Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 5/15 p. 3-4
  • Otu Chiifu Atụlee Ọdịnihu Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otu Chiifu Atụlee Ọdịnihu Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Ebe Ndị Nna Nna Anyị Hà Nọ?
    Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
  • Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Pụrụ Ịhụ Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Olee Ndị Bi n’Ógbè Ndị Mmụọ?
    Teta!—1996
  • Iso Ógbè Ndị Mmụọ Enwe Mmekọrịta
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 5/15 p. 3-4

Otu Chiifu Atụlee Ọdịnihu Ya

ONYE chiifu ahụ nke Ọdịda Anyanwụ Africa bụ onye a hụrụ n’anya nke ukwuu ma na-akwanyere ùgwù n’ógbè ya. N’ememe ncheta ọmụmụ ya nke 78, ndị enyi, ezinụlọ, na ndị ọzọ na-echere ya echiche ọma gbakọrọ ịja ya mma. N’otu okwu o kwuru, chiifu ahụ họọrọ isiokwu pụrụ iche maka ihe omume dị otú ahụ. O kwuru banyere echiche ya banyere ndụ mgbe a nwụsịrị.

Ọ sịrị na a gafesịa ili, “e nwere ụwa ọhụrụ nke aghụghọ, ntaji anya na anyaukwu na-adịghị ya.” Ọ kọwara ya dị ka ụwa nke “e kpuchiri n’ihe omimi,” nke nanị ndị ezi omume bi na ya, bụ́ ndị ga-eso Chineke emekọ ihe.

Nkwenkwe ndị dị otú ahụ juru eju n’etiti ndị mmadụ n’Africa dum. Dị ka okpukpe omenala Africa na-ekwu, ọnwụ abụghị ngwụsị nye ndụ kama nanị ụzọ ngafe, ngabiga banye ná ndụ n’ógbè ndị bụ mmụọ. N’ọnwụ a sịrị na mmadụ na-agabiga site n’ụwa nke a na-ahụ anya gaa na nke a na-adịghị ahụ anya. Dị ka mmụọ, onye ahụ na-abanyezi mgbe ahụ ná mbara ebe ndị nna nna ya ha bi.

Ọtụtụ ndị Ọdịda Anyanwụ Africa kwere na ndị nna nna, ma ọ bụ mmụọ ndị nna nna, na-ahụ maka ọdịmma nke ezinụlọ ha n’elu ụwa. Akwụkwọ bụ́ West African Traditional Religion na-asị: “E nweghị ịkpa ókè ọ bụla doro anya nke mmetụta n’etiti ndị ka nọ n’ógbè ndị dị n’elu ụwa, na ndị nke nọ n’ala mmụọ. Mgbe ha nọ n’elu ụwa ebe a, [ndị nna nna] bụ ndị okenye nke ezinụlọ ha gasị. Ugbu a e wepụworo ha n’anya anyị, ha ka bụkwa ndị okenye n’ụwa nke ndị bụ mmụọ. Ha adịghị akwụsị inwe mmasị n’ọdịmma dum nke ezinụlọ ha gasị.”

Ya mere, chiifu ahụ meworo agadi nke e hotara ná mmalite tụrụ anya isonyere ndị nna nna ya rụkọọ ọrụ n’ógbè ndị bụ mmụọ. Ọ sịrị: “Obi siri m nnọọ ike ná ndụ mgbe a nwụsịrị na ohere nke mụ ịga n’ihu n’ije ozi—ọbụna mgbe m nwụsịrị.”

Otú ọ dị, n’ihi ihe chiifu ahụ kwuziri, akwụkwọ akụkọ Sunday Times nyere echiche nke na o “yiri ka obi esichaghị ya nnọọ ike” banyere ndụ gabiga ili. Ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ gbakọrọ na ya anụwo banyere otu akwụkwọ na-atụle ndụ mgbe a nwụsịrị. Chiifu ahụ anọwo na-achọ akwụkwọ ahụ ruo afọ ise. Ọ na-anụ ya ọkụ n’obi nke ukwuu ịgụ ya nke na o wepụtara ihe hà ka $1,500 (U.S.) maka onye ọ bụla ga-ewetara ya otu.

Chiifu ahụ gaara egbochiworo onwe ya nsogbu site n’ilenye anya n’otu akwụkwọ nke na-esighị ike ịchọta. Ọ bụ akwụkwọ dị mfe nnweta nke ọ na-abụghị mmadụ mepụtara kama ọ bụ Onye Okike nke mmadụ nile. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:13) Akwụkwọ ahụ bụ Bible. Gịnị ka ọ na-ekwu banyere ndụ mgbe a nwụsịrị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya