Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 8/15 p. 5-7
  • Imeghe Anya Nye Ozi Ọma Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Imeghe Anya Nye Ozi Ọma Ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Imeri Ikpu Ìsì Ime Mmụọ
  • Nanị Ọgwụgwọ Na-adịgide Adịgide​—⁠Alaeze Chineke
  • Ọgwụgwọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ dị nso.a Jọn onyeozi mere ihe atụ nke usoro ọgwụgwọ nke Chineke nke a n’ụzọ mara mma: “O wee gosi m osimiri nke mmiri nke ndụ, na-enwu dị ka crystal, ka ọ na-esi n’ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ pụta, n’etiti ámá ya. N’akụkụ a na n’akụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ ka osisi nke ndụ dịkwa, na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ, na-enye mkpụrụ ya n’ọnwa n’ọnwa: akwụkwọ osisi ahụ bụ ihe ime ka ahụ dị mba nile ike.”​—⁠Mkpughe 22:​1, 2.
  • Obi Ụtọ n’Ụwa Ọhụrụ Chineke
  • Kụziere Ndị Ìsì Okwu Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị ndị kpuru Ìsì?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ndị Farisii Agbaa Nwoke Ahụ Kpuburu Ìsì Ajụjụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Agwọọ Otu Nwoke Kpuru Ìsì Malite Mgbe A Mụrụ Ya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 8/15 p. 5-7

Imeghe Anya Nye Ozi Ọma Ahụ

“IHU igwe adịghị ahapụ ịcha anụnụ anụnụ n’ihi na onye ìsì adịghị ahụ ya,” ka ilu ndị Denmark na-ekwu. Ma ná ndụ iji ọrụ n’aka anyị na-ebi kwa ụbọchị, ànyị na-ahụ na ihu igwe na-acha anụnụ anụnụ, dị ka a pụrụ ikwu ya? Ànyị na-eji obi ike ele ọdịnihu anya? Ànyị kweere n’ezie n’ozi ọma nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-enye?

N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị tụlere akụkụ dị iche iche nke ikpu ìsì nkịtị. Ugbu a ka anyị nyochaa otu ụdị ịhụ ụzọ nke dị mkpa nke ukwuu karị. O metụtara obi ụtọ anyị na-adịgide adịgide nakwa ọdịnihu nke ndị anyị hụrụ n’anya.

N’enweghị ihe ịrụ ụka, anyị na-eche “oge dị oké egwu” ihu. (2 Timoti 3:1) Gịnị na-eme ka ndị mmadụ na-adọga ịchọta ihe e ji ebi ndụ, na-edi ihe isi ike ahụ ike na nsogbu ezinụlọ, ma na-anagide ikpe na-ezighị ezi nke ọha mmadụ na ụkọ ịhụnanya? N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ na-achọpụta na obi ha tụkwasịrị mmadụ ibe ha, okpukpe, na ọchịchị na-adalata. N’ahụghị ụzọ mgbapụ, ụfọdụ na-ekwubi na a pụghị ịgwọta nsogbu ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma ọlị. N’akwụkwọ akụkọ Brazil bụ́ Jornal da Tarde, Jacob Pinheiro Goldberg sịrị: “Ndị mmadụ, mgbe ha na-eche ihe ndị na-emekpa ahụ na-eme eme ihu, na-ejupụta n’ọnụma nke ukwuu site ná njehie nke na ha adịghị echezi echiche, ha na-adaberekwa n’ịmata eziokwu site n’iche echiche miri emi nke na-akụda mmụọ.” Ma, ọbụna mgbe ihe gajọrọ, anyị na-achọ iji ezi echiche mee ihe, ọ̀ bụ na anyị adịghị eme otú ahụ?

Chetụdị echiche nwa oge na ị chọrọ ụlọ maka ezinụlọ gị, ego abụghịkwa nsogbu. Ma eleghị anya i legharịrị anya ma jee leta ụlọ dị iche iche n’akụkụ ebe obibi dịgasị iche. Ọ bụ ezie na ndị na-ere ala na-agbalị inye gị ihe ị chọrọ, ọ dịghị ebe a na-ahụ ụlọ nke bụ nnọọ obi gị. Ma, ebe ọ bụ na o metụtara afọ ojuju na ọdịmma nke ezinụlọ gị, ị dịghị ada mbà, ị̀ na-ada? Ugbu a jiri anya nke uche hụ obi ụtọ ga-adịnụ mgbe ị hụrụ ụlọ nke bụ ọchịchọ gị n’ikpeazụ.

Dị nnọọ ka ị ga-etinye oge n’ịchọ ụlọ ọhụrụ, gịnị mere ị gaghị enyocha Bible iji hụ ngwọta nye nsogbu gị? Dị nnọọ ka anyị na-aghaghị ịtụle ihe ndị bụ eziokwu mgbe anyị na-eme mkpebi banyere ụlọ, otú ahụ ka ọ dị anyị mkpa iche ezi echiche banyere ihe anyị na-agụta n’Okwu Chineke. Ọbụna ihe bara uru karịa ịchọta ụlọ bụ anyị ịhụ na ịnakwere eziokwu banyere Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. Jisọs sịrị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”​—⁠Jọn 17:3.

Ma ọ bụrụ na ozi nke Bible bara uru nke ukwuu, gịnị mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-anọgide n’ìsì n’ebe ozi ọma ya dị? Otu ihe kpatara ya bụ, nke a pụkwara iju ọtụtụ anya, “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) N’ihi ya, Setan bụ́ Ekwensu “mere ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì n’etiti ha, ka inye ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraịst, Onye bụ onyinyo Chineke, wee ghara ịwakwasị ha.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Ọ bụ ezie na anyị na-eji anya anyị ahụ ụzọ, ọ bụ ụbụrụ na-akọwa ìhè ahụ na-aba n’anya. Ya mere, a kọwakwara ikpu ìsì dị ka “enweghị ike ma ọ bụ adịghị njikere ịghọta ma ọ bụ ikpebi ihe.” Nke a na-echetara anyị otu okwu a ma ama: “O nweghị onye kpuru ìsì ka ndị ahụ na-achọghị ịhụ ụzọ.”

Onye kpuru ìsì apụghị ịhụ ihe nọ ya n’ihu, ya mere ọ pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ nke imerụ ahụ. Ikpu ìsì nkịtị nke ọtụtụ ndị bụ nke a na-apụghị imegharị ugbu a, ma ọ dịghị onye a na-amanye ịnọgide n’ìsì n’ụzọ ime mmụọ.

Imeri Ikpu Ìsì Ime Mmụọ

Dị nnọọ ka ọnọdụ ịdị ọcha na-ezughị ezu na-ebelata ịhụ ụzọ, gburugburu ebe na-emerụ omume pụrụ iweta ikpu ìsì n’omume. Ọzọkwa, Jisọs Kraịst dọrọ aka ná ntị megide ozizi na omenala ndị mmadụ mere. O mere ka o doo anya na ndị ndú okpukpe laa azụ n’oge ahụ na-eduhie atụrụ ha: “Ha bụ ndị ndú kpuru ìsì. Ma ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.”​—⁠Matiu 15:14.

Kama ịbụ ndị ndị ndú kpuru ìsì duhiere, lee aha obi ụtọ ndị meghere anya ha nye ozi ọma banyere Alaeze Chineke ga-enwe! Jisọs kwupụtara, sị: “Ọ bụ ikpe ikpe ka Mụ onwe m ji bịa n’ụwa nke a, ka ndị na-ahụghị ụzọ wee hụ.” (Jọn 9:39) Ma, olee otú ndị kpuru ìsì n’ụzọ ime mmụọ pụrụ isi hụwa ụzọ? Ọ dị mma, ka anyị gaa n’ihu ná ntụle nke ikpu ìsì nkịtị anyị na-eme.

Ndị na-adịghị ahụ ụzọ nke ọma nwere ihe dị iche iche ha ga-eji mee ihe. Nke a adịbughị otú ahụ. O nweghị oké ihe e mere iji nyere ndị ìsì aka tupu Valentin Haüy eguzobe ụlọ akwụkwọ pụrụ iche maka ndị kpuru ìsì na 1784. Ka oge na-aga, Louis Braille mepụtara usoro nke zara aha ya; o mere nke ahụ iji nyere ndị na-adịghị ahụ ụzọ nke ọma aka ịgụ ihe.

Gịnị banyere ndị kpuru ìsì n’ụzọ ime mmụọ? N’oge ndị na-adịchabeghị anya e mewo mgbalị ndị kpụ ọkụ n’ọnụ iji kwusaa ozi ọma nke a ọbụna n’akụkụ ebe bakarịsịrị n’ime nke ụwa. (Matiu 24:14) Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ iwetara ma ndị ìsì n’ụzọ ihe atụ ma ndị nke elu ahụ olileanya.

Otu nwanyị Brazil dere, sị: “Achọrọ m ikwu na n’agbanyeghị ezughị okè elu ahụ m, m pụrụ ịhụ ụzọ​—⁠n’ụzọ ime mmụọ. Lee Chineke dị ebube ọ bụ! Anyị nwere obi ụtọ ịmara na ‘Jehova na-asaghe aka ya, werekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’” (Abụ Ọma 145:16) Jorge kwa, onye kpuru ìsì n’ụzọ nkịtị, na-echeta, sị: “A pụrụ nnọọ ikewa ndụ m akụkụ abụọ: tupu na mgbe Ndịàmà bịasịrị. . . . Site n’aka ha, m malitere iji uche na-ahụ ụwa n’ụzọ doro anya ma na-enwupụ enwupụ. M na-enwe nkwekọrịta magburu onwe ya n’ebe onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ nọ.” N’ịbụ ihe ọṅụ, Bible na-emesi anyị obi ike na n’isi nso o nweghị onye ọ bụla nọ n’elu ala ga-ekpu ìsì​—⁠n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ. Olee otú nke ahụ ga-esi mee? Olee otú ọ ga-esi bụrụ eziokwu n’elu ala nile na “Jehova na-emeghe anya ndị ìsì”?​—⁠Abụ Ọma 146:8.

Nanị Ọgwụgwọ Na-adịgide Adịgide​—⁠Alaeze Chineke

N’agbanyeghị mmụba nke nkà ihe ọmụma ahụ ike, imerime ọrịa nọgidere na-akpata ikpu ìsì, ahụ mgbu, na ọnwụ. Ya mere, gịnị dị mkpa iji kpochapụ erighị nri na-edozi ahụ, adịghị ọcha nke akụkụ ebe obibi, na nhụsianya nke na-ewepụ ma ịhụ ụzọ ma ọṅụ nke ndụ? Ọgwụgwọ Jisọs gwọrọ ndị ìsì na ndị ọzọ bụ ihe atụ dị nta maka ọdịnihu. Dị ka ihe ọṅụ, ozizi na ọrụ ịgwọ ọrịa ya na-eme ihe atụ nke ngọzi a ga-agbasa n’elu ala n’okpuru ọchịchị Alaeze Chineke.

Ọgwụgwọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ dị nso.a Jọn onyeozi mere ihe atụ nke usoro ọgwụgwọ nke Chineke nke a n’ụzọ mara mma: “O wee gosi m osimiri nke mmiri nke ndụ, na-enwu dị ka crystal, ka ọ na-esi n’ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ pụta, n’etiti ámá ya. N’akụkụ a na n’akụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ ka osisi nke ndụ dịkwa, na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ, na-enye mkpụrụ ya n’ọnwa n’ọnwa: akwụkwọ osisi ahụ bụ ihe ime ka ahụ dị mba nile ike.”​—⁠Mkpughe 22:​1, 2.

Okwu ndị dị ka “mmiri nke ndụ” na “osisi nke ndụ” na-egosi na mgbe ajọ usoro ihe nke taa gwụsịrị, ihe ndị na-agwọ ọrịa nke Alaeze Chineke ga-enye ga-eji nwayọọ nwayọọ bulie ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’izu okè. N’eziokwu, uru nile nke àjà mgbapụta Jisọs (gụnyere mgbaghara zuru ezu nke mmehie), tinyekwara ihe ọmụma nke Jisọs Kraịst na Nna ya, ga-eweta ahụ ike zuru okè na ndụ ebighị ebi.​—⁠Jọn 3:16.

Obi Ụtọ n’Ụwa Ọhụrụ Chineke

Jiri anya nke uche hụ, mgbe ahụ, elu ala na-enweghị mpụ, mmetọ, ma ọ bụ ogbenye. Hụrụ ezinụlọ gị ka ha na-ebi n’udo na Paradaịs e weghachiri eweghachi. (Aịsaịa 32:​17, 18) Lee ihe ọṅụ ọ ga-abụ iji ike anyị ji amata ihe na uche nke zuru okè na-ahụ ịtụ àgwà dị iche iche!

“Ọnọdụ ebumpụta ụwa nke mmadụ bụ ibi n’akụkụ ebe obibi na-anọgide na-agbanwe​—⁠nke ìhè, àgwà, ọdịdị dị iche iche. E nweghị ihe dị ka nanị otu akụkụ ebe obibi n’okike,” ka Faber Birren kwuru. “Ịtụ àgwà bụ otu n’ime ihe ọṅụ nke okike nke ụwa nke a. Ọ bụ ihe a na-ahụkarị n’okike, ọ bụghị nanị n’ọnọdụ ole na ole, ihe dịkwa ukwuu ná ndụ dị mma dabeere na ya.”

Lee aha ihe dị oké ọnụ ahịa onyinye nke ịhụ ụzọ bụ! Lee ụdị ihe ọṅụ ọ ga-abụ mgbe anya nke kpuburu ìsì​—⁠n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ⁠—​ga-ahụ ụzọ!

Ee, na Paradaịs e weghachiri eweghachi nke na-abịanụ, ikpu ìsì na ọrụsị ndị ọzọ agaghịkwa akpata obi ilu! E nweghịkwa onye a ga-eduhie ọzọ. Ebe ezi ịhụnanya ga-ejupụta, a ga-eme ka mmadụ nile nwee mmepeanya n’ụzọ ime mmụọ. Nke ahụ, na karịa, ga-eme n’ọdịnihu dị nso, ma ugbu a kpọmkwem bụ oge ịbụ onye nwere nnwapụta nke Onye ahụ ga-emezu nkwa ya e buru n’amụma, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì”!​—⁠Aịsaịa 35:5.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Biko nyochaa ihe àmà e nyere n’akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, isiakwụkwọ nke 18, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 7]

Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya