Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 5/15 p. 4-6
  • Bible—Akwụkwọ nke A Ga-agụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bible—Akwụkwọ nke A Ga-agụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ka A Sịkwa Ihe Mere O Ji Lanarị!
  • Àgwà nke Ịgụ Bible
  • Na-agụ Ya Mgbe Nile
  • Irite Uru Site n’Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ọgụgụ Bible—Ihe Bara Uru Ma Na-atọ Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Na-enweta Obi Ụtọ n’Okwu Chineke
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 5/15 p. 4-6

Bible​—⁠Akwụkwọ nke A Ga-agụ

ỌDỊ mfe okwu ndị na-egosi ihe kasịnụ ịgwụnahụ mmadụ mgbe a na-ekwu banyere Bible. Ọ bụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu akwụkwọ a kasị na-ekesa n’akụkọ ihe mere eme nile. Bible bụ akwụkwọ kasị ochie, nke a kasị sụgharịa, nke a kasị na-ehota, nke kasị na-akpa ike, na nke a kasị akwanyere ùgwù. Ma eleghị anya ọ bụkwa nke kasị na-eweta arụmụka. Ọ bụkwa n’ezie akwụkwọ nke lanarịworo mmachibido iwu, osusu ọkụ, na ajọ mmegide kasịnụ. Otú ọ dị, n’ụzọ na-adịghị enye obi ụtọ, e nwere otu okwu na-egosi ihe kasịnụ nke a na-apụkwaghị iji mee ihe maka Bible. O yighị ka ọ ka bụkwa akwụkwọ a kasị na-agụ n’ụwa.

Ọ bụ ezie na ndị mmadụ pụrụ inwe ebe ha debere Bible n’ụlọ ha, ọtụtụ na-eche na ha ji ọrụ n’aka karị itinye oge n’ezie n’ịgụ ya. Ịgụ ihe nwere mgbe ọ bụ ihe e ji ezuru ike. Ma, ugbu a, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-ahọrọ iji oge ha nwere ohere na-ekiri telivishọn ma ọ bụ na-eme ihe ọzọ. Ndị ka na-agụtụ ihe na-ahọrọkarị ihe dị mfe ọgụgụ. Ịgụ Bible na-ewe ntinye uche n’ihe, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ adịkwaghị etinyemi uche n’ihe ha na-agụ.

Ma, Bible alanarịghị nanị iji bụrụ nke a hapụrụ ka ọ nọdụ n’elu ọ́bọ̀ akwụkwọ anyị. E nwere ezi ihe ndị mere e kwesịrị iji gụọ ya. Tụlee eziokwu ụfọdụ banyere ya.

Ka A Sịkwa Ihe Mere O Ji Lanarị!

Okwu ahụ bụ́ “Bible” sitere n’okwu Grik bụ́ bi·bliʹa, nke pụtara “akwụkwọ nta dị iche iche.” Nke a na-echetara anyị na akwụkwọ ole na ole mejupụtara Bible​—⁠ụfọdụ adịchaghị ntakịrị! E dere ha n’ogologo oge dị narị afọ iri na isii. Ọ bụ ezie na ọ bụ ụmụ mmadụ dere ha, e nyere ha mmụọ nsọ maka ya site n’Isi Iyi ka elu. Otu onye so dee Bible kwuru, sị: “Ọ dịghị amụma ọ bụla nke e ji ọchịchọ mmadụ buo mgbe ọ bụla: kama mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe Mmụọ Nsọ na-eme ka ha kwuo.” (2 Pita 1:21) Ihe bụ eziokwu banyere amụma Akwụkwọ Nsọ bụkwa eziokwu banyere akụkụ nile ọzọ nke Bible. “Akwụkwọ nta dị iche iche” ndị a sitere n’ike Chineke jupụtara n’echiche ndị e buliri elu nke Jehova Chineke. (Aịsaịa 55:9) Ka a sịkwa ihe mere Bible ji lanarị ogologo oge a nile!

Nye ndị na-ejere Chineke ozi, Bible abụwo mgbe nile akwụkwọ na-ebute ụzọ. Ha na-ekwenyere Pọl onyeozi, ya onwe ya bụkwa otu n’ime ndị dere Bible. Ọ sịrị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe.” (2 Timoti 3:16) N’ihi ya, Bible bụ ntọala nke okwukwe Ndịàmà Jehova taa. Ọ na-ekpebi ozizi ha nile ma na-achịkwa akparamagwa ha. Ha ji obi ha dum na-atụ aro ka onye ọ bụla na-agụ akụkụ ụfọdụ nke Okwu Chineke kwa ụbọchị ma jiri obi ekele tụgharịa uche n’ihe o kwuru.​—⁠Abụ Ọma 1:​1-⁠3.

Àgwà nke Ịgụ Bible

Àgwà nke ịgụ Akwụkwọ Nsọ abawo uru n’oge ndị gara aga. E nyere ndị eze Israel iwu ka ha jiri aka depụtaghachiri onwe ha Iwu ahụ​—⁠nke bụ akụkụ dị mkpa nke Bible⁠—​ma na-agụ ya kwa ụbọchị dị ka ihe ncheta mgbe nile nke uche Chineke maka ha. (Deuterọnọmi 17:​18-⁠20) Ịhapụ ime nke a kpatara ọdịda nke ọtụtụ ndị eze.

E mere ihe atụ nke abamuru nke ịgụ Akwụkwọ Nsọ n’ihe banyere onye amụma meworo agadi bụ́ Daniel. N’ihi ọmụmụ ihe onwe onye ya nke akụkụ Bible ndị e nwere n’ụbọchị ya, Daniel, mgbe ọ nọ ná ndọrọ n’agha na Babilọn, nwere ike ‘jiri akwụkwọ nile ghọta’ na otu amụma dị mkpa Jeremaịa dekọrọ na-achọ imezu.​—⁠Daniel 9:2.

N’oge a mụrụ Jisọs, nwoke ahụ bụ́ “onye ezi omume na onye na-atụ egwu Chineke” bụ́ Simeọn ji obi ike na-atụ anya ịhụ onye ahụ nke ga-abụ Kraịst ahụ, ma ọ bụ Mesaịa ahụ. E kwewo Simeọn nkwa na ọ gaghị anwụ tupu ọ hụ Kraịst. Ya izo aka n’amụma Aịsaịa mgbe o ku nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jisọs n’aka ya na-egosi na Simeọn bụ onye na-eji nlezianya agụ akwụkwọ dị iche iche nke Bible ndị e deworo n’ụbọchị ya.​—⁠Luk 2:​25-⁠32; Aịsaịa 42:6.

Mgbe Jọn Onye Na-eme Baptism na-eme nkwusa, “ndị Juu nọ na-ele anya” Mesaịa ahụ. Gịnị ka nke a na-egosi? Ọ na-atụ aro na ọtụtụ n’etiti ndị Juu maara nke ọma amụma ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị metụtara Mesaịa ahụ. (Luk 3:15) Nke a na-akpali mmasị, n’ihi na n’ụbọchị ndị ahụ ọ dịghị mfe inweta akwụkwọ ndị ahụ. A ghaghị iji oké ọrụ depụtagharịa akwụkwọ dị iche iche nke Bible, ha na-adịkwa oké ọnụ, na-esikwa ike n’otu aka ahụ inweta. Olee otú ndị mmadụ si mara nke ọma ihe ndị dị n’ime ha?

N’ọtụtụ ọnọdụ, site n’ịgụ ya n’ihu ọha. Dị ka ihe atụ, Mosis nyere iwu na n’oge ụfọdụ a kara aka, a ga-agụrụ mkpọkọta ndị Israel Iwu dum Chineke nyere. (Deuterọnọmi 31:​10-⁠13) Ka ọ na-eru narị afọ nke mbụ O.A., ọgụgụ akwụkwọ dị iche iche nke Bible gbasapụrụ agbasapụ. Jemes onye na-eso ụzọ rịbara ama, sị: “Mosis site n’ọgbọ mbụ nile nwere n’obodo dum ndị na-ekwusa ya, ebe a na-agụ ya n’ụlọ nzukọ nile ụbọchị izu ike dum.”​—⁠Ọrụ 15:21.

Taa, ọ dị mfe mmadụ inwe Bible nke aka ya. Ma ọ dịkarịa ala ụfọdụ n’ime “akwụkwọ nta dị iche iche” ndị a dị n’asụsụ nke 98 pasent ndị bi n’ụwa. Ya mere ọ dị mwute na ọtụtụ ndị enweghị mmasị ịchọpụta ihe Bible nwere ịgwa ha. Nke a pụrụ ịbụ ọgbọ nkà mmụta sayensị, Okwu Chineke, bụ́ Bible, n’ụzọ pụtara ìhè ka “bakwara uru iji zie ihe.” Ọ na-enye ndụmọdụ dị mma n’omume, mmekọrịta ụmụ mmadụ, na ọtụtụ isiokwu ndị ọzọ. Ọzọkwa, Bible na-enye olileanya e ji n’aka nke e nwere nanị ya maka ọdịnihu dị n’udo.

Na-agụ Ya Mgbe Nile

Ya mere Ndịàmà Jehova emewo ya akụkụ gbara ọkpụrụkpụ nke ọrụ ha ịgba ume ịgụ Bible mgbe nile. Ná mkpụrụ akwụkwọ ndị gbara okpotokpo n’elu ájá ebe obibi akwụkwọ n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile ha dị na Brooklyn, New York, ka e nwere okwu agbamume ahụ bụ́: “GỤỌ OKWU CHINEKE BỤ́ BIBLE NSỌ KWA ỤBỌCHỊ.” Ọtụtụ nde ndị na-agafenụ ahụwo okwu ndị a, e nwekwara olileanya na ọtụtụ aṅawo ha ntị.

N’ihe karịrị 73,000 ọgbakọ Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa, a na-enwe kwa izu nnọkọ dị iche iche nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Akụkụ nke usoro agụmakwụkwọ ahụ bụ ọgụgụ n’ihu ọha nke akụkụ a họpụtara ahọpụta nke Bible. Mmadụ nile na-ege ntị nwekwara ọrụ nke ịgụ isiakwụkwọ ole na ole nke Bible kwa izu n’ebe obibi nke aka ha. Ndị na-agbasochi usoro ihe omume nke a anya na-emesịa gụsịa Bible dum.

Ndokwa nke a kwekọrọ n’okwu nke otu n’ime akwụkwọ ọgụgụ ndị e ji eme ihe n’ụlọ akwụkwọ nke a. Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ Ije-ozi Ọchichi-Chineke na-asị: “Usoro ihe omume nke onwe gị kwesịrị ịgụnyekọ oge maka ọgụgụ Bible onwe ya. Uru dị ukwuu dị n’ịgụzu ya otu ihu site n’isi ruo n’ọdụdụ. Otú ọ dị, nzube gị ekwesịghị ịbụ mgbe ọ bụla nanị ka ị gụzuo ihe, kama ka ọ bụrụ ụzọ ile ihe anya ya zuru ezu site ná nzube nke icheta ya. Tinye oge n’ịtụgharị uche n’ihe ọ na-asị.”

Akwụkwọ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova na-ebipụta n’otu aka ahụ na-agba ume maka ọgụgụ Bible. Dị ka ihe atụ, agbamume na-esonụ pụtara na magazin ya na nke a na-agakọ, bụ́ Teta!, maka ndị na-eto eto: “Ị̀ gụwo . . . Bible gụchaa ya? Ee, Bible bụ akwụkwọ buru ibu, ma gịnị ma i kewasịa ọgụgụ ya gaa n’ùkwù ndị dị nta? . . . Ndị Beria ‘dị mma n’obi nyochara ihe nile e deworo n’Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị.’ (Ọrụ 17:11) Ọ bụrụ na ị gbasoo usoro ihe omume kwa ụbọchị nke ịgụ ihe nanị minit 15 kwa ụbọchị . . . , ị pụrụ ịgụzu Bible n’ime otu afọ.” Ee, Ndịàmà Jehova na-eche na ndị Kraịst nke oge a kwesịrị ịma Akwụkwọ Nsọ nke ọma, dị nnọọ ka ndị jeere Chineke ozi n’oge gboo.

N’iburu nke a n’uche, Ndịàmà akwalitewo ụdị nke narị afọ nke 20 nke ọgụgụ Bible n’ihu ọha. N’ọtụtụ asụsụ, ha emepụtawo kaseti nke a gụnyezuru Bible dum n’ime ya. Nye ọtụtụ ndị nke a aghọwo ihe enyemaka mara mma n’imeri ihe ụfọdụ na-egbochi ọgụgụ Bible. Ụfọdụ na-ege kaseti ndị a mgbe ha na-arụ ọrụ gburugburu ụlọ ha, na-anya ụgbọ ala ha, ma ọ bụ na-eme ụfọdụ ihe ndị ọzọ. Ịnọdụ ala ma nọrọ jụụ na-aṅa ntị n’ọgụgụ nke otu akụkụ nke Bible mgbe ị na-esonye na nke gị bụ ahụmahụ na-atọ ụtọ.

Ọ bụrụ na ị malitebeghị ịgụ Bible kwa ụbọchị, gịnị ma i mee ya àgwà gị ime otú ahụ? Ọ dịghị mkpa na nke a ga na-ewe ogologo oge kwa ụbọchị, ma abamuru ya nile dị ukwuu, n’ihi na itinye Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ga-enyere gị aka ime ihe n’amamihe ma nụ ụtọ nke ndụ na-enyeghachi ụgwọ ọrụ n’ụzọ ime mmụọ. Ị ga na-emekwa ihe kwekọrọ n’iwu nke a e nyere onye ndú ndị Israel bụ́ Joshua n’ogologo oge gara aga: “Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị, kama ị ga-atụgharị uche n’ime ya ehihie na abalị, ka i wee lezie anya ime dị ka ihe nile si dị nke e deworo n’ime ya: n’ihi na mgbe ahụ ị ga-eme ka ije gị gaa nke ọma, mgbe ahụ ị ga-enwekwa uche.”​—⁠Joshua 1:8.

Peji nile nke Bible na-ekpughe nzube ịhụnanya nke Jehova maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Ezi ihe ọmụma nke Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ na-arụpụta ezi obi ụtọ na olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’ụwa ọhụrụ dị ebube nke ngọzi na-adịghị agwụ agwụ. (Luk 23:43; 2 Pita 3:13) Ka i were ohere i nwere ịgụ na ịmụ Bible mee ihe ma ruo eru inweta ndụ nke a dị ebube.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya