Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 10/15 p. 4-7
  • Gịnị Bụ Ọnọdụ Ndị Nwụrụ Anwụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Ọnọdụ Ndị Nwụrụ Anwụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Bughị n’Uche Ka Ihe A Kpọrọ Mmadụ Na-anwụ Anwụ
  • Olee Nkwa Ọ Bụ?
  • Okwu Ndị Sitere n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ
  • Jehova, Chineke nke Eziokwu na Ịhụnanya
  • Gịnị Na-eme Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Ì Kwesịrị Ịtụ Ndị Nwụrụ Anwụ Ụjọ?
    Teta!—2009
  • Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—N’ụzọ Dị Aṅaa, n’Ebee, Olee Mgbe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ì Nwere Mmụọ nke Na-adịghị Anwụ Anwụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 10/15 p. 4-7

Gịnị Bụ Ọnọdụ Ndị Nwụrụ Anwụ?

EGWU maka ndị nwụrụ anwụ dabeere n’otu echiche​—⁠na onye nwụrụ anwụ nwere mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ nke na-anọgide ndụ mgbe a nwụsịrị. Ọ bụrụ na Bible na-ezi n’ụzọ doro anya na echiche nke a bụ ụgha, mgbe ahụ e liwo ajụjụ ahụ nke ma ndị nwụrụ anwụ hà pụrụ imerụ gị ahụ. Mgbe ahụ, gịnị ka Bible na-ekwu?

Banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, Okwu Chineke na-asị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ; n’ihi na e chezọwo ncheta ha. Ma ịhụnanya ha, ma ịkpọasị ha, ma ekworo ha, na mgbe dị anya gara aga ka ọ laworo n’iyi; ọ dịghịkwa òkè ha nwere ọzọ ruo mgbe ebighị ebi n’ihe ọ bụla nke e meworo n’okpuru anyanwụ.”​—⁠Eklisiastis 9:​5, 6.

N’iburu nke ahụ n’uche, ndị nwụrụ anwụ hà pụrụ inyere gị aka ma ọ bụ imerụ gị ahụ? Ee e, ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu. Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, ha nọkwa duu. Ha enweghị ike iso ndị dị ndụ kwurịta okwu ma ọ bụ gosipụta mmetụta uche ọ bụla​—⁠ịhụnanya ma ọ bụ ịkpọasị⁠—​ma ọ bụ ịrụ ọrụ ọ bụla. Ọ dịghị mkpa gị ịtụ ha egwu ma ọlị.

‘Ọ dị mma, ee, nke ahụ pụrụ ịbụ eziokwu ma ọ bụrụ na ị na-ekwu banyere ọnwụ nke ahụ nkịtị,’ ka ụfọdụ pụrụ ikwu. ‘Ma ọnwụ nkịtị abụghị ngwụsị nke ndụ; nanị ihe ọ na-eme bụ ịtọhapụ mmụọ site n’ahụ. Mmụọ ahụ pụrụ inyere ndị dị ndụ aka ma ọ bụ imerụ ha ahụ.’ Ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa na-eche otú ahụ.

Dị ka ihe atụ, na Madagascar a na-ele ndụ anya nanị dị ka ngafere, ya mere a na-ele ememe ili ozu na mbọpụta nke ozu anya dị ka ihe dị mkpa karịa agbamakwụkwọ. E chere na onye ahụ sitere na nke ndị nna ya ochie ma na-alaghachikwuru ha n’ọnwụ. N’ihi ya, a na-eji osisi na ájá ụrọ, ngwá ọrụ ndị na-eretọ ka oge na-aga, ewu ụlọ maka ndị dị ndụ, ebe ili, “ụlọ” ndị nwụrụ anwụ, na-amakarị mma n’anya karị ma na-adịte aka. Mgbe a na-abọ ozu, ndị ezinụlọ na ndị enyi na-eche na a ga-agọzi ha, ndị inyom kwekwara na ọ bụrụ na ha emetụ ọkpụkpụ onye ikwu ha nwụrụ anwụ aka, ha ga-enwe ike ịmụ nwa. Ma, ọzọ, gịnị ka Okwu Chineke na-ekwu?

E Bughị n’Uche Ka Ihe A Kpọrọ Mmadụ Na-anwụ Anwụ

Ọ na-akpali mmasị ịmara na Jehova Chineke kere mmadụ ịdị ndụ, o kwukwara banyere ọnwụ nanị dị ka ihe ga-esite ná nnupụisi. (Jenesis 2:17) N’ụzọ dị mwute, nwoke na nwanyị mbụ mehiere, n’ihi ya kwa, mmehie gbasara ruo ụmụ mmadụ nile dị ka ihe nketa na-eweta ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Ya mere ị pụrụ ikwu na ọnwụ bụ ihe a na-ahụ ná ndụ kemgbe nnupụisi nke mmadụ abụọ mbụ ahụ, ee, ihe na-egbu mgbu n’obi nke a na-ahụ ná ndụ. E kere anyị ịdị ndụ, bụ́ nke n’otu akụkụ na-akọwa ihe mere na o siiri nde mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ nnọọ ike iche ọnwụ ihu dị ka ọgwụgwụ.

Dị ka ihe ndekọ Bible na-ekwu, Setan nwara iduhie mmadụ abụọ mbụ ahụ banyere ọnwụ site n’ikwugide ịdọ aka ná ntị Chineke na nnupụisi ga-eweta ọnwụ. (Jenesis 3:4) Ma, ka oge na-aga, o doro anya nke ọma na ụmụ mmadụ na-anwụ dị nnọọ ka Chineke kwuru na ha ga-anwụ. Otú a, n’ime ọtụtụ narị afọ Setan zaghachiri site n’otu ụgha ọzọkwa​—⁠na otu akụkụ mmadụ nke bụ́ mmụọ na-alanarị ọnwụ nke anụ ahụ. Nghọrị dị otú ahụ kwekọrọ n’ụdị onye Setan bụ́ Ekwensu bụ, onye Jisọs kọwara dị ka ‘nna ụgha.’ (Jọn 8:44) N’ụzọ dị iche, nzaghachi Chineke maka ọnwụ bụ otu nkwa na-agba ume.

Olee Nkwa Ọ Bụ?

Ọ bụ nkwa nke mbilite n’ọnwụ maka ọtụtụ ndị. Okwu Grik a sụgharịrị “mbilite n’ọnwụ” bụ a·naʹsta·sis. Ọ pụtara n’ụzọ nkịtị “ibili ọtọ ọzọ,” ọ na-ezokwa aka n’ibilite ọtọ site n’ọnwụ. Ee, mmadụ na-edina ala n’ọnwụ, ma Chineke site n’ike ya pụrụ ịdọlite mmadụ ọtọ ọzọ. Mmadụ na-atụfu ndụ, ma Chineke pụrụ inye ya ndụ ọzọ. Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, kwuru na “oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:​28, 29) Pọl onyeozi kwupụtara “olileanya [ya] n’ebe Chineke nọ, . . . na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) Job, onye ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Chineke ozi n’oge dịrị tupu oge ndị Kraịst, kwupụtakwara olileanya ya ná mbilite n’ọnwụ: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ? Ụbọchị nile nke obubu agha m ka m ga-eche, ruo mgbe mgbanwe m ga-abịa. Ị [Chineke] ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị.”​—⁠Job 14:​14, 15.

Ọ̀ bụ na nkwa doro anya nke mbilite n’ọnwụ adịghị egosi na echiche nke na ndị nwụrụ anwụ nọ ndụ n’ụdị nke ndị bụ mmụọ bụ ụgha? Ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ nọ ndụ ma na-adị adị n’eluigwe ma ọ bụ n’otu ụwa nke ndị bụ mmụọ, gịnị ga-abụ nzube nke mbilite n’ọnwụ? Ọ̀ bụ na ha agaghị enwetaworị ụgwọ ọrụ ma ọ bụ ihe nketa ha? Ihe ọmụmụ nke Okwu Chineke na-ekpughe na ndị nwụrụ anwụ nwụrụ anwụ n’ezie, ghara ịma ihe ọ bụla, nọrọ n’ụra ruo mgbe a ga-enwe oké mkpọte ahụ site ná mbilite n’ọnwụ n’ime ụwa ọhụrụ​—⁠paradaịs⁠—​nke Nna anyị na-ahụ n’anya, Jehova, kwere ná nkwa. Ma ọ bụrụ na ọnwụ apụtaghị nkewa nke anụ ahụ na mmụọ nakwa ọ bụrụ na mmụọ ahụ adịghị anọgide ndụ, oleekwanụ banyere ihe ndị yiri ka iso ndị nọ n’ụwa ndị bụ mmụọ kwurịta okwu?

Okwu Ndị Sitere n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ

A kọwo ọtụtụ akụkọ nke okwu ndị a sịrị na a nụrụ site n’ógbè ndị bụ mmụọ. Gịnị n’ezie bụ isi iyi ha? Bible na-adọ anyị aka ná ntị na “Setan n’onwe ya na-aghọgharị ka mmụọ ozi nke ìhè. Ya mere ọ bụ ihe dị mfe ndị ọrụ ya ịghọgharị ka ndị ọrụ nke ihe ọma.” (2 Ndị Kọrint 11:​14, 15, The New English Bible) Ee, iji ghọgbuo ma duhie ndị mmadụ n’ụzọ dị mfe karị, ndị mmụọ ọjọọ (mmụọ ozi ndị na-enupụ isi) agwawo ndị dị ndụ okwu, mgbe ụfọdụ na-eme ka a ga-asị na ha chọrọ inye aka.

Pọl onyeozi dọkwuru aka ná ntị banyere ọrụ nduhie nke a: “Ụfọdụ ga-ewezụga onwe ha n’ebe okwukwe anyị dị, na-aṅa ntị ndị mmụọ na-eduhie eduhie na ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Timoti 4:1) Ya mere nzaghachi ọ bụla a sịrị na ọ bụ ndị nwụrụ anwụ nyere yikarịrị ka ọ ga-esite n’aka ndị mmụọ ọjọọ na-aghọgharị ka ha bụ “ndị ọrụ nke ihe ọma” ma na-akwalite otu ụgha okpukpe, na-eme ndị mmadụ ohu nye nkwenkwe ụgha nke na-eduru ha pụọ n’ebe eziokwu nke Okwu Chineke dị.

Iji nwapụta na ndị nwụrụ anwụ apụghị ikwu ihe ọ bụla, ime ihe ọ bụla, ma ọ bụ nwee mmetụta ọ bụla, Abụ Ọma 146:​3, 4 na-asị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere. Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” Olee mmụọ nke “na-apụ apụ”? Ọ bụ ike ndụ nke onye ahụ nke a na-eji iku ume na-eme ka ọ dịgide. Ya mere, mgbe onye ahụ nwụrụ anwụ kwụsịrị iku ume, ikike ịmata ihe nile adịkwaghị arụ ọrụ. Ọ na-abanye n’ọnọdụ nke amaghị onwe ya. Ya mere o kweghị omume na ọ ga na-akpa ike n’ahụ ndị dị ndụ.

Ọ bụ ya mere Bible ji jiri ọnwụ nke mmadụ na-atụnyere ọnwụ nke anụmanụ, na-asị na ha abụọ na-eru amaghị ihe ọ bụla n’ọnwụ ma laghachi n’ájá bụ́ nke e ji mee ha. Eklisiastis 3:​19, 20 na-asị: “Ihe na-adabara ụmụ mmadụ, ihe na-adabakwara anụmanụ; ọbụna otu ihe ahụ na-adabara ha: dị ka ọnwụ nke anụmanụ si dị, otú a ka ọnwụ nke mmadụ dị; ee, otu mmụọ ka ha nile nwere; ọ dịghịkwa ọkaaka mmadụ nwere karị anụmanụ: n’ihi na ha nile bụ ihe efu. Ha nile na-ala n’otu ebe; ha nile siri n’ájá pụta, ha nile na-alaghachikwa n’ájá.”

Ịmara na ndị mmụọ ọjọọ na-anwa iduhie ndị mmadụ iche na ha pụrụ iso ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu, na ndị nwụrụ anwụ pụkwara ịkpa ike n’ahụ ha, Jehova Chineke dọrọ ndị ya, bụ́ ndị Israel oge ochie, aka ná ntị, sị: “A gaghị ahụta n’etiti gị . . . onye na-ajụ ase, ma ọ bụ onye na-eji igwe ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ, ma ọ bụ onye na-agba afa, ma ọ bụ onye mgbaasị, ma ọ bụ dibịa nrafu, ma ọ bụ onye na-ajụ mmụọ ihe, ma ọ bụ dibịa afa, ma ọ bụ onye na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ihe. N’ihi na ihe arụ nke Jehova ka onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ.”​—⁠Deuterọnọmi 18:​10-⁠12.

N’ụzọ doro anya, echiche nke na ndị nwụrụ anwụ pụrụ imerụ anyị ahụ esiteghị na Chineke. Ọ bụ Chineke nke eziokwu. (Abụ Ọma 31:5; Jọn 17:17) Ọ kpadokwara ọdịnihu dị ebube maka ndị na-ahụ eziokwu n’anya bụ́ ndị na-efe ya “n’ime mmụọ na eziokwu.”​—⁠Jọn 4:​23, 24.

Jehova, Chineke nke Eziokwu na Ịhụnanya

Nna anyị nke eluigwe onye na-ahụ n’anya, “onye na-apụghị ikwu okwu ụgha,” ekwuwo okwu ya: A ga-akpọlite nde kwụrụ nde mmadụ ndị nwụworonụ e tinye ha n’ime ili na-enwe olileanya nke ndụ agwụghị agwụ n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume! (Taịtọs 1:​1, 2; Jọn 5:28) Nkwa ịhụnanya nke a nke mbilite n’ọnwụ na-ekpughe na Jehova nwere mmasị miri emi n’ọdịmma nke ihe okike bụ́ mmadụ na ọchịchọ sitere n’obi iwepụsị ọnwụ, iru újú, na ihe mgbu. Ya mere ọ dịghị mkpa ịtụ egwu ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ na-enwe oké nchegbu banyere ha na olileanya dịịrị ha. (Aịsaịa 25:​8, 9; Mkpughe 21:​3, 4) Chineke anyị na-ahụ n’anya na nke ezi ikpe, Jehova, pụrụ, ọ ga-akpọlitekwa ha, na-agbanwe ihe mgbu nke ọnwụ.

Okwu Chineke, bụ́ Bible, jupụtara ná nkọwa nke ihe ọnọdụ ga-adị ka ya n’ụwa ọhụrụ ahụ nke ezi omume. (Abụ Ọma 37:29; 2 Pita 3:13) Ọ ga-abụ oge nke udo na obi ụtọ na nke ịhụnanya maka mmadụ nile. (Abụ Ọma 72:7; Aịsaịa 9:7; 11:6-⁠9; Maịka 4:​3, 4) Mmadụ nile ga-enwe ebe obibi dị ntụkwasị obi, maa mma, nweekwa ọrụ na-enye ọṅụ. (Aịsaịa 65:​21-⁠23) A ga-enwe uju nke ihe ọma mmadụ nile ga-eri. (Abụ Ọma 67:6; 72:16) Mmadụ nile ga-enwe ezi ahụ ike. (Aịsaịa 33:24; 35:5, 6) Ọ bụ ezie na ndị ozi ahụ na ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị ọzọ ga-eso Jisọs chịa achịa n’eluigwe, Bible akpọtụghị ọnọdụ a gọziri agọzi n’eluigwe aha maka mkpụrụ obi nke ndị ọzọ mgbe ha nwụrụ. (Mkpughe 5:9, 10; 20:6) Nke a ga-apụ iche ma ọ bụrụ na ọtụtụ nde ndị ọzọ nwụworonụ na-adị ndụ mgbe ha nwụsịrị.

Ma ọ pụghị iche mgbe anyị matara nkụzi doro anya nke Bible: Ndị nwụrụ anwụ akwụsịwo ịdị adị dị ka mkpụrụ obi dị ndụ. Ha apụghị imerụ gị ahụ. Ndị nọ n’ili ncheta na-ezu nanị ike, ghara ịma ihe ọ bụla ruo mbilite n’ọnwụ ha n’oge Chineke. (Eklisiastis 9:10; Jọn 11:​11-14, 38-⁠44) Mgbe ahụ, olileanya na atụmanya anyị nile dabeere na Chineke. “Ka anyị tegharịa egwú ọṅụ ṅụrịakwa ná nzọpụta Ya.”​—⁠Aịsaịa 25:9.

[Foto dị na peeji nke 7]

Dị ka Okwu Chineke na-egosi n’ụzọ doro anya, ndị nwụrụ anwụ adịghị eme ihe ọ bụla ma ọlị ruokwa mbilite n’ọnwụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya