Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 3/15 p. 7
  • Enyi Ha Kachasị Ukwuu Kwagidere Ha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Enyi Ha Kachasị Ukwuu Kwagidere Ha
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Site n’Ịbụ Onye Na-eme Mkpọsa Maka Mgbanwe Ọchịchị gaa n’Ịbụ Onye Kraịst Nọpụrụ Iche
    Teta!—2002
  • Aha Chineke Achọọ Ihe Owuwu nke Czech Mma
    Teta!—1998
  • Amụtara M Ịdabere na Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Mkpagbu Okpukpe—N’ihi Gịnị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 3/15 p. 7

Enyi Ha Kachasị Ukwuu Kwagidere Ha

OTU ọbụbụenyi karịsịa na-akwagide Ndịàmà Jehova. Ọ bụ mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke ha na Enyi ha kachasị ukwuu, bụ́ Jehova Chineke. (Tụlee Jemes 2:23.) Ọ na-akwado ha n’oge oké ule dị iche iche nke okwukwe.

Ihe ndekọ nke iguzosi ike n’ezi ihe nke Ndịàmà n’okpuru ọchịchị aka ike dị iche iche abụrụwo nke ọtụtụ ndị hụrụ ihe merenụ toro. Otu onye n’ime ha bụ Jiří Krupička, bụ́ onye nwere akara ùgwù mmụta dọkịta na nkà ihe ọmụma na nkà mmụta sayensị okike bụ́ onye si Czechoslovakia kwapụ na 1968 mgbe ọ nọsịrị ọtụtụ afọ n’ogige ịta ahụhụ nke ọchịchị ndị Kọmunist. N’akwụkwọ ya bụ́ Renesance rozumu (Oge Ntụte Ọgụgụ Isi), o kwuru okwu banyere ịta ahụhụ na iguzosi ike nke Ndịàmà a tụrụ nga n’ihi nnọpụiche ha.

N’okpuru ọchịchị Kọmunist, a tụrụ ọtụtụ Ndịàmà nga n’ihi okwukwe ha. N’agbanyeghị na a tụrụ ha nga, ha jụrụ igwupụta ọla uranium maka iji ya mee ihe n’agha. (Aịsaịa 2:4) Krupička na-akọwa otu ihe merenụ ọ hụrụ na 1952 n’otu n’ime ebe ndị a a na-egwupụta ihe. Ọ hụrụ ihe oyiyi abụọ kwụ ọtọ dị ka ihe a kpụrụ akpụ nke ice wụkwasịjuru n’ahụ n’oké oyi ahụ. E ji drọm ígwè kpuchie isi ha na akụkụ elu ahụ ha.

Krupička na-ede, sị: “Ha yi nkịkara uwe ụlọ nga ha guzoro ebe ahụ kemgbe isi ụtụtụ. Olee otú ha si nwee ike iguzo ọtọ ruo ogologo oge ha otú a n’ụkwụ oyi meworo ka ọ gbasie ike? Site n’ike nke okwukwe. Drọm ndị ahụ emeela ochie, taakwa nchara. Otu onye obi tara mmiri kụrụ ha aka n’isi na n’ubu n’ụzọ siri ike nke na ọnụ drọm ahụ nke dị jagajaga mapuru jaket ma banye n’akpụkpọ ahụ nke otu n’ime ndị ikom ahụ, ọbara sikwa n’ọnụ aka uwe ya na-atụsị.

“Onye nche ahụ jiri olu ike kwụsị ogologo ahịrị anyị n’ihu ha, onye ọchịagha gwakwara anyị ntakịrị okwu. O kwuru na ịjụ ịrụ ọrụ bụ nnupụisi, a na-enyekwa ntaramahụhụ maka ya otú kwesịrị ekwesị. Ọ dịghị mmetụta na-enweghị isi banyere agha na igbu mmadụ nke ga-enyere ndị a jụrụ ije agha aka, ndị iro a nke ọchịchị ọha na eze.”

Ọchịagha ahụ tụtụlitere otu mkpirisi ígwè wee kụọ otu n’ime drọm ndị ahụ. Nwoke ahụ e ji ya kpuchie dara n’ala ka drọm ahụ ka nọkwa na-ekpuchi isi ya. Ihe ọzọ merenụ nwere mmetụta miri emi n’uche Krupička.

Ọ na-ekwu, sị: “Olu ịbụ abụ si n’ime drọm ahụ na-adapụta. Olu ndị dị ala, ekpere a takwunyeere Chineke, onye pụrụ ịnụ ihe ọ bụla site n’ebe ọ bụla—ọbụna abụ a gbalịrị ịbụ site n’ime drọm uranium ahụ merela ochie, nke tara nchara. Ọ na-anụ ya n’ụzọ dara ụda karịa olu ukwe a nọ n’ime katidral buru ibu na-ekwe.”

Na September 1, 1993, ọrụ Ndịàmà Jehova nọ na Czech Republic nwetara nkwado iwu sitere n’aka gọọmenti. Ndịàmà bụ́ ndị Czechoslovakia na-aṅụrị ọṅụ ugbu a ịrụ ọrụ izi ihe ha nke ndị Kraịst ná nnwere onwe. Ee, obi dị ha ụtọ ịgwa ndị ọzọ banyere Jehova, bụ́ Enyi ha kachasị ukwuu.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị bịara mgbakọ na Czech Republic

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya