Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 11/1 p. 9-15
  • Jehova—Nna Anyị nke Nwere Ọmịiko

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova—Nna Anyị nke Nwere Ọmịiko
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebe Njedebe nke Ọmịiko Chineke
  • Ọmịiko Maka Aha Ya
  • Ngosipụta Kasị Ukwuu nke Ọmịiko
  • Mgbe Jisọs Mere Ebere
  • Ịma Atụ Ndị Na-eme Ka Ọmịiko Pụta Ìhè
  • Jehova Ji Ọmịiko Na-achị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Nweenụ Obi Ọmịiko
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Obi Ọmịiko nke Chineke Anyị”
    Bịaruo Jehova Nso
  • “O Nwere Ọmịiko”
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 11/1 p. 9-15

Jehova​—⁠Nna Anyị nke Nwere Ọmịiko

“Jehova dị nro nke ukwuu ná mmetụta, nweekwa ọmịiko.”​—⁠JEMES 5:11, ntụaka ala ala peji, NW.

1. N’ihi gịnị ka e ji adọta ndị e wedara n’ala n’ebe Jehova Chineke nọ?

ELUIGWE na ala buru ibu nke ukwuu nke na ndị na-enyocha mbara igwe apụghị ọbụna ịgụta ọnụ ọgụgụ nke ụyọkọ ya nile. Ụyọkọ nke anyị, bụ́ Milky Way, bara ụba nke ukwuu nke na mmadụ apụghị ọbụna ịgụta ọnụ ọgụgụ nke kpakpando ya nile. Ụfọdụ kpakpando, dị ka Antares, ji ọtụtụ okpukpu puku buo ibu ma na-egbukepu egbukepu karịa anyanwụ anyị. Lee ka Onye Okike Ukwu nke kpakpando nile dị n’eluigwe na ala na-aghaghị isi dị ike! N’ezie, “ọ bụ Onye ahụ Nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka Ọ na-akpọ.” (Aịsaịa 40:26) Ma, otu Chineke nke a dị ebube ‘dịkwa nro nke ukwuu ná mmetụta, nweekwa ọmịiko.’ Lee ka ihe ọmụma dị otú ahụ si bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ nye ndị ohu Jehova ndị dị umeala n’obi, karịsịa ndị na-enwe mkpagbu, ọrịa, ịda mbà n’obi, ma ọ bụ ihe isi ike ndị ọzọ!

2. Olee otú ndị ụwa nke a si elekarị mmetụta uche dị nro anya?

2 Ọtụtụ na-ele mmetụta uche ndị dị nro karị, ndị dị ka “ọmịiko na ebere” nke Kraịst anya, dị ka adịghị ike. (Ndị Filipaị 2:1) N’ịbụ ndị nkà ihe ọmụma evolushọn nwere mmetụta n’ahụ ha, ha na-agba ndị mmadụ ume ibute onwe ha ụzọ a sịgodi na ihe ọ ga-apụta bụ ịzọtọ mmetụta ndị ọzọ. Ọtụtụ ndị a na-eṅomi n’ime ihe ntụrụndụ na egwuregwu bụ ndị nwere echiche dị elu banyere ịbụ nwoke ha, ndị na-adịghị ebe ákwá ma ọ bụ na-egosi mmetụta dị nro. Ụfọdụ ndị ọchịchị ndọrọ ndọrọ na-emekwa otú ahụ. Onye Stoik bụ́ onye ọkà ihe ọmụma bụ́ Seneca, bụ́ onye kụziiri onye ọchịchị alaeze ukwu obi tara mmiri bụ́ Nero ihe, kwusiri ike na “obi ebere bụ adịghị ike.” Akwụkwọ Cyclopædia nke M’Clintock na Strong dere na-asị: “Mmetụta nile nke echiche ndị Stoik . . . nọgidere na-arụ ọrụ n’uche ndị ikom ọbụna n’oge ugbu a.”

3. Olee otú Jehova si kọwaara Mosis onwe ya?

3 N’ụzọ dị iche, àgwà nke Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ na-ekpo obi ọkụ. Ọ kọwaara Mosis onwe ya n’okwu ndị a: “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; . . . na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie: ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.” (Ọpụpụ 34:​6, 7) N’eziokwu, Jehova mechiri nkọwa nke a nke onwe ya site n’ime ka ikpe ziri ezi nke ya pụta ìhè. Ọ gaghị agụpụ ndị leziri anya na-eme mmehie ná ntaramahụhụ kwesịrị ha. Ma, o bu ụzọ kọwaa onwe ya dị ka Chineke nke dị ebere, “jupụtara n’ebere” n’ụzọ nkịtị.

4. Gịnị bụ ihe na-ekpo obi ọkụ nke okwu Hibru ahụ a na-asụgharịkarị ịbụ “ebere” pụtara?

4 Mgbe ụfọdụ a na-eche banyere okwu ahụ bụ́ “ebere” nanị n’echiche enweghị mmetụta, nke ikpe nke ịghara inye ntaramahụhụ. Otú ọ dị, ntụle nke nsụgharị Bible dị iche iche na-ewepụta nghọta dị omimi nke nkọwaaha Hibru ahụ nke e si na ngwaa ahụ bụ́ ra·chamʹ nweta. Dị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta si kwuo, ihe bụ isi ọ pụtara bụ “ịdị nro.” “Racham,” ka akwụkwọ bụ́ Synonyms of the Old Testament na-akọwa, “na-egosipụta mmetụta ọmịiko dị nro nke miri emi, dị ka nke ịhụ adịghị ike ma ọ bụ ahụhụ nke ndị anyị hụrụ n’anya ma ọ bụ ndị chọrọ enyemaka anyị nọ n’ime ya na-akpali.” A pụrụ ịchọta nkọwa ndị ọzọ na-ekpo obi ọkụ nke àgwà nke a a na-achọsi ike n’akwụkwọ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 375-379.

5. Olee otú ebere si pụta ìhè n’Iwu Mosis ahụ?

5 Ọmịiko nke Chineke pụtara ìhè n’ụzọ doro anya n’Iwu ahụ o nyere mba Israel. A ga-emeso ndị ihe ụwa na-atụ n’ọnụ, dị ka ndị inyom di ha nwụrụ, ụmụ mgbei, na ndị ogbenye, n’ụzọ ọmịiko. (Ọpụpụ 22:​22-⁠27; Levitikọs 19:​9, 10; Deuterọnọmi 15:​7-⁠11) Mmadụ nile, gụnyere ndị ohu na anụmanụ, ga-erite uru site na Sabat izu ike kwa izu. (Ọpụpụ 20:10) Ọzọkwa, Chineke rịbara ndị ji ịdị nro mesoo ndị e wedara n’ala ihe ama. Ilu 19:17 na-ekwu, sị: “Onye na-ebinye Jehova ihe ka onye na-emere onye na-enweghị ike amara bụ, ọ bụkwa mmeso ọma ya ka Ọ ga-akwụghachi ya.”

Ebe Njedebe nke Ọmịiko Chineke

6. N’ihi gịnị ka Jehova ji zijere ndị ya ndị amụma na ndị ozi?

6 Ụmụ Israel zara aha Chineke ma fee ofufe n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem, nke bụ ‘ụlọ e wuuru aha Jehova.’ (2 Ihe Emere 2:4; 6:33) Otú ọ dị, ka oge na-aga, ha malitere ịgbachi nkịtị n’omume rụrụ arụ, ikpere arụsị, na igbu ọchụ, na-ewetara aha Jehova oké nkọcha. N’ikwekọ n’àgwà ọmịiko ya, Chineke ji ndidi gbalịa idozi ọnọdụ ọjọọ nke a n’ewetaghịrị mba ahụ dum ọdachi. Ọ nọgidere ‘na-ezigara ha ozi n’aka ndị ozi Ya, na-ebili n’isi ụtụtụ, na-ezikwa; n’ihi na O nwere ọmịiko n’ahụ ndị Ya na n’ebe ebe obibi Ya dị: ha wee na-eme ndị ozi Chineke ka ha bụrụ ihe ọchị, ha na-elelịkwa okwu Ya anya, na-emekwa onwe ha ndị aghụghọ n’ebe ndị amụma Ya nọ, ruo mgbe ọnụma Jehova lara elu imegide ndị Ya, ruo mgbe ngwọta na-adịghị.’​—⁠2 Ihe Emere 36:​15, 16.

7. Mgbe ọmịiko Jehova ruru njedebe ya, gịnị mere alaeze Juda?

7 Ọ bụ ezie na Jehova nwere ọmịiko ma ghara ịdị na-ewe iwe ọsọ ọsọ, mgbe ọ dị mkpa ọ na-egosipụta iwe ezi omume. Laa azụ n’oge ahụ, ọmịiko Chineke eruwo ebe njedebe ya. Anyị na-agụ banyere ihe ndị si n’ime ya pụta: “[Jehova] wee mee ka eze Kaldea rịgokwasị ha, o wee were mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha n’ụlọ ebe nsọ ha, o nweghịkwa ọmịiko n’ahụ nwa okorobịa, ma ọ bụ n’ahụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, ma ọ bụ n’ahụ okenye, ma ọ bụ n’ahụ onye kara nká: ha nile ka O nyere n’aka ya.” (2 Ihe Emere 36:17) Otú a e bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya, a dọrọkwaara mba ahụ laa n’agha na Babilọn.

Ọmịiko Maka Aha Ya

8, 9. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji kwupụta na ya ga-enwe ọmịiko maka aha ya? (b) Olee otú e si kpuchie ndị iro Jehova ọnụ?

8 Mba ndị nọ gburugburu ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ọdachi nke a. N’ụzọ ịkwa emo, ha sịrị: “Ndị nke Jehova ka ndị a bụ, ọ bụkwa n’ala Ya ka ha siri pụta.” N’ịbụ onye nkọcha nke a metụrụ n’ahụ, Jehova kwupụtara, sị: “Enwere m ọmịiko n’ahụ aha nsọ m . . . M ga-edokwa aha ukwu m nsọ, . . . mba nile ga-amakwa na Mụ onwe m bụ Jehova.”​—⁠Ezikiel 36:​20-⁠23.

9 Ka mba nke ya nọsịrị 70 afọ ná ndọta n’agha, Chineke ọmịiko ahụ, bụ́ Jehova, tọhapụrụ ha ma kwe ka ha laghachi ma wughachi ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem. Nke a mere ka ọnụ kpuchie mba ndị nọ gburugburu, ndị ji oké ijuanya na-ele anya. (Ezikiel 36:​35, 36) Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, mba Israel dabaghachiri ọzọ n’omume ọjọọ. Onye Juu kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Nehemaịa, nyere aka idozi ọnọdụ ahụ. N’otu ekpere ihu ọha, ọ tụleghachiri mmeso ọmịiko nile nke Chineke mesoworo mba ahụ, na-asị:

10. Olee otú Nehemaịa si mee ka ọmịiko Jehova pụta ìhè?

10 “Na mgbe mkpagbu ha, ha wee tikuo Gị, Gị onwe gị wee site n’eluigwe nụ, nye ha ndị nzọpụta dị ka ọtụtụ obi ebere Gị nile si dị, ha wee zọpụta ha n’aka ndị na-akpagbu ha. Ma mgbe izu ike dịịrị ha, ha mekwara ihe ọjọọ n’ihu Gị ọzọ; I wee hapụ ha n’aka ndị iro ha, ha wee nwee ike n’ahụ ha: ha wee laghachi, tikuo Gị, Gị onwe gị wee site n’eluigwe nụ, napụta ha ọtụtụ ugbo dị ka obi ebere Gị nile si dị. . . . Ị na-eme ka ọtụtụ afọ dị ogologo n’isi ha.”​—⁠Nehemaịa 9:​26-⁠30; leekwa Aịsaịa 63:​9, 10.

11. Gịnị bụ ọdịiche dị n’agbata Jehova na chi dị iche iche nke ụmụ mmadụ?

11 N’ikpeazụ, ka ha jisịrị obi ịta mmiri jụ Ọkpara Chineke ọ hụrụ n’anya, mba ndị Juu tụfuru ọkwá ihe ùgwù ha ruo mgbe ebighị ebi. Nrapagide n’ụzọ iguzosi ike n’ihe nke Chineke n’ebe ha nọ dịruru ihe karịrị 1,500 afọ. Ọ na-eguzo dị ka ihe àmà ebighị ebi nke eziokwu ahụ bụ na Jehova bụ n’ezie Chineke nke ebere. Lee nnọọ ọdịiche doro anya nke a bụ n’ebe chi ndị obi tara mmiri na chi ndị na-enweghị mmetụta ndị ụmụ mmadụ na-eme mmehie mepụtara nọ!​—⁠Lee peji nke 8.

Ngosipụta Kasị Ukwuu nke Ọmịiko

12. Gịnị bụ́ ngosipụta kasị ukwuu nke ọmịiko Chineke?

12 Ngosipụta kasị ukwuu nke ọmịiko Chineke bụ nzite o zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya n’elu ụwa. N’eziokwu, ndụ iguzosi ike n’ezi ihe nke Jisọs wetaara Jehova oké obi ụtọ, na-enye ya azịza zuru okè n’ebe ebubo ụgha dị iche iche nke Ekwensu dị. (Ilu 27:11) Otú ọ dị, n’otu oge ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ya ikiri ka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya nwụrụ ọnwụ obi ịta mmiri nke na-emekwa ihere kpataara Jehova ihe mgbu karịa nke onye ọ bụla bụ mmadụ nke mụrụ nwa na-aghaghị idiworị mgbe ọ bụla. Ọ bụ nnọọ ezigbo àjà ịhụnanya, na-emepe ụzọ maka nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Jọn 3:16) Dị ka Zakaraịas, bụ́ nna nke Jọn Onye Na-eme Baptism, buru n’amụma, o mere ka “obi ebere nke Chineke anyị” pụtakwuo ìhè.​—⁠Luk 1:​77, 78.

13. N’ụzọ dị aṅaa dị mkpa ka Jisọs siworo gosipụta àgwà Nna ya?

13 Nzite nke Ọkpara Chineke n’ụwa nyekwara ihe a kpọrọ mmadụ nghọta ka doo anya nke àgwà Jehova. N’ụzọ dị aṅaa? N’ụdị nke na Jisọs gosipụtara àgwà nke Nna ya n’ụzọ zuru okè, karịsịa n’ụzọ ọmịiko o si mesoo ndị e wedara n’ala! (Jọn 1:14; 14:9) N’akụkụ nke a, mmadụ atọ ahụ dere Oziọma ndị ahụ bụ́ Matiu, Mak, na Luk jiri ngwaa Grik, bụ́ splag·khniʹzo·mai, nke sitere n’okwu Grik maka “ngịrị afọ” mee ihe. “Site n’ebe ahụ e si nweta ya,” ka ọkà mmụta Bible bụ́ William Barclay na-akọwa, “a pụrụ ịhụ na ọ dịghị akọwa obi ebere nkịtị ma ọ bụ ọmịiko, kama mmetụta uche nke na-akpali mmadụ ruo n’ime ime obi ya. Ọ bụ okwu kachasị sie ike n’asụsụ Grik maka mmetụta nke ọmịiko.” A na-asụgharị ya n’ụzọ dịgasị iche iche dị ka “ime ebere” ma ọ bụ “ịbụ onye ebere kwaliri.”​—⁠Mak 6:34; 8:2.

Mgbe Jisọs Mere Ebere

14, 15. N’otu obodo nke Galili, olee otú Jisọs si bụrụ onye obi ebere kwaliri, gịnịkwa ka nke a na-eme ihe atụ ya?

14 Ebe ahụ bụ otu obodo nke Galili. Otu nwoke nke “ekpenta jupụtara n’ahụ” abịakwute Jisọs n’enyeghị ịdọ aka ná ntị ahụ a na-enyekarị. (Luk 5:12) Jisọs ò ji olu ike bawara ya mba n’ihi na ọ dịghị eti mkpu, sị, “Onye rụrụ arụ, onye rụrụ arụ,” dị ka Iwu Chineke chọrọ? (Levitikọs 13:45) Ee e. Kama nke ahụ, Jisọs gere ntị n’arịrịọ onye ihe ji n’olu nke nwoke ahụ: “Ọ bụrụ na Ị na-achọ, Ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” ‘N’ịbụ onye ọmịiko kwaliri,’ Jisọs setịpụrụ aka Ya, metụ ya, sị: “Ana m achọ; ka e mee ka ị dị ọcha.” E weghachiri ahụ ike nwoke ahụ ozugbo. Jisọs si otú a na-egosi ọ bụghị nanị ike ọrụ ebube ya ndị sitere n’aka Chineke kamakwa mmetụta ndị dị nro ndị na-akpali ya iji ike ndị dị otú ahụ mee ihe.​—⁠Mak 1:​40-⁠42.

15 Ọ̀ bụ iwu na a ga-abịakwuterịrị Jisọs tupu o gosi mmetụta ọmịiko ya? Ee e. N’oge ọzọ ka e mesịrị, o zutere ìgwè ndị na-eje ili ozu ka ha si n’obodo Nain na-apụta. Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya, Jisọs ahụwo ọtụtụ olili ozu tupu mgbe ahụ, ma nke a bụ ọdachi n’ụzọ pụrụ iche. Onye ahụ nwụrụnụ bụ nanị nwa nwoke nke otu nwanyị di ya nwụrụ. ‘N’ịbụ onye ọmịiko kwaliri,’ Jisọs bịakwutere ya wee sị: “Akwala ákwá.” Mgbe ahụ, ọ rụọ ọrụ ebube ahụ pụrụ iche nke ịkpọliteghachi nwa ya nwoke ná ndụ.​—⁠Luk 7:​11-⁠15.

16. N’ihi gịnị ka Jisọs ji na-emere ìgwè mmadụ ahụ na-eso ya ebere?

16 Ihe mmụta pụrụ iche a mụtara site n’ihe omume ndị ahụ dị n’elu bụ na mgbe Jisọs ‘nwere ọmịiko,’ ọ na-eme ihe pụtara ìhè iji nye aka. N’oge ọzọ ka e mesịrị, Jisọs leruru ìgwè mmadụ na-esogharị ya anya. Matiu na-akọ na “o nwere ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Ndị Farisii na-eme ihe dị nta iji gboo agụụ ime mmụọ nke ndị nkịtị. Kama nke ahụ, ha na-eji ọtụtụ ụkpụrụ nduzi ndị na-adịghị mkpa ebogbu ndị dị umeala n’obi. (Matiu 12:1, 2; 15:1-⁠9; 23:4, 23) E kpughere otú ha si ele ndị nkịtị anya mgbe ha kwuru banyere ndị gere Jisọs ntị, sị: “Ìgwè mmadụ a nke na-amaghị iwu anyị bụ ndị a na-abụ ọnụ.”​—⁠Jọn 7:49.

17. Olee otú ebere Jisọs nwere maka ìgwè mmadụ ahụ si akpali ya, nduzi dịkwa aṅaa nke nwere mmetụta na-adịte anya ka o nyere n’ebe ahụ?

17 N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ọnọdụ ime mmụọ jọrọ njọ nke ìgwè mmadụ ahụ metụrụ Jisọs n’ahụ n’ụzọ dị omimi. Ma e nwere nnọọ ọtụtụ ndị nwere mmasị nke na ọ pụghị inye ha nlekọta n’otu n’otu. Ya mere ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere maka inwekwu ndị ọrụ. (Matiu 9:​35-⁠38) N’ikwekọ n’ekpere ndị dị otú ahụ, Jisọs jiri ozi bụ́: “Alaeze eluigwe dị nso,” zipụ ndị ozi ya. Ntụziaka ndị e nyere mgbe ahụ ejewo ozi dị ka ihe nduzi bara uru nye ndị Kraịst ruokwa taa. N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, mmetụta ọmịiko nke Jisọs na-akwali ya igbo agụụ ime mmụọ nke ihe a kpọrọ mmadụ.​—⁠Matiu 10:​5-⁠7.

18. Olee otú Jisọs si meghachi omume mgbe ìgwè mmadụ wakwasịrị nnọrọ onwe ya, gịnịkwa ka anyị na-amụta site na nke a?

18 N’oge ọzọ, Jisọs nwere mmetụta banyere mkpa dị iche iche nke ìgwè mmadụ ahụ ọzọkwa. Na nke ugbu a ike gwụsịrị ya na ndị na-eso ụzọ ya ka ha mesịrị njem ime nkwusa nke kpụ ọkụ n’ọnụ, ha wee chọrọ ebe ha ga-anọ zuru ike. Ma n’oge na-adịghị anya ndị ahụ chọtara ha. Kama Jisọs ịbụ onye mwakwasị nke a a wakwasịrị ha ebe ha nọọrọ onwe ha kpasuru iwe, Mak dekọrọ na ọ bụ ‘onye ọmịiko kwaliri.’ Gịnịkwa kpatara mmetụta dị omimi nke Jisọs? “Ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” Ọzọkwa, Jisọs gosipụtara mmetụta ya wee malite izi ìgwè mmadụ ahụ ihe “banyere alaeze Chineke.” Ee, agụụ ime mmụọ ha kwaliri ya n’ụzọ dị omimi nke na o jiri ezumike dị mkpa chụọ àjà iji zie ha ihe.​—⁠Mak 6:34; Luk 9:11.

19. Olee otú nchegbu Jisọs maka ìgwè mmadụ ahụ si gụnye ihe karịrị mkpa ime mmụọ ha?

19 Ọ bụ ezie na o nwere nchegbu n’ụzọ bụ isi banyere mkpa ime mmụọ nke ndị mmadụ, Jisọs adịghị mgbe o leghaara mkpa anụ ha ndị bụ isi anya. N’otu oge ahụ, o ‘mekwara ka ahụ dị ha ike, bụ́ ndị ọ dị mkpa ka e mee ka ahụ ha dị ike.’ (Luk 9:11) N’oge ọzọ ka e mesịrị, ya na ìgwè mmadụ ahụ anọwo ruo ogologo oge, ha nọkwa n’ebe dị anya site n’ụlọ. N’ịmata mkpa anụ ahụ ha, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Enwere m ọmịiko n’ahụ ìgwè mmadụ a, n’ihi na Mụ na ha nọgidere ụbọchị atọ ugbu a, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri: ma achọghị m izilaga ha n’ọnụ efu, ka ha ghara ịda mbà n’ụzọ ma eleghị anya.” (Matiu 15:32) Jisọs emee ihe ugbu a iji gbochie ịta ahụhụ pụrụ ịdapụta. N’ụzọ ọrụ ebube o nyere ọtụtụ puku ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị ihe oriri site n’ógbè achịcha asaa na ntakịrị azụ ole na ole.

20. Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe ndekọ ndị ikpeazụ e mere banyere Jisọs ịbụ onye obi ebere kwaliri?

20 Ihe ndekọ ikpeazụ e mere banyere obi ebere ịkwali Jisọs bụ na njem ikpeazụ o mere gaa Jerusalem. Ìgwè mmadụ buru ibu so ya na-eme njem ije mee Ememe Ngabiga. N’ogologo ụzọ ahụ n’ebe dịdewere Jeriko, ndị ìsì abụọ nọgidere na-eti mkpu, sị: “Onyenwe anyị, meere anyị ebere.” Ìgwè mmadụ gbalịrị ikpuchi ha ọnụ, ma Jisọs kpọrọ ha wee jụọ ha ihe ha chọrọ ka o mee. “Onyenwe anyị, ka e wee meghee anya anyị,” ka ha rịọrọ. “Ebe O nwere ọmịiko n’ahụ ha,” o metụrụ anya ha aka, ha wee malite ịhụ ụzọ. (Matiu 20:​29-⁠34) Lee aha ihe dị mkpa anyị mụtara site na nke a! Jisọs na-achọ ịbanye n’izu ikpeazụ nke ozi elu ala ya. O nwere ọrụ dị ukwuu ịrụzu tupu ọ nwụọ ọnwụ obi ịta mmiri n’aka ndị ọrụ Setan. Ma, o kweghị ka nrụgide nke oge a dị oké mkpa gbochie ya igosipụta mmetụta ọmịiko dị nro n’ebe mkpa ndị dị ala karị nke ụmụ mmadụ dị.

Ịma Atụ Ndị Na-eme Ka Ọmịiko Pụta Ìhè

21. Gịnị ka e mere ihe atụ ya site n’onyenwenụ ahụ ịkagbu ụgwọ buru ibu nke ohu ya?

21 Ngwaa Grik ahụ bụ́ splag·khniʹzo·mai, bụ́ nke e ji mee ihe n’ihe ndekọ ndị a nke ndụ Jisọs, bụ nke e jikwa mee ihe n’atọ n’ime ilu Jisọs. N’otu akụkọ, otu ohu na-arịọ oge iji kwụghachi ụgwọ buru ibu o ji. Onye nwe ya n’ịbụ onye “nwere ọmịiko n’ahụ ya,” kagburu ụgwọ ahụ. Nke a na-eme ihe atụ na Jehova Chineke egosiwo oké ọmịiko n’ịkagburu onye Kraịst ọ bụla gosipụtara okwukwe n’àjà mgbapụta nke Jisọs ụgwọ mmehie buru ibu.​—⁠Matiu 18:27; 20:28.

22. Gịnị ka ilu nke nwa mmefu ahụ na-eme ihe atụ ya?

22 Mgbe ahụ e nwere akụkọ banyere nwa mmefu ahụ. Cheta ihe mere mgbe nwa ngahie ahụ lọtara n’ụlọ. “Ma mgbe ọ nọ n’ebe dị anya ugbu a, nna ya hụrụ ya, o wee nwee ọmịiko n’ahụ ya, gbaa ọsọ, makụọ ya n’olu, sutukwa ya ọnụ nke ukwuu.” (Luk 15:20) Nke a na-egosi na mgbe onye Kraịst nke gahieworo gosiri ezi nchegharị, Jehova ga-eme ebere ma jiri ịdị nro nabataghachi onye ahụ. Ya mere, site n’ihe atụ abụọ ndị a, Jisọs na-egosi na Nna anyị, bụ́ Jehova, “dị nro nke ukwuu ná mmetụta, nweekwa ọmịiko.”​—⁠Jemes 5:11, ntụaka ala ala peji, NW.

23. Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe atụ Jisọs banyere onye Sameria ahụ nwere omume onye agbata obi?

23 Ojiji nke atọ e ji splag·khniʹzo·mai mee ihe n’ụzọ ihe atụ metụtara onye Sameria ahụ nwere ọmịiko bụ́ onye ‘nwere ọmịiko’ n’ihi ọnọdụ ọjọọ nke onye Juu e zuru ohi ma hapụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma. (Luk 10:33) N’ime ihe site ná mmetụta ndị a, onye Sameria ahụ mere ihe nile o nwere ike ime iji nyere onye ahụ ọ na-amaghị aka. Nke a na-egosi na Jehova na Jisọs na-atụ anya ka ezi ndị Kraịst gbasoo ihe nlereanya ha n’igosi ịdị nro na ọmịiko. A ga-atụle ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi mee nke a n’isiokwu na-esonụ.

Ajụjụ ná Ntụleghachi

◻ Gịnị ka ọ pụtara bụ ịdị ebere?

◻ Olee otú Jehova si gosi ọmịiko maka aha ya?

◻ Gịnị bụ ngosipụta kasị ukwuu nke ọmịiko?

◻ N’ụzọ dị aṅaa pụrụ iche ka Jisọs si gosipụta àgwà nke Nna ya?

◻ Gịnị ka anyị na-amụta site n’ọrụ ọmịiko ndị nke Jisọs nakwa site n’ihe atụ ya dị iche iche?

[Igbe dị na peeji nke 12, 13]

OKWU DORO ANYA MAKA “NLEKỌTA ỊHỤNANYA DỊ NRO”

“NGỊRỊ afọ m, ngịrị afọ m!” ka onye amụma bụ́ Jeremaịa tiri ná mkpu. Ọ̀ na-ekwu banyere nsogbu afọ n’ihi ihe dị njọ o riri? Ee e. Jeremaịa ji okwu Hibru nke na-asị n’ihe bụ ihe ọzọ n’ụzọ ihe atụ na-eme ihe iji kọwaa nchegbu ya dị omimi banyere ọdachi na-abịakwasị alaeze Juda.—Jeremaịa 4:19.

Ebe Jehova Chineke nwere mmetụta ndị dị omimi, a na-ejikwa okwu Hibru bụ́ maka “ngịrị afọ,” ma ọ bụ “eriri afọ,” (me·ʽimʹ) eme ihe iji kọwaa mmetụta uche ya dị nro. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ iri afọ tupu ụbọchị Jeremaịa, eze Asiria dọọrọ alaeze ebo iri nke Israel n’agha. Jehova kwere ka nke a mee dị ka ntaramahụhụ n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ha. Ma Chineke ò chefuru ha n’ala ọzọ? Ee e. Ọ ka rapagidesiri ike n’ebe ha nọ dị ka akụkụ nke ndị ya ha na ya nọ n’ọgbụgba ndụ. Na-ezo aka n’ebe ha nọ n’aha nke ebo a ma ama bụ́ Efraim, Jehova jụrụ, sị: “Efraim, ọ̀ bụ nwa nwoke dị oké ọnụ ahịa M nwere? ọ̀ bụ nwa na-atọ m ụtọ nke ukwuu? n’ihi na ka mgbe hà M na-ekwu okwu megide ya, ana m echeta ya nke ọma ruo ugbu a: n’ihi nke a ngịrị afọ m adaworo ya ụda; aghaghị m inwe obi ebere n’ahụ ya.”​—⁠Jeremaịa 31:⁠20.

Site n’ikwu, sị, “ngịrị afọ m adaworo ya ụda,” Jehova ji atụmatụ okwu mee ihe iji kọwaa mmetụta ịhụnanya ya dị omimi maka ndị ya nọ n’ala ọzọ. N’okwu nkọwa ya n’amaokwu a, onye mmụta Bible nke narị afọ nke 19 bụ́ E. Henderson dere, sị: “Ọ dịghị ihe pụrụ ịkarị ngosipụta na-emetụ n’ahụ nke mmetụta dị nro nke onye mụrụ nwa n’ebe nwa mmefu na-alọghachi alọghachi nọ, nke Jehova gosipụtara n’ebe a. . . . Ọ bụ ezie na o siwo otú a kwuo okwu megide [ndị Efraim ahụ na-ekpere arụsị] ma taa ha ahụhụ . . . , ọ dịghị mgbe o chefuru ha, kama, n’ụzọ dị iche na nke ahụ, o nwere ọṅụ n’olileanya nke mgbake ha n’ikpeazụ.”

A na-ejikwa okwu Grik maka “eriri afọ,” ma ọ bụ “ngịrị afọ,” eme ihe n’otu aka ahụ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Mgbe a na-ejighị ya mee ihe n’ụzọ nkịtị, dị ka ọ dị n’Ọrụ Ndị Ozi 1:​18, ọ na-ezo aka ná mmetụta ịhụnanya dị nro ma ọ bụ ọmịiko. (Faịlimọn 12) Mgbe ụfọdụ a na-agbakwụnye okwu ahụ n’okwu Grik pụtara “mma” ma ọ bụ “ọma.” Ndị ozi bụ́ Pọl na Pita ji njikọta nke okwu abụọ ahụ mee ihe mgbe ha na-agba ndị Kraịst ume ka ha ‘nwee obi ọmịiko,’ n’ụzọ nkịtị “nwee ebere nke ọma.” (Ndị Efesọs 4:32; 1 Pita 3:⁠8) A pụkwara ịgbakwụnye okwu Grik maka “eriri afọ” n’okwu Grik bụ́ pol·yʹ. Njikọ ahụ pụtara n’ụzọ nkịtị “inwe nnukwu eriri afọ.” E ji okwu Grik nke a a na-ejikebeghị eme ihe mee ihe nanị otu ugboro n’ime Bible, ọ na-ezokwa aka n’ebe Jehova Chineke nọ. New World Translation na-enye nsụgharị nke a: “Jehova dị nro ná mmetụta ịhụnanya.”​—⁠Jemes 5:⁠11.

Lee ka anyị kwesịrị isi nwee ekele na onye kachasị ike n’eluigwe na ala, bụ́ Jehova Chineke, adịghị nnọọ ka chi dị iche iche obi tara mmiri ndị ụmụ mmadụ na-enweghị ọmịiko mepụtara! N’iṅomi Chineke ha nke “nwere ọmịiko,” a na-akwali ezi ndị Kraịst imekwa otú ahụ ná mmeso ha na-emesorịta ibe ha.​—⁠Ndị Efesọs 5:⁠1.

[Foto dị na peeji nke 10]

Mgbe ọmịiko Chineke ruru njedebe ya, Jehova kwere ka ndị Babilọn merie ndị ya na-agahie agahie

[Foto dị na peeji nke 11]

Ikiri Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka ọ nwụrụ aghaghị ịkpataworo Jehova Chineke ihe mgbu kachasị nke onye ọ bụla na-aghaghị inweworị mgbe ọ bụla

[Foto dị na peeji nke 15]

Jisọs gosipụtara àgwà ọmịiko nke Nna ya n’ụzọ zuru okè

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya