Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Pụrụ Ịhụ Anyị?
OTU nwanyị egbuo di ya. Afọ asaa n’ihu otu nrọ nke o kwere na ọ bụ ihe mgbaàmà nke ọnụma di ya nwụrụ anwụ na-emenye ya egwu. Iji mee ka obi dajụọ “mmụọ” ya, ọ na-eziga nwa ya nwanyị ka ọ gaa wụsa onyinye ihe ọṅụṅụ n’elu ili ya.
Nwa ya nwanyị amaghị otú ọ ga-esi gwa mmụọ nna ya okwu, ebe onyinye ahụ sitere n’aka nne ya bụ́ onye gburu ya. Site n’ebe dị nzuzo, nwanne ya nwoke na-ekiri ihe na-emenụ. Ọ bịara nso, ya na nwanne ya nwanyị kpegakwaara nna ha ekpere ka o nyere ha aka ịbọ ọ́bọ̀ ogbugbu e gburu ya.
Ihe nkiri nke a sitere na The Libation Bearers, ihe nkiri Grik e dere n’ihe karịrị 2,400 afọ gara aga. N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, karịsịa n’Africa, a na-achụ àjà ndị dị otú ahụ n’akụkụ ili ọbụna taa.
Dị ka ihe atụ, tụlee ahụmahụ nke Ibe, onye bi na Nigeria. Ebe ụmụ atọ funahụworo ya n’ọnwụ, o jekwuuru otu dibịa ọdịnala, onye gwara Ibe na ọnwụ ndị ahụ abụghị na nkịtị—nna Ibe bụ́ onye nwụworo anwụ na-ewe iwe n’ihi na e mebeghị ememe olili ozu ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.
N’ime ihe kwekọrọ n’okwu ndụmọdụ dibịa ọdịnala ahụ, Ibe chụrụ otu ewu n’àjà ma wụsa onyinye mmanya ọkụ na mmanya ọcha n’ili nna ya. Ọ kpọkuru mmụọ nna ya, na-arịọ mgbaghara, na-emesi ịhụnanya ya ike, ma na-arịọ maka ngọzi.
Ibe adịghị arụ ụka na nna ya pụrụ ịhụ ya ma nụ ihe ọ na-ekwu. O kweghị na nna ya tọgbọrọ n’enweghị ndụ kama na n’ọnwụ, ọ “gafere” site n’ụwa a na-ahụ anya gaa n’ụwa a na-adịghị ahụ anya. Ibe kwenyere na nna ya esiwo n’ụwa nke anụ ahụ na ọbara gaa n’ụwa nke ndị bụ mmụọ, ebe obibi nke ndị nna ochie.
Ibe na-eche echiche otú a: ‘Ọ bụ ezie na Papa anọkwaghị n’ụwa nke a, ọ ka na-echeta m, nweekwa mmasị n’ọdịmma m. Ebe ọ bụzikwa mmụọ ugbu a nke nwere ike ndị kanụ, ọ nọ n’ọnọdụ ka nnọọ mma nke ukwuu inyere m aka karịa mgbe ọ bụ mmadụ n’elu ụwa. Ọzọkwa, ọ pụrụ ịgakwuru Chineke n’onwe ya n’ihi m, ebe ọ bụ na Chineke bụkwa mmụọ. Iwe pụrụ ịdị na-ewe papa m ugbu a, ma ọ bụrụ na mụ egosi ya nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị, ọ ga-agbagbara ma gọzie m.’
N’Africa nkwenkwe nke na ndị nwụrụ anwụ na-ahụ ndị mmadụ n’elu ụwa ma na-akpa ike ná ndụ ha zuru ebe nile n’etiti ndị na-ekpe okpukpe ọdịnala. A na-ahụkwa ya n’etiti ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, mgbe nwanyị lụsịworo di na chọọchị, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ ka ọ gara n’ụlọ ndị mụrụ ya iji nata ngọzi ọdịnala. N’ebe ahụ a na-akpọku ndị nna ochie, a na-awụsakwara ha onyinye ihe ọṅụṅụ. Ọtụtụ ndị kwere na emeghị nke a na-eweta ọdachi n’alụmdi na nwunye ahụ.
E chere na ndị nna ochie, ma ọ bụ mmụọ ndị nna nna ha, na-ahụ maka nlanarị na ịba ụba nke ezinụlọ dị iche iche n’ụwa. Dị ka echiche nke a na-egosi, ha bụ ndị ibe dị ike n’ọrụ, ndị nwere ike iweta owuwe ihe ubi dị mma, kwalite ahụ ike, ma chebe ndị mmadụ pụọ ná mmerụ ahụ. Ha na-agbachitere mmadụ. Ma, ọ bụrụ na e leghara ha anya ma ọ bụ kpasuo ha iwe, ha na-eweta ọdachi—ọrịa, ịda ogbenye, ọbụna ọnwụ. N’ihi ya, site n’àjà na usoro ememe, ndị mmadụ na-agbalịsi ike ịnọgide na-eso ndị nwụrụ anwụ na-enwe mmekọrịta dị mma.
Ì kwenyere na ndị nwụrụ anwụ na-ekere òkè pụtara ìhè ná ndụ ndị dị ndụ? Ọ̀ dịwo mgbe i guzoro n’ili onye a hụrụ n’anya ma hụ onwe gị ka ị na-ekwu okwu ole na ole, a dị ama ama ọ bụrụ na o nwere ike ịnụ ihe ị na-ekwu? Ọ dị mma, ma ndị nwụrụ anwụ hà na-ahụ anyị na-anụkwa ihe anyị na-ekwu ma ọ bụ na ha adịghị dabeere n’ihe na-eme mgbe a nwụrụ. Ka anyị nyochaa ihe Bible kwuru banyere isiokwu nke a dị mkpa.