Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 4/1 p. 28-31
  • Ị̀ Na-asọpụrụ Ùgwù Ha?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-asọpụrụ Ùgwù Ha?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Gosipụta Ihe Atụ nke Ùgwù
  • Ùgwù ná Mmekọrịta Ezinụlọ
  • N’ọgbakọ Ndị Kraịst
  • Ịnọgide Na-enwe Ùgwù Onwe Onye
  • Sọpụrụ Jehova Site n’Ịkpa Àgwà Dị Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ị̀ Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù Mgbe Ị Na-enye Ndụmọdụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • A Dịghị Akwanyere Ọtụtụ Ndị Ùgwù Ruuru Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ọ Ga-ekwe Omume Ịkwanyere Mmadụ Nile Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 4/1 p. 28-31

Ị̀ Na-asọpụrụ Ùgwù Ha?

N’ỊBỤ ndị e jidere ka ụmụ anụmanụ ma kpọchie n’ime unyi na ísì jọgburu onwe ha, e ji ụgbọ mmiri buru ụmụ afọ Africa ka ibu gaa Kọntinent ndị dị n’America. Ọ dịkarịa ala a tụrụ anya na ọkara n’ime ha ga-anwụ tupu ha ana-erudị ebe ha na-aga. E ji obi ọjọọ kewagasịa ndị òtù ezinụlọ, n’enweghị mgbe ha ga-ahụ ibe ha ọzọ. Ahịa ohu so n’ihe omume ndị kasị njọ ná mmeso afọ ịta mmiri nke mmadụ megide mmadụ ibe ya. Ihe omume ndị ọzọ dị otú ahụ mere mgbe ndị mmeri ndị dị ike ji obi ọjọọ chịa ụmụ amaala bụ́ ndị na-enweghị nchebe.

Ịnapụ mmadụ ùgwù ya pụrụ ịbụ ihe obi ọjọọ karịa iti ihe nkịtị. Ọ na-egbu mmụọ mmadụ. Ọ bụ ezie na a kwụsịwo ịgba ohu n’ala ka n’ọnụ ọgụgụ, imebi ùgwù mmadụ ka na-aga n’ihu, ma eleghị anya n’ụdị zoro ezo karị.

N’aka nke ọzọ, ezi ndị Kraịst na-agba mbọ ịṅa ntị na ndụmọdụ Jisọs Kraịst ‘ịhụ ndị agbata obi ha n’anya dị ka onwe ha.’ N’ihi ya, ha na-ajụ onwe ha, sị, ‘Àna m asọpụrụ ùgwù onwe onye nke ndị ọzọ?’—Luk 10:27.

E Gosipụta Ihe Atụ nke Ùgwù

Dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu si kwuo, ùgwù bụ ọdịdị ma ọ bụ ọnọdụ nke ịbụ onye ruru eru, onye a na-asọpụrụ, ma ọ bụ onye a na-ebuli elu. Lee otú nkọwa a si kwekọọ n’ọnọdụ Eze Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova Chineke! N’eziokwu, Akwụkwọ Nsọ na-eji ịdị ùgwù eme ihe ugboro ugboro n’ebe aha Jehova na ọbụbụeze ya dị. Mosis, Aịsaịa, Ezikiel, Daniel, Jọn onyeozi, na ndị ọzọ nwere ihe ùgwù nke ịbụ ndị e nyere ọhụụ ndị sitere n’ike mmụọ nsọ nke Onye Kasị Ihe Nile Elu na ogige eluigwe ya, nkọwa ha gosipụtakwara mgbe nile oké ebube na ùgwù. (Ọpụpụ 24:9-11; Aịsaịa 6:1; Ezikiel 1:26-28; Daniel 7:9; Mkpughe 4:1-3) N’ekpere inye otuto, Eze Devid sịrị: “Jehova, Gị nwe ịdị ukwuu, na ịdị ike, na ịma mma, na mmeri, na [ùgwù, NW]: n’ihi na ihe nile dị n’eluigwe na n’ụwa bụ nke Gị.” (1 Ihe E Mere 29:11) N’ezie, ọ dịghị onye ka Jehova Chineke n’onwe ya ruo eru inweta nsọpụrụ na mbuli elu.

N’ike mmadụ n’onyinyo na n’ọdịdị ya, Jehova nyere mmadụ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke iru eru, nsọpụrụ onwe onye, na ùgwù. (Jenesis 1:26) Ya mere, ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ, ọ dị anyị mkpa inye onye nke ọ bụla nsọpụrụ na ùgwù ruuru ya. Mgbe anyị na-eme otú ahụ, n’eziokwu, anyị na-egosipụta ekele nye Isi Iyi nke ùgwù mmadụ, bụ́ Jehova Chineke.—Abụ Ọma 8:4-9.

Ùgwù ná Mmekọrịta Ezinụlọ

N’okpuru ike mmụọ nsọ, Pita onyeozi, bụ́ nwoke lụrụ nwanyị, nyere ndị Kraịst bụ́ di ndụmọdụ ka ha kenye nwunye ha “nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị.” (1 Pita 3:7; Matiu 8:14) Pọl onyeozi dụrụ ọdụ “ka nwunye leziekwa anya ka ọ na-atụ egwu di ya.” (Ndị Efesọs 5:33) Ya mere, n’alụmdi na nwunye, mmadụ ịsọpụrụ ùgwù onwe onye nke di ma ọ bụ nwunye ya bụ ihe Bible na-achọ. Olee ụzọ ndị a pụrụ isi gosi nke a?

Dị ka mmiri si enye ihe ọkụkụ ume, okwu na-atọ ụtọ na omume obiọma n’etiti di na nwunye, n’ihu ọha na ná nzuzo, pụrụ ịkwalite mmekọrịta ha chiri anya. N’ụzọ megidere nke ahụ, okwu mkparị ndị dị ike ma ọ bụ na-adịghị egosicha nsọpụrụ, okwu nlelị, dị ka a na-anụkarị ha n’ihe omume TV ndị na-akpa ọchị, na-emebi ihe. Ha pụrụ ịkpali mmetụta ndị na-emerụ ahụ nke ịbụ onye na-abaghị uru, ịda mbà n’obi, na iwe; ha pụrụ ọbụna ịkpata ọnyá mmetụta uche ndị na-adịghị ala ngwa ngwa.

Ịsọpụrụ ùgwù onwe onye nke ndị ọzọ na-apụtakwa ịnakwere ha otú ha dị, ọ bụghị ịdị na-anwa ime ka ha kwekọọ n’ụdị ndị a dị mbụ buru n’uche ma ọ bụ were ha na-atụnyere ndị ọzọ n’ụzọ na-ezighị ezi. Nke a dị mkpa karịsịa n’etiti di na nwunye. Ebe nkwurịta okwu na-aga were were na n’ụzọ di mfe, e nweghịkwa onye na-atụ ụjọ ịbụ onye a katọrọ ma ọ bụ a gwakasịrị okwu ahụ, mkpachi anya ga-adị. Mgbe mmadụ pụrụ inwe ahụ iru ala n’alụmdi na nwunye, mgbe ahụ ka ebe obibi na-aghọ n’ezie ebe mgbaba pụọ n’ụwa obi ọjọọ, nke na-agbakasị ahụ.

Ụmụaka nọ n’okpuru iwu Akwụkwọ Nsọ ịsọpụrụ na irubere nne na nna ha isi. N’aka nke ha, nne na nna maara ihe ma nwee ịhụnanya ga-eme nke ọma ịnakwere ùgwù ụmụ ha. Ịja mma na-ekpo ọkụ maka ezi akparamàgwà, tinyere ịdọ aka ná ntị e ji ndidi na-enye mgbe ọ dị mkpa, na-arụ ọrụ dị mma n’imesi “ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị” ike. Ime nkatọ mgbe nile, iti mkpu, na ịkọ ọnụ n’okwu ndị na-eweda n’ala dị ka “onye iberibe” ma ọ bụ “ewu” bụ nanị iwe ka ọ ga-akpasu ha.—Ndị Efesọs 6:4.

Otu onye Kraịst bụ́ okenye na nna, nke na-azụlite ụmụ nwoke atọ na ụmụ nwanyị atọ, na-asị: “N’Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị na-eji nnọọ nwayọọ dị ka ọ pụrụ ikwe mee nye ịdọ aka ná ntị dị mkpa. Obere inutụ aka ma ọ bụ inwù anya n’ụzọ ịdọ aka ná ntị na-ezukarị. Ọ bụrụ na a chọkwuo ịdọ aka ná ntị ka sie ike, anyị ga-enye ya ná nzuzo n’ụlọ anyị nakwa pụọ n’ebe ụmụaka ndị ọzọ nọ. Ugbu a ụmụaka a mere okenye karị, ịdọ aka ná ntị na-agụnye inye onye nke ọ bụla ndụmọdụ ịhụnanya, na nke amamihe sitere n’Okwu Chineke dị ka mkpa ha si dị n’otu n’otu. Anyị na-anwa ịnọgide na-eme ihe na nzuzo n’okwu onwe onye ndị a, si otú a na-egosi nsọpụrụ maka ikike nwa nke ọ bụla nwere izochi ihe ụfọdụ na inwe ùgwù.”

A gaghị eleghara anya mkpa e nwere maka àgwà ọma n’okwu na n’omume n’ime ezinụlọ. Mkpachi anya ekwesịghị ịkachapụ okwu ndị dị ka “biko,” “i meela,” “ewela iwe,” na “ndo.” Àgwà ọma dị mkpa ma na mmadụ ịnọgide na-enwe ùgwù ya ma n’ịsọpụrụ nke ndị ọzọ.

N’ọgbakọ Ndị Kraịst

“Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike,” ka Jisọs sịrị. (Matiu 11:28) A dọọrọ ndị e wedara n’ala, ndị dara mbà n’obi, ọbụna obere ụmụaka n’ụzọ a na-apụghị iguzogide eguzogide gaa n’ebe Jisọs nọ. Ndị ụkọchukwu na ndị ndú nke oge ahụ bụ́ ndị mpako na ndị na-eme ezi omume n’anya nke onwe ha lelịrị ha. Ma n’ebe Jisọs nọ ha hụtara onye nyere ha ùgwù ruuru ha.

N’iṅomi Jisọs, anyị kwesịkwara ịbụrụ ndị kwere ekwe ibe anyị isi iyi nke izu ike. Nke a na-apụta ịchọ ohere iji wulie ha elu site n’okwu anyị na n’omume anyị. Ọ na-ekwesị ekwesị mgbe nile iji ezi obi na-ekwupụta okwu obiọma na nke ziri ezi n’ụba ná mkparịta ụka anyị. (Ndị Rom 1:11, 12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:11) Anyị na-egosi na anyị na-echebara mmetụta ndị ọzọ echiche site n’ịkpachara anya n’ihe ndị anyị na-ekwu nakwa otú anyị si ekwu ha. (Ndị Kọlọsi 4:6) Ejiji na akparamàgwà kwesịrị ekwesị ná nzukọ ndị Kraịst na-egosipụtakwa nsọpụrụ miri emi maka ùgwù nke Chineke anyị, ofufe ya, na ndị ofufe ibe anyị.

Jisọs sọpụụrụ ùgwù ụmụ mmadụ ọbụna mgbe ọ na-ejere ha ozi. Ọ dịghị mgbe o buliri onwe ya elu site n’imechu ndị ọzọ ihu ma ọ bụ site n’iweda ha n’ala. Mgbe otu onye ekpenta bịakwutere ya na-achọ ọgwụgwọ, Jisọs achụpụghị nwoke ahụ dị ka onye na-adịghị ọcha na onye na-abaghị uru, o meghịkwa ka a hụ ya site n’ịdọrọ uche gaa n’ebe ya onwe ya nọ. Kama nke ahụ, mgbe onye ekpenta ahụ rịọrọ Jisọs, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na Ị na-achọ, Ị pụrụ ime ka m dị ọcha,” Ọ kwanyeere onye ekpenta ahụ ùgwù site n’ịsị, “Ana m achọ.” (Luk 5:12, 13) Lee otú o si magbuo onwe ya nye anyị ọ bụghị nanị inyere ndị nọ ná mkpa aka kamakwa imesi ha obi ike na ha abụghị ibu arọ kama na a chọrọ ha ma hụ ha n’anya! N’ụwa a na-elegharakarị ndị na-eme ihere, ndị dara mbà n’obi, na ndị nwere nkwarụ anya, na-ezere ha, ma ọ bụ na-eweda ha n’ala. Ma ha kwesịrị ịchọta ezi mkpakọrịta na nnabata mgbe ha nọ n’etiti ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ha bụ́ ndị Kraịst. Anyị aghaghị ime ókè anyị iji tụnye ụtụ na mmụọ nke a.

Jisọs hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya dị ka “ndị nke aka Ya” ma ‘hụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ’ n’agbanyeghị adịghị ike na ụdị mmadụ ha bụ. (Jọn 13:1) Ọ hụrụ n’ime ha obi dị ọcha na nsọpụrụ sitere ná mkpụrụ obi ha dum nye Nna ya. N’otu aka ahụ, anyị ekwesịghị ma ọlị iche na ndị ofufe ibe anyị nwere ajọ ebumnuche nanị n’ihi na ha nwere ike ghara ime ihe n’ụzọ anyị si eme ma ọ bụ n’ihi na àgwà ma ọ bụ ụdị mmadụ ha bụ pụrụ ịkpasu anyị iwe. Nsọpụrụ maka ùgwù ụmụnna anyị ga-akwali anyị ịhụ ha n’anya ma nakwere ha otú ha dị, na-enwe ntụkwasị obi na ha hụkwara Jehova n’anya ma na-ejere ya ozi site n’ebumnobi dị ọcha.—1 Pita 4:8-10.

Ndị okenye, karịsịa, kwesịrị ilezi anya ka ha ghara ịkpatara ndị e nyefere ha n’aka ilekọta nchegbu. (1 Pita 5:2, 3) Mgbe ha na onye nọ n’ọgbakọ nke dabaworo ná mmehie na-enwe nnọkọ, ọ ga-adị mma ka ndị okenye jiri obiọma na nchebara echiche mee ka okwu ha dị nro ma zere ịjụ ajụjụ ndị na-emechu ihu n’ụzọ na-adịghị mkpa. (Ndị Galatia 6:1) Ọbụna mgbe ịdọ aka ná ntị siri ike ma ọ bụ ahụhụ kwesịrị ekwesị, ha ga-anọgide na-asọpụrụ ùgwù ruuru onye ahụ mere ihe ọjọọ.—1 Timoti 5:1, 2.

Ịnọgide Na-enwe Ùgwù Onwe Onye

N’ịbụ ndị e kere n’onyinyo na n’ọdịdị nke Chineke, anyị ga-egosipụta, ruo n’ókè o kwere mee, àgwà Chineke ndị magburu onwe ha—gụnyere ùgwù ya—ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. (Jenesis 1:26) N’ụzọ yiri nke ahụ, echiche dị n’iwu ahụ bụ́ ‘hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị’ bụ mkpa ọ dị inwe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi nke ùgwù na nsọpụrụ onwe onye. (Matiu 22:39) Eziokwu bụ na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndị ọzọ na-asọpụrụ anyị ma na-akwanyere anyị ùgwù, anyị aghaghị igosipụta na anyị kwesịrị ịnata ya.

Otu ihe dị mkpa iji nọgide na-enwe nsọpụrụ na ùgwù onwe onye bụ ịnọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha. Akọ na uche e merụrụ emerụ na mmekpa ahụ nke obi amamikpe na-eduje n’ụzọ dị mfe ná mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị uru, nkụda mmụọ, na ịda mbà n’obi. Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ emewo oké ihe ọjọọ, o kwesịrị iwere nzọụkwụ ndị dị ngwa iji chegharịa ma chọọ enyemaka ime mmụọ nke ndị okenye iji wee nweta “oge inwe ume ndụ . . . n’ihu Onyenwe anyị.” A gụnyere mweghachi nke ùgwù na nsọpụrụ onwe onye nke mmadụ n’inwe ume ndụ ahụ.—Ọrụ 3:19.

Ma ọ ka mma ime mgbalị mgbe nile iji chekwaa akọ na uche anyị e ji Bible zụọ, ghara ikwe ka ihe ọ bụla tụpọọ ma ọ bụ belata ikike ya. Inwe njide onwe onye n’akụkụ nile nke ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị—iri ihe, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, achụmnta ego, ntụrụndụ, mmekọrịta nke anyị na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị—ga-enyere anyị aka inwe akọ na uche dị ọcha ma mee ka o kwe anyị omume igosipụta otuto na ùgwù nke Chineke ná ndụ anyị.—1 Ndị Kọrint 10:31.

Gịnị ma ọ bụrụ na obi amamikpe sitere n’ihie ụzọ anyị ajụ ịkụjụ? Ma ọ bụ gịnị ma ọ bụrụ na ncheta mmadụ nke mmetọ e metọrọ ya anọgide na-afụ ụfụ? Ihe ndị a pụrụ ịzọpịa ùgwù onwe onye anyị ma weta oké ịda mbà n’obi. Lee otú okwu Eze Devid a na-achọta n’Abụ Ọma 34:18 si na-akasi obi: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha”! Jehova dị njikere ma na-achọ ịkwagide ndị ohu ya mgbe ha na-aghaghị ịnagide ịda mbà n’obi na mmetụta nke ịbụ ndị na-abaghị uru. Ịrịọ ya arịrịọ tinyere ịchọ enyemaka nke ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, dị ka nne na nna bụ́ ndị Kraịst, ndị okenye, na ndị ọzọ tozuru okè n’ọgbakọ, bụ ụzọ a pụrụ isi nwetaghachi nsọpụrụ na ùgwù onwe onye.—Jemes 5:13-15.

N’aka nke ọzọ, ọ dị anyị mkpa ịnọ na nche megide isi n’ùgwù onwe onye gafere ná mpako. Ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ bụ ‘ịghara ịtụkwasị uche n’onwe onye karịa ka e kwesịrị ịtụkwasị uche; kama ịtụkwasị uche n’inwe uche zuru okè, dị ka Chineke kere ọ̀tụ̀tụ̀ nke okwukwe nye mmadụ nile n’otu n’otu.’ (Ndị Rom 12:3) Ọ bụ ezie na o kwesịrị ekwesị ịzụlite nsọpụrụ onwe onye, anyị ekwesịghị ime onwe anyị ka a ga-asị na anyị bara uru gabiga ókè ma ọ bụ na-eche na ùgwù mmadụ bụ mgbalị onwe onye nanị na nke gabigara ókè ụfọdụ na-eme iji zọrọ ihu n’ebe ndị ọzọ nọ.

Ee, nsọpụrụ maka ùgwù onye ọzọ bụ ihe a chọrọ n’aka onye Kraịst. Ndị òtù ezinụlọ anyị na ndị Kraịst ibe anyị ruru eru ma kwesị ịnata ùgwù, nsọpụrụ, na mbuli elu anyị. Jehova enyewo onye nke ọ bụla n’ime anyị ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ùgwù na nsọpụrụ ndị anyị kwesịrị igosi ekele maka ha ma nọgide na-enwe. Ma n’elu ihe nile, anyị aghaghị ịzụlite nsọpụrụ ofufe miri emi maka ùgwù na ebube nke Nna eluigwe anyị, bụ́ Jehova Chineke.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị ntorobịa pụrụ igosi nsọpụrụ maka ndị nwere nkwarụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya