“Yoke nke M Adịghị Egbu Mgbu, Ibu M Dịkwa Mfe”
“Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m.”—MATIU 11:29.
1, 2. (a) Olee ihe i nweworo ahụmahụ ya ná ndụ nke na-ewetara gị izu ike? (b) Gịnị ka mmadụ na-aghaghị ime iji nweta izu ike ahụ nke Jisọs kwere ná nkwa?
ỊSA mmiri oyi ná ngwụsị ụbọchị na-ekpo ọkụ ma na-agba ọsụsọ, ma ọ bụ ezigbo ụra abalị mgbe e mesịrị ogologo njem na-agwụ ike—oo, lee ka o si abụ nke na-enye izu ike! Otú ahụ ka ọ dị mgbe e bupụrụ ibu dị arọ ma ọ bụ mgbe a gbaghaara mmehie na njehie. (Ilu 25:25; Ọrụ 3:19) Izu ike nke ahụmahụ ndị dị otú ahụ na-akpali akpali na-eweta na-enyeghachi anyị ume, a na-enyekwa anyị ike ịga n’ihu.
2 Ndị nile na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị e bokwasịrị ibu na ndị ike gwụrụ pụrụ ịbịakwute Jisọs, n’ihi na o kwere ha nkwa nke ahụ kpọmkwem—izu ike. Otú ọ dị, iji nweta izu ike ahụ a chọsiri ike, ọ dị ihe mmadụ na-aghaghị ịdị njikere ime. “Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m,” ka Jisọs kwuru, “unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu.” (Matiu 11:29) Gịnị ka yoke nke a bụ? Olee otú o si eweta izu ike?
Yoke Na-adịghị Egbu Mgbu
3. (a) Olee ụdị yoke ndị e jiri mee ihe n’oge Bible? (b) Gịnị ka yoke pụtara n’ụzọ ihe atụ?
3 N’ibi n’ọha mmadụ na-akọ ugbo, Jisọs na ndị na-ege ya ntị maara yoke nke ọma. N’ụzọ bụ isi, yoke bụ ogwe osisi toro ogologo nke nwere ebe abụọ bakpuru n’ime n’okpuru ya n’ụzọ ga-ekwe ka olu anụmanụ abụọ na-adọkpụ ihe, nke na-abụkarị oké ehi, banye nke ọma, iji jiri ike ha abụọ mee ihe ịdọkpụ ọ́gụ̀, ụgbọ ala, ma ọ bụ ibu ọzọ. (1 Samuel 6:7) E jikwara yoke e mere maka ndị mmadụ mee ihe. Ndị a bụ ogwe osisi nkịtị ma ọ bụ osisi kwụ ọtọ ndị a na-atụkwasị n’ubu ma kegide ibu n’isi ya abụọ. N’iji ha mee ihe, ndị ọrụ na-enwe ike ibu ibu ndị dị arọ. (Jeremaịa 27:2; 28:10, 13) Site ná njikọ dị n’etiti ya na ibu na ọrụ, a na-ejikarị yoke eme ihe n’ụzọ ihe atụ n’ime Bible iji mee ihe atụ nke inwe ikike n’ahụ na ịchịkwa ihe.—Deuterọnọmi 28:48; 1 Ndị Eze 12:4; Ọrụ 15:10.
4. Gịnị ka yoke ahụ Jisọs na-enye ndị na-abịakwute ya sere onyinyo ya?
4 Mgbe ahụ, gịnị bụ yoke nke Jisọs kpọrọ ndị na-abịakwute ya maka izu ike ka ha nyara? Cheta na o kwuru, sị: “Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m.” (Matiu 11:29) Onye na-amụ ihe bụ onye na-eso ụzọ. N’ihi ya, ịnyara yoke Jisọs pụtara n’ụzọ dị mfe ịghọ onye na-eso ụzọ ya. (Ndị Filipaị 4:3) Otú ọ dị, nke a chọrọ ihe karịrị nanị inwe nghọta ọgụgụ isi nke ozizi ya dị iche iche. Ọ na-achọ ịrụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ na ha—ịrụ ọrụ ọ rụrụ na ibi ndụ n’ụzọ o si bie. (1 Ndị Kọrint 11:1; 1 Pita 2:21) Ọ na-achọ iji ọchịchọ obi na-erubere ịbụisi ya na ndị ahụ o nyeworo ikike isi. (Ndị Efesọs 5:21; Ndị Hibru 13:17) Ọ pụtara ịghọ onye Kraịst raara onwe ya nye, e mere baptism, na-anara ihe ùgwù na ibu ọrụ nile na-eso nraranye dị otú ahụ abịa. Nke ahụ bụ yoke nke Jisọs na-enye ndị nile na-abịakwute ya maka nkasi obi na izu ike. Ị̀ dị njikere ịnakwere ya?—Jọn 8:31, 32.
5. N’ihi gịnị ka ọ na-agaghị eji bụrụ ahụmahụ na-afụ ụfụ ịnyara yoke nke Jisọs?
5 Ịchọta izu ike site n’ịnyara yoke—nke ahụ ọ́ bụghị ihe imegide onwe ya? N’ezie ọ bụghị, ebe ọ bụ na Jisọs sịrị na yoke ya “adịghị egbu mgbu.” Okwu a pụtara ịdị nro, ịdị ụtọ, ịdị mma. (Matiu 11:30; Luk 5:39; Ndị Rom 2:4; 1 Pita 2:3) Dị ka onye mụrụ ọrụ ịkwa nkà, o yikarịsịrị ka Jisọs ò mewo ọ́gụ̀ anụ ụlọ na-adọkpụ na yoke, ọ ga-amakwa otú e si akwazi yoke ka e wee nwee ike rụọ ọrụ kasịnụ a pụrụ ịrụ ná ntụsara ahụ ruo ókè o kwere mee. Ọ pụrụ ịmapado yoke ndị ahụ ákwà ma ọ bụ akpụkpọ anụ. A na-eme ọtụtụ otú ahụ ka ha ghara imepụta ọnyá ma ọ bụ ichihịasị olu n’ụzọ gabigara ókè. N’otu ụzọ ahụ, yoke ihe atụ nke Jisọs kwuru na ọ ga-enye anyị “adịghị egbu mgbu.” Ọ bụ ezie na ịbụ onye na-eso ụzọ ya na-agụnye ibu ọrụ ụfọdụ, ọ bụghị ahụmahụ na-afụ ụfụ ma ọ bụ nke na-akpagbu akpagbu kama nke na-enye izu ike. Iwu nke Nna ya nke eluigwe, Jehova, adịghịkwanụ arọ.—Deuterọnọmi 30:11; 1 Jọn 5:3.
6. Gịnị ka Jisọs pụrụ ibuworị n’uche mgbe o kwuru, sị: “Nyaranụ yoke nke m n’olu unu”?
6 Ọ dị ihe ọzọkwa na-eme ka yoke Jisọs bụrụ nke ‘na-adịghị egbu mgbu,’ ma ọ bụ nke dị mfe ịnyara. Mgbe o kwuru, sị: “Nyaranụ yoke nke m n’olu unu,” ihe ọ na-ekwu pụrụ ịbụ otu n’ime ihe abụọ. Ọ bụrụ na ihe o bu n’uche bụ yoke gbara mkpị abụọ, ya bụ, ụdị na-ejikọta anụmanụ abụọ na-adọkpụ ihe ịdọkpụrụ ibu, mgbe ahụ ọ na-akpọ anyị òkù ịbịa soro ya nyara otu yoke ahụ. Lee ihe ngọzi nke ahụ ga-abụ—Jisọs ịnọ n’akụkụ anyị soro anyị na-adọkpụ ibu anyị! N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ihe Jisọs bu n’uche bụ yoke ogologo ahụ nke ndị ọrụ nkịtị na-eji eme ihe, mgbe ahụ ọ na-enye anyị ụzọ anyị pụrụ isi mee ka ibu ọ bụla anyị bu dịrị mfe karị ma ọ bụ kwe obubu karị. Nke ọ bụla ọ bụ, yoke ya bụ isi iyi nke ezi izu ike n’ihi na ọ na-emesi anyị obi ike, sị: “N’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi.”
7, 8. Mmehie ihe dị aṅaa ka ụfọdụ na-eme mgbe ha nwere nrụgide?
7 Mgbe ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị na-eche na ibu nke nsogbu nke ndụ anyị na-ebu na-aghọ nke anyị na-agaghị ebuli nakwa na a na-arụgide anyị nke ukwuu? N’ụzọ na-ezighị ezi, ụfọdụ pụrụ iche na yoke nke ịbụ onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst sibigara ike ókè ma ọ bụ bụrụ nke na-achọ ihe gabiga ókè n’aka mmadụ, n’agbanyeghị na ọ bụ nsogbu nke ndụ bụ ihe ndị na-anyịgbu ha. Ụfọdụ ndị nọ n’ọnọdụ ahụ na-akwụsị ije nzukọ ndị Kraịst, ma ọ bụ ha na-akwụsị ikere òkè n’ozi, na-eche na ma eleghị anya na ha ga-enweta ahụ efe ụfọdụ. Otú ọ dị, nke ahụ bụ mmehie ihe dị oké njọ.
8 Anyị nwere ekele na yoke Jisọs na-enye “adịghị egbu mgbu.” Ọ bụrụ na anyị anyaraghị ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ pụrụ imerụ anyị ahụ. N’ọnọdụ ahụ anyị kwesịrị ilezi yoke dị n’ubu anyị anya. N’ihi ihe ụfọdụ, ọ bụrụ na yoke ahụ emebiela ma ọ bụ bụrụ nke a na-etinyezighị etinyezi, ọ bụghị nanị na iji ya na-eme ihe ga-achọkwu mgbalị n’akụkụ anyị kama ọ ga-akpata ụfọdụ ihe mgbu. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụrụ na ọrụ dị iche iche nke ọchịchị Chineke amalite iyi ibu nye anyị, anyị aghaghị ime nnyocha iji hụ ma anyị na-arụ ha n’ụzọ ziri ezi. Gịnị bụ nzube anyị maka ime ihe anyị na-eme? Ànyị na-akwadebe nke ọma mgbe anyị na-eje nzukọ dị iche iche? Ànyị na-adị njikere n’ụzọ anụ ahụ na n’uche mgbe anyị na-ekere òkè n’ozi ubi? Ànyị na-esoro ndị ọzọ n’ime ọgbakọ na-enwe mmekọrịta chiri anya na nke dị mma? Karịsịa, oleekwa otú mmekọrịta onwe onye dị n’etiti anyị na Jehova Chineke na Ọkpara ya, Jisọs Kraịst dị?
9. N’ihi gịnị ka yoke ndị Kraịst na-ekwesịghị mgbe ọ bụla ịbụ ibu na-anyịgbu anyịgbu?
9 Mgbe anyị ji obi anyị dum nakwere yoke Jisọs na-enye ma mụta ibu ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ dịghị ihe mere ọ ga-eji yie ibu na-anyịgbu anyịgbu mgbe ọ bụla. N’ezie, ọ bụrụ na anyị pụrụ iji anya nke uche hụ ọnọdụ ahụ—Jisọs isoro anyị nyara otu yoke ahụ—o sighịịrị anyị ike ịhụ onye n’ezie na-ebu akụkụ ka ukwuu n’ibu ahụ. O yiri nwa na-amụ ije na-adakwasị n’aka ihe e ji ebugharị ya, na-eche na ọ bụ ya na-enu ya aga n’ihu, ma otú ọ dị, n’ezie, ọ bụ nne ma ọ bụ nna ya na-enu ya. Dị ka Nna nke na-ahụ n’anya, Jehova Chineke maara nke ọma ebe ike anyị jedebere na adịghị ike anyị, ọ na-egbokwara anyị mkpa anyị site na Jisọs Kraịst. “Chineke m ga-enyezu unu ihe nile ọ bụla na-akpa unu dị ka akụ̀ Ya n’ebube si dị, n’ime Kraịst Jisọs,” ka Pọl kwuru.—Ndị Filipaị 4:19; tụlee Aịsaịa 65:24.
10. Gịnị bụworo ahụmahụ nke otu onye na-eji iso ụzọ akpọrọ ihe?
10 Ọtụtụ ndị Kraịst rarawooro onwe ha nye aghọtawo nke a site n’ahụmahụ onwe onye. Dị ka ihe atụ, e nwere Jenny, bụ́ onye chọpụtara na ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka kwa ọnwa ma na-arụ ọrụ ego oge nile nke na-arụgide arụgide nke ukwuu na-etinye ya n’oké ndọlị. Otú ọ dị, ọ na-eche na ọrụ ọsụ ụzọ na-enyere ya aka n’ezie ịnọgide na-enwe ezi nguzo ya. Inyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu nke Bible na ịhụ ka ha na-agbanwe ndụ ha iji nweta nnwapụta nke Chineke—nke a bụ ihe na-ewetara ya ọṅụ kasị ukwuu ná ndụ ya nke iji ọrụ n’aka mgbe nile. O ji obi ya nile na-ekwere n’okwu ndị ahụ nke Ilu bụ́ nke na-asị: “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”—Ilu 10:22.
Ibu Dị Mfe
11, 12. Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Ibu m dịkwa mfe”?
11 Tụkwasị n’ikwe anyị nkwa yoke ‘na-adịghị egbu mgbu,’ Jisọs na-emesi anyị obi ike, sị: “Ibu m dịkwa mfe.” Yoke ‘na-adịghị egbu mgbu’ emeworị ka ọrụ ahụ dịrị mfe karị; ọ bụrụkwa na e mee ka ibu ahụ dị mfe, ọrụ ahụ bụ n’ezie nke dị ụtọ. Otú ọ dị, gịnị ka Jisọs bu n’uche site n’okwu ahụ?
12 Tụlee ihe onye ọrụ ubi ga-eme mgbe ọ chọrọ ịgbanwere anụmanụ ya ọrụ, dị ka, site n’ịkọ ubi gaa n’ịdọkpụ ụgbọ ala. Ọ ga-ebu ụzọ wepụ ọ́gụ̀ ma kedozie ụgbọ ala. Ọ ga-abụ ihe na-enweghị isi nye ya ikekọta ma ọ́gụ̀ ma ụgbọ ala ahụ n’anụmanụ ahụ. N’otu aka ahụ, Jisọs adịghị agwa ndị mmadụ ka ha tụkwasị ibu nke ya n’elu nke ha bu ebu. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke na-eje ozi nke pụrụ ịbụ ohu nke nna abụọ.” (Luk 16:13) Otú a, Jisọs na-enye ndị mmadụ ohere ime nhọrọ. Ọ̀ ga-akara ha mma ịnọgide na-ebu ibu arọ ahụ ha na-ebu, ka hà ga-ebutu nke ahụ ma nara ihe ọ na-enye? Jisọs nyere ha ihe mkpali ịhụnanya bụ́: “Ibu m dịkwa mfe.”
13. Ibu dị aṅaa ka ndị mmadụ n’oge Jisọs na-ebu, gịnị sikwa n’ime ya pụta?
13 N’ụbọchị Jisọs, ụmụ mmadụ nọ na-adọlị n’okpuru ibu dị arọ nke ndị ọchịchị nchịgbu ndị Rom na ndị ndú okpukpe ihu abụọ, na-arapagidesi ike n’iwu ha bokwasịrị ha. (Matiu 23:23) N’ịnwa ịtụpụ ibu ndị Rom, ụfọdụ ndị nwara iji aka ha gbanwee ihe. Ha tinyere onwe ha ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nanị ịbụ ndị a lara n’iyi. (Ọrụ 5:36, 37) Ndị ọzọ kpebisiri ike imeziwanye ọnọdụ ha site n’ịbami n’oké nchụso nke ihe onwunwe. (Matiu 19:21, 22; Luk 14:18-20) Mgbe Jisọs nyere ha ụzọ isi nwee ahụ efe site n’ịkpọ ha òkù ịghọ ndị na-eso ụzọ ya, ọ bụghị mmadụ nile dị njikere ịnakwere ya. Ha adịchaghị njikere ibutu ibu ha bu, n’agbanyeghị na ọ dị arọ, ma buru nke ya. (Luk 9:59-62) Lee mmehie ihe dị oké njọ ọ bụ!
14. Olee otú nchegbu nke ndụ na ọchịchọ nke ihe onwunwe pụrụ isi nyịgbuo anyị?
14 Ọ bụrụ na anyị elezighị anya, anyị pụrụ ime otu mmehie ihe ahụ taa. Ịghọ ndị na-eso ụzọ Jisọs na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ịchụso otu ihe mgbaru ọsọ na ụkpụrụ ndị dị ka ndị nke ụwa na-eme. Ọ bụ ezie na anyị ka ga na-arụsi ọrụ ike iji nweta ihe ndị dị anyị mkpa kwa ụbọchị, anyị adịghị eme ihe ndị a ihe bụ isi ná ndụ anyị. Ma, nchegbu nke ndụ na ihe ndọrọ nke ntụsara ahụ ihe onwunwe pụrụ ijidesi anyị aka ike. Ọ bụrụ na anyị enyere ya ohere, ọchịchọ ndị dị otú ahụ pụrụ ọbụna ịkpagbu eziokwu ahụ nke anyị jiworo ọchịchọ siri ike nakwere. (Matiu 13:22) Anyị pụrụ imikpu onwe anyị nke ukwuu n’imezu ọchịchọ ndị dị otú ahụ nke na ibu ọrụ anyị nke ndị Kraịst na-aghọ ibu ọrụ ndị na-agwụ ike nke na anyị na-achọ nnọọ imechapụ ya iji mezuo iwu. N’ezie anyị apụghị ịtụ anya inweta izu ike ọ bụla site n’ozi anyị na-ejere Chineke ma ọ bụrụ na e ji mmụọ dị otú ahụ na-eme ya.
15. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jisọs nyere banyere ọchịchọ ihe onwunwe?
15 Jisọs gosipụtara na ndụ nke afọ ojuju na-abịa, ọ bụghị site n’ịgbalisi ike imezu ihe nile anyị chọrọ, kama site n’ijide n’aka ihe ndị ka mkpa ná ndụ. “Unu echegbula onwe unu nye ndụ unu, ihe unu ga-eri, ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ; echegbukwala onwe unu nye ahụ unu, ihe unu ga-eyi,” ka o nyere ndụmọdụ ya. “Ọ́ bụghị ndụ karịrị ihe e ji azụ ya, ọ́ bụghịkwa ahụ karịrị uwe oyiyi ya?” Mgbe ahụ ọ kpọtụrụ uche ná nnụnụ nke eluigwe ma kwuo, sị: “Ha adịghị agha mkpụrụ, ha adịghị ewekwa ihe ubi, ha adịghị ekpokọtakwa ihe baa n’ọbá; ma Nna unu nke eluigwe na-azụ ha.” N’izo aka n’ebe urodi nke ubi dị, o kwuru, sị: “Ha adọgbughị onwe ha n’ọrụ, ha atụghịkwa ogho: ma asị m unu, na ọbụna Solomọn n’ebube ya nile, e gbokwasịghị ya ákwà dị ka otu n’ime ndị a.”—Matiu 6:25-29.
16. Gịnị ka ahụmahụ gosiworo banyere ihe ndị na-esi ná nchụso ihe onwunwe apụta?
16 Ànyị pụrụ ịmụta ihe site n’ihe atụ ntakịrị ndị a nwere ihe mmụta? Ọ bụ ahụmahụ zuru ebe nile na ka mmadụ na-agbalịsikwu ike ime ka ọnọdụ ya ná ndụ dịkwuo mma n’ụzọ ihe onwunwe, otú ahụ ka ọ na-eji nchụso nke ụwa na-ekegidekwu onwe ya, otú ahụkwa ka ibu na-adịkwasị ya n’ubu na-adị arọ karị. Ụwa jupụtara ná ndị oji ego achụ ego, bụ́ ndị jiworo ezinụlọ e kewara ekewa, alụmdi na nwunye dakpọrọ adakpọ, ahụ ike mebiworo emebi, na ihe ndị ọzọ kwụọ ụgwọ ihe ịga nke ọma ha n’ụzọ ihe onwunwe. (Luk 9:25; 1 Timoti 6:9, 10) Onye nwetara ihe nrite Nobel bụ́ Albert Einstein kwuru n’otu mgbe, sị: “Ihe onwunwe, ihe ịga nke ọma a na-ahụ anya, ịbụ onye ọha maara, ndụ okomoko—nye m ihe ndị a abụwo mgbe nile ihe a kpọrọ asị. M kwere na ụdị ndụ dị mfe na nke na-abụghị nke nganga bụ nke kasị mma nye onye ọ bụla.” Nke a bụ nanị ikwughachi okwu ndụmọdụ dị mfe nke Pọl onyeozi: “Nsọpụrụ Chineke, ya na inwezu ihe nile dị mkpa, bụ ụzọ irite uru nke ukwuu.”—1 Timoti 6:6.
17. Ụdị ndụ dị aṅaa ka Bible na-atụ aro ya?
17 Ọ dị akụkụ dị mkpa anyị na-ekwesịghị ileghara anya. Ọ bụ ezie na “ụdị ndụ dị mfe na nke na-abụghị nke nganga” nwere ọtụtụ abamuru, ọ bụghị ya n’onwe ya na-eweta afọ ojuju. E nwere ọtụtụ ndị ụdị ndụ ha dị mfe n’ihi ịbụ ndị ọnọdụ manyere ịdị otú ahụ, ma ha abụtụghị ndị afọ juru ma ọ bụ ndị obi ụtọ. Bible adịghị agba anyị ume ịjụ ịma ụtọ nke ihe onwunwe ma na-ebi ndụ nke onye na-anọ nanị ya. Ebe e lekwasịrị anya bụ ná nsọpụrụ Chineke, ọ bụghị inwezu ihe nile dị mkpa. Ọ bụ nanị mgbe anyị jikọtara ha abụọ ka anyị na-enwe “ụzọ irite uru nke ukwuu.” Uru dị aṅaa? N’ịga n’ihu n’otu akwụkwọ ozi ahụ, Pọl na-egosipụta na ndị ‘na-atụkwasị obi ọ bụghị n’ihe ahụ a na-ejighị n’aka, bụ́ akụ̀, kama na Chineke’ ga ‘na-akpadoro onwe ha ntọala ọma nye oge gaje ịbịa, ka ha wee jide ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie.’—1 Timoti 6:17-19.
18. (a) Olee otú mmadụ pụrụ isi chọta ezi izu ike? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi lee mgbanwe ndị ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị mee anya?
18 Anyị ga-enwe izu ike ma ọ bụrụ na anyị amụta ibutu ibu dị arọ nke onwe anyị nke anyị pụrụ ịdị na-ebu ma buru ibu dị mfe nke Jisọs na-enye. Ọtụtụ ndị hazigharịworo ndụ ha ka ha wee nwee ike ikere òkè n’ụzọ zuru ezu karị n’ije ozi Alaeze ahụ achọtawo ụzọ nke ndụ obi ụtọ na nke afọ ojuju. Otú ọ dị, ọ na-achọ okwukwe na obi ike maka mmadụ iwere nzọụkwụ dị otú ahụ, a pụkwara inwe ihe mgbochi dị iche iche. Ma Bible na-echetara anyị, sị: “Onye na-arịba ifufe ama agaghị agha mkpụrụ; ọzọ, onye na-elekwasị igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.” (Eklisiastis 11:4) Ọtụtụ ihe adịghị esicha ike otú ahụ n’ezie ozugbo anyị kpebiworo ime ha. O yiri ka akụkụ kasị sie ike bụ ime mkpebi. Anyị pụrụ ime onwe anyị ike ọgwụgwụ site n’anyị ịdị na-agba mgba ma ọ bụ iguzogide echiche ahụ. Ọ bụrụ na anyị ekee ajị̀ n’ume ma nakwere ihe ịma aka ahụ, ọ pụrụ iju anyị anya ịchọpụta ihe ngọzi ọ ga-emesị bụrụ. Onye ọbụ abụ gbara ume, sị: “Detụnụ ire, hụ na Jehova dị mma.”—Abụ Ọma 34:8; 1 Pita 1:13.
“Izu Ike Nye Mkpụrụ Obi Unu”
19. (a) Gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya ka ọnọdụ nke ụwa na-anọgide na-adịwanye njọ? (b) Mgbe anyị nọ n’okpuru yoke Jisọs, gịnị ka anyị ga-ejide n’aka?
19 Pọl onyeozi chetaara ndị na-eso ụzọ na narị afọ mbụ, sị: “Anyị aghaghị isite n’ọtụtụ mkpagbu baa n’alaeze Chineke.” (Ọrụ 14:22) Nke ahụ ka bụ eziokwu taa. Ka ọnọdụ ụwa na-anọgide na-adịwanye njọ, nrụgide ndị na-abịakwasị mmadụ nile kpebisiri ike ịdị ndụ nke ezi omume na nsọpụrụ Chineke ga-adị ukwuu ọbụna karị. (2 Timoti 3:12; Mkpughe 13:16, 17) Ma, mmetụta anyị na-adị ka nke Pọl mgbe o kwuru, sị: “A na-akpagbu anyị n’akụkụ nile, ma a dịghị akpagbubiga anyị ókè; anyị nwere obi abụọ, ma anyị adịghị enwebiga obi abụọ ókè; a na-esogbu anyị, ma a dịghị ahapụ nanị anyị; a na-atụda anyị n’ala, ma a dịghị ala anyị n’iyi.” Ihe kpatara ya bụ na anyị pụrụ ịdabere na Jisọs Kraịst inye anyị ọkịka nke ike. (2 Ndị Kọrint 4:7-9) Site n’iji obi anyị dum nakwere yoke nke ịbụ ndị na-eso ụzọ, anyị ga-enweta mmezu nke nkwa Jisọs: “Unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu.”—Matiu 11:29.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Gịnị bụ yoke ahụ na-adịghị egbu mgbu nke Jisọs nyere?
◻ Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị na-eche na yoke anyị na-aghọ ibu arọ?
◻ Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Ibu m dịkwa mfe”?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ibu anyị nọgidere na-adị mfe?