Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 12/1 p. 20-24
  • Ụzọ Ndụ nke Nwere Nzube

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Ndụ nke Nwere Nzube
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrụ M Rụrụ n’Afọ Ndụ M Nile
  • Egwuregwu Ghọrọ Ụzọ Ndụ
  • Nzube nke Dị Iche Pụọ n’Egwuregwu
  • Itinye Mkpebi n’Ọrụ
  • Ije Ozi n’Alaka Ụlọ Ọrụ
  • Ụzọ Ndụ nke Nzube Na-adịgide Adịgide
  • Nke A Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ụzọ Ndụ Kasị Mma Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Òkù A Na-akpọ Mmadụ Niile!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Anyị Bụbu Ndị Na-arụkọ Ọrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 12/1 p. 20-24

Ụzọ Ndụ nke Nwere Nzube

DỊ KA MELVA A. WIELAND SI KỌỌ

Na March 1940, ọnwa ole na ole mgbe e mesịrị m baptism, nwanne m nwanyị bụ́ Phyllis bịakwutere m wee jụọ, sị: “Gịnị ma ị banye n’ọrụ ọsụ ụzọ?” “Ọrụ ọsụ ụzọ?” ka m jụrụ. “Ị̀ na-ekwu ịdị na-eme nkwusa oge nile, dị ka kwa ụbọchị?”

‘OLEE otú m ga-esi bụrụ onye ọsụ ụzọ,’ ka m chere, ‘ebe m nwere ihe ọmụma Bible dị nta na ọbụna ego ụlọ akụ nke dị nta karị?’ Otú o sina dị, ajụjụ Phyllis tinyere m n’echiche. Ekpekwara m ekpere banyere ya nke ukwuu.

N’ikpeazụ echere m sị, ‘N’ihi gịnị ka m na-apụghị ịtụkwasị Chineke obi ebe o kwere nkwa ilekọta anyị ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ chọọ Alaeze ya?’ (Matiu 6:33) Ya mere na June 1940, etinyere m akwụkwọ ịhapụ ọrụ ịkwa ákwà m. Mgbe ahụ m degaara alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị n’Australia akwụkwọ, na-arịọ maka ọrụ onye ọsụ ụzọ.

Ọrụ M Rụrụ n’Afọ Ndụ M Nile

Mgbe izu ole na ole gasịrị, anatara m nzaghachi, nke na-agwa m na a ga-enye m ọrụ mgbe m jesịrị mgbakọ nke a ga-enwe na gburugburu isi ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị na Strathfield, otu obere obodo dị ná nnukwu obodo Australia, bụ́ Sydney. N’ụtụtụ na-esonụ mgbe mgbakọ ahụ gasịrị, agara m n’ụlọ ọrụ ahụ ịnata ọrụ e kenyere m.

Onye nọ ọrụ mgbe ahụ kọwara, sị: “Ka ọ dị ugbu a anyị ji nnọọ ọrụ n’aka n’ebe ịsa ákwà. Ị̀ ga-enwe ike ịnọ ma nye aka ruo izu ole na ole?” Nke ahụ bụ n’August 1940​—⁠m ka na-arụkwa ọrụ n’ebe ịsa ákwà ahụ! N’oge ahụ e nwere nanị mmadụ 35 n’ezinụlọ isi ụlọ ọrụ ahụ; ugbu a e nwere 276.

Ma ọ pụrụ iju gị anya ihe mere m ji were ịrụ ọrụ n’ebe ịsa ákwà dị ka “ụzọ ndụ nke nwere nzube,” karịsịa ebe nke a bụworo ọrụ m ruo ihe karịrị 50 afọ ugbu a. Tupu m kọwaa, ka m kọọ banyere nchụso m ná mmalite.

Egwuregwu Ghọrọ Ụzọ Ndụ

Apụtara m n’ụwa na Melbourne na January 1, 1914, nwa nke mbụ n’ime ụmụ ise. Anyị nwere nne na nna ndị ụkpụrụ ndị dị elu na-eduzi, ha na-enye ịdọ aka ná ntị mgbe ọ dị mkpa. Anyị nwekwara ihe a pụrụ ịkpọ nzụlite okpukpe na-adịghị n’usoro, n’ihi na ndị mụrụ anyị abụghị ndị na-aga chọọchị. Otú o sina dị, ha siri ọnwụ ka anyị bụ́ ụmụ ha jee ihe ọmụmụ Sunday school nke Chọọchị England.

Mgbe m hapụrụ ụlọ akwụkwọ na 1928 wee malite ọrụ dị ka onye na-akwa ákwà, ekpebiri m iji ihe ka ọtụtụ n’ime oge m nwere ohere na-eme egwuregwu, na-ekwere na nke a pụrụ inyere m aka imeri ihere m. Esonyeere m òtù na-apịa tennis ma pịa ya n’ime afọ nile. N’oge oyi akụrụ m basketball na baseball, n’oge okpomọkụ esonyeere m òtù egwuregwu ụmụ nwanyị na-apịa cricket. Cricket ghọrọ enyi ọma m, agbalịsikwara m ike ịmụta ya nke ọma dị ka onye na-apịa bọlụ ọsọ ọsọ iji wee ruo eru maka asọmpi steti dị iche iche.

Nzube nke Dị Iche Pụọ n’Egwuregwu

N’oge m bụ nwata, ozizi nke na Chineke ịhụnanya nwere otu ebe a na-akpọ hell ebe a ga-ata ndị mere ihe ọjọọ ahụhụ ruo ebighị ebi nyere m nsogbu n’obi. Nke a adabaghị adaba n’uche m. Ya mere cheedị echiche ihe bụ ọṅụ m mgbe m mụtara n’ụzọ m na-atụghị anya site na Bible ihe “hell” pụtara n’ezie. Lee otú o si mee:

Phyllis nwanne m nwanyị, bụ́ onye m ji afọ ise tọọ, nwekwara mmasị n’egwuregwu, anyị nọkwa n’otu òtù egwuregwu ụmụ nwanyị ahụ na-apịa cricket. Na 1936 otu onye òtù anyị gosiri Phyllis otu nwa okoro aha ya bụ Jim bụ́ onye a maara dị ka onye na-ekpe okpukpe nke ọma. N’oge na-adịghị anya Jim malitere ịgwa Phyllis banyere ozizi ndị dị na Bible. A kpaliri mmasị ya. “O ziri nnọọ ezi, bụrụ ihe ezi uche dị na ya,” ka ọ na-agwa m.

N’oge ahụ mụ na Phyllis bi n’otu ọnụ ụlọ n’ebe obibi anyị, ọ gbalịkwara ịkpali mmasị m n’ihe Jim na-agwa ya banyere Alaeze Chineke. “Ọ gaje ime ihe gọọmenti mmadụ naenwebeghị ike ime,” ka o ji obi ụtọ gwa m. Otú ọ dị, arụrụ m ya ụka, na-ekwu na nke a bụ nnọọ ụdị okpukpe ọzọ iji megharịa anyị anya, na ọ dịghịkwa onye ọ bụla maara banyere ọdịnihu n’ezie. Ma Phyllis ekweghị ahapụ m aka, ọ hapụkwara akwụkwọ n’ebe dị iche iche n’ọnụ ụlọ anyị, na-enwe olileanya na m pụrụ ịgụ ya.

Achọrọ m ịmata ihe mere Phyllis ji na-anụ ọkụ n’obi otú a banyere nkwenkwe ọhụrụ nke a, ya mere otu ụbọchị ewelitere m otu akwụkwọ nta. O nwere isiokwu na-akpali akpali bụ́ Hereafter. ‘Ntị kọrọ m ọkọ’ mgbe m sapere ọtụtụ peji ya wee hụ okwu ahụ bụ “hell.” N’ihe ijuanya m, amụtara m na okwu Bible ahụ bụ́ “hell” na-ezo aka n’ezie gaa n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ na ma ndị ọma ma ndị ọjọọ na-aga n’ebe ahụ. Amụtakwara m na hell abụghị ebe ịta ahụhụ; ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, ha apụghịkwa inwe mmetụta ọ bụla.​—⁠Eklisiastis 9:​5, 10; Abụ Ọma 146:​3, 4.

Nke a dabara adaba n’uche m, karịsịa mgbe akwụkwọ nta ahụ kọwara na Chineke nke na-ahụ n’anya ma dị ike ekwewo nkwa iweghachi ndị nwụrụ anwụ site n’otu ọrụ ebube a kpọrọ mbilite n’ọnwụ. (Jọn 5:​28, 29) Ugbu a achọkwara m ịchọpụta ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ Jim nọworo na-agwa Phyllis. Achọtara m ntakịrị King James Version nke nna m nyeworo m mgbe m bụ nwatakịrị ma sapeta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e depụtara n’akwụkwọ nta ahụ. Nke a nwapụtara eziokwu nke ihe e kwuru banyere hell na ọnọdụ nke ndị nwụrụ anwụ.

Ihe ijuanya ọzọ na-akpali akpali nye m bụ ịmụta na Chineke nwere aha onwe onye, bụ́ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) Apụkwara m ịhụ na Chineke nwere nzube maka ihe ọ bụla o mere ma ọ bụ kwee ka o mee. Nke a mere ka m jụọ onwe m, sị, ‘Gịnị n’ezie bụ nzube m ná ndụ?’ Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, amalitere m ịjụ onwe m ma ọ̀ bụ ihe kasị baara m uru iwere egwuregwu dị ka oké ihe​—⁠na-afọdụ nke nta ka m chefuo ihe ọ bụla ọzọ.

Itinye Mkpebi n’Ọrụ

Jim na Phyllis amaghị ma ọlị na ọdịdị m ná ndụ agbanwewo, ma ha chọpụtara mgbe a kpọrọ ezinụlọ anyị òkù ịbịa oriri nke otu enyi. N’ụbọchị ndị ahụ, n’ememe ndị dị otú ahụ ndị nile bịaranụ ga-eguzo ọtọ, a ga-agọkwara Eze ndị England ọfọ, mmadụ nile ga-ewelikwa iko ha elu iji ṅụọ mmanya maka ọfọ ahụ. Otú ọ dị, ekpebiri m isoro Jim na Phyllis nọdụ ala n’ebilighị ọtọ. Ha ekweghị n’ihe anya ha hụrụ mgbe ha hụrụ m ka m ka nọdụrụ ala! Otú ọ dị, anyị ebughị mkparị ọ bụla n’uche, ma dị ka ndị Kraịst anyị chere na anyị kwesịrị ịnọpụ iche ma ghara ikere òkè n’ememe ịhụ mba n’anya ndị dị otú ahụ.​—⁠Jọn 17:16.

Otú o sina dị, nne na nna m na ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ anyị were iwe. Ha sịrị na anyị eguzosighị ike n’ihe, ma ọ bụ na isi adịghị anyị mma​—⁠ma ọ bụ ha abụọ! Mgbe ahụ, mgbe mụ na Phyllis jere nnọkọ inye onyinye maka òtù egwuregwu ụmụ nwanyị ahụ na-apịa cricket, otu ihe yiri nke ahụ mere n’oge otu ememe ịhụ mba n’anya. Ihe si na ya pụta bụ na anyị abụọ hapụrụ òtù ahụ. Nke a esighị ike otú m chere na ọ ga-adị, n’ihi na abịawo m ghọta na nrubeisi na nguzosi ike n’ihe m bụ nye Kraịst Jisọs, Eze nke Alaeze eluigwe Chineke.

Ugbu a Phyllis kọwara na ọ dị mkpa mụ ije nzukọ nile nke Ndịàmà Jehova mgbe nile iji wulite okwukwe m site n’inwekwu ihe ọmụma Bible. N’oge ahụ e nwere nanị otu ọgbakọ na Melbourne, ya mere amalitere m ije nzukọ n’ebe ahụ n’ehihie Sunday ọ bụla. N’oge na-adịghị anya o doro m anya na nke a bụ ezi nzukọ elu ala nke Chineke.

N’oge na-adịghị anya a kpọrọ m òkù iso kere òkè n’ọrụ nkwusa ụlọ n’ụlọ nke ọgbakọ. Ná mmalite alara m azụ, ma n’otu ụtụtụ Sunday ekpebiri m iso gaa nanị iji hụ otú e si eme ya. Obi tọrọ m ụtọ mgbe e kenyere m iso otu Onyeàmà nwere ahụmahụ bụ́ onye ji obi ike kwuo okwu n’ọnụ ụzọ mbụ ma nweta onye nwe ụlọ gere ya ntị nke ọma. Echere m n’ime onwe m sị, ‘Leenụ, nke ahụ esighị oké ike, ma ọ dị mkpa ka m nwee ọtụtụ mmụgharị tupu m nwee ike imeta ya otú ahụ.’ Ya mere cheedị echiche ihe ijuanya m nwere mgbe, ka anyị pụtasịrị n’ọnụ ụzọ mbụ ahụ, Onyeàmà ahụ asị m, “Ị ga-enwe ike ịrụ nanị gị ugbu a.”

“Nanị m?” ka m jụrụ, ná mgbagwoju anya! “I ji ya n’egwuregwu! Gịnị ka m ga-ekwu ma ọ bụrụ na mmadụ ajụọ ajụjụ ma amaghị m azịza ya?” Ma onye mụ na ya so siri ọnwụ. Ya mere, site n’ahụ ọma jijiji, nanị m rụwara, ebe ọ nọgidere na-agbara ndị mmadụ àmà n’akụkụ nke ọzọ nke okporo ámá. N’otu ụzọ alanarịrị m ụtụtụ mbụ ahụ.

Site n’oge ahụ gaa n’ihu amalitere m ikere òkè n’ọrụ ime nkwusa n’ụtụtụ Sunday ọ bụla. Mgbe onye m zutere n’ọnụ ụzọ jụrụ m ajụjụ nke m na-apụghị ịza, ana m asị, “M ga-eme nnyocha ma bịaghachi ịhụ gị.” N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Jehova nọgidere na-enye m ume na obi ike ịga n’ihu n’ụzọ ndụ ọhụrụ m nwere nzube. M mere nraranye nke ndụ m nye ya, n’October 1939 kwa, e mere m baptism n’ebe ịsa ahụ obodo nke dị na Melbourne. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị Phyllis, bụ́ onye lụworo Jim n’oge ahụ, jụrụ ihe mere na mụ amaliteghị ọrụ ọsụ ụzọ.

Ije Ozi n’Alaka Ụlọ Ọrụ

Na January 1941, n’oge na-adịghị anya mgbe m malitesịrị ịrụ ọrụ na Betel, dị ka anyị na-akpọ alaka ụlọ ọrụ, a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu n’Australia. E mesịa ndị agha weghaara Ebe Obibi Betel anyị dị na Strathfield, ezigakwara m n’ugbo Society dị na Ingleburn, ihe dị ka 48 kilomita ná mpụga obodo ahụ. Na June 1943 ụlọ ikpe dị iche iche kachapụrụ okwu ikpe megide Watch Tower Society ma wepụ mmachibido ahụ. Ka ọ na-erule ngwụsị afọ ahụ, a kpọghachiri 25 n’ime anyị na Betel nke Strathfield. N’ebe ahụ anọgidere m na-arụ ọrụ n’ebe ịsa ákwà, tinyere ikere òkè n’ọrụ ndị ọzọ a na-arụ na gburugburu ebe obibi ahụ.

Iri afọ sonụ yiri ka ọ gwụrụ ngwa ngwa. Mgbe ahụ na 1956, alụrụ m onye Betel ibe m, bụ́ Ted Wieland. Ted bụ nwoke dị nnọọ jụụ, nwee ndidi, obi tọkwara anyị ụtọ mgbe anyị natara nkwado ịnọgide na-ebi na Betel dị ka di na nwunye. Anyị abụọ ji ụzọ ndụ anyị nke nwere nzube kpọrọ ihe, nwee obi ụtọ maka ihe ùgwù nke ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Australia. N’ezie, tụkwasị n’ọrụ Betel anyị, anyị nwere ọṅụ nke ịrụkọ ọrụ ọnụ inyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Dị ka otu ihe atụ, ị pụrụ ịgụ banyere ezinụlọ Weekes ná mbipụta Teta! (Bekee) nke October 22, 1993.

Uto na-aga nwayọọ nwayọọ nke ọrụ nkwusa Alaeze chọrọ ntụkwasị nke nanị mmadụ 10 ma ọ bụ 12 ná ndị ọrụ anyị n’afọ 30 ndị mbụ m nọrọ na Betel. Ma ọnọdụ ahụ gbanwere n’afọ ndị 1970 mgbe anyị malitere ibipụta magazin Ụlọ Nche na Teta! n’ebe a. Owuwu ihe malitere na January 1972 n’ebe obibi akwụkwọ ọhụrụ. N’oge na-adịghị anya otu ígwè obibi akwụkwọ dị 40 tọn si Japan bịarute, ka ọ na-erukwa 1973 anyị na-ebi ihe ruru 700,000 magazin kwa ọnwa. Ezinụlọ Betel anyị ugbu a amalitewo ịmụba n’ezie.

Afọ ndị 1970 wetakwaara m iru újú onwe onye. Nke mbụ, di m m hụrụ n’anya, bụ́ Ted, nwụrụ na 1975 n’afọ ndụ nke 80. Mgbe ahụ, n’ihe na-erughị otu afọ mgbe nke ahụ gasịrị, nna m meworo agadi dakwara n’ụra ọnwụ. Enwetara m nkasi obi dị ukwuu n’ebe Jehova na Okwu ya, bụ́ Bible, dị, nakwa n’ebe ụmụnna m nwoke na nwanyị ime mmụọ nọ. O nyekwara aka nke ukwuu na m ji ọrụ n’aka na Betel n’ọrụ m nke nwere nzube n’oge a nke dị oké mwute ná ndụ m.

Otú o sina dị, ndụ m nọgidere na-aga n’ihu, amalitekwara m ọzọ inweta afọ ojuju na ngọzi, ugbu a dị ka nwanyị di ya nwụrụ. Na 1978, ejere m mgbakọ na London, England, mesịakwa leta isi ụlọ ọrụ ụwa nke Watch Tower Society dị na Brooklyn, New York. Ịhụ ọtụtụ narị ụmụnna m ndị nwoke na nwanyị ka ha ji obi ụtọ na-arụ ọrụ n’ebe ahụ na Betel dị na Brooklyn anọwo na-abụ ihe mkpali nye m ruo taa.

Ka afọ ndị 1970 na-agwụsị, anyị matara na a na-eme atụmatụ mwusawanye ọzọ maka ogige Betel nke Australia. Otú ọ dị, mwusawanye ahụ agajeghị iwere ọnọdụ na Strathfield, bụ́ ebe ala fọdụrụ afọdụ dị ntakịrị. Kama nke ahụ, a gaje iwu ogige ọhụrụ, nke buru ibu karị n’ala anyị dị na Ingleburn, bụ́ ebe m rụworo ọrụ n’oge mmachibido ahụ ná mmalite afọ ndị 1940.

Ụzọ Ndụ nke Nzube Na-adịgide Adịgide

Lee obi ụtọ e nwere na January 1982 mgbe anyị kwafere n’ihe owuwu ọhụrụ anyị! N’eziokwu, ná mmalite e nwere obere mwute n’ihi ịhapụ gburugburu ebe ahụ anyị maara, ma n’oge na-adịghị anya anyị nwere ọṅụ n’ihi ebe obibi ọhụrụ anyị nke nwere 73 ọnụ ụlọ ịrahụ ụra ndị mara mma. Ugbu a kama ilepụ anya na-ahụ mgbidi blọkụ na okporo ámá ndị dị ná nnukwu obodo, anyị na-ahụ ubi ahịhịa ndụ, úkwù osisi, ehi ndị na-ata ahịhịa, na ọwụwa na ọdịda anyanwụ ndị mara mma​—⁠ihe ndị mara nnọọ mma ikiri.

Na March 19, 1983, anyị nwere nraranye na-enye obi ụtọ nke ogige ọhụrụ ahụ n’ime anwụ otiti dị mma nke oge mgbụsị akwụkwọ. Lloyd Barry so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova kwuru okwu nraranye na-akpali akpali. Mụ onwe m nwere ekele ịhụ ya na nwunye ya ka ha nọ ya maka ihe omume nraranye ahụ, ebe ọ bụ na m esorowo ha rụkọọ ọrụ na Betel nke Strathfield mgbe anyị nile ka bụ ndị ntorobịa.

Uto nọgidere na-aga n’ihu nke ọrụ nkwusa Alaeze mere ka ọ dị mkpa iwusawanye ihe owuwu anyị n’ebe a na Ingleburn. Na 1987 e mere ka ọfịs saa mbara. Mgbe ahụ, na November 25, 1989, a raara otu ụlọ obibi ọhụrụ dị okpukpu ise n’elu na otu ụlọ obibi akwụkwọ mgbakwụnye dị okpukpu atọ n’elu nye. Lee ka anyị siworo mụbaa​—⁠site ná ndị ozi ole na ole na-erughị 4,000 n’Australia mgbe m malitere ozi m gaa n’ihe dị ka 59,000!

N’oge na-adịchabeghị anya, e mewo alaka ụlọ ọrụ Australia otu n’ime Ụlọ Ọrụ Owuwu Ihe Ógbè atọ nke Society, tinyere Japan na Germany. Nke a emewo ka ọ dị mkpa inwekwu mwusawanye nke ogige Betel. Ugbu a a rụchawo ọfịs ọzọ dị okpukpu atọ n’elu, ọrụ na-agwụchakwa n’ụlọ obibi dị okpukpu ise n’elu, nke ga-enwe 80 ọnụ ụlọ ndị ọzọ ga-abata ezinụlọ anyị na-amụba mgbe nile.

N’ebe ịsa ákwà, anyị nwere ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ buru ibu iji na-arụpụta ọrụ anyị nwere, ma ọtụtụ mgbe ana m echeta ụbọchị August ahụ na 1940 mgbe a kpọrọ m òkù inye aka ná ngalaba a ruo izu abụọ. Enwere m nnọọ obi ekele na izu abụọ ndị ahụ agbatịwo ruo ihe karịrị 50 afọ, na Jehova Chineke duzikwara nzọụkwụ m nile ịga n’ụzọ ndụ dị otú ahụ nke nwere nzube.

[Foto dị na peeji nke 21]

Mgbe m dị 25 afọ

[Foto dị na peeji nke 23]

Ụbọchị agbamakwụkwọ anyị na 1956

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Na 1938 mụ na nwanne m nwanyị mikpuru onwe anyị n’egwuregwu, ma ugbu a ndụ m na-arụpụta ihe dị ukwuu karị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya