Mgbanwe Ọrụ n’Afọ Ndụ nke 80
DỊ KA GWENDOLINE MATTHEWS SI KỌỌ
Mgbe m gbara afọ 80, mụ na di m kpebiri ịkwaba ihe onwunwe anyị nile na pikọp a gbazitere agbazite ma si England kwaga Spain. Anyị amaghị asụ Spanish, anyị na-agakwa ndịda ọdịda anyanwụ Spain, ebe dị anya site n’ebe ndị na-eme njem nleta na-asụ Bekee na-agakarị. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị enyi anyị chere na isi adịghị anyị mma, ma eji m ihu ọchị chetara onwe m na Abraham dị afọ 75 mgbe ọ hapụrụ Ua.
DỊ KA ihe si na ya pụta, afọ ndị anyị nọrọ na Spain kemgbe anyị rutere ebe a n’April 1992 abụrụwo ndị kasị enye afọ ojuju ná ndụ anyị. Ma tupu mụ akọwaa ihe mere anyị ji kwapụ, ka m kọọrọ unu otú ogologo ndụ anyị n’ozi Jehova si duga anyị n’ime mkpebi ahụ dị ukwuu.
Eziokwu Bible Agbanwee Ndụ Anyị
A zụlitere m n’ezinụlọ ji okpukpe kpọrọ ihe na ndịda ọdịda anyanwụ London, England. Mama m na-akpọkarị mụ na nwanne m nwanyị aga ebe ofufe dị iche iche ka ọ nọgidere na-achọ afọ ojuju ime mmụọ. Papa m, onye ọrịa ụkwara nta na-ekweghị ahapụ ahapụ, esonyereghị anyị. Ma ọ bụ onye na-eji ịnụ ọkụ n’obi agụ Bible, ọ na-akakwa ya akara n’okpuru mgbe ọ bụla ọ hụrụ akụkụ nyere ya nghọta. Otu n’ime ihe onwunwe kasị dị oké ọnụ ahịa m nwere bụ Bible ahụ kara nnọọ nká o ji kpọrọ ihe nke ukwuu.
Na 1925, mgbe m dị afọ 14, a fanyere otu traktị n’okpuru ọnụ ụzọ anyị bụ́ nke kpọrọ anyị òkù maka okwu ihu ọha n’ụlọ ezumezu obodo dị na West Ham. Mama m na otu onye agbata obi kpebiri ịga nụrụ okwu ahụ, mụ na nwanne m nwanyị sonyekwaara ha. Okwu ahụ, bụ́ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị,” kụnyere mkpụrụ eziokwu Bible n’obi mama m.
Ka ọnwa ole na ole gasịrị, papa m nwụrụ n’afọ ndụ nke 38. Ọnwụ ya bụ oké ihe otiti, ebe o wetaara anyị obi mgbawa tinyere ịda ogbenye. N’ụka ncheta ọnwụ ya a kara na Chọọchị England dị n’ebe ahụ, ọ wụrụ mama m akpata oyi n’ahụ ịnụ ka onye ụkọchukwu kwuru na mkpụrụ obi papa m nọ n’eluigwe. Ọ maara site na Bible na ndị nwụrụ anwụ na-ehi ụra n’ili, o kwenyesikwara ike na otu ụbọchị a ga-akpọlite papa m n’ọnwụ gaa ná ndụ ebighị ebi n’elu ala. (Abụ Ọma 37:9-11, 29; 146:3, 4; Eklisiastis 9:5; Ọrụ 24:15; Mkpughe 21:3, 4) N’ịbụ onye e mere ka o kweta na ọ ghaghị isonyere ndị na-akụzi Okwu Chineke, o kpebiri ịzụlite ọbụbụenyi ya na Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ.
Ebe anyị na-enweghị ego ime njem, kwa izu anyị na-eje ije hour abụọ site n’ụlọ anyị gaa ná nzukọ Ndịàmà Jehova. E mesịa, anyị ga-eje ije hour abụọ ọzọ ịlaghachi. Ma anyị jiri nzukọ ndị ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu, ọ dịghị mgbe otu kwara anyị, ọbụna mgbe oké aluluu London kpuchiri obodo ukwu ahụ. N’oge na-adịghị anya mama m kpebiri ịrara ndụ ya nye Jehova, ka e meekwa ya baptism, na 1927 kwa, e mekwara m baptism.
N’agbanyeghị ihe isi ike akụ̀ na ụba anyị nwere, mama m kụziiri m mgbe nile ịdị mkpa nke ibute ihe ime mmụọ ụzọ. Matiu 6:33 bụ otu n’ime akụkụ akwụkwọ nsọ na-amasịkarị ya, n’ezie o ‘bukwara ụzọ chọọ alaeze Chineke.’ Mgbe ọ nwụchuru ọnwụ n’ihi ọrịa cancer na 1935, ọ nọ na-eme atụmatụ ịza òkù maka ndị ozi oge nile ndị pụrụ ịkwaga France iji jee ozi.
Ihe Nlereanya Ndị Wusiri Anyị Ike
N’afọ ndị mbụ ahụ, ụfọdụ ndị bịara nzukọ na London chọrọ ịkpọsa echiche nke ha, ndị a kpatakwara esemokwu na okwu iwe. Ma, mama m na-ekwu mgbe nile na ọ ga-abụ eguzosighị ike n’ihe ịgbahapụ nzukọ Jehova mgbe anyị mụtasịworo ihe a nile site na ya. Nleta nke Joseph F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society mgbe ahụ, kpaliri anyị ịnọgide na-eje ozi n’iguzosi ike n’ihe.
M na-echeta Nwanna Rutherford dị ka nwoke nwere obiọma, a pụrụ ijekwuru. Mgbe m ka nọ n’afọ iri na ụma, Ọgbakọ London mere mkpapụ bụ́ nke ọ nọ na ya. Ọ hụrụ m—onye nọ n’afọ iri na ụma na-emetụ ihere—ka m ji kamera ma jụọ ma m ga-achọ ise ya foto. Foto ahụ ghọrọ ihe ncheta m ji kpọrọ ihe.
E mesịa, otu ahụmahụ mere ka m ghọta ọdịiche dị n’etiti ndị na-edu ndú n’ọgbakọ ndị Kraịst na ndị ikom a ma ama n’ụwa. M na-arụ ọrụ dị ka onye na-eke nri n’otu ụlọ ukwu dị na London bụ́ ebe a kpọrọ Franz von Papen, bụ́ otu n’ime ndị ozi Hitler, òkù ịbịa rie nri ehihie. Ọ jụrụ iyipụ mma agha ya mgbe ọ na-eri nri, ekotakwara m ya ụkwụ wee wụfuo ofe m bu. O ji iwe kwuo na ọ bụrụ na Germany, elezighị anya dị otú ahụ ga-eduje n’ịgbagbu m. N’oge nile fọdụrụnụ nke iri nri ahụ, e zeere m ya!
E nwere mgbakọ dị mkpa, bụ́ ebe m gere okwu Nwanna Rutherford, n’Alexandra Palace na 1931. N’ebe ahụ ka anyị ji ịnụ ọkụ n’obi nakwere aha ọhụrụ anyị, bụ́ Ndịàmà Jehova. (Aịsaịa 43:10, 12) Mgbe afọ abụọ gasịrị, na 1933, abanyere m n’ozi ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ozi oge nile. Ngọzi ọzọ m na-echeta site n’afọ ndị ahụ bụ nke inwe ike isonyere ụmụ okorobịa ọma ndị mesịrị ghọọ ndị ozi ala ọzọ n’akụkụ ụwa ndị dị anya. Ndị a gụnyere Claude Goodman, Harold King, John Cooke, na Edwin Skinner. Ihe nlereanya ndị dị otú ahụ nke ikwesị ntụkwasị obi mere ka m chọọ ije ozi ná mba ọzọ.
Ịsụ Ụzọ na East Anglia
Ebe e kenyere m ịsụ ụzọ bụ na East Anglia (ebe ọwụwa anyanwụ England), ime nkwusa n’ebe ahụ chọkwara ịnụ ọkụ n’obi. Iji jezuo ókèala anyị buru ibu, anyị ji ịnyịnya ígwè gaa site n’obodo ruo n’obodo, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta, birikwa n’ọnụ ụlọ ndị a na-akwụ ụgwọ ha. O siri ike inweta ọgbakọ ọ bụla n’ógbè ahụ, ya mere mụ na onye òtù m na-atụlekọ akụkụ dị iche iche nke nzukọ kwa izu a na-enwechi anya. N’ozi anyị, anyị nyefere ọtụtụ narị akwụkwọ ukwu na akwụkwọ nta ndị kọwara nzube Chineke.
Otu nleta kwesịrị ncheta bụ mgbe anyị gara n’ụlọ onye ụkọchukwu bụ́ ebe anyị na osote ụkọchukwu nke Chọọchị England kwurịtara okwu. N’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ógbè, anyị yigharịrị ije leta osote ụkọchukwu Anglikan ahụ gaa na nke ikpeazụ n’ihi na ọtụtụ mgbe o mere ka ihe siere anyị ike mgbe ọ matara na anyị na-ekwusa ozi ọma n’ógbè ahụ. Ma onye ọ bụla n’obodo nta a na-ekwu okwu ọma banyere osote ụkọchukwu a. Ọ na-eleta ndị ọrịa, ọ na-agbazinye ndị ịgụ akwụkwọ na-amasị akwụkwọ, ọbụnakwa na-eleta ndị parish ya iji kọwaara ha Bible.
Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, mgbe anyị letara ya, o nwere nnọọ omume enyi, ọ natakwara ọtụtụ akwụkwọ. O mesikwara anyị obi ike na ọ bụrụ na onye ọ bụla n’obodo nta ahụ chọrọ ụfọdụ akwụkwọ anyị ma ọ pụghị ịzụtali ha, na ya ga-akwụ ụgwọ ha. Anyị nụrụ na ahụmahụ dị njọ o nwere n’Agha Ụwa Mbụ emewo ka o kpebie ịkwalite udo na ịdị mma na parish ya. Tupu anyị ahapụ ya, ọ gọziri anyị ma gbaa anyị ume ịnọgide n’ọrụ ọma anyị. Okwu gaa nke ọma ọ gwara anyị bụ ndị dị n’Ọnụ Ọgụgụ 6:24: “Onyenwe anyị gọzie unu, chebekwa unu.”—King James Version.
Mama m nwụrụ ka afọ abụọ m malitere ịsụ ụzọ gasịrị, alaghachikwara m London n’enweghị ego na ezinụlọ. Ezi Onyeàmà si Scotland kpọọrọ m, nyere m aka ịnagide ọnwụ mama m, gbaakwa m ume ịnọgide n’ozi oge nile. Ya mere mụ na Julia Fairfax, onye ọhụrụ mụ na ya na-asụkọ ụzọ laghachiri East Anglia. Anyị rụziri otu ụlọ ochie ụgbọala na-adọkpụ ịghọ ntakịrị ebe obibi a na-ebugharị ebugharị; anyị ji traktọ ma ọ bụ pikọp na-adọkpụgharị ya. Anyị na di na nwunye meworo okenye karị, bụ́ Albert na Ethel Abbott, ndị nwekwara otu obere ụlọ ụgbọala na-adọkpụ, nọgidere na-eme nkwusa. Albert na Ethel dịịrị m ka nne na nna.
Ka m na-asụ ụzọ na Cambridgeshire, ezutere m John Matthews, ọmarịcha onye Kraịst nwapụtawororị iguzosi ike n’ezi ihe ya nye Jehova n’okpuru ọnọdụ ndị tara akpụ. Anyị lụrụ na 1940, n’oge na-adịghị anya Agha Ụwa nke Abụọ malitere.
Oge Agha na Ezinụlọ
Mgbe anyị lụrụ di na nwunye ọhụrụ, ụlọ anyị bụ obere ụlọ ụgbọala na-adọkpụ nke hà ka ntakịrị kichin, anyị jiri ọgba tum tum anyị a pụrụ ịtụkwasị obi jee ozi. Otu afọ anyị lụsịrị, a mara John ikpe ịga rụọ ọrụ n’ugbo n’ihi nkweta ya ndị dabeere na Bible, ọ jụrụ ije ozi agha. (Aịsaịa 2:4) Ọ bụ ezie na nke a pụtara njedebe nke ịsụ ụzọ anyị, ikpe a mara John nwapụtara ịbụ ihe Chineke duziri ebe m dị ime, ọ ga-enwekwa ike ịkwado anyị.
N’afọ ndị ahụ a na-alụ agha, anyị ritere uru ná nzukọ ndị pụrụ iche e nwere n’agbanyeghị ihe isi ike ndị dịnụ. Na 1941 ọgba tum tum anyị buuru mụ na John, ebe m dị ime nwa mbụ anyị, gaa Manchester, nke dị kilomita 300 site n’ebe ahụ. N’ụzọ, anyị gafere ọtụtụ obodo bọmbụ tụkasịrị, anyị chere ma a pụrụ inwe nzukọ ahụ n’okpuru ọnọdụ ndị dị otú ahụ. E nwere ya. Ndịàmà si akụkụ dị iche iche nke England jupụtara na The Free Trade Hall dị n’etiti Manchester, e mechakwara usoro ihe omume ahụ nile.
Ná mmechi nke okwu ya, ọkà okwu ikpeazụ nke mgbakọ ahụ gwara ndị bịaranụ na ha kwesịrị ịhapụ ebe ahụ ozugbo, ebe a na-atụ anya na a ga-eji ụgbọelu tụọ bọmbụ ebe ahụ. Ịdọ aka ná ntị ahụ bịara n’ezi oge. Anyị agamibeghị site n’ụlọ ezumezu ahụ mgbe anyị nụrụ ụda opi siren na égbè e ji agbatu ụgbọelu. N’ileghachi anya azụ, anyị hụrụ ọtụtụ ụgbọelu ka ha na-atụdata bọmbụ n’etiti obodo ukwu ahụ. N’ebe dị anya, n’etiti ọkụ na anwụrụ ọkụ, anyị pụrụ ịhụ ụlọ ezumezu anyị nọrọ n’oge na-adịghị anya; e bibiri ya kpam kpam! Dị ka ihe obi ụtọ, ọ dịghị otu n’ime ụmụnna nwoke ma ọ bụ ụmụnna nwanyị ndị Kraịst anyị e gburu.
Ka anyị na-azụlite ụmụ anyị, anyị enweghị ike ịsụ ụzọ, ma anyị kpọbatara ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị ọsụ ụzọ ndị na-enweghị ebe obibi n’ụlọ anyị. N’otu oge, ndị ọsụ ụzọ isii biri n’ụlọ anyị ruo ọnwa ole na ole. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na iso ndị dị otú ahụ kpakọrịta bụ ihe mere nwa anyị nwanyị bụ́ Eunice ji họrọ ịmalite ịsụ ụzọ na 1961 mgbe ọ dị nanị afọ 15. Ọ dị mwute ikwu na nwa anyị nwoke bụ́ David anọgideghị na-ejere Jehova ozi mgbe o tolitere, nwa anyị nwanyị nke ọzọ, bụ́ Linda, nwụkwara n’ọdachi n’oge agha.
Mkpebi Anyị Ịkwaga Spain
Ihe nlereanya na agbamume mama m akpasuwo n’ime m ọchịchọ ịbụ onye ozi ala ọzọ, echefuchabeghịkwa m ihe mgbaru ọsọ ahụ. N’ihi ya, ọ masịrị anyị mgbe, na 1973, Eunice hapụrụ England gawa Spain ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. N’ezie, o wutere anyị ịhụ ya ka ọ na-ahapụ, ma obi dịkwa anyị ụtọ na ọ chọrọ ije ozi n’ala ọzọ.
Anyị eletawo Eunice n’afọ ndị gafeworonụ, anyị bịakwara mara Spain nke ọma. N’eziokwu, mụ na John letara ya n’anọ n’ime ebe dị iche iche e kenyerela ya ọrụ. Ka ọtụtụ afọ na-agafezi, ike anyị malitere ịdalata. John dara ada metụtara ahụ ike ya nke ọjọọ, enwekwara m nsogbu obi na nke olu. E wezụga ndị ahụ, anyị abụọ na-arịa arthritis. Ọ bụ ezie na enyemaka Eunice dịsiri anyị mkpa ike, anyị achọghị ka ọ hapụ ọrụ e kenyere ya n’ihi anyị.
Anyị na Eunice kwurịtara nhọrọ ndị anyị nwere, anyị kpekwara ekpere maka nduzi. Ọ dị njikere ịlọta ụlọ inyere anyị aka, ma anyị kpebiri na ngwọta kasị mma ga-abụ mụ na John ibinyere ya na Spain. Ọ bụrụ na mụ apụghị ịbụ onye ozi ala ọzọ n’onwe m, ma ọ dịghị ihe ọzọ apụrụ m ịkwado nwa m nwanyị na ndị ọsụ ụzọ ibe ya abụọ n’ozi oge nile. Mgbe ahụ, mụ na John weere Nuria na Ana, ndị ọsụ ụzọ abụọ ha na Eunice sụkọworo ụzọ ruo ihe dị ka afọ 15, ịbụ ụmụ anyị nwanyị. Ha nwekwara obi ụtọ anyị ịbịa binyere ha n’ebe ọ bụla a pụrụ ikenye ha ọrụ.
Ihe karịrị afọ isii agafeela kemgbe anyị mere mkpebi ahụ. Ahụ ike anyị akabeghị njọ, ndụ anyị aghọwokwa n’ezie nke na-akpali akpali karị. Enwebeghịkwa m ike ịsụ Spanish nke ukwuu, ma nke ahụ adịghị egbochi m ime nkwusa. Mụ na John nwekwara ntụsara ahụ n’obere ọgbakọ anyị dị na Extremadura, na ndịda ọdịda anyanwụ Spain.
Ibi na Spain akụziworo m ọtụtụ ihe banyere ọdịdị zuru ụwa ọnụ nke ọrụ nkwusa Alaeze anyị, ugbu a kwa m na-aghọta n’ụzọ doro anya karị, otú o si bụrụ na, dị ka Jisọs Kraịst kwuru, “ubi ahụ bụ ụwa.”—Matiu 13:38.
[Foto ndị dị na peeji nke 28]
Ịsụ ụzọ n’afọ ndị 1930