Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị ndị kpuru Ìsì?
JOHN MILTON rọrọ abụ uri ya ndị bụ́ Paradise Lost na Paradise Regained ọ bụ ezie na o kpuru ìsì kpam kpam. Ịbụ ma onye kpuru ìsì ma onye ntị chiri egbochighị Helen Keller n’ọrụ ọ na-eso ndị nwere nkwarụ na-arụ. Ee, ọtụtụ ndị kpuru ìsì na-anagide ya nke ọma. Ma lee ihe magburu onwe ya ọ ga-abụ ma onye ọ bụla nwee ike ịdị na-ahụ ụzọ nke ọma! Ị ga-ekwere nke a karịsịa ma ọ bụrụ na i nwere onye ị hụrụ n’anya ma ọ bụ enyi kpuru ìsì ma ọ bụ na-adịghị ahụzi ụzọ nke ọma.
N’eziokwu, n’ụfọdụ mba usoro e ji enyere ndị ọrụsị aka ịba uru na-ezi ndị na-adịghị ahụ ụzọ nkà ndị e ji ebi ndụ kwa ụbọchị. Mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì na nkịta ndị a zụrụ idu ndị ìsì na-enyere ndị ìsì aka ilekọta ọtụtụ n’ime mkpa ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị na-ele ikpu ìsì anya dị ka ọrụsị a kasị atụ egwu. Otu onye na-ede akwụkwọ kwuru, sị: “Ikpu ìsì bụ ịtụfu akụkụ kasị mkpa nke ihe ndị anyị ji amata ihe.” N’otu oge ahụ, ọtụtụ aghaghị ịdabere n’ebe ndị ọzọ nọ n’ụzọ dị ukwu.
N’ihi gịnị, ka ị pụrụ ịjụ, ka ikpu ìsì ji jupụta ebe nile? Ọ dị mma, ị̀ nụwo banyere ọrịa anya a na-akpọ trachoma? Ọ na-akpata ihe dị ka nde itoolu nke ikpu ìsì. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica kwuru banyere ya, sị: “Ọrịa ahụ na-efe efe ma na-amụba ebe ụba ndị mmadụ kwụkwụkọtara ọnụ na gburugburu ebe obibi na-adịghị ọcha. Ụkọ mmiri maka ịsacha ihe, na nde kwuru nde nke ijiji nsị mmadụ na-adọta, na-enye aka ikesa ọrịa ahụ. N’ụzọ ụfọdụ trachoma bụkarịrị nsogbu mmekọrịta nke ọha mmadụ karịa nke ọgwụ; ọ bụrụ na a pụrụ imeziwanye ọ̀tụ̀tụ̀ obibi ndụ, belata njubiga ókè, gbochie ijiji, jide n’aka na e nwere mmiri ga-ezunụ, nsogbu nke trachoma ga-ebelata ngwa ngwa.” Ihe dị ka otu nde ọzọ nwere ìsì osimiri. Ma ọ bụ gịnị banyere xerophthalmia? Ọ bụ ezie na aha ahụ tara akpụ ọkpụkpọ, eziokwu dị na ya bụ na ọ bụ ihe na-akpatakarị ikpu ìsì. Ọrịa mamịrị, mgbapịa nkọlọ, àkpàtà, oké ahụ ọkụ, na ọrịa ndị a na-ebute ná mmekọahụ pụkwara iduje n’ikpu ìsì.
Ka anyị na-akawanye nká, ọhụhụ ụzọ anyị pụrụ ịdalata n’ihi nsogbu ndị dị ka nrichapụ nke etiti mkpụrụ anya na ọrịa glaucoma, anyị apụghịkwa ịgụpụ ọrịa cataract. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Ọrịa cataract ka nọkwa n’elu ná ndepụta nke ihe ndị na-akpata ikpu ìsì n’ọtụtụ mba n’ụwa, nke a bụkwa ihe ọjọọ karị n’ihi na a pụrụ ịgwọ ya n’ụzọ dị mfe site n’ịwapụ ya awapụ.”
N’agbanyeghị nchọpụta ndị ọhụrụ nke nkà mmụta ihe banyere anya, mkpochapụ nke ìsì yiri ihe ka dị anya. Otu akwụkwọ nkà mmụta ahụ sịrị: “Ọganihu ndị e nwere n’igbochi na ịgwọ ìsì site n’inye ọgwụ na ịwa ahụ pụrụ nanị ịbara ụba mmadụ nwere ike inweta nlekọta ahụ ike uru. Ruo mgbe a pụrụ imeziwanye ọ̀tụ̀tụ̀ iri ihe ndị na-edozi ahụ na ịdị ọcha nke akụkụ dị ukwuu nke ndị bi n’ụwa, ikpu ìsì ndị a pụrụ igbochi ga-anọgide n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya dị elu ugbu a.”
Ọ bụ ezie na ọgwụ ndi na-egbochi nje ọrịa na ịwa ahụ na-aba uru n’ọgụ a na-alụso ikpu ìsì, olileanya nke ọgwụgwọ na-adịgide adịgide bụ nke e jikọrọ ya na ihe mere n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga.
Ịgwọ Ndị Ìsì n’Ụbọchị Jisọs
Jiri anya nke uche hụ nwoke nọ ná mmalite 30 afọ ya nke na-azọ njem n’okporo ụzọ dị úzúzú. Ịnụ na ọ na-agafe, ndị ìsì abụọ nọ n’akụkụ ụzọ tiri mkpu, sị: “Meere anyị ebere.” Ọ bụ ezie na ndị na-ahụ ihe na-emenụ baara ha mba ka ha kwuchie ọnụ, ndị ìsì ahụ tiri mkpu dara ụda, sị: “Meere anyị ebere.” Nwoke ahụ jiri obi ọma jụọ, sị: “Gịnị ka unu na-achọ ka M meere unu?” N’oké mmasị ha zara, sị: “Ka e wee meghee anya anyị.” Ugbu a cheedị echiche: Nwoke ahụ metụrụ anya ha aka, ozugbo ahụkwa ha hụwara ụzọ!—Matiu 20:29-34.
Lee ihe ọṅụ ọ ga-abụrụ ndị ikom a bụbu ndị ìsì! Ma, ikpu ìsì jupụtara ebe nile. Nke a bụ nanị otu n’ime ha. Gịnị mere i kwesịrị iji leba ya anya? N’ihi na ọ bụ Jisọs nke Nazaret ji obi ọma mee ka ha na-ahụ ụzọ. N’eziokwu, e wezụga ịbụ onye ‘e tere mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma,’ Jisọs bụ onye ‘e zitere ikwusa ịhụ ụzọ gwa ndị ìsì.’—Luk 4:18.
Ọgwụgwọ ọrụ ebube ndị ahụ e ji mmụọ nsọ dị ike nke Chineke rụọ juru ndị mmadụ anya. Anyị na-agụ, sị: “O juru ìgwè mmadụ ahụ anya, mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha na-ekwu okwu, na ndị ọrụsị ka ahụ ha dị mma, na ndị ngwụrọ ka ha na-eje ije, na ndị ìsì ka ha na-ahụ ụzọ: ha wee too Chineke nke Israel.” (Matiu 15:31) N’efughị ihe ọ bụla ma ọ bụ ngosi ikike onwe onye ma o bụ ịchọ otuto onwe ya n’ọgwụgwọ ndị ahụ, Jisọs mere ka a hụ ịhụnanya na ebere Jehova Chineke nke ọma. Otú ọ dị, Jisọs nwekwara ọmịiko maka ndị kpuru ìsì n’ụzọ ime mmụọ na ndị a na-adịghị enyere aka bụ́ ndị a ‘na-achụsa dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’—Matiu 9:36.
Ọ bụ ezie na akụkọ dị otú ahụ na-adọrọ mmasị, ị pụrụ ịjụ, sị, Gịnị banyere taa? Ebe ọ na-enweghị onye na-agwọ ndị mmadụ taa dị ka Jisọs mere, ọgwụgwọ ndị ahụ ò nwere ihe ha pụtara nye anyị? È nwere olileanya ọ bụla dịịrị ndị ìsì? Biko gụọ isiokwu na-esonụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
“Ruo mgbe a pụrụ imeziwanye ọ̀tụ̀tụ̀ iri ihe na-edozi ahụ na ịdị ọcha nke akụkụ dị ukwuu nke ndị bi n’ụwa, ikpu ìsì ndị a pụrụ igbochi ga-anọgide n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya dị elu ugbu a.”—The New Encyclopædia Britannica