Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 7/1 p. 9-14
  • Ndịàmà Bụ́ Ndị Kraịst Ala Ha Dị n’Eluigwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndịàmà Bụ́ Ndị Kraịst Ala Ha Dị n’Eluigwe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Ịmụ Ọzọ’
  • Ụmụ Chineke
  • “Israel nke Chineke”
  • Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ
  • “Jerusalem Ọhụrụ”
  • Jehova Ekubata Ọtụtụ Ụmụ Ndị Ikom n’Ebube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Òle Ndị n’Ezie Nwere Ọkpụkpọ nke Eluigwe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • “Israel nke Chineke” na “Oké Ìgwè Mmadụ” Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ịchịkọta Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ihe Ndị Dị n’Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 7/1 p. 9-14

Ndịàmà Bụ́ Ndị Kraịst Ala Ha Dị n’Eluigwe

“N’ihi na ala anyị dị n’eluigwe ugbu a.”—NDỊ FILIPAỊ 3:20.

1. Olee nzube dị ebube Jehova nwere banyere mmadụ ụfọdụ?

NDỊ a mụrụ dị ka ụmụ mmadụ ga-achị dị ka eze na ndị nchụàjà n’eluigwe, ọbụna n’elu ndị mmụọ ozi. (1 Ndị Kọrint 6:2, 3; Mkpughe 20:6) Lee eziokwu dị ịtụnanya nke ahụ bụ! Ma, Jehova zubere ya, ọ na-emekwa ka o mezuo site n’Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst. N’ihi gịnị ka Onye Okike anyị ga-eji mee ihe dị otú ahụ? Oleekwa ụzọ ihe ọmụma banyere ya kwesịrị isi metụta onye Kraịst taa? Ka anyị lee ụzọ Bible si aza ajụjụ ndị a.

2. Olee ihe ọhụrụ Jọn Onye Na-eme Baptism mara ọkwa ya na Jisọs ga-eme, gịnịkwa ka ihe ọhụrụ a metụtara?

2 Mgbe Jọn Onye Na-eme Baptism na-akwadebere Jisọs ụzọ, ọ mara ọkwa na Jisọs ga-eme ihe ọhụrụ. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “[Jọn] na-ekwusakwa, sị, Onye ka m ike na-abịa n’azụ m, Onye m na-erughị ihuru ala ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ Ya abụọ. Mụ onwe m jiri mmiri mee unu baptism; ma Onye ahụ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptism.” (Mak 1:7, 8) Tupu oge ahụ, ọ dịghị onye e jiworo mmụọ nsọ mee baptism. Nke a bụ ndokwa ọhụrụ gụnyere mmụọ nsọ, o metụtakwara nzube Jehova a na-aga ikpughe ekpughe ịkwadebe ụmụ mmadụ maka ịchịisi n’eluigwe.

‘Ịmụ Ọzọ’

3. Ihe ọhụrụ dịgasị aṅaa banyere Alaeze eluigwe ka Jisọs kọwaara Nikọdimọs?

3 N’otu nzukọ nzuzo nke ya na otu onye Farisii a ma ama, Jisọs kpughekwuru ihe banyere nzube Chineke nke a. Onye Farisii ahụ, bụ́ Nikọdimọs, bịakwutere Jisọs n’abalị, Jisọs wee sị ya: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya.” (Jọn 3:3) Nikọdimọs, dị ka onye Farisii nke na-aghaghị ịmụworị Akwụkwọ Nsọ Hibru, maara banyere eziokwu dị ebube nke Alaeze Chineke. Akwụkwọ Daniel buru amụma na a ga-enye onye “dị ka nwa nke mmadụ” na “ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu” Alaeze ahụ. (Daniel 7:13, 14, 27) Alaeze ahụ ‘ga-etipịa alaeze ọzọ nile mee ka ha gwụsịa’ wee guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. (Daniel 2:44) O yikarịrị ka Nikọdimọs ò chere na a ga-emezu amụma ndị a n’ihe banyere mba ndị Juu; ma Jisọs kwuru na iji hụ Alaeze ahụ, a ghaghị ịmụ mmadụ ọzọ. Nikọdimọs aghọtaghị, ya mere Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, ọ pụghị ịba n’alaeze Chineke.”—Jọn 3:5.

4. Nye ndị a mụrụ site na mmụọ nsọ, olee otú mmekọrịta ha na Jehova ga-esi gbanwee?

4 Jọn Onye Na-eme Baptism ekwuwo banyere iji mmụọ nsọ mee baptism. Ugbu a, Jisọs gbakwụnyere na a ghaghị ịmụ mmadụ site na mmụọ nsọ ma ọ bụrụ na ọ ga-aba n’Alaeze Chineke. Site n’ọmụmụ a pụrụ iche, ndị ikom na ndị inyom na-ezughị okè na-eso Jehova Chineke banye ná mmekọrịta pụrụ nnọọ iche. Ha na-aghọ ụmụ o kuchiri ekuchi. Anyị na-agụ, sị: “Ka ha hà, bụ́ ndị naara [Jisọs], ha ka O nyere ike ịghọ ụmụ Chineke, bụ́ ndị kwere n’aha Ya: ndị a mụrụ, ọ bụghị site n’ọbara, ọ bụghịkwa site n’ọchịchọ anụ ahụ, ọ bụghịkwa site n’ọchịchọ nwoke, kama site na Chineke.”—Jọn 1:12, 13; Ndị Rom 8:15.

Ụmụ Chineke

5. Olee mgbe e ji mmụọ nsọ mee ndị ahụ na-eso ụzọ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi baptism, ọrụ ndị ọzọ dịgasị aṅaa nke mmụọ nsọ werekwaara ọnọdụ n’otu oge ahụ?

5 Mgbe Jisọs gwara Nikọdimọs okwu, mmụọ nsọ abịakwasịworị Jisọs, na-ete ya mmanụ maka ọbụbụeze ya n’ọdịnihu n’Alaeze Chineke, Chineke ekwupụtawokwa n’ihu ọha na Jisọs bụ Ọkpara Ya. (Matiu 3:16, 17) Jehova mụtakwuru ụmụ ime mmụọ na Pentikọst 33 O.A. E ji mmụọ nsọ mee ndị na-eso ụzọ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ndị zukọrọ n’ọnụ ụlọ dị n’elu na Jerusalem baptism. N’otu oge ahụ, a mụrụ ha ọzọ site na mmụọ nsọ dị ka ụmụ ndị ikom ime mmụọ Chineke. (Ọrụ 2:2-4, 38; Ndị Rom 8:15) Ọzọkwa, e ji mmụọ nsọ tee ha mmanụ maka ihe nketa eluigwe n’ọdịnihu, e jikwa mmụọ nsọ kaa ha akara n’ụzọ bu ụzọ dị ka ihe nnwapụta nke olileanya eluigwe ahụ ịbụ nke e ji n’aka.—2 Ndị Kọrint 1:21, 22.

6. Gịnị bụ nzube Jehova banyere Alaeze eluigwe, n’ihi gịnịkwa ka o ji kwesị ekwesị na ụmụ mmadụ ga-enwe òkè na nke a?

6 Ndị a bụ ụmụ mmadụ mbụ na-ezughị okè Chineke họọrọ ịbanye n’Alaeze ahụ. Ya bụ, mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ha gasịrị, ha gaje ịghọ akụkụ nke nzukọ Alaeze eluigwe ahụ nke ga-achị isi n’elu ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi. Jehova zubere na site n’Alaeze a, a ga-edo aha ukwu ya nsọ, wepụkwa ọkaaka ya n’ụta n’ihu ihe nile e kere eke. (Matiu 6:9, 10; Jọn 12:28) Lee ka o si kwesị ekwesị na ụmụ mmadụ nwere òkè n’Alaeze ahụ! Setan jiri ụmụ mmadụ mee ihe mgbe ọ na-ewelite ịma aka mbụ ya megide ọkaaka Jehova laa azụ n’ogige Iden, ugbu a kwa Jehova na-ezube na ụmụ mmadụ ga-etinye aka n’ịzaghachi ihe ịma aka ahụ. (Jenesis 3:1-6; Jọn 8:44) Pita onyeozi degaara ndị a họọrọ ịchị n’Alaeze ahụ akwụkwọ, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Ọ bụ, bụ́ Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Onye mụrụ anyị ọzọ, dị ka oké ebere Ya si dị, ka anyị wee nwee olileanya dị ndụ, site ná mbilite ahụ nke Jisọs Kraịst si ná ndị nwụrụ anwụ bilite, ka anyị wee keta nketa nke a na-apụghị imebi, nke a na-adịghị emerụkwa emerụ, nke na-adịghị atalatakwa, nke e debeworo n’eluigwe nye unu.”—1 Pita 1:3, 4.

7. Mmekọrịta dị aṅaa pụrụ iche ka ndị e ji mmụọ nsọ mee baptism so Jisọs na-enwe?

7 Dị ka ụmụ Chineke kuchiri, ndị Kraịst a a họpụtara ahọpụta ghọrọ ụmụnne Jisọs Kraịst. (Ndị Rom 8:16, 17; 9:4, 26; Ndị Hibru 2:11) Ebe Jisọs ghọrọ Mkpụrụ ahụ e kwere Abraham ná nkwa, ndị Kraịst a e ji mmụọ nsọ tee mmanụ bụ akụkụ mgbakwụnye, ma ọ bụ nke abụọ, nke Mkpụrụ ahụ, nke ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ kwere ekwe ngọzi. (Jenesis 22:17, 18; Ndị Galetia 3:16, 26, 29) Ngọzi dị aṅaa? Ohere nke ịbụ ndị a gbapụtara site ná mmehie ma bụrụ ndị e mere ka ha na Chineke dịghachi ná mma na nke ijere ya ozi ugbu a na ruo ebighị ebi. (Matiu 4:23; 20:28; Jọn 3:16, 36; 1 Jọn 2:1, 2) Ndị Kraịst e tere mmanụ n’elu ụwa na-egosi ndị obi ha ziri ezi ụzọ isi nweta ngọzi a site n’ịgba àmà banyere nwanne ha nwoke n’ime mmụọ bụ́ Jisọs Kraịst na Nna kuchiri ha, bụ́ Jehova Chineke.—Ọrụ 1:8; Ndị Hibru 13:15.

8. Gịnị bụ “mkpughe” nke ụmụ Chineke ji mmụọ nsọ mụta?

8 Bible na-ekwu banyere “mkpughe” nke ụmụ ndị ikom a Chineke ji mmụọ mụta. (Ndị Rom 8:19) N’ịbanye n’Alaeze ahụ dị ka ndị ha na Jisọs ga-abụkọ eze, ha ga-ekere òkè n’ibibi usoro ihe nke ụwa Setan. Nke ahụ gasịa, ruo otu puku afọ, ha ga-enye aka iche uru nile nke àjà mgbapụta ahụ ihu n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ wee si otú ahụ bulie agbụrụ mmadụ gaa n’izu okè ahụ Adam tụfuru. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:8-10; Mkpughe 2:26, 27; 20:6; 22:1, 2) Mkpughe ha gụnyere ihe a dum. Ọ bụ ihe nke mmadụ nile e kere eke kwere ekwe na-atụsi anya ya ike.

9. Olee otú Bible si ezo aka n’òtù zuru ụwa ọnụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ?

9 Ìgwè zuru ụwa ọnụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ bụ “nzukọ nke ndị e buru ụzọ mụpụta ndị e deworo aha ha n’akwụkwọ n’eluigwe.” (Ndị Hibru 12:23) Ha bụ ndị mbụ na-erite uru n’àjà mgbapụta Jisọs. Ha bụkwa “ahụ nke Kraịst,” nke na-egosi mmekọrịta chiri anya ha nwere n’etiti onwe ha na n’etiti ha na Jisọs. (1 Ndị Kọrint 12:27) Pọl dere, sị: “Dị ka ahụ anyị bụ otu, nweekwa ọtụtụ ihe dị ya n’ime, ma ihe nile nke dị n’ahụ, ọ bụ ezie na ha dị ọtụtụ, ma ha bụ otu ahụ; otú a ka Kraịst dịkwa. N’ihi na n’ime otu Mmụọ Nsọ ka e mere anyị onwe anyị nile baptism ịba n’otu ahụ, ma ànyị bụ ndị Juu ma ọ bụ ndị Grik, ma ànyị bụ ndị ohu ma ọ bụ ndị nweere onwe ha; e mekwara ka anyị nile ṅụọ n’ime otu Mmụọ Nsọ.”—1 Ndị Kọrint 12:12, 13; Ndị Rom 12:5; Ndị Efesọs 1:22, 23; 3:6.

“Israel nke Chineke”

10, 11. Na narị afọ mbụ, n’ihi gịnị ka Israel ọhụrụ ji dị mkpa, oleekwa ndị mejupụtara mba ọhụrụ a?

10 Ruo ihe karịrị 1,500 afọ tupu Jisọs abịa dị ka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa, mba Israel n’anụ ahụ bụ ndị Jehova pụrụ iche. N’agbanyeghị ihe ncheta mgbe mgbe, mba ahụ dị ka otu ìgwè ekwesịghị ntụkwasị obi. Mgbe Jisọs pụtara, mba ahụ jụrụ ya. (Jọn 1:11) Ya mere, Jisọs gwara ndị ndú okpukpe ndị Juu, sị: “A ga-anara unu alaeze Chineke, wee nye mba ọzọ nke na-amị mkpụrụ ya.” (Matiu 21:43) Ịmata “mba [ahụ] nke na-amị mkpụrụ [Alaeze ahụ]” dị mkpa maka nzọpụta.

11 Mba ọhụrụ ahụ bụ ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ, nke a mụrụ na Pentikọst 33 O.A. Ndị mbụ so na ya bụ ndị Juu soro ụzọ Jisọs ndị nakweere ya dị ka Eze eluigwe ha. (Ọrụ 2:5, 32-36) Otú ọ dị, ha bụ ndị òtù mba ọhụrụ Chineke, ọ bụghị ná ndabere nke ha isite n’usoro ọmụmụ ndị Juu, kama ná ndabere nke okwukwe na Jisọs. Ya mere, Israel ọhụrụ nke a nke Chineke bụ ihe pụrụ iche—mba ime mmụọ. Mgbe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị Juu jụrụ ịnakwere Jisọs, a gbatịpụụrụ ndị Sameria, e mesịakwa ndị Jentaịl, ọkpụkpọ òkù ịbụ akụkụ nke mba ọhụrụ ahụ. A kpọrọ mba ọhụrụ ahụ “Israel nke Chineke.”—Ndị Galetia 6:16.

12, 13. Olee otú o si doo anya na Israel ọhụrụ ahụ abụghị nnọọ ịrọ òtù okpukpe ndị Juu?

12 N’Israel oge ochie, mgbe ndị na-abụghị ndị Juu ghọrọ ndị na-eso ụzọ ndị Juu, ha aghaghị ido onwe ha n’okpuru Iwu Mosis, ndị ikom aghaghịkwa igosipụta nke a site n’ibi úgwù. (Ọpụpụ 12:48, 49) Ndị Kraịst ụfọdụ bụ́ ndị Juu chere na otu ihe ahụ kwesịkwara ịdịrị ndị na-abụghị ndị Juu nọ n’Israel nke Chineke. Otú ọ dị, Jehova bu ihe dị iche n’uche. Mmụọ nsọ duuru Pita onyeozi gaa n’ụlọ Kọniliọs onye Jentaịl. Mgbe Kọniliọs na ezinụlọ ya nakweere nkwusa Pita, ha natara mmụọ nsọ—ọbụna tupu e mee ha baptism n’ime mmiri. Nke a gosiri n’ụzọ doro anya na Jehova anakwerewo ndị Jentaịl a dị ka ndị òtù nke Israel nke Chineke n’achọghị n’aka ha ka ha doo onwe ha n’okpuru Iwu Mosis.—Ọrụ 10:21-48.

13 Nke a siiri ụfọdụ ndị kwere ekwe ike ịnakwere, n’isi nso kwa ọ dị mkpa ka ndị ozi na ndị okenye na Jerusalem tụlee okwu ahụ dum. Òtù ahụ nwere ikike ṅara ntị n’akaebe na-egosi ụzọ mmụọ nsọ siworo na-arụ ọrụ n’ahụ ndị kwere ekwe na-abụghị ndị Juu. Nnyocha Bible gosiri na nke a bụ ná mmezu nke amụma sitere n’ike mmụọ nsọ. (Aịsaịa 55:5; Emọs 9:11, 12) E ruru ná mkpebi ziri ezi: Ọ dịghị mkpa na ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu ga-edo onwe ha n’okpuru Iwu Mosis. (Ọrụ 15:1, 6-29) Otú a, Israel ime mmụọ bụ mba ọhụrụ n’ezie, ọ bụghị nnọọ ịrọ òtù nke okpukpe ndị Juu.

14. Gịnị ka Jemes ịkpọ ọgbakọ ndị Kraịst “ebo anyị iri na abụọ ndị nọ ná Mgbasa ahụ” na-egosi?

14 N’ikwekọ na nke a, mgbe ọ na-edegara ndị Kraịst e tere mmanụ na narị afọ mbụ akwụkwọ, Jemes onye na-eso ụzọ zigaara “ebo anyị iri na abụọ ndị nọ ná Mgbasa ahụ” akwụkwọ ozi ya. (Jemes 1:1; Mkpughe 7:3-8) Otú ọ dị, e kenyeghị ndị ala Israel ọhụrụ ahụ ebo ndị ọ bụla kpọmkwem. E nweghị nkewa ọ bụla gaa n’ebo 12 doro anya n’Israel ime mmụọ dị ka e nweburu n’Israel anụ ahụ. Ka o sina dị, okwu Jemes sitere n’ike mmụọ nsọ na-egosi na n’anya Jehova Israel nke Chineke anọchiwo kpam kpam ebo 12 nke Israel dị ka ọmụmụ si dị. Ọ bụrụ na onye Israel dị ka ọmụmụ si dị aghọọ akụkụ nke mba ọhụrụ ahụ, usoro ọmụmụ ya n’anụ ahụ—ọbụna ma o site n’ebo Juda ma ọ bụ Livaị—abaghị uru ọ bụla.—Ndị Galetia 3:28; Ndị Filipaị 3:5, 6.

Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ

15, 16. (a) Olee otú Jehova si ele ndị na-abụghị ndị Juu nọ n’Israel nke Chineke anya? (b) N’ihe ndabere dị aṅaa kwekọrọ n’iwu ka e hiwere Israel ọhụrụ ahụ?

15 N’anya Jehova, ndị na-abụghị ndị Israel so ná mba ọhụrụ a bụ ndị Juu ime mmụọ n’ụzọ zuru ezu! Pọl onyeozi kọwara, sị: “Onye nke bụ onye Juu n’anya mmadụ abụghị onye Juu; obibi úgwù ahụ nke mmadụ na-ahụ anya, nke dị n’anụ ahụ, abụghịkwa obibi úgwù: kama onye nke bụ onye Juu n’ihe zoro ezo, onye ahụ bụ onye Juu; obibi úgwù bụkwa nke mkpụrụ obi, n’ime mmụọ, ọ bụghị n’ihe e deworo n’akwụkwọ; nke otuto ya na-esiteghị n’aka mmadụ, kama o sitere n’aka Chineke.” (Ndị Rom 2:28, 29) Ọtụtụ ndị Jentaịl zara òkù ahụ nke ịbụ akụkụ nke Israel nke Chineke, ihe nke a mere mezukwara amụma Bible. Dị ka ihe atụ, Hosea onye amụma dere: “M ga-enwekwa obi ebere n’ahụ Lo-ruhama; M ga-asịkwa Lo-ami, Ndị m ka ị bụ; ndị ahụ ga-asịkwa, Chineke m.”—Hosea 2:23; Ndị Rom 11:25, 26.

16 Ọ bụrụ na ndị Israel ime mmụọ anọghị n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu Mosis, n’ihe ndabere dị aṅaa ka ha bụ akụkụ nke mba ọhụrụ ahụ? Jehova so mba ime mmụọ nke a gbaa ọgbụgba ndụ ọhụrụ site na Jisọs. (Ndị Hibru 9:15) Mgbe Jisọs guzobere Ememe Ncheta nke ọnwụ ya, na Nisan 14, 33 O.A., o bunyere ndị ozi ya 11 kwesịrị ntụkwasị obi achịcha na mmanya ma sị na mmanya ahụ bụ ihe atụ nke ‘ọbara ọgbụgba ndụ ahụ.’ (Matiu 26:28; Jeremaịa 31:31-34) Dị ka a kọrọ n’ihe ndekọ Luk, Jisọs kwuru na iko mmanya ahụ bụ ihe atụ nke “ọgbụgba ndụ ọhụrụ.” (Luk 22:20) Ná mmezu nke okwu Jisọs, mgbe a wụpụrụ mmụọ nsọ na Pentikọst, a mụọkwa Israel nke Chineke, a napụrụ Israel anụ ahụ Alaeze ahụ ma nye ya mba ọhụrụ ahụ, nke ime mmụọ. N’ọnọdụ nke Israel anụ ahụ, mba ọhụrụ nke a bụ ugbu a ohu Jehova, nke ndị àmà ya mejupụtara.—Aịsaịa 43:10, 11.

“Jerusalem Ọhụrụ”

17, 18. Nkọwa dịgasị aṅaa ka e nyere n’akwụkwọ Mkpughe maka ebube na-echere ndị Kraịst e tere mmanụ?

17 Lee aha ịdị ebube na-echere ndị nwere ihe ùgwù ikere òkè n’ọkpụkpọ òkù eluigwe ahụ! Leekwa ihe ọṅụ ọ bụ ịmata ihe ịtụnanya nile na-echere ha! Akwụkwọ Mkpughe na-ese onyinyo ndị na-akpali akpali nke ihe nketa eluigwe ha. Dị ka ihe atụ, ná Mkpughe 4:4, anyị na-agụ, sị: “[Iri ocheeze abụọ na anọ] dịkwa ocheeze [Jehova] gburugburu: m wee hụ [iri ndị okenye abụọ na anọ] ka ha na-anọkwasị n’ocheeze ndị a, ndị e gbokwasịworo uwe ọcha; ahụkwara m okpueze nke ọlaedo n’isi ha.” Ndị okenye 24 a bụ ndị Kraịst e tere mmanụ, kpọlite ha n’ọnwụ, ha na-anọkwa ugbu a n’ọnọdụ eluigwe Jehova kwere ha nkwa ya. Okpueze na ocheeze ha na-echetara anyị banyere ịchịeze ha. Cheekwa banyere oké ihe ùgwù ha dị ebube nke ije ozi gburugburu ocheeze Jehova!

18 Ná Mkpughe 14:1, anyị na-ahụchata onyinyo ha ọzọ: “M wee hụ, ma lee, Nwa atụrụ ahụ ka Ọ na-eguzo n’ugwu Zaịọn, Ya na [puku narị na iri anọ na anọ] bụ́ ndị e deworo aha Ya na aha Nna ya n’egedege ihu ha.” N’ebe a anyị na-ahụ ọnụ ọgụgụ a kpara ókè nke ndị a e tere mmanụ—144,000. Ọkwá ịchịeze ha ka a na-ahụta na ha iso Eze Jehova nọkwasịworo n’ocheeze, “Nwa atụrụ ahụ,” bụ́ Jisọs, guzoro. Ha nọkwa n’Ugwu Zaịọn nke eluigwe. Ugwu Zaịọn nke elu ụwa bụ ebe Jerusalem, obodo ndị eze nke Israel dị. Ugwu Zaịọn nke eluigwe na-anọchite anya ọnọdụ e buliri elu nke Jisọs na ndị nketa ibe ya, ndị mejupụtara Jerusalem eluigwe.—2 Ihe Emere 5:2; Abụ Ọma 2:6.

19, 20. (a) Olee nzukọ eluigwe nke ndị Kraịst e tere mmanụ ga-abụ akụkụ ya? (b) N’ogologo oge dị aṅaa ka Jehova họrọ ndị ala ha ga-adị n’eluigwe?

19 N’ikwekọ na nke a, e kwukwara banyere ndị e tere mmanụ n’ebube eluigwe ha dị ka “Jerusalem ọhụrụ.” (Mkpughe 21:2) Jerusalem elu ụwa bụkwa “obodo nke Eze ukwu ahụ” nakwa ebe ụlọ nsọ ahụ dị. (Matiu 5:35) Jerusalem Ọhụrụ nke eluigwe bụ nzukọ ndị eze nke Alaeze nke Ọkaaka ukwu ahụ, bụ́ Jehova, na Eze ya ọ họpụtara ahọpụta, Jisọs, si na ya na-achị ugbu a, nke ọ bụkwa na ya ka a ga-eje ozi ndị nchụàjà ka ngọzi ndị bara ụba na-erupụta site n’ocheeze Jehova maka ọgwụgwọ nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Mkpughe 21:10, 11; 22:1-5) N’ọhụụ ọzọ Jọn nụrụ ka a kpọrọ ndị Kraịst e tere mmanụ, na-ekwesị ntụkwasị obi, a kpọlitere n’ọnwụ “nwunye nke Nwa atụrụ ahụ.” Lee onyinyo na-ekpo obi ọkụ nke ahụ na-ese banyere mkpakọrịta chiri anya ha na Jisọs ga-enwe nakwa ha iji ọchịchọ obi ha doo onwe ha n’okpuru ya! Leedị ọṅụ ga-adị n’eluigwe mgbe nke ikpeazụ n’ime ha mesịrị nata ụgwọ ọrụ ya nke eluigwe. Ugbu a, n’ikpeazụ, “ọlụlụ nwunye nke Nwa atụrụ ahụ” pụrụ iwere ọnọdụ! Nzukọ eluigwe ahụ nke ndị eze ga-ezu ezu mgbe ahụ.—Mkpughe 19:6-8.

20 Ee, ngọzi ndị dị ebube na-echere ndị ahụ Pọl onyeozi kwuru banyere ha, sị: “N’ihi na ala anyị dị n’eluigwe ugbu a.” (Ndị Filipaị 3:20) Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ, Jehova anọwo na-ahọ ụmụ ime mmụọ ya ma na-akwadebe ha maka ihe nketa eluigwe. Dị ka ihe àmà nile na-egosi, ọrụ a nke nhọrọ na nkwadebe na-achọ ịgwụ. Ma e nwere ihe ndị ka ga-eso, dị ka e kpugheere Jọn n’ọhụụ ya e dekọrọ ná Mkpughe isi 7. Ya mere ugbu a, ìgwè ọzọ nke ndị Kraịst chọrọ nlebara anya anyị, anyị ga-atụlekwa ìgwè nke a n’isiokwu nke na-eso.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Ọrụ dịgasị aṅaa nke mmụọ ahụ na-ewere ọnọdụ n’ahụ ndị nwere ihe nketa nke eluigwe?

◻ Mmekọrịta chiri anya dị aṅaa ka ndị e tere mmanụ na-enwe ha na Jehova? ha na Jisọs?

◻ Olee otú e si kọwaa ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ n’ime Bible?

◻ N’ihe ndabere dị aṅaa kwekọrọ n’iwu ka e hiwere Israel nke Chineke?

◻ Ihe ùgwù dịgasị aṅaa nke eluigwe na-echere ndị Kraịst e tere mmanụ?

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

N’ogologo oge fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ, Jehova họpụtara ndị ga-achị n’Alaeze eluigwe ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya