Nzukọ Ndị Isi nke Okpukpe Nile nke Ụwa Ọ̀ Ga-enwe Ihe Ịga nke Ọma?
ỌTỤTỤ narị ndị ndú okpukpe gbakọrọ na nke abụọ nke Nzukọ Ndị Isi nke Okpukpe Nile nke Ụwa na Chicago, Illinois, U.S.A., n’oge ọkọchị nke 1993. A nọchitechara anya okpukpe Buddha, Krisendọm, Hindu, ndị Juu, na Alakụba. Ndị amoosu na ndị na-efe chi nwanyị dị iche iche nọkwa ya. Ha tụlere òkè ha nwere ikere n’iweta ngwụsị nke agha. Onye isi oche nzukọ ndị isi ahụ kwuru na “ụzọ abụọ n’ime atọ nke esemokwu ndị bụ isi n’ụwa taa metụtasịrị okpukpe.”
Otu Narị Afọ Gara Aga
Nzukọ ndị isi ahụ ò nwere ihe ịga nke ọma? Lee anya n’ihe mere n’otu narị afọ gara aga na nke mbụ nke Nzukọ Ndị Isi nke Okpukpe Nile nke Ụwa. E mekwara ya na Chicago, n’oge ọkọchị nke 1893, a nọchitekwara anya 40 okpukpe dị iche iche. Kansụl ahụ maka Nzukọ Ndị Isi nke Okpukpe Nile nke Ụwa kwetara na ndị bịara na 1893 “kwenyere na ọ ga-abụ nke mbụ n’usoro mgbakọ mba nile nke ngwakọ okpukpe dị iche iche nke ga-enye aka maka nghọta, udo na ọganihu. Ọ dabaghị otú ahụ. Ekweghị ibe nọrọ na ime ihe ike nke okpukpe abụwo akụkụ nke agha ndị a lụworo na 100 afọ gara aga, ọ nọgidekwara na-abụ taa.” Gịnị kpatara ọdịda ahụ? N’ihi na Chineke akwadoghị echiche dum nke ngwakọrịta okpukpe. Bible na-asị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu.”—2 Ndị Kọrint 6:14-17.
N’ụzọ kwesịrị ekwesị, mbipụta September 1893 nke Zion’s Watch Tower kọwapụtara ụkọ nke nkwado Akwụkwọ Nsọ maka Nzukọ Ndị Isi nke Okpukpe Nile nke Ụwa mgbe ọ sịrị, sitekwa n’ịkwa emo: “Ha egwupụtawo ọtụtụ mkpọ ndị na-akpali oké mmasị bụ́ ndị e ji ájá ụrọ kpụọ ma ṅakpọọ ha n’ọkụ site ná mkpọmkpọ ihe nile nke Babilọn na obodo oge ochie ndị ọzọ, ma e nwere ụfọdụ a na-achọtabeghị. . . . Ha achọtabeghị nke ọ bụla na-ekwu banyere Mosis na Joshua ịkpọkọ ‘Nzukọ Ndị Isi nke Okpukpe Nile,’ nke ndị Moab na ndị Amọn, na ndị Edọm . . . Ha achọtabeghị nke ọ bụla na-ekwu banyere Samuel gbasiri ike bụ́ onye meworo agadi, ka o zigara ozi na Gat na Ekrọn ka e zite ndị nnọchite anya nke ndị nchụàjà Dagọn ka ha bịa Shaịlo ma soro ndị nchụàjà Jehova nwee nzukọ . . . Ha achọtabeghị nke ọ bụla na-ekwu banyere Elaịja kere ekike akpụkpọ anụ n’úkwù ka o mere atụmatụ ‘nzukọ ezumezu’ nke ya na ndị nchụàjà Beal na Molek maka nkwurịta okwu otu izu banyere ụkpụrụ nke okpukpe ha dị iche iche, na-eburu n’uche ịkwalite nkwanyerịta ùgwù maka okpukpe ibe ha.”
Alaeze Chineke—Olileanya E Nwere Nanị Ya
Nzukọ Ndị Isi nke Okpukpe Nile nke Ụwa ahụ agaghị enwe ihe ịga nke ọma. Akwụkwọ akụkọ dị iche iche na ndị gara ya ji okwu ndị dị ka “adịghị n’usoro,” “mkpaghasị,” na “oké ọgba aghara,” mee ihe banyere nzukọ ndị isi ahụ. Dị ka otu akụkọ na-ekwu, ọbụna ndị uwe ojii tinyere aka n’ime ka esemokwu abụọ ndị nkewa ndọrọ ndọrọ ọchịchị kpatara, dajụọ. N’otu akwụkwọ e dere na 1952, nzukọ ndị isi ahụ depụtara dị ka otu n’ime nzube ya dị iche iche, sị: “Iguzobe Nzukọ Ụwa nke Ndị Isi Okpukpe bụ́ nke na-adịgide adịgide iso òtù UNITED NATIONS na-arụkọ ọrụ n’inweta udo ụwa na nghọta n’etiti ndị nile.” N’ụzọ megidere nke ahụ, Jisọs kwuru na Alaeze ya agaghị esite n’ụwa. Bible na-ezo aka n’Alaeze Chineke dị ka ihe ngwọta e nwere nanị ya maka nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Daniel 2:44; Jọn 18:36.