Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 8/1 p. 21-25
  • Ịtụkwasị Anya na Obi n’Ihe Nrite Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịtụkwasị Anya na Obi n’Ihe Nrite Ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ozi Oge Nile
  • Ịga Ebe E Kenyere Anyị Ọrụ
  • Ọrụ Ndị Ọhụrụ
  • Ịlaghachi States
  • Ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead Ọzọkwa
  • Ndị E Kenyere Ọrụ Gaa Argentina
  • Ịlaghachikwa Ọzọ na States
  • Ibu Ụzọ Achọ Alaeze Ahụ—Ndụ E Ji n’Aka na nke Na-enye Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ịchụso Ihe Mgbaru Ọsọ nke M Setịpụrụ Mgbe M Dị Afọ Isii
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ekpebisiri M Ike Ịnọgide Na-ejere Onye Okike M Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ihe Nketa Ndị Kraịst nke Dị Ụkọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 8/1 p. 21-25

Ịtụkwasị Anya na Obi n’Ihe Nrite Ahụ

Dị Ka Edith Michael Si kọọ

Ná mmalite afọ ndị 1930, anyị nọ na-ebi ná mpụga nke St. Louis, Missouri, U.S.A., mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ anyị. Ụdọ e ji ekokwasị ákwà gbabiri kpọmkwem mgbe ahụ, mee ka uwe ọcha ndị na-egbukepụ egbukepụ nke mama m daba n’apịtị. Ọ nakweere akwụkwọ ndị e nyere ya, nanị ka nwanyị ahụ wee lawa, ọ tụkwasịkwara ha n’elu ebe a na-etinye ihe, chezọọ ha.

OGE ndị ahụ bụ afọ ndị e nwere ndakpọ akụ̀ na ụba, a chụkwara papa m n’ọrụ. Otu ụbọchị ọ jụrụ ma ọ dị ihe ọ bụla dị n’ụlọ ya ga-agụ. Mama m gwara ya banyere akwụkwọ ndị ahụ. Ọ malitere ịgụ ha, mgbe ntakịrị oge gakwara o tiri mkpu, sị: “Nne, nke a bụ eziokwu!”

“Oo, ọ bụ nanị okpukpe chọrọ ego dịkwa ka ndị ọzọ nile,” ka ọ zaghachiri. Otú ọ dị, papa m gbara ya ume ka ọ nọdụ ala ma soro ya na-achọta akụkụ akwụkwọ nsọ. Mgbe o mere nke ahụ, ya onwe kwa kwetara. Ka e mesịrị ha malitere ịchọgharị Ndịàmà, ha chọpụtakwara na ha na-ezukọta n’otu ụlọ nzukọ a gbazitere agbazite nke dị nso n’ebe etiti St. Louis, bụ́ ụlọ nzukọ e jikwa eme ihe maka ite egwú na ihe omume ndị ọzọ.

Papa m na mama m kpọ m gawa—adị m ihe dị ka afọ atọ—wee chọta ụlọ nzukọ ahụ, ma a nọ na-ete egwú n’ime ya. Papa m chọpụtara oge e ji enwe nzukọ, anyị laghachitekwara. Anyị malitekwara ije ọmụmụ Bible kwa izu na nso nso ebe anyị bi. A na-enwe ya n’ụlọ otu nwanyị bụ́ onye bu ụzọ kpọtụrụ anyị. “Gịnị mere na unu adịghị akpọ ụmụ unu ndị nwoke abịakwa?” ka ọ jụrụ. Ihere mere mama m ikwu na ha enweghị akpụkpọ ụkwụ. Mgbe o mesịrị kwuo ya, e nyere ha akpụkpọ ụkwụ, ụmụnne m ndị nwoke malitekwara iso anyị na-eje nzukọ ndị ahụ.

E nyere mama m ókèala ime nkwusa n’ebe dịdewere ụlọ anyị, ọ malitekwara ozi ụlọ n’ụlọ. Eso m ya na-eje, na-ezo n’azụ ya. Tupu ọ mụta ịnya ụgbọ ala, anyị ga-eji ụkwụ gaa ihe karịrị otu kilomita iji banye bọs ga-ebuga anyị nzukọ na St. Louis. Ọbụna mgbe ice na snow na-ada, anyị ahapụtụbeghị nzukọ.

Na 1934, e mere mama m na papa m baptism. Mụ onwe m kwa chọrọ ka e mee m baptism, anọgidekwara m na-esi ọnwụ ruo mgbe mama m gwara Onyeàmà mere okenye karị ka o soro m kwurịta okwu banyere ya. Ọ jụrụ ọtụtụ ajụjụ n’ụzọ m pụrụ ịghọta. Mgbe ahụ ọ gwara ndị mụrụ m na e kwesịghị igbochi m ime baptism; ọ pụrụ imebi uto ime mmụọ m. Ya mere e mere m baptism n’oge okpomọkụ na-esonụ, mgbe m ka dị afọ isii.

Enwere m mmasị n’akwụkwọ nta bụ́ Home and Happiness, bụ́ nke m na-eji oge nile, ọbụna na-etinye ya n’okpuru ohiri isi m mgbe m na-ehi ụra. Ugboro ugboro, arịọrọ m mama m ka ọ na-agụrụ m ya ruo mgbe m buuru ya n’isi. Azụ ya nwere ihe osise nke otu nwatakịrị nwanyị nọ n’ime Paradaịs ya na ọdụm. Asịrị m na ọ bụ m bụ nwatakịrị nwanyị ahụ. Ihe osise ahụ nyeere m aka ilekwasị anya m n’ihe nrite nke ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.

M na-eme ihere nke ukwuu, ma n’agbanyeghị na m pụrụ ịdị na-ama jijiji, m na-aza ajụjụ mgbe nile n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke ọgbakọ.

N’ụzọ dị mwute, papa m tụrụ ụjọ na a ga-achụ ya n’ọrụ, ya mere ọ kwụsịrị iso Ndịàmà na-akpakọrịta. Ụmụnne m ndị nwoke kwụsịkwara.

Ozi Oge Nile

Mama m mere ka ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị ozi oge nile, dọsa ụlọ ha ụgbọ ala na-adọkpụ n’azụ ụlọ anyị, m na-esonyekwara ha n’ozi mgbe m si akwụkwọ lọta. N’oge na-adịghị anya m chọrọ ịsụ ụzọ, ma papa m ekweghị, na-ekwenye na m kwesịrị ịgụkwu akwụkwọ. N’ikpeazụ mama m mere ka o kweta ịhapụ m ka m sụọ ụzọ. Ya mere na June 1943, mgbe m dị afọ 14, amalitere m ozi oge nile. Iji nye aka ná mmefu ezinụlọ, m rụrụ ọrụ nwa oge, mgbe ụfọdụkwa arụrụ m ọrụ oge nile. N’agbanyeghị nke ahụ eruru m ihe mgbaru ọsọ nke 150 hour kwa ọnwa n’ọrụ ime nkwusa.

Ka oge na-aga achọtara m onye mụ na ya ga-asụkọ ụzọ, bụ́ Dorothy Craden, bụ́ onye maliteworo ịsụ ụzọ na January 1943, mgbe ọ dị afọ 17. Ọ bụbu ezigbo onye Katọlik, ma mgbe ọ mụsịrị Bible ruo ọnwa isii, e mere ya baptism. Ruo ọtụtụ afọ ọ bụ isi iyi nke agbamume na ume nye m, abụkwa m nye ya. Anyị ghọrọ ndị chiri anya karịa ụmụnne nwanyị.

Malite na 1945, anyị sụkọrọ ụzọ ọnụ n’ime ntakịrị obodo ndị dị na Missouri ebe ndị a na-enweghị ọgbakọ. N’obodo Bowling Green anyị doziri otu ụlọ nzukọ; mama m bịara nyere anyị aka. Mgbe ahụ anyị gara n’ebe obibi nile dị n’obodo ahụ kwa izu ma kpọọ ndị ahụ òkù ịbịa nụrụ okwu ihu ọha anyị mere ndokwa ka ụmụnna si St. Louis bịa nye. Kwa izu anyị na-enwe ihe nọ n’agbata mmadụ 40 na 50 na-abịanụ. Ka e mesịrị anyị mere otu ihe ahụ na Louisiana, bụ́ ebe anyị gbazitere otu ụlọ nsọ nke ndị Freemason. Iji kwụọ ụgwọ e ji gbazite ụlọ nzukọ ndị ahụ, anyị wepụtara igbe onyinye dị iche iche, a na-akwụkwa ụgwọ mmefu nile kwa izu.

Ebe ọzọ anyị gara bụ obodo ukwu bụ́ Mexico, na Missouri, bụ́ ebe anyị gbazitere otu ọnụ ụlọ n’ụlọ ahịa. Anyị doziri ya ka ntakịrị ọgbakọ dị n’ebe ahụ jiri ya na-eme ihe. Ụlọ ahụ nwere ọnụ ụlọ ndị ọzọ, bụ́ ebe anyị biri. Anyị nyekwara aka mee ndokwa maka okwu ihu ọha na Mexico. Anyị gaziri isi obodo ahụ, bụ́ Jefferson City, bụ́ ebe anyị kpọtụụrụ ndị ọrụ obodo kwa ụtụtụ ụbọchị ọrụ ọ bụla n’ọfịs ha. Anyị biri n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, anyị na Stella Willie, bụ́ onye na-emeso anyị ka nne.

Site n’ebe ahụ anyị atọ gara n’obodo Festus na Crystal City, bụ́ ndị dịdewere ibe ha. Anyị biri n’ụlọ ọkụkọ e jizi mere ụlọ obibi nke dị n’azụ ụlọ nke otu ezinụlọ nwere mmasị. Ebe a na-enweghị ụmụ nwoke e mere baptism, anyị duziri nzukọ nile. Anyị na-ere ihe ntecha dị ka ọrụ nwa oge. Anyị nwere ntakịrị ihe n’ụzọ ihe onwunwe. N’ezie, anyị enweghị ego iji dozie oghere ndị dị n’akpụkpọ ụkwụ anyị, ya mere anyị na-etinye kadbọd ọhụrụ n’ime ha, n’abalị kwa onye ọ bụla na-asa otu mkpụrụ uwe o nwere.

Ná mmalite 1948, mgbe m dị afọ 19, mụ na Dorothy natara ọkpụkpọ òkù ịga klas nke 12 nke ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead maka ndị ozi ala ọzọ. Mgbe ọmụmụ ihe ahụ were ọnwa ise gasịrị, otu narị ụmụ akwụkwọ ahụ gụsịrị akwụkwọ na February 6, 1949. Ọ bụ nnọọ oge obi ụtọ. Ndị mụrụ m akwafewo na California, mama m sikwa ebe ahụ bịa iji nọrọ ya.

Ịga Ebe E Kenyere Anyị Ọrụ

E kenyere mmadụ 28 gụsịrị akwụkwọ ọrụ ịga Itali—isii, tinyere mụ na Dorothy, gaa obodo ukwu bụ́ Milan. Na March 4, 1949, anyị hapụrụ New York n’ụgbọ mmiri Itali bụ́ Vulcania. Njem ahụ were ụbọchị 11, oké osimiri ahụ na-adịghịkwa jụụ mere ka ihe ka ukwuu n’ime anyị daa ọrịa njem mmiri. Nwanna Benanti bịara n’ọdụ ụgbọ mmiri Genoa izute anyị na iji ụgbọ okporo ígwè buru anyị laghachi Milan.

Mgbe anyị rutere n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na Milan, anyị hụrụ okooko osisi nke otu nwa agbọghọ onye Itali tinyeworo n’ime ọnụ ụlọ anyị nke ọ bụla. Ọtụtụ afọ n’ihu nwa agbọghọ a, bụ́ Maria Merafina, gara Gilead, laghachite Itali, mụ na ya jekọkwara ozi n’otu ebe obibi ndị ozi ala ọzọ!

N’ụtụtụ sochiri ụbọchị anyị rutere Milan, anyị si na window ebe ịsa ahụ lepụ anya. N’okporo ámá dị n’azụ anyị e nwere otu nnukwute ụlọ nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ bụ́ nke e ji bọmbụ tụjasịa. N’amaghị ụma, otu ụgbọ elu ndị America na-atụ bọmbụ atụwo otu bọmbụ gbuchapụrụ 80 ezinụlọ bi n’ebe ahụ. N’oge ọzọ, bọmbụ a tụrụ otu ụlọ ọrụ mmepụta ihe gahiere ụzọ wee tụọ otu ụlọ akwụkwọ ma gbuo 500 ụmụaka. N’ihi ya ndị obodo ahụ enweghị obi ụtọ n’ebe ndị America nọ.

Ike agha agwụla ndị mmadụ. Ọtụtụ ndị kwuru na ọ bụrụ na agha ọzọ amalite, ha agaghị agbaga n’ebe nchebe dị iche iche pụọ na bọmbụ kama na ha ga-anọrọ n’ụlọ gbanye gas ma nwụọ n’ebe ahụ. Anyị mesiri ha obi ike na anyị bịara n’ebe ahụ ịnọchite anya, ọ bụghị mba United States ma ọ bụ gọọmenti ọ bụla ọzọ mmadụ guzobere, kama Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-akwụsị agha nile na ịta ahụhụ ndị ha na-eweta.

N’obodo ukwu bụ́ Milan, nanị otu ọgbakọ e nwere nke nwere ihe dị ka 20 mmadụ na-ezukọta n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ. E kepụtabeghị ókèala ime nkwusa, ya mere anyị malitere ịgba àmà n’otu nnukwute ụlọ nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ. N’ọnụ ụzọ nke mbụ, anyị zutere Maazi Giandinotti, bụ́ onye chọrọ ka nwunye ya hapụ chọọchị, ya mere ọ nakweere otu n’ime akwụkwọ anyị. Oriakụ Giandinotti bụ nwanyị nwere obi eziokwu, nke nwere ọtụtụ ajụjụ. “Obi ga-adị m ụtọ mgbe unu mụtara Italian,” ka o kwuru, “ka unu wee nwee ike ịkụziri m Bible.”

Uko dị n’ụlọ ha dị elu, ọkụ ya adịghịkwa achasi ike, ya mere n’abalị ọ ga-adọkwasị oche ya n’elu table iji nọdewe ọkụ ahụ iji gụọ Bible. “Ọ bụrụ na m soro unu mụọ Bible,” ka ọ jụrụ, “m̀ ka pụrụ ịdị na-aga chọọchị?” Anyị gwara ya na ọ dị ya n’aka. Ọ na-aga chọọchị n’ụtụtụ Sunday ma na-abịa nzukọ anyị n’ehihie. Mgbe ahụ o kwuru otu ụbọchị, sị, “M gaghị ejekwa chọọchị.”

“N’ihi gịnị?” ka anyị jụrụ.

“N’ihi na ha adịghị akụzi Bible, achọtawokwa m eziokwu ahụ site n’iso unu na-amụ Bible.” E mere ya baptism, o sorokwa ọtụtụ ụmụ nwanyị na-eje chọọchị kwa ụbọchị mụọ ihe. Ka e mesịrị ọ gwara anyị na a sị na anyị gwara ya agala chọọchị, na ya gaara akwụsị ịmụ ihe, ma eleghịkwa anya na ya agaraghị amụta eziokwu ahụ ma ọlị.

Ọrụ Ndị Ọhụrụ

Ka oge na-aga e kenyere mụ na Dorothy, tinyere ndị ozi ala ọzọ anọ ọzọ ọrụ n’obodo Itali bụ́ Trieste, bụ́ nke dị n’aka ndị agha Britain na America n’oge ahụ. E nwere nanị ihe dị ka Ndịàmà iri, ma ọnụ ọgụgụ a mụbara. Anyị mere nkwusa na Trieste ruo afọ atọ, mgbe anyị pụkwara, e nwere ihe dị ka ndị nkwusa Alaeze 40, ndị 10 n’ime ha bụ ndị ọsụ ụzọ.

Ebe ọzọ e kenyere anyị ọrụ bụ n’obodo ukwu bụ́ Verona, bụ́ ebe a na-enweghị ọgbakọ ọ bụla. Ma mgbe chọọchị rụgidere ndị ọchịchị, a manyere anyị ịpụ. E kenyere mụ na Dorothy ọrụ na Rom. N’ebe ahụ anyị gbazitere otu ọnụ ụlọ e doziri nke ọma, anyị rụkwara ọrụ n’ókèala dịdewere Vatican. Ọ bụ oge anyị nọ n’ebe ahụ ka Dorothy gara Lebanọn ka ya na John Chimiklis ga lụọ. Anyị anọkọwo ọnụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 12, agụụ ya gụkwara m n’ezie.

Na 1955 e meghere ebe obibi ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ n’akụkụ ọzọ nke Rom n’okporo ámá a na-akpọ New Appian Way. Otu n’ime mmadụ anọ bi n’ebe obibi ahụ bụ Maria Merafina, nwa agbọghọ ahụ tinyere okooko osisi n’ọnụ ụlọ anyị n’abalị ahụ anyị rutere Milan. E guzobere ọgbakọ ọhụrụ n’akụkụ a nke obodo ukwu ahụ. Ka e nwesịrị mgbakọ mba nile na Rom n’oge okpomọkụ ahụ, enwere m ihe ùgwù nke ije mgbakọ ahụ e mere na Nuremberg, Germany. Lee ihe obi ụtọ ọ bụ izute ndị tachiworo obi nke ukwuu n’okpuru ọchịchị Hitler!

Ịlaghachi States

Na 1956, n’ihi nsogbu ahụ ike, alaghachiri m United States wee nọọ ezumike n’ihi ọrịa. Ma ọ dịghị mgbe m wepụrụ anya m n’ihe nrite nke ijere Jehova ozi ugbu a na n’akwụsịghị akwụsị n’ime ụwa ọhụrụ ya. Emere m atụmatụ ịlaghachi Itali. Otú ọ dị, ezutere m Orville Michael, bụ́ onye jere ozi n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York. Anyị lụrụ di na nwunye mgbe e nwesịrị mgbakọ mba nile nke 1958 na New York City.

Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị anyị kwagara Front Royal, Virginia, bụ́ ebe ọ tọrọ anyị ụtọ iso otu ntakịrị ọgbakọ jee ozi. Anyị biri n’otu ntakịrị ụlọ dị n’azụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ikpeazụ, na March 1960 ọ ghọrọ ihe dị mkpa ka anyị laghachi Brooklyn iji chọta ọrụ ego iji kwụọ ụgwọ nile anyị ji. Anyị na-arụ ọrụ n’abalị n’ụlọ ndebe ego dị iche iche ka anyị wee nwee ike ịnọgide n’ozi oge nile.

Oge anyị nọ na Brooklyn, papa m nwụrụ, nne di m nwekwara ntakịrị ahụ mkpọnwụ. Ya mere anyị kpebiri ịkwaga Oregon iji nọdewe ndị nne anyị. Anyị abụọ chọtara ọrụ ego nwa oge ma nọgide n’ozi ịsụ ụzọ n’ebe ahụ. N’oge mgbụsị akwụkwọ nke 1964, anyị na ndị nne anyị jiri ụgbọ ala gaa n’akụkụ ọzọ nke mba ahụ iji jee nzukọ kwa afọ nke Watch Tower Bible and Tract Society na Pittsburgh, Pennsylvania.

N’oge anyị jere nleta na Rhode Island, otu onye nlekọta sekit, bụ́ Arlen Meier, na nwunye ya gbara anyị ume ịkwaga n’isi obodo ahụ, bụ́ Providence, bụ́ ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ndị nne anyị gbara anyị ume ịnakwere ọrụ ọhụrụ a, ya mere mgbe anyị laghachiri Oregon, anyị rere ihe ka ukwuu ná ngwongwo ụlọ anyị wee kwapụ.

Ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead Ọzọkwa

N’oge okpomọkụ nke 1965, anyị jere otu mgbakọ n’Ámá Egwuregwu Yankee. N’ebe ahụ anyị tinyere akwụkwọ maka ụlọ akwụkwọ Gilead dị ka di na nwunye. Ihe dị ka otu ọnwa n’ihu, ọ tụrụ anyị n’anya ịnata akwụkwọ ndejupụta, bụ́ nke a na-aghaghị izighachi n’ime 30 ụbọchị. Enwere m nchegbu banyere ịga ná mba dị anya ebe ọ bụ na ahụ adịghị mama m. Ma ọ gbara m ume, sị: “Dejupụtanụ akwụkwọ ndị ahụ. Unu maara na unu kwesịrị ịnakwere ihe ùgwù ọ bụla nke Jehova nyere!”

Nke ahụ mere ka okwu bie. Anyị dejupụtara akwụkwọ ndị ahụ ma ziga ha. Lee ihe ijuanya ọ bụ ịnata ọkpụkpọ òkù ịbịa klas nke 42, bụ́ nke malitere n’April 25, 1966! Ụlọ Akwụkwọ Gilead dị mgbe ahụ na Brooklyn, New York. N’ihe na-erughị ọnwa ise n’ihu, mmadụ 106 n’ime anyị gụsịrị akwụkwọ na September 11, 1966.

Ndị E Kenyere Ọrụ Gaa Argentina

Ụbọchị abụọ ka anyị gụsịrị akwụkwọ, anyị tinyere isi n’ụzọ gawa Argentina n’Ụgbọ Elu Peru. Mgbe anyị rutere Buenos Aires, onye nlekọta alaka ahụ, bụ́ Charles Eisenhower, zutere anyị n’ọdụ ụgbọ elu. O nyeere anyị aka ịgafere ndị ọrụ na-ahụ maka ibubata ngwá ahịa wee buruzie anyị gaa n’alaka ahụ. Anyị nwere otu ụbọchị iji kwasịsịa ibu anyị ma dozie ha; mgbe ahụ ihe ọmụmụ anyị nke asụsụ Spanish malitere. Anyị mụrụ Spanish hour 11 kwa ụbọchị n’ọnwa mbụ. N’ọnwa nke abụọ, anyị mụrụ asụsụ ahụ hour anọ kwa ụbọchị ma malite ikere òkè n’ozi ubi.

Anyị nọrọ na Buenos Aires ruo ọnwa ise, e wee zigazie anyị na Rosario, bụ́ obodo ukwu nke ga-ewe ihe dị ka hour anọ ma e jiri ụgbọ okporo ígwè gawa n’ebe ugwu. Mgbe anyị jesịrị ozi n’ebe ahụ ruo ọnwa 15, e zigara anyị gamikwuo n’ebe ugwu Santiago del Estero, bụ́ obodo ukwu nke dị n’ógbè ọzara na-ekpo ọkụ. Mgbe anyị nọ ebe ahụ, na January 1973, mama m nwụrụ. Ahụbeghị m ya anya ruo afọ anọ. Ihe nyere aka kwagide m ná mwute m bụ olileanya ahụ e ji n’aka nke mbilite n’ọnwụ tinyekwara ịmara na m na-eje ozi n’ebe mama m ga-achọ ka m nọrọ.—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.

Ndị obodo Santiago del Estero nwere omume enyi, ọ dịkwa mfe ịmalite ọmụmụ Bible. Mgbe anyị bịarutere na 1968, e nwere ihe dị ka mmadụ 20 ma ọ bụ 30 na-abịa nzukọ, ma afọ asatọ n’ihu e nwere ihe karịrị otu narị n’ọgbakọ anyị. Tụkwasịkwa, e nwere ọgbakọ ọhụrụ abụọ ndị nwere ihe nọ n’agbata ndị nkwusa 25 na 50 n’obodo ndị dị nso.

Ịlaghachikwa Ọzọ na States

N’ihi nsogbu ahụ ike, na 1976 e kenyere anyị ọrụ ịgaghachi na United States dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche—gaa Fayetteville, na North Carolina. E nwere ọtụtụ ndị na-asụ Spanish n’ebe ahụ bụ́ ndị si Ebe Etiti na Ndịda America, Dominican Republic, Puerto Rico, na ọbụna Spain. Anyị nwere ọtụtụ ọmụmụ Bible, ka oge na-agakwa a malitere ọgbakọ Spanish. Anyị nọrọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ asatọ n’ebe ahụ e kenyere anyị ọrụ.

Otú ọ dị, ọ dị anyị mkpa ịnọdewe nne di m, bụ́ onye meworo nnọọ agadi ma nwee nkwarụ. O bi na Portland, Oregon, ya mere anyị natara ọrụ ọhụrụ gaa n’ọgbakọ Spanish dị na Vancouver, Washington, bụ́ nke na-adịghị anya na Portland. Ọgbakọ ahụ dị ntakịrị mgbe anyị bịarutere na December 1983, ma anyị na-ahụ ọtụtụ ndị ọhụrụ.

Na June 1996, anọzuru m 53 afọ n’ozi oge nile, di m nọzukwara 55 afọ na January 1, 1996. N’ime ọtụtụ afọ ndị a, enwewo m ihe ùgwù nke inyere ọtụtụ narị mmadụ aka ịbịa mata eziokwu nke Okwu Chineke ma rara ndụ ha nye Jehova. Ọtụtụ n’ime ndị a na-eje ozi ugbu a dị ka ndị okenye na ndị na-eje ozi oge nile.

Mgbe ụfọdụ a na-ajụ m ma ọ̀ na-ewute m na mụ amụghị ụmụ. Ihe bụ eziokwu bụ na Jehova ejiriwo ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ime mmụọ gọzie m. Ee, ndụ m abụrụwo nke nwere nzube ma na-akwụghachi ụgwọ n’ozi Jehova. Apụrụ m inwe mmetụta yiri nke ada Jefta, bụ́ onye tinyere ndụ ya n’ozi ụlọ nsọ ma ghara ịmụ ụmụ n’ihi oké ihe ùgwù ya nke ije ozi.—Ndị Ikpe 11:38-40.

M ka na-echeta ime nrara m nye Jehova mgbe m ka bụ nwatakịrị nwanyị. M na-ahụ n’uche m ihe osise nke Paradaịs n’ụzọ doro anya ugbu a dị ka ọ dị n’oge ahụ. Anya m na obi m ka dị n’ihe nrite nke ndụ na-enweghị ngwụsị n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. Ee, ọchịchọ m bụ ijere Jehova ozi, ọ bụghị nanị ruo 50 afọ, kama ruo mgbe ebighị ebi—n’okpuru ịchịisi Alaeze ya.

[Foto dị na peeji nke 23]

Dorothy Craden, ka ọ tụkwasịrị m aka n’ubu, na ndị ọsụ ụzọ ibe m na 1943

[Foto dị na peeji nke 23]

Na Rom, Itali, mụ na ndị ozi ala ọzọ ibe m na 1953

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na di m

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya