Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 8/1 p. 9-14
  • Jehova Nwere Ezi Uche!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Nwere Ezi Uche!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova​—⁠Onye Kasị Na-eme Mgbanwe n’Eluigwe na Ala
  • Ezi Uche Bụ Akara nke Amamihe Chineke
  • “Na-agbaghara Mmehie”
  • Ịgbanwe Ụzọ Ime Ihe Ka Ọnọdụ Ndị Ọhụrụ Na-ebilite
  • Ezi Uche n’Iji Ịbụ Isi Eme Ihe
  • “O Nwere Obi nke Maara Ihe”—Ma Ọ Dị Umeala n’Obi
    Bịaruo Jehova Nso
  • Zụlite Ezi Uche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Na-ele Ihe Anya Otú Kwesịrị Ekwesị Ka Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ghọta na Jehova Na-emesapụ Aka, Nweekwa Ezi Uche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 8/1 p. 9-14

Jehova Nwere Ezi Uche!

“Amamihe nke si n’elu bịa . . . [nwere] ezi uche.”​—⁠JEMES 3:17, NW.

1. Olee otú ụfọdụ siworo kọwaa Chineke ịbụ onye na-enweghị ezi uche, oleekwa otú echiche dị otú ahụ banyere Chineke si emetụta gị?

ỤDỊ Chineke dị aṅaa ka ị na-efe? Ì kwere na ọ bụ Chineke nke ikpe na-adịghị nro, nke siri oké ike, nwee ọdịdị nke enweghị mmetụta na nke a na-apụghị ịgbanwe agbanwe? Nye onye mgbanwe ndị Protestant bụ́ John Calvin, Chineke aghaghị iyiwo onye dị otú ahụ. Calvin mere nzọrọ na Chineke nwere “atụmatụ ebighị ebi na nke a na-apụghị ịgbanwe agbanwe” banyere onye ọ bụla, buru ụzọ na-eguzobere onye nke ọ bụla akara aka ma ọ ga-adị ndụ agwụ agwụ n’obi ụtọ ma ọ bụ e mekpọọ ya ọnụ ruo ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ. Cheedị echiche: Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, ọ dịghị ihe ị pụrụ ime, n’agbanyeghị otú i si gbalịsie ike, nke ga-agbanwe atụmatụ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe nke dịteworo aka banyere gị na ọdịnihu gị. À ga-adọta gị nso n’ebe Chineke dị otú ahụ nke na-enweghị ezi uche nọ?​—⁠Tụlee Jemes 4:8.

2, 3. (a) Olee otú anyị pụrụ isi maa atụ enweghị ezi uche nke òtù dị iche iche nke ụmụ mmadụ? (b) Olee otú ọhụụ Ezikiel nke ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova si ekpughe ime mgbanwe Ya?

2 Lee ka o si bụụrụ anyị ihe ikuru ume ndụ ịmụta na Chineke nke Bible nwere ezi uche n’ụzọ pụrụ iche! Ọ bụghị Chineke kama ụmụ mmadụ bụ ndị na-adịghị agbanwe agbanwe ma ghara ịdị nro, bụrụ ndị ezughị okè nke ha na-akpara ókè. Òtù dị iche iche nke ụmụ mmadụ pụrụ ịbụ nke siri ike nchịkwa dị ka ụgbọ okporo ígwè obu ngwongwo. Mgbe nnukwute ụgbọ okporo ígwè obu ngwongwo gbaara na-aga n’ihe dachiri ụzọ, nchigharị ihu bụ ihe a na-apụghị ime eme, nkwusị adịghịkwanụ mfe karị. Ụgbọ okporo ígwè ụfọdụ nwere ike ọsọ dị ukwuu nke na ha na-ewe ihe karịrị otu kilomita iji kwụsị mgbe e jidesịrị brekị ya! N’otu aka ahụ, nnukwute ụgbọ mmiri na-ebu mmanụ pụrụ ịgba na-aga n’ihu ruo kilomita asatọ ọzọ mgbe a gbanyụsịrị injin ya. Ọbụna ma a tụọ gia ịga azụ, ọ ka pụrụ ịga n’ihu ruo kilomita atọ! Ma ugbu a tụlee ụgbọ nke dị ebube nke ukwuu karịa abụọ ndị a, otu nke na-anọchite anya nzukọ Chineke.

3 Ihe karịrị 2,600 afọ gara aga, Jehova nyere Ezikiel onye amụma ọhụụ nke sere onyinyo nzukọ eluigwe Ya nke ndị mmụọ e kere eke. Ọ bụ ụgbọ ịnyịnya na-adọkpụ nke ịdị ukwuu ya na-akpata ụjọ, “ụgbọ” Jehova n’onwe ya nke na-anọ n’okpuru nchịkwa ya mgbe nile. Ihe kasị na-adọrọ mmasị bụ ụzọ o si na-aga. Nnukwute wheel ya nile nwere akụkụ anọ ma jupụta n’anya, ya mere ha pụrụ ịhụ ebe ọ bụla ma nwee ike ịgbanwe ụzọ ya kpam bim, n’akwụsịghị akwụsị ma ọ bụ chigharịa. Nnukwute ụgbọ a kwa agakwaghị na-enugharị enugharị dị ka nnukwute ụgbọ mmiri na-ebu mmanụ ma ọ bụ nnukwute ụgbọ okporo ígwè obu ngwongwo. Ọ pụrụ ịgba ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ nke àmụ̀má, ọbụna na-echigharị kpọmkwem n’otu ebe o guzo! (Ezikiel 1:​1, 14-⁠28) Jehova dị iche site na Chineke nke Calvin kwusara dị ka ụgbọ Ya dị iche site n’ígwè ọrụ ndị siri ike nchịkwa bụ́ ndị mmadụ mere. Ọ na-eme mgbanwe n’ụzọ zuru okè. Ịghọta akụkụ nke a nke ọdịdị Jehova kwesịrị inyere anyị aka ịnọgide na-eme mgbanwe ma na-ezere ọnyà nke enweghị ezi uche.

Jehova​—⁠Onye Kasị Na-eme Mgbanwe n’Eluigwe na Ala

4. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka aha Jehova n’onwe ya si ekpughe ya ịbụ Chineke na-eme mgbanwe? (b) Gịnị bụ ụfọdụ utu aha a na-akpọ Jehova Chineke, n’ihi gịnịkwa ka ha ji kwesị ekwesị?

4 Aha Jehova n’onwe ya pụtara ya ịdị na-eme mgbanwe. “Jehova” pụtara n’ụzọ nkịtị “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Ihe àmà na-egosi na nke pụtara na Jehova na-eme onwe ya ka ọ bụrụ Onye Mmezu nke nkwa ya nile. Mgbe Mosis jụrụ Chineke aha ya, Jehova nyere nkọwa banyere ihe ọ pụtara n’ụzọ dị otú a: “M gaje ịghọ ihe m gaje ịghọ.” (Ọpụpụ 3:14, NW) Nsụgharị Rotherham tinyere ya hoo haa otú a: “M Ga-aghọ ihe ọ bụla masịrị m.” Jehova na-aghọ, ma ọ bụ na-ahọrọ ịghọ, ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo nzube na nkwa ezi omume ya nile. Otú a, o nwere ọtụtụ utu aha ndị na-adọrọ mmasị, dị ka Onye Okike, Nna, Eze Onyenwe Anyị, Onye Ọzụzụ Atụrụ, Jehova nke usuu nile nke ndị agha, Onye Na-anụ ekpere, Onyeikpe, Onye Ozizi Kasị Ukwuu, Onye Mgbapụta. O mewo onwe ya ka ọ ghọọ ihe ndị a dum na karịa iji mezuo nzube ya dị iche iche nke ịhụnanya.​—⁠Aịsaịa 8:13; 30:20; 40:28; 41:14; Abụ Ọma 23:1; 65:2; 73:28; 89:26; Ndị Ikpe 11:27; leekwa New World Translation, Appendix 1J.

5. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ikwubi na ime mgbanwe Jehova pụtara na ọdịdị na ụkpụrụ ya nile na-agbanwe agbanwe?

5 Mgbe ahụ, nke a ọ̀ pụtara na ọdịdị ma ọ bụ ụkpụrụ nile nke Chineke na-agbanwe agbanwe? Ee e; dị ka Jemes 1:17 si tinye ya, “Onye ọghụgha ọ bụla na-apụghị ịdị n’ebe Ọ nọ, ma ọ bụ onyinyo nke nchigharị na-eweta.” È nwere mmegiderịta n’ebe a? Ee e ma ọlị. Dị ka ihe atụ, olee nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya nke na-adịghị agbanwe ọrụ ya iji baara ụmụ ya uru? N’ime oge dum gafere n’otu ụbọchị, nne ma ọ bụ nna pụrụ ịbụ onye ndụmọdụ, osi ite, onye nlekọta ụlọ, onye nkụzi, onye ọzụzụ, enyi, mekanik, nọọsụ​—⁠ndepụta ya nọ nnọọ na-aga n’ihu. Nne ma ọ bụ nna ahụ adịghị agbanwe ọdịdị ya mgbe ọ na-aba n’ọrụ ndị a; nanị ihe ọ na-eme bụ ime mgbanwe dị ka mkpa e nwere si dị. Otú ahụ ka ọ dị n’ebe Jehova nọ ma ọ bụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka elu nke ukwuu. E nweghị ọgwụgwụ n’ihe ndị ọ pụrụ ime onwe ya ka ọ ghọọ maka abamuru ihe ndị o kere. Omimi nke amamihe ya na-ebu isi n’ezie!​—⁠Ndị Rom 11:33.

Ezi Uche Bụ Akara nke Amamihe Chineke

6. Gịnị bụ ihe nkịtị okwu Grik Jemes ji mee ihe n’ịkọwa amamihe Chineke pụtara, oleekwa ihe ndị ọ gụnyere?

6 Onye na-eso ụzọ bụ́ Jemes jiri okwu na-akpali mmasị mee ihe iji kọwaa amamihe nke Chineke nke a na-eme mgbanwe n’ụzọ kasị ukwuu. O dere: “Amamihe nke si n’elu bịa . . . [nwere] ezi uche.” (Jemes 3:17, NW) Okwu Grik o jiri mee ihe ebe a (e·pi·ei·kesʹ) siri ike ịsụgharị. Ndị nsụgharị ejiwo okwu ndị dị ka “ịdị obi ọma,” “ime ebere,” “ịnagide,” na “ichebara echiche,” mee ihe. New World Translation sụgharịrị ya ịbụ “inwe ezi uche,” na-enwe ntụaka ala ala peji nke na-egosi na ihe ọ pụtara n’ụzọ nkịtị bụ “ịdị na-ekwenye ekwenye.”a Okwu ahụ na-enyekwa echiche nke esighị ọnwụ n’ihe nile ọ bụla iwu kwuru, bụrụ onye na-adịghị eme mgbanwe ma ọ bụ gbaa isi akwara n’ụzọ na-enweghị isi. Onye mmụta bụ́ William Barclay na-ekwu n’akwụkwọ bụ́ New Testament Words, sị: “Isi ihe banyere epieikeia bụ na ọ na-amalite n’ebe Chineke nọ. Ọ bụrụ na Chineke eguzogide n’ihe ndị ruuru ya, ọ bụrụ na Chineke atụkwasị anyị nanị ụkpụrụ iwu ya ndị dị ike, olee ebe anyị ga-anọ? Chineke bụ ihe nlereanya kasị elu nke onye dị epieikēs na onye ji epieikeia na-emeso ndị ọzọ.”

7. Olee otú Jehova si gosipụta ezi uche n’ogige Iden?

7 Tụlee oge mgbe ihe a kpọrọ mmadụ nupụrụ isi megide ọkaaka Jehova. Lee ka ọ ga-esiworị dị mfe Chineke igbusịsị ndị nnupụisi atọ ahụ na-enweghị ekele​—⁠Adam, Iv, na Setan! Lee aha oké obi mgbu ọ gaara egbochiworo onwe ya! Ònye kwa gaara agbagha na o nweghị ikike ịchọ ezi ikpe dị otú ahụ nke na-enweghị mgbanwe? Ka o sina dị, ọ dịghị mgbe Jehova mere ka a kpọchigide nzukọ eluigwe ya nke yiri ụgbọ ịnyịnya n’ime ụkpụrụ ezi ikpe nke dị ike, na-adịghị eme mgbanwe. Ya mere ụgbọ ịnyịnya ahụ agbaraghị gaba n’ụzọ na-enweghị nkwụsị ma kwọgbuo ezinụlọ mmadụ na olileanya nile maka ọdịnihu obi ụtọ nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, Jehova nyagharịrị ụgbọ ịnyịnya ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ yiri nke àmụ̀má. Ozugbo nnupụisi ahụ gasịrị, Jehova Chineke setịpụrụ nzube ga-ewe ogologo oge nke chere ebere na olileanya n’ihu ụmụ nile nke Adam.​—⁠Jenesis 3:15.

8. (a) Olee otú echiche hiere ụzọ nke Krisendọm banyere ezi uche si dị iche n’ezigbote inwe ezi uche nke Jehova? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ezi uche Jehova apụtaghị na ọ pụrụ imebi ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke?

8 Otú ọ dị, ezi uche Jehova apụtaghị na ọ pụrụ imebi ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke. Chọọchị dị iche iche nke Krisendọm taa pụrụ iche na ha na-enwe ezi uche mgbe ha na-agba omume rụrụ arụ nkịtị nanị iji nweta ihu ọma nke ìgwè atụrụ ha na-eme otú masịrị ha. (Tụlee 2 Timoti 4:3.) Ọ dịghị mgbe Jehova mebiri iwu ndị nke ya, ọ dịghịkwa emebi ụkpụrụ ya dị iche iche. Kama nke ahụ, ọ na-egosi ịdị njikere ikwenye, ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ, ka e wee tinye ụkpụrụ ndị ahụ n’ọrụ n’ụzọ ikpe ziri ezi ma n’ụzọ ebere. Ọ na-eburu n’uche mgbe nile iji ịhụnanya ya na amamihe ya ezi uche dị na ya mee ka ezi ikpe na ike ya nọrọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma. Ka anyị tụlee ụzọ atọ Jehova si egosipụta ezi uche.

“Na-agbaghara Mmehie”

9, 10. (a) Gịnị ka “na-agbaghara mmehie” na inwe ezi uche nwekọrọ? (b) Olee otú Devid si rite uru site na Jehova ịdị na-agbaghara mmehie, n’ihi gịnịkwa?

9 Devid dere, sị: “N’ihi na Gị onwe gị, Onyenwe anyị, dị mma, Ị bụkwa onye na-agbaghara mmehie, Ị na-abakwa ụba n’ebere n’ahụ ndị nile na-akpọku Gị.” (Abụ Ọma 86:5) Mgbe a sụgharịrị Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Grik, a kpọrọ okwu e ji mee ihe maka “na-agbaghara mmehie” e·pi·ei·kesʹ, ma ọ bụ “ezi uche.” N’ezie, ịdị na-agbaghara mmehie ma na-egosi ebere bụ ma eleghị anya akụkụ kasị mkpa isi gosipụta ezi uche.

10 Devid n’onwe ya maara nke ọma otú Jehova nweruru ezi uche n’akụkụ nke a. Mgbe Devid kwasoro Bat-sheba iko ma mee ndokwa ka e gbuo di ya, ma ya ma Bat-sheba kwesịrị ntaramahụhụ nke ọnwụ. (Deuterọnọmi 22:22; 2 Samuel 11:​2-⁠27) Ọ bụrụ na ndị ọkà ikpe bụ mmadụ bụ́ ndị na-adịghị eme mgbanwe kpere ikpe ahụ, ha abụọ pụrụ ịtụfuwo ndụ ha. Ma Jehova gosipụtara inwe ezi uche (e·pi·ei·kesʹ), nke, dị ka Vine’s Expository Dictionary of Biblical Words si kwuo ya, “na-akọwa nchebara echiche ahụ nke na-ele anya ‘site ná mmetụta na ezi uche n’ihe ndị bụ eziokwu n’ikpe.’” Ihe bụ eziokwu ndị metụtara mkpebi obi ebere nke Jehova nwere ike ịgụnye nchegharị sitere n’ezi obi nke ndị ahụ mejọrọnụ na obi ebere Devid n’onwe ya gosiworo n’ebe ndị ọzọ nọ. (1 Samuel 24:4-⁠6; 25:32-⁠35; 26:7-⁠11; Matiu 5:7; Jemes 2:13) Otú ọ dị, n’ikwekọ ná nkọwa Jehova nke onwe ya n’Ọpụpụ 34:​4-⁠7, ọ bụ ihe ezi uche na Jehova ga-agbazi Devid olu. O ji Netan onye amụma zigara Devid ozi dị ike, na-eme ka eziokwu ahụ bụ na o lelịwo okwu Jehova anya doo Devid anya. Devid chegharịrị, ya mere ọ nwụghị n’ihi mmehie ya.​—⁠2 Samuel 12:​1-⁠14.

11. Olee otú Jehova si gosi ịdị na-agbaghara mmehie n’ọnọdụ nke Manase?

11 Ihe nlereanya nke Eze Manase nke Juda dị ịrịba ama karị n’akụkụ nke a, ebe ọ bụ na Manase, n’adịghị ka Devid, gbara ajọ mmadụ nke ukwuu ruo ogologo oge. Manase kwalitere omume okpukpe ndị a na-asọ oyi n’ala ahụ, gụnyere iji mmadụ achụ àjà. Ọ pụrụ ịbụwo ya kpatara onye amụma kwesịrị ntụkwasị obi ịbụ onye “a kwọwara.” (Ndị Hibru 11:37) Iji taa Manase ahụhụ, Jehova kwere ka e buru ya laa dị ka onye e ji eji na Babilọn. Otú ọ dị, Manase chegharịrị n’ụlọ mkpọrọ ma rịọ maka ebere. Ná nzaghachi nye nchegharị nke a sitere n’obi, Jehova ‘gbaghaara ya mmehie’​—⁠ọbụna n’ọnọdụ nke a gabigara ókè.​—⁠2 Ihe Emere 33:​9-⁠13.

Ịgbanwe Ụzọ Ime Ihe Ka Ọnọdụ Ndị Ọhụrụ Na-ebilite

12, 13. (a) N’ọnọdụ nke Nineve, mgbanwe ọnọdụ dị aṅaa kpaliri Jehova ịgbanwe ụzọ ya? (b) Olee otú Jona si ghọọ onye na-enweghị ezi uche dị ka Jehova Chineke?

12 Ezi uche Jehova na-apụtakwa ìhè n’ịdị njikere ya ịgbanwe ụzọ a chọrọ iji mee ihe dị ka ọnọdụ ndị ọhụrụ na-ebilite. Dị ka ihe atụ, mgbe Jona onye amụma gagharịrị n’okporo ámá dị iche iche nke Nineve oge ochie, ozi ya sitere n’aka mmụọ nsọ dị nnọọ mfe: A ga-ebibi obodo ukwu ahụ n’ime 40 ụbọchị. Otú ọ dị, ọnọdụ gbanwere​—⁠n’ụzọ dị ịtụnanya! Ndị Nineve chegharịrị.​—⁠Jona, isi nke 3.

13 Ọ bụ ihe izi ihe iji ụzọ Jehova si meghachi ná mgbanwe ọnọdụ a tụnyere ụzọ nke Jona. N’ụzọ bụ isi Jehova chigharịrị ụzọ ụgbọ ịnyịnya eluigwe ya si aga. N’ọnọdụ nke a o mere mgbanwe, na-eme onwe ya ka ọ ghọọ onye na-agbaghara mmehie kama ịbụ “onye agha.” (Ọpụpụ 15:3) Jona, n’aka nke ọzọ, adịghị nro ma ọlị. Kama isochi ụgbọ ịnyịnya Jehova ụkwụ na ụkwụ, o mere ihe yikarịrị nke ụgbọ okporo ígwè obu ngwongwo ma ọ bụ nnukwute ụgbọ mmiri na-ebu mmanụ nke a kpọtụrụ aha na mbụ. O kwusawo ọdachi, ya mere a ghaghị inwe ọdachi! Ma eleghị anya o chere na mgbanwe ọ bụla n’ụzọ ihe omume ga-emechu ya ihu n’anya ndị Nineve. Ma, site ná ndidi, Jehova kụziiri onye amụma ya na-agba isi akwara ihe mmụta a na-agaghị echefu echefu n’inwe ezi uche na ebere.​—⁠Jona, isi nke 4.

14. N’ihi gịnị ka Jehova ji gbanwee ụzọ ime ihe ya n’ihe banyere onye amụma ya bụ́ Ezikiel?

14 Jehova agbanwewo ụzọ n’oge ndị ọzọ​—⁠ọbụna banyere ihe ndị na-adịchaghị ukwuu. Dị ka ihe atụ, otu oge mgbe o nyere Ezikiel onye amụma ọrụ ime ihe nkiri nke amụma, ntụziaka Jehova gụnyere iwu na Ezikiel ga-esi nri ya n’ọkụ nke e ji nsị́ mmadụ menwuo. Nke a gbakara onye amụma ahụ isi, bụ́ onye tiri mkpu sị, “Ewo, Onyenwe anyị Jehova!” wee rịọ ka a ghara ime ya ka o mee ihe ọ na-asọ oyi. Jehova elegharaghị mmetụta nke onye amụma ahụ anya dị ka nke onye uche na-ezuchaghị ezu; kama nke ahụ, O kwere ka Ezikiel jiri nsị́ ehi mee ihe, bụ́ ihe ọtụtụ ndị ji amụnye ọkụ n’ọtụtụ ala ruo taa.​—⁠Ezikiel 4:​12-⁠15.

15. (a) Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi na Jehova adịwo njikere ịṅa ntị na ịzaghachi ụmụ mmadụ? (b) Ihe mmụta dị aṅaa ka nke a pụrụ izi anyị?

15 Ọ̀ bụ na ọ dịghị ekpo obi ọkụ iche echiche banyere ịdị umeala n’obi nke Chineke anyị bụ́ Jehova? (Abụ Ọma 18:35) Ọ dị elu nke ukwuu karịa anyị; ma ọ na-eji ndidi na-ege ụmụ mmadụ na-ezughị okè ntị na ọbụna na-agbanwe ụzọ ya otú kwekọrọ ekwekọ mgbe ụfọdụ. O kwere ka Abraham rịọ ya arịrịọ ogologo oge banyere mbibi Sọdọm na Gọmọra. (Jenesis 18:​23-⁠33) O kwekwara ka Mosis welite okwu mgbochi dị iche iche maka nzube Ya ibibi ndị Israel na-enupụ isi ma kama nke ahụ ka e nwee mba ukwu site na Mosis. (Ọpụpụ 32:​7-⁠14; Deuterọnọmi 9:​14, 19; tụlee Emọs 7:​1-⁠6.) O si otú ahụ setịpụ ihe nlereanya zuru okè maka ụmụ mmadụ na-ejere ya ozi, bụ́ ndị kwesịrị igosi ịdị njikere dị otú ahụ ịṅa ndị ọzọ ntị mgbe ezi uche dị na ya ma kwekwa omume ime otú ahụ.​—⁠Tụlee Jemes 1:19.

Ezi Uche n’Iji Ịbụ Isi Eme Ihe

16. Olee otú Jehova si dị iche site n’ọtụtụ mmadụ n’ụzọ o si eji ịbụ isi ya eme ihe?

16 Ọ̀ dịwo mgbe ị rịbara ama na ka ndị mmadụ na-enwetakwu ikike, ọtụtụ na-eyi ka ha na-aghọwanye ndị na-enweghị ezi uche? Jehova, n’ụzọ dị iche, nwere ọkwá kasị elu nke ịbụ isi n’eluigwe na ala, ma ọ bụ ihe nlereanya kasịnụ nke inwe ezi uche. Ọ na-eji ịbụ isi ya eme ihe n’ụzọ ezi uche na-aghaghị ịdị ya. N’adịghị ka ọtụtụ mmadụ, Jehova adịghị atụ egwu banyere ịbụ isi ya, ya mere ọ dịghị enwe mmetụta ịbụ onye a manyere iji ekworo chebe ya​—⁠dị ka a ga-asị na inye ndị ọzọ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịbụ isi pụrụ iyitụ nke ya egwu. N’ezie, mgbe e nwere nanị otu onye ọzọ n’eluigwe na ala, Jehova nyefere onye ahụ ịbụ isi dị nnọọ ukwuu. O mere Logos ahụ “onye ọkà,” malite mgbe ahụ na-eme ka ihe nile dịrị adị site n’Ọkpara nke a a hụrụ n’anya. (Ilu 8:​22, 29-⁠31; Jọn 1:​1-3, 14; Ndị Kọlọsi 1:​15-⁠17) O mesịrị nyefee ya “ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa.”​—⁠Matiu 28:18; Jọn 5:22.

17, 18. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji ziga ndị mmụọ ozi na Sọdọm na Gọmọra? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ji gwa ndị mmụọ ozi ka ha tụọ aro n’ụzọ isi rafuo Ehab?

17 N’otu aka ahụ, Jehova na-enyefe ọtụtụ ndị o kere eke ọrụ ndị ọ pụrụ ịrụ ọbụna nke ọma karị n’onwe ya. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ gwara Abraham sị, “ka M rịdakwa [ruo Sọdọm na Gọmọra], hụ ma ọ bụ dị ka iti mkpu ya si dị, nke ruru m ntị, ka ha mezuworo,” o bughị n’uche na ya ga-aga n’ebe ahụ n’onwe ya. Kama nke ahụ, Jehova họọrọ inyefe ikike, na-ahọpụta ndị mmụọ ozi inwetara ya ihe ọmụma dị otú ahụ. O nyere ha ikike ịrụzu ọrụ nke a nke ịchọpụta ihe mere eme na iweghachiri ya ozi.​—⁠Jenesis 18:​1-3, 20-⁠22.

18 N’oge ọzọ, mgbe Jehova kpebiri imezu ihe e kpere n’ikpe n’isi Eze Ehab obi ọjọọ, Ọ kpọrọ ndị mmụọ ozi òkù ná mgbakọ eluigwe ka ha tụọ aro banyere ụzọ isi ‘rafuo’ eze ahụ si n’ezi ofufe dapụ gaa n’isonye n’ibu agha nke ga-eweta ndụ ya ná njedebe. N’ezie, Jehova, Isi Iyi nke amamihe nile, enweghị mkpa nke ichepụta ụzọ ime ihe nke kasị mma! Ma, ọ kwanyeere ndị mmụọ ozi ahụ ùgwù site n’inye ha ihe ùgwù nke ịtụ aro ihe ngwọta dị iche iche na inye ha ikike iji nke ọ họọrọ mee ihe.​—⁠1 Ndị Eze 22:​19-⁠22.

19. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji akpara ọnụ ọgụgụ nke iwu ndị ọ na-eme ókè? (b) Olee otú Jehova si egosi onwe ya ịbụ onye nwere ezi uche mgbe a bịara n’ihe ọ na-atụ anya ya n’aka anyị?

19 Jehova adịghị eji ịbụ isi ya achịkwa ndị ọzọ n’ụzọ na-enweghị isi. Na nke a kwa ọ na-egosipụta ezi uche na-enweghị atụ. Ọ na-eji nlezianya na-akpara ọnụ ọgụgụ iwu ndị ọ na-eme ókè ma na-egbochi ndị na-ejere ya ozi ka ha ghara ‘ịgabiga ihe e dere ede’ site n’ịtụkwasị iwu ndị bụ ibu arọ bụ́ nke ha onwe ha guzobere. (1 Ndị Kọrint 4:6; Ọrụ 15:28; tụnyere ha Matiu 23:4.) Ọ dịghị mgbe ọ na-achọ nrubeisi kpuru ìsì n’aka ndị o kere, ma ọ na-enyekarị ihe ọmụma zuru ezu iji duzie ha ma tinye nhọrọ ahụ n’ihu ha, na-eme ka ha mara abamuru nile nke ịṅa ntị na ihe ndị aṅaghị ntị ga-arụpụta. (Deuterọnọmi 30:​19, 20) Kama ịdị na-amanye ndị mmadụ site n’obi amamikpe, ihere, ma ọ bụ egwu, ọ na-ekwu okwu iji ruo n’obi; ọ chọrọ ka ndị mmadụ jeere ya ozi site n’ezi ịhụnanya kama ịbụ ná mmanye. (2 Ndị Kọrint 9:7) Ozi nile dị otú ahụ e ji obi dum jee na-eme ka obi Chineke ṅụrịa, ya mere ọ bụghị onye “ọ na-esi ike imeta mma” n’ụzọ ezi uche na-adịghị ya.​—⁠1 Pita 2:18, NW; Ilu 27:11; tụlee Maịka 6:8.

20. Olee otú ezi uche Jehova si emetụta gị?

20 Ọ̀ bụ na ọ dịghị ịrịba ama na Jehova Chineke, onye nwere ike karịa onye ọ bụla e kere eke, adịghị mgbe ọ na-egosipụta ike ahụ n’ụzọ ezi uche na-adịghị ya, ọ dịghị mgbe ọ na-eji ike amanye ndị ọzọ? Otú ọ dị, ụmụ mmadụ, ndị pere oké mpe ma e jiri ha tụnyere ya, nwere akụkọ nke ịdị na-achịgbu ibe ha. (Eklisiastis 8:9) N’ụzọ doro anya, ezi uche bụ àgwà dị oké ọnụ ahịa, otu nke na-akwali anyị ịhụkwu Jehova n’anya. Nke ahụ, n’akụkụ nke ya, pụrụ ịkpali anyị ịzụlite àgwà nke a n’onwe anyị. Olee otú anyị pụrụ isi mee otú ahụ? Isiokwu na-esonụ ga-atụle okwu nke a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Laa azụ na 1769, onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ John Parkhurst kọwara okwu ahụ dị ka “ịdị na-ekwenye ekwenye, nke àgwà ikwenye ekwenye, obi ọma, nwayọọ, ndidi.” Ndị mmụta ndị ọzọ nyekwara “ịdị na-ekwenye ekwenye” dị ka nkọwa.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Olee otú aha Jehova na ọhụụ ahụ nke ụgbọ ịnyịnya eluigwe si emesi ikike ime mgbanwe ya ike?

◻ Gịnị bụ inwe ezi uche, n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ akara nke amamihe Chineke?

◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova siworo gosi na ya “na-agbaghara mmehie”?

◻ N’ihi gịnị ka Jehova jiworo họrọ ịgbanwe ụzọ ọ chọrọ isi mee ihe n’ọnọdụ ụfọdụ?

◻ Olee otú Jehova si egosipụta ezi uche n’ụzọ o si eji ịbụ isi eme ihe?

[Foto dị na peeji nke 10]

N’ihi gịnị ka Jehova ji gbaghara Eze Manase dị obi ọjọọ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya