-ekwu.
N’ihi nke a, a dụrụ ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst ọdụ ka ha jiri nkwanye ùgwù na nsọpụrụ mesoo ìgwè atụrụ Chineke. (1 Pita 5:2, 3) Ọ bụrụ na ọnọdụ ebilite bụ́ ebe ọ dị mkpa, baakwa uru ịdụ ndị ọzọ ọdụ, olee otú ị pụrụ isi chebe onwe gị pụọ n’echiche na àgwà nke ndị ụwa bụ́ ndị, n’eleghị anya n’azụ, na-emebi ùgwù nke ndị ọzọ? Gịnị pụrụ inyere gị aka ichebe ùgwù ndị Kraịst ibe gị, nakwa nke gị?—Ilu 27:6; Ndị Galetia 6:1.
Ụkpụrụ Ndị Na-echebe Ùgwù
Okwu Chineke agbaghị nkịtị n’okwu a. Onye ndụmọdụ nwere nkà ga-atụkwasị obi zuru ezu ná ndụmọdụ nke Okwu Chineke, kama ilega anya n’amamihe ụwa nke a. Ihe Odide Dị Nsọ ndị ahụ nwere okwu ndụmọdụ bara uru. Mgbe a gbasoro ha, ha na-akwanyere ma onye ndụmọdụ ma onye nke a na-atụziri ụzọ ùgwù. Otú a, ntụzi Pọl nye onye nlekọta bụ́ onye Kraịst bụ́ Timoti bụ: “Abarala okenye oké mba, kama na-arịọ ya arịrịọ dị ka nna; na-emesokwa ụmụ okorobịa dị ka ụmụnne: ndị inyom, ndị bụ́ okenye, dị ka ndị bụ́ nne; ụmụ aghọghọ dị ka ụmụnne nwanyị, n’ịdị ọcha nile.” (1 Timoti 5:1, 2) Lee ka e si na-egbochi oké iru újú, iwe, na mmechuihu site n’ịrapara n’ụkpụrụ ndị a!
Rịba ama na isi ihe dị n’inwe ihe ịga nke ọma n’ịdụ ọdụ bụ nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị maka onye ahụ na ya ịbụ onye o ruuru ịbụ onye e mesoro ihe n’ụzọ dị ùgwù, n’ịhụnanya. Ndị okenye bụ́ ndị Kraịst, gụnyere ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, kwesịrị ịgbalịsi ike ịgbaso okwu ndụmọdụ nke a, na-achọ ịmata ihe mere onye mgbazi olu dị mkpa ji na-eche echiche ma na-akpa àgwà dị ka ọ na-eme. Ha ga-achọ ịnụ echiche nke ya. A na-eme mgbalị nile iji zere imenye ihere, iwetu ala, ma ọ bụ ime onye a na-enyere aka akaje.
Dị ka onye okenye, mee ka nwanna gị mara na ị na-eche banyere ya ma chọọ inyere ya aka ná nsogbu ya. Ọ bụ ihe ezigbo dọkịta na-eme mgbe ị gara n’ọfịs ya ka e wee lee gị ahụ. Echiche nke iyipụsị uwe n’ime ụlọ na-atụ oyi, nke na-akụnwụ ahụ pụrụ imenye gị ihere ma wetuo gị ala. Lee ka i si enwe ekele maka onye dọkịta nke gosiri mmetụta n’ebe ùgwù onwe onye gị dị ma kwanyere gị ùgwù site n’inye gị uwe mkpuchi ahụ, ka ọ na-ele gị ahụ ndị dị mkpa iji chọpụta ihe kpatara ọrịa gị! N’ụzọ dị otú ahụ, onye Kraịst na-enye ndụmọdụ nke gosiri nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị maka onye ahụ dị obi ọma ma na-akwụrụsi ike n’ihe, ka o sina dị na-eyikwasị onye na-anara ya ùgwù. N’ụzọ megidere nke a, ndụmọdụ olu ike, nke mmetụta na-adịghị ya, dị ka myipụ uwe n’ụzọ ihe atụ nke na-emenye gị ihere, wetuo gị ala, ma yipụ gị ùgwù gị.
Ndị nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke karịsịa na-elezi anya ịdụ ọdụ n’ụzọ dị ùgwù. Mgbe ha na-adụ ndị meworo agadi ọdụ, ha na-egosipụta otu ịhụnanya ahụ ha ga-egosi nne na nna ha n’anụ ahụ. Ha na-enwe ọmịiko, ihu enyi, na ikpo ọkụ. Inwe mmetụta dị otú ahụ dị mkpa. Ọ na-eme ka e nwee ọnọdụ dị mma maka inye na ịnara ndụmọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị.
Ndị okenye, burunụ n’uche na ndụmọdụ dị irè na-ebuli elu, na-agba ume, na-ewuli elu, na-arụpụtakwa ihe ọma. Ndị Efesọs 4:29 na-asị: “Ka okwu ọ bụla nke na-ere ure ghara isi n’ọnụ unu pụta, kama ihe bụ ezi ihe, iwuli mmadụ elu dị ka ụlọ, dị ka mkpa si dị, ka o wee nye ndị na-anụ ya amara.”
Ọ dịghị mkpa iji okwu, ma ọ bụ ntụgharị uche obi ọjọọ eme ihe. Kama nke ahụ, nkwanye ùgwù maka onye nke ọzọ ahụ na ọchịchọ ichekwa mmetụta ya nke mmadụ ịba uru na ùgwù onwe onye na-akpali gị ikwu ihe n’ụzọ dị mma, nke e chepụtara nke ọma. Tupu i kwuo ihe ọ bụla buru ụzọ nye ịja mma bụ́ eziokwu maka akụkụ ya ma ọ bụ àgwà ya ndị dị mma, kama imesi ike echiche ndị ga-eme ka ọ dị ya ka onye ike ụwa gwụrụ na onye abaghị uru. Ọ bụrụ na ị na-eje ozi dị ka okenye, jiri ‘ike gị wulie elu dị ka ụlọ ọ bụghị iweda ala.’—2 Ndị Kọrint 10:8.
Ee, mmetụta nke ndụmọdụ ọ bụla site n’ọnụ ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ịbụ iji nye agbamume dị mkpa, iji nye amara. O kwesịghị ịbụ iji kụdaa mmụọ ma ọ bụ ime ka a “tụọ oké egwu.” (2 Ndị Kọrint 10:9) Ọbụna onye nke meworo ihe dị oké njọ dị mkpa ka e nye ya ọ̀tụ̀tụ̀ nkwanye ùgwù onwe onye na nsọpụrụ. A ghaghị iji okwu ịba mba nke obi ọma ma bụrụ ndị nke kwụsiri ike n’ihe hazie ndụmọdụ iji kwalie ya gaa ná nchegharị.—Abụ Ọma 44:15; 1 Ndị Kọrint 15:34.
N’ụzọ dị ịrịba ama, Iwu Chineke nyere Israel nwere otu ụkpụrụ ndị a. O nyere ohere maka inye ndụmọdụ na ọbụna ịdọ aka ná ntị nkịtị, n’otu mgbe ahụkwa na-echebe iru eru mmadụ nwere inweta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ùgwù onwe onye. E nyere ohere iji ụtari tie ihe “nke ga-ezu mmebi iwu ya, n’ọnụ ọgụgụ,” ma nke a agaghị agabiga ókè. E tinyere njedebe n’ọnụ ọgụgụ nke ụtarị a ga-apịa ka a ghara ‘n’ezie ilelị’ onye ahụ mebiri iwu.—Deuterọnọmi 25:2, 3.
Nchegbu maka mmetụta nke ndị mebiri iwu ma nwee nchegharị bụkwa ihe a hụrụ n’omume Jisọs. Banyere ya, Aịsaịa buru amụma, sị: “Ọ gaghị akpaji amị a pịara apịa, ọ gaghị emenyụkwa ogho oriọna na-enwu inyoghị inyoghị: n’eziokwu ka ọ ga-eme ka ikpe pụta.”—Aịsaịa 42:3; Matiu 12:17, 20; Luk 7:37, 38, 44-50.
Okwu ndị Jisọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ahụ na-emesikwu mkpa ọ dị inwe ọmịiko ike: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu.” (Matiu 7:12) Ụkpụrụ nke a dị oké mkpa n’ịkwalite mkpakọrịta ọma nke na a na-akpọkarị ya Ụkpụrụ Ọma. Dị ka okenye bụ́ onye Kraịst, olee otú ọ pụrụ isi nyere gị aka imeso ndị ọzọ ihe n’obi ọma na n’ụzọ dị ùgwù mgbe ị na-enye ndụmọdụ?
Buru n’uche na gị onwe gị na-ehiekwa ụzọ. Dị ka Jemes kwuru, “anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe.” (Jemes 3:2) Icheta nke a ga-enyere gị aka ime ka okwu gị dị nro ma chịkwaa mmetụta gị mgbe ọ dị mkpa ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ndị ha na-emezighị. Ghọta otú ihe si emetụta ha n’obi. Nke a ga-enyere gị aka izere imekarị nkatọ, na-adọrọ uche na-aga n’ihie ụzọ ma ọ bụ ntụpọ ndị dị nta. Jisọs mesiri nke a ike mgbe ọ sịrị: “Unu ekpela ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. N’ihi na ikpe unu ji kpee ka a ga-eji kpee unu: ọ bụkwa ihe unu ji tụọ ihe ka a ga-eji tụọrọ unu.”—Matiu 7:1, 2.
Kwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù—Guzogide Ekwensu
A haziri ụzọ akọ nile nke Setan iji yipụ gị ùgwù, iji kpata mmetụta nke ihere, abaghị uru, na obi nkoropụ. Rịba ama ụzọ o si jiri ndị ọrụ bụ mmadụ kpalie mmetụta uche na-ezighị ezi n’ime Job kwesịrị ntụkwasị obi. Elifaz dị ihu abụọ mere nzọrọ, sị: “Ndị ohu ya ka Ọ [Jehova] na-adịghị atụkwasị obi; ndị mmụọ ozi Ya [dị nsọ] ka Ọ na-ebo ebubo na ha bụ ndị mmehie: Ọ̀ ga-esikwa aṅaa ghara ibo karị ndị bi n’ụlọ ụrọ [ụmụ mmadụ na-emehie emehie]? nke ntọala ha dị n’ájá, ndị a na-azọpịa azọpịa dị ka nla.” (Job 4:18, 19) Ya mere dị ka o kwuru, Job abakarịghị nla n’uru ma ọlị nye Chineke. N’ezie, ndụmọdụ Elifaz na ndị enyi ya, kama ịbụ ihe mwuli elu ma ọlị, gaara anapụwo Job ọbụna ncheta nke oge ndị ka mma. N’echiche ha, ikwesị ntụkwasị obi ya n’oge gara aga, ọzụzụ ezinụlọ, mmekọrịta ya na Chineke, na onyinye ebere abaghị uru ọ bụla.
N’otu aka ahụ taa, ndị ngahie chegharịrịnụ nọkarịrị n’ọnọdụ ịdaba ná mmetụta ndị dị otú ahụ, e nwekwara ihe ize ndụ nke ha ịbụ ndị ‘e lodara site ná mwute gabigara ókè.’ Ndị okenye, mgbe unu na-adụ ndị dị otú ahụ ọdụ, “mee ka ịhụnanya unu hụrụ” ha “bụrụ ihe dị ịtụkwasị obi” site n’inye ha ohere ichebe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdị ùgwù. (2 Ndị Kọrint 2:7, 8) “Ịbụ onye e mesoro ihe n’ụzọ na-adịghị ùgwù na-eme ka o sie ike ịnakwere ndụmọdụ,” ka William kwetara. Ọ dị mkpa imesi okwukwe ha ike na ha bara uru n’anya Chineke. Chetara ha na Jehova “abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ [ha] na ịhụnaya ahụ [ha] gosiri n’ebe aha Ya dị” n’afọ ha ndị gara aga nke ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi.—Ndị Hibru 6:10.
Ihe ndị ọzọ dị aṅaa pụrụ inyere gị aka ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù mgbe ị na-enye ndụmọdụ? Mata na mmadụ nile nwere iru eru ebumpụta ụwa ịnata nkwanye ùgwù, ebe e kere ha n’onyinyo Chineke. Jehova Chineke na Jisọs Kraịst ji ha kpọrọ ihe; ndokwa abụọ ahụ nke ihe mgbapụta na mbilite n’ọnwụ na-agba akaebe nye eziokwu ahụ. Jehova na-atụkwasịkwara ndị Kraịst ùgwù site ‘n’idebe ha ijere Ya ozi,’ na-eji ha na-arịọ ọgbọ ọjọọ ka ha soro Chineke dị n’udo.—1 Timoti 1:12.
Ndị okenye, chetanụ na ihe dị ukwuu ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ụmụnna unu ndị Kraịst bụ ndị gaje ịbụ ndị mbụ ga-amalite òtù ọhụrụ nke ụmụ mmadụ n’ụwa e mere ka ọ dị ọcha. Dị ka ụmụ mmadụ e ji kpọrọ ihe otú a na ndị dị oké ọnụ ahịa, ha ruru eru ịbụ ndị e kenyere nsọpụrụ. Mgbe a na-adụ ọdụ, chetanụ ụzọ ma Jehova ma Jisọs si chebara ha echiche, ma nọgidenụ na-eme òkè unu n’inyere ụmụnna unu aka ichebe mmetụta nke ịdị ùgwù na abamuru onwe onye n’agbanyeghị ihe ịma aka nile nke Setan.—2 Pita 3:13; tụlee 1 Pita 3:7.
[Igbe dị na peeji nke 29]
Ndụmọdụ nke Na-enye Ùgwù
(1) Jaa mma n’eziokwu na n’obi ziri ezi. (Mkpughe 2:2, 3)
(2) Bụrụ onye na-ege ntị nke ọma. N’ụzọ doro anya na n’obi ọma gosipụta nsogbu dịnụ na ihe kpatara ndụmọdụ ahụ. (2 Samuel 12:1-14; Ilu 18:13; Mkpughe 2:4)
(3) Dabere ndụmọdụ gị n’Akwụkwọ Nsọ. Nwee echiche ọma, na-eche echiche ziri ezi, ma na-agba ume, gosikwa ọmịiko. Akpala ùgwù na abamuru onwe onye nke onye na-anara ya aka. (2 Timoti 3:16; Taịtọs 3:2; Mkpughe 2:5, 6)
(4) Mesie onye ahụ na-anara ya obi ike na ngọzi ga-esite n’ịnara na itinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ. (Ndị Hibru 12:7, 11; Mkpughe 2:7)
[Foto dị na peeji nke 26]
Ọ dị ndị okenye bụ́ ndị Kraịst mkpa ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù mgbe ha na-enye ndụmọdụ