Udo nke Uche n’Ọha Mmadụ nke Na-asọrịta Mpi
“ỌBỤRỤ na onye ọ bụla na-achọ ka ọ bụrụ onye isi,” ka Jisọs Kraịst dụrụ ndị ozi ya ọdụ, “ọ ga-abụ onye ikpeazụ n’etiti unu nile, na onye na-ejere unu nile ozi.” Ndị ozi ahụ na-arụ ụka banyere onye ka ukwuu n’etiti ha. Ha matara na Jisọs kpọrọ mmụọ dị otú ahụ asị. Ọ dịghị mgbe o mere ka ndị na-eso ụzọ ya na-amarịta ibe ha aka dị ka ụzọ isi kwalite ọganihu ime mmụọ.—Mak 9:33-37.
Tupu ọ na-abịa n’ụwa, Jisọs Kraịst keere òkè n’okike nke di na nwunye mbụ, ọ makwaara otú e si mee ha. (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) E kenyere mmadụ mbụ ndị ahụ ikike inwe ọganihu n’abụghị site ná nsọrịta mpi obi ọjọọ. Ọ dịghị ndị mmadụ mkpa ịlụso onwe ha ọgụ iji mata onye bụ isi ha, ha na ụmụ anụ asọghịkwa mpi n’ịgba mgba maka nlanarị.—Jenesis 1:26; 2:20-24; 1 Ndị Kọrint 11:3.
Mmalite nke Mmụọ Ịsọ Mpi
Mgbe ahụ, olee otú mmụọ ịsọ mpi nke ajọ obi si ghọọ ike dị ukwuu n’etiti ọha mmadụ? Oge mbụ e gburu mmadụ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ na-enyetụ nkọwa. Mmụọ ịsọ mpi n’akụkụ nke Ken, nwa mbụ nke di na nwunye mbụ bụ mmadụ, dubara n’ihe ọghọm ahụ. Ken gburu nwanne ya nwoke bụ́ Ebel n’ihi na àjà Ebel tọrọ Chineke ụtọ, ebe nke Ken na-atọghị ya. Bible na-ekwukwa na Ken “si n’ajọ onye ahụ pụta, wee gbuo nwanne ya.”—1 Jọn 3:12; Jenesis 4:4-8.
Ee, ajọ onye ahụ, bụ́ Setan Ekwensu, bụ onye mmalite na onye nkwalite nke mmụọ ịsọ mpi. Ọ bụ ezie na ọ bụ nwa bụ mmụọ ozi nke Chineke nke nwere ihe ùgwù ndị dị elu, ọ chọrọ ihe karịrị nke ahụ. (Tụlee Ezikiel 28:14, 15.) Mgbe ọ rafuru Iv, o kpughere ọchịchọ nke onwe ya. Ọ sịrị na site n’iri mkpụrụ ahụ a machibidoro iwu, ọ ‘gaje ịdị ka Chineke.’ (Jenesis 3:4, 5) N’ezie, ọ bụ Setan bụ onye chọrọ ịdị ka Chineke, na-ama Jehova aka. Mmụọ ịsọ mpi megide Chineke nubara ya ná nnupụisi.—Jemes 1:14, 15.
Mmụọ nke a na-efe efe. N’okpuru ike Setan, udo Chineke nyere nke ndokwa ezinụlọ mbụ ahụ nwere furu. (Jenesis 3:6, 16) Kemgbe nnupụisi ya megide Chineke, Setan Ekwensu achịwo ihe a kpọrọ mmadụ, na-emesiwanye mmụọ nke ịsọ mpi ike, ọbụna na-aghọgbu ndị ikom na ndị inyom gaa n’ikwere na ịsọ mpi obi ọjọọ bụ ụzọ isi nwee ihe ịga nke ọma. Ma Bible na-akọwa, sị: “Ebe ekworo na ịkpa iche iche dị, be ahụ ka ịgba aghara na omume nile ọ bụla nke na-adịghị mma dị.” (Jemes 3:14-16) Setan esiwo otú a napụ mmadụ obi uto na udo nke uche ya.
Ihe Ịga nke Ọma n’Asọghị Mpi
N’ụzọ megidere echiche Setan, Bible na-enye ihe atụ ụfọdụ nke ihe ịga nke ọma n’abụghị site n’ịsọ mpi. Nke kasị pụta ìhè bụ nke Jisọs Kraịst. Ọ bụ ezie na ọ dịrịị n’ụdị Chineke, ọ dịghị mgbe o chere banyere ịha ka Chineke kama o weere ụdị nke ohu wee bịa n’ụwa. Karịa nke ahụ, o weturu onwe ya ala ma rube isi ọbụna ruo ọnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ. Àgwà nrubeisi nke a, nke mmụọ ịma aka na-adịghi ya ma ọlị, dubara na ya irite ihu ọma Chineke. “N’ihi nke a Chineke welikwara Ya elu nke ukwuu, werekwa amara nye Ya aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu.” (Ndị Filipaị 2:5-9) Olee ihe ịga nke ọma karịrị nke a nke ihe ọ bụla e kere eke pụrụ inweta? O mere ihe na-atọ Nna ya ụtọ ruo n’ókè nke ọ na-adịghị ihe e kere eke ọzọ pụrụ, nke a ka o mekwara n’enweghị mmụọ ịma aka ma ọ bụ ịsọ mpi ọ bụla.—Ilu 27:11.
Ọtụtụ ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi n’eluigwe na-egosipụta otu àgwà nke a. Ọ bụ ezie na Jisọs, onye bụ onye isi ndị mmụọ ozi, ghọrọ onye dị ala nke nta karịa ha mgbe ọ bịara n’ụwa, ha ji ọchịchọ obi ha jee ozi maka mkpa ya. N’ụzọ doro anya, ha enweghị echiche ọ bụla nke iji ọnọdụ ahụ mee ihe na ịnwa ịnọchi ya dị ka Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi nke batara ha n’uche.—Matiu 4:11; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:16; Ndị Hibru 2:7.
Asị ha kpọrọ àgwà ịsọ mpi ọbụna na-apụtakwu ìhè mgbe anyị tụlere ụzọ ha siworo zaghachi ná nzube Chineke nke ibuli ụmụ mmadụ ụfọdụ na-ezughị okè gaa ná ndụ anwụghị anwụ nke ndị bụ mmụọ, ọnọdụ nke ha ga-anọ na ya ‘kpee ndị mmụọ ozi ikpe.’ (1 Ndị Kọrint 6:3) Ndị mmụọ ozi nwere ụba nke ahụmahụ n’ijere Jehova ozi, nweekwa ike ka nnọọ ukwuu iji rụzuo ihe ọma karịa ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ma, ndị mmụọ ozi ji obi ụtọ na-ejere ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa ozi, n’adịghị mgbe ha kworo ekworo nke ihe ndị a ga-anata. (Ndị Hibru 1:14) Àgwà ọma ha nke asọghị mpi na-enyere ha aka ịnọgide na-eje ozi n’ihu ocheeze nke Eze Onyenwe Anyị Jehova.
Ọzọ, chee echiche banyere ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie bụ́ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ bịa n’ụwa. Abraham bụ ihe atụ dị ịrịba ama nke okwukwe, a kpọkwara ya “nna nke ndị nile kwere.” (Ndị Rom 4:9, 11) Job setịpụrụ ihe nlereanya na-egbuke egbuke nke ntachi obi. (Jemes 5:11) Mosis, onye “dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala,” duuru mba Israel gaa ná nnwere onwe. (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Ònye n’etiti ụmụ mmadụ na-ezughị okè setịpụworo ihe nlereanya ka mma n’okwukwe, ntachi obi, na ịdị umeala n’obi karịa ndị ikom ndị a? Ma, ha kwụ n’ahịrị maka iketa akụkụ elu ala nke Alaeze Chineke. (Matiu 25:34; Ndị Hibru 11:13-16) Ha, dị ka Jọn Onye Na-eme Baptism, ga-anọ n’ọnọdụ dị ala karịa “onye dịkarịrị nta n’alaeze eluigwe.” (Matiu 11:11) Hà ga-echedi echiche ime mkpesa, na-agba isi akwara na okwukwe, ntachi obi, ma ọ bụ ịdị umeala n’obi ha hà ka ma ọ bụ n’ọnọdụ ụfọdụ karịa nke ndị e nyere ndụ n’eluigwe? E ji n’aka na ha agaghị eme ya! Ha ga-abụ ndị nwere obi ụtọ Alaeze Chineke na-achị n’elụ ụwa.
Taakwa, a na-enwe mmasị ịnọ ndị na-enweghị àgwà ịsọ mpi nso. Yasuo, nke e hotara n’isiokwu mbụ, mikpuru n’oké ụgwọ site n’iji atụmanya uru na-azụ ahịa ọlaedo wee tụfuo ihe nile o nwere. “Ndị enyi” ya hapụrụ ya. Ebe nwunye ya maliteworo iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, ọ gara nzukọ ha n’ihi mmetụta nke ịkwa ụta n’ihi nhụsianya ọ kpatawooro ezinụlọ ya. N’ikpeazụ, o wepụsịrị n’ime onwe ya nsọrịta mpi wee ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ugbu a o nwere obi ụtọ ịbụ onye ndị enyi bụ́ ndị Kraịst nọ gburugburu, bụ́ ụdị ndị dị njikere inyere ya aka n’oge ihe isi ike.
Ụzọ Isi Nọgide Na-enwe Udo nke Uche
Ọ naghị adị mfe mgbe nile ịnọgide na-enwe udo nke uche n’etiti ọha mmadụ na-adịghị eme ebere, nke ịsọ mpi. Ọ dị mma ka anyị rịba ama na Bible na-ekwugide “ibu iro, esemokwu, ekworo, ọnụma, ịkpa iche iche, nkewa, ịrọ òtù, ịkpọasị” dị ka “ọrụ nile nke anụ ahụ” nke na-egbochi ndị mmadụ iketa Alaeze Chineke. Ọrụ ndị a nile na mmụọ nke ịsọ mpi na-agakọ. Ka a sịkwa ihe mere Pọl onyeozi ji gbaa ndị Galetia ume, sị: “Ka anyị ghara ịghọ ndị na-achọ otuto efu, na-achọrịta ibe anyị okwu, na-akpọrịta ibe anyị asị.”—Ndị Galetia 5:19-21, 26.
N’ihe a na-ekwu n’ebe a, akwụkwọ ozi Pọl gosiri ụzọ e si eche ịsọ mpi nke ịchọ otuto efu ihu. Ọ sịrị: “Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè: ọ dịghị iwu na-emegide ihe nile dị otú a.” (Ndị Galetia 5:22, 23) Mkpụrụ nke mmụọ nsọ na-enyere anyị aka iwepụsị n’uche anyị ịma aka. Tụlee, dị ka ihe atụ, àgwà ahụ bụ ịhụnanya. “Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo,” ka Pọl na-akọwa. Ọ “dịghị anya isi, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị eme ihe na-adịghị mma n’anya, ọ dịghị achọ ihe nke aka ya, oké iwe adịghị ewe ya.” (1 Ndị Kọrint 13:4-7) Site n’ịzụlite ịhụnanya, anyị pụrụ ifopụsị ekworo, ike na-enuba mmadụ ná mmụọ nke ịsọ mpi. Mkpụrụ ndị ọzọ nke mmụọ nsọ na-enyekwara anyị aka ịsachapụ n’obi na n’uche anyị akụkụ ọ bụla fọrọ afọ nke mmụọ ịsọ mpi obi ọjọọ. Eenụ, site n’imeru ihe n’ókè a pụrụ ịbịada ngwa ngwa oké ọchịchọ ọ bụla na-ebilite ịsọ mpi megide ndị ọzọ iji merie n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu!—Ilu 17:27.
Otú ọ dị, iji zụlite àgwà ndị a, anyị aghaghị ikwere ka mmụọ Chineke rụọ ọrụ n’ahụ anyị. Anyị pụrụ ịkwado ọrụ nke a na-enye ahụ ike nke mmụọ nsọ site n’ịnọgidesi ike n’ekpere ma na-arịọ ka mmụọ Chineke nyere anyị aka. (Luk 11:13) N’azịza nye ekpere anyị, gịnị ka Chineke ga-enye anyị? Bible na-aza: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.
Nke a pụtara ìhè n’ọnọdụ ndị ozi Jisọs. Ọbụna mgbe Jisọs malitesịrị Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’abalị ikpeazụ ya na ndị ozi ahụ nọrọ, ha ka na-ese okwu n’enweghị isi banyere onye o yiri ka ọ bụ ya ka ukwuu. (Luk 22:24-27) Jisọs anwawo n’oge ndị ọzọ inyere ha aka ịgbazi echiche ha, ma àgwà ịsọ mpi nke a gbamiri mkpọrọgwụ n’ime ha. (Mak 9:34-37; 10:35-45; Jọn 13:12-17) Otú ọ dị, ozugbo ha natara mmụọ nsọ ahụ n’ihe dị ka 50 ụbọchị mgbe esemokwu ahụ gasịrị, àgwà ha gbanwere. E nweghị arụmụka ọ bụla banyere onye ga-anọchite anya ha n’ịgwa ìgwè mmadụ ahụ chọrọ ịmata ihe bụ́ ndị zukọrọ n’ụbọchị ahụ nke Pentikọst.—Ọrụ 2:14-21.
E nweghị ohere ọ bụla maka mmadụ ịchị ọgbakọ ndị Kraịst. Mgbe ọ dịrị ha mkpa idozi nsogbu banyere ibi úgwù, Jemes, onye na-abụghịdị onye na-eso ụzọ mgbe Jisọs nwụrụ, nọrọ n’isi oche ná nzukọ ahụ dị mkpa. E nweghị ihe àmà ọ bụla nke esemokwu banyere onye ga-ebute ụzọ ná nzukọ ahụ nke òtù na-achị isi nke ọgbakọ ndị Kraịst. Lee aha mgbanwe ọ bụ site na mgbe ndị ozi ahụ bụ ndị nwere ntụpọ nke mmụọ ịsọ mpi! Site n’enyemaka mmụọ nsọ, ha chetaghachiri nkụzi Jisọs ma malite ịghọta ihe ihe mmụta ya nile pụtara.—Jọn 14:26.
Otu ihe ahụ pụkwara ịbụ eziokwu n’ebe anyị nọ. Site n’enyemaka nke mmụọ nsọ, anyị pụrụ imeri ọchịchọ ọ bụla fọrọ afọ nke iso ndị ọzọ sọọ mpi iji were ha na-achụ àjà maka inwe ọganihu. Kama nke ahụ, anyị pụrụ inweta udo nke uche nke karịrị echiche uche nile. Bible na-eme ka o doo anyị anya na a ga-atụba isi iyi nke ịsọ mpi obi ọjọọ, Setan Ekwensu, n’abyss n’isi nso, mee ka ọ gharakwa ịrụ ọrụ. (Mkpughe 20:1-3) Ịma aka n’etiti ndị agbata obi agaghị adịkwa. Ihe ọ ga-arụpụta ọ̀ ga-abụ ọha mmadụ nke na-adịghi enwe ọganihu ọ bụla? Ọ dịghị ma ọlị! Ụmụ mmadụ ga-arịgoru izu okè, ọ bụghị site n’ịsọrịta mpi n’etiti onwe ha, kama site n’itinye àjà mgbapụta Jisọs n’ọrụ n’ebe ha nọ.—1 Jọn 2:1, 2.
Keinosuke, nke e hotara na mbụ, onye nweworo na mbụ ahụmahụ nke ebube nke ihe ịga nke ọma ụwa site n’ire ọnụ ọgụgụ ụgbọ ala dị ịrịba ama, rụkasịrị onwe ya n’ọrụ n’uche na n’anụ ahụ, ma o mesịrị hapụ ọrụ ya. “Ugbu a, ndụ m jupụtara n’ezi ọṅụ,” ka ọ na-ekwu. Ọ bịara hụ ihe mere ezi ihe ịga nke ọma ji kaa ndụ Jisọs akara. Ọ na-enweta ugbu a ume ndụ n’ihe ọ bụla ọ pụrụ n’ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke Chineke. E si otú a na-akwadebe ya maka ụwa ọhụrụ ahụ, nke ịsọ mpi na-agaghị adị ya. Gị onwe gị kwa pụrụ ịnụ ụtọ nke a bu ụzọ nke ọha mmadụ nke ụwa ọhụrụ nke a site n’ileta otu n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè gị ma soro Ndịàmà Jehova kpakọrịta.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ọha ụmụ mmadụ n’ụwa ọhụrụ Chineke ga-enwe udo na mmekọ ihe ọnụ