Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/08 p. 1
  • “Nyaranụ Yok M”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Nyaranụ Yok M”
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Yoke nke M Adịghị Egbu Mgbu, Ibu M Dịkwa Mfe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Jizọs Gwara Ndị Mmadụ Okwu Gbara Ha Ume
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • “Bịakwutenụ M, . . . M Ga-emekwa Ka Unu Nweta Ume”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Nweta Ume Site n’Ime Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ife Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 5/08 p. 1

“Nyaranụ Yok M”

1 N’ụwa a nke nsogbu jupụtara na ya, nakwa nke e nwere ọtụtụ ihe na-echegbu ndị mmadụ, ahụ́ eruola anyị nnọọ ala n’ihi na anyị mere ihe Jizọs gwara anyị mee, nke bụ́ ịnyara yok ya nke na-enye ume. (Mat. 11:29, 30) Onye kwetara ịnyara yok Jizọs nke bụ́ ịghọ onye na-eso ụzọ ya ekwetala ịrụ otu ọrụ siri ike ma na-enye ume. Ọrụ a gụnyere ikwusa ozi ọma Alaeze na inyere ndị mmadụ aka iso anyị nweta ume mmadụ na-enweta ma ọ nyara yok Jizọs nke na-adịghị egbu mgbu.—Mat. 24:14; 28:19, 20.

2 Inweta Ume Site n’Ozi Ọma: Jizọs agwaghị ụmụazụ ya ka ha buru ibu ya bukwasị na nke ha bu ebu. Ọ gwara ha ka butuo ibu arọ ha bu ma buru nke ya na-adịghị arọ. Nchegbu niile na enweghị olileanya niile e ji mara ụwa ọjọọ a anaghịzi anyịgbu anyị; anyị anaghịkwa adọgbu onwe anyị n’ọrụ iji nweta akụnụba a na-ejighị n’aka. (Luk 21:34; 1 Tim. 6:17) A sịgodị na anyị na-arụsi ọrụ ike iji nweta nri ụbọchị, anyị na-ebute ofufe Chineke ụzọ ná ndụ anyị. (Mat. 6:33) Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ebute ihe ndị ka mkpa ụzọ, ikwusa ozi ọma ga na-enye anyị ume mgbe niile kama ịbụrụ anyị ibu arọ.—Fil. 1:10.

3 Obi na-atọkarị anyị ụtọ mgbe anyị na-ekwu banyere ihe ọ bụla na-amasị anyị. (Luk 6:45) Ihe banyere Jehova na ngọzi ndị o kwere nkwa na Alaeze ya ga-ewetara anyị na-amasị nnọọ Ndị Kraịst niile. N’ihi ya, ọ bụ nnọọ ihe na-enye obi ụtọ ikwu banyere “ozi ọma nke ihe dị mma” na ileghara ihe ndị na-echegbu anyị kwa ụbọchị anya mgbe anyị nọ n’ozi! (Rom 10:15) O doro anya na ka anyị na-emekwu ihe, otú ahụ ka ihe ahụ ga na-amarakwu anyị ahụ́ ma na-enyekwu anyị ọṅụ. N’ihi ya, anyị iwepụtakwu oge maka ozi ọma, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe anyị mee, ga-eme ka anyị nwetakwuo ume. Ọ bụrụkwa na ndị anyị na-ezi ozi ọma aṅaa anyị ntị, anyị na-enwekwu nnọọ ume! (Ọrụ 15:3) Ọbụna mgbe ndị mmadụ na-egeghị anyị ntị ma ọ bụ mgbe ha na-emegide anyị, ozi ọma ga-eme ka mmekọrịta anyị na Chineke sikwuo ike ma ọ bụrụ na anyị eburu n’obi na mgbalị anyị na-eme na-atọ Jehova ụtọ, nakwa na ezigbo ihe ọ bụla ozi anyị rụpụtara bụ n’ihi ngọzi ya.—Ọrụ 5:41; 1 Kọr. 3:9.

4 Ọ bụrụ na anyị anyara yok ahụ Jizọs gwara anyị nyara, anyị ga-enwe ihe ùgwù nke iso ya na-eje ozi dị ka Ndịàmà Jehova. (Aịza. 43:10; Mkpu. 1:5) Ọ dịghị ihe nwere ike inye anyị ume karịa nke ahụ!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya