Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 6/1 p. 24
  • Chineke Adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ichere Alaeze nke “Na-abụghị Akụkụ nke Ụwa A”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Obi Dị M Ụtọ na m Na-ejere Jehova Ozi n’Agbanyeghị Ule Ndị Bịaara M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Mmụọ Nsọ Dakwasịrị Kọnịliọs
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Jehova “Adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 6/1 p. 24

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Chineke Adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu

IHE karịrị 1,900 afọ gara aga, onyeozi bụ́ Pita gbaara ọchịagha bụ́ Kọniliọs àmà, na-asị: “N’ezie ana m aghọta na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:​34, 35) Kọniliọs gosipụtara egwu Chineke na ịhụnanya maka ezi omume. Ọ nakweere àmà Pita gbaara ya wee ghọọ onye Kraịst.

Otu ụkpụrụ ahụ ka bụkwa eziokwu taa​—⁠Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu. Anyị chọpụtara nke a site n’otu ahụmahụ sitere Germany. Akụkọ ahụ na-asị:

“N’ókèala ọgbakọ anyị, e nwere nnukwu ogige nke ndị agha nke mba Russia. Na 1989, n’oge na-adịghị anya ka Mgbidi Berlin dasịrị, ndị okenye jụrụ ma ọ̀ dị onye nkwusa ọ bụla maara asụ asụsụ Russian. Ụfoḍụ n’ime anyị maara, anyị jekwara ịrụ ọrụ n’ókèala a, nke ghọworo nnọọ ihe ọṅụ. Nke a na-esonụ bụ otu n’ime ọtụtụ ahụmahụ.

“Mụ na otu onye nkwusa a na-emebeghị baptism (nke mewororị baptism kemgbe) so mgbe anyị gwara otu ọchịagha okwu. Ọchịagha ahụ gere ntị n’ihe anyị nwere ikwu wee kpọọkwa anyị okù ịgwa ndị soja ya okwu. O kwuru na ha aghaghịkwa ịnụ banyere Chineke na Bible, ya mere anyị yiri oge ịlaghachite.

“Anyị rịọrọ otu nwanna nwanyị na asụ asụsụ Russian nke ọma ka o soro anyị jee dị ka onye ntụgharị okwu. N’ebe ezumezu nke ogige ndị agha ahụ, anyị guzobere table maka akwụkwọ nweekwa ike ịgwa 68 ndị soja okwu zaakwa ajụjụ ha dị iche iche. Mgbe nke ahụ gasịrị ha ji obi ụtọ nata 35 akwụkwọ na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100 magazin. Ka anyị hapụrụ ebe ezumezu ahụ, anyị hụrụ ìgwè nta dị iche iche ka ha na-ekwurịta banyere akwụkwọ ndị ahụ.

“Anyị yiri oge ilaghachi na July 4, 1992. Ka anyị bịarutere na 10:50 ụtụtụ, ndị nche nọ n’ọnụ ụzọ ama ogige ahụ gwara anyị na ndị soja ahụ na-atụ anya anyị. Otu onye isi agha kpọọrọ anyị banye n’ebe ezumezu ahụ, anyị chọpụtakwara na otu nwaada onye nataburu anyị akwụkwọ maka ebe ọgụgụ akwụkwọ ahụ amawo ọkwà ọbịbịa anyị site n’ịmapawa mpempe akwụkwọ dị iche iche n’ogige ahụ. Ụmụnna atọ kwuru okwu dị mkpirikpi banyere ọrụ anyị zuru ụwa ọnụ ma gosikwa ihe mere anyị pụrụ iji nwee obi ike na Bible. Mgbe ahụ anyị zara ajụjụ ndị sitere n’aka ndị na-ege ntị, na-enye azịza site na Bible. Otu n’ime ajụjụ ndị ahụ bụ, Gịnị bụ echiche Ndịàmà Jehova banyere ije ozi ndị agha, nakwa ma ọ̀ dị onye ọ bụla n’ime ha bụ onye soja? Nke a nyere onye ahụ na-emebeghị baptism mụ na ya so jee ná mbụ ohere ịkọwa ọrụ ya ruo 25 afọ n’òtù ndị agha nke East Germany, afọ ndị ikpeazụ dị ka kaptịn ndị agha ụgbọ elu. Ọ kọrọ otú o si mụta banyere Chineke na Bible wee chọọ ugbu a ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ihe ndị soja ahụ nụrụ masịrị ha. N’ime minit asaa, akwụkwọ nile anyị ji bịa nọ n’aka ndị soja ahụ, ọtụtụ chọkwara Bible. Anyị nwere ike inweta Bible asaa n’asụsụ Russian n’ụlọ ahịa na-ere akwụkwọ, nke ha nwere ekele inweta. Ọ bụ ezi ihe ọṅụ inye ndị a agụụ ime mmụọ na-agụ ihe ọmụma Bible, anyị na-enwekwa olileanya na ha ga-eji ya mee ihe.”

N’eziokwu, Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu. Site n’Okwu ya ọ na-akpọ ndị nwere obi eziokwu, onye ọ bụla na ebe ọ bụla ha pụrụ ịnọ. Ọ na-akpọ ha òkù ịbịa mụta banyere ya na Ọkpara ya, Jisọs Kraịst, ọtụtụ ndị sikwa n’ọnọdụ nile ná ndụ na-emekwa nke ahụ.​—⁠Jọn 17:3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya