Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 3/15 p. 8-9
  • Ịṅa Ntị n’Okwu Nọdụ Mma nke Jisọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịṅa Ntị n’Okwu Nọdụ Mma nke Jisọs
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-emenụ Nke A Ka Unu wee Na-echeta M”
  • ‘M Na-enye Unu Iwu Ọhụrụ’
  • “Na-emenụ Nke A Ka Unu Wee Na-echeta M”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Ihe Omume nke Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-eme Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Nwere Ihe Dị Ukwuu Ọ Pụtara Nye Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 3/15 p. 8-9

Ha Mere Uche Jehova

Ịṅa Ntị n’Okwu Nọdụ Mma nke Jisọs

N’UHURUCHI nke Nisan 14, 33 O.A., Jisọs Kraịst na ndị ozi ya 11 kwesịrị ntụkwasị obi nọdụrụ ala iri nri n’ime ọnụ ụlọ dị n’elu na Jerusalem. N’ịmata na ọnwụ ya dị nso, ọ gwara ha, sị: “Ọ fọdụrụ nwa oge Mụ na unu ga-anọ.” (Jọn 13:33) N’ezie, Judas Iskarịọt apụọlarị ije soro ndị ajọ mmadụ ndị chọrọ ka e gbuo Jisọs gbaa izu.

Ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ime ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu nke ghọtara ịdị ngwa nke ọnọdụ ahụ karịa otú Jisọs ghọtara. Ọ maara nke ọma na ya na-aga ịta ahụhụ. Jisọs makwaara na ndị ozi ya ga-agbahapụ ya n’abalị ahụ. (Matiu 26:31; Zekaraịa 13:7) Ebe ọ bụ na nke a bụ ohere ikpeazụ Jisọs nwere tupu ọnwụ ya isoro ndị ozi ya kwurịta okwu, anyị pụrụ ijide n’aka na okwu nọdụ mma ya lekwasịrị anya n’ihe ndị dị mkpa karịsịa.

“Na-emenụ Nke A Ka Unu wee Na-echeta M”

Ka ya na ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi nọ, Jisọs guzobere ememe ọhụrụ nke ga-anọchi anya Ememe Ngabiga ndị Juu. Pọl onyeozi kpọrọ ya “nri anyasị nke Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 11:20) Ka o weere otu ógbè achịcha na-ekoghị eko, Jisọs kpere ekpere. Ọ nyawaziri achịcha ahụ ma nye ndị ozi ya achịcha ahụ. “Naranụ, rie; nke a bụ ahụ m,” ka o kwuru. Mgbe ahụ ọ narakwa otu iko mmanya, kpee ekpere ekele wee nye ya ndị ozi ya, na-asị: “Unu nile ṅụọ n’ime ya; n’ihi na nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ, nke a na-awụsịrị ọtụtụ mmadụ ka e wee gbaghara mmehie.”—Matiu 26:26-28.

Gịnị ka ihe omume a pụtara? Dị ka Jisọs gosiri, achịcha ahụ nọchitere anya ahụ ya na-enweghị mmehie. (Ndị Hibru 7:26; 1 Pita 2:22, 24) Mmanya ahụ nọchitere anya ọbara Jisọs nke a wụsịrị, nke ga-eme ka mgbaghara mmehie kwe omume. Ọbara ya o jiri chụọ àjà ga-emekwa ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke dị n’agbata Jehova Chineke na 144,000 mmadụ dị irè, bụ́ ndị ga-emesịa soro Jisọs chịa achịa n’eluigwe. (Ndị Hibru 9:14; 12:22-24; Mkpughe 14:1) Site n’ịkpọ ndị ozi ya òkù iso kere òkè ná nri a, Jisọs gosiri na ha ga-esoro ya kere òkè n’Alaeze eluigwe.

Banyere nri a e ji echeta ihe, Jisọs nyere iwu, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) Ee, Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ga-abụ ihe omume a ga na-eme kwa afọ, dị nnọọ ka Ememe Ngabiga ahụ bụrịị. Ebe Ememe Ngabiga ahụ bụ iji cheta nnapụta nke ndị Israel n’ịbụ ohu n’Ijipt, Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị gaje ilekwasị anya ná nnapụta ka nnọọ ukwuu—nke ihe a kpọrọ mmadụ a pụrụ ịgbapụta agbapụta pụọ n’ịbụ ohu nye mmehie na ọnwụ. (1 Ndị Kọrint 5:7; Ndị Efesọs 1:7) Ọzọkwa, a ga-echetara ndị na-ekere òkè n’achịcha na mmanya ahụ bụ́ ihe nnọchianya banyere ihe ùgwù ọdịnihu ha nwere dị ka ndị eze na ndị nchụàjà n’Alaeze eluigwe nke Chineke.—Mkpughe 20:6.

Ọnwụ Jisọs Kraịst bụ n’eziokwu ihe omume kasị mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ndị ji ihe Jisọs mere kpọrọ ihe rubere isi n’iwu ya banyere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” Ndịàmà Jehova na-echeta ọnwụ Jisọs kwa afọ n’ụbọchị kwekọrọ na Nisan 14. Na 1996 ụbọchị a dabara n’April 2, mgbe anwụ dasịrị. A na-akpọ gị òkù n’ụzọ na-ekpo ọkụ ije n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè unu.

‘M Na-enye Unu Iwu Ọhụrụ’

E wezụga iguzobe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, Jisọs nwere ndụmọdụ nọdụ mma ụfọdụ maka ndị ozi ya. N’agbanyeghị ọzụzụ ọma e nyere ha, ndị ikom a nwere ihe dị ukwuu ịmụta. Ha aghọtaghị n’ụzọ zuru ezu ihe bụ nzube Chineke maka Jisọs, maka ha, ma ọ bụ maka ọdịnihu. Ma Jisọs anwaghị ime ka ihe ndị a nile doo anya n’oge a. (Jọn 14:26; 16:12, 13) Kama nke ahụ, o kwuru okwu banyere ihe dị oké mkpa. “Iwu ọhụrụ ka M na-enye unu,” ka o kwuru, “ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka M hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya.” Mgbe ahụ Jisọs kwukwasịrị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”—Jọn 13:34, 35.

N’ụzọ dị aṅaa ka nke a bụ “iwu ọhụrụ”? Ọ dị mma, Iwu Mosis kwuru, sị: “Hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.” (Levitikọs 19:18) Otú ọ dị, Jisọs kpọkuru ndị na-eso ụzọ ya igosi ịhụnanya nke na-eji onwe onye achụ àjà nke ga-eru n’ókè nke mmadụ inyefe ndụ ya n’ihi ndị Kraịst ibe ya. N’eziokwu, ‘iwu ịhụnanya’ ahụ gajekwa imetụta ọnọdụ ndị na-esichaghị ike. N’ọnọdụ nile onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst gaje ibu ụzọ mee ihe iji gosi ịhụnanya site n’inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ ndị ọzọ.—Ndị Galetia 6:10.

N’abalị ikpeazụ a nke ndụ elu ala Jisọs, ịhụnanya kpaliri Jisọs ikpegara Jehova Chineke ekpere n’ihi ndị na-eso ụzọ ya. Ná ndebiri, o kpere, sị: “Ndị a nọ n’ụwa, Mụ onwe m na-abịakwutekwa Gị. Nna dị nsọ, na-edebe ha n’aha Gị nke I nyeworo m, ka ha wee bụrụ otu, dị ka Anyị onwe anyị bụ.” (Jọn 17:11) Ọ dị ịrịba ama na n’arịrịọ a ọ rịọrọ Nna ya, Jisọs kpere ekpere maka ịdị n’otu ịhụnanya nke ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 17:20-23) Ọ dị ha mkpa ‘ịhụrịta ibe ha n’anya dị ka Jisọs hụrụ ha n’anya.’—Jọn 15:12.

Ndị ozi ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ṅara ntị n’okwu nọdụ mma nke Jisọs. Anyị onwe anyị kwa kwesịrị irube isi n’iwu ya nile. Na “mgbe ikpeazụ” ndị a dị oké egwu, ịhụnanya na ịdị n’otu n’etiti ndị na-efe ezi ofufe dị mkpa karịa ka ọ dịtụrụla mgbe ọ bụla. (2 Timoti 3:1) N’ezie, ezi ndị Kraịst na-erube isi n’iwu Jisọs nile ma na-egosipụta ịhụnanya ụmụnna. Nke a na-agụnye irube isi n’iwu ya nke ime ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya