Zụlite Ezi Uche
“Meenụ ka mmadụ nile mara ezi uche unu. Onyenwe anyị nọ nso.” —NDỊ FILIPAỊ 4:5, NW.
1. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ịma aka inwe ezi uche n’ụwa nke taa?
“NWOKE nwere ezi uche”—onye England na-ede akwụkwọ bụ́ Sir Alan Patrick Herbert gụrụ onye dị n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme aha ahụ. N’ezie, ọ pụrụ iyi mgbe ụfọdụ na e nweghị ndị ọ bụla nwere ezi uche fọrọ n’ụwa a esemokwu dọrisịrị. Bible buru amụma na ná “mgbe ikpeazụ” ndị a dị oké egwu, ndị mmadụ ga-abụ ndị “dị ka anụ ọhịa,” “ndị isi ike,” na “ndị na-adịghị agba ndụ”—n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndị na-enweghị ezi uche ma ọlị. (2 Timoti 3:1-5) Ka o sina dị, ezi ndị Kraịst na-ewere ezi uche n’ihe dị oké elu, na-amara na ọ bụ akara nke amamihe Chineke. (Jemes 3:17) Anyị adịghị eche na ọ bụ ihe a na-apụghị ime eme mmadụ inwe ezi uche n’ụwa nke ezi uche na-adịghị ya. Kama nke ahụ, anyị ji obi anyị dum na-anakwere ihe ịma aka ahụ dị ná ndụmọdụ Pọl onyeozi nke sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ nke a na-achọta ná Ndị Filipaị 4:5 (NW): “Meenụ ka mmadụ nile mara ezi uche unu.”
2. Olee otú okwu Pọl onyeozi ná Ndị Filipaị 4:5 si enyere anyị aka ịchọpụta ma anyị nwere ezi uche?
2 Rịba ama otú okwu Pọl si enyere anyị aka ịnwale ma ànyị nwere ezi uche. Ọ bụchaghị ihe metụtara otú anyị si ele onwe anyị anya; ọ bụ ihe metụtara ụzọ ndị ọzọ si ele anyị, otú e si mara anyị. Nsụgharị Phillips dere amaokwu a ịgụ: “Bụrụnụ ndị e ji inwe ezi uche mara.” Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ nnọọ ịjụ sị, ‘Olee otú e si mara m? M̀ bụ onye e ji inwe ezi uche, ịdị na-ekwenye ekwenye, na ịdị nro, mara? Ka àkpọrọ m ekwo nkụ, dị aka ike, ma ọ bụ isi ike?’
3. (a) Gịnị ka okwu Grik a sụgharịrị “ezi uche” pụtara, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka àgwà nke a ji na-adọrọ adọrọ? (b) Olee otú onye Kraịst pụrụ isi mụta inwekwu ezi uche?
3 Otú e si mara anyị n’okwu a ga-egosipụta nnọọ ọ̀tụ̀tụ̀ anyị na-eṅomiru Jisọs Kraịst. (1 Ndị Kọrint 11:1) Mgbe ọ nọ n’elu ụwa ebe a, Jisọs gosipụtara ihe nlereanya ka elu nke Nna ya n’inwe ezi uche n’ụzọ zuru okè. (Jọn 14:9) N’ezie, mgbe Pọl dere banyere “ịdị nwayọọ na obi ọma nke Kraịst,” okwu Grik o ji mee ihe maka obi ọma (e·pi·ei·kiʹas) pụtakwara “ezi uche” ma ọ bụ, n’ụzọ nkịtị, “ịdị na-ekwenye ekwenye.” (2 Ndị Kọrint 10:1) Akwụkwọ bụ́ The Expositor’s Bible Commentary na-akpọ nke a “otu n’ime okwu ukwu ndị e ji kọwaa mjimara n’A[gba] Ọ[hụrụ].” Ọ na-akọwa àgwà nke na-adọrọ mmasị nke ukwuu nke na otu onye mmụta kpọrọ okwu ahụ “ezi uche na-atọ ụtọ.” Ya mere, ka anyị tụlee ụzọ atọ Jisọs, dị ka Nna ya, bụ́ Jehova, si gosipụta ezi uche. Anyị pụrụ isi otú ahụ mụta ụzọ isi ghọkwuo ndị nwere ezi uche n’onwe anyị.—1 Pita 2:21.
“Na-agbaghara Mmehie”
4. Olee otú Jisọs si gosi onwe ya ịdị “na-agbaghara mmehie”?
4 Dị ka Nna ya, Jisọs gosiri ezi uche site n’ịdị “na-agbaghara mmehie” ugboro ugboro. (Abụ Ọma 86:5) Tụlee oge ahụ mgbe Pita, onye ya na kpakọrọ n’ụzọ chiri anya, gọnarịrị Jisọs ugboro atọ n’abalị nke njide na ule Jisọs. Jisọs n’onwe ya ebuwo ụzọ kwuo, sị: “Onye ọ bụla nke ga-agọnarị m n’ihu mmadụ, ya ka Mụ onwe m ga-agọnarị n’ihu Nna m.” (Matiu 10:33) Jisọs ò tinyere ụkpụrụ nke a n’ọrụ n’ụzọ ịkpọ ekwo nkụ na emeghị ebere n’ebe Pita nọ? Ee e; mgbe mbilite n’ọnwụ Ya gasịrị, Jisọs letara Pita n’onwe ya, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ iji kasie onyeozi nke a chegharịrị echegharị, nke obi ya tiwara etiwa obi, meekwa ka obi sie ya ike. (Luk 24:34; 1 Ndị Kọrint 15:5) Ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị, Jisọs kwere ka Pita nwee ibu ọrụ dị ukwuu. (Ọrụ 2:1-41) N’ebe a ka e nwere ezi uche na-atọ ụtọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị mma! Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe nkasi obi iche na Jehova ahọpụtawo Jisọs dị ka Onyeikpe n’isi ihe nile a kpọrọ mmadụ?—Aịsaịa 11:1-4; Jọn 5:22.
5. (a) Aha dị aṅaa ka ndị okenye kwesịrị inwe n’etiti atụrụ ahụ? (b) Olee ihe ọmụma ndị okenye kwesịrị ịtụleghachi tupu ịhụ maka okwu ikpe, n’ihi gịnịkwa?
5 Mgbe ndị okenye na-eme ihe dị ka ndị ikpe n’ọgbakọ, ha na-agbalịsi ike ịgbaso ihe nlereanya ezi uche nke Jisọs. Ha achọghị ka atụrụ ahụ na-atụ ha egwu dị ka ndị na-enye ahụhụ. Kama nke ahụ, ha na-achọ iṅomi Jisọs ka atụrụ ahụ wee nwee mmetụta ịnọ ná nchebe n’ebe ha nọ dị ka ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya. N’okwu ikpe, ha na-etinye mgbalị nile iji gosi ezi uche, dị njikere ịgbaghara. Tupu ịhụ maka okwu dị otú ahụ, ndị okenye ụfọdụ ahụwo ya dị ka ihe na-enye aka ịtụleghachi isiokwu Ụlọ Nche ndị dị ná mbipụta July 1, 1992, bụ́ “Jehova, ‘Onye Ikpe Ụwa Nile’ nke Na-adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu” na “Ndị Okenye, Na-ekpenụ Ikpe n’Ezi Omume.” Ha na-esi otú a buru n’uche nchịkọta nke ụzọ ikpe ikpe nke Jehova: “Iguzosi ike n’ebe ọ dị mkpa, obi ebere n’ebe o kwere mee.” Ọ bụghị ihie ụzọ ịchọ ime ebere n’ikpe mgbe e nwere ihe ndabere ezi uche dị na ya ime otú ahụ. (Matiu 12:7) Ọ bụ oké ihe ihie ụzọ ịdị aka ike ma ọ bụ emeghị ebere. (Ezikiel 34:4) Ndị okenye si otú a ezere ịgahie site n’ịchọsi ike ịgbaso ụzọ nke kasị bụrụ nke ịhụnanya, nke obi ebere pụrụ ịdịnụ n’ókè nile nke ezi ikpe.—Tụlee Matiu 23:23; Jemes 2:13.
Ịdị Nro Mgbe E Nwere Mgbanwe n’Ọnọdụ
6. Olee otú Jisọs si gosipụta inwe ezi uche n’imeso nwanyị onye Jentaịl ihe bụ́ onye mmụọ ọjọọ ji nwa ya nwanyị?
6 Dị ka Jehova, Jisọs nwapụtara onwe ya ịdị ngwa ịgbanwe ụzọ o si eme ihe ma ọ bụ gbanwee n’ikwekọ n’ọnọdụ ndị ọhụrụ ka ha na-ebilite. N’otu ọnọdụ otu nwanyị onye Jentaịl rịọrọ ya ka ọ gwọọ nwa ya nwanyị mmụọ ọjọọ ji aka ọjọọ. N’ụzọ atọ dị iche iche, Jisọs bu ụzọ gosi na ya agajeghị inyere ya aka—nke mbụ, site n’ịgbachi ya nkịtị; nke abụọ, site n’ịgwa ya hoo haa na e zitere ya nye ndị Juu, ọ bụghị ndị Jentaịl; na nke atọ, site n’inye ya ihe atụ nke kwuru otu isi ihe ahụ n’ụzọ obi ọma. Otú ọ dị, nwanyị ahụ nọgidere n’agbanyeghị ihe a dum, na-enye ihe àmà nke okwukwe pụrụ iche. N’ihi ọnọdụ nke a pụrụ iche, Jisọs pụrụ ịhụ na nke a abụghị oge itinye ụkpụrụ metụtara ihe nile n’ọrụ; ọ bụ oge ime mgbanwe iji kwekọọ n’ụkpụrụ ka elu.a Otú a, Jisọs mere kpọmkwem ihe o gosiworo ugboro atọ na ya agaghị eme. Ọ gwọrọ nwa nwanyị nke nwanyị ahụ!—Matiu 15:21-28.
7. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị nne na nna pụrụ isi gosipụta ezi uche, n’ihi gịnịkwa?
7 À makwaara anyị n’otu aka ahụ maka anyị ịdị njikere ime mgbanwe mgbe o kwesịrị ekwesị? Ọ dị ndị nne na nna mkpa mgbe mgbe igosi ezi uche dị otú ahụ. Ebe ọ bụ na nwa nke ọ bụla pụrụ iche, ụzọ ndị dịrị irè n’ebe otu nọ nwere ike ha agaghị ekwesị ekwesị n’ebe ọzọ nọ. Ọzọkwa, ka ụmụaka na-eto, mkpa ha na-agbanwe. È kwesịrị ịgbanwe oge a na-aghaghị ịlata ụlọ? Ọmụmụ ihe ezinụlọ ọ̀ ga-aba uru karị site n’usoro na-ekpo ọkụ karị? Mgbe nne ma ọ bụ nna meghachiri omume gabiga ókè n’ihi njehie dị ntakịrị, ọ̀ na-adị njikere igosipụta obi umeala ma dozie okwu? Ndị nne na nna na-ekwenye ekwenye n’ụzọ ndị dị otú a na-ezere iwetara ụmụ ha mkpasu iwe na-adịghị mkpa na iwezụga ha n’ebe Jehova nọ.—Ndị Efesọs 6:4.
8. Olee otú ndị okenye ọgbakọ pụrụ isi bute ụzọ n’ime mgbanwe ikwekọ ná mkpa ókèala ha?
8 Ọ dịkwa ndị okenye mkpa ime mgbanwe ka ọnọdụ ndị ọhụrụ na-ebilite, ebe ọ na-adịghị mgbe ha ga-emebi iwu ndị ọ bụla kpọmkwem nke Chineke. N’ilekọta ọrụ nkwusa ahụ, ị̀ na-amụ anya ịhụ mgbanwe dị iche iche n’ókèala ahụ? Ka ụzọ ndụ n’ógbè unu na-agbanwe, ma eleghị anya e kwesịrị ịkwalite ịgba àmà uhuruchi, ịgba àmà okporo ámá, ma ọ bụ ịgba àmà telifon. Ime mgbanwe n’ụzọ ndị dị otú a na-enyere anyị aka ịrụzu ọrụ nkwusa anyị n’ụzọ dị irè karị. (Matiu 28:19, 20; 1 Ndị Kọrint 9:26) Pọl hụkwara na ya na-eme mgbanwe ikwekọ n’ụdị mmadụ nile n’ozi ya. Ànyị na-eme otú ihe ahụ, dị ka ihe atụ, site n’ịmụta ihe zuru ezu banyere okpukpe na ọdịbendị ndị e nwere n’ógbè ahụ iji nyere ndị mmadụ aka?—1 Ndị Kọrint 9:19-23.
9. N’ihi gịnị ka onye okenye kwesịrị iji ghara isi ọnwụ ịhụ maka nsogbu dị iche iche n’ụzọ o si eme ihe n’oge gara aga?
9 Ka mgbe ikpeazụ ndị a na-adịwanye egwu, ọ pụkwara ịdị ndị na-azụ atụrụ mkpa ime mgbanwe ikwekọ n’oké mgbagwoju anya na obi ilu nke ụfọdụ n’ime nsogbu ndị na-eche ìgwè atụrụ ha ihu. (2 Timoti 3:1) Ndị okenye, nke a abụghị oge maka ịkpọ ekwo nkụ! N’ezie onye okenye agaghị esi ọnwụ iche nsogbu dị iche iche ihu dị ka o meworo n’oge gara aga ma ọ bụrụ na ụzọ o ji eme ihe adịkwaghị irè ma ọ bụ ọ bụrụ na “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ahụwo ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị ibipụta ihe ọhụrụ n’isiokwu dị otú ahụ. (Matiu 24:45; tụlee Eklisiastis 7:10; 1 Ndị Kọrint 7:31.) Otu onye okenye na-ekwesị ntụkwasị obi ji ezi obi gbalịa inyere otu nwanna nwanyị nwere nkụda mmụọ aka bụ́ onye chọsiri onye na-ege ntị nke ọma ike. Otú ọ dị, o lere nkụda mmụọ ya anya dị ka ihe na-esighị ike ma nye ihe ngwọta na-erijughị afọ. Mgbe ahụ Watch Tower Society bipụtara ihe ọmụma ụfọdụ dabeere na Bible nke tụlere nsogbu nwanyị ahụ kpọmkwem. Onye okenye ahụ hụrụ na ya na ya kwurịtara okwu ọzọ, n’oge a na-eji ihe ọmụma ọhụrụ ahụ na-eme ihe ma na-egosi ọmịiko maka ọnọdụ ya. (Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 5:14, 15.) Lee ihe nlereanya ọma nke ezi uche ọ bụ!
10. (a) Olee otú ndị okenye kwesịrị isi gosipụta àgwà ikwenye ekwenye n’ebe ibe ha nọ na n’ebe òtù ndị okenye dum nọ? (b) Olee otú òtù ndị okenye kwesịrị isi lee ndị na-egosipụta onwe ha ịbụ ndị na-enweghị ezi uche anya?
10 Ọ dịkwa ndị okenye mkpa igosi àgwà nke ikwenye ekwenye n’ebe ibe ha nọ. Mgbe òtù ndị okenye zukọrọ, lee ka o si dị mkpa na otu okenye ọ bụla agaghị na-azọrọ ikwucha ihe nile a na-ekwu! (Luk 9:48) Njighachi onwe onye azụ dị onye nke nọ n’isi oche karịsịa mkpa n’akụkụ nke a. Mgbe otu okenye ma ọ bụ abụọ na-ekwenyeghị ná mkpebi nke ìgwè ahụ dum, ha agaghị esi ọnwụ ka e mee otú ha chọrọ. Kama nke ahụ, ọ bụrụhaala na ọ dịghị ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ a na-emebi, ha ga-ekwenye, na-echeta na a chọrọ ezi uche n’aka ndị okenye. (1 Timoti 3:2, 3) N’aka nke ọzọ, ìgwè ndị okenye kwesịrị iburu n’uche na Pọl baara ọgbakọ dị na Kọrint mba n’ihi ‘ikwere ka ndị na-enweghị ezi uche nọgide’ bụ́ ndị na-egosipụta onwe ha dị ka “ndị kachasị elu n’etiti ndị ozi.” (2 Ndị Kọrint 11:5, 19, 20) Ya mere ha ekwesịghị igbu oge n’ịdụ onye okenye ibe ha ọdụ bụ́ onye kpara àgwà n’ụzọ ịgba isi akwara, nke enweghị ezi uche, ma ha onwe ha kwesịrị ịdị nwayọọ ma nwee obi ọma n’ime otú ahụ.—Ndị Galetia 6:1.
Ezi Uche n’Iji Ịbụ Isi Eme Ihe
11. Ọdịiche dị aṅaa dị n’etiti ụzọ ndị ndú okpukpe n’ụbọchị Jisọs si jiri ịbụ isi mee ihe na ụzọ Jisọs si jiri ya mee ihe?
11 Mgbe Jisọs gagharịrị n’elu ụwa, ezi uche ya pụtara ìhè n’ezie n’ụzọ o si jiri ịbụ isi Chineke nyere ya mee ihe. Lee ka o si dị iche n’ebe ndị ndú okpukpe nke oge ya nọ! Tụlee otu ihe atụ. Iwu Chineke ekwuwo na a gaghị arụ ọrụ ọ bụla, ọbụna ịchịkọta nkụ, n’Ụbọchị Izu Ike. (Ọpụpụ 20:10; Ọnụ Ọgụgụ 15:32-36) Ndị ndú okpukpe ahụ chọrọ ịchịkwa nnọọ ụzọ ndị mmadụ si etinye iwu ahụ n’ọrụ. Ya mere ha weere ya dị ka ọrụ ha inye iwu kpọmkwem ihe mmadụ pụrụ ibuli n’Ụbọchị Izu Ike. Ha nyere iwu sị: ihe na-adịghị arọ karịa fig abụọ kpọrọ nkụ. Ọbụna na ha tinyere mmachibido iwu n’akpụkpọ ụkwụ ndị a kụnyere ntu, na-azọrọ na ibuli arọ ọzọ nke a nke ntu ndị ahụ ga-apụta ọrụ! A sịrị na, n’ozuzu ya, ndị rabaị gbakwụnyere 39 ụkpụrụ iwu n’iwu Chineke banyere Ụbọchị Izu Ike wee tinye ihe mgbakwụnye a na-anaghị agụta ọnụ n’ụkpụrụ iwu ndị ahụ. Jisọs, n’aka nke ọzọ, achọghị ịchịkwa ndị mmadụ site n’imenye ihere site n’isetịpụ ụkpụrụ iwu mgbochi ndị na-adịghị agwụ agwụ ma ọ bụ site n’isetịpụ ụkpụrụ ndị na-adịghị agbanwe agbanwe, ndị a na-apụghị iru eru.—Matiu 23:2-4; Jọn 7:47-49.
12. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji sị na Jisọs enweghị obi abụọ mgbe a bịara n’ụkpụrụ ezi omume nile nke Jehova?
12 Mgbe ahụ, ànyị gaje iwere ya na Jisọs ejigidesighị ụkpụrụ ezi omume Chineke ike? O jigidere ya n’ezie! Ọ ghọtara na iwu na-adị irè karịsịa mgbe ụmụ mmadụ buuru n’obi ụkpụrụ ndị e ji mee iwu ndị ahụ. Ebe ndị Farisii na-adọlịgbu onwe ha n’ịgbalị iji ọtụtụ iwu chịkwaa ndị mmadụ, Jisọs chọsiri ike iru n’obi. Dị ka ihe atụ, ọ maara nke ọma na e nweghị nkwenye ọ bụla mgbe a bịara n’iwu Chineke ndị dị ka “gbanarịnụ ịkwa iko.” (1 Ndị Kọrint 6:18) Ya mere Jisọs dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere echiche ndị pụrụ iduba n’omume rụrụ arụ. (Matiu 5:28) Ozizi dị otú ahụ nwere amamihe na nghọta ka nnọọ ukwuu karịa nanị isetịpụ ụkpụrụ iwu ndị na-adịghị agbanwe agbanwe, nke ịgbaso omenala.
13. (a) N’ihi gịnị ka ndị okenye kwesịrị iji zere ime iwu na ụkpụrụ ndị na-adịghị nro? (b) Olee akụkụ ụfọdụ ebe ndị ọ dị mkpa ịkwanyere akọ na uche mmadụ ùgwù?
13 Ụmụnna ndị nwere ezi uche taa nwekwara mmasị n’otu aka ahụ iru n’obi. Otú a, ha na-ezere iguzobe ụkpụrụ iwu ndị obi ebere na-adịghị ha, ndị na-adịghị nro ma ọ bụ ịgbanwe echiche onwe onye ha ka ọ ghọọ iwu. (Tụlee Daniel 6:7-16.) Site n’oge ruo n’oge, ihe ncheta obi ọma dị iche iche n’okwu ndị dị ka uwe na ejiji pụrụ ikwesị ekwesị ma kwesị oge, ma onye okenye ga-etinye aha ọma ya n’ihe ize ndụ dị ka nwoke nwere ezi uche ma ọ bụrụ na o jiri okwu ndị dị otú ahụ na-agụ egwú ma ọ bụ na-agbalị ịmanye ihe ndị bụkarịrị ngosipụta nke mmasị onwe onye ya n’isi ndị ọzọ. N’ezie, mmadụ nile n’ọgbakọ kwesịrị izere ịnwa ịchịkwa ndị ọzọ.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 1:24; Ndị Filipaị 2:12.
14. Olee otú Jisọs si gosi na ya nwere ezi uche banyere ihe ọ na-atụ anya ya n’aka ndị ọzọ?
14 Ndị okenye pụrụ ịchọ inyocha onwe ha n’akụkụ ọzọ: ‘M̀ nwere ezi uche n’ihe m na-atụ anya ya n’aka ndị ọzọ?’ Jisọs n’ezie nwere. Ọ nọgidere na-egosi ndị na-eso ụzọ ya na ya chọrọ n’aka ha ihe na-akarịghị mgbalị ndị sitere n’obi dum nakwa na ya na-ewere ndị a n’ihe dị oké ọnụ ahịa. O toro nwanyị ogbenye ahụ di ya nwụrụ n’ihi inye mkpụrụ ego ya ndị uru ha dị nta. (Mak 12:42, 43) Ọ baara ndị na-eso ụzọ ya mba mgbe ha katọrọ onyinye dị oké ọnụ nke Meri, na-asị: “Hapụnụ ya. . . . O mere ihe o nwere ike ime.” (Mak 14:6, 8) O nwere ezi uche ọbụna mgbe ndị na-eso ụzọ ya na-emeghị ihe ọ tụrụ anya ya. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na ọ gbara ndị ozi ya atọ kasị dịrị ya nso ume ka ha mụrụ anya ma soro ya nọrọ ná nche n’anyasị e jidere ya, ha mechuru ya ihu site n’ịda n’ụra ugboro ugboro. Ma, o ji ọmịiko rịba ama, sị: “Mmụọ nke mmadụ dị ọkụ n’ezie, ma anụ ahụ adịghị ike.”—Mak 14:34-38.
15, 16. (a) N’ihi gịnị ka ndị okenye ga-eji kpachara anya ịghara ịrụgide ma ọ bụ ịmanye ìgwè atụrụ ahụ ime ihe? (b) Olee otú otu nwanna nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi si mee mgbanwe n’ihe ọ na-atụ anya ya n’aka ndị ọzọ?
15 N’eziokwu, Jisọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha ‘jisie ike.’ (Luk 13:24) Ma ọ dịghị mgbe ọ rụgidere ha ime otú ahụ! Ọ kpaliri ha, setịpụ ihe ilereanya, bute ụzọ, ma chọọ iru n’obi ha. Ọ tụkwasịrị obi n’ike mmụọ Jehova ime nke fọdụrụ. Ndị okenye taa kwesịrị n’otu aka ahụ ịgba ìgwè atụrụ ahụ ume ijere Jehova ozi site n’obi dum ma ha kwesịrị izere ịdị na-amanye ha amanye site n’ime ka e nwee echiche ikpe ọmụma ma ọ bụ ihere, na-eme ka a ghọta na ihe ha na-eme ugbu a n’ijere Jehova ozi ezughị ezu ma ọ bụ bụrụ nke a na-adịghị anakwere n’ụzọ ụfọdụ. Ụzọ dị ike, nke ịgwagbu mmadụ n’okwu sị “mekwuo, mekwuo, mekwuo!” pụrụ ịkụda ndị na-eme ihe nile ha pụrụ ime aka. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe mwute ma ọ bụrụ na onye okenye aghọọ onye a ma ama n’ihi ịbụ “onye o siri ike imete mma”—ihe na-eyitụghị ezi uche ma ọlị!—1 Pita 2:18, NW.
16 Anyị nile kwesịrị inwe ezi uche n’ihe anyị na-atụ anya ya n’aka ndị ọzọ! Otu nwanna nwanyị, mgbe ya na di ya hapụsịrị ọrụ ozi ala ọzọ e kenyere ha ije lekọta nne ya ahụ na-esighị ike, dere, sị: “Oge ndị a siri ike n’eziokwu nye anyị bụ́ ndị nkwusa nọ n’ebe a n’ọgbakọ dị iche iche. Ebe anyị nọworo n’ọrụ sekit na distrikti, bụrụ ndị e chebere pụọ n’ọtụtụ nrụgide ndị dị otú ahụ, e mere ka anyị mata ihe ndị a na mberede na n’ụzọ na-afụ ụfụ. M na-agwabu onwe m, dị ka ihe atụ, ‘N’ihi gịnị ka nwanna nwanyị ahụ na-ejighị na-enyefe akwụkwọ kwesịrị ekwesị n’ọnwa a? Ọ̀ naghị agụ Ozi Alaeze?’ Ugbu a amatawo m ihe kpatara ya. Nye ụfọdụ ọ gwụla ihe ha pụrụ ime iji pụta [n’ije ozi].” Lee ka o si ka mma nke ukwuu ịja ụmụnna anyị mma maka ihe ha mere kama ikpe ha ikpe maka ihe ha na-emeghị!
17. Olee otú Jisọs si setịpụrụ anyị ihe nlereanya n’ihe banyere ezi uche?
17 Tụlee ihe nlereanya ikpeazụ nke ụzọ Jisọs si jiri ịbụ isi ya mee ihe n’ụzọ ezi uche. Dị ka Nna ya, Jisọs adịghị eji ekworo na-echebe ịbụ isi ya. Ya onwe ya bụkwa ọkà n’inyefe ndị ọzọ ọrụ, na-ahọpụta òtù ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ka o lekọta “ihe nile o nwere” n’elu ụwa ebe a. (Matiu 24:45-47) Ọ dịghịkwa atụ egwu ịṅa ntị n’echiche ndị ọzọ. Ọ na-ajụkarị ndị na-ege ya ntị sị: “Gịnị bụ uche gị?” (Matiu 17:25; 18:12; 21:28; 22:42) Otú ahụ ka o kwesịrị ịdị n’etiti ndị nile na-eso ụzọ Kraịst taa. Ọ dịghị ókè ịbụ isi kwesịrị ime ka ha ghara ịdị njikere ịṅa ntị. Ndị nne na nna, ṅaanụ ntị! Ndị bụ di, ṅaanụ ntị! Ndị okenye, ṅaanụ ntị!
18. (a) Olee otú anyị pụrụ isi chọpụta ma a ma anyị ama n’ihi inwe ezi uche? (b) Gịnị ka anyị nile pụrụ ime nke ọma ikpebisi ike?
18 Ee, onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ ịbụ ‘onye e ji inwe ezi uche mara.’ (Ndị Filipaị 4:5, Phillips) Ma olee otú anyị si ama ma anyị nwere aha dị otú ahụ? Ọ dị mma, mgbe Jisọs chọsiri ike ịmata ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya, ọ jụrụ ndị enyi ya ọ tụkwasịrị obi. (Matiu 16:13) Gịnị ma ị gbasoo ihe nlereanya ya? Ị pụrụ ịjụ onye ị pụrụ ịdabere na ya maka eziokwu ma ị bụ onye e ji inwe ezi uche, ime nkwenye mara. N’ezie e nwere ihe dị ukwuu anyị nile pụrụ ime iji ṅomikwuo n’ụzọ chiri anya ihe nlereanya zuru okè nke Jisọs nke inwe ezi uche! Karịsịa ma ọ bụrụ na anyị nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịbụ isi n’ebe ndị ọzọ nọ, ka anyị na-agbaso ihe nlereanya Jehova na Jisọs mgbe nile, na-eji ya eme ihe mgbe nile n’ụzọ ezi uche, na-adị njikere mgbe nile ịgbaghara, ime mgbanwe, ma ọ bụ ikwenye mgbe o kwesịrị ekwesị. N’ezie, ka onye ọ bụla n’ime anyị gbalịsie ike “inwe ezi uche”!—Taịtọs 3:2, NW.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Akwụkwọ bụ́ New Testament Words na-ekwu, sị: “Nwoke nke dị epieikēs [ezi uche] maara na e nwere oge ụfọdụ mgbe otu ihe pụrụ ịbụ nke usoro iwu kwadoro kpam kpam ma bụrụ nke dị njọ kpam kpam n’ụzọ omume ọma. Nwoke nke dị epieikēs maara mgbe ịhapụtụ iwu n’okpuru nrụgide nke ikike nke dị elu ma dị ukwuu karịa iwu.”
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji chọọ inwe ezi uche?
◻ Olee otú ndị okenye pụrụ isi ṅomie Jisọs n’ịdị na-agbaghara mmehie?
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji gbalịsie ike ịdị nro dị ka Jisọs?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta inwe ezi uche n’ụzọ anyị si eji ịbụ isi eme ihe?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi nyochaa onwe anyị ma ànyị nwere ezi uche n’ezie?
[Foto dị na peeji nke 15]
Jisọs gbaghaara Pita chegharịrịnụ n’egbughị oge
[Foto dị na peeji nke 16]
Mgbe otu nwanyị gosiri okwukwe pụrụ iche, Jisọs hụrụ na ọ bụghị oge itinye otu ụkpụrụ metụtara ihe nile n’ọrụ
[Foto dị na peeji nke 18]
Ndị nne na nna ṅaanụ ntị!
[Foto dị na peeji nke 18]
Ndị bụ di ṅaanụ ntị!
[Foto dị na peeji nke 18]
Ndị okenye ṅaanụ ntị!