Ụwa nke Agha Na-adịghị na Ya—Olee Mgbe?
AKWỤKWỌ Iwu nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu malitere ịdị irè n’October 24, 1945. Ọ bụ atụmatụ kasị saa mbara ụmụ mmadụ mepụtatụworo maka udo ụwa. N’inwe 51 Mba so n’òtù ahụ ná mmalite, òtù Mba Ndị Dị n’Otu ghọrọ òtù mba nile kasị buo ibu n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa. Ọzọkwa, na nke mbụ ya, òtù mba nile ga-enwe ndị agha iji hụ na e nwere udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ma weta ụwa nke agha na-adịghị na ya.
Taa, n’inwe 185 Mba ndị so n’òtù ya, òtù Mba Ndị Dị n’Otu siri ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Gịnị meziri na òtù mba nile nke kasị sie ike n’akụkọ ihe mere eme jiworo daa n’imezu ebumnobi ya ndị mara mma n’ụzọ zuru ezu?
Okpukpe—Oké Ihe Ndọghachi Azụ
Otu nsogbu bụ isi bụ òkè okpukpe na-ekere n’ihe omume ụwa. N’eziokwu, kemgbe mmalite nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu, okpukpe ndị bụ isi nke ụwa ekwewo nkwa inye òtù ahụ nkwado ha. N’izo aka n’ememe ịgba 50 afọ ya, Pope John Paul nke Abụọ kwuru banyere òtù Mba Ndị Dị n’Otu dị ka “ngwa ọrụ kasị mma maka ịkwalite na ichekwa udo.” Ndị ndú okpukpe n’ụwa nile nwere otu mmetụta ahụ. Ma mmekọrịta a chọrọ akọ nke dị n’agbata okpukpe na gọọmenti apụghị ikpuchi eziokwu ahụ bụ na okpukpe anọwo na-abụrụ òtù Mba Ndị Dị n’Otu ihe ndọghachi azụ na nsogbu.
Ruo ọtụtụ narị afọ okpukpe ekerewo òkè bụ isi n’ịkwalite ma ọ bụ ịkwado ịkpọasị nke mba, agha, na mgbukpọ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, n’aha nke ịnụrụ okpukpe ọkụ n’obi, ndị agbata obi egburịtawo ibe ha. Okwu ahụ bụ́ “mkpochapụ agbụrụ” abụrụwo nke e ji mee ihe n’ụzọ sara mbara n’ihe metụtara agha dị ná mba ndị dị na Balkan. Otú ọ dị, ajọ ịkpọasị nke ọtụtụ ndị nọ n’ebe ahụ nwere n’ebe ibe ha nọ gbadoro ụkwụ n’okpukpe mmadụ na-ekpe kama ịbụ n’agbụrụ, ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha si n’otu agbụrụ. Ee, okpukpe aghaghị ịnakwere ụta dị ukwuu maka oké nkwafu ọbara n’ebe bụbu Yugoslavia, òtù Mba Ndị Dị n’Otu enwebeghị ike ịkwụsị ya.
N’ụzọ kwesịrị ekwesị, onye prọfesọ n’ihe banyere okpukpe n’otu kọleji kwuru na nso nso a na “n’ime ụwa nke dị mgbe agha nzuzo gasịworo bụ́ ebe e nwere ịrị elu nke agha okpukpe, inyocha okpukpe na mgbukpọ nke agbụrụ pụrụ ịbụ otu n’ime ihe ndị kasị anyị mkpa, n’agbanyeghị ahụ erughị ala ọ na-akpalite.” Taa a na-ahụ nghọta ọhụrụ nke otú okpukpe si na-adọghachi mgbalị ndị a na-eme maka udo ụwa.
Mkpọsa nke òtù UN mere na 1981 kwuru, sị: “N’ịbụ ndị ngosipụta nile nke ekweghị ibe nọrọ na ịdị adị nke ịkpa ókè n’okwu ndị metụtara okpukpe ma ọ bụ nkweta ndị a ka na-ahụ n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa na-echegbu, Kpebiri ime ihe dị mkpa maka mkpochapụ dị ngwa nke ekweghị ibe nọrọ dị otú ahụ n’ụdị ya nile na igbochi ma lụsoo ịkpa ókè n’ihi okpukpe ma ọ bụ nkweta ọgụ.”
N’ikwekọ ná mkpọsa ha, òtù Mba Ndị Dị n’Otu akpọsawo 1995 ịbụ Afọ Maka Ikwe Ibe Nọrọ. Otú ọ dị, n’ikwu ya n’ụzọ ga-ekwe nghọta, ọ̀ dị mgbe ọ ga-ekwe omume inwe udo na ịnọ ná ntụkwasị obi n’ime ụwa nke okpukpe kewasịrị?
Ọdịnihu nke Okpukpe
Otu amụma nke dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-enye azịza ya. Ọ na-ekwu banyere ‘nwanyị ihe atụ nke na-akwa iko’ nke na-anọkwasị dị ka “eze nwanyị,” nweekwa “alaeze na-achị ndị eze ụwa.” Nwanyị a na-akwa iko na-ebi ‘n’otuto o nyere onwe ya,’ sorokwa gọọmenti dị iche iche nke ụwa nwee mmekọahụ. E gosiri gọọmenti ndị a dị ka ‘anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie,’ bụ nke nwanyị ahụ na-akwa iko nọkwasịrị n’elu ya ná ntụsara ahụ. (Mkpughe 17:1-5, 18; 18:7) N’ịbụ nke a maara dị ka “Babilọn Ukwu ahụ,” nwanyị a dị ike nke nwere omume rụrụ arụ bụ nke a gụrụ aha Babilọn oge ochie, bụ ebe okpukpe ikpere arụsị malitere. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, taa nwanyị ahụ na-akwa iko na-anọchite anya okpukpe nile nke ụwa, bụ ndị tinyeworo aka n’ihe omume nile nke gọọmenti dị iche iche.
Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu ikwu na, ka oge na-aga, Chineke ga-etinye ya n’obi nke akụkụ anụ ọhịa ahụ nke ndị agha mejupụtara ime ihe. Ndị a “ga-akpọ nwanyị ahụ na-akwa iko asị, ha ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ.” (Mkpughe 17:16)a Otú a, Jehova Chineke n’onwe ya ga-ebuteworị ụzọ n’ime ihe site n’ime ka mba ndị dị ike banye n’usoro ihe omume iji kpochapụ okpukpe ụgha. A ga-ebibi usoro okpukpe zuru ụwa ọnụ, ya na ụlọ nsọ ya dị iche iche dị okomoko na ebe nsọ ya nile, kpam kpam. Ndọghachi azụ nke okpukpe n’iguzobe udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ga-abụ nke e wepụrụ mgbe ahụ. Ma ọbụna n’oge ahụ, à ga-enwe ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi n’elu ụwa?
Ọdịdị Na-ezughị Okè nke Mmadụ
È ji n’aka na ikpochapụ okpukpe ga-eduje n’ezie n’ụwa nke agha na-adịghị na ya? Ee e. Òtù Mba Ndị Dị n’Otu ga-anọgide na-eche ọnọdụ na-emegiderịta onwe ya ihu. N’otu aka, ndị mmadụ chọrọ udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ma, n’aka nke ọzọ, ọ bụ ndị mmadụ bụ ihe iyi egwu kachasị ukwuu nye udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ịkpọasị, mpako, ịchọ otuto efu, ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, na amaghị nke a na-akọ bụcha àgwà ụmụ mmadụ ndị na-akpata agha na esemokwu nile.—Jemes 4:1-4.
Bible buru amụma na n’ụbọchị anyị ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu.”—2 Timoti 3:1-4.
Odeakwụkwọ Ukwu bụ́ Boutros Boutros-Ghali kwetara na “ụwa nọ ná nsogbu nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya na nke omume bụ nke, n’ọtụtụ ọha mmadụ, ruru ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu.” E nweghị atụmatụ inwe nkwekọrịta n’etiti mba na mba nke pụrụ ihichapụ àgwà ọjọọ nile nke ọdịdị na-ezughị okè nke mmadụ.—Tụlee Jenesis 8:21; Jeremaịa 17:9.
Jisọs Kraịst—Onyeisi Udo
N’ụzọ doro anya, òtù Mba Ndị Dị n’Otu enweghị ike iweta udo ụwa. Ndị òtù ya na ndị nkwado ya bụcha ụmụ mmadụ na-ezughị okè, n’agbanyeghị ihe mgbaru ọsọ ha ndị magburu onwe ha. Bible na-asị na “ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Ọzọkwa, Chineke na-adọ aka ná ntị, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.”—Abụ Ọma 146:3.
Bible na-ebu amụma ihe Jehova ga-arụzu site n’aka Ọkpara ya, bụ́ “Onyeisi Udo.” Aịsaịa 9:6, 7 na-ekwu, sị: “A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya Onye Ebube, Onye Ndụmọdụ, Chineke Nke bụ Dike, Nna Nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi, Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ.”
Iri afọ ise nke mgbalị ndị dara ada agwụwo mba nile nke ụwa ike. N’isi nso ha ga-ebibi nzukọ okpukpe nile yiri nwanyị na-akwa iko. Mgbe ahụ Jisọs Kraịst, bụ́ “Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile,” na ìgwè ndị agha ya nke eluigwe ga-ekposa ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ ma gbuo ndị nile jụrụ ọkaaka Chineke. (Mkpughe 19:11-21; tụlee Daniel 2:44.) Ọ bụ n’ụzọ dị otú a ka Jehova ga-esi weta ụwa nke agha na-adịghị na ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Maka ihe ọmụmụ miri emi nke amụma Mkpughe banyere Babilọn Ukwu ahụ, lee isi 33 ruo 37 nke akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York Inc., bipụtara na 1994.
[Igbe dị na peeji nke 7]
OTÚ NDỊ KRAỊST SI ELE ÒTÙ MBA NDỊ DỊ N’OTU ANYA
N’amụma Bible, a na-ejikarị anụ ọhịa eme ihe atụ nke ọchịchị ụmụ mmadụ. (Daniel 7:6, 12, 23; 8:20-22) Ya mere, ruo ọtụtụ iri afọ, magazin Ụlọ Nche ejikọtawo anụ ọhịa ndị dị ná Mkpughe isi nke 13 na 17 na ọchịchị ụwa nke taa. Nke a na-agụnye òtù Mba Ndị Dị n’Otu, bụ́ nke e gosiri ná Mkpughe isi nke 17 dị ka anụ ọhịa na-acha uhie uhie nke nwere isi asaa na mpi iri.
Otú ọ dị, ụzọ ile ihe anya nke a nke Akwụkwọ Nsọ adịghị anabata ụdị ọ bụla nke enweghị nkwanye ùgwù maka ọchịchị dị iche iche ma ọ bụ ndị isi ha. Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụru na Chineke edoghị ya; ndị na-achị isi bụkwa ndị Chineke doworo. Ya mere onye na-edo onwe ya megide onye ahụ na-achị isi, ọ na-eguzogide iwu Chineke nyere: ma ndị na-eguzogide ga-anata ikpe nye onwe ha.”—Ndị Rom 13:1, 2.
N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-ejigide nnọpụiche kpam kpam na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, adịghị etinye aka n’ọchịchị ụmụ mmadụ. Ọ dịghị mgbe ha na-akpalite mgbanwe ma ọ bụ na-ekere òkè n’omume inupụrụ ọchịchị isi. Kama nke ahụ, ha na-aghọta na ọ dị mkpa inwe ụdị ụfọdụ nke ịchị ọchịchị iji hụ na a na-edebe iwu na ịdị n’usoro n’ọha mmadụ.—Ndị Rom 13:1-7; Taịtọs 3:1.
Ndịàmà Jehova na-ele òtù Mba Ndị Dị n’Otu anya dị ka ha si ele òtù ọchịchị ndị ọzọ nke ụwa anya. Ha kwetara na òtù Mba Ndị Dị n’Otu nọgidere na-adị ná nkwere nke Chineke. N’ikwekọ n’ihe Bible kwuru, Ndịàmà Jehova na-akwanyere ọchịchị nile ùgwù ruuru ha ma na-erubere ha isi ma ọ bụrụhaala na nrubeisi dị otú ahụ adịghị achọ ka ha mehie megide Chineke.—Ọrụ 5:29.