Okwu Chineke Na-arụ “Ọrụ Ebube”
DỊ KA THÉRÈSE HÉON SI KỌỌ
Otu ụbọchị na 1965, abanyere m n’otu ụlọ ọrụ ma nyefee ndị ahịa ọtụtụ magazin Ụlọ Nche na Teta! Ka m tụgharịrị ịlawa, anụrụ m otu oké ụda. Otu mgbọ égbè dara n’ala n’akụkụ ụkwụ m. “Nke ahụ bụ ụzọ isi mesoo Ndịàmà Jehova,” ka otu onye ahịa kwuru n’ịkwa emo.
AHỤMAHỤ ahụ tụrụ m egwu—ma o zughị ezu ime ka m hapụ ozi oge nile. Eziokwu Bible ndị m mụtaworo dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu nke na ha agaghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ka m hapụ ozi m. Ka m kọwaa ihe mere m ji na-ekwu nke a.
Mgbe a mụsịrị m na July 1918, ndị mụrụ m gara biri na Cap-de-la-Madeleine, bụ́ obodo nta dị na Quebec, Canada, nke a maara dị ka Ebe A Na-arụ Ọrụ Ebube. Ndị nleta na-enubata ebe a iji kwanyere ihe oyiyi nke Meri Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke ùgwù. Ọ bụ ezie na a pụghị ịnwapụta ọrụ ebube ndị ahụ a sịrị na Meri na-arụ, Okwu Chineke arụwo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọrụ ebube ná ndụ nke ọtụtụ ndị mmadụ ebe obodo nta ahụ toworo ghọọ obodo nke nwere ihe karịrị 30,000 ndị bi n’ime ya.
Mgbe m dị ihe dị ka 20 afọ, nna m hụrụ mmasị m nwere n’ihe banyere okpukpe wee nye m Bible ya. Mgbe m malitere ịgụ ya, o juru m anya ịmụta site n’Ọpụpụ isi nke 20 na a kagburu ife ihe oyiyi ofufe n’ụzọ doro anya. Ozugbo ahụ atụkwasịkwaghị m ozizi Chọọchị Katọlik obi, m kwụsịkwa ịga Mas. Achọghị m ife ihe a kpụrụ akpụ ofufe. M ka pụrụ ịnụ ka papa m na-asị, “Thérèse, ị́ gaghị aga chọọchị?” “Ee e,” ka m zaghachiri, “m na-agụ Bible.”
Ọgụgụ Bible nọgidere na-abụ akụkụ nke ndụ m ọbụna mgbe m lụsịrị di na September nke 1938. Ebe di m, bụ́ Rosaire, na-arụkarị ọrụ n’abalị, emere m ya àgwà m ịgụ Bible mgbe ọ nọ n’ọrụ. N’oge na-adịghị anya ekpebiri m na Chineke ga-enwerịrị otu ndị, m malitekwara ịchọwa ha.
Ọchịchọ M Chọrọ Ndị Chineke
N’ihi ihe m mụtaworo na chọọchị, mgbe m dị ntakịrị, ụjọ na-atụ m ịlakpu ụra n’ihi egwu nke iteta n’ọkụ ala mmụọ. Iji lụsoo ụdị egwu ahụ ọgụ, m na-agwa onwe m na Chineke nke ịhụnanya agaghị ekwe ka ihe ọjọọ dị otú ahụ mee. N’obi ike, m nọgidere na-agụ Bible, na-achọ eziokwu. M yiri ọnozi Etiopia bụ́ onye gụrụ ma ghara ịghọta.—Ọrụ 8:26-39.
Nwanne m nwoke bụ́ André na nwunye ya, bụ́ ndị bi n’ụlọ dị n’okpuru nke anyị, malitere isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible n’ihe dị ka 1957. M gwara nwunye nwanne m ka o mee ka m mara site n’ịkụ aka n’uko ụlọ mgbe Ndịàmà bịara ime nkwusa n’ụlọ ahụ. N’ụzọ dị otú ahụ m ga-ama iji ghara ịza ha. Otu ụbọchị o chefuru ime ka m mara.
N’ụbọchị ahụ emepere m ụzọ ma zute Kay Munday, bụ́ onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Ọ gwara m okwu banyere aha Chineke, na-akọwa na Chineke nwere aha onwe onye, bụ́ Jehova. Mgbe ọ lawara, enyochara m Bible m iji jide n’aka na ihe e dere na Bible kwadoro ihe o kwuru n’ezie. Nnyocha m mere m obi ụtọ nke ukwuu.—Ọpụpụ 6:3, Douay Version, nkọwa ala ala peji; Matiu 6:9, 10; Jọn 17:6.
Mgbe Kay bịaghachiri, anyị tụlere ozizi Atọ n’Ime Otu nke Katọlik, bụ́ nke na-asị na Chineke bụ ndị atọ nọ n’otu Chineke. Mgbe e mesịrị eji m nlezianya nyochaa Bible mụ iji nwapụta n’onwe m na ọ dịghị akụzi Atọ n’Ime Otu. (Ọrụ 17:11) Ọmụmụ ihe m kwadoro na Jisọs adịrughị ukwuu ka Chineke. E kere ya eke. O nwere mmalite, ma Jehova enweghị. (Abụ Ọma 90:1, 2; Jọn 14:28; Ndị Kọlọsị 1:15-17; Mkpughe 3:14) N’ịbụ onye ihe m na-amụ juru afọ, obi dị m ụtọ ịnọgide ná nkwurịta okwu Bible ahụ.
Otu ụbọchị na 1958, n’oge oké ọdịda snow na November, Kay kpọrọ m òkù ịbịa mgbakọ sekit nke a na-eme n’uhuruchi ahụ n’ụlọ ezumezu a gbazitere agbazite. M nakweere ọkpụkpọ òkù ahụ, usoro ihe omume ahụ tọkwara m ụtọ. Mgbe nke a gasịrị, n’otu nkwurịta okwu m sooro Onyeàmà bịakwutere m nwee, m jụrụ, sị, “Ọ̀ bụ iwu na ezi onye Kraịst ga-ekwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ?”
“Ee,” ka o kwuru, “a ghaghị ikwusa ozi ọma ahụ, Bible na-ekpughekwa na ịkpọtụrụ ndị mmadụ n’ebe obibi ha bụ otu ụzọ dị mkpa nke isi mee nkwusa.”—Ọrụ 20:20.
Lee ka azịza ya si mee m obi ụtọ! O mere ka o doo m anya na achọtawo m ndị Chineke. A sị na ọ sịrị, “Ee e, ọ dịghị mkpa,” m gaara enwewo obi abụọ na m achọtawo eziokwu ahụ, n’ihi na m maara ihe Bible kwuru banyere ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Site na mgbe ahụ gaa n’ihu, m nwere ọganihu ime mmụọ dị ngwa.
Mgbe mgbakọ sekit ahụ gasịrị, amalitere m ịga nzukọ nke Ndịàmà Jehova ndị a na-enwe n’obodo ya na ya gbara agbata obi bụ́ Trois-Rivières. Kay na onye òtù ya, bụ́ Florence Bowman, bụ nanị Ndịàmà bi na Cap-de-la-Madeleine mgbe ahụ. Otu ụbọchị m sịrị, “M ga-esoro unu gaa ime nkwusa echi.” Obi dị ha ụtọ na m sonyeere ha.
Ime Nkwusa n’Obodo A Mụrụ M
M chere na onye ọ bụla ga-anakwere ozi Bible, ma amụtara m ngwa ngwa na nke a abụghị otú ọ dị. Mgbe e kenyere Kay na Florence ọrụ ebe ọzọ, ọ bụ nanị m nọ n’obodo ahụ na-ekwusa eziokwu Bible site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’ịbụ onye na-adaghị mbà, m nọgidere na-eme nkwusa nanị m ruo ihe dị ka afọ abụọ ruo mgbe e mere m baptism na June 8, 1963. N’otu ụbọchị ahụ kpọmkwem edenyere m aha m ịrụ ihe a kpọrọ mgbe ahụ ozi ọsụ ụzọ oge ezumike.
M nọgidere dị ka onye ọsụ ụzọ oge ezumike ruo otu afọ. Mgbe ahụ, Delvina Saint-Laurent kwere nkwa na ya ga-abịa Cap-de-la-Madeleine ma soro m na-arụ ọrụ otu ugboro n’izu ma ọ bụrụ na mụ aghọọ onye ọsụ ụzọ oge nile. Ya mere m dejupụtara akwụkwọ ọrụ ọsụ ụzọ m. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, nanị izu abụọ tupu mụ amalite ozi oge nile ahụ, Delvina nwụrụ. Gịnị ka m ga-eme? Edejupụtawo m akwụkwọ ahụ, achọghịkwa m ịlaghachi azụ. Ya mere n’October 1964, amalitere m ọrụ m n’ozi oge nile. Ruo afọ anọ na-esonụ, m gara nanị m site n’ụlọ ruo n’ụlọ.
Ndị ji okpukpe Katọlik kpọrọ ihe bi na Cap-de-la-Madeleine enweghị omume enyi. Ụfọdụ kpọrọ ndị uwe ojii ná mgbalị nke igbochi m ime nkwusa. Otu ụbọchị, dị ka m hotara ná mmalite, otu onye ahịa nwara ịmaja m site n’ịgba égbè n’ụkwụ m. Otú ọ dị, nke a dọọrọ uche ndị mmadụ n’obodo. Ụlọ ọrụ telivishọn ógbè ahụ kpọrọ ya mkpọsa megide Ndịàmà Jehova. Ihe omume ahụ nile wetara ịgba àmà dị mma. Dị ka o si daba, afọ iri n’ihu, onye ikwu nke onye ahịa ahụ gbara m égbè ghọrọ Onyeàmà n’onwe ya.
“Ọrụ Ebube” Ndị Okwu Chineke Rụrụ
N’ime afọ ndị gafeworonụ, ahụwo m ka mgbidi nke mmegide nye eziokwu Bible ji nwayọọ nwayọọ daa na Cap-de-la-Madeleine. N’ihe dị ka na 1968, Ndịàmà ọzọ kwatara n’ebe a, ndị bi n’ógbè ahụ malitekwara na-azaghachi n’eziokwu Bible. Ka ọ na-erule ná mmalite afọ ndị 1970, e nwere ihe a ga-akpọ ntiwapụ n’ọnụ ọgụgụ nke ọmụmụ Bible. O ruru n’ọnọdụ nke na m gwara Ndịàmà ọzọ ka ha weghara ụfọdụ ọmụmụ Bible m na-eduzi ka m wee nwee ike ịga n’ihu na-ekere òkè n’ozi ụlọ n’ụlọ.
Otu ụbọchị otu nwa agbọghọ natara m akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. Enyi ya n’oge ahụ bụ nwa okorobịa aha ya bụ André, onye omekome na-eme aghara bụ́ onye sonyere ná nkwurịta okwu ahụ. Isoro André kwurịta okwu kpasuru mmasị ya, a malitekwara ọmụmụ Bible. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị ọ malitere ịgwa ndị enyi ya okwu banyere ihe ọ na-amụta.
N’otu oge, m nọ na-eduziri ndị omekome anọ Bible, ndị otu n’ime ha na-adịghị ekwu oké okwu ma ọ na-aṅa ntị nke ukwuu. Aha ya bụ Pierre. Otu ụtụtụ n’ihe dị ka elekere abụọ, mụ na di m nụrụ aka a kụrụ n’ụzọ. Cheedị nke a n’echiche: Ndị omekome anọ guzo n’ebe ahụ na-enwe ajụjụ ha ga-ajụ m. N’ịbụ ihe dabara nke ọma, ọ dịghị mgbe Rosaire mere mkpesa banyere ụdị nleta ahụ e mere n’oge na-ekwesịghị ekwesị.
Na mbụ ndị ikom anọ ahụ bịara nzukọ. Otú ọ dị, nanị André na Pierre nọgidesiri ike. Ha mere ka ndụ ha kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke, e mekwara ha baptism. Ruo ihe karịrị 20 afọ ugbu a, ndị ikom abụọ ahụ ejeworo Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Mgbe ha malitere ịmụ ihe, a maara ha nke ọma maka omume ime mpụ ha, ndị uwe ojii na-etinyekwa anya n’ebe ha nọ. Mgbe ụfọdụ ndị uwe ojii bịara chọọ ha mgbe anyị nwesịrị otu n’ime ọmụmụ Bible anyị ma ọ bụ n’oge nzukọ ọgbakọ. Obi dị m ụtọ na m mere nkwusa nye “ụdị mmadụ nile,” wee si otú a were anya m hụ ụzọ Okwu Chineke na-esi akpata mgbanwe ndị yiri ọrụ ebube n’ezie.—1 Timoti 2:4, NW.
Ọ bụrụ na ná mmalite nke ozi m a gwara m na a ga-enwe Ụlọ Nzukọ Alaeze na Cap-de-la-Madeleine nakwa na ndị Jehova ga-ejupụta ya, agaraghị m ekweta. N’ịbụrụ m ihe ọṅụ, otu ntakịrị ọgbakọ ahụ dị n’obodo ya na ya gbara agbata obi bụ́ Trois-Rivières amụbawo gaa n’ọgbakọ isii na-eme nke ọma bụ́ ndị na-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze atọ, tinyere nke ahụ dị na Cap-de-la-Madeleine.
Enwewo m n’onwe m ọṅụ nke inyere ihe dị ka 30 ndị mmadụ aka iru n’ọnọdụ nke nraranye na baptism. Ugbu a, n’afọ ndụ nke 78, m pụrụ ikwu n’ezie na obi dị m ụtọ na m raara ndụ m nye Jehova. Otú ọ dị, aghaghị m ikweta na ọ dịwo mgbe m nwere nkụda aka dị iche iche. Iji nagide oge ndị dị otú ahụ, m na-emeghe Bible m mgbe nile ma gụọ ụfọdụ akụkụ ndị na-enye m ume ọhụrụ n’ụzọ dị ukwuu. Ọ gaghị ekwe m omume ikwe ka otu ụbọchị gafee n’agụghị Okwu Chineke. Ebe na-agba ume karịsịa bụ Jọn 15:7, bụ́ ebe ọ na-asị: “Ọ bụrụ na unu na-anọgide n’ime m, ọ bụrụkwa na okwu m na-anọgide n’ime unu, rịọnụ ihe ọ bụla unu na-achọ, a ga-emekwara unu ya.”
Ọ bụ olileanya m ịhụ Rosaire n’ụwa ọhụrụ ahụ dị nnọọ nso. (2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4) Kpọmkwem tupu ọnwụ ya na 1975, ọ na-aga n’ihu nke ọma ime baptism. Ka ọ dị ugbu a, ekpebisiela m ike ịnọgịdesi ike n’ozi oge nile ma nọgide na-aṅụrị ọṅụ n’ọrụ Jehova.