Ihe Mere Ezi Ofufe Ji Na-enweta Ngọzi Chineke
“Haleluya; Nzọpụta nile na otuto nile na ike nile na-adịrị Chineke anyị: n’ihi na ikpe Ya nile bụ eziokwu bụrụkwa ikpe ziri ezi.”—MKPUGHE 19:1, 2.
1. Olee otú Babilọn Ukwu ahụ ga-esi bịa ná njebede ya?
“BABILỌN UKWU AHỤ” adawo n’anya Chineke, ọ na-echekwa mkpochapụ ihu ugbu a. Amụma Bible na-egosi na n’isi nso okpukpe akwụna a zuru ụwa ọnụ ga-ezute mbibi n’aka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya na ha na-akwa iko; ọgwụgwụ ya ga-abịa na mberede, dịkwa ngwa. Mkpughe Jisọs kpugheere Jọn nwere okwu amụma ndị a: “Otu mmụọ ozi nke dị ike wee buru nkume, dị ka oké nkume igwe nri, wee tụba ya n’ime oké osimiri, sị, Otú a ka a ga-atụda Babilọn, bụ́ obodo ukwu ahụ, n’oké ọdịda, a gaghị ahụkwa ya ọzọ ma ọlị.”—Mkpughe 18:2, 21.
2. Olee otú ndị ohu Jehova ga-esi meghachi omume ná mbibi Babilọn?
2 Akụkụ ụfọdụ nke ụwa Setan ga-ebe ákwá maka mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ ma n’ezie ọ gaghị abụ ndị ohu Chineke, ndị nke eluigwe ma ọ bụ ndị elu ala. Mkpu ọṅụ ha ga-etiri Chineke ga-abụ: “Haleluya; Nzọpụta nile na otuto nile na ike nile na-adịrị Chineke anyị: n’ihi na ikpe Ya nile bụ eziokwu bụrụkwa ikpe ziri ezi; n’ihi na O kpere oké nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, bụ́ nwanyị nke weere ịkwa iko ya mebie ụwa, ọ bọkwara ọ́bọ̀ ọbara ndị ohu Ya n’isi ya.”—Mkpughe 18:9, 10; 19:1, 2.
Mkpụrụ Dị Aṅaa Ka Ezi Okpukpe Na-aghaghị Ịmịpụta?
3. Ajụjụ ndị dị aṅaa chọrọ azịza?
3 Ebe ọ bụ na a ga-ekpochapụ okpukpe ụgha dị n’ụwa, ụdị ofufe dị aṅaa ga-afọdụ? Olee otú anyị pụrụ isi kpebie taa òtù okpukpe ga-alanarị mbibi nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha nke Setan? Gịnị bụ mkpụrụ ezi omume nke òtù a na-aghaghị ịmịpụta? Ọ dịkarịa ala e nwere akara iri e ji amata ezi ofufe Jehova.—Malakaị 3:18; Matiu 13:43.
4. Gịnị bụ ihe mbụ a chọrọ maka ezi ofufe, oleekwa otú Jisọs si setịpụ ihe nlereanya n’akụkụ nke a?
4 Nke mbụ na nke kasị n’ime ha bụ na ezi ndị Kraịst aghaghị ịkwado ọbụbụeze nke Jisọs nwụrụ n’ihi ya—ọbụbụeze Nna ya. Jisọs atọgbọghị ndụ ya n’ihi nzube ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ebo, agbụrụ, ma ọ bụ ihe ọha mmadụ ọ bụla. O debere Alaeze Nna ya n’ihu nchụso ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ihe omume mgbanwe nile nke ndị Juu. Ọ zaghachiri onyinye Setan nyere ya ike ụwa n’okwu a: “Laba, Setan: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwo nsọ, sị, Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị Ya ka ị ga-ekpere.” Ọ maara site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru na Jehova bụ Eze bụ́ ezie n’elu ụwa nile. Olee òtù okpukpe na-akwado ịchịisi Jehova n’ụzọ pụtara ìhè karịa usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a?—Matiu 4:10; Abụ Ọma 83:18.
5. (a) Olee otú ndị na-efe ezi ofufe kwesịrị isi lee aha Chineke anya? (b) Gịnị na-egosi na Ndịàmà Jehova na-asọpụrụ aha ahụ?
5 Ihe nke abụọ a chọrọ bụ na ezi ofufe aghaghị ibuli aha Chineke elu ma doo ya nsọ. Onye ahụ Pụrụ Ime Ihe Nile kpugheere ndị ya bụ́ Israel aha ya, Jehova (nke a sụgharịrị Yahweh n’ụfọdụ nsụgharị Bible), e jikwa ya mee ihe ọtụtụ puku ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ọbụnadị tupu mgbe ahụ, Adam, Iv, na ndị ọzọ maara aha ahụ, ọ bụ ezie na ha akwanyeghịrị ya ùgwù mgbe nile. (Jenesis 4:1; 9:26; 22:14; Ọpụpụ 6:2) Ebe ndị nsụgharị nke Krisendọm na ndị Juu na-ewepụkarị aha Chineke na Bible ha, Ndịàmà Jehova enyewo aha ahụ ọnọdụ na nkwanye ùgwù kwesịrị ya na New World Translation of the Holy Scriptures. Ha na-asọpụrụ aha ahụ, ọbụna dị ka ndị Kraịst oge mbụ mere. Jemes gbara akaebe, sị: ‘Simeon kọrọ otú Chineke buru ụzọ leta ndị mba ọzọ, isi n’etiti ha wepụtara aha Ya otu ndị. Nke a na okwu ndị amụma nwekwara otu olu; . . . ka ndị fọdụrụ n’etiti mmadụ wee chọọ Onyenwe anyị, ha na mba nile, ndị a gụrụ aha m, ka Onyenwe anyị kwuru, Onye na-eme ka a mara ihe ndị a.’—Ọrụ 15:14-17; Emọs 9:11, 12.
6. (a) Gịnị bụ ihe nke atọ a chọrọ maka ezi ofufe? (b) Olee otú Jisọs na Daniel si mesie ịchịisi Alaeze ike? (Luk 17:20, 21)
6 Ihe nke atọ a chọrọ maka ezi ofufe bụ na o kwesịrị ibuli Alaeze Chineke elu dị ka ngwọta iwu kwadoro na nke dị irè e nwere nanị ya nye nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ banyere ọchịchị. Jisọs kụziiri ụmụazụ ya n’ụzọ doro anya ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze ahụ bịa, ka ịchịisi Chineke weghara ọchịchị nke ụwa. E nyere Daniel ike mmụọ nsọ ibu amụma banyere mgbe ikpeazụ, sị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi. . . . Ọ ga-etipịa alaeze [ụwa, nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị] ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” Olee ndị gosiworo site n’ụzọ ha si eme omume na narị afọ nke 20 nke a na ha na-enye Alaeze ahụ nkwado a na-ekewaghị ekewa—ọ̀ bụ okpukpe nile nke Babilọn Ukwu ahụ ka ọ̀ bụ Ndịàmà Jehova?—Daniel 2:44; Matiu 6:10; 24:14.
7. Olee otú ndị na-efe ezi ofufe si ele Bible anya?
7 Ihe nke anọ a chọrọ maka nnwapụta Chineke bụ na ezi ndị ohu Chineke kwesịrị ịkwado Bible dị ka Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. Ya mere ha agaghị adaba n’oké nkatọ Bible, nke na-anwa iwetu Bible ala dị ka nanị akwụkwọ mmadụ dere tinyere mmehie ihe nke nke a ga-agụnye. Ndịàmà Jehova kwenyere na Bible bụ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, ọbụna dị ka Pọl degaara Timoti, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”a Ya mere, Ndịàmà Jehova na-ewere Bible dị ka ihe na-eduzi ha, akwụkwọ nduzi ha maka ndụ a na-adị kwa ụbọchị, na isi iyi ha nke olileanya maka ọdịnihu.—2 Timoti 3:16, 17.
Okpukpe nke Ịhụnanya, Ọ Bụghị Ịkpọasị
8. Gịnị bụ ihe nke ise a chọrọ maka ezi ofufe?
8 Olee otú Jisọs siri gosipụta ọdịiche nke ezi ndị na-eso ụzọ ya? Azịza ya na-eweta anyị n’akara nke ise dị mkpa e ji amata ezi ofufe. Jisọs sịrị: “Iwu ọhụrụ ka M na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka M hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:34, 35, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Olee otú Jisọs si gosi ịhụnanya ya? Site n’inye ndụ ya dị ka àjà mgbapụta. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) N’ihi gịnị ka ezi ịhụnanya ji bụrụ àgwà dị mkpa maka ezi ndị Kraịst? Jọn kọwara, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị hụrịta onwe anyị n’anya: n’ihi na ịhụnanya bụ ihe si na Chineke pụta . . . Onye na-adịghị ahụ n’anya amaghị Chineke; n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.”—1 Jọn 4:7, 8.
9. Olee ndị gosiworo ezi ịhụnanya, n’ụzọ dịkwa aṅaa?
9 Olee ndị n’oge anyị gosiworo ụdị ịhụnanya a, ọbụna n’ihu ịkpọasị ebo, mba, ma ọ bụ agbụrụ? Olee ndị gafeworo ule kasị ukwuu, ọbụna ruo ọnwụ, ka ịhụnanya ha wee merie? Ànyị pụrụ ikwu na ọ bụ ndị ụkọchukwu na ndị nọn Katọlik bụ́ ndị e kwetaworo na ụta ụfọdụ dịịrị maka mgbukpọ nke weere ọnọdụ na Rwanda na 1994? Ọ̀ bụ ndị Orthodox nke Serbia ka ọ̀ bụ ndị Katọlik nke Croatia bụ́ ndị tinyeworo aka ná “nhichapụ agbụrụ” na ihe omume ndị ọzọ na-ekwesịghị ndị Kraịst n’agha obodo ahụ a na-alụ ná mba ndị Balkan? Ka ọ̀ bụ ndị ụkọchukwu Katọlik ma ọ bụ Protestant ndị fụnwuru ọkụ nke inwe echiche na-ezighị ezi banyere mmadụ na ịkpọasị na Northern Ireland kemgbe iri afọ ole na ole gara aga? N’ezie a pụghị ibo Ndịàmà Jehova ebubo itinye aka n’ụdị ọgụ ọ bụla dị otú ahụ. Ha atawo ahụhụ n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, ọbụna ruo ọnwụ, kama ịjụ ịhụnanya ndị Kraịst ha.—Jọn 15:17.
10. N’ihi gịnị ka ezi ndị Kraịst ji anọgide na-anọpụ iche?
10 Ihe nke isii a chọrọ maka ofufe Chineke na-anakwere bụ nke nnọpụiche n’ihe metụtara ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji nọgide na-anọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị? Pọl, Jemes, na Jọn nyere anyị ọkpụrụkpụ ihe kpatara nguzo ahụ. Pọl onyeozi dere na Setan bụ “chi nke oge a,” onye na-eme ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì n’etiti ha site n’ụzọ nile kwere omume, tinyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akpata nkewa. Jemes onye na-eso ụzọ kwuru na “ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onye iro nke Chineke,” Jọn onyeozi kwukwara na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” Ya mere, ezi onye Kraịst agaghị emebi nrara ọ raara onwe ya nye Chineke site n’itinye aka n’ụwa rụrụ arụ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ikike nke Setan.—2 Ndị Kọrint 4:4; Jemes 4:4; 1 Jọn 5:19.
11. (a) Olee otú ndị Kraịst na-esi ele agha anya? (b) Ihe ndabere dị aṅaa nke Akwụkwọ Nsọ ka e nwere maka nguzo a? (2 Ndị Kọrint 10:3-5)
11 N’ihi ihe abụọ ikpeazụ ahụ a chọrọ, nke asaa doro anya, ya bụ, na ndị Kraịst na-efe ezi ofufe ekwesịghị ikere òkè n’agha. Ebe ọ bụ na ezi okpukpe ahụ bụ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke dabeere n’ịhụnanya, mgbe ahụ ọ dịghị ihe pụrụ ikewa ma ọ bụ imebi ‘òtù ụmụnna ahụ ndị nọ n’ụwa.’ Jisọs kụziri ịhụnanya, ọ bụghị ịkpọasị; udo, ọ bụghị agha. (1 Pita 5:9; Matiu 26:51, 52) Otu “ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan, onye rabanyere Ken igbu Ebel anọgidewo na-akụnye ịkpọasị n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ na ịkpali ọgụ na mwụfu ọbara ná ndabere nke nkewa ndọrọ ndọrọ ọchịchị, okpukpe, na agbụrụ. Ezi ndị Kraịst ‘adịghị amụtakwa agha ọzọ,’ n’agbanyeghị ụgwọ a gaje ịkwụ. N’ụzọ ihe atụ, ha ‘akpụgharịworị mma agha ha nile ka ha bụrụ mma oge, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.’ Ha na-amịpụta mkpụrụ mmụọ Chineke nke udo.—1 Jọn 3:10-12; Aịsaịa 2:2-4; Ndị Galetia 5:22, 23.
Chineke Na-agọzi Ịdị Ọcha nke Omume na Ozizi
12. (a) Gịnị bụ ihe nke asatọ a chọrọ, ma nkewa okpukpe dịgasị aṅaa ka ị pụrụ ihota? (b) Olee otú Pọl si mee ka isi ihe nke ihe nke asatọ a chọrọ pụta ìhè?
12 Ịdị n’otu ndị Kraịst bụ ihe nke asatọ a chọrọ ezi ofufe n’aka. Otú ọ dị, okpukpe ndị na-akpata nkewa nke Krisendọm enyebeghị aka n’ime nke a. Ọtụtụ n’ime okpukpe ndị a sị na ha bụ isi ekewawo gaa n’ịrọ òtù nzuzo dị iche iche, ihe sikwa na ya apụta bụ ọgba aghara. Were, dị ka ihe atụ, okpukpe Baptist dị na United States, bụ́ nke e kewara n’etiti Northern Baptist (Chọọchị Baptist ndị America na U.S.A.) na Southern Baptist (Mgbakọ nke Southern Baptist), nakwa ọtụtụ ìgwè ndị Baptist ndị ọzọ nke siworo ná nkewa dị iche iche pụta. (World Christian Encyclopedia, peji nke 714) Ọtụtụ nkewa esitewo ná ndịrịta iche nke ozizi ma ọ bụ ọchịchị chọọchị pụta (dị ka ihe atụ, Presbyterian, Episcopalian, na Congregational). Nkewa nile nke Krisendọm na nke okpukpe na-esoghị n’ime Krisendọm bụ otu ihe ahụ—ma ọ bụ okpukpe Buddha, Alakụba, ma ọ bụ okpukpe Hindu. Gịnị ka Pọl onyeozi dụrụ ndị Kraịst oge mbụ ọdụ banyere ya? “Ma, ụmụnna m, esitere m n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst rịọ unu, ka unu nile na-ekwu otu ihe, ka nkewa gharakwa ịdị n’etiti unu; kama ka e mee unu ka unu zuo okè n’otu uche ahụ na n’otu izu ahụ.”—1 Ndị Kọrint 1:10; 2 Ndị Kọrint 13:11.
13, 14. (a) Gịnị ka ‘ịdị nsọ’ pụtara? (b) Olee otú e si edebe ezi ofufe ọcha?
13 Gịnị bụ ihe nke itoolu a chọrọ maka okpukpe nke Chineke nwapụtara? E kwupụtara otu ụkpụrụ Bible na Levitikọs 11:45: “Unu ga-adịkwa nsọ, n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị.” Pita onyeozi kwughachiri ihe a a chọrọ mgbe o dere, sị: ‘Dị ka Onye kpọrọ unu dị nsọ, unu onwe unu, ghọọkwanụ ndị dị nsọ n’ibi obi nile dị iche iche.’—1 Pita 1:15.
14 Gịnị ka mkpa a nke ịdị nsọ pụtara? Na ndị na-efe Jehova ofufe kwesịrị ịdị ọcha n’ime mmụọ na n’omume. (2 Pita 3:14) E nweghị ohere maka ndị na-ama ụma eme mmehie, ndị na-enweghị nchegharị, bụ́ ndị site n’omume ha na-egosi na ha jụrụ àjà mgbapụta Kraịst. (Ndị Hibru 6:4-6) Jehova na-achọ ka e debe ọgbakọ ndị Kraịst ọcha na nsọ. Olee otú a na-esi emezu nke ahụ? N’otu akụkụ site n’usoro ikpe nke ịchụpụ ndị ga-etetọ ọgbakọ.—1 Ndị Kọrint 5:9-13.
15, 16. Mgbanwe ndị dị aṅaa ka ọtụtụ ndị Kraịst meworo ná ndụ ha?
15 Tupu ha amara eziokwu ndị Kraịst, ọtụtụ biri ndụ rụrụ arụ, ndụ ihe ụtọ, nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Ma okwu banyere Kraịst gbanwere ha, ha enwetawokwa mgbaghara nye mmehie ha. Pọl kwuru ya n’ụzọ siri ike mgbe o dere, sị: ‘Ma ọ bụ ùnu amataghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? Unu ekwela ka e duhie unu: ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, ma o bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke. Otú a ka ụfọdụ n’etiti unu dịkwarị: ma unu sachara onwe unu.’—1 Ndị Kọrint 6:9-11.
16 O doro anya na Jehova na-anwapụta ndị chegharịrị site n’omume ha ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, chigharịa, ma ghọọ ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst na ozizi ya. Ha na-ahụ ndị agbata obi ha n’anya n’ezie dị ka onwe ha ma na-egosi ya n’ọtụtụ ụzọ, dị ka site n’ịnọgidesi ike n’ozi nke na-enye ndị nile ga-anụ ya ozi nke ndụ.—2 Timoti 4:5.
“Eziokwu ahụ Ga-emekwa Ka Unu Pụọ n’Ohu”
17. Gịnị bụ ihe nke iri a chọrọ maka ezi ofufe? Nye ihe atụ dị iche iche.
17 E nwere ihe nke iri a chọrọ nke Jehova nwere maka ndị na-efe ya ofufe n’ime mmụọ na n’eziokwu—ozizi dị ọcha. (Jọn 4:23, 24) Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” (Jọn 8:32) Eziokwu nke Bible na-eme ka anyị pụọ n’ohu nke ozizi ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, dị ka mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ala mmụọ, na pọgatrị. (Eklisiastis 9:5, 6, 10; Ezikiel 18:4, 20) Ọ na-eme ka anyị pụọ n’ohu nke ihe omimi Babilọn nke “Atọ n’Ime Otu Kasị Nsọ” nke Krisendọm. (Deuterọnọmi 4:35; 6:4; 1 Ndị Kọrint 15:27, 28) Irubere eziokwu Bible isi na-arụpụta ndị mmadụ na-ahụ n’anya, na-echebara mmadụ ibe ha echiche, dị obi ọma, dị ebere. Ezi Iso Ụzọ Kraịst akwalitetụbeghị ndị njụta okwukwe na-abọ ọ́bọ̀, ndị na-adịghị ekwe ibe nọrọ, dị ka Tomás de Torquemada, ma ọ bụ ndị na-akwalite agha, bụ́ ndị na-akpọ asị, dị ka ndị popu kwadoro Agha Ntute nile. Ma, Babilọn Ukwu ahụ amịpụtawo ụdị mkpụrụ a n’akụkọ ihe mere eme nile, ya dịkarịa ala site n’oge Nimrọd ruo ugbu a.—Jenesis 10:8, 9.
Aha nke Pụrụ Iche
18. (a) Olee ndị ruru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe iri ahụ a chọrọ maka ezi ofufe, n’ụzọ dịkwa aṅaa? (b) Gịnị ka anyị nile n’otu n’otu na-aghaghị ime iji nweta ngọzi dị anyị n’ihu?
18 Olee ndị taa n’ezie na-emezu ihe iri ndị a a chọrọ ezi ofufe n’aka? Olee ndị ka ndị ọzọ maara maka ihe ndekọ ha nke iguzosi ike n’ezi ihe na ịdị n’udo ha? Gbaa ụwa gburugburu a rịbawo Ndịàmà Jehova ama n’ihi na ha “esiteghị n’ụwa.” (Jọn 15:19; 17:14, 16; 18:36) Ọ bụ ihe ùgwù nye ndị Jehova ịza aha ya na ịbụ Ndịàmà ya, ọbụna dị ka Jisọs Kraịst bụrụ onyeàmà kwesịrị ntụkwasị obi nye Nna ya. Anyị na-aza aha ahụ dị nsọ, na-eburu n’obi ibu ọrụ anyị imezu ihe nile ọ nọchiri anya ya. Dịkwa ka Ndịàmà ya, lee olileanya dị ebube dị anyị n’ihu! Ya bụ ịbụ akụkụ nke ezinụlọ ụmụ mmadụ, na-erube isi ndị dị n’otu n’ife Eze Eluigwe na Ala ofufe na paradaịs e weghachiri eweghachi n’elu ala ebe a. Iji nweta ngọzi dị otú ahụ, ka anyị nọgide na-adịnyere ezi ofufe ahụ n’ụzọ doro anya ma na-aza aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova n’obi ụtọ “n’ihi na ikpe Ya nile bụ eziokwu bụrụkwa ikpe ziri ezi”!—Mkpughe 19:2; Aịsaịa 43:10-12; Ezikiel 3:11.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nsụgharị Bible dị iche iche n’onwe ha esiteghị n’ike mmụọ nsọ Chineke. Nsụgharị dị iche iche, site n’ọdịdị ha, pụrụ igosipụta ndịrịta iche nke nghọta asụsụ mbụ ndị e ji dee Bible.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Olee otú ndị ohu Jehova si ele mbibi Babilọn Ukwu ahụ anya?
◻ Gịnị bụ ihe ndị bụ isi a chọrọ maka ezi ofufe?
◻ Olee otú eziokwu ahụ na-esi eme ka ị pụọ n’ohu?
◻ Ihe ùgwù dị aṅaa pụrụ iche ka anyị nwere dị ka Ndịàmà Jehova?
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Ndịàmà Jehova na-ekwusa ma na-akụzi ozi ọma nke Alaeze Chineke
[Foto dị na peeji nke 18]
Ezi ndị Kraịst anọgidewo mgbe nile na-anọpụ iche n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na agha nile nke ụwa
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ụgbọ elu: Site n’aka Ministry of Defense, London