Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 12/15 p. 8-10
  • Ndị Amọn Ndị Ji Ibu Iro Kwụghachi Obi Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Amọn Ndị Ji Ibu Iro Kwụghachi Obi Ọma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gilead—Ókèala Maka Ndị Nwere Obi Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Jefta Mezuru Nkwa O Kwere Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Mba Dị Iche Iche ‘Ga-amara na M Bụ Jehova’
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
  • Sọl​—⁠Eze Mbụ nke Izrel
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 12/15 p. 8-10

Ndị Amọn Ndị Ji Ibu Iro Kwụghachi Obi Ọma

OBODO oge ugbu a nke a na-akpọ Amman, nke bụ́ isi obodo alaeze Hashem nke Jọdan, mere ka a na-echeta otu ndị na-anọkwaghị n’elu ụwa. A kpọrọ ha ndị Amọn. Ole ndị ka ha bụ, oleekwa ihe mmụta anyị pụrụ inweta site n’ọdịda ha?

Ndị Amọn sitere n’usoro ọmụmụ nke onye ezi omume bụ́ Lọt. (Jenesis 19:35-38) Ebe Lọt bụ nwa nwanne Abraham, ị pụrụ ikwu na ndị Amọn bụ ụmụ nke nwanne nna ndị Israel. Otú ọ dị, ụmụ Lọt chigharịkwuuru ofufe nke chi ụgha. Ma, Jehova Chineke nọgidere na-enwe mmasị n’ebe ha nọ. Ka mba Israel rutere Ala Nkwa ahụ, Chineke dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Akpagbula [ndị Amọn], alụsokwala ha ọgụ: n’ihi na M gaghị enye gị ala sitere n’ala ụmụ Amọn ka ọ bụrụ ihe nnweta: n’ihi na ụmụ Lọt ka M nyeworo ya ịbụ ihe nnweta.”—Deuterọnọmi 2:19.

Ndị Amọn, hà nwere ekele maka obi ọma dị otu ahụ? N’ụzọ megidere nke ahụ, ha jụrụ ịnakwere na Jehova enyewo ha ihe ọ bụla. Ha ji ibu iro nke a nọgidere na-enwe megide ndị Chineke, bụ́ Israel, kwụghachi mmasị obi ọma nke Chineke gosiri n’ebe ha nọ. Ọ bụ ezie na ndị Israel sọpụụrụ iwu Jehova wee ghara ime mwakpo ọ bụla megide ha, ndị Amọn na ụmụnne ha bụ́ ndị Moab nwere mmetụta nke ịbụ ndị e yiri egwu. N’eziokwu, ndị Amọn emeghị mwakpo agha ọ bụla, ma ha goro onye amụma a na-akpọ Belam ọrụ ma gwa ya ka ọ kọchaa Israel!—Ọnụ Ọgụgụ 22:1-6; Deuterọnọmi 23:3-6.

Otu ihe dị ịtụnanya mere n’oge ahụ. Bible na-akọ na Belam enweghị ike ikwupụta nkọcha ya. Ọ pụrụ ikwupụta nanị ngọzi n’ebe ha nọ, na-asị: “Onye ọ bụla nke na-agọzi gị bụ onye a gọziri agọzi, onye ọ bụla nke na-abụ gị ọnụ bụkwa onye a na-abụ ọnụ.” (Ọnụ Ọgụgụ 24:9) Ndị o metụtara, tinyere ndị Amọn, kwesịrị ịmụtaworị oké ihe site na nke a: Mgbe o metụtara ndị Chineke, ọ dị nnọọ njikere ime ihe n’ihi ha!

Otú ọ dị, ndị Amọn nọgidere na-achọ ụzọ isi megide Israel. N’oge Ndị Ikpe, Amọn na ndị Moab na ndị Amalek jikọtara aka wee wakwasị Ala Nkwa ahụ, na-aga n’ihu ruo Jeriko. Otú ọ dị, mmeri adịteghị aka, ebe Onye Ikpe Ihud nke Israel chụghachiri ndị mwakpo ahụ azụ. (Ndị Ikpe 3:12-15, 27-30) Nkwụsịtụ agha nke na-adịghị jụụ dịgidere ruo n’ụbọchị Onye Ikpe Jefta. N’oge ahụ, mba Israel adabawo n’ikpere arụsị, ya mere Jehova kwụsịrị ichebe ha. Ruo ihe dị ka afọ 18, Chineke si otú a “renye ha . . . n’aka ụmụ Amọn.” (Ndị Ikpe 10:6-9) Ọzọkwa e meriri ndị Amọn mmeri dị ilu ka ndị Israel hapụrụ ikpere arụsị wee bịakọtakwa ọnụ ọzọ n’okpuru idu ndú nke Jefta.—Ndị Ikpe 10:16–11:33.

Oge ọchịchị nke ndị ikpe n’Israel ruru ná njedebe ya n’ochichi nke eze mbụ ya, bụ́ Sọl. N’oge na-adịghị anya mgbe Sọl malitesịrị ịchị, ibu iro nke ndị Amọn malitekwara ọzọ. Eze Nehash mere mwakwasị mberede n’obodo Israel bụ́ Jebesh-gilead. Mgbe ndị ikom nke obodo ahụ rịọrọ maka udo, Nehash onye Amọn kwuru ka e mee ihe a jọgburu onwe ya: “Na nke a ka mụ na unu ga-agba ndụ, n’ịrụkpọ unu anya aka nri nile.” Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Flavius Josephus kwuru na e mere nke a n’otu akụkụ dị ka ime ihe nchebe agha, ka ọ ga-abụ “mgbe e jiri ọtá kpuchie anya aka ekpe ha, ha agaghị aba nnọọ uru ọ bụla n’agha.” Ma, nzube bụ isi nke iwu obi ịta mmiri nke a bụ iji ndị Israel ndị a mee ihe atụ nke mweda n’ala.—1 Samuel 11:1, 2.

Ọzọkwa ndị Amọn ejiriwo ibu iro kwụghachi obi ọma nke Jehova. Jehova elegharaghị iyi egwu obi ọjọọ nke a anya. “Mmụọ nke Chineke wee dakwasị Sọl n’ike mgbe ọ nụrụ okwu ndị a [nke Nehash], iwe ya wee dị ọkụ nke ukwuu.” N’okpuru nduzi nke mmụọ Chineke, Sọl chịkọtara ìgwè dị 330,000 ndị ikom agha bụ́ ndị meriri ndị Amọn nke na “ọ fọdụghịkwa ndị ikom abụọ n’otu ebe n’etiti ha.”—1 Samuel 11:6, 11.

Omume itinyebiga uche oke ná mmasị onwe nke ndị Amọn, obi ịta mmiri ha, na anyaukwu ha mesịrị duga ná mbibi ha kpam kpam. Dị ka onye amụma Jehova bụ́ Zefanaịa sị buo n’amụma, ha dịzi “ka Gọmọra . . . ebe tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighi ebi . . . n’ihi na ha atawo ndị Jehova nke usuu nile nke ndị agha ụta, mee onwe ha ukwuu imegide ha.”—Zefanaịa 2:9, 10.

Ndị ndú ụwa taa kwesịrị ịrịba ama ihe mere ndị Amọn. Chineke n’otu ụzọ ahụ egosiwo mba nile ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke obi ọma n’ikwere ka ha biri n’ihe mgbakwasị ụkwụ ya, bụ́ ụwa. Ma kama ilekọta ụwa, mba ndị na-achọ ọdịmma onwe ha na-emebi ya, ọbụna jiri mbibi nke nuklia yie mbara ala egwu. Kama igosi obi ọma n’ebe ndị na-efe Jehova n’ụwa nọ, mgbe mgbe mba dị iche iche na-egosi ibu iro, na-ewetara ha mkpagbu dị ilu. Ya mere ihe mmụta nke ndị Amọn bụ na Jehova adịghị ewere ya dị ka ihe dị nta iji ibu iro kwụghachi obi ọma ya. Mgbe oge ya ruru, ọ ga-eme ihe, dị ka o mere n’oge ochie.—Tụlee Abụ Ọma 2:6-12.

[Foto dị na peeji nke 9]

Mkpọmkpọ ebe nke ndị Rom nke dị n’Amman, ebe Rabbah dị, bụ́ isi obodo nke ndị Amọn

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị Amọn biri n’ógbè a

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 8]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya