Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 6/1 p. 19-23
  • Ha Setipụụrụ Anyị Ihe Nlereanya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Setipụụrụ Anyị Ihe Nlereanya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmụta Eziokwu Bible
  • Ịsụ Ụzọ n’Australia
  • A Kpọọ Anyị Òkù Ije Mba Ọzọ
  • Alụmdi na Nwunye, Mmachibido, na Agha
  • Ndụ n’Ogige Ịta Ahụhụ Dị Iche Iche
  • Nnwere Onwe na Njikọghachi Dị Ịrịba Ama
  • Ịlaghachi n’Australia
  • Jehova Nọnyeere M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ebe E Kenyere Anyị Ozi Ala Ọzọ Ghọrọ Obodo Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 6/1 p. 19-23

Ha Setipụụrụ Anyị Ihe Nlereanya

DỊ KA CRAIG ZANKER SI KỌỌ

Ruo afọ asatọ mụ na nwunye m bụ́ Gayle, bụ ndị ọsụ ụzọ, ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. N’afọ isii ndị ikpeazụ, anyị anọwo na-eje ozi n’etiti ndị Aborigine nke ime obodo ndị dịpụrụ adịpụ nke Australia. Ihe anyị na-eme bụ nanị ịgbaso ihe nlereanya nke ndị mụrụ m na nke ndị mụrụ nne m.

KA M kọọrọ gị karịsịa banyere ndị mụrụ nne m. Anyị ji ịhụnanya na-akpọ ha Opa na Oma, bụ ihe ndị Dutch na-akpọ nna ochie na nne ochie. Nna m ochie bụ́ Charles Harris, ka ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi na Melbourne, bụ ebe o biworo ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 50 afọ.

Ịmụta Eziokwu Bible

A mụrụ Opa ná ntakịrị obodo dị na Tasmania, bụ obodo agwaetiti nke Australia. Na 1924, mgbe ọ dị afọ 14, nna ya zụtara otu ihe ndebe ihe nke ndị na-anya ụgbọ mmiri ná mgbuka. N’ụzọ ime mmụọ, o mesịrị ghoọ n’ezie akụ dị óké ọnụ ahịa, n’ihi na o nwere n’ime ya ìgwè akwụkwọ nke onye isi oche mbụ nke Watch Tower Bible and Tract Society, bụ́ Charles Taze Russell dere.

O yiri ka nna Opa enwekebeghị mmasị n’akwụkwọ ndị ahụ, ma Opa malitere ịgụ ha, matakwa ozugbo na ha nwere eziokwu Bible ndị dị mkpa n’ime ha. Ya mere ọ malitere ịchọ Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile bụ́ ndị nnọchianya nke ndị bipụtara akwụkwọ ahụ, ndị a maara ugbu a dị ka Ndịàmà Jehova. Ọ chọrọ ịgwa ha okwu iji nwetakwuo nkọwa nke eziokwu Bible ndị ọ na-amụta.

Mgbe ọ jụsịrị ọtụtụ ajụjụ, ọ chọtara ụmụ nwanyị atọ meworo agadi ndị na-arụsi ọrụ ike n’ikụziri ndị ọzọ ihe. Ha nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ Charles ka na-eto eto. E mesịa, na 1930, ọ raara onwe ya nye Jehova Chineke, e meekwa ya baptism n’ime mmiri. Ọ gbara arụkwaghịm n’ọrụ ya dị ka onye na-egbu anụ wee gaa n’ebe ugwu na Sydney, ebe e kenyere ya ọrụ dị ka onye nkwusa ozi ọma oge nile.

Ịsụ Ụzọ n’Australia

N’ime afọ ole na ole n’ihu, ókèala ebe Charles na-eje ozi gụnyere ógbè Bondi nke Sydney nke didewere mmiri tinyekwara ime obodo ndị dị n’obodo nke New South Wales. E mesịa kenye ya ọrụ na Perth, Ọdịda Anyanwụ Australia, ọtụtụ puku kilomita gaa n’akụkụ nke ọzọ nke kọntinentị ahụ. Ruo ọnwa isii ọ gbara àmà n’ókèala azụmahịa nke Perth, mgbe ahụ, tinyere ndị ọsụ ụzọ abụọ ndị ọzọ, e kenyere ya ọrụ n’ebe ndị mmadụ na-ebichaghị nke akụkụ ugwu ebe ọdịda anyanwụ Australia.

Ebe e kenyere mmadụ atọ ndị a​—⁠Arthur Willis, George Rollsten, na Charles ọrụ ikwusa ozi ọma⁠—​bụ ókèala ha ka Itali okpukpu anọ! Ọnụ ọgụg̣ụ ndị bi ya ebughị ibu, ime ime obodo tọgbọkwa chakoo, okpomọkụ ya dịkwa ukwuu. Mgbe ụfọdụ ọ na-adị mkpa ije ihe karịrị 500 kilomita site n’otu ebe a na-azụ anụ ruo n’ọzọ, nke e ji ebe ọzụzụ ehi mara. Ike agwụwokwa ụgbọ ala ha na-eji eme ihe, ọbụna ma e jiri ya tụnyere ndị e nwere n’afọ ndị 1930, ma ha nwere okwukwe siri ike na mkpebisi ike dị ukwuu.

Ụzọ ájá uzuzu ahụ dị warara, nke okukoro jupụtara na ya bụ nke awara ụzọ ịnyịnya ibu kamel si aga gafere na ya nke ukwuu, n’ọtụtụ ebe kwa, uzuzu (nke a na-akpọ uzuzu ehi) na-ekpuchi ógwè osisi ndị dị ize ndụ. Ka a sịkwa ihe mere spring ụgbọ ala ahụ ji agbajikarị. Axle azụ ya gbakara ugbo abụọ, taya na-agbabikwa ọtụtụ ugboro. Ọtụtụ mgbe ndị ọsụ ụzọ ahụ na-ebekata mpekere taya ochie wee jiri bolt jikọta ya n’ime ime nke ndị dị adị iji nọgide na njem ha.

Mgbe m bụ obere nwa, ajụrụ m Opa ihe gbara ha ume ịnọgide na-aga n’ihu n’okpuru ọnọdụ ndị ahụ siri ike. Ọ kọwara na n’ebe ahụ ekewapụrụ n’ebe ndị mmadụ nọ, e nwere ịnọ Jehova nso. Ọ sịrị na mgbe ụfọdụ ihe ahụ bụ ihe isi ike anụ ahụ na-aghọ ngọzi ime mmụọ.

N’egosighị n’ụzọ ọ bụla echiche nke ịka ndị ọzọ elu, Opa gosipụtara ihe ijuanya na o yiri ka ọtụtụ mmadụ dị ukwuu hà na-echegbubiga onwe ha oké banyere ịkwakọba ihe onwunwe. O chetaghachiiri m na “ọ ka mma iji ntakịrị ihe onwunwe ruo n’òkè o kwere mee na-ebi ndụ. Ọ bụrụ na Jisọs dị njikere ihi ụra n’èzí mgbe ọ dị mkpa, mgbe ahụ anyị kwesịrị inwe obi ụtọ ime otú ahụ ma ọrụ anyị chọọ ya.” (Matiu 8:​19, 20) N’eziekwa, ya na ndị ibe ya mere otú ahụ.

A Kpọọ Anyị Òkù Ije Mba Ọzọ

Na 1935, Opa natara ọrụ ime nkwusa n’ebe ọhụrụ​—⁠ịgbara ndị bị n’agwaetiti nke South Pacific àmà. Tinyere ìgwè nke mmadụ isii ndị ọzọ, o ji ụgbọ mmiri nke Watch Tower Society dị 16 mita nke bụ́ Lightbearer, nupụ.

N’otu oge, ka ha nọ n’Osimri Coral nke ebe ugwu Australia, injin nke abụọ nke Lightbearer ahụ mebiri. E nweghị otu mkpụrụ ifufe na-efe, ya mere, ha tọrọ atọ ọtụtụ kilomita site n’ebe ala dị. N’agbanyeghị na ha nọ n’ihe ize ndụ nke ụgbọ ikpu n’Oke Nkume Mgbochi ahụ, ịdị jụụ nke dị ebe nile masịrị Opa. “Osimiri ahu yiri mmiri dọrọ otu ebe,” ka o deturu n’akwụkwọ o ji edetu ihe. “M gaghị echezọ ọdịda nke anyanwụ n’osimiri ahụ dị jụụ n’uhuruchi ọ bụla. Ọ mara nnọọ mma ikiri nke na apụghị m ichefu ya ma ọlị.”

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, tupu ha amalite inupụ nke nta nke nta gaa na nkume ahụ, ifufe malitere ife, ha wee jiri ákwà ifufe nke ụgbọ kwọrọ ụgbọ ahụ n’udo banye na Port Moresby, Papua New Guinea, bụ́ ebe a nọ doziere ha injin ụgbọ ahụ. Ha si Port Moresby gaa Thursday Island, sizie ebe ahụ gaa Java, bụ agwaetiti ukwu nke Indonesia. Opa zụlitere ịhụnanya dị omimi maka mba nke a nke a kọwaworo dị ka “ngakọta nke ọtụtụ pearl ndị gafere ebe ụwa kewara abụọ.” N’oge ahụ, Indonesia bụ ókèala nke ndị Netherlands na-achị, ya mere nna ochie mụtara ma asụsụ Dutch ma Indonesian. Otú ọ dị, akwụkwọ ndị ọ na-enyefe n’ọrụ nkwusa ya bụ n’asụsụ ise: Dutch, Indonesian, Chinese, Bekee, na Arabic.

Opa nwere nnọọ ihe ịga nke ọma n’inyefe akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Otu mgbe, a kpọrọ Clem Deschamp, bụ onye na-elekọta ebe ndọsa akwụkwọ nke Watch Tower dị na Batavia (nke bụ ugbu a Djakarta), n’ihu onye uwe ojii bụ́ onye Netherlands nke nọ na-eleru ọrụ nkwusa anyị anya. “Mmadụ ole ka unu nwere na-arụ ọrụ n’ebe ahụ na East Java?” ka onye uwe ojii ahụ jụrụ.

“Nanị otu,” ka Nwanna Deschamp zaghachiri.

“Ị̀ tụrụ anya na m ga-ekweta nke ahụ?” ka onye uwe ojii ahụ ji iwe kwuo. “Unu aghaghị inwe ìgwè ndị ọrụ ụfọdụ n’ebe ahụ, dị ka a pụrụ ịhụ site n’ọnụ ọgụgụ akwụkwọ unu a na-ekesa ebe nile!”

Opa na-eche na nke ahụ bụ otu n’ime okwu ịja mma kasịnụ ọ nụtụworo ná ndụ ya. Ma nke ahụ kwesịrị ya, ebe ọ bụ na ọ na-etinyekarị ihe nọ n’agbata 1,500 na 3,000 akwụkwọ kwa ọnwa.

Alụmdi na Nwunye, Mmachibido, na Agha

Na December 1938, Opa lụrụ otu nwa agbọghọ onye Indonesia aha ya bụ Wilhelmina, onye ghọrọ nne m ochie. Oma, ma ọ bụ nne m ochie, nwere obi ọma, dị nwayọọ, na-arụsị ọrụ ike, ọ na-ejikwa nwayọọ ekwu okwu. Amatara m, n’ihi na n’oge m bụ nwatakịrị ọ bụ enyi m kasị m nso.

Mgbe alụmdi na nwunye ha gasịrị, Opa na Oma nọgidekọrọ n’ije ozi ọsụ ụzọ ha. N’oge a, ìgwè ndị nke ọzọ Lightbearer agbasawo gaa n’akụkụ ụwa ndị ọzọ ma ọ bụ laghachi obodo ha. Ma Opa emeela Indonesia obodo ya, o kpebisikwara ike ịnọgide.

Ka Agha Ụwa nke Abụọ na-eru nso, gọọmentị Netherlands nke na-achị Indonesia, na-emekwa ihe n’okpuru nrụgide nke ndị ụkọchukwu, malitere itinye ihe mgbochi dị iche iche n’ọrụ Ndịàmà Jehova, mesịa n’ikpeazụ machibido ọrụ anyị. Ya mere e ji ihe isi ike na-eme nkwusa, na-eji nanị Bible eme ihe. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’obodo nta ọ bụla Opa na Oma letara, a na-akpụpụ ha n’ihu ndị isi gbaakwa ha ajụjụ. E mesoro ha dị ka ndị omekome. Oge na-adịghị anya ka mmachibido ahụ weresịịrị ọnọdụ, a tụrụ di nwanne Oma mkpọrọ n’ihi nnọpụiche ndị Kraịst ya. Ọ nwụrụ n’ụlọ mkpọrọ ndị Netherlands.

Opa na Oma biri n’ụgbọ ala nke a rụnyere ụlọ ụgbọ ala na-akpụgharị. Site n’iji ebe obibi nke a a na-adọkpụgharị adọkpụgharị na-eme ihe, ha mere nkwusa na Java nile. Na 1940, ka iyi egwu nke mwakpo nke ndi agha Japan na-eru ka mmiri, e ji otu nwa nwanyị gọzie ha, onye mesịrị ghọọ nne m. Ha kpọrọ aha nwatakịrị ahụ Victory [Mmeri], nke bụ isiokwu nke okwu ihu ọha onye isi oche Watch Tower Bible and Tract Society n’oge ahụ bụ J. F. Rutherford kwuru afọ abụọ tupu oge ahụ. Ha nọgidere na-asụ ụzọ ruokwa kpọmkwem mgbe a mụrụ nwa ahụ.

Ná mmalite afọ 1942, Opa, Oma, na Victory nọ n’ụgbọ mmiri ndị Netherlands na-ebu ngwongwo, si Borneo na-alọta mgbe a nụrụ otu ụda égbè sitere n’ụgbọ agha ndị Japan. Ọkụ nile nyụrụ, ndị mmadụ tikwara mkpu. N’ụzọ dị otú a, agha ahụ batara ná ndụ nke ezinụlọ m. Ọ bụ ezie na ha rutere ọdụ mmiri ahụ n’udo, ndị Japan wakwasịrị Java nanị ụbọchị ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, onye isi bụ onye Netherlands kpughekwaara ndị agha Japan ebe Opa na Oma nọ.

Mgbe ndị Japan chọtara ha, a napụrụ ha ihe onwunwe ha nile, ruokwa na ihe Victory ji egwuri egwu, kpụrụkwa ha gaa n’ogige ịta ahụhụ abụọ dị iche iche. E kwere ka Victory na Oma nọrọ, Opa ahụghịkwa ha anya ruo afọ atọ na ọkara na-esonụ.

Ndụ n’Ogige Ịta Ahụhụ Dị Iche Iche

N’oge ọ nọ na mkpọrọ, e bufere Opa site n’otu obodo nta gaa n’ọzọ​—⁠site na Surabaja gaa Ngawi, gaa Bandung, na n’ikpeazụ gaa Tjimahi. Ngagharị ndị a a nọgidere na-eme bụ iji mebie atụmatụ ọ bụla a haziri ahazi iji gbapụ. Ọtụtụ n’ime ndị mkpọrọ ahụ bụ ndị Netherlands, tinyere ndị Britain ole na ole na ụfọdụ ndị Australia. Ka ọ nọ n’ogige ndị ahụ, Opa mụrụ ọrụ ịkpụ isi, ọrụ ọ ka na-arụkwa mgbe ụfọdụ. Nanị akwụkwọ okpukpe e kwere ya ka o debe agwụla Bible​—⁠King James Version ya.

Ka ọ dị mgbe ahụ, a nọkwa na-ebugharị Oma na Victory site n’otu ogige gaa n’ọzọ. N’ogige ndị a onye nlekọta ogige na-agwa ndị inyom ka ha jee rụọ ọrụ n’ezi maka “ọdịmma ọha na eze.” Otú ọ dị, n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, ọ dịghị mgbe a họtara Oma. O mesịrị mata na a na-akpọpụ ndị inyom ndị ahụ ijere ndị agha Japan ozi dị ka ndị akwụna.

Ebe ọ bụ na ndị agha Japan adịghị enwe mmasị n’ụmụaka bụ ụmụ nwanyị, Oma na-eyinye Victory uwe dị ka nwoke oge nile, ma na-akpụkwa ya isi. Aha ahụ bụ Victory kpatara oké nsogbu mgbe onye nlekọta ogige ahụ chọrọ ịmata ihe aha ahụ pụtara​—⁠Mmeri nye Ndị Agha Ọchịchị Alaeze Japan ka ọ bụ Mmeri nye ndị America?

“Mmeri nye Alaeze Chineke n’elu gọọmentị nile nke elu ala!” ka nne m ochie ji nganga zaghachi.

N’ihi ịjụ ikwu, sị, “Mmeri nye Ndị Agha Ọchịchị Alaeze Japan,” a manyere Oma na nwa ya nwanyị dị afọ ise ịkwụ ọtọ ruo hour asatọ n’okpuru anwụ na-achasi ike dị ka ntaramahụhụ. E nweghị ndò, mmiri, ịnọdụ ala, ihulata ala. Ma site n’enyemaka Jehova ha lanarịrị mmeso ọjọọ nke a na-atụ ụjọ.

Otu afọ ka a tụsiri Oma mkpọrọ, onye nlekọta ogige ahụ gwara ya na di ya anwụọla! O ji nwute tinye foto Opa n’ala ala igbe ya e bibisiworo ma nọgide n’agbanyeghị iru ùjù ya.

Ndụ n’ime ogige mkpọrọ siri ike. Okè ihe oriri a na-enye onye ọ bụla kwa ụbọchị bụ otu iko alịbọ maka nri ụtụtụ, ounce asaa nke bred e ji sago mee maka nri ehihie, nakwa otu iko osikapa e siri n’ofe akwụkwọ nri dị mmiri mmiri maka nri anyasị. N’ihi òkè ihe oriri ahụ dị ntakịrị, erighị nri na-edozi ahụ jupụtara ebe nile, ndị mmadụ na-anwụkwa n’ihi afọ ọbara kwa ụbọchị.

N’oge Opa nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọrịara ọrịa pellagra nakwa ahụ ọzịza n’ihi erighị nri na-edozi ahụ (ọrịa ịkwụ agụụ). Ọ fọkwara nke nta ka Oma nwụọ, ebe ọ na-eburukarị nri ya nye Victory ka obere nwa ahụ ghara ịnwụ n’agụụ. Mmekpọ ọnụ na agụụ ghọrọ ihe na-adị mgbe nile. Ha nwere ike ịlanarị nanị site n’ịnọ Chineke ha bụ́ Jehova nso.

Echetara m otu n’ime okwu Opa na-ekwukarị: “Nnwere onwe bụ mmadụ na Onye Ahụ Bụ Chineke bụ́ Jehova ịdị ná mma.” Otú ahụ, Opa na-ele onwe ya anya dị ka onye nweere onwe ya n’ezie n’agbanyeghị na ọ na⁠-edi ịtụ mkpọrọ obi ọjọọ. Ịhụnanya ya na Oma nwere maka Jehova nyeere ha aka n’ezie ‘ịtachi obi n’ihe nile.’ (1 Ndị Kọrint 13:7) Mmekọrịta dị otú ahụ chiri anya nke anyị na Chineke bụ ihe mụ na Gayle na-agbalịsi ike ugbu a ijigide.

Nnwere Onwe na Njikọghachi Dị Ịrịba Ama

N’ikpeazụ, Agha Ụwa nke Abụọ kwụsịrị na 1945. Oge na-adịghị anya ka Japan chịlisịrị aka elu, e ji ụgbọ okporo ígwè buru Opa. Ka ha nọ n’ụzọ na-eje Bandung site na Djakarta, ndị agha Indonesia kwụsịrị ụgbọ okporo ígwè ahụ. Ọ bụ ezie na mmegide n’aka ndị Japan akwụsiwo, ndị Indonesia na-alụ agha iji nwere onwe ha n’aka ndị Netherlands. O juru Opa anya nke ukwuu na e si n’ụgbọ okporo ígwè ahụ kpụpụta ya na mberede nke na ọ chezọrọ ikwu okwu n’asụsụ Bekee kama nke ahụ malite ikwu okwu n’asụsụ Dutch. Nye ndị Indonesia, Dutch bụ asụsụ ndị iro, aghaghịkwa igbu ndị iro.

Dị ka ihe ndabara, ka ndị agha ahụ nọ na-enyocha ihe Opa ji, ha chọtara akwụkwọ ikike maka ịkwọ ụgbọ ala nke mba Australia ya, nke o chefuworo kpam kpam. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ndị Indonesia na ndị Australia adịghị alụrịta agha. Ruo taa, Opa ka na-ele nchọta a chọtara akwụkwọ ikike maka ịkwọ ụgbọ ala ahụ nke nwapụtara na ọ bụ nwa amaala Australia anya dị ka nke sitere n’aka Chineke, n’ihi na ka hour ole na ole gasịrị, n’otu ebe ahụ, otu ìgwè ndị agha ahụ gburu ndị Netherlands 12 ndị ji ụgbọ okporo ígwè na-agafe.

Ngwa ngwa mgbe ihe a mesịrị, Oma na Victory nọ na-echere ụgbọ ala ga-ebupụ ha site n’ebe ndị ahụ agha bibisiworo. Ka ha nọ ala n’akụkụ ụzọ, ogologo ahịrị nke ụgbọ ala bu ndị agha na ndị nkịtị nọ na-agafe. Na mberede, na-enweghị ihe doro anya kpatara ya, ogologo ahịrị ahụ kwụụrụ otu ebe. Ọ dabara na Oma lepụrụ anya gaa n’azụ ghere oghe nke ụgbọ ala kasị nọrọ nso, n’iju anya ya, ọ hụrụ otu nwoke tara ahụ bụ onye ọ matakwara onye ọ bụ ozugbo ahụ. Ọ bụ di ya! Ọnụ apụghị ịkọ ụdị mkpali mmetụta nke njikọtaghachi ha.

Ịlaghachi n’Australia

Mgbe nna ochie na ezinụlọ ya laghachiri Australia na 1946, ka bisiworo n’Indonesia ruo afọ 11, ndụ adịghịrị ha mfe. Ha laghachiri dị ka ndị gbara ọsọ agha​—⁠ndị na-atọgbọghị ihe ọ bụla, ndị na-adịghị eri nri na-edozi ahụ, ndị ọtụtụ ndị obodo na-enyokwa enyo. Oma na Victory aghaghị ịta ahụhụ nke ịkpa oké agbụrụ a na-akpaso ndị si Esia bata. Opa aghaghị ịrụsi ọrụ ike ruo ọtụtụ hour iji lekọta ezinụlọ ya na inye ha ebe obibi. N’agbanyeghị ihe isi ike ndị a, ha tachiri obi wee lanarị n’enweghị ihe mere ọnọdụ ime mmụọ ha.

Ugbu a, ka ihe karịrị 48 afọ gasịrị, Opa bi na Melbourne, ebe ọ ka nọgide na-ekere okè n’ozi ụlọ n’ụlọ. Ọ hụwo Victory na ụmụ ya ka na-anata eziokwu ahụ, rara ndụ ha nye Jehova, nke ọ bụlakwa na-abanye n’ozi ọsụ ụzọ oge nile.

E mere Des Zanker, onye ghọrọ nna m, na Victory baptism ná mmalite afọ ndị 1950, Des ghọkwara onye òtù ezinụlọ Betel nke Australia na 1958. Ka ọ lụsịrị Victory, onye nọ na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche, ha sụrụ ụzọ ruo nwa oge e wee kpọọ ha ịbanye n’ozi ime ngagharị. N’oge ahụ ka a mụrụ m, ha aghaghịkwa ịhapụ ọrụ ime ngagharị iji zụlite m. Ma, ka 27 afọ gasịrị, papa m ka nọkwa na-asụ ụzọ.

Ná mmalite 1990, Oma nwụrụ n’udo n’ụlọ, n’otu ụlọ ahụ a nọ zụlite nne m. Azụlitekwara m n’otu ụlọ a dị na Melbourne, tinyekwara nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị ndị m tọrọ. Ọ bụwo ezi ngọzi nye ezinụlọ anyị ịnọkọ n’otu ụlọ. Mgbe ụfọdụ ọ na-abụ ebe jubigara oké, ma apụghị m icheta mgbe o wutere m. Ọbụna n’ime afọ anọ mbụ nke alụmdi na nwunye anyị, nwunye m bụ Gayle sokwa biri n’ime ya ma nwee mmasị na ya. Oge anyị mesịrị hapụ maka ọrụ ọhụrụ anyị ketara, ebere m akwa. Anatawo m rị oké nkwado na ịhụnanya n’ụlọ ahụ.

Otú ọ dị, ugbu a, mụ na Gayle nwere ihe mere anyị ga-eji nwee ọṅụ dị ukwuu, n’ihi na anyị nwere ike ime ihe ndị mụrụ m na ndị mụrụ ha mere. Mgbe anyị hapụrụ ụlọ, anyị chọtara nkasi obi n’ihe mere anyị ji aga, nke bụ ime uche Jehova n’ozi oge nile ahụ. Anyị na-agbalịsi ike ịgbaso ihe nlereanya ọma nke ndị nna anyị ochie ha bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi, ndị chọtakwara otu ụdị nkasi obi ahụ mgbe ha na-arụ ọrụ n’ebe siri ike e kenyere ha ọrụ, mgbe ha nọ n’oké ụkọ, na ọbụna mgbe e ji ha eji ruo ọtụtụ afọ n’ogige ịta ahụhụ nke ndị Japan.​—⁠2 Ndị Kọrint 1:​3, 4.

Opa achọtawo nkasi obi mgbe nile n’okwu ndị ahụ nke Eze Devid gwara Jehova: “N’ihi na ebere gị dị mma karịa ndụ.” (Abụ Ọma 63:3) Ọ bụwo ọchịchọ siri ike nna m ochie nwere mgbe nile ịnụ ụtọ nke ebere ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ọchịchọ ezinụlo ya dum iso ya kerịta ya.

[Foto dị na peeji nke 21]

Oma na Opa Harris

[Foto dị na peeji nke 23]

Craig Zanker (n’azụ), na nwunye ya, ndị mụrụ ya, na nwanne ya nwoke na nwanyị ndị ọ tọrọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya