Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 7/1 p. 14-19
  • “Israel nke Chineke” na “Oké Ìgwè Mmadụ” Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Israel nke Chineke” na “Oké Ìgwè Mmadụ” Ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Oké Ìgwè Mmadụ” Ahụ
  • “Alaeze Ndị Nchụàjà” Ihe Atụ
  • Ndị Ala Ọzọ n’Israel
  • Mba Ime Mmụọ Ahụ
  • Mmezu nke Eluigwe
  • Ndị Na-ebikọ ‘n’Ala’ E Weghachiri Eweghachi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ndịàmà Bụ́ Ndị Kraịst Ala Ha Dị n’Eluigwe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Òtù Ndị Nchụàjà Bụ́ Ndị Eze Ndị Ga-abara Mmadụ Niile Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Nwa Amaala Ma Ọ Bụ Onye Ala Ọzọ, Chineke Na-anabata Gị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 7/1 p. 14-19

“Israel nke Chineke” na “Oké Ìgwè Mmadụ” Ahụ

“M wee hụ, ma lee, oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ.”—MKPUGHE 7:9.

1-3. (a) Ihe ndị dị ebube dị aṅaa n’eluigwe ka ndị Kraịst e tere mmanụ na-atụ anya ha? (b) Olee otú Setan si nwaa ibibi ọgbakọ narị afọ mbụ ahụ? (ch) Gịnị mere na 1919 nke gosiri na mgbalị Setan ịgwagbu ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ adawo?

NHIWE nke “Israel nke Chineke” na 33 O.A. bụ nzọụkwụ gbara ọkpụrụkpụ ná mmezu nke nzube nile nke Jehova. (Ndị Galetia 6:16) Ndị òtù ya e tere mmanụ nwere olileanya nke ịbụ ndị mmụọ e kere eke na-adịghị anwụ anwụ na iso Kraịst chịa n’Alaeze eluigwe Chineke. (1 Ndị Kọrint 15:50, 53, 54) N’ọnọdụ ahụ ha nwere òkè bu ụzọ n’ido aha Jehova nsọ na ichipịa isi Onyeiro ukwu ahụ, bụ́ Setan Ekwensu. (Jenesis 3:15; Ndị Rom 16:20) Ka a sịkwa ihe mere Setan ji mee ihe nile o nwere ike ime iji bibie ọgbakọ ọhụrụ a, ma site n’ịkpagbu ya ma site n’ịnwa ịgwagbu ya!—2 Timoti 2:18; Jud 4; Mkpughe 2:10.

2 Mgbe ndị ozi nọ ndụ, Setan apụghị inwe ihe ịga nke ọma. Otú ọ dị, mgbe ha nwụsịrị, ndapụ n’ezi ofufe gbasara n’enweghị ihe mgbochi. N’ikpeazụ, n’anya mmadụ, ọgbakọ dị ọcha nke ndị Kraịst nke Jisọs hiwere yiri ka a gwagbuwo ya mgbe Setan wepụtara okpukpe adịgboroja nke ndapụ n’ezi ofufe nke a maara taa dị ka Krisendọm. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3-8) Ka o sina dị, ezi Iso Ụzọ Kraịst dịgidere.—Matiu 28:20.

3 Jisọs, n’ilu ya nke ọka na ata ndị ahụ, buru amụma na ezi ndị Kraịst ga-eto ruo oge ụfọdụ ha na “ata,” ma ọ bụ ndị Kraịst ụgha; nke a mekwara. Ma o kwukwara na na mgbe ikpeazụ, “ụmụ alaeze eluigwe” ga-agbakwa iche ọzọ n’ụzọ pụtara ìhè pụọ ‘n’ata’ ahụ. (Matiu 13:36-43) Nke a mekwara. Na 1919 ezigbote ndị Kraịst e tere mmanụ si ná ndọrọ laa n’agha na Babilọn lọta. E si n’eluigwe kọwapụta ha dị ka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” ha jikwa anyaike malite ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. (Matiu 24:14, 45-47; Mkpughe 18:4) Ọ fọrọ nke nta ka ha nile bụrụ ndị Jentaịl; ma n’ihi na ha nwere okwukwe nke Abraham, ha bụ n’ezie “ụmụ Abraham.” Ha bụ ndị òtù “Israel nke Chineke.”—Ndị Galetia 3:7, 26-29.

“Oké Ìgwè Mmadụ” Ahụ

4. Olee ìgwè ndị Kraịst pụtara ìhè, karịsịa n’afọ ndị 1930?

4 Ná mmalite, ndị nakweere nkwusa nke ndị Kraịst a e tere mmanụ ghọkwara ndị Israel ime mmụọ, ndị fọdụrụnụ na 144,000 ahụ, na-enwe olileanya eluigwe. (Mkpughe 12:17) Otú ọ dị, karịsịa n’afọ ndị 1930, ìgwè ọzọ pụtara ìhè. A matara ndị a dị ka “atụrụ ọzọ” ahụ nke ilu ogige atụrụ ndị ahụ. (Jọn 10:16) Ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst nwere olileanya ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Ha bụ ụmụ ime mmụọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, nke ndị Kraịst e tere mmanụ. (Aịsaịa 59:21; 66:22; tụlee 1 Ndị Kọrint 4:15, 16.) Ha nakweere ọgbakọ ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ dị ka ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, dịkwa ka ụmụnna ha e tere mmanụ, ha nwere ịhụnanya miri emi maka Jehova, okwukwe n’àjà Jisọs, ịnụ ọkụ n’obi maka ito Chineke, na ịdị njikere ịta ahụhụ maka ezi omume.

5. Olee otú e siworo na-aghọta ọnọdụ atụrụ ọzọ ahụ nke ọma n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu?

5 Na mbụ a ghọtaghị ọnọdụ nke atụrụ ọzọ ndị a nke ọma, ma ka oge na-aga, ihe dowanyere anya. Na 1932 a gbara ndị Kraịst e tere mmanụ ume ka ha na-agba atụrụ ọzọ ahụ ume ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ—ihe nke ọtụtụ atụrụ ọzọ ahụ nọwororịị na-eme. Na 1934 a gbara atụrụ ọzọ ahụ ume ịnakwere baptism ime mmiri. Na 1935 a matara ha dị ka “oké ìgwè mmadụ” nke Mkpughe isi 7. Na 1938 a kpọrọ ha òkù ịbịa Ememe Ncheta nke ọnwụ Jisọs Kraịst dị ka ndị nkiri. Na 1951 a chọpụtara na ndị ikom toruru etoru n’etiti ha so ná “ndị isi” ga-eje ozi dị ka “ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo.” (Abụ Ọma 45:16; Aịsaịa 32:1, 2) Na 1953, a hụrụ nzukọ elu ala nke Chineke—nke akụkụ ya ka ukwuu bụ mgbe ahụ nke atụrụ ọzọ ahụ mejupụtara—dị ka ebe bụ isi nke ọha mmadụ nke ụwa nke ga-adị n’ụwa ọhụrụ ahụ. Na 1985 a ghọtara na ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs, a na-agụ atụrụ ọzọ ahụ ná ndị ezi omume dị ka ndị enyi Chineke, na-enwekwa olileanya nke ịlanarị Amagedọn.

6. Olee ọnọdụ dịgasị iche iche nke ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ taa nwere, na-eduje n’ajụjụ dịgasị aṅaa?

6 Ka ọ dị ugbu a, n’akụkụ ngwụsị a nke “mgbe ikpeazụ,” ihe ka nnọọ ukwuu na 144,000 ahụ anwụwo ma nata ụgwọ ọrụ ha nke eluigwe. (2 Timoti 3:1; Mkpughe 6:9-11; 14:13) Ndị Kraịst nwere olileanya elu ụwa na-arụ ihe kanụ n’ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ ugbu a, ha na-ewerekwa ya n’ihe ùgwù ịkwado ụmụnna Jisọs e tere mmanụ na nke a. (Matiu 25:40) Otú ọ dị, ndị a e tere mmanụ bụ ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke ọ bụ site na ya ka e nyeworo nri ime mmụọ na mgbe ikpeazụ a dum. Gịnị ga-abụ ọnọdụ atụrụ ọzọ ahụ mgbe ndị nile e tere mmanụ natasịrị ụgwọ ọrụ ha nke eluigwe? Ndokwa dịgasị aṅaa ka a ga-emere atụrụ ọzọ ahụ mgbe ahụ? Ilenyetụ anya n’Israel oge ochie ga-enye aka ịza ajụjụ ndị ahụ.

“Alaeze Ndị Nchụàjà” Ihe Atụ

7, 8. Ruo n’ókè hà aṅaa ka Israel oge ochie bụ alaeze ndị nchụàjà na mba dị nsọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ?

7 Mgbe Jehova họọrọ Israel dị ka mba ya pụrụ iche, o so ha gbaa ndụ, na-asị: “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu m n’ezie, ọ bụrụkwa na unu edebe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụkwara m ihe nke aka m karịa ndị nile: n’ihi na ọ bụ Mụ nwe ụwa nile: unu onwe unu ga-abụkwara m alaeze ndị nchụàjà, na mba dị nsọ.” (Ọpụpụ 19:5, 6) Israel bụ ndị pụrụ iche nye Jehova ná ndabere nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Ma, olee otú a ga-esi mezuo nkwa nke metụtara alaeze ndị nchụàjà na mba dị nsọ?

8 Israel, mgbe ha kwesịrị ntụkwasị obi, nakweere ọkaaka Jehova ma nabata ya dị ka Eze ha. (Aịsaịa 33:22) Otú a, ha bụ alaeze. Ma, dị ka e mesịrị kpughee, nkwa banyere “alaeze” ga-apụta ọbụna ihe karịrị nke ahụ. Ọzọkwa, mgbe ha rubere isi n’Iwu Jehova, ha dịrị ọcha, nọpụ iche site ná mba ndị dị gburugburu ha. Ha bụ mba dị nsọ. (Deuterọnọmi 7:5, 6) Hà bụ alaeze ndị nchụàjà? Eem, n’Israel e doro ebo Livaị iche maka ije ozi ụlọ nsọ, n’ime ebo ahụkwa e nwere usoro ndị nchụàjà Livaị. Mgbe e hiwere Iwu Mosis, e weere ndị ikom bụ́ ndị Livaị dị ka ihe mgbanwere nke nwa mbụ nke ezinụlọ ọ bụla na-abụghị nke Livaị.a (Ọpụpụ 22:29; Ọnụ Ọgụgụ 3:11-16, 40-51) Otú a, ezinụlọ ọ bụla n’Israel bụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, nke a nọchitere anya ya n’ije ozi ụlọ nsọ. Nke a bụ ókè mba ahụ pụrụ ịbịarukarịsị nso n’ịbụ òtù ndị nchụàjà. Ka o sina dị, ha nọchitere anya Jehova n’ihu mba nile. Onye ala ọzọ chọrọ ife ezi Chineke ahụ aghaghị ime otú ahụ site n’isonyere Israel.—2 Ihe Emere 6:32, 33; Aịsaịa 60:10.

9. Gịnị mere ka Jehova jụ alaeze ebe ugwu nke Israel ‘ịbụrụ ya onye nchụàjà’?

9 Mgbe ọnwụ Solomọn gasịrị, ndị Chineke kewara gaa ná mba ebe ugwu nke Israel n’okpuru Eze Jeroboam na mba ebe ndịda nke Juda n’okpuru Eze Rehoboam. Ebe ọ bụ na ụlọ nsọ ahụ, ebe bụ isi nke ezi ofufe, dị n’ókèala Juda, Jeroboam hiwere ụdị ofufe nke iwu na-akwadoghị site n’iguzobe ihe oyiyi nke nwa ehi n’ókèala nke mba ya. Ọzọkwa, “o mee ụlọ nke ebe dị elu, meekwa ndị nchụàjà sitere n’ọnụ ọgụgụ ndị Israel nile, ndị na-esiteghị n’ụmụ Livaị.” (1 Ndị Eze 12:31) Mba ebe ugwu ahụ mikpukwuru n’ofufe ụgha mgbe Eze Ehab kwere ka nwunye ya si ala ọzọ, bụ́ Jezebel, guzobe ofufe Beal n’ala ahụ. N’ikpeazụ, Jehova mara mba nnupụisi ahụ ikpe. Site n’ọnụ Hosea, ọ sịrị: “E mewo ka ndị m laa n’iyi site n’enweghị ọmụma Chineke: n’ihi na gị onwe gị ajụwo ọmụma ahụ, M ga-ajụkwa gị, i wee ghara ịbụrụ m onye nchụàjà.” (Hosea 4:6) Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, ndị Asiria kpochapụrụ alaeze ebe ugwu nke Israel.

10. Olee otú alaeze ebe ndịda nke Juda, mgbe o kwesịrị ntụkwasị obi, si nọchite anya Jehova n’ihu mba nile?

10 Gịnị banyere mba nke ebe ndịda, bụ́ Juda? N’ụbọchị Hezekaịa, Jehova gwara ha site n’ọnụ Aịsaịa, sị: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m, . . . na ohu m nke M họpụtara . . . ndị M kpụworo nye Onwe m, akụkọ otuto m ka ha ga-akọ.” (Aịsaịa 43:10, 21; 44:21) Mgbe ha na-ekwesị ntụkwasị obi, alaeze ebe ndịda ahụ jere ozi ịkpọsara mba nile ebube Jehova na ịdọta ndị obi ha ziri ezi bịa ife ya n’ụlọ nsọ ya, usoro ndị nchụàjà nke Livaị iwu kwadoro ejeekwara ha ozi.

Ndị Ala Ọzọ n’Israel

11, 12. Kpọọ aha ụfọdụ ndị ala ọzọ bịara ijere Jehova ozi site n’isonyere ndị Israel.

11 Banyere ndị ala ọzọ nakweere àmà mba a na-agba, e meere ha ndokwa n’Iwu ahụ e nyere site n’ọnụ Mosis—onye nwunye ya, Zipọra, bụ onye Midia. “Ìgwè ndị gwara ọgwa” nke ndị na-abụghị ndị Israel so Israel hapụ Ijipt, nọrọkwa ya mgbe a na-enye Iwu ahụ. (Ọpụpụ 2:16-22; 12:38; Ọnụ Ọgụgụ 11:4) A zọpụtara Rehab na ezinụlọ ya site na Jeriko ma mesịa nabata ha n’ọgbakọ ndị Juu. (Joshua 6:23-25) Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, ndị Gibeọn so Israel kpee udo, e wee kenye ha ọrụ n’ihe metụtara ụlọikwuu ahụ.—Joshua 9:3-27; leekwa 1 Ndị Eze 8:41-43; Esta 8:17.

12 E mesịa, ndị ala ọzọ jere ozi n’ọkwá dịgasị elu. A gụnyere Uraịa bụ́ onye Het, di Bat-sheba, ná “ndị dike” Devid, dị ka a gụrụ Zelek onye Amọn. (1 Ihe Emere 11:26, 39, 41; 2 Samuel 11:3, 4) Ebed-melek, onye Etiopịa, jere ozi n’obíeze ma na-eru n’ihu eze. (Jeremaịa 38:7-9) Mgbe Israel si n’ibi n’ala ọzọ na Babilọn lata, e nyere ndị Netinim na-abụghị ndị Israel ibu ọrụ ndị ka elu n’inyere ndị nchụàjà aka. (Ezra 7:24) Ebe a na-ele ụfọdụ n’ime ndị ala ọzọ a, ma ọ bụ ndị ọbịa, kwesịrị ntụkwasị obi anya dị ka ndị na-eme ihe atụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ taa, ọnọdụ ha na-adọrọ mmasị anyị.

13, 14. (a) Olee ihe ùgwù na ibu ọrụ dịgasị iche iche nke ndị na-eso ụzọ ndị Juu n’Israel? (b) Olee otú ndị Israel ga-esi lee ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-eso ụzọ ndị Juu anya?

13 Ndị dị otú ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ndị Juu, ndị raara onwe ha nye na-efe Jehova ofufe n’okpuru Iwu Mosis bụ́ ndị e doro iche pụọ ná mba nile ha na ndị Israel. (Levitikọs 24:22) Ha chụrụ àjà, debe onwe ha pụọ n’ofufe ụgha, ma na-ezere ọbara, dị nnọọ ka ndị Israel mere. (Levitikọs 17:10-14; 20:2) Ha nyere aka n’iwu ụlọ nsọ Solomọn ma nye aka ná mweghachi nke ezi ofufe n’okpuru Eze Esa na Eze Hezekaịa. (1 Ihe Emere 22:2; 2 Ihe Emere 15:8-14; 30:25) Mgbe Pita jiri ugodi mbụ nke Alaeze mee ihe na Pentikọst 33 O.A., “ma ndị Juu ma ndị na-eso ụzọ ndị Juu” nụrụ okwu ya. Ma eleghị anya, ụfọdụ n’ime puku mmadụ atọ e mere baptism n’ụbọchị ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ndị Juu. (Ọrụ 2:10, 41) Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, Filip mere otu onye Etiopịa na-eso ụzọ ndị Juu baptism—tupu Pita ejiri ugodi nke ikpeazụ nke alaeze mee ihe n’ebe Kọniliọs na ezinụlọ ya nọ. (Matiu 16:19; Ọrụ 8:26-40; 10:30-48) N’ụzọ doro anya, e leghị ndị na-eso ụzọ ndị Juu anya dị ka ndị Jentaịl.

14 Ka o sina dị, ọnọdụ nke ndị na-eso ụzọ ndị Juu adịghị ka nke ụmụ afọ Israel. Ndị na-eso ụzọ ndị Juu ejeghị ozi dị ka ndị nchụàjà, a nọchiteghịkwa anya ụmụ mbụ ha n’usoro ndị nchụàjà Livaị.b Ndị na-eso ụzọ ndị Juu enweghịkwa ihe nketa ala n’Israel. Ma, e nyere ndị Israel iwu ka ha na-echebara ndị na-eso ụzọ ndị Juu bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi echiche ma na-ele ha anya dị ka ụmụnna.—Levitikọs 19:33, 34.

Mba Ime Mmụọ Ahụ

15. Gịnị mere mgbe Israel anụ ahụ jụrụ ịnakwere Mesaịa ahụ?

15 A haziri Iwu ahụ iji debe Israel ọcha, setịpụ ha iche site ná mba ndị dị gburugburu ha. Ma o mezukwara nzube ọzọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Iwu ahụ aghọwo onye ozizi anyị ikuru anyị bịakwute Kraịst, ka e wee site n’okwukwe gụọ anyị ná ndị ezi omume.” (Ndị Galetia 3:24) Ọ bụ ihe mwute na ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ụmụ Israel ekweghị ka Iwu ahụ kuru ha gakwuru Kraịst. (Matiu 23:15; Jọn 1:11) Ya mere Jehova Chineke jụrụ mba ahụ ma mee ka a mụọ “Israel nke Chineke.” Ọzọkwa, ọ gbatịpụụrụ ndị na-abụghị ndị Juu ọkpụkpọ òkù ahụ nke ịghọ ụmụ amaala nke Israel ọhụrụ nke a n’akụkụ nile. (Ndị Galetia 3:28; 6:16) Ọ bụ n’isi mba ọhụrụ nke a ka nkwa Jehova dị n’Ọpụpụ 19:5, 6 banyere òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze nweworo mmezu ya dị ebube, nke ikpeazụ. N’ụzọ dị aṅaa?

16, 17. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’elu ụwa bụ “eze”? “òtù ndị nchụàjà”?

16 Pita hotara Ọpụpụ 19:6 mgbe o degaara ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ n’ụbọchị ya, sị: “Unu onwe unu bụ ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara.” (1 Pita 2:9) Gịnị ka nke a pụtara? Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’elu ụwa hà bụ ndị eze? Ee e, ọbụbụeze ha ka dị n’ihu. (1 Ndị Kọrint 4:8) Ka o sina dị, ha bụ “eze” n’echiche nke na a kara ha akara maka ihe ùgwù nke ịchịeze n’ọdịnihu. Ọbụna ugbu a ha bụ mba nke nọ n’okpuru eze, bụ́ Jisọs, nke Ọkaaka Ukwu ahụ, Jehova Chineke, họpụtara. Pọl dere: “[Jehova] dọpụtara anyị n’ike nke ọchịchịrị, wee webiga anyị n’alaeze nke Ọkpara nke ịhụnanya Ya.”—Ndị Kọlọsi 1:13.

17 Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’elu ụwa hà bụ òtù ndị nchụàjà? N’ụzọ ụfọdụ, ee. Dị ka otu ọgbakọ, ha na-arụ ọrụ nchụàjà a na-apụghị ịgbagha agbagha. Pita kọwara nke a mgbe ọ sịrị: “Wee werekwa unu onwe unu . . . wuo, ka unu bụrụ ụlọ nke Mmụọ Nsọ, ka unu wee bụrụ òtù ndị nchụàjà dị nsọ.” (1 Pita 2:5; 1 Ndị Kọrint 3:16) Taa, ihe fọdụrụnụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka otu ìgwè bụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” ụzọ e si na-ekesa nri ime mmụọ. (Matiu 24:45-47) Dị ka ọ dịrị n’ọnọdụ Israel oge ochie, onye ọ bụla chọrọ ife Jehova gaje ime otú ahụ site n’isonyere ndị Kraịst ndị a e tere mmanụ.

18. Dị ka òtù ndị nchụàjà, ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ n’elu ụwa nwere ibu ọrụ dị aṅaa nke bụ isi?

18 Ọzọkwa, ndị Kraịst e tere mmanụ naghaara Israel ihe ùgwù nke ịgba àmà maka ịdị ukwu nke Jehova n’etiti mba nile. Ihe a na-atụle gosiri na mgbe Pita kpọrọ ndị Kraịst e tere mmanụ òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, o bu ọrụ nkwusa ahụ n’uche. N’ezie, ọ chịkọtara n’otu nhota nkwa Jehova n’Ọpụpụ 19:6 na okwu Ọ gwara Israel n’Aịsaịa 43:21 mgbe ọ sịrị: “Unu onwe unu bụ . . . òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, . . . ka unu wee kwusaa ịdị mma nile nke Onye ahụ Onye kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.” (1 Pita 2:9) N’ikwekọ na nke a, Pọl kwuru banyere mkpọsa nke ịma mma nile nke Jehova dị ka àjà n’ụlọ nsọ. O dere: “Ka anyị site n’aka [Jisọs] na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahụ bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha Ya.”—Ndị Hibru 13:15.

Mmezu nke Eluigwe

19. Gịnị bụ mmezu ikpeazụ, nke dị ebube nke nkwa ahụ bụ na Israel ga-abụ alaeze ndị nchụàjà?

19 Otú ọ dị, Ọpụpụ 19:5, 6 ga-emesị nwee mmezu dị ebube nke ukwuu karị. N’akwụkwọ Mkpughe, Jọn onyeozi nụrụ ka ihe ndị e kere eke n’eluigwe ji akụkụ akwụkwọ nsọ a na-eme ihe ka ha na-eto Jisọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ: “E gburu Gị egbu, I werekwa ọbara Gị gbatara Chineke mmadụ si n’ebo nile ọ bụla, na asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla, na mba nile ọ bụla, pụta, I wee mee ha ka ha bụrụ alaeze na ndị nchụàjà nye Chineke anyị; ha bụkwa eze n’elu ụwa.” (Mkpughe 5:9, 10) Mgbe ahụ, n’echiche ikpeazụ ya, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze bụ Alaeze eluigwe nke Chineke, òtù ndị isi na-achị eze nke Jisọs kụziiri anyị ikpe ekpere maka ya. (Luk 11:2) Puku narị na iri anọ na anọ ahụ nile bụ́ ndị Kraịst e tere mmanụ ndị tachiri obi ruo ọgwụgwụ ga-enwe òkè ná ndokwa Alaeze ahụ. (Mkpughe 20:4, 6) Lee aha mmezu dị ebube nke ahụ ga-abụ nke nkwa ahụ e kwere eri ogologo oge site n’ọnụ Mosis!

20. Olee ajụjụ a ka ga-aza?

20 Gịnị ka ihe a nile nwere ime n’ọnọdụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ na ọdịnihu ha mgbe ndị nile e tere mmanụ nwetasịworo ihe nketa ha dị ebube? Nke a ga-edo anya n’isiokwu ikpeazụ nke usoro isiokwu a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Mgbe e hiwere usoro ndị nchụàjà nke Israel, a gụrụ ụmụ ndị ikom mbụ nile nke ebo Israel nile na-abụghị ndị Livaị na ndị ikom nile nke ebo Livaị ọnụ. E nwere 273 ụmụ mbụ karịa ndị ikom Livaị. N’ihi ya, Jehova nyere iwu na e kwesịrị ịkwụ shekel ise maka nke ọ bụla n’ime 273 ahụ dị ka ihe mgbapụta maka ọnụ ọgụgụ ahụ gafere agafe.

b Ìgwè gwara ọgwa ahụ nke ndị na-abụghị ndị Israel nọ ya mgbe e hiwere Iwu ahụ na 1513 T.O.A., ma a gụnyeghị ụmụ mbụ ha mgbe e weere ndị Livaị dị ka ihe mgbanwere maka ụmụ mbụ nke Israel. (Lee paragraf nke 8.) Ya mere, e wereghị ndị Livaị dị ka ihe mgbanwere maka ụmụ mbụ nke ndị a na-abụghị ndị Israel.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Olee otú e siworo na-aghọta ọnọdụ atụrụ ọzọ ahụ nke ọma n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu?

◻ N’ihi gịnị ka Jehova ji jụ alaeze ebe ugwu nke Israel ịbụrụ ya onye nchụàjà?

◻ Mgbe o kwesịrị ntụkwasị obi, gịnị bụ ọnọdụ Juda n’ihu mba nile?

◻ Gịnị bụ ọnọdụ nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-eso ụzọ ndị Juu n’Israel?

◻ Olee otú ọgbakọ ahụ e tere mmanụ si eje ozi dị ka alaeze ndị nchụàjà?

[Foto dị na peeji nke 16]

Dị ka òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, ndị Kraịst e tere mmanụ na-akpọsa otuto Jehova n’ụwa

[Foto dị na peeji nke 18]

Mmezu ikpeazụ nke Ọpụpụ 19:6 bụ Alaeze ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya