Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 4/15 p. 2-6
  • À Pụrụ Inweta Eziokwu Okpukpe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Pụrụ Inweta Eziokwu Okpukpe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nkà Ihe Ọmụma Ụwa na Eziokwu
  • È Nwere Mkpa Inwe Mkpughe nke Eziokwu?
  • Okpukpe na Eziokwu Ahụ
  • ‘Ọka na Ata Ndị Ahụ’
  • Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Chọọ Eziokwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Iṅomi Chineke Nke Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • ‘Eziokwu ahụ Ga-eme Ka Unu Pụọ n’Ohu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 4/15 p. 2-6

À Pụrụ Inweta Eziokwu Okpukpe?

NA Sweden otu nwoke nwere oké ọchịchọ ịmata ihe ime mmụọ n’obodo Uppsala mahadum dị na ya kpebiri ịmụ banyere nkwenkwe nke okpukpe dị iche iche dị n’obodo ya, ọbụna na-eleta ebe ofufe ha dị iche iche. O gere ntị ka ndị ndú ha na-ekwu okwuchukwu, ọ gbakwara ụfọdụ ndị òtù ha ajụjụ ọnụ. Ọ chọpụtara na nanị Ndịàmà Jehova yiri ka obi ò siri ha ike na ha “achọtawo eziokwu ahụ.” N’iburu n’uche ọtụtụ echiche okpukpe dị iche iche dịnụ, o juru ya anya ihe mere ha pụrụ iji mee nzọrọ dị otú ahụ.

Ị̀ na-eche n’onwe gị na ọ pụrụ ikwe mee inweta eziokwu banyere okpukpe? Ọ̀ gadị ekwe omume ikpebi ihe a pụrụ ịkpọ eziokwu bụ isi?

Nkà Ihe Ọmụma Ụwa na Eziokwu

Ndị mụworo nkà ihe ọmụma ụwa ewelitewo echiche nke na eziokwu bụ isi adịghị ebe aka mmadụ pụrụ iru ya. Ị pụrụ ịma na a kọwawo nkà ihe ọmụma ụwa dị ka “sayensị nke na-agbalị ịkọwa mmalite nke ịdị adị na ndụ.” Ma, n’ikwu eziokwu, o siiri ya ike ime otú ahụ. N’akwụkwọ bụ́ Filosofins Historia (Akụkọ Ihe Mere Eme nke Nkà Ihe Ọmụma Ụwa), onye Sweden na-ede akwụkwọ bụ́ Alf Ahlberg dere, sị: “Ọtụtụ ajụjụ nkà ihe ọmụma ụwa dị n’ụdị nke na a pụghị inye ha azịza ọ bụla kpọmkwem. . . . Ọtụtụ ndị na-enwe echiche nke na nsogbu nile karịrị ike mmadụ [ndị metụtara ụkpụrụ ndị mbụ nke ihe nile] nọ . . . n’ìgwè a.”

Ya mere, ndị siworo ná nkà ihe ọmụma ụwa gbalịa ịchọta azịza nye ajụjụ ndị dị mkpa ná ndụ ọtụtụ mgbe emesịwo ghara inwe afọ ojuju ma ọ bụ nwee obi mgbu. N’akwụkwọ ya bụ́ Tankelinjer och trosformer (Usoro nke Echiche na Okwukwe Okpukpe), onye Sweden na-ede akwụkwọ bụ́ Gunnar Aspelin sịrị: “Otu ihe anyị na-ahụ bụ na usoro okike enwekwaghị mmasị ná mmadụ karịa ka o nwere n’urukurubụba na anwụnta . . . Anyị enweghị ike ma ọlị n’ọdịdị nke ikike ndị na-akpa ike ha ná mbara ụwa na n’ime ime ụwa anyị. Nke a bụ ụzọ ile ndụ anya nke pụtaworo nnọọ ọtụtụ mgbe n’akwụkwọ ọgụgụ na nso ngwụsị nke narị afọ mgbe ụmụ mmadụ tinyeworo okwukwe ha n’ọganihu ma rọọ nrọ maka ọdịnihu ka mma.”

È Nwere Mkpa Inwe Mkpughe nke Eziokwu?

O doro anya na mgbalị nile nke mmadụ nanị agabeghị nke ọma n’ịchọta eziokwu banyere ndụ, o yikwara ka ha agaghị anwa anwa chọta ya. Mgbe ahụ, e nwere ezi ihe mere a ga-eji kwubie na ụdị ụfọdụ nke mkpughe Chineke dị mkpa. Ihe ọtụtụ ndị na-akpọ akwụkwọ nke okike na-enye mkpughe ụfọdụ. Ọbụna ma ọ bụrụ na o nyeghị nkọwa zuru ezu banyere mmalite nke ndụ, ọ na-egosi na e nwere ihe na-enye afọ ojuju karịa nanị nkọwa a na-ahụ anya maka ndụ. Otu ibe ahịhịa nke na-etoli elu n’ezie na-agbaso iwu ndị dị iche site ná ndị na-achịkwa ikpo nkume n’olulu na-adakpọ adakpọ. Ihe ndị e kere eke nwere ndụ na-ewulite ma na-ahazi onwe ha n’ụzọ ihe ndị na-enweghị ndụ na-adịghị eme. Otu onye mmụta a ma ama nke iwu na okpukpe ji n’ihi nke a nwee ihe ndabere maka ikwubi: “Ihe [Chineke] anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke.”—Ndị Rom 1:20.

Ma iji chọpụta onye kpatara owuwu na nhazi a nile, mkpughe ọzọ dị anyị mkpa. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụ anya na mkpughe dị otú ahụ ga-adị? Ọ́ gaghị abụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na Onye ọ bụ ya wetara ndụ n’elu ụwa ga-ekpughere ihe ndị o kere onwe ya?

Bible na-azọrọ ịbụ mkpughe dị otú ahụ. Ọtụtụ mgbe na magazin a, anyị ewepụtawo ezi ihe ndị mere a ga-eji nakwere nzọrọ nke a, ọtụtụ ndị na-eche echiche anakwerewokwa ya. Na ọ dị ndị ikom dere Bible ọkụ n’obi ime ka o doo anya na ihe ha na-ede esiteghị n’uche ha bụ n’onwe ya ihe dị nnọọ ịrịba ama. Ihe karịrị 300 ugboro, anyị na-ahụ ka ndị amụma Bible na-eji okwu ndị dị ka, “Otú a ka Jehova sịrị,” eme ihe. (Aịsaịa 37:33; Jeremaịa 2:2; Nehum 1:12) Ọ ghaghị ịbụ na ị maara na ndị ikom na ndị inyom na-ede akwụkwọ ma ọ bụ isiokwu na-anụkarị ọkụ n’obi idenye aha ha n’ihe ha dere. Ma, ndị dere Bible debere onwe ha n’ọnọdụ nke apụtaghị ìhè; n’ọnọdụ ụfọdụ o siri ike ikpebi onye dere akụkụ ụfọdụ nke Bible.

Akụkụ ọzọ nke Bible nke ị pụrụ ịhụ dị ka ihe dị ịrịba ama bụ nkwekọ nke ihe ndị dị n’ime ya. Nke a dị nnọọ ịrịba ama, n’iburu n’uche na e dere 66 akwụkwọ nke Bible n’ime ogologo oge karịrị 1,600 afọ. Ka e were ya na ị gara n’ọbá akwụkwọ ọha na eze ma họrọ 66 akwụkwọ okpukpe e deworo n’ime ogologo oge karịrị narị afọ 16. I wee chịkọta akwụkwọ ndị ahụ ọnụ n’otu mpịakọta. Ị̀ ga-atụ anya na mpịakọta ahụ ga-enwe otu isiokwu na ozi na-ekwekọ ekwekọ? Ọ dịghị ma ọlị. Nke ahụ ga-achọ ọrụ ebube. Tụlee nke a: Akwụkwọ nile nke Bible nwere otu isiokwu dị otú ahụ, ha na-akwadorịtakwa onwe ha. Nke a na-egosi na a ghaghị inwe otu onye nduzi, ma ọ bụ isi iyi, onye duziri ihe ndị dere Bible dekọrọ.

Otú ọ dị, ị ga-achọta otu ihe na-anwapụta isite n’aka Chineke nke Bible karịa ihe ọ bụla ọzọ. Amụma—ihe ọmụma e dere tupu oge ya banyere ihe na-aghaghị iwere ọnọdụ n’ọdịnihu. Okwu ndị dị ka, “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ” na, “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a” dịịrị nanị Bible. (Aịsaịa 2:2; 11:10, 11; 23:15; Ezikiel 38:18; Hosea 2:21-23; Zekaraịa 13:2-4) Ọtụtụ narị afọ tupu Jisọs Kraịst abịa n’elu ụwa, amụma dị iche iche n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nyere nkọwa banyere ndụ ya—malite n’ọmụmụ ya ruo n’ọnwụ ya. Ọ dịghị nkwubi okwu ọzọ ezi uche dị na ya a pụrụ iru e wezụga na Bible bụ isi iyi nke eziokwu banyere ndụ. Jisọs n’onwe ya mesiri nke a ike n’okwu ndị a: “Okwu gị bụ eziokwu.”—Jọn 17:17.

Okpukpe na Eziokwu Ahụ

Ọbụna ọtụtụ ndị na-ekwu na ha kwere na Bible kwere na a pụghị inweta eziokwu bụ isi. Ụkọchukwu John S. Spong bụ́ onye United States kwuru, sị: “Anyị aghaghị . . . ịghara iche na anyị nwere eziokwu, na ndị ọzọ aghaghịkwa ịhụ ihe n’ụzọ ahụ anyị si ele ihe anya, wee jee n’ịmara na eziokwu bụ isi bụ ihe anyị nile na-apụghị inweta.” Otu onye Roman Katọlik na-ede akwụkwọ, bụ́ Christopher Derrick, na-ekwu otu ihe kpatara echiche dị otú ahụ na-ezighị ezi banyere ịchọta eziokwu: “Nhota ọ bụla nke ‘eziokwu’ okpukpe gụnyere ụdị ụfọdụ nke nzọrọ ịmara ihe . . . Ị na-enye echiche nke na onye ọ bụla ọzọ nwere ike ghara izi ezi; a gaghịkwa ekwere nke ahụ ma ọlị.”

Otú ọ dị, dị ka onye na-eche echiche, ị ga-eme nke ọma ịtụle ajụjụ ụfọdụ metụtara ya. Ọ bụrụ na a pụghị inweta eziokwu, n’ihi gịnị ka Jisọs Kraịst ga-eji kwuo, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu”? N’ihi gịnịkwa ka otu n’ime ndị ozi Jisọs ga-eji kwuo na uche Chineke bụ ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu”? N’ihi gịnị ka okwu ahụ bụ “eziokwu” ji pụta ihe karịrị otu narị ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’ihe banyere okwukwe? Ee, n’ihi gịnị, ma ọ bụrụ na a pụghị inweta eziokwu?—Jọn 8:32; 1 Timoti 2:3, 4.

N’ezie, Jisọs egosipụtaghị nanị na a pụrụ inweta eziokwu kama o gosiri na ịchọta ya bụ ihe a chọrọ n’aka anyị ma ọ bụrụ na Chineke ga-anakwere ofufe anyị. Mgbe otu nwanyị Sameria nwere ijuanya banyere ụdị bụ ezie nke ofufe—ofufe nke ndị Juu na-efe na Jerusalem ka ọ bụ nke ndị Sameria na-efe n’Ugwu Geraịzim—Jisọs azaghị site n’ikwu na a pụghị inweta eziokwu. Kama nke ahụ, ọ sịrị: “Ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye Ya. Chineke bụ Mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye Ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.”—Jọn 4:23, 24.

Ọtụtụ ndị na-azọrọ, ‘A pụrụ ịkọwa Bible n’ụzọ dị iche iche, ya mere ọ pụghị ikwe mmadụ omume ijide n’aka ihe eziokwu bụ.’ Ma è dere Bible n’ezie n’ụzọ dị inyoghị inyoghị otú ahụ nke na ị pụghị ijide n’aka ụzọ a ga-esi ghọta ya? Ọ bụ eziokwu na amụma na okwu ihe atụ ụfọdụ pụrụ isi ike nghọta. Dị ka ihe atụ, Chineke gwara Daniel onye amụma na akwụkwọ ya, nke nwere ọtụtụ okwu amụma, bụ nke a na-agaghị aghọtacha ruo “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a.” (Daniel 12:9) O dokwara anya na ọ dị mkpa ịkọwa ilu na ihe atụ ụfọdụ akọwa.

Ma, o doro anya na banyere nkụzi ndị bụ isi nke ndị Kraịst na ụkpụrụ omume ndị dị mkpa n’ife Chineke ofufe n’eziokwu, Bible na-edo nnọọ anya. Ọ dịghị enye ohere ọ bụla maka nkọwa ndị na-emegiderịta onwe ha. N’akwụkwọ ozi e degaara ndị Efesọs, e kwuru banyere okwukwe ndị Kraịst dị ka nke dị “otu,” na-egosi na a gajeghị inwe okwukwe dị iche iche. (Ndị Efesọs 4:4-6) Ma eleghị anya ị pụrụ ịjụ sị, ‘Ọ bụrụ na a pụghị izi ezi n’ịkọwa Bible n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche, n’ihi gịnị ka e ji nwee ọtụtụ òtù okpukpe dị iche iche nke “ndị Kraịst”?’ Anyị na-achọta azịza ya ma anyị leghachi anya azụ n’oge sochiri nnọọ mgbe ndị ozi Jisọs nwụsịworo, ndapụ n’ezi okwukwe nke ndị Kraịst amalitekwa.

‘Ọka na Ata Ndị Ahụ’

Jisọs buru amụma ndapụ n’ezi ofufe a n’ilu ya nke ọka na ata. Jisọs n’onwe ya kọwara na “ọka” ahụ nọchitere anya ezi ndị Kraịst; “ata” ahụ nọchitere anya ndị Kraịst ụgha, ma ọ bụ ndị dapụrụ n’ezi ofufe. “Mgbe mmadụ na-ehi ụra,” ka Jisọs sịrị, “onye iro” ga-agha ata n’ugbo ọka ahụ. Ọghịgha mkpụrụ nke a malitere mgbe ndị ozi dasịrị n’ụra ọnwụ. Ilu ahụ na-egosi na ngwagbu nke a nke ezi ndị Kraịst na ndị nke ụgha ga-aga n’ihu ruo “n’ọgwụgwụ oge a.” N’ihi ya, n’ime ọtụtụ narị afọ ndị na-agafenụ, akara e ji amata ezi ndị Kraịst agbawo ọchịchịrị n’ihi na ndị bụ ndị Kraịst nanị n’ọnụ ejupụtawo n’ubi okpukpe. Otú ọ dị, “n’ọgwụgwụ oge a,” a ga-enwe mgbanwe. “Nwa nke mmadụ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi Ya” ikewapụ ndị Kraịst ụgha n’ebe ezi ndị Kraịst nọ. Nke a pụtara na ọ ga-adị mfe mgbe ahụ ịmata ọgbakọ ndị Kraịst, ọ na-enwe ọnọdụ o nwere n’oge ndị ozi.—Matiu 13:24-30, 36-43.

Ma amụma Aịsaịa ma ndị nke Maịka kwuchara banyere nchịkọtaghachi dị otú ahụ nke ezi ndị ofufe “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” Aịsaịa sịrị: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ya elu karịa ugwu nta nile; mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri. Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruo ụlọ Chineke nke Jekọb; Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.” Ile anya n’ụzọ doro edo n’ihe ndị na-emenụ na-egosi na a na-emezu amụma Aịsaịa n’oge anyị.—Aịsaịa 2:2, 3; Maịka 4:1-3.

Otú ọ dị, uto nke ọgbakọ ndị Kraịst adịghị ewere ọnọdụ site ná mgbalị ụmụ mmadụ. Jisọs buru amụma na ya “ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya” ịga rụọ ọrụ nchịkọbata. O gosikwara nzube pụrụ nnọọ iche maka ya: “Mgbe ahụ ka ndị ezi omume ga-enwupụ dị ka anyanwụ n’alaeze nke Nna ha.” (Matiu 13:43) Nke a na-egosi na ọgbakọ ndị Kraịst gaje ịrụ ọrụ inye nghọta, ma ọ bụ ọrụ nkụzi zuru ụwa ọnụ.

Ndịàmà Jehova na-ahụ mmezu nke amụma ndị a n’ọrụ nkụzi ha na-arụ n’ime 232 ala taa. Site n’iji Bible tụlee nkwenkwe, ụkpụrụ omume, na nzukọ nke Ndịàmà, ndị na-enweghị obi abụọ pụrụ ịhụ n’ụzọ doro anya na ndị a kwekọrọ ná ndị nke ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ. Ndịàmà na-ekwu banyere okwukwe ha dị ka “eziokwu ahụ” ma ọ bụghị site na nganga ọ bụla nke ha ịbụ ndị ka ndị ọzọ. Kama nke ahụ, ha na-eme otú ahụ n’ihi na ha amụwo Okwu Chineke, bụ́ Bible, n’ụzọ sara mbara, na-agbasokwa ya dị ka ụkpụrụ e nwere nanị ya a pụrụ iji tụọ okpukpe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

Ndị Kraịst oge mbụ zoro aka n’okwukwe ha dị ka “eziokwu ahụ.” (1 Timoti 3:15; 2 Pita 2:2; 2 Jọn 1) Ihe bụụrụ ha eziokwu aghaghịkwa ịbụrụ anyị eziokwu taa. Ndịàmà Jehova na-akpọ mmadụ nile òkù ịnwapụtara onwe ha nke ahụ site n’ịmụ Bible. Anyị nwere olileanya na site n’ime otú ahụ ị ga-enwekwa ahụmahụ nke ọṅụ na-abịa ọ bụghị nanị site n’ịchọta okpukpe nke ka ndị ọzọ mma kamakwa site n’ịchọta eziokwu ahụ!

[Igbe dị na peeji nke 5]

NKÀ IHE ỌMỤMA ỤWA ỤFỌDỤ MEGIDE EZIOKWU

OZIZI POSITIVISM: Ụzọ ile ihe anya nke na echiche nile yiri nke okpukpe bụ ihe nzuzu a na-apụghị ịnwapụta anwapụta nakwa na isi ihe dị ná nkà ihe ọmụma ụwa bụ ijikọta sayensị ndị nwere ihe nnwapụta ịghọ otu ùkwù ihe.

OZIZI EXISTENTIALISM: Ihe ụjọ nile mere n’Agha Ụwa nke Abụọ nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ ndị na-akwado ya, n’ihi ya kwa ha bịara nwee echiche enweghị olileanya n’ile ndụ anya. Ọ na-emesi ike inyocha nhụsianya mmadụ n’ihu ọnwụ na ịtọgbọ chakoo nke ndụ. Onye na-ede akwụkwọ banyere ozizi existentialism bụ́ Jean-Paul Sartre na-asị na ebe a na-enweghị Chineke, a gbahapụrụ mmadụ, ọ na-adịkwa adị ná mbara ụwa nke na-achọghị ịma ma ọlị.

OZIZI SKEPTICISM: Na-ekwu na ọ bụ ihe a na-apụghị ime eme site ná nchọpụta na iche echiche irute ihe ọmụma dị irè, nke metụtara ihe nile—eziokwu ọ bụla—banyere ịdị adị.

OZIZI PRAGMATISM: Na-atụ abamuru bụ́ ezie nke nkweta anyị nile n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nanị site ná mmetụta dị irè ha nwere n’ọdịmma mmadụ, dị ka n’ịkpụzigharị agụmakwụkwọ, omume, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ dịghị atụle eziokwu dị ka ihe bara uru n’onwe ya.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

Peji nke 3: Nke abụọ site n’aka ekpe: Site n’ikike The British Museum; Aka nri: Sung Kyun Kwan University, Seoul, Korea

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya