Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 1/1 p. 31
  • Jehova Dị Ike Karịa Ndị Iro Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Dị Ike Karịa Ndị Iro Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrụ Ọma Ndị Na-enye Jehova Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Site n’Ịda Mbà n’Obi Gaa n’Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 1/1 p. 31

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Jehova Dị Ike Karịa Ndị Iro Ya

EKWENSU na ndị mmụọ ọjọọ ya anwawo eri ogologo oge iji okpukpe ụgha na mgbaasị gbochie nkwusa nke ozi ọma ahụ. Bible na-ekwu banyere ebumnuche ọjọọ Setan ná 2 Ndị Kọrint 4:4 ebe ọ na-ekwu na “chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì n’etiti ha, ka inye ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraịst, Onye bụ́ onyinyo Chineke, wee ghara ịwakwasị ha.”

Ma Jehova Chineke dị ike karịa Setan. Ọ dịghị ihe ọ bụla ndị iro Jehova pụrụ ime iji kwụsị mmezu nke uche Chineke, nke bụ ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Akụkọ ndị na-esonụ ndị sitere n’aka ndị nkwusa Alaeze n’Australia na-eme ka nke a pụta ìhè.

◻ Mgbe 20 afọ nke ikewapụ onwe ya n’okpukpe gasịrị, otu nwanyị malitere ịgụ Bible ọzọ. Mmasị nke a e mere ka ọ dịghachi ọhụrụ n’ebe Bible dị kpaliri ya inwe ọtụtụ ajụjụ, ya mere o kpegaara Chineke ekpere maka enyemaka iji chọta azịza ha. Ọ chọrọ ịchọta eziokwu ahụ, ma ọ matara na ịlaghachi azụ n’okpukpe ochie ya agaghị agwọta nsogbu ya. Kama nke ahụ, ọ malitere ọchịchọ ya site n’ileta otu ụlọ ahịa a na-ere akwụkwọ ndị e jiworo mee ihe ma na-ajụ ma ha nwere akwụkwọ ọ bụla ndị metụtara okpukpe.

Onye nwe ụlọ ahịa ahụ chetara na ya nwere otu akwụkwọ okpukpe, ọ bụghị n’ụlọ ahịa, kama n’ụlọ ya. Aha akwụkwọ ahụ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, nke Ndịàmà Jehova na-ebipụta. Nwanyị ahụ ji oké mmasị gụọ akwụkwọ ahụ wee chọta azịza nye ọtụtụ n’ime ajụjụ Bible ya. Mgbe ọ chọsịrị Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ ntụziaka telifon, o mesịrị chọta ha ma malite ọmụmụ Bible chiri anya.

◻ Otu nwa agbọghọ kwụrụ otu akwụkwọ akụkọ a na-ede n’ógbè ahụ ụgwọ ka ọ kpọsaa maka ire otu ọgwụ nchebe. Mkpọsa ngwá ahịa ahụ zoro aka na ya dị ka ‘ọgwụ nchebe nke mgbe ụwa na-emepebeghị anya nke dị ike nke ukwuu.’ Otu n’ime Ndịàmà Jehova hụrụ mkpọsa ngwá ahịa ahụ. O kpebiri ịkpọ nwanyị ahụ site na nọmba telifon e nyere ma gwa nwanyị ahụ okwu banyere ebe ike ahụ a sịrị na ọgwụ nchebe ahụ nwere si bịa. Mkparịta ụka n’ihe bụ echiche nke Bible banyere ọrụ ndị mmụọ ọjọọ sochiri. Nwa agbọghọ ahụ nwe ọgwụ nchebe ahụ kpughere na nanị n’ime ụbọchị bu nke ahụ ụzọ, na ya ekpegaworo Chineke ekpere maka enyemaka ná nsogbu ya n’ebe ndị mmụọ ọjọọ nọ. Onyeàmà ahụ mere ndokwa maka iji telifon nwee mkparịta ụka ọzọ.

Mgbe ọ kpọrọ, nwa agbọghọ ahụ anọghị n’ụlọ. Nne ya zara telifon ahụ, wee sị: “Amaghị m ihe ị gwara nwa m nwanyị, ma ihe meworonụ bụ ọrụ ebube!” Ọ kọrọ na mgbe ọkpụkpọ nke mbụ gasịrị, nwa ya nwanyị tụfuru ihe osise Setan na akwụkwọ ya nile ma malite ịgụ Bible.

Ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị, e mere ndokwa maka ije leta nwa agbọghọ ahụ ihu na ihu. Ọ nakweere isoro Ndịàmà Jehova na-amụchi Bible anya n’egbughị oge. Ọ malitekwara isoro Ndịàmà na-akpakọrịta site n’ije nzukọ ndị Kraịst ha. Ọzọ, Jehova meriri ndị mmụọ ọjọọ site n’ime ka ìhè nke ezi ihe ọmụma nke eziokwu Bible nwupụta.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya