Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 10/1 p. 21-25
  • Ala Na-adịghị Emepụta Ihe Aghọọ nke Na-emepụta Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ala Na-adịghị Emepụta Ihe Aghọọ nke Na-emepụta Ihe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Nketa Ime Mmụọ
  • Ikere Òkè n’Ọrụ Ime Nkwusa Ahụ
  • Ịkụ Mkpụrụ n’Akụkụ Osimiri
  • Ozi E So Onye Ibe Nọgide Na-eje
  • Imeri Mmegide
  • Idi Nsogbu Dị Iche Iche n’Osimiri
  • Nhazigharị Ndị Ọzọ
  • Ala ahụ Aghọwo nke Na-emepụta Ihe
  • Ụgbọ Ha Ekpuo n’Otu Agwaetiti
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ịtụkwasị Jehova Obi Na-eweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Obi Ụtọ Na-adịrị Onye ahụ nke Jehova Bụ Chineke Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 10/1 p. 21-25

Ala Na-adịghị Emepụta Ihe Aghọọ nke Na-emepụta Ihe

DỊ KA ARTHUR MELIN SI KỌỌ

Ọ bụ otu ụbọchị gbachapụrụ agbachapụ n’oge opupu ihe ubi na 1930, eguzokwa m n’ebe ụgbọ mmiri na-akwasa ibu na Prince Rupert, British Columbia. N’ileda anya n’ụgbọ epeepe ahụ dọrọ n’ala osimiri ahụ, echere m, sị, ‘Olee ebe mmiri nile ahụ gara?’ Nke a bụ nke mbụ m na-ahụ ntalata nke Ụsọ Osimiri nke Ọdịda Anyanwụ Pacific ebe elu mmiri ahụ pụrụ ịgbadaru mita asaa nanị n’ime hour isii. Ma olee otu nwatakịrị a zụlitere n’ime ubi ahịhịa si bịa nọrọ n’akụkụ Osimiri Pacific?

A KPỌWO m òkù ịmụba ihe ùgwù m nke ijere Jehova ozi oge nile site n’isonyere ìgwè ụgbọ epeepe ahụ bụ́ Charmian. Ọrụ e kenyere anyị bụ ịmalite ọrụ ime nkwusa n’ogologo ụsọ osimiri ọdịda anyanwụ dịpụrụ adịpụ site na Vancouver ruo Alaska. Ihe mejupụtara ogologo ebe a bụ ihe ka ukwuu n’ime ọtụtụ kilomita nke ókèala ụsọ osimiri British Columbia, nke na-enweghị ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-eto Jehova. Ihe dị iche agwụla ìgwè ndị nkwusa Alaeze dị nta nọ n’obodo Prince Rupert.

Ọ na-anụ m ọkụ n’obi ịmalite, ya mere ka m si n’ụgbọ okporo ígwè rịdata, etinyere m isi n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ ije hụ ụgbọ epeepe ahụ bụ́ Charmian ma zute ndị nọ na ya, bụ́ Arne na Christina Barstad. Ọ dịghị onye nọ n’ime ya, ya mere m si ebe ahụ pụọ. Mgbe m lọghachiri n’ụbọchị ahụ ka oge gatụworo, ọ tụrụ m n’anya. O yiri ka osimiri ahụ ọ na-atakọ atakọ!

Ma gịnị dujere n’ọrụ a na-adọrọ mmasị?

Ihe Nketa Ime Mmụọ

Mmasị m nwere maka ihe ime mmụọ malitere n’ụlọ na mbara ala dị larịị nke Alberta, Canada. Nna m chọtara otu traktị nke Charles Taze Russell nke Zion’s Watch Tower Tract Society dere bụ́ nke gbanwere ndụ ya kpam kpam. Papa m malitere ime nkwusa gwa ndị agbata obi ya, n’agbanyeghị ọrụ ya na-ewe oge nke ịkọ ugbo na Calmar, Alberta. Nke ahụ bụ otu narị afọ gara aga ná mmalite afọ ndị 1890.

Ọ bụ n’ime ezinụlọ nke a na-atụ egwu Chineke ka a mụnyere m na February 20, 1905, nke asatọ n’ihe mesịrị ghọọ ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị iri. Papa m, tinyere ndị ọzọ n’ógbè a nke ndị Sweden, sonyeere Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile. Ka oge na-aga, ha wuru ebe nzukọ, nke e mesịrị kpọọ Ụlọ Nzukọ Alaeze. O so na nke mbụ na Canada.

Ọ dịghị mgbe ọrụ ugbo gbochiri anyị ije nzukọ ndị Kraịst, nke ihe e mere n’ụfọdụ bụ okwu dị iche iche site n’ọnụ ndị ọkà okwu Watch Tower Society zipụrụ. Okwu ndị a wulitere n’ime anyị ọchịchọ siri ike iso kere òkè n’ọrụ ime nkwusa. Dị ka ihe si na ya pụta, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile n’ezinụlọ anyị anọgidesiwo ike na-eje ije n’ìhè nke eziokwu Bible.

Ikere Òkè n’Ọrụ Ime Nkwusa Ahụ

Ná mmalite afọ ndị 1920, e kenyere m ọrụ ịgba àmà mbụ m. M gaje ikesa ịkpọ òkù maka okwu ihu ọha site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’obodo Edmonton. Ka m guzo ebe ahụ nanị m n’ụbọchị ahụ, amụtara m ihe bara uru: Tụkwasị Jehova obi. (Ilu 3:​5, 6) Lee ka m si nwee obi ụtọ ịrụzu ọrụ mbụ ahụ site n’enyemaka Jehova!

Obi ike m nwere n’ebe nzukọ Jehova a na-ahụ anya na òtù ohu ya kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche dị nọgidere na-eto ka a na-enye nghọta ka ukwuu n’Okwu ya nke eziokwu. Ọtụtụ n’ime ihe omume Krisendọm, ndị dị ka ime ememe Krismas na ncheta ọmụmụ, bụ ndị e wezụgara. Nzọpụta onwe onye abụkwaghị ihe e tinyere uche nile na ya; kama nke ahụ, ime nkwusa Alaeze malitere iwere ọnọdụ ịdị mkpa nke kwesịrị ekwesị. Ihe ndị a nile nwere mmetụta dị omimi ná ndụ m. Ya mere ọ dịghị anya ka m rarasịịrị ndụ m nye Jehova n’April 23, 1923, emere m ozi oge nile ihe mgbaru ọsọ m.

N’oge ihe nile na-aghọ ice n’oge oyi n’ubi ahịhịa ndị ahụ, anyị na-eji ịnyịnya na ụgbọ ala ịnyịnya na-adọkpụ na-agba àmà n’ime ime obodo dị iche iche. N’otu oge eso m otu ìgwè nọọ izu abụọ n’ihe a na-akpọ ọrụ ụgbọ ala e ji mere ebe obibi. Ụgbọ ala ndị a pụrụ iche bara oké uru n’ịgba àmà na mbara ala ndị ahụ osisi na-adịghị nke ala ubi ahịhịa Canada. N’agbanyeghị nsogbu ego, ihu igwe na-adịghị mma, na ebe ndị dị anya a ga-eje, agbalịrị m ịnọgide n’ozi ọsụ ụzọ ruo ihe dị ka afọ atọ n’Alberta, na-akwụsịtụ mgbe ụfọdụ, ruokwa n’ụbọchị ahụ kwesịrị ncheta na 1930 mgbe a kpọrọ m òkù ije ozi n’Ụsọ Osimiri nke Ọdịda Anyanwụ Pacific. Ebe ọ na-adịghị ihe m maara banyere osimiri ma ọ bụ ụgbọ epeepe, ọkpụkpọ òkù ahụ juru m anya.

Otú ọ dị, ọ dịghị anya ka m rutesịrị na Prince Rupert ahụ wee ruo m ala n’ebe ndị ọrụ ọhụrụ ibe m n’ime ụgbọ ahụ nọ. Nwanna Barstad bụ onye ọrụ ụgbọ mmiri doro anya, ebe o jiworo ọrụ ịkụ azụ chụọ nta ego ruo ọtụtụ afọ. Afọ isii sochirinụ bụ oge ime nkwusa kpụ ọkụ n’ọnụ, na-agbagharị ná mmiri nile nke ụsọ osimiri British Columbia site na Vancouver ruo Alaska. Ihe ọzọ m mụtara: Nakwere mgbe nile ọrụ sitere n’aka Jehova, alakwala azụ n’ịnakwere ya.

Ịkụ Mkpụrụ n’Akụkụ Osimiri

Ebe mbụ anyị zọrọ ụkwụ n’oge opupu ihe ubi ahụ nke 1930 bụ Ketchikan, Alaska, ebe anyị butere 60 igbe nke akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Ruo ọtụtụ izu, anyị jere n’ebe obibi nile dị na Ketchikan, Wrangell, Petersburg, Juneau, Skagway, Haines, Sitka, na ógbè ndị ọzọ dịsasịrị adịsasị. E mesịa, anyị jezuru ụsọ osimiri nile nke British Columbia, na-ejezu ha tupu ọgwụgwụ nke oge okpomọkụ. E letara ógbè ndị dịmiri adịmi a na-egbutu osisi na ha, na-agba azụ ná mkpọ, ime obodo nke ndị India, ntakịrị obodo dị iche iche, tinyere ndị bipụrụ ebipụ na ndị na-achụ nta anụ. Mgbe ụfọdụ o siri ike ịhapụ ndị owu na-ama nọ n’ụlọ na-enye ìhè maka ndị ọrụ ụgbọ mmiri bụ́ ndị na-anabata onye ha ga-ekwunyere okwu.

Ka e mesịrị, Society nyere anyị ígwè phonograph nke a pụrụ ibugharị ebugharị na okwu ihu ọha dabeere na Bible ndị a kpọnyere n’efere egwú. Anyị na-ebu ndị a agagharị, tinyere akwụkwọ, Bible, na magazin. Ọtụtụ mgbe anyị aghaghị ibu ha ka anyị na-arịfe oké nkume ndị dị n’ụsọ osimiri. N’oge ntalata mmiri, mgbe ụfọdụ anyị aghaghị isite n’ubube ndị na-esighị ike bugoo ha n’ebe ndị a na-akwasa ibu sitere n’ụgbọ mmiri bụ́ ndị dị elu. Obi dị m ụtọ n’ihi ọzụzụ mmega ahụ m nwetaworo n’oge ntorobịa m ka m naarụ ọrụ n’ubi nke dị n’ala bụ́ nanị ahịhịa.

Usoro mgbasa okwu nke dị n’ụgbọ epeepe anyị jere ozi dị ka ngwá ọrụ dị ike n’ịgbasa ozi Alaeze ahụ. Ebe mmiri na-ebu ụzarị okwu ndị ahụ, ọtụtụ mgbe a na-anụ okwu ihu ọha ruo ọtụtụ kilomita. Otu mgbe ka anyị kwụsịrị n’otu ọdụ ụgbọ mmiri dịpụrụ adịpụ na Vancouver Island, anyị kpọrọ otu n’ime okwu ihu ọha ndị a dabeere na Bible. N’echi ya ndị bi n’ime obodo ji oké ọṅụ gwa anyị, sị: “Ụnyaahụ anyị nụrụ okwuchukwu sitere kpọmkwem n’eluigwe!”

N’oge ọzọ, otu di na nwunye meworo agadi sịrị na ha nụrụ egwú si n’ebe anwụrụ ọkụ si apụ na-abata n’ụlọ ha, ma mgbe ha pụrụ n’èzí, ha anụghị ihe ọ bụla. N’ịbataghachi n’ime ụlọ, ha nụrụ otu olu. Gịnị kpatara nke ahụ? Otú ọ dị, ka ha nọ n’èzí anyị anọwo na-agbanwe efere egwú ahụ. Anyị na-ebu ụzọ kpọọ egwú iji dọta mmasị ndị mmadụ, mgbe ahụ kpọwazie okwu ihu ọha dabeere na Bible.

N’oge ọzọkwa, mgbe anyị kwụsịrị n’ebe dịdewere otu agwaetiti nke nwere otu ime obodo nke ndị India, ụmụ okorobịa abụọ bụ́ ndị obodo ahụ kpaara ụgbọ bịa ịhụ ebe olu ndị ahụ si abịa. Ụfọdụ ndị nọ n’agwaetiti ahụ chere na ha bụ olu nke ndị ha nwụrụ anwụ ndị siworo n’ọnwụ bilie!

Ọ bụghị ihe na-adịghị emekebe bụ itinye otu narị akwụkwọ otu ụbọchị n’aka ndị na-arụ ọrụ n’ebe ndị a na-agba azụ ná mkpọ ndị dịmiri adịmi. N’ịbụ ndị nwere ihe ndọpụ uche ole na ole, ha nwere oge iche echiche banyere ihe ime mmụọ. Ka e mesịrị, ọtụtụ n’ime ndị a bipụrụ iche ghọrọ Ndịàmà. N’oge ndị ọzọ anyị jeghachiri, anyị lepụrụ anya n’ihu maka “ịgbarịta ibe anyị ume.”​—⁠Ndị Rom 1:12, NW.

Ozi E So Onye Ibe Nọgide Na-eje

Na 1931, alụrụ m nwanne nwanyị Christina Barstad, bụ́ Anna. Ka nke ahụ gasịrị anyị nọgidekọrọ n’ịsụ ụzọ anyị n’ime ụgbọ epeepe ahụ ma nwee ọtụtụ ahụmahụ na-akwụghachi ụgwọ n’ime ọtụtụ afọ ndị ahụ. Azụ whale, ọdụm mmiri, anụ seal, anụ porpoise, mgbada, bear, na ugo bụ ndị ibe anyị n’etiti oké ugwu dị iche iche, ọwara mmiri ndị dịpụrụ adịpụ, na ụsọ osimiri ndị dị obosara ndị dị n’ime, nke osisi cedar, pine, na oké osisi Douglas fir, tojupụtara. Ọtụtụ mgbe anyị nyeere mgbada ndị tụbọrọ atụbọ na ụmụ ha aka ka ha na-agbalị igwufere mmiri ndị na-achị ọkụ iji gbanahụ ndị na-egbu ha.

N’otu ehihie anyị hụrụ otu ugo ka ọ na-efe ala ala n’elu mmiri, mbọ́ ya na-agadosi otu nnukwute azụ chinook salmon ike. Azụ ahụ bubigara ibu ókè iburucha ya pụọ na mmiri ahụ, ya mere ugo ahụ na-eche ihu n’ụsọ mmiri na-adọkpụrụ azụ salmon ahụ. Frank Franske, onye so n’ìgwè ahụ, hụrụ ihe ahụ pụrụ ịba uru wee gbara ọsọ gaa n’akụkụ ụsọ mmiri ahụ ije zute ugo ahụ ike na-agwụ ma mee ka ọ hapụ azụ ahụ o jidere. Ìgwè anyị bụ́ ndị ọsụ ụzọ riri nri anyasị dị ụtọ e ji azụ salmon sie n’uhuruchi ahụ, ugo ahụ mụtakwara iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe, ọ bụ ezie na o sighị ya n’obi.

N’otu ntakịrị agwaetiti dị n’ebe ugwu nke Vancouver Island, otu di na nwunye aha ha bụ Thuot nabatara eziokwu Bible. Ọ bụ onye na-amaghị akwụkwọ, na-agba isi akwara, na-adịghị adabere ná ndị ọzọ ná mkpebi ya, onye nọ n’etiti afọ ndị 90 ya, nwunye ya nọkwa n’etiti afọ ndị 80 ya. Otú ọ dị, eziokwu ahụ kpaliri mmasị ya nke ukwuu nke na o weturu onwe ya ala wee kwe ka nwunye ya kụziere ya ịgụ ihe. N’oge na-adịghị anya o nwere ike ịmụ Bible na mbipụta dị iche iche nke Society n’onwe ya. Ihe na-erughị afọ atọ ka e mesịrị, enwere m ọṅụ nke ime ha abụọ baptism n’ebe obibi ha dịmiri adịmi nke dị n’agwaetiti, na-eji ụgbọ epeepe anyị eme ihe dị ka ọdọ mmiri maka ime baptism!

Anyị nwekwara ọṅụ nke ịhụ ezinụlọ Sallis bi n’obodo Powell River ka ha zaghachiri n’ozi Alaeze ahụ. Walter gụrụ akwụkwọ nta bụ́ War or Peace​—⁠Which? wee ghọta ihe dị n’ime ya ozugbo dị ka eziokwu. N’oge na-adịghị anya ezinụlọ ahụ dum sonyeere Walter n’ọrụ ịsụ ụzọ na Vancouver, ebe anyị gaje ịkwọsa Charmian maka oge oyi. Ọ ghọrọ onye na-anụ ọkụ n’obi nke ukwuu, n’ime ọtụtụ afọ ndị gabigakwara o mere onwe ya ka òtù ụmụnna nile nọ n’ógbè Vancouver nwee ịhụnanya n’ebe ọ nọ. O jesịrị ozi elu ala ya na 1976, na-ahapụ ezinụlọ buru ibu nke Ndịàmà.

Imeri Mmegide

Ndị ụkọchukwu n’ime obodo nke ndị India nwere obi ilu n’ebe ọrụ anyị dị ọtụtụ mgbe, na-ewere anyị dị ka ndị na-achụ nta n’ókèala ime mmụọ ha. Na Port Simpson, onye ụkọchukwu ógbè ahụ kwusiri ike ka chiifu obodo ahụ gbochie anyị ịdị na-eje n’ebe obibi dị iche iche. Anyị kpọtụụrụ chiifu ahụ wee jụọ ma ò chere na onye ụkọchukwu ahụ ziri ezi iwere ndị obodo ya dị ka ndị bụ́ ndị iti nke na ha apụghị ichere onwe ha echiche. Anyị tụrụ aro ka e nye ndị obodo ya ohere ịnụ mkparịta ụka nke Okwu Chineke ma kpebie n’onwe ha ihe ha chọrọ ikwere. Ihe si na ya pụta: O nyere anyị ikike ịnọgide na-eme nkwusa n’ime obodo ahụ.

Otu chiifu ime obodo ọzọ mebiri mgbalị nke ndị òtù kansụl na òtù okpukpe dị iche iche mere igbochi Ndịàmà ịkpọtụrụ ndị obodo ya ruo ọtụtụ iri afọ. “Ruo ogologo oge ọ bụ m bụ́ chiifu,” ka ọ sịrị, “a nabatara Ndịàmà Jehova n’ebe a.” N’eziokwu, a dịghị anabata anyị mgbe nile n’ebe nile, ma n’agbanyeghị mmegide ọ dịghị mgbe a manyere anyị ịhapụ ógbè ọ bụla. Otú a, anyị nwere ike ijezu ozi anyị mgbe ọ bụla anyị kwụsịrị.

Idi Nsogbu Dị Iche Iche n’Osimiri

N’ime ọtụtụ afọ ahụ, anyị zutere ihe isi ike dị iche iche nke oké ifufe, ntalata na uto nke mmiri, oké nkume ndị na-adịghị n’ihe osise, na nsogbu injin mgbe ụfọdụ. N’otu oge anyị seere n’elu mmiri wee bịaruo Lasqueti Island oké nso, ihe dị ka 160 kilomita n’ebe ugwu nke Vancouver. Anyị kooro n’elu otu oké nkume, tọ n’ebe ahụ mgbe mmiri na-atalata atalata, wee nọrọ na-echere ihu igwe. Ọ bụrụ na ihu igwe mesịrị dị njọ, ụgbọ epeepe ahụ gaara etijasị n’oké nkume ndị ahụ. Anyị nile rịkwasịrị n’elu oké nkume ndị ahụ wee mee ihe kasịnụ anyị pụrụ ime n’ọnọdụ ọjọọ. Anyị riri nri ehihie, wee mụtụ ihe, ma chere ka mmiri ahụ toghachi.

N’agbanyeghị ọtụtụ ihe ize ndụ na ihe isi ike dị iche iche, ọ bụ ndụ nke ezi ahụ ike, nke obi ụtọ. Otú ọ dị, ọmụmụ nke ụmụ anyị ndị nwoke abụọ wetara nnukwu mgbanwe. Anyị nọgidere na-ebi n’ime ụgbọ epeepe ahụ, ma mgbe ọ bụla anyị nupụrụ jee ebe ugwu ruo Osimiri Oona, Anna na ụmụaka sooro ndị mụrụ ya nọrọ n’ebe ahụ, ebe ndị fọdụrụ n’ime anyị ga-anọgide na-eje ebe ugwu ruo Alaska. E mesịa, mgbe anyị lọghachiri ebe ndịda, Anna na ụmụaka ahụ sonyeghachiri anyị ọzọ.

Adịghị m echeta mgbe ọ bụla ụmụaka ahụ mere mkpesa ma ọ bụ na-arịa ọrịa. Ha na-eyi ihe okike na-eme ka mmadụ see n’elu mmiri oge nile, mgbe ụfọdụkwa anyị ọbụna na-amanye ha ụdọ. Ee, e nwere oge ụfọdụ nke ịchị uche n’aka.

Nhazigharị Ndị Ọzọ

Na 1936, anyị aghaghị ịhapụ Charmian, enwetakwara m ọrụ ego. Ka e mesịrị anyị mụrụ nwa nwoke nke atọ. Ka oge na-aga azụtara m ụgbọ epeepe e ji akụ azụ, nke jere ozi ọ bụghị nanị dị ka ihe e ji achụta ihe e ji ebi ndụ kamakwa o nyere anyị ohere ịnọgide n’ọrụ ime nkwusa n’ogologo ụsọ osimiri.

Anyị guzobere otu ebe obibi na Digby Island, n’ofe nke ọzọ nke ụsọ osimiri dị obosara site na Prince Rupert, n’oge na-adịghịkwa anya e guzobere otu ntakịrị ọgbakọ. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, mgbe a machibidoro ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova iwu na Canada, anyị na-eji ụgbọ epeepe gafere Prince Rupert wee “mee mwakwasị mberede” n’etiti ndeeri n’ókèala ahụ, na-ahapụ akwụkwọ n’ebe obibi ọ bụla. Ọ dịghị onye ọ bụla jikọtara ngafe ime abalị anyị na nkesa nke akwụkwọ a machibidoro!

Ala ahụ Aghọwo nke Na-emepụta Ihe

Nke nta nke nta ọtụtụ mmadụ karị malltere isonyere Ndịàmà Jehova, na 1948 kwa, mkpa e nwere maka Ụlọ Nzukọ Alaeze na Prince Rupert pụtara ìhè. Mgbe a zụtasịrị otu ihe owuwu ndị soja nke dị ma a gafere ọdụ ụgbọ mmiri ahụ, anyị tọsasịrị ya, bufee ya, jirizie ụgbọ ala buga ya n’ebe a ga-ewu ihe owuwu ahụ. Jehova gọziri ịrụsi ọrụ ike anyị, anyị nwetakwara Ụlọ Nzukọ Alaeze nke anyị.

Na 1956, abanyeghachiri m n’ịsụ ụzọ, Anna sonyekwaara m na 1964. Anyị ji ụgbọ epeepe rụọkwa ọrụ ọzọ n’ogologo Ụsọ Osimiri Pacific. Ruo oge ụfọdụ anyị kerekwaara òkè n’ọrụ sekit, na-eleta ọgbakọ dị iche iche site na Queen Charlotte Islands chee ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ gafere ugwu ndị ahụ ruo Ọdọ Mmiri Fraser, e mesịakwa ruo Prince George na Mackenzie. N’ime afọ ndị ahụ, anyị ji ụgbọ ala, ụgbọ epeepe, na ụgbọ elu jezuo Ọdịda Anyanwụ nke Ebe Ugwu Pacific.

Na Prince Rupert anyị anọgidewo na-enwe ahụmahụ ọma dị iche iche n’ozi ahụ. Ma mụ ma Anna eduziworo ndị mesịrị jee ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead, ndị mesịkwara jee ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ n’ala dị iche iche ọmụmụ ihe. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ ụmụ anyị n’ime mmụọ ka ha na-ebu ozi Alaeze ahụ dị oké ọnụ ahịa eje n’ala ndị dị anya!

Ugbu a anyị abụọ agafewo nnọọ 80 afọ ma na-anagide ahụ ike na-adịwanye njọ, ma obi ka dị anyị ụtọ n’ozi Jehova. Ihe okike mara mma ndị anyị hụworo n’Alaska na na British Columbia na-akpali ncheta ihe ndị dị oké ọnụ ahịa. Ma ọ na-eweta ọbụna ọṅụ ka ukwuu ịhụ ka ebe bụbu ọzara na-adịghị emepụta ihe n’ụzọ ime mmụọ nke ógbè a sara mbara jupụtara ugbu a n’ọtụtụ ọgbakọ nke ndị na-eto Jehova.

O nyewo anyị obi ụtọ karịsịa ịhụ ka ụmụ anyị, tinyere ụmụ anyị n’ime mmụọ, tolitere ma na-agọzi Jehova. Anyị na-aṅụrị ọṅụ na anyị ekerewo òkè dị nta n’uto ime mmụọ n’akụkụ nke a nke ụwa. Dị ka ihe atụ, Alaska nwere ugbu a alaka ụlọ ọrụ nke ya nke na-achịkọta ọrụ nke ihe karịrị 25 ọgbakọ.

N’ebe a na Prince Rupert anyị nwere ihe ùgwù nke ịrara otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ mara mma nke dị n’etiti obodo kpọmkwem nye na 1988. Ee, anyị na-aṅụrị ọṅụ dị ka Aịsaịa ṅụrịrị, n’ikwu, sị: “Ị tụkwasịwo mmadụ ná mba nke a, Jehova, . . . Ị natawo nsọpụrụ: I mewo ka nsọtụ nile nke ala dị anya.”​—⁠Aịsaịa 26:15.

[Foto dị na peeji nke 21]

Ije ozi n’ọrụ sekit 1964-1967

[Foto dị na peeji nke 24]

Ụdị ụgbọ epeepe e ji mee ihe n’ịgba àmà n’ụsọ osimiri

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya