Mmụba Nke Akụkọ Ọjọọ
Ọ̀DỊTỤWO mgbe ị chọpụtara na isi akụkọ ndị na-akpọsa akụkọ ọjọọ na-aka akpali mmasị nke ndị na-agụ ya karịa isiokwu ndị na-akpọsa akụkọ ọma? Ma ọ̀ bụ isiokwu akwụkwọ akụkọ banyere ọdachi meere onwe ya ma ọ bụ asịrị kpụ ọkụ n’ọnụ e bipụtara n’ihu magazin ndị na-egbuke egbuke, o yiri ka a na-erepụ akụkọ ọjọọ karịa akụkọ ọma.
Taa akụkọ ọjọọ adịghị ụkọ. Ma mmadụ na-eche mgbe ụfọdụ ma ọ bụ akụkọ ọjọọ ka e nyere ndị nta akụkọ ọzụzụ ịdị na-achọ na ịdị na-ewepụta—n’agụnyeghị akụkọ ọma ọ bụla.
Ọ Bara Ụba n’Akụkọ Ihe Mere Eme Nile
N’ezie, akụkọ ọjọọ abawo ụba n’ime ọtụtụ narị afọ, na-akarị akụkọ ọma ọ bụla. N’akụkọ ihe mere eme, ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ dalara nke ukwuu n’ebe ịta ahụhụ ụmụ mmadụ dị, ndakpọ olileanya, na obi nkoropụ, ndị bụworo òkè nke ihe a kpọrọ mmadụ.
Ka anyị tụlee nanị ihe atụ ole na ole. Akwụkwọ bụ́ Chronicle of the World, nke Jacques Legrand chepụtara, na-akọ akụkọ dị iche iche, e dere nke ọ bụla maka akara ụbọchị mgbe ihe ahụ mere kpọmkwem ma dị ka a ga-asị na ọ bụ onye nta akụkọ nke oge a na-akọ ihe ahụ merenụ. Site n’akụkọ ndị a e nyochara nke ọma, anyị na-ahụ n’ụzọ doro anya na akụkọ ọjọọ ndị gbasaworo bụ́ nke ndị mmadụ nụworo kemgbe ịdị adị ya nke jupụtara ná nsogbu na mbara Ụwa ebe a.
Nke mbụ, tụlee akụkọ oge gboo a sitere Gris na 429 T.O.A. Ọ na-akọ banyere agha ndị Atens na ndị Sparta na-alụ mgbe ahụ, sị: “A manyewo obodo ukwu ahụ bụ isi nke bụ́ Potidaea ịchịliri ndị Atens na-awakpo ya aka elu mgbe e tinyesịworo ya n’ọnọdụ agụụ nke na ndị obodo ahụ anọwo na-eri anụ ahụ nke ndị nke ha nwụrụ anwụ.” Ọ bụ akụkọ ọjọọ n’ezie!
N’ịga n’ihu rute na narị afọ mbụ tupu Oge Anyị, anyị na-ahụ akụkọ doro anya banyere ọnwụ Julius Caesar, bụ́ nke e dere na Rom, na March 15, 44 B.C. “E gbuola Julius Caesar. Ìgwè ndị gbara izu mmegide magburu ya, ụfọdụ n’ime ha bụ ezigbo ndị enyi ya, ka o weere oche n’Ụlọ Ndị Ome Iwu taa, bụ́ March 15.”
N’ime narị afọ ndị sochirinụ, akụkọ ọjọọ nọgidere na-ejupụta. Otu ihe atụ na-awụ akpata oyi n’ahụ bụ akụkọ a si Mexico na 1487: “Ná ngosipụta ịchụ àjà kasị dị ịrịba ama a hụtụworo n’isi obodo ndị Aztec, bụ́ Tenochtitlan, Huitzilopochtli, bụ́ chi nke agha, ewerewo obi nke 20,000 mmadụ.”
Ọ bụghị nanị na obi ọjọọ mmadụ ewepụtawo akụkọ ọjọọ kama akpachapụghị anya ya atụkwasịwo ihe n’ihe ndekọ ahụ dị ogologo. Oké ọkụ ahụ nke London yiri ka ọ bụ otu n’ime ọdachi dị otú ahụ. Akụkọ ahụ si London, England, nke akara ụbọchị ya bụ September 5, 1666, na-agụ, sị: “N’ikpeazụ, mgbe ụbọchị anọ gasịrị, onye isi obodo nke York, bụ́ onye chịbatara ìgwè ndị agha mmiri bu nsí égbè iji gbarisie ụlọ ndị dị n’ebe ọkụ ahụ na-agba, emenyụwo ọkụ ahụ nke London. Ọkụ agbaala ihe dị ka 160 hekta tinyere 87 chọọchị, bibiekwa ihe karịrị 13,000 ụlọ. N’ụzọ ọrụ ebube, ọ bụ nanị mmadụ itoolu nwụrụ.”
Anyị aghaghị ịgbakọnye ntiwapụ ọrịa ndị tiwapụworo n’ime ọtụtụ kọntinent—dị ka ihe atụ, ntiwapụ nke ọrịa ọgbụgbọ na ọnyụnyụ ná mmalite afọ ndị 1830—n’ihe atụ ndị a nke akụkọ ọjọọ. Isi akụkọ e biri ebi nke na-akọ nke a na-agụ, sị: “Ụjọ nke ọrịa ọgbụgbọ na ọnyụnyụ na-enye Europe nsogbu.” Akụkọ na-esonụ nke dabeere n’ihe ndị mere eme na-egosi akụkọ ọjọọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị atụ ụjọ: “Ọrịa ọgbụgbọ na ọnyụnyụ, nke a na-amaghị na Europe ruokwa 1817, si Esia na-agbasa aga n’akụkụ ọdịda anyanwụ. Ka ọ dị ugbu a e gbubilatalarị ọnụ ọgụgụ nke ndị bi n’obodo ukwu dị iche iche nke Russia dị ka Moscow na St. Petersburg—ihe ka ukwuu ná ndị o gburu bụ ndị ogbenye bi n’obodo ukwu.”
Ịrị Elu n’Afọ Ndị Na-adịbeghị Anya
Ya mere ọ bụ eziokwu na akụkọ ọjọọ anọwo na-abụ ihe dị adị n’akụkọ ihe mere eme nile e dekọrọ edekọ, afọ iri ndị na-adịbeghị anya nke narị afọ nke 20 nke a na-enye ihe àmà na akụkọ ọjọọ na-amụba, n’ezie o ji ọsọ na-arị elu.
N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, akụkọ agha abụrụwo ụdị akụkọ ọjọọ kasị njọ nke narị afọ anyị a nụworo. Agha abụọ kachasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme—ndị a kpọrọ n’ụzọ ziri ezi Agha Ụwa Mbụ na Agha Ụwa nke Abụọ—mere n’ezie ka a kọọ akụkọ ọjọọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ jọgburu onwe ya. Ma nke ahụ n’ezie bụ nanị akụkụ dị nta n’akụkọ ọjọọ nke narị afọ a obi na-adịghị ụtọ wepụtaworo.
Tụlee nanị isiokwu ole na ole a họọrọ aghara aghara:
September 1, 1923: Ala ọma jijiji ebibie Tokyo—300,000 mmadụ nwụrụ; September 20, 1931: Ọgba aghara—Britain egbutuo ikike nke ego pound; June 25, 1950: North Korea abanye na South; October 26, 1956: Ndị Hungary ebilie megide ọchịchị mba Soviet; November 22, 1963: A gbagbuwo John Kennedy na Dallas; August 21, 1968: Ụgbọ agha na-awụpụ mgbọ nke ndị Russia abanye iji gwepịa nnupụisi nke Prague; September 12, 1970: A nọrọ n’ọzara gbarie ụgbọ elu ndị e jichiri ejichi; December 25, 1974: Ajọ Ikuku Tracy ebibie obodo bụ́ Darwin—66 anwụọ; April 17, 1975: Ndị agha ọchịchị Kọmunist eweghara Cambodia; November 18, 1978: Ìgwè ndị mmadụ egbuo onwe ha na Guyana; October 31, 1984: A gbagbuo Oriakụ Gandhi; January 28, 1986: Ụgbọ mbara igwe agbawaa mgbe a gbapụrụ ya; April 26, 1986: Ebe nchịkwa ike nuklia nke Soviet na-ere ọkụ; October 19, 1987: Ụlọ ahịa ego adaa; March 25, 1989: Nkwafu mmanụ akpaa Alaska aka ọjọọ; June 4, 1989: Ndị agha egbuchapụ ndị na-eme ngagharị iwe na Tiananmen Square.
Ee, akụkọ ihe mere eme na-egosi na akụkọ ọjọọ bara ụba mgbe nile, ebe akụkọ ọma dị ụkọ ma e jiri ya tụnyere ya. Ka akụkọ ọjọọ rịworo elu n’afọ iri ndị na-adịbeghị anya, akụkọ ọma ebelatawo ka afọ ọ bụla na-agafe.
N’ihi gịnị ka o kwesịrị iji dị otú a? Ọ̀ ga na-adị otú ahụ mgbe nile?
Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ abụọ a.
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 3]
WHO/League of Red Cross