Inwe Obi Ụtọ n’Ezi Òtù Ụmụnna Zuru Ụwa Ọnụ
DỊ KA WILLIE DAVIS SI KỌỌ
Na 1934 Oké Ndakpọ ahụ na-ejikpọ ụwa, United States nọkwa n’ihe isi ike nke ọgba aghara akụ̀ na ụba. N’èzí Prospect Relief Station na Cleveland, Ohio, otu onye uwe ojii na onye kwenyesiri ike n’ọchịchị Kọmunist na-alụ ọgụ. Onye uwe ojii ahụ gbagburu onye Kọmunist ahụ na otu onye na-ekiri ihe na-emenụ, nne nne m, bụ́ Vinnie Williams.
NDỊ Kọmunist gbalịrị ịrọgharị ọnwụ ndị a ka ha bụrụ ihe metụtara agbụrụ, ebe nne nne m bụ onye isi ojii, onye uwe ojii abụrụ onye ọcha. Ha kesara akụkọ e bipụtara ebipụta nke bu isiokwu ndị dị ka “Ndị Uwe Ojii Cleveland Na-akpa Ókè Agbụrụ” na “Bọọ Ọ́bọ̀ Ogbugbu Ndị A.” Ndị Kọmunist mere ndokwa ma hụ maka ememe olili ozu nne nne m. M nwere foto nke ndị buru ozu ahụ—ha nile bụcha ndị ọcha, ha nile bụkwa ndị òtù Kọmunist ahụ. Onye ọ bụla weliri aka a kwụkwụchiri akwụkwụchi elu n’ụzọ nke e mesịrị na-eji eme ihe dị ka ihe ngosipụta nke Ike Ndị Isi Ojii.
Mgbe nne nne m nwụrụ, ada ya bu m n’akpa nwa ya, a mụkwara m mgbe ọnwa anọ gasịrị. Etolitere m na-enwe nsogbu ikwu okwu. Apụghị m ikwu okwu n’asụghị nsụ, ya mere ịga akwụkwọ mgbe m dị obere gụnyere usoro ọgwụgwọ nke ikwu okwu.
Nne na nna m kewara mgbe m dị afọ ise, nne anyị zụlitekwara mụ na nwanne m nwanyị. Mgbe m dị afọ iri, m malitere ire ihe oriri mgbe a gbasasịrị akwụkwọ iji nye aka n’ego a na-emefu n’ezinụlọ. Afọ abụọ mgbe nke a gasịrị amalitere m ịrụ ọrụ tupu na mgbe a gbasara akwụkwọ, na-aghọ onye bụ isi na-akpata ego ezinụlọ. Mgbe e nyere nne m àkwà n’ụlọ ọgwụ ma nwee mkpa nke ịwa ya ahụ ugboro ugboro, akwụsịrị m ịga akwụkwọ ma malite na-arụ ọrụ oge nile.
Ime Ka M Mara Otu Òtù Ụmụnna
Na 1944 otu onye n’ime Ndịàmà Jehova hapụụrụ nwunye nwa nwanne mama m akwụkwọ ahụ bụ́ “The Truth Shall Make You Free,” esonyekwara m n’ọmụmụ Bible nke a malitere iduziri ya. N’otu afọ ahụ amalitere m ije Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’Ọgbakọ Eastside. Onye nduzi ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ́ Albert Cradock, nwere ụdị nsogbu ikwu okwu ahụ m nweburu, ma ọ mụtawo ịchịkwa ya. Lee aha ihe agbamume ọ bụ nye m!
Ndị bi gburugburu ebe obibi anyị bụkarịrị ndị Itali, Poland, Hungary, na ndị Juu, ndị si n’agbụrụ ndị a na ìgwè ndị ọzọ mejupụtakwara ọgbakọ ahụ. Mụ na nwunye nwa nwanne mama m so ná ndị mbụ bụ́ ndị Africa nke America sonyeere ọgbakọ nke a nke a pụrụ ịkpọ nke ndị ọcha, ma ọ dịghị mgbe Ndịàmà ahụ gosiri ịkpa ókè agbụrụ n’ebe anyị nọ. N’ezie, ha na-akpọ m mgbe nile iri nri n’ụlọ ha dị ka onye ọbịa.
Na 1956, m kwagara n’ebe ndịda nke United States ije ozi ebe mkpa maka ndị ozi dị ukwuu karị. Mgbe m lọghachiri n’ebe ugwu n’otu oge ọkọchị maka mgbakọ distrikti, ọtụtụ ụmụnna ndị si Cleveland bịara leta m ma gosipụta mmasị na-ekpo ọkụ n’ọrụ nile m na-arụ. Nchegbu ha kụziiri m otu ihe mmụta dị mkpa: Mgbe nile ịhapụ ịdị ‘na-ele ihe nke aka unu anya, kama unu nile n’otu n’otu leekwa ihe nke mmadụ ibe unu anya.’—Ndị Filipaị 2:4.
Ozi Oge Nile A Gbasapụrụ Agbasapụ
Mgbe m jesịrị ozi afọ atọ n’ọrụ nkwusa oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ, na November 1959, a kpọrọ m òkù ịrụ ọrụ na Betel dị na Brooklyn, isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova na New York. E kenyere m ọrụ ná Ngalaba Mbupụ Akwụkwọ. Onye nlekọta ngalaba m nọ na ya, Klaus Jensen, na onye mụ na ya bi n’otu ọnụ ụlọ, William Hannan, ha abụọ ndị ọcha, ghọrọ ndị nna ime mmụọ nye m. Nke ọ bụla n’ime ha ejewo ozi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 40 afọ na Betel mgbe m bịarutere.
Ná mmalite afọ ndị 1960, e nwere ihe dị ka 600 ndị òtù ezinụlọ Betel, ihe dịkwa ka 20 n’ime ha bụ ndị Africa nke America. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, United States amalitewo ịdọkasị n’esemokwu agbụrụ, e mebikwara mmekọrịta dị n’etiti agbụrụ dị iche iche. Otú o sina dị, Bible na-akụzi na “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu,” anyị ekwesịghịkwa ịbụ. (Ọrụ 10:34, 35) Nkwurịta okwu ime mmụọ anyị nwere na table Betel ụtụtụ ọ bụla mesiri mkpebi anyị ike ịnakwere echiche Chineke n’okwu ndị dị otú ahụ.—Abụ Ọma 19:7.
Mgbe m na-eje ozi na Betel dị na Brooklyn m zutere Lois Ruffin, onye ọsụ ụzọ sitere Richmond, Virginia, anyị lụkwara na 1964. Mkpebi anyị bụ ịnọgide n’ozi oge nile, ya mere mgbe anyị gbasịrị akwụkwọ anyị laghachiri n’ebe ndịda nke United States. Na mbụ anyị jere ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, e mesịakwa na 1965, a kpọrọ m òkù iwere ọrụ sekit. Ruo afọ iri na-esonụ, anyị letara ọgbakọ dị iche iche na steti ndị nke Kentucky, Texas, Louisiana, Alabama, Georgia, North Carolina, na Mississippi.
Ule nye Òtù Ụmụnna Anyị
Ndị ahụ bụ afọ nke oké mgbanwe. Tupu anyị akwaga n’Ebe Ndịda, e kewasịala agbụrụ dị iche iche. A machibidoro ndị isi ojii site n’iwu ịga otu ụlọ akwụkwọ, iri nri n’otu ụlọ oriri, ịrahụ ụra n’otu họtel, ịzụ ahịa n’otu ụlọ ahịa, ma ọ bụ ọbụna ịṅụ mmiri n’otu ebe a na-aṅụ mmiri ha na ndị ọcha. Ma na 1964 òtù Ome Iwu nke United States mepụtara Iwu Ihe Ruuru Onye Amaala nke machibidoro ịkpa ókè n’ebe dị iche iche nke ọha, gụnyere usoro ịga njem. Ya mere e nwekwaghị ndabere iwu ọ bụla maka ịkpa ókè agbụrụ.
Ya mere ajụjụ a ga-ajụ bụ, Ụmụnna anyị nwoke na nwanyị ndị nọ n’ọgbakọ bụ nanị ndị isi ojii ma ọ bụ nanị ndị ọcha hà ga-abịakọta ọnụ ma gosikọrịta ịhụnanya ka nrụgide sitere n’ógbè na mmetụta gbamiworo mkpọrọgwụ site n’oge gara aga ò mere ka ha guzogide mbịakọta ọnụ? Ọ bụ ihe ịma aka ige ntị n’iwu Akwụkwọ Nsọ ahụ bụ́: “N’akụkụ ịhụnanya unu n’ebe ụmụnna unu nọ, ka ihe mmadụ ibe unu na-atọrịta unu ụtọ nke ukwuu; n’akụkụ nsọpụrụ unu, [na-ebutenụ ụzọ, NW].”—Ndị Rom 12:10.
Ruo ókè mmadụ ọ bụla pụrụ icheta, echiche ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ, karịsịa n’Ebe Ndịda, abụwo na ndị isi ojii dị ala karị. Echiche a abụwo nke akụkụ ọ bụla nke ọha mmadụ, tinyere chọọchị dị iche iche, kụmiworo n’uche ndị mmadụ. Ya mere ọ dịghịrị ụfọdụ ndị ọcha mfe ile ndị isi ojii anya dị ka ndị ha na ha hà. N’ezie, nke ahụ bụ oge nke ule nye òtù ụmụnna anyị—ma ndị isi ojii ma ndị ọcha.
Dị ka ihe obi ụtọ, n’ozuzu ha, e nwere nzaghachi magburu onwe ya n’ebe mbịakọta ọnụ nke ọgbakọ anyị dị iche iche dị. E hichapụghị ngwa ngwa echiche ịka elu agbụrụ e leziri anya kụzie n’ọtụtụ narị afọ. Ma mgbe a malitere ịbịakọta ọnụ, ụmụnna anyị nabatara ya nke ọma, nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha ṅụrịrị ọṅụ inwe ike izukọta ọnụ.
N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ọbụna ndị na-abụghị Ndịàmà kwenyere ná mbịakọ ọnụ nke ọgbakọ anyị dị iche iche. Dị ka ihe atụ, na Lanett, Alabama, a jụrụ ndị agbata obi bi nso Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ha jụrụ ajụ ka ndị isi ojii na-abịa nzukọ dị iche iche. Otu nwanyị bụ onye ọcha nke meworo agadi kwere otu nwanna nwoke onye isi ojii n’aka, na-asị: “Biko bịa n’ógbè anyị ma fee Chineke gị otú ị chọrọ!”
Ụmụnna Ndị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi n’Etiopia
Na 1974 obi dị anyị ụtọ ịnata ọzụzụ ọnwa ise na ọkara nke ndị ozi ala ọzọ na Watchtower Bible School of Gilead na New York City. Mgbe ahụ e kenyere anyị mba Africa bụ́ Etiopia. A ka chụtusịrị Haile Selassie, bụ́ onye ọchịchị alaeze ukwu, ma debe ya n’ọnọdụ nke esila n’ụlọ zọpụ ụkwụ n’èzí. Ebe ọ bụ na ọrụ anyị ka nọ n’okpuru mmachibido iwu, anyị nwere ekele maka ịnọ nso na-ekpo ọkụ nke òtù ụmụnna ndị Kraịst anyị.
Anyị so ọtụtụ ndị e mesịrị tụọ mkpọrọ n’ihi ịrapagidesi ike n’ezi ofufe ha bie ma jee ozi. Ọbụna e gburu ụfọdụ ndị ezi enyi anyị. Adera Teshome, bụ onye okenye ibe m n’otu ọgbakọ dị n’isi obodo Etiopia, bụ́ Addis Ababa.a Mgbe ọ nọsịrị afọ atọ n’ụlọ mkpọrọ, e gburu ya. Dị ka o kwesịrị, o wutere nwunye ya n’ụzọ dị omimi. Lee ihe obi ụtọ ọ bụ ọtụtụ afọ mgbe nke a gasịrị ịhụ ya ka ọ na-egbukepụ n’ọṅụ ka ọ na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụsọ!
Worku Abebe, nwanna nwoke ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ onye a mara ikpe ọnwụ ugboro asatọ.b Ma e meghị ya ka ọ tụọ ụjọ ma ọlị! Mgbe m hụrụ ya nke ikpeazụ, o gosiri m ntị ya abụọ nke ndị nche ụlọ mkpọrọ jiworo úkwù égbè kụrie. O ji egwuregwu kwuo na e ji ịkụ ya úkwù égbè emere ya nri ụtụtụ, nri ehihie, na nri abalị. Ọ bụ ezie na ọ nwụworị kemgbe, ụmụnna ka na-echetakwa ya n’ụzọ ịhụnanya.
Hailu Yemiru bụ nwanna ọzọ m ji ịhụnanya na-echeta.c O gosiri ịhụnanya kwesịrị nṅomi n’ebe nwunye ya nọ. E jidere nwunye ya, ma ebe ọ bụ na ọ dị ime ọmụmụ, Hailu jụrụ ndị isi ụlọ mkpọrọ ahụ ma ọ pụrụ ịnọchi ọnọdụ nwunye ya n’ụlọ nga. Ka oge na-aga, mgbe ọ na-agaghị emebi okwukwe ya, e gburu ya.—Jọn 15:12, 13; Ndị Efesọs 5:28.
N’ihi ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-adakpọ adakpọ n’Etiopia, anyị kwagara Kenya na 1976. Ruo afọ asaa anyị jere ozi n’ọrụ njegharị, na-eleta ụmụnna n’ọtụtụ mba nke Ọwụwa Anyanwụ Africa—gụnyere Kenya, Etiopia, Sudan, Seychelles, Uganda, na Tanzania. Emekwara m njem gaa Burundi na Rwanda ọtụtụ mgbe dị ka onye so n’ime ndị e zigara isoro ndị ọchịchị kparịta ụka banyere ideba ọrụ anyị n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro ná mba ndị ahụ.
Ọ bụ ihe obi ụtọ ịlaghachi n’Etiopia na January 1992 ịga mgbakọ distrikti mbụ e mere ebe ahụ mgbe e wepụsịrị mmachibido iwu ahụ n’ọrụ anyị. Ọtụtụ n’ime ihe karịrị 7,000 ndị bịaranụ amaghị onwe ha, ebe ụmụnna na-ezukọbu nanị n’ìgwè nta dị iche iche. Ụbọchị ọ bụla nke mgbakọ ahụ, ihe ka ọtụtụ na-anọ ya hour abụọ tupu usoro ihe omume amalite ma nọgidekwa ruo mgbe chi jiri, na-anụ ụtọ òtù ụmụnna anyị na-ahụ n’anya.
E Merie Ịkpa Ókè Agbụrụ
Ruo ọtụtụ narị afọ ịkpa ókè agbụrụ ejupụtawo n’Africa. N’ime Burundi na Rwanda, dị ka ihe atụ, agbụrụ ndị bụ isi, ndị Hutu na ndị Tutsi, akpọwo onwe ha asị ruo ogologo oge. Kemgbe mba ndị a nweere onwe ha site n’aka Belgium na 1962, ndị òtù nke agbụrụ abụọ ndị a site n’oge ruo n’oge egbuwo ọtụtụ puku ibe ha. Ya mere, lee ihe obi ụtọ ọ bụ, ịhụ ndị òtù nke agbụrụ abụọ ndị a ndị ghọworo Ndịàmà Jehova ka ha na-arụkọ ọrụ n’udo! Ezi ịhụnanya ha na-egosirịta ibe ha agbawo ọtụtụ ndị ọzọ ume ige eziokwu Bible ntị.
N’otu aka ahụ, ìgwè agbụrụ ndị nọ na Kenya enweworị esemokwu ndị nke ha mgbe mgbe. Lee ihe dị iche na nke ahụ ọ bụ n’etiti òtù ụmụnna ndị Kraịst nke ndị Jehova na Kenya! Ị pụrụ ịhụ ndị agbụrụ dị iche iche ka ha na-efe ofufe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ịdị n’otu. Ọ bụworo m ihe obi ụtọ ịhụ ọtụtụ ndị a ka ha na-ewepụsị ịkpọasị agbụrụ ma gosi ezi ịhụnanya n’ebe ụmụnna ha nwoke na nwanyị nke agbụrụ ndị ọzọ nọ.
Inwe Obi Ụtọ Maka Òtù Ụmụnna Anyị
Ka m na-eleghachi anya azụ n’ihe gafere 50 afọ nke mkpakọrịta mụ na nzukọ Chineke, obi ekele nye Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, na-ejupụta obi m. Ọ bụwo n’ezie ihe ịtụnanya ịhụ ihe ha meworo ka ọ dị n’elu ala! Ee e, ọnọdụ abụbeghị nke zuru okè mgbe nile n’etiti ndị Chineke, ha abụghịkwa taa. Ma a pụghị ịtụ anya na ọtụtụ narị afọ nke ozizi ịkpa ókè agbụrụ nke ụwa Setan ziri ga-abụ ihe e wepụrụ n’otu ntabi anya. E kwuwerị, anyị ka bụ ndị na-ezughị okè.—Abụ Ọma 51:5.
Ka m na-eji nzukọ Jehova na-atụnyere ụwa, obi m na-ejubiga ókè n’ekele maka ezigbo òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ. M ka ji ịhụnanya na-echeta ụmụnna ndị ahụ nọ na Cleveland, bụcha ndị ọcha, ndị zụrụ m n’eziokwu. Ka m hụkwara ụmụnna anyị nọ ná ndịda United States, ma ndị ọcha ma ndị isi ojii, ka ha ji ịhụnanya ụmụnna dochie mmetụta nke ịkpọasị, obi m ṅụrịrị ọṅụ. Mgbe ahụ, ịga Africa na ịhụ n’onwe m ụzọ Okwu Jehova pụrụ isi wepụ ịkpọasị agbụrụ emewo m ka m nwekwuo ekele maka òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ.
N’ezie, Eze Devid nke oge ochie kwupụtara ya nke ọma mgbe o kwuru, sị: “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu!”—Abụ Ọma 133:1.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Foto Adera Teshome na Hailu Yemiru pụtara na peji nke 177 nke 1992 Yearbook of Jehovah’s Witnesses; a kọrọ ahụmahụ nke Worku Abebe na peji nke 178-181.
b Foto Adera Teshome na Hailu Yemiru pụtara na peji nke 177 nke 1992 Yearbook of Jehovah’s Witnesses; a kọrọ ahụmahụ nke Worku Abebe na peji nke 178-181.
c Foto Adera Teshome na Hailu Yemiru pụtara na peji nke 177 nke 1992 Yearbook of Jehovah’s Witnesses; a kọrọ ahụmahụ nke Worku Abebe na peji nke 178-181.
[Foto dị na peeji nke 23]
Ememe olili ozu nne nne m
[Foto dị na peeji nke 24]
Ndịàmà bụ́ ndị Tutsi na ndị Hutu na-arụkọ ọrụ ọnụ n’udo
[Foto dị na peeji nke 25]
Mụ na nwunye m, Lois