“Ebe Anyị Nwere Ije Ozi A . . . , Ike Agwụghị Anyị n’Obi”
DỊ KA RONALD TAYLOR SI KỌỌ
N’oge okpomọkụ nke 1963, ahụrụ m onwe m ka m na-alụ ọgụ maka ndụ m. Mgbe m nọ na-aga n’ụsọ mmiri, m zọnyere ụkwụ n’okukoro zoro ezo, wee danye na mberede n’ime mmiri dị nnọọ omimi. N’ihi ịbụ onye na-amaghị mmiri egwu, ọ fọrọ nke nta ka mmiri rie m nanị mita ole na ole site n’ụsọ mmiri ahụ. M buruworị ụzọ mikpuo ugboro atọ n’ime mmiri ma loda ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke mmiri osimiri mgbe otu enyi m hụrụ nsogbu m ma dọpụta m n’ụsọ mmiri. Site n’isi n’imi kunye m ume ndụ ngwa ngwa, alanarịrị m.
NKE a abụghị mbụ m bịara ghọta mkpa nke ịbụ onye ike na-agwụghị n’obi ma ọlị—ọbụna ọ bụ ezie na o yiri ka olileanya adịghị. Site ná nwata, ọ dịrị m mkpa ịlụ ọgụ maka ndụ ime mmụọ m.
Ọ bụ n’ụbọchị ndị dị mwute nke Agha Ụwa nke Abụọ ka m zutere eziokwu ndị Kraịst na nke mbụ ya. Eso m n’otu n’ime ọtụtụ puku ụmụaka bụ́ ndị e si na London kpọpụ iji gbanarị ihe ize ndụ nke ogbunigwe a na-atụ aghara aghara. Ebe ọ bụ na m dị nanị afọ 12, agha ahụ enwekebeghị ihe ọ pụtara nye m; ọ dị m nnọọ ka m na-eme mkpagharị.
Di na nwunye meworo agadi nọ na Weston-super-Mare, ndịda ọdịda anyanwụ nke England, lekọtara m. N’oge na-adịghị anya ka m rutesịrị n’ụlọ di na nwunye ahụ, ụfọdụ ndị ozi ọsụ ụzọ malitere ịbịa leta anyị. Ọ bụ ezinụlọ Hargreaves; ha anọ nile—Reg, Mabs, Pamela, na Valeri—bụcha ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Nne na nna m ndị kuchiri m nakweere eziokwu ahụ, mgbe m mụsịkwara akwụkwọ bụ́ The Harp of God, emekwara m mkpebi ijere Jehova ozi. Mgbe nanị izu isii gasịrị, a kpọrọ m òkù ikere òkè n’ọrụ ime nkwusa.
M ka pụrụ icheta ụbọchị mbụ m pụrụ n’ozi ubi. N’enweghị nkwadebe ọzọ, e nyere m ụfọdụ akwụkwọ nta ma sị m: “Rụọ akụkụ okporo ámá ahụ gbadaa.” Nke ahụ bụkwa otú m si nwee ahụmahụ ụbọchị mbụ m nke ikwusa ozi ọma. N’oge ahụ, anyị na-ekwusakarị ozi ọma site n’iji rekọd phonograph nwere okwu ihu ọha ndị siri ike. Oge ndị mere m obi ụtọ karịsịa bụ mgbe m pụrụ iburu phonograph ahụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma kpọọ okwu ihu ọha ndị a gụbanyere n’ime ya. M lere ya anya dị ka ihe ùgwù n’ezie ịbụ onye e ji na-eme ihe n’ụzọ dị otú ahụ.
Agbara m nnọọ àmà dị ukwuu n’ụlọ akwụkwọ, echetakwara m mgbe m nyefere usoro akwụkwọ e dere n’isiokwu ndị dị na Bible n’aka onye isi ụlọ akwụkwọ. Mgbe m nọ afọ 13, e mere m baptism ná mgbakọ dị nso na Bath. Mgbakọ ọzọ e mere n’oge agha m na-agaghị echezọ mgbe ọ bụla bụ nke e mere na Leicester na 1941 n’ụlọ ezumezu De Montfort Hall. M gbagooro n’elu ikpo okwu ịnara akwụkwọ Children nke m, bụ́ nke nwere ozi onwe onye sitere n’aka Nwanna Rutherford, bụ́ onye isi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ. Okwu na-akpali akpali a gwara ndị na-eto eto nile nọ ebe ahụ mesiri ọchịchọ m ijere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi ike.
Otú a mụ na nne na nna m ndị kuchiri m biri afọ abụọ nke obi ụtọ na-etolite n’eziokwu. Ma n’afọ nke 14, ọ dịrị m mkpa ịlaghachi London ma malite ịrụ ọrụ maka ihe ndị m ga-eji ebi ndụ. Ọ bụ ezie na e jikọtaghachiri mụ na ezinụlọ a mụrụ m na ya ọzọ, m ga-eguzoro onwe m ugbu a n’ime mmụọ, ebe ọ na-adịghị onye nọ n’ụlọ sonyeere m na nkwenkwe m. N’oge na-adịghị anya Jehova wetara ihe inyeaka dị m mkpa. Nanị izu atọ ka m lọtasịrị London, otu nwanna nwoke kpọtụrụ n’ụlọ m iji nata nna m ike ịkpọrọ m gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè ahụ. Nwanna nwoke ahụ bụ John Barr, bụ́ ugbu a onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ọ ghọrọ otu n’ime “nna” ime mmụọ m n’afọ ndị iri na atọ ruo iri na itoolu ndị ahụ dị oké egwu.—Matiu 19:29.
M malitere ije Ọgbakọ Paddington, ndị na-ezukọ na Craven Terrace n’akụkụ Ebe Obibi Betel nke London. Ebe m bụ nwa na-enweghị nne ma ọ bụ nna n’ụzọ ime mmụọ, otu nwanna nwoke e tere mmanụ meworo agadi, bụ́ “Pop” Humphreys, bụ onye e nyere ọrụ inwe mmasị pụrụ iche n’ebe m nọ. Ọ bụ n’ezie ngọzi dị ukwuu inwe ike isoro ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị e tere mmanụ na-eje ozi n’ọgbakọ ahụ na-akpakọrịta. Anyị bụ ndị nwere olileanya elu ala—bụ́ ndị a kpọrọ ndị Jonadab—ka nta n’ọnụ ọgụgụ. N’ezie, abụ m nanị “Jonadab” nọ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nke m gara. Ọ bụ ezie na mụ na ndị ọgbọ m enweghị mkpakọrịta dị ukwuu, nnọkọrịta ahụ dị oké ọnụ ahịa mụ na ụmụnna tozuru okè nwere kụziiri m ọtụtụ ihe mmụta ndị bara uru. Eleghị anya nke kasị mkpa n’ime ha bụ nke ahapụghị ozi Jehova ma ọlị.
N’ụbọchị ndị ahụ, anyị na-ejibu ngwụsị izu nile rụọ ọrụ nkwusa. E nyere m ọrụ ilekọta “moto nwere ígwè na-ekwu okwu,” nke bụ n’ezie ịnyịnya ígwè nwere ụkwụ atọ a rụziri iji nwee ígwè na-ekwu okwu na batrị moto. Na Saturday ọ bụla, m na-eji ịnyịnya ígwè ahụ mee njem gaa ná nkuku okporo ámá dị iche iche, ebe anyị na-akpọnye egwú ụfọdụ ma mgbe ahụ kpọnye otu n’ime okwu Nwanna Rutherford. A na-ejikwa Saturday arụ ọrụ okporo ámá, na-ebu akpa magazin anyị. Anyị na-eji Sunday nile na-arụ ọrụ ụlọ n’ụlọ, na-enyefe akwụkwọ nta na akwụkwọ ukwu dị iche iche.
Mkpakọrịta nke mụ na ụmụnna ndị tọrọ m na-anụ ọkụ n’obi kpaliri n’ime m ọchịchọ nke ịsụ ụzọ. E wusiri ọchịchọ nke a ike mgbe m nụrụ okwu ndị dabeere n’ịsụ ụzọ ná mgbakọ distrikti. Otu mgbakọ nwere mmetụta dị omimi ná ndụ m bụ nke e nwere na Earl Court, London, na 1947. Ọnwa abụọ ka nke ahụ gasịrị, edenyere m aha m n’ozi ọsụ ụzọ, agbalịwokwa m ịnọgịde na-enwe mmụọ ịsụ ụzọ kemgbe ahụ. Ọṅụ nke m na-enweta site n’iduzi ọmụmụ Bible ndị na-aga n’ihu mere ka m jide n’aka na nke a bụ ezi mkpebi.
Nwunye Bụ́ Onye Spain na Ọrụ Ịga Spain
N’afọ 1957, mgbe m ka na-asụ ụzọ n’Ọgbakọ Paddington, ezutere m ọmarịcha nwanna nwanyị si Spain aha ya bụ Rafaela. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, anyị lụrụ. Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ịrụkọ ọrụ ọsụ ụzọ ọnụ, ma anyị bu ụzọ gaa Madrid ka m wee nwee ike ịhụ nne na nna Rafaela. Ọ bụ nleta nke gbanwere ndụ m. Mgbe anyị nọ na Madrid, Nwanna Ray Dusinberre, onye nlekọta alaka nke Spain, jụrụ m ma anyị ga-achọ ije ozi na Spain, ebe e nwere mkpa dị ukwuu maka ụmụnna nwoke nweworo ahụmahụ.
Olee otú anyị pụrụ isi jụ ụdị ịkpọ òkù ahụ? Ya mere, na 1958 anyị malitekọrọ ozi oge nile anyị ọnụ na Spain. N’oge ahụ mba ahụ nọ n’okpuru ọchịchị Franco, ọrụ anyị enweghịkwa nkwado iwu, bụ́ nke mere ka ọrụ ime nkwusa taa nnọọ akpụ. Tụkwasị na nke ahụ, aghaghị m ịgba mgba ịmụ asụsụ Spanish n’afọ ole na ole ndị mbụ. Ọzọkwa, ọ bụ banyere enweghị ike ọgwụgwụ n’obi, ọ bụ ezie na m bere ákwá n’ihe karịrị otu oge n’ihi nkụda obi nke enweghị ike isoro ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ kwurịta okwu.
Mkpa e nwere maka ndị nlekọta dị ukwuu nke na ọbụna ọ bụ ezie na apụghị m ịsụli asụsụ Spanish, mgbe ọ na-erule otu ọnwa, m na-elekọta otu ìgwè nta. N’ihi ọrụ anyị ịbụ nke a na-arụ na nzuzo, a haziri anyị gaa n’ìgwè nta ndị nwere 15 ruo 20 ndị nkwusa, nke na-arụ ọrụ dị ka ọgbakọ nta. Na mbụ, o siri ike iduzi nzukọ ahụ, ebe m na-apụghị mgbe nile ịghọta azịza nke ndị na-ege ntị. Otú ọ dị, nwunye m na-anọdụ n’azụ, ọ bụrụkwa na ọ hụta na m nọ ná mgbagwoju anya, ọ ga-eji akọ kwee n’isi iji gosi na azịza ahụ ziri ezi.
Enweghị m onyinye nke ịmụ asụsụ, n’ihe karịkwara otu ugbo m nwere mmetụta ịlaghachi England, ebe m pụrụ ime ihe nile n’ụzọ dị mfe karị. Ka o sina dị, site ná mmalite, ịhụnanya na omume enyi nke ezi ụmụnna anyị nwoke na nwanyị bụ́ ndị Spain kwụghachiri ụgwọ nkụda obi nile m nwere n’asụsụ. Jehova gọzikwara m site n’ihe ùgwù ndị pụrụ iche nke mere ka ha nile yie ka ha kwesịrị ya. Na 1958, a kpọrọ m òkù ịga mgbakọ mba nile na New York dị ka onye nnọchianya si Spain. Mgbe ahụ na 1962, anatara m ọzụzụ bara uru nke ukwuu n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze a haziri maka anyị na Tangier, Morocco.
Nsogbu ọzọ m chere ihu, e wepụ asụsụ, bụ nchegbu m na-enwekarị banyere ịbụ onye ndị uwe ojii kpaara aka. Dị ka onye mba ọzọ, amaara m na ịbụ onye e jidere ga-apụta ịgbara m ụgbọ nwa mkpi ozugbo. Iji belata ihe ize ndụ ahụ, anyị na-adị abụọ arụ ọrụ. Mgbe otu onye na-agba àmà, onye nke ọzọ ga-anọ na-ege ntị maka ihe mgbaàmà nke ihe ize ndụ. Mgbe anyị letasịrị otu ọnụ ụzọ ma ọ bụ abụọ, mgbe mgbe n’elu nke ụlọ elu, anyị na-amafere ụlọ abụọ ma ọ bụ atọ ma kpọtụrụ ebe obibi abụọ ma ọ bụ atọ ọzọ. Anyị jiri Bible mee ihe nke ukwuu, anyị bukwaara nanị akwụkwọ nta ole na ole e zofuru n’akpa kotu anyị inyefe ya ndị nwere mmasị.
Mgbe anyị nọsịrị otu afọ na Madrid, e nyere anyị ọrụ ịga Vigo, obodo ukwu dị n’ebe ugwu ọdida anyanwụ nke Spain, ebe a na-enweghị Ndịàmà ma ọlị. N’ihe dị ka ọnwa mbụ, Society tụrụ aro ka nwunye m na-agba àmà ahụ karị—iji nye echiche na anyị bịara nleta dị ka ndị na-eme njem ntụrụndụ. N’agbanyeghị ụzọ a dị ala e ji na-eso ya, nkwusa anyị dọọrọ mmasị. Mgbe ọ na-erule otu ọnwa, ndị ụkọchukwu Katọlik malitere ịkatọ anyị na redio. Ha dọrọ ndị na-aga ụka aka ná ntị na otu di na nwunye na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-ekwu banyere Bible—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akwụkwọ a machibidoro iwu n’oge ahụ. “Di na nwunye ahụ a na-achọ achọ” gụnyere otu onye mba ọzọ na nwunye ya bụ́ onye Spain, onye fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nanị ya na-ekwu ihe nile!
Ndị ụkọchukwu ahụ nyere iwu na nanị ikwusara di na nwunye nke a dị ize ndụ okwu bụ mmehie nke a ga-agbaghara nanị ma ọ bụrụ na e kwupụtara onye ụkọchukwu mmehie ahụ ozugbo. Dịkwa ka a pụrụ ịtụ anya ya, ná mmechi nke otu nkwurịta okwu dị ụtọ anyị na otu nwanyị nwere, ọ gwara anyị n’ụzọ ịrịọ mgbaghara na ya aghaghị ịga mee nkwupụta. Mgbe anyị hapụrụ ụlọ ya, anyị hụrụ ya ka ọ na-agbaga na chọọchị ngwa ngwa.
Nchụpụ
Nanị ọnwa abụọ ka anyị rutesịrị na Vigo, ndị uwe ojii wakwasịrị anyị. Onye uwe ojii jidere anyị nwere ọmịiko ma ghara ịtụ anyị ị́gà maka njem ịga n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. N’ụlọ ọrụ ahụ, anyị hụrụ ihu anyị ma ama, onye na-eji ígwè typewriter ede ihe bụ́ onye anyị gbawooro àmà n’oge na-adịbeghị anya. O doro anya na ahụ erughị ya ala ịhụ ka a na-eme anyị dị ka ndị ome mpụ ma mee ngwa iji mesie anyị obi ike na ọ gbaghị anyị àmà. N’agbanyeghị nke ahụ, e boro anyị ebubo itinye “ịdị n’otu ime mmụọ nke Spain” n’ihe ize ndụ, ọnwa isii ka nke ahụ gasịkwara a gbaara anyị ụgbọ nwa mkpi.
Ọ bụ ihe ndọghachi azụ, ma anyị ezubeghị inwe ike ọgwụgwụ n’obi. A ka nwere ọrụ dị ukwuu anyị ga-arụ na Iberian Peninsula. Mgbe anyị nọsịrị ọnwa atọ na Tangier, e nyere anyị ọrụ na Gibraltar—ókèala ọzọ a na-akpabeghị aka. Dị ka Pọl onyeozi kwuru, ọ bụrụ na anyị ji ozi anyị kpọrọ ihe, anyị ga-aga n’ihu, a ga-akwụghachikwa anyị ụgwọ ọrụ. (2 Ndị Kọrint 4:1, 7, 8) Nke a ghọrọ eziokwu n’ọnọdụ anyị. Kpọmkwem n’ụlọ mbụ anyị letara na Gibraltar, anyị maliteere otu ezinụlọ nile ọmụmụ Bible. N’oge na-adịghị anya, onye ọ bụla n’ime anyị na-eduzi ọmụmụ ihe 17. Ọtụtụ n’ime ndị anyị duziiri ọmụmụ ihe ghọchara Ndịàmà, n’ọnwa abụọ kwa e nwere ọgbakọ nke 25 ndị nkwusa mejupụtara.
Ma, dị ka na Vigo, ndị ụkọchukwu malitere ikwugide anyị. Bishọp ndị Anglikan na Gibraltar dọrọ onye isi ndị uwe ojii aka ná ntị na anyị bụ “ndị a na-achọghị,” nrụgide ya mesịrị rụpụta ihe. Na January 1962 a chụpụrụ anyị na Gibraltar. Olee ebe ọzọ anyị ga-aga? A ka nwere mkpa dị ukwuu na Spain, ya mere anyị laghachiri azụ, na-enwe olileanya na ihe ndekọ anyị dị n’aka ndị uwe ojii agaghị agbata ha n’uche.
Obodo Seville anwụ na-amụ bụ ebe obibi ọhụrụ anyị. N’ebe ahụ anyị nwere ọṅụ isoro di na nwunye ọsụ ụzọ ọzọ, bụ́ Ray na Pat Kirkup na-arụkọ ọrụ. Ọ bụ ezie na Seville bụ obodo ukwu nwere ọkara nde ndị mmadụ bi n’ime ya, a dị nanị 21 ndị nkwusa, ya mere e nwere ọtụtụ ọrụ a ga-arụ. Ugbu a, e nwere ọgbakọ 15 nwere 1,500 ndị nkwusa. Otu afọ n’ihu anyị nwere ihe ịtụnanya na-eme obi ụtọ; a kpọrọ anyị òkù ije ozi n’ọrụ njegharị n’ógbè Barcelona.
Ọrụ sekit ná mba ọrụ anyị na-enweghị nkwado iwu dịtụ iche. Izu ọ bụla anyị jere leta ìgwè ndị dị nta, nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha nwere ụmụnna ole na ole ruru eru. Ụmụnna ndị a na-arụsi ọrụ ike nwere mkpa nke ọzụzụ na nkwado nile anyị pụrụ inye ha. Anyị nwere mmasị n’ọrụ a! Ka anyị nọsịrị ọtụtụ afọ n’ebe e nwere Ndịàmà ole na ole ma ọ bụrụ na e nwedịrị, obi dị anyị ụtọ ịdị na-eleta ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị dị iche iche. Ọzọkwa, ịrụ ọrụ nkwusa na Barcelona dị mfe karị, ọtụtụ ndị mmadụ chọkwara ịmụ Bible.
Ịlụso Ịda Mbà n’Obi Ọgụ
Otú ọ dị, nanị ọnwa isii mgbe e mesịrị, ndụ m gbanwere n’ụzọ dị ịtụnanya. Ezumike anyị mbụ n’akụkụ osimiri fọrọ nke nta ka ọ dị oké njọ mgbe m nwere ihe ọghọm ahụ m kọwara ná mbụ. N’elu ahụ m gbakere ngwa ngwa site ná nkụja nke onye mmiri rijọọrọ, ma ihe ọghọm ahụ hapụrụ akara na-agaghị apụ apụ n’usoro akwara m.
N’ọnwa ole na ole, m gbara mgba ịnọgide n’ọrụ sekit, ma n’ikpeazụ ọ dịrị m mkpa ịlọghachi England iji gwọọ onwe m. Mgbe afọ abụọ gasịrị agbakere m n’ụzọ zuru ezu iji mee ka anyị nwee ike lachachi Spain, ebe anyị weere ọrụ sekit ọzọkwa. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ nanị maka nwa oge nta. Nne na nna nwunye m dara oké ọrịa, anyị hapụrụ ozi oge nile iji lekọta ha.
Ndụ ghọkwuru ihe siri ike mgbe, na 1968, enwere m ọrịa mkpaghasị mmetụta uche. E nwere oge ndị mụ na Rafaela chere na m agaghị agbake. O yiri nnọọ ka mmiri ọ na-eri m ọzọ, kama n’ụzọ dị iche! E wepụ ịdị na-eme ka echiche na-ezighị ezi na-anyịgbu m, ịda mbà n’obi ahụ na-anapụ m ume m nile. M nwere ọtụtụ oké ike ọgwụgwụ, nke na-amanye m izu ike ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile. N’oge ahụ ọ bụghị ụmụnna nile ghọtara ụdị nsogbu ahụ; n’ezie amaara m na Jehova ghọtara ya. Ọ bụworo m ihe na-eju afọ nke ukwuu ịgụ isiokwu ndị magburu onwe ha na magazin Ụlọ Nche na Teta! nke na-aghọta ma na-enyere ndị dara mbà n’obi aka.
N’oge ihe isi ike a nile, nwunye m nọgidere na-abụ isi iyi nke agbamume. Ịnagidekọ nsogbu dị iche iche ọnụ n’ezie wusiri ihe nkekọ nke alụmdi na nwunye anyị ike. Nne na nna Rafaela nwụrụ, mgbe afọ 12 gasịkwara, ahụ ike m dịwanyere mma ruo n’ókè nke na anyị chere na anyị pụrụ ịlọghachi n’ozi oge nile. Na 1981, n’ịbụrụ anyị ihe ịtụnanya na ihe obi ụtọ, a kpọrọ anyị òkù ọzọ ije ozi n’ọrụ sekit.
Mgbanwe ọchịchị Chineke ndị dị ukwuu ewerewo ọnọdụ na Spain kemgbe anyị nwesịrị ahụmahụ mbụ anyị n’ozi njegharị. Ime nkwusa enwekwaghị ihe mgbochi ugbu a, ya mere m ghaghị ịmara ihe ndị na-eme ugbu a. N’agbanyeghị nke ahụ, ije ozi dị ka onye nlekọta sekit otu ugbo ọzọ bụ ihe ùgwù dị ukwuu. Anyị ịbụ ndị sụrụ ụzọ n’agbanyeghị ọnọdụ ndị siri ike mere ka anyị nwee ike ịgba ndị ọsụ ụzọ na-enwe nsogbu ume. Mgbe mgbe kwa anyị na-enwe ike nyere ndị ọzọ aka isonye n’ọrụ ọsụ ụzọ.
Mgbe afọ 11 nke ọrụ njegharị na Madrid na Barcelona gasịrị, ọzọkwa ahụ ike anyị na-ada ada mere ka ọ dị mkpa ịgbanwe ọrụ anyị. E nyere anyị ọrụ dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo ukwu nke Salamanca, ebe m pụrụ ịba uru dị ka onye okenye. Ụmụnna nọ na Salamanca mere ka ahụ ruo anyị ala ozugbo. Otu afọ mgbe nke a gasịrị ọgba aghara ọzọ ga-etinye ntachi obi anyị n’ule.
N’ụzọ a na-apụghị ịkọwali Rafaela dara oké ọrịa nke ụkọ ọbara, nnyocha ndị e mekwara kpughere na o nwere ọrịa cancer eriri afọ. Ugbu a ọ dị m mkpa ịbụ onye dị ike ma nye nwunye m nkwado nile m pụrụ inye. Mmeghachi omume mbụ anyị bụ ekweghị nke ahụ, ụjọ esote ya. Rafaela ọ̀ ga-alanarị nke a? N’oge ndị dị otú a, ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ bụ ihe na-enyere anyị aka ịnọgide. Obi dị m ụtọ ikwu na afọ a wara Rafaela gara nke ọma, anyị nwere olileanya na ọrịa cancer ahụ agaghị abịaghachi.
Ọ bụ ezie na anyị enwewo ọnọdụ a latụ ihu a latụ azụ nke anyị na 36 afọ ndị anyị nọworo na Spain, ọ bụrụwo ihe obi ụtọ ibi n’oge ndị a nke ito eto ime mmụọ. Anyị ahụwo ka ìgwè nta nke ihe dị ka 800 ndị nkwusa na 1958 toruru ìgwè ndị agha nke ihe karịrị 100,000 ndị nkwusa taa. Ọtụtụ ọṅụ anyị ekpuchiwo ihe isi ike ndị anyị nwere—na-enyere ndị ọzọ aka ịnara eziokwu ma tozuo okè n’ụzọ ime mmụọ, na-arụkọ ọrụ ọnụ dị ka di na nwunye, na-enwe mmetụta na anyị ejiriwo ndụ anyị mee ihe n’ụzọ kasị mma anyị pụrụ ime.
Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Kọrint, sị: “Ebe anyị nwere ije ozi a, dị ka e meere anyị ebere, ike agwụghị anyị n’obi.” (2 Ndị Kọrint 4:1) Ileghachi anya azụ, ekwenyere m na e nwere ọtụtụ ihe ndị mere ná ndụ m nke gbochiri m inwe ike ọgwụgwụ n’obi. Ihe atụ nke ụmụnna e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwere mmasị n’ebe m nọ n’oge m na-eto eto nyere ezi ntọala. Inwe nwunye nwere ụdị ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ m nwere bụ enyemaka magburu onwe ya; mgbe m na-enwe nkụda mmụọ, Rafaela ga-agba m ume, emewokwa m otu ihe ahụ n’ebe ọ nọ. Echiche nke ịchịtụ ọchị bụkwa àgwà dị mma nke ukwuu. Inwe ike isoro ụmụnna chịa ọchị—ma chịakwa onwe anyị ọchị—na-emetụ ka nsogbu yie ihe na-adịghị anyịgbu anyịgbu karị.
Ma nke ka nke, ntachi obi n’ihu ọnwụnwa dị iche iche chọrọ ike Jehova. M na-echeta mgbe nile okwu Pọl: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.” Ná nkwado Jehova, ọ dịghị mkpa ka ike gwụ anyị n’obi ma ọlị.—Ndị Filipaị 4:13.
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Ronald na Rafaela Taylor na 1958
[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]
Izukọ ọnụ n’okpuru mmachibido iwu na Spain (1969)