Nakwere Bible n’Ihi Ihe Ọ Bụ n’Ezie
“Anyị onwe anyị na-ekelekwa Chineke n’ewepụghị aka, na, mgbe unu natara okwu nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, bụ́ okwu nke Chineke, ọ bụghị okwu mmadụ ka unu naara nke ọma, kama, otú ọ dị n’eziokwu, ọ bụ okwu Chineke, nke na-arụsikwa ọrụ ike n’ime unu ndị kwere ekwe.”—1 NDỊ TESALỌNAỊKA 2:13.
1. Ụdị ihe ọmụma dị aṅaa dị n’ime Bible mere akwụkwọ ahụ ihe pụrụ iche n’ezie?
BIBLE Nsọ bụ akwụkwọ a kasị sụgharịa ma na-ekesa ebe nile n’ụwa. A na-anakwere ya ngwa ngwa dị ka otu n’ime oké akwụkwọ ndị e detụworo. Otú ọ dị, nke ka mkpa, Bible na-enye nduzi nke dị ndị nke agbụrụ ọ bụla na mba ọ bụla mkpa ngwa ngwa n’agbanyeghị ọrụ ma ọ bụ ọkwá ha ná ndụ. (Mkpughe 14:6, 7) N’ụzọ nke na-emeju obi na uche, Bible na-aza ajụjụ ndị dị ka: Gịnị bụ nzube nke ndụ mmadụ? (Jenesis 1:28; Mkpughe 4:11) Gịnị mere gọọmenti nile nke ihe a kpọrọ mmadụ enwebeghị ike iweta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi na-adịgide adịgide? (Jeremaịa 10:23; Mkpughe 13:1, 2) N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji anwụ? (Jenesis 2:15-17; 3:1-6; Ndị Rom 5:12) N’ime ụwa nke a jupụtara ná nsogbu, olee otú anyị pụrụ isi nagide nsogbu nile nke ndụ n’ụzọ gara nke ọma? (Abụ Ọma 119:105; Ilu 3:5, 6) Gịnị ka ọdịnihu nwere maka anyị?—Daniel 2:44; Mkpughe 21:3-5.
2. N’ihi gịnị ka Bible ji na-enye azịza ndị a pụrụ ịdabere kpam kpam na ha nye ajụjụ anyị dị iche iche?
2 Gịnị mere Bible ji na-aza ajụjụ ndị dị otú ahụ n’ụzọ a pụrụ ịtụkwasị obi? N’ihi na ọ bụ Okwu Chineke. O ji ndị mmadụ dee ya, ma dị ka e kwuru na 2 Timoti 3:16, “ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta.” Ọ bụghị ihe si ná nkọwa onwe onye nke ihe omume mmadụ pụta. “Ọ dịghị amụma ọ bụla [nkwupụta nke ihe ndị gaje ime, iwu Chineke, ụkpụrụ omume nke Bible] nke e ji ọchịchọ mmadụ buo mgbe ọ bụla: kama mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe Mmụọ Nsọ na-eme ka ha kwuo.”—2 Pita 1:21.
3. (a) Nye ihe atụ ndị na-egosi otú ndị mmadụ n’ọtụtụ ala si were Bible dị ka ihe bara uru nke ukwuu. (b) N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji dị njikere itinye ndụ ha n’ihe ize ndụ iji gụọ Akwụkwọ Nsọ?
3 N’ịghọta uru Bible, ọtụtụ ndị etinyewo onwe ha n’ihe ize ndụ nke ịtụ mkpọrọ, ọbụna ọnwụ, iji nweta ma gụọ ya. Nke ahụ bụ eziokwu n’afọ ndị gaworo aga na Spain nke Katọlik, ebe ndị ụkọchukwu tụrụ ụjọ na a ga-ebelata mmetụta ha ma ọ bụrụ na ndị mmadụ agụọ Bible n’asụsụ nke ha; ọ bụkwa eziokwu n’Albania, ebe e weere nzọụkwụ ndị siri ike n’okpuru ọchịchị ndị na-ekweghị na Chineke iji kwụsị mmetụta nile nke okpukpe. Ma, ndị na-atụ egwu Chineke weere Akwụkwọ Nsọ dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, gụọ ya, ma soro ibe ha kerịta ya. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, n’ogige ịta ahụhụ nke Sachsenhausen, e ji akọ site n’otu ụlọ mkpọrọ wega otu Bible n’ọzọ (ọ bụ ezie na a machibidoro nke a iwu), ndị o rukwara aka buuru akụkụ ụfọdụ n’isi iji soro ndị ọzọ kerịta ha. N’afọ ndị 1950, n’ihe bụ mgbe ahụ East Germany nke Kọmụnist, Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha tinyere onwe ha n’ihe ize ndụ nke mkpọrọ ịnọ nanị onwe onye ruo ogologo oge mgbe ha nyere akụkụ dị nta nke Bible site n’otu onye mkpọrọ gaa n’ọzọ ka a gụọ ya n’abalị. N’ihi gịnị ka ha ji mee ya? N’ihi na ha matara na Bible bụ Okwu Chineke, ha makwaara na “ọ bụghị nanị achịcha” kama ‘n’ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’ (Deuterọnọmi 8:3) Okwu ndị a, bụ́ ndị e dekọrọ na Bible, nyeere Ndịàmà ahụ aka ịnọgide na-adị ndụ n’ime mmụọ n’agbanyeghị ịbụ ndị a na-emekpọ ọnụ n’ụzọ na-enweghị atụ.
4. Ọnọdụ dị aṅaa ka Bible kwesịrị inwe ná ndụ anyị?
4 Bible abụghị akwụkwọ nke nanị ihe a ga-eme bụ́ itinye ya n’ọ́bá akwụkwọ maka izo aka na ya site n’oge ruo n’oge, ọ bụghịkwa nke e bu n’obi iji eme ihe nanị mgbe ndị kwere ekwe ibe anyị zukọrọ maka ofufe. E kwesịrị iji ya eme ihe kwa ụbọchị iji ghọta ọnọdụ ndị na-eche anyị ihu na igosi anyị ụzọ ziri ezi isi eje ije.—Abụ Ọma 25:4, 5.
E Bu n’Obi Ka A Gụọ ma Ghọta Ya
5. (a) Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ma ọlị, gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị inwe? (b) N’Israel oge ochie, olee otú ndị mmadụ si achọpụta ihe dị n’ime Akwụkwọ Nsọ? (ch) Olee otú Abụ Ọma 19:7-11 si emetụta omume gị n’ebe ọgụgụ Bible dị?
5 N’oge anyị, ọ dị mfe inweta Bible n’ihe ka n’ọtụtụ ala, anyị na-agbakwa onye ọ bụla na-agụ Ụlọ Nche ume ka o nweta otu. N’oge mgbe a na-ede Bible, e nweghị ígwè ndị na-ebi akwụkwọ. Ndị mmadụ n’ozuzu ha enweghị nke aka ha. Ma Jehova dokwaara ndị ohu ya ịnụ ihe e deworo. N’ihi ya, Ọpụpụ 24:7 na-akọ, mgbe Mosis detusịrị ihe Jehova tụziworo, o “weere akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, gụọ ya ná ntị ndị Israel.” Ebe ha bụworo ndị akaebe nke ngosipụta ndị ka ike mmadụ n’Ugwu Saịnaị, ha matara na ihe Mosis gụụrụ ha sitere n’aka Chineke nakwa na ọ dị ha mkpa ịmara ihe ọmụma nke a. (Ọpụpụ 19:9, 16-19; 20:22) Ọ dịkwa anyị mkpa ịmara ihe e dekọrọ n’Okwu Chineke.—Abụ Ọma 19:7-11.
6. (a) Tupu mba Israel abanye n’Ala Nkwa ahụ, gịnị ka Mosis mere? (b) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Mosis?
6 Ka mba Israel na-akwado ịgafe Osimiri Jọdan iji banye n’Ala Nkwa ahụ, si otú ahụ na-ahapụ ndụ mwagharị ha n’ọzara, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị nye ha ịtụleghachi Iwu Jehova na mmeso ya nile n’ebe ha nọ. N’ịbụ onye mmụọ Chineke kpaliri, Mosis sooro ha tụleghachi Iwu ahụ. O chetaara ha ihe nile dị n’Iwu ahụ, o mekwara ka ụkpụrụ ndị bụ́ isi na omume ndị ga-emetụta mmekọrịta ha na Jehova pụta ìhè. (Deuterọnọmi 4:9, 35; 7:7, 8; 8:10-14; 10:12, 13) Ka anyị na-ewere ọrụ ọhụrụ ma ọ bụ na-eche ọnọdụ ọhụrụ ná ndụ ihu taa, anyị onwe anyị kwa ga-eme nke ọma ịtụle otú ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị isi metụta ihe anyị na-eme.
7. Nwa oge nta ndị Israel gafesịrị Jọdan, gịnị ka e mere iji kụnye Iwu Jehova n’uche na obi ha?
7 Nwa oge nta mgbe Israel gafesịrị Osimiri Jọdan, ndị mba ahụ zukọkwara ọzọ ịtụleghachi ihe Jehova gwaworo ha site n’ọnụ Mosis. Mba ahụ zukọrọ ihe dị ka 50 kilomita n’ebe ugwu nke Jerusalem. Ọkara ebo nile ahụ nọ n’ihu Ugwu Ebal, ọkara nọkwa n’ihu Ugwu Geraịzim. N’ebe ahụ Joshua “wee gụọ okwu nile nke iwu ahụ, ma ngọzi ma nkọcha.” Otú a ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka, tinyere ndị ọbịa, nụrụ nkwupụtaghachi e mere n’oge ya nke iwu ndị na-achịkwa omume nke ga-eweta iwe Jehova na ngọzi ndị ha ga-anata ma ọ bụrụ na ha erubere Jehova isi. (Joshua 8:34, 35) Ọ dị mkpa ka ha buru n’uche n’ụzọ doro anya ihe bụ ezi ihe na ihe bụ ihe ọjọọ n’anya Jehova. Ọzọ, ọ dị ha mkpa ịkụnye n’ime obi ha ịhụnanya maka ezi ihe na ịkpọasị maka ihe ọjọọ, dị ka onye ọ bụla n’ime anyị taa na-eme.—Abụ Ọma 97:10; 119:103, 104; Emọs 5:15.
8. Gịnị bụ abamuru nke ịgụ Okwu Chineke site n’oge ruo n’oge ná mgbakọ ụfọdụ kpọmkwem nke mba ahụ nile n’Israel?
8 Tinyere ọgụgụ a na-agụ Iwu ahụ n’oge ndị ahụ dị mkpa, e depụtara ndokwa maka ịgụ Okwu Chineke mgbe mgbe na Deuterọnọmi 31:10-12. Afọ nke asaa ọ bụla mba ahụ dum ga-ezukọ ịnụrụ ọgụgụ nke Okwu Chineke. Nke a nyere ha nri ime mmụọ. O mere ka nkwa nile banyere Mkpụrụ ahụ dịrị n’uche na n’obi ha mgbe nile ma si otú a jee ozi iduru ndị kwesịrị ntụkwasị obi gaa na Mesaịa ahụ. Ndokwa ndị e mere maka iri ihe ime mmụọ nke e guzobere mgbe Israel nọ n’ọzara akwụsịghị mgbe ha banyere n’Ala Nkwa ahụ. (1 Ndị Kọrint 10:3, 4) Kama nke ahụ, e mere ka Okwu Chineke dịwanye ụtọ site n’itinye mkpughe ndị ọzọ nke ndị amụma.
9. (a) Ọ̀ bụ nanị mgbe ndị Israel gbakọrọ n’ìgwè buru ibu ka ha gụrụ Akwụkwọ Nsọ? Kọwaa. (b) Olee otú e si nye ntụziaka site n’Akwụkwọ Nsọ n’ime ezinụlọ dị iche iche, gịnịkwa bụ nzube ya?
9 Ntụleghachi nke ndụmọdụ nke Okwu Chineke abụghị nke a ga-eme nanị n’oge ndị ahụ mgbe ndị ala ahụ zukọrọ n’ìgwè buru ibu. A ga-atụle akụkụ dị iche iche nke Okwu Chineke na ụkpụrụ ndị dị ha n’ime kwa ụbọchị. (Deuterọnọmi 6:4-9) N’ihe ka n’ọtụtụ ebe taa, ọ na-ekwe ndị na-eto eto omume inwe Bible nke aka ha, ọ bakwara nnọọ uru ha ime otú ahụ. Ma n’Israel oge ochie, nke ahụ adịghị otú ahụ. Laa azụ n’oge ahụ, mgbe ndị nne na nna nyere ntụziaka sitere n’Okwu Chineke, ha aghaghị ịdabere n’ihe ha buworo n’isi na n’eziokwu ndị ha tinyeworo n’obi ha, tinyere ntakịrị akụkụ ọ bụla ha pụworo ideturu onwe ha. Site n’ikwughachi ya ọtụtụ mgbe, ha ga-agbalị iwulite ịhụnanya maka Jehova na ụzọ ya nile n’ime ụmụ ha. Nzube ya abụghị nanị inwe ụbụrụ jupụtara n’ihe ọmụma kama iji nyere onye òtù ezinụlọ ha ọ bụla aka ibi ndụ n’ụzọ ga-egosipụta ịhụnanya maka Jehova na Okwu ya.—Deuterọnọmi 11:18, 19, 22, 23.
Ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ n’Ụlọ Nzukọ
10, 11. Usoro ihe omume dị aṅaa nke ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ ka a gbasoro n’ụlọ nzukọ, oleekwa otú Jisọs si lee oge ndị a anya?
10 N’otu oge mgbe a kpọrọsịịrị ndị Juu gaa n’ala Babilọn, e guzobere ụlọ nzukọ dị iche iche dị ka ebe a ga-anọ na-efe ofufe. Iji gụọ ma tụlee Okwu Chineke n’ebe nzukọ ndị a, e wepụtakwuru ndepụtaghachi nke Akwụkwọ Nsọ. Nke a bụ ihe wetara nlanarị nke ihe dị ka 6,000 akwụkwọ ndị ochie e ji aka depụtaghachi bụ́ ndị nwere akụkụ dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ Hibru.
11 Ngalaba dị mkpa nke ife ofufe n’ụlọ nzukọ ahụ bụ ọgụgụ nke Torah, nke ya na akwụkwọ ise mbụ nke Bible oge ugbu a bụ otu ihe. Ọrụ Ndị Ozi 15:21 kọrọ na n’ime narị afọ mbụ O.A., e mere ụdị ọgụgụ ihe ahụ n’Ụbọchị Izu Ike ọ bụla, Mishnah na-egosikwa na ka ọ na-erule narị afọ nke abụọ, e nwekwara ọgụgụ nke Torah n’ụbọchị nke abụọ na nke ise n’izu. Ọtụtụ mmadụ keere òkè n’ịgụ akụkụ ndị e kenyere ha, onye gụchaa ibe ya agụọ. Omenala ndị Juu bi na Babilọn bụ ịgụ Torah dum kwa afọ; omenala dị na Palestine bụ ịhazi ọgụgụ ihe ahụ ka o wee afọ atọ. A gụkwara ma kọwaa otu akụkụ nke Ndị Amụma. Ọ bụ omenala Jisọs ịnọ ya maka usoro ihe omume ọgụgụ Bible n’Ụbọchị Izu Ike n’ebe o biri.—Luk 4:16-21.
Nzaghachi Onwe Onye na Itinye Ya n’Ọrụ
12. (a) Mgbe Mosis gụụrụ ndị mba ahụ Iwu ahụ, olee otú ndị mba ahụ si rite uru? (b) Olee otú ndị mba ahụ si zaghachi?
12 E bụghị n’uche ka ọgụgụ nke Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ bụrụ nanị ihe e ji emezu iwu. E meghị ya nanị iji dajụọ ọchịchọ ịmata ihe nke ndị mba ahụ. Mgbe Mosis gụụrụ Israel “akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ” n’ala dị larịị chere Ugwu Saịnaị ihu, o mere otú ahụ ka ha wee mara ibu ọrụ ha n’ebe Chineke nọ ma mezuo ha. Hà ga-eme otú ahụ? Ọgụgụ ihe ahụ chọrọ nzaghachi. Ndị ala ahụ ghọtara nke ahụ, ha kwukwara okwu, na-asị: “Ihe nile Jehova kwuworo, anyị ga-eme ya, nụkwa.”—Ọpụpụ 24:7; tụlee Ọpụpụ 19:8; 24:3.
13. Mgbe Joshua gụrụ ọbụbụọnụ maka erubeghị isi, gịnị ka ndị mba ahụ ga-eme, ná nzube dị aṅaa?
13 E mesịa, mgbe Joshua gụụrụ mba ahụ ngọzi ndị e kwere ná nkwa na ọbụbụọnụ, ma ọ bụ nkọcha ahụ, a chọrọ nzaghachi. Mgbe e kwusịrị nkọcha nke ọ bụla, e nyere ntụziaka bụ: “Ndị Israel nile ga-asịkwa, Amen.” (Deuterọnọmi 27:4-26) Ya mere, site n’otu isi ihe gaa n’ọzọ ha kwupụtara nkwenye ha kwenyere ná nkagbu Jehova kagburu ihe ọjọọ ndị ahụ a na-ehota. Lee ihe omume dị ebube ọ na-aghaghị ịbụ mgbe mba ahụ dum kwupụtara nkwenye ya n’olu dara ụda!
14. N’ụbọchị Nehemaịa, n’ihi gịnị ka ọgụgụ Iwu ahụ n’ihu ọha ji bụrụ ihe na-aba uru karịsịa?
14 N’ụbọchị Nehemaịa, mgbe ndị mba ahụ dum zukọrọ na Jerusalem ịnụrụ Iwu ahụ, ha hụrụ na ha adịghị emezu ntụziaka ndị e dere n’ebe ahụ. N’oge ahụ ha tinyere ihe ha mụtara n’ọrụ ozugbo. Gịnị si na nke ahụ pụta? “Oké ọṅụ dị ukwuu.” (Nehemaịa 8:13-17) Mgbe otu izu nke ọgụgụ Bible n’oge ememe ahụ gasịrị, ha ghọtara na a chọkwuru ihe ọzọ n’aka ha. Ha ji ekpere tụleghachi akụkọ ihe mere eme nke mmeso Jehova mesoworo ndị ya site n’ụbọchị Abraham gaa n’ihu. Ihe ndị a nile kpaliri ha ịṅụ iyi ikwekọ n’ihe Iwu ahụ chọrọ, izere ha na ndị mba ọzọ ịlụkọrịta di na nwunye, nakwa ịnara ibu ọrụ maka ilekọta ụlọ nsọ ahụ na ozi a na-eje na ya.—Nehemaịa, isi 8-10.
15. Olee otú ntụziaka ndị dị na Deuterọnọmi 6:6-9 si na-egosi na, n’ime ezinụlọ dị iche iche, ntụziaka dị n’Okwu Chineke agaghị abụ nanị iji mezuo iwu?
15 N’otu aka ahụ, n’ime ezinụlọ, e meghị ịkụzi Akwụkwọ Nsọ ka ọ bụrụ nanị iji mezuo iwu. Dị ka a hụwororịị, n’okwu ihe atụ e ji mee ihe na Deuterọnọmi 6:6-9, a gwara ndị ala ahụ ka ha ‘kee okwu Chineke n’elu aka ha ka ha bụrụ ihe ịrịba ama’—si otú ahụ na-egosi ịhụnanya ha maka ụzọ nile nke Jehova site n’ihe nlereanya na omume. Ha ga-edebekwa okwu Chineke dị ka ‘mkpọnihu n’etiti anya ha abụọ’—si otú ahụ nọgide na-ahụ mgbe nile ụkpụrụ ndị dị n’ime Akwụkwọ Nsọ ma na-eji ndị a eme ihe dị ka ebe ndabere maka mkpebi ha. (Tụlee okwu e ji mee ihe n’Ọpụpụ 13:9, 14-16.) Ha ‘ga-edekwasị ha n’awara ụzọ abụọ nke ụlọ ha na n’ọnụ ụzọ ámá ha nile’—si otú ahụ na-esetịpụ ụlọ na ógbè ha iche dị ka ebe a na-akwanyere okwu Chineke ùgwù ma na-etinye ya n’ọrụ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndụ ha ga-enye ihe àmà dị ukwuu nke na ha hụrụ ụkpụrụ ezi omume Jehova n’anya ma na-etinye ha n’ọrụ. Lee aha ihe bara uru nke ahụ pụrụ ịbụ! Okwu Chineke ò nwere ọnọdụ dị mkpa otú ahụ ná ndụ ezinụlọ anyị na-adị kwa ụbọchị? N’ụzọ dị mwute, ndị Juu tụgharịrị ihe ndị a nile ịbụ nanị ihe e ji emezu iwu, na-anyara igbe ndị akwụkwọ nsọ dị n’ime ha n’olu dị ka a ga-asị na ihe ndị a bụ ọtụmọkpọ. Ofufe ha kwụsịrị isite n’obi, Jehova jụkwara ya.—Aịsaịa 29:13, 14; Matiu 15:7-9.
Ibu Ọrụ nke Ndị Nọ n’Ọnọdụ Inye Nlekọta
16. N’ihi gịnị ka ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ mgbe nile ji bụrụ ihe dị mkpa nye Joshua?
16 Banyere ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ, e nyere ndị nlekọta mba ahụ nlebara anya pụrụ iche. Nye Joshua, Jehova kwuru, sị: ‘Lezie anya ime dị ka iwu ahụ nile si dị.’ N’olileanya nke ya imezu ibu ọrụ ahụ, a gwara ya, sị: “Ị ga-atụgharị uche n’ime ya ehihie na abalị, . . . mgbe ahụ ị ga-eme ka ije gị gaa nke ọma, mgbe ahụ ị ga-enwekwa uche.” (Joshua 1:7, 8) Dị ka ọ bụ eziokwu nye onye nlekọta ọ bụla bụ́ onye Kraịst taa, ọgụgụ Joshua na-agụ Akwụkwọ Nsọ mgbe nile ga-enyere ya aka iburu n’uche n’ụzọ doro anya iwu ndị Jehova nyeworo ndị Ya. Ọ dịkwa Joshua mkpa ịghọta otú Jehova siworo mesoo ndị ohu Ya omume n’okpuru ọnọdụ dị iche iche. Ka ọ na-agụ okwu dị iche iche nke nzube Chineke, ọ dị ya mkpa iche echiche banyere ibu ọrụ nke onwe ya n’ihe metụtara nzube ahụ.
17. (a) Ka ndị eze wee rite uru site n’ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ Jehova kwuru, gịnị ka a chọrọ tinyere ọgụgụ ihe ha? (b) N’ihi gịnị ka ọgụgụ Bible na ntụgharị uche mgbe nile ji dịrị ndị okenye bụ́ ndị Kraịst oké mkpa?
17 Jehova tụziri ka onye ọ bụla na-eje ozi dị ka eze n’ebe ndị Ya nọ, mepụta akwụkwọ nke Iwu Chineke, ná mmalite nke ọbụbụeze ya, na-eme ka ọ dabere n’akwụkwọ nke ndị nchụàjà debere. Mgbe ahụ ọ “ga-agụkwa ihe dị n’ime ya ụbọchị nile nke ndụ ya.” Nzube ya abụghị nanị iburu ihe dị n’ime ya n’isi. Kama nke ahụ, ọ bụ ka “o wee mụta ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke ya” nakwa ka “obi ya wee ghara ịdị elu karịa ụmụnne ya.” (Deuterọnọmi 17:18-20) Nke a chọrọ ka o chemie echiche n’ihe ọ na-agụ. O doro anya na ụfọdụ ndị eze ahụ chere na ha ji ọrụ n’aka nke ukwuu n’ọrụ ọchịchị nke na ha enweghị efe ime nke ahụ, mba ahụ dum takwara ahụhụ n’ihi nleghara anya ha. Òkè ndị okenye na-ekere n’ọgbakọ ndị Kraịst abụtụghị nke ndị eze ma ọlị. N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka ọ bụ eziokwu n’ebe ndị eze ahụ nọ, ọ dị oké mkpa na ndị okenye na-agụ ma na-atụgharị uche n’Okwu Chineke. Ha ime nke ahụ ga-enyere ha aka ịnọgide na-enwe echiche kwesịrị ekwesị maka ndị e tinyere ha n’aka ilekọta. Ọ ga-enyekwara ha aka imezu ibu ọrụ ha dị ka ndị nkụzi n’ụzọ nke na-asọpụrụ Chineke n’ezie ma na-ewusi ndị Kraịst ibe ha ike n’ime mmụọ.—Taịtọs 1:9; tụlee Jọn 7:16-18; lee ọdịiche dị na 1 Timoti 1:6, 7.
18. Ihe nlereanya dị aṅaa nke Pọl onyeozi setịpụrụ ka ọgụgụ na ọmụmụ Bible mgbe nile ga-enyere anyị aka iṅomi?
18 Pọl onyeozi, onye nlekọta bụ́ onye Kraịst na narị afọ mbụ, bụ onye maara Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ nke ọma. Mgbe ọ gbaara ndị nọ na Tesalọnaịka oge ochie àmà, o nwere ike isoro ha tụgharịa uche n’ụzọ dị irè site n’Akwụkwọ Nsọ ma nyere ha aka ịghọta ihe ọ pụtara. (Ọrụ 17:1-4) O ruru n’obi nke ndị ji ezi obi na-ege ntị. Ya mere, ọtụtụ ndị ṅara ya ntị ghọrọ ndị kwere ekwe. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:13) Dị ka ihe si n’usoro ihe omume gị nke ọgụgụ na ọmụmụ Bible pụta, ì nwere ike ịtụgharị uche n’ụzọ dị irè site n’Akwụkwọ Nsọ? Ọnọdụ nke ọgụgụ Bible na-ewere ná ndụ gị na ụzọ ị na-esi eme ya ọ̀ na-enye ihe àmà na ị ghọtara n’ezie ihe ọ pụtara bụ́ inwe Okwu Chineke dị ka nke gị? N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú ọbụna ndị usoro ihe omume ha juru nnọọ eju pụrụ isi zaa ee n’ajụjụ ndị a.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka ndị mmadụ jiworo dị njikere itinye ndụ na nnwere onwe ha n’ihe ize ndụ iji gụọ Bible?
◻ Olee otú anyị si rite uru site n’ịtụleghachi ndokwa ndị e mere ka Israel oge ochie nụrụ Okwu Chineke?
◻ Gịnị ka anyị kwesịrị iji ihe anyị gụrụ na Bible mee?
◻ N’ihi gịnị ka ọgụgụ Bible na ntụgharị uche ji dịrị ndị okenye bụ́ ndị Kraịst mkpa?
[Foto dị na peeji nke 9]
Jehova gwara Joshua: “Ị ga-atụgharị uche n’ime ya ehihie na abalị”