Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 1/1 p. 20-23
  • Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa Ikerịta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa Ikerịta
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Nlereanya Na-akpali Akpali nke Nne M
  • Iji Oge Nile Kerịta Akụ̀ Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa
  • Imezu Otu Ihe Mgbaru Ọsọ
  • Malta na Libya
  • Ọrụ Ọhụrụ
  • Ógbè Ndị Ekpenta
  • Ịbụ Onye Akụ̀ ahụ Dị Oké Ọnụ Ahịa Kwagidere
  • Jehova Kụziiri M Ime Uche Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ile Ndị Ọbịa Anya Nke Ọma Ewetara Malta Ngọzi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ịtụkwasị Anya na Obi n’Ihe Nrite Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ekpebisiri M Ike Ịnọgide Na-ejere Onye Okike M Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 1/1 p. 20-23

Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa Ikerịta

DỊ KA GLORIA MALASPINA SI KỌỌ YA

Mgbe ikpere mmiri Sicily ahụ pụrụ n’anya, mụ na di m malitere ịtụkwasị uche anyị n’ebe anyị na-aga, agwaetiti Mediterranean nke Malta. Lee atụmanya na-akpali akpali ọ bụ! Ka ụgbọ mmiri ahụ na-agafe oké osimiri ahụ, anyị chere echiche banyere ahụmahụ Pọl onyeozi na Malta na narị afọ mbụ.—ỌRỤ 28:1-10.

AFỌ ahụ bụ 1953, Malta anabataghị ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. N’afọ bu ụzọ, anyị agụsịwo akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead, e wee kenye anyị ọrụ n’Itali. Mgbe mkpirikpi oge nke ịmụ asụsụ Italian gasịrị, ọ gụrụ anyị agụụ ịhụ ihe nọ na-echere anyị na Malta.

Olee otú mụ, bụ́ nwa agbọghọ, si ghọọ onye ozi ala ọzọ? Ka m kọwaa.

Ihe Nlereanya Na-akpali Akpali nke Nne M

Na 1926, mgbe ezinụlọ anyị bi na Fort Frances, Ontario, Canada, nne m naara akwụkwọ nta ahụ bụ́ Millions Now Living Will Never Die site n’aka Onye Mmụta Bible (dị ka a matara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ). O ji oké mmasị gụọ ya, n’otu izu ahụkwa ọ gara otu ìgwè ọmụmụ Bible, bụ́ ndị ji magazin Ụlọ Nche na-eme ihe. Nne m bụ onye na-agụsi Bible ike, ọ nakwekwaara ozi banyere Alaeze Chineke dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa ọ na-achọ eri oge. (Matiu 6:33; 13:44) N’agbanyeghị mmegide siri oké ike site n’aka papa m, ọ bụkwa ezie na o nwere obere ụmụ agbọghọ atọ ilekọta, o weere nguzo ya n’ihe ọ na-amụta.

Okwukwe mama m na-adịghị ada ada n’ime 20 afọ ndị sochiri mere ka mụ na ụmụnne m ndị inyom abụọ tọrọ m, bụ́ Thelma na Viola, mata banyere olileanya ahụ dị ebube nke ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume. (2 Pita 3:13) O chere ọtụtụ ule ndị siri ike ihu, ma ọ dịghị mgbe anyị nwere obi abụọ banyere ụzọ ọ họọrọ.

Na 1931, mgbe m dị nanị afọ iri, anyị kwagara n’otu ugbo n’ebe ugwu nke Minnesota, U.S.A. N’ebe ahụ e kewapụrụ anyị n’isoro Ndịàmà Jehova na-akpachi anya ma ọ bụghị pụọ n’ebe ntụziaka Bible nke sitere n’aka mama m dị. Ozi o ji ikwesị ntụkwasị obi na-eje dị ka colporteur, ma ọ bụ onye ozi oge nile, kpaliri m ịchọ isonyere ya n’ọrụ ahụ. Na 1938 mụ na ụmụnne m ndị inyom abụọ gosipụtara nraranye anyị nye Jehova site n’ịbụ ndị e mere baptism n’otu mgbakọ na Duluth, Minnesota.

Mgbe m gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu na 1938, mama m gbara m ume ịgụ mmụta azụmahịa ka m wee nwee ike ịkwado onwe m dị ka onye ọsụ ụzọ (aha ọhụrụ maka colporteur). Nke a mesịrị bụrụ ndụmọdụ dị mma, karịsịa ebe ọ bụ na nna m kpebiri ịgawara onwe ya ma hapụ anyị na nke anyị.

Iji Oge Nile Kerịta Akụ̀ Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa

N’ikpeazụ akwagara m California, amalitekwara m ọrụ oge nile na San Francisco na 1947. Mgbe m na-arụ ọrụ nkwadebe mgbakọ maka Mgbakọ “Mmụba Mba Nile” na Los Angeles, ezutere m Francis Malaspina. Ihe mgbaru ọsọ anyị nwekọrọ ọnụ nke ozi ala ọzọ dujere ná mmalite nke mmekọrịta ịhụnanya. Anyị lụrụ di na nwunye na 1949.

Na September 1951, a kpọrọ mụ na Francis òkù ije klasị nke 18 nke Gilead. N’ụbọchị ngụsị akwụkwọ, February 10, 1952, mgbe ọnwa ise nke ọzụzụ siri ike gasịrị, onye isi nke ụlọ akwụkwọ ahụ bụ́ Nathan H. Knorr kpọpụtara mba ndị a na-eziga anyị dị ka usoro aha ha si dị. Mgbe ọ sịrị, “Itali, Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Malaspina,” anyị amaliteworị njem n’obi anyị!

Mgbe izu ole na ole gasịrị, anyị banyere n’ụgbọ mmiri ahụ na New York maka njem ụbọchị iri n’oké osimiri ije Genoa, Itali. Giovanni DeCecca na Max Larson, ndị bụ́ ndị ọrụ n’isi ụlọ ọrụ Brooklyn nọ n’ebe a na-abanye ụgbọ mmiri ịsị anyị ka e mesịa. Na Genoa ndị ozi ala ọzọ ndị ihe isi ike dị iche iche metụtara ịbanye ná mba ahụ doro anya zutere anyị.

N’ịbụ ndị ihe nile dị anyị gburugburu kpaliri, anyị banyere ụgbọ okporo ígwè na-aga Bologna. Echiche anyị nwere mgbe anyị rutere bụ nke obodo nke bọmbụ ndị a tụrụ n’Agha Ụwa nke Abụọ ka mebisịrị ịma mma ya. Ma e nwekwara ọtụtụ ihe ndị mara mma, dị ka ísìsì na-adọrọ adọrọ nke kọfị a na-arụ n’ọkụ nke jupụtara ikuku ụtụtụ ahụ na ísìsì dị ụtọ nke ụdị ofe dị iche iche a na-akwadebe maka ụdị dị iche iche nke nri ọka.

Imezu Otu Ihe Mgbaru Ọsọ

Anyị ji okwu ndị e bu n’isi malite ọrụ nkwusa ahụ, anyị na-ekwusakwa ya ruo mgbe a jụrụ ozi ahụ ma ọ bụ mgbe e mechiri ụzọ. Ọchịchọ nke ikwupụta ihe anyị bu n’obi kwaliri anyị ịmụsi asụsụ ahụ ike. Mgbe ọnwa anọ gasịrị, e kenyere anyị ibi n’ebe obibi ọhụrụ nke ndị ozi ala ọzọ na Naples.

A matara nnukwu obodo ukwu nke a maka ịma mma ile anya ya. Anyị nwere obi ụtọ n’ozi anyị n’ebe ahụ, ma mgbe ọnwa anọ ndị ọzọ gasịrị, e kenyere di m ọrụ sekit, ma ọ bụ ọrụ njegharị, ileta ọgbakọ dị iche iche malite na Rom ruo Sicily. Ka oge na-aga, anyị letakwara Malta na ọbụna Libya n’Ebe Ugwu Africa.

Iji ụgbọ okporo ígwè site na Naples gaa Sicily n’ime afọ ndị ahụ bụ ile ntachi obi anụ ahụ ule. Anyị na-abanye n’ụgbọ okporo ígwè jupụtara ná ndị njem ma kwụrụ ọtọ n’agbata oche ndị mmadụ nọjuru, mgbe ụfọdụ maka hour isii ruo asatọ. Otú ọ dị, o nyere anyị ohere mara mma ịmata ndị ahụ nọ anyị gburugburu nke ọma. Ọtụtụ mgbe otu nnukwute ùdù mmanya e mere n’obodo ahụ na-eje ozi dị ka oche maka onye nwe ya, bụ́ onye na-aṅụ ihe dị ya n’ime iji gboo mkpa ya maka ihe ọṅụṅụ n’oge ogologo njem ahụ. Ọtụtụ mgbe ndị nọ n’ụgbọ ahụ nwere omume enyi na-arịọ ka anyị soro ha kerịta achịcha na anụ e gwere egwe ha, bụ́ omume imesapụ aka, nke obi ikpo ọkụ anyị nwere obi ekele maka ya.

Na Sicily ndị enyi na-ezute anyị wee bugoo akpati anyị n’elu ugwu ahụ ná nrịgo na-ewe hour atọ na ọkara nke e ji nwayọọ nwayọọ eme ịgaru n’ọgbakọ ahụ dị n’elu ugwu. Nnabata na-ekpo ọkụ nke ụmụnna anyị ndị Kraịst mere ka anyị chefuo ike ọgwụgwụ anyị. Mgbe ụfọdụ anyị na-agba ịnyịnya ibu ndị na-adịghị ada ngwa ngwa, ma ọ dịbeghị mgbe anyị lere anya ná ndagwurugwu dị n’okpuru bụ́ ebe otu nzọhie ụkwụ nke ịnyịnya ibu ahụ gaara eduje anyị. Nguzo siri ike nke ụmụnna anyị nwere maka eziokwu Bible n’agbanyeghị ihe isi ike ha gbara anyị ume, ịhụnanya e gosiri anyị mere ka anyị nwee ekele ịnọnyere ha.

Malta na Libya

N’ịbụ ndị jupụtara ná ncheta nke ụmụnna anyị na Sicily, anyị ji ụgbọ mmiri jee Malta. Pọl onyeozi ahụworị ndị mmadụ nwere obi ọma n’ebe ahụ, otú a ka anyị hụkwara. Oké ifufe na St. Paul’s Bay mere ka anyị ghọta ihe ize ndụ chere obere ụgbọ mmiri ihu na narị afọ mbụ ahụ. (Ọrụ 27:39–28:10) Ma Libya ka na-eche anyị n’ihu. Gịnị ga-abụ ọnọdụ anyị n’ala Africa nke a ebe a machibidoro ọrụ anyị iwu?

Ọzọkwa anyị hụrụ ọdịbendị dị iche kpam kpam. Ihe ndị anya na-ahụ na ụ́dà ndị a na-anụ n’obodo ahụ bụ́ Tripoli dọọrọ mmasị m ka anyị na-agafe n’okporo ámá ndị ahụ e ji mgbidi wuo n’ebe ndịda ndịda nke obodo ahụ. Ndị ikom ji uwe e ji ájị́ ịnyịnya ibu kpaa echebe onwe ha pụọ n’okpomọkụ na-ere ọkụ nke Ọzara Sahara n’oge ehihie na pụọ n’ịjụ oyi nke abalị. Anyị mụtara ịghọta na ịsọpụrụ ụzọ ndị mmadụ si eme mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ ihu igwe ndị dị n’ebe ha bi.

Ịnụ ọkụ n’obi e ji nlezianya eme nke ụmụnna ndị ahụ kụziiri anyị ọtụtụ ihe banyere ịdabere na Jehova n’ụzọ dị ukwuu na ịgbaso ntụziaka nke ndị ahụ nwere ihe ọmụma ka ukwuu banyere ime nkwusa n’okpuru ọnọdụ ndị dị otú ahụ. Ụmụnna anyị ndị Kraịst sitere ná mba dị iche iche; n’agbanyeghị nke ahụ ha ji ịdị n’otu rụkọọ ọrụ ọnụ n’ozi ha na-ejere Jehova.

Ọrụ Ọhụrụ

N’ihi mmegide a na-emegide ọrụ nkwusa anyị, ọ dị mkpa ka anyị hapụ Itali, ma anyị ji obi ụtọ nara ọrụ nkwusa ọhụrụ na Brazil na 1957. Mụ na Francis mere mgbanwe iji kwekọọ ná ndụ na omenala ndị ahụ, mgbe ọnwa asatọ gasịkwara, a kpọrọ Francis ịrụ ọrụ sekit. Anyị ji bọs, ụgbọ elu, na ụkwụ mee njem. Obodo nke a buru ibu, nke makwara mma meghere n’ihu anyị dị ka otu ihe mmụta n’ihe ọmụmụ ọdịdị ala.

Ọrụ sekit mbụ anyị gụnyere ọgbakọ iri n’obodo ukwu ahụ bụ São Paulo, tinyekwara obere obodo iri n’ime ime obodo na n’akụkụ ebe ikpere mmiri dị n’ebe ndịda nke steti São Paulo. E nweghị ọgbakọ ọ bụla n’obodo ndị ahụ n’oge ahụ. Anyị na-achọta ebe anyị ga-anọ, mgbe anyị zuruchaara ike, anyị na-eji ozi Alaeze ahụ aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Anyị na-ahapụkwa mpempe akwụkwọ ịkpọ òkù maka ngosi nke otu n’ime ihe nkiri nke Watch Tower Society ji akụziri ndị mmadụ ihe.

Ibu ngwá ọrụ sinima, ígwè projector, ígwè transformer, na faịlụ dị iche iche, akwụkwọ, akwụkwọ ịkpọ òkù, na ngwá ọrụ e ji edekwasị ebe a ga-anọ egosi sinima ahụ n’akwụkwọ ịkpọ òkù ndị ahụ abanye n’ime bọs abụghị ọrụ dị mfe. N’iji ihe tụnyere ibe ya, obere akpati ákwà anyị abụghị ihe buru ibu. Aghaghị ịdọkwasị ígwè projector ahụ n’apata ụkwụ anyị ka ọ ghara ịwụghari ma gbarisie n’ihi ime njem n’ụzọ ndị ahụ na-adịghị larịị.

Mgbe anyị chọtasịrị ebe a ga-egosi sinima ahụ, anyị na-eje site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ ma hapụ akwụkwọ ịkpọ òkù maka ngosi sinima ahụ. Mgbe ụfọdụ anyị na-enweta ikike igosi sinima ahụ n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ ma ọ bụ na họtel. N’oge ndị ọzọ anyị na-agbasapụ ibé ákwà n’agbata polu abụọ n’ebe sara mbara. Ndị ahụ ji obi ekele na-ekiri ya, ndị ọtụtụ n’ime ha na-ahụtụbeghị sinima na mbụ, ga-eguzo ọtọ ma gee ntị nke ọma ka Francis na-agụ okwu nkọwa ya. N’ikpeazụ, anyị na-ekesa akwụkwọ Bible dị iche iche.

Iji ruo n’ime obodo, anyị na-eji bọs mee njem. A rụghị àkwà mmiri n’ụfọdụ n’ime osimiri ndị ahụ, ya mere a ga-ebukwasị bọs ahụ n’elu nnukwu ùkwù ógwè osisi ndị e kekọtara ọnụ ma buga ya n’akụkụ nke ọzọ n’elu mmiri. A na-agwa anyị ka anyị si na bọs ahụ rịtuo, ọ bụrụkwa na anyị ahụ na bọs ahụ na-adanye n’ime mmiri, ka anyị wụfee akụkụ ọzọ nke ùkwù ógwè osisi ndị ahụ e kekọtara ọnụ iji zere ịdanye n’ime mmiri. Dị ka ihe na-enye obi ụtọ, ọ dịghị mgbe bọs funahụrụ anyị n’ime mmiri—bụ́ nke dị nnọọ mma, karịsịa ebe ọ bụ na a ma mmiri ahụ ama maka inwe azụ piranha ndị na-eri anụ!

Mgbe anyị jesịrị mgbakọ mba nile ahụ na New York na 1958, anyị lọghachiri na Brazil, bụ́ ebe anyị laghachiri n’ọrụ njegharị n’oge na-adịghị anya. Distrikti anyị kpọgara anyị n’ókèala Uruguay n’ebe ndịda, Paraguay n’ebe ọdịda anyanwụ, steti nke Pernambuco n’ebe ugwu, na Oké Osimiri Atlantic n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke Brazil.

Ógbè Ndị Ekpenta

N’etiti afọ ndị 1960, anyị naara ịkpọ òkù igosi otu n’ime sinima Society n’otu ógbè ndị ekpenta. Aghaghị m ikweta na egwu tụrụ m nke nta. Anyị enweghị ihe ọmụma ọ bụla banyere ekpenta, e wezụga ihe anyị gụrụ banyere ya na Bible. Ngwa ngwa anyị banyesịrị n’ogige ebe obibi ahụ, bụ́ nke e tere agba ọcha, a sịrị ka anyị banye n’ime otu ebe nzukọ ọha na eze. E ji eriri kewapụ otu ebe n’etiti maka anyị na ngwá ọrụ anyị.

Onye ọrụ ọkụ eletrik na-enyere anyị aka bụ onye gbara 40 afọ nke bi n’ógbè ahụ. Malite ná nkwonkwo aka, aka ya abụọ efunahụwo ya tinyere ụfọdụ akụkụ ahụ ya ndị ọzọ, na-eme ka o nwee ọdịdị dị njọ nke ukwuu n’ile ya anya. Akụjara m na mbụ, ma omume ihu ọchị na nkà ya n’iji aka ya arụ ọrụ mere ka ahụ ruo m ala. N’oge na-adịghị anya anyị malitere ikwurịta banyere ọtụtụ ihe ka anyị na-emezu nkwadebe ndị dị mkpa. N’ime otu puku ndị ọrịa bi n’ihe owuwu ahụ, ihe karịrị narị abụọ bịara. Ka ha na-arọ ụkwụ na-abata, anyị hụrụ ogo dị iche iche nke ọrịa ahụ na-arịa ha. Lee ahụmahụ mmetụta uche na-akpali akpali ọ bụ nye anyị!

Anyị chere echiche banyere ihe Jisọs gwara onye ekpenta ahụ rịọrọ ya, sị, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na Ị na-achọ, Ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” N’imetụ nwoke ahụ aka, Jisọs mesiri ya obi ike, sị, “Ana m achọ; ka e mee ka ị dị ọcha.” (Matiu 8:2, 3) Mgbe ihe omume ahụ gasịrị, ọtụtụ mmadụ bịakwutere anyị ikele anyị maka ịbịa, anụ ahụ ha mebiri emebi bụkwa akaebe doro anya nke oké ahụhụ ihe a kpọrọ mmadụ na-ata. N’ikpeazụ, Ndịàmà bi n’ebe ahụ sooro ndị nwere mmasị ịmụtakwu ihe mụọ Bible.

Na 1967 anyị laghachiri na United States ilekọta nsogbu ahụ ike ụfọdụ siri ike. Ka anyị nọ na-alụso ndị a ọgụ, anyị nwekwara ihe ùgwù nke ije ozi n’ọrụ sekit ọzọ. N’ime 20 afọ ndị na-esochi, m sooro Francis rụọ ọrụ njegharị na United States. N’ime oge a ọ kụzikwara ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze.

Lee isi iyi agbamume ọ bụ nye m inwe di na-ahụ n’anya na enyi na-ekwesị ntụkwasị obi onye rụrụ ọrụ ọ bụla e nyere ya! Anyị nwere ihe ùgwù nke ijikọ aka kerịta akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke eziokwu Bible n’akụkụ ụfọdụ nke kọntinent anọ.

Ịbụ Onye Akụ̀ ahụ Dị Oké Ọnụ Ahịa Kwagidere

Laa azụ na 1950, nne m lụrụ David Easter, bụ́ nwanna nwoke kwesịrị ntụkwasị obi e mere baptism na 1924. Ha rụkọrọ ọrụ n’ozi oge nile ruo ọtụtụ afọ. Otú ọ dị, n’ime akụkụ ikpeazụ nke ndụ nne m, ọrịa Alzheimer malitere igosipụta onwe ya. Nlekọta dị ukwuu dị ya mkpa ka ọrịa ahụ weghaara ikike iche echiche ya. Ụmụnne m ndị inyom na-enye nkwado na David buuru ibu ọrụ ahụ dị arọ nke ilekọta ya, ebe ọ bụ na ha achọghị ka anyị hapụ ihe ùgwù pụrụ iche anyị nke ozi oge nile. Ihe nlereanya ikwesị ntụkwasị obi nke nne m ruo n’ọnwụ ya na 1987 mere ihe dị ukwuu inyere anyị aka ịtụzi ụzọ anyị ná ndụ, olileanya ahụ ọ gụrụ n’ihe dị oké ọnụ nke nkwụghachi ụgwọ n’eluigwe kasikwara anyị obi.

Ka ọ na-erule 1989, amatara m na Francis agbasikwaghị ike dị ka ọ dịbu. Anyị amataghị na ahụ ọkụ na-amị ọbara, bụ́ ọrịa a matara nke ọma n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, anọwo na-enwe mmetụta ọjọọ ya. Na 1990, onye iro nke a na-adịghị ada mbà meriri ya, onye òtù m hụrụ n’anya bụ́ onye m soroworo kerịta ihe karịrị 40 afọ n’ozi Jehova funahụrụ m.

Ndozigharị ihe dị iche iche bụ otu akụkụ nke ndụ. Ụfọdụ dị mfe, ụfọdụ sikwara ike. Ma Jehova, Onye Na-enye akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke eziokwu Bible, nyere m nkwado site ná nzukọ ya na ịhụnanya na agbamume nke ezinụlọ m. M ka na-achọta afọ ojuju ka m na-elepụ anya ná mmezu nke nkwa Jehova nile na-adịghị ada ada.

[Foto dị na peeji nke 23]

Mgbe mụ na di m bụ ndị ozi ala ọzọ n’Itali

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya