Ịsọ Mpi Ọ̀ Bụ Ụzọ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma?
“IMERI abụghị ihe dị mkpa, ọ bụ ihe kasị mkpa.” Taa ọtụtụ ndị na-ebi ndụ kwekọrọ n’okwu ndị ahụ, ndị a na-asịkarị na ọ bụ onye America na-azụ ndị na-agba bọl bụ́ Vince Lombardi kwuru. Ugbu a, mba ndị bụbu nke Kọmunist esonyewo n’ịkwado ụkpụrụ nke ịsọ mpi. Iwebata ịsọ mpi n’ọma ahịa ka a na-asị na ọ bụ ihe na-emeghe ụzọ ịba ọgaranya. N’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ọtụtụ ndị nne na nna na-eme ka ụmụ ha na ndị ọzọ na-asọrịta mpi ma na-eziga ha n’ụlọ akwụkwọ nwa oge bụ́ ndị na-akụziri ha ụzọ dị nkọ isi gafere n’ule e ji abanye n’ụlọ akwụkwọ ka elu. Ndị nne na nna nke a riri isi kwenyesiri ike na ịbanye n’ụlọ akwụkwọ ndị ukwu bụ ụzọ isi baa ọgaranya n’ọdịnihu.
Ọtụtụ kwenyesiri ike na ịsọ mpi bụ ụzọ isi nwee ihe ịga nke ọma. Dị ka nkwenye ha si dị, ụmụ mmadụ agawo n’ihu site n’ịsọrịta mpi. “Ịsọ mpi maka mbugo n’ọkwá bụ isi iyi nke ume ụlọ ọrụ dị iche iche nke Japan,” ka 65.9 pasent nke ndị isi ụlọ ọrụ ndị bụ isi kwuru, bụ́ ndị ụlọ ọrụ Federation of Economic Organizations nke Japan nyochara. Ọ na-eyikwa ka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Japan hà na-aga nke ọma ruo ugbu a. Otú ọ dị, ịsọ mpi ọ̀ bụ n’ezie ụzọ isi nwee ihe ịga nke ọma?
Ọ̀ Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ n’Ezie?
Ndị na-eso ndị ọzọ asọrịta mpi na-egosipụta mmụọ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, àgwà ibute ndị ọzọ ụzọ. Ọ na-atọ ha ụtọ mgbe ihe na-agazighịrị ndị ọzọ, na-eche na ọ ga-emezi ka e lekwuo ha anya ọma. Maka uru ọdịmma onwe onye nanị ha, ha pụrụ iji ụzọ ndị na-emerụ ndị ọzọ ahụ mee ihe. Na gịnị ka nchụso dị otú ahụ nke ihe ịga nke ọma site n’ịsọ mpi na-eduba? Yasuo, onye mikpuru onwe ya ná mgbalị ịbụ onye dị mkpa n’ụlọ ọrụ ya, na-echetaghachi ụzọ ọ gbasoro n’oge ochie ma sị: “Ebe obi m jupụtara ná mmụọ ịsọ mpi na echiche ịgbago n’ọkwá, eji m onwe m tụnyere ndị ọzọ ma nwee mmetụta nke ịka ha. Mgbe e tinyere ndị ahụ n’ọkwá ka nke m, m ga ewe iwe na-emekwa ntamu kwa ụbọchị banyere ndị na-ahụ maka ndị ọrụ ụlọ ọrụ ahụ. Enweghị m ezi ndị enyi n’ezie.”
Mmụọ ịsọ mpi pụkwara iduba n’ọnwụ nnwụchu. N’ụzọ dị aṅaa? Akwụkwọ akụkọ ndị Japan bụ́ Mainichi Daily News na-ejikọ karoshi, ma ọ bụ ọnwụ site n’ịrụbiga ọrụ ókè, na akparamagwa nke type A. Type A na-akọwa usoro akparamagwa nke na-anagide nrụgide site n’ịdị ngwa nke oge, nsọrịta mpi, na ibu iro. Ndị America bụ́ ndị ọkà n’ihe banyere obi bụ́ Friedman na Rosenman na-ejikọ akparamagwa type A na ọrịa akwara coronary nke obi. Ee, mmụọ ịsọ mpi pụrụ iweta ọnwụ.
Ịsọ mpi n’ụlọ ọrụ pụkwara iduga ná nsogbu ndị ọzọ nke anụ ahụ na nke uche. Otu ihe atụ bụ Keinosuke, onye bụ onye isi ndị na-azụrụ otu ụlọ ọrụ ukwu na-ere ụgbọ ala na Japan, ahịa. O guzobere ihe ndekọ nke ire ngụkọta nke 1,250 ụgbọ ala. E wuuru foto ya ọbọ ma kowe ya n’ọnụ ụlọ ebe òtù ndị ntụzi na-enwe nzukọ n’isi ụlọ ọrụ nke ụlọ ọrụ ahụ. Ọ bụ ezie na ọ kpọrọ iji ndị ọrụ ibe ya eme ihe mgbakwasị ụkwụ iji nweta mbugo n’ọkwá asị nke ukwuu, ụlọ ọrụ ahụ kwanyere ya n’ịsọ mpi. N’ihi ya, n’otu afọ ọ rịara ọnyá akpa afọ na nke mmalite eriri afọ. N’otu afọ ahụ, e nyere ndị isi ọrụ 15 n’ụlọ ọrụ ya àkwà n’ụlọ ọgwụ, otu gbukwara onwe ya.
N’ụlọ, àgwà ịchọ ịdị ka ibe na-akwanye ndị mmadụ n’ime ngosi nke ihe ha ji ebi ndụ n’ụzọ ịma aka n’enweghị njedebe. (1 Jọn 2:16) Nke a na-abara nanị usoro azụmahịa uru, na-etinye ego n’aka ndị eze ahịa nke ụwa.—Tụlee Mkpughe 18:11.
Ọ bụ ezie na mmụọ ịma aka na ịsọ mpi pụrụ ime ka a rụzie ọrụ, ọ bụghị ihe ijuanya na Eze Solomọn kwupụtara, sị: “Mụ onwe m wee hụ ndọgbu nile mmadụ na-adọgbu onwe ha n’ọrụ, ya na ọrụ nile na-agazi agazi, na ọ bụ n’ihi nke a ka mmadụ ga-abụ onye mmadụ ibe ya ga-ekwoso ekworo. Nke a bụkwa ihe efu na ịchọ ijide ifufe.” (Eklisiastis 4:4) Ya mere olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe udo nke uche mgbe anyị na-ebi n’etiti ọha mmadụ na-asọrịta mpi? Iji chọpụta, ka anyị buru ụzọ hụ ebe echiche nke ịsọ mpi malitere.