Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 7/1 p. 28-31
  • Ònye Kwesịrị Ka A Kpọọ Ya Rabaị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Kwesịrị Ka A Kpọọ Ya Rabaị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mosis Ọ̀ Bụ Rabaị?
  • Iṅomi Onye Ozizi Ahụ
  • Ndị Rabaị n’Ime Ọgbọ Nile
  • “Ka A Ghara Ịkpọ Unu Onwe Unu, Rabaị”
  • Gbasoo Onye Nlereanya Ahụ
  • Iwu Ahụ E Nyere N’ọnụ—N’ihi Gịnị Ka E Ji Dee Ya Ede?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Gịnị bụ Tora?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Gịnị Bụ Talmud?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Mishnah na Iwu Chineke Nyere Mosis
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 7/1 p. 28-31

Ònye Kwesịrị Ka A Kpọọ Ya Rabaị?

ONYE na-eme njem nleta na-amaghị ihe na-aganụ nwere ntakịrị olileanya nke ịgaru n’ọdụ ụgbọ elu n’oge. Ọtụtụ narị ndị uwe ojii nwara iduzi njem ụgbọ ala ka ha na-echebe ihe karịrị 300,000 ndị na-eru újú bụ ndị jupụtara n’okporo ámá nke Jerusalem. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Jerusalem Post kpọrọ ya “ịkwụ n’ahịrị nke ememe olili ozu nke hà nnọọ ka nke a na-emekarịrị nanị ndị president, ndị eze ma ọ bụ ndị ọchịchị aka ike.” Ònye pụrụ ịkpatawo ụdị mwụpụta nke nraranye ahụ, na-eme ka ihe ghara ịga aga n’isi obodo Israel ruo ọtụtụ hour? Ọ bụ onye rabaị a na-akwanyere ùgwù. N’ihi gịnị ka ọkwá rabaị ji na-adọta ụdị nkwanye ùgwù na nraranye ahụ n’etiti ndị Juu? Olee mgbe e jiri okwu ahụ bụ́ “rabaị” mee ihe na nke mbụ ya? Ònye ka o ziri ezi iji ya eme ihe n’ebe ọ nọ?

Mosis Ọ̀ Bụ Rabaị?

Aha a kasị akwanyere ùgwù n’okpukpe ndị Juu bụ Mosis, onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu Israel. Ndị Juu ji okpukpe kpọrọ ihe na-akpọ ya “Mosis ‘Rabaị anyị.’” Otú ọ dị, ọ dịghị ebe a kpọrọ Mosis utu aha ahụ bụ́ “Rabaị” na Bible. N’ezie, okwu ahụ bụ́ “rabaị” apụtatụghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ya bụrụ otú ahụ, olee otú ndị Juu si malite izo aka n’ebe Mosis nọ n’ụzọ dị otú a?

Dị ka Akwụkwọ Nsọ Hibru si kwuo, ibu ọrụ na ikike nke ịkụzi na ịkọwa Iwu ahụ bụ nke e nyere ụmụ Erọn, ndị nchụàjà nke ebo Livaị. (Levitikọs 10:8-11; Deuterọnọmi 24:8; Malakaị 2:7) Otú ọ dị, na narị afọ nke abụọ T.O.A., mgbanwe na-apụtaghị ìhè malitere n’ime okpukpe ndị Juu, na-emetụta echiche ndị Juu n’ụzọ na-adịgide adịgide site na mgbe ahụ gaa n’ihu.

Banyere mgbanwe ime mmụọ a, Daniel Jeremy Silver na-ede n’akwụkwọ bụ́ A History of Judaism, sị: “N’oge [ahụ] òtù ndị odeakwụkwọ na ndị ọkà mmụta na-abụghị ndị nchụàjà malitere ịma izi ezi nke nkọwa nke nanị ndị nchụàjà na-akọwa Torah [Iwu Mosis] aka. Onye ọ bụla kwetara na ndị nchụàjà dị mkpa dị ka ndị na-arụ ọrụ n’Ụlọ Nsọ, ma n’ihi gịnị ka ha kwesịrị iji na-abụ o kwucha o bie n’ihe banyere Torah?” Olee ndị bụ ndị na-akpasu ịma aka a nke ikike nke òtù ndị nchụàjà? Ọ bụ òtù ọhụrụ nọ n’ime okpukpe ndị Juu a kpọrọ ndị Farisii. Silver gara n’ihu na-asị: “Ndị Farisii na-akpọbata mmadụ n’ụlọ akwụkwọ ha dabere n’iru eru, ọ bụghị n’ọmụmụ [usoro ọmụmụ ndị nchụàjà], ha webatakwara òtù ọhụrụ nke ndị Juu n’ime idu ndú okpukpe.”

Ka ọ na-erule narị afọ mbụ O.A., a bịara mara ndị gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị Farisii ndị a dị ka ndị nkụzi, ma ọ bụ ndị ozizi, nke iwu ndị Juu. Dị ka ihe nkwanye ùgwù, ndị Juu ndị ọzọ malitere izo aka n’ebe ha nọ dị ka “onye nkụzi m,” ma ọ bụ “onye ozizi m,” na Hibru, rabaị.

Ọ dịghị ihe pụrụ inyekwu utu aha ọhụrụ ndị a ikike karịa ịkpọ ya onye e lere anya dị ka onye nkụzi kasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke ndị Juu, bụ́ Mosis. Ihe ga-esi na nke a pụta ga-ebelatakwu anya e lekwasịrị n’òtù ndị nchụàjà ka a na-ewelite echiche e nwere banyere idu ndú nke ndị Farisii bụ́ nke na-enwewanye ike. N’ihi ya, ihe karịrị 1,500 afọ mgbe ọnwụ ya gasịrị, a na-akpọ Mosis “Rabaị” iji na-echeta ya.

Iṅomi Onye Ozizi Ahụ

Ọ bụ ezie na okwu ahụ bụ́ “rabaị” (“onye ozizi m”) bụ nke ọha mmadụ ji na-eme ihe mgbe ụfọdụ n’izo aka n’ebe ndị nkụzi ọzọ ha na-akwanyere ùgwù nọ, e jikarị okwu ahụ na-eme ihe n’ebe ndị nkụzi a ma ama n’etiti ndị Farisii, “ndị amamihe,” nọ. Ka e bibisịrị ụlọ nsọ ahụ na 70 O.A., si otú ahụ na-eweta ikike nke òtù ndị nchụàjà ná ngwụsị kpam kpam, ndị rabaị nke ndị Farisii ghọrọ ndị ndú a na-adịghị agbagha agbagha nke okpukpe ndị Juu. Ọnọdụ ha a na-adịghị ama aka mere ka e nwee ntolite nke ụdị òtù okpukpe nke hiwere isi ná ndị amamihe ahụ bụ́ ndị rabaị.

Mgbe ọ na-atụle oge mgbanwegharị nke narị afọ mbụ O.A. a, Prọfesọ Dov Zlotnick na-ekwu, sị: “‘Ilegide Ndị Amamihe ahụ anya nke ọma,’ ghọrọ ihe dị mkpa karịa ọmụmụ nke Torah.” Ọkà mmụta bụ́ onye Juu bụ́ Jacob Neusner gara n’ihu na-akọwa, sị: “‘Onye na-eso ụzọ ndị amamihe’ ahụ bụ nwa akwụkwọ rapaara onwe ya n’ahụ onye rabaị. Ọ na-eme otú ahụ n’ihi na ọ chọrọ ịmụta ‘Torah.’ . . . A dịghị esi n’iwu ahụ amụta Torah, kama site n’ịhụ iwu ahụ ka e gosipụtara ya n’imegharị ahụ n’okwu na n’omume nke ndị amamihe ahụ ka nọ ndụ. Ha na-akụzi iwu ahụ site n’ihe ha na-eme, ọ bụghị nanị site n’ihe ha na-ekwu.”

Ọkà mmụta nke Talmud bụ́ Adin Steinsaltz na-akwado nke a, na-ede, sị: “Ndị amamihe ahụ n’onwe ha kwuru, sị, ‘E kwesịrị ịmụ mkparịta ụka, njakịrị, ma ọ bụ okwu nkịtị nke ndị amamihe ndị na-apụta site na mgbe ruo na mgbe.’” Ruo n’ókè ha aṅaa ka a pụrụ itinye nke a n’ọrụ? Steinsaltz na-ekwu, sị: “Ihe atụ gafere ókè banyere nke a bụ onye na-eso ụzọ ahụ a kọrọ na o zoro onwe ya n’okpuru àkwà ndina onye nkụzi ukwu ya iji chọpụta otú ya na nwunye ya si anọkọ. Mgbe a gbara ya ajụjụ banyere ọchịchọ ịmata ihe ya, onye ahụ na-eto eto na-eso ụzọ zara, sị: ‘Ọ bụ Torah, e kwesịkwara ịmụ ya,’ echiche nke ma ndị rabaị ma ụmụ akwụkwọ nakweere dị ka ihe kwesịrị ekwesị.”

N’ihi okwu a na-ekwusi ike banyere ndị rabaị karịa Torah—ịmụta Torah site n’aka onye rabaị—okpukpe ndị Juu site na narị afọ mbụ O.A. gaa n’ihu ghọrọ okpukpe ji ndị rabaị kpọrọ oké ihe. Mmadụ na-abịaru Chineke nso, ọ bụghị site n’Okwu ahụ e dere ede n’okpuru ike mmụọ nsọ, kama site n’onye nlereanya onwe onye, onye ozizi, onye rabaị. N’ihi ya, n’ụzọ ezi uche dị na ya nkwusi okwu ike ahụ hapụrụ Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ gafere n’iwu e nyere n’ọnụ na ọdịnala nke ndị rabaị a kụziri. Site n’oge a gaa n’ihu, akwụkwọ ọgụgụ nke ndị Juu, dị ka Talmud, hiwekarịrị isi ná mkparịta ụka, akụkọ dị mkpirikpi, na akparamàgwà nke ndị rabaị karịa ná nkwupụta okwu nke Chineke.

Ndị Rabaị n’Ime Ọgbọ Nile

Ọ bụ ezie na ha nwere ikike na mmetụta dị ukwuu, ndị rabaị oge mbụ enwetaghị ihe ha ji bie ndụ site n’ọrụ okpukpe ha. Akwụkwọ Encyclopaedia Judaica na-ekwu, sị: “Onye rabaị nke Talmud . . . dị iche kpam kpam ná ndị ji utu aha ahụ n’oge a. Onye rabaị nke Talmud bụ onye ntụgharị okwu na onye na-akọwa Bible na Iwu E Nyere n’Ọnụ, ọ fọkwara nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile ka ọ na-enwe aka ọrụ ọ na-esi na ya enweta ihe o ji ebi ndụ. Ọ bụ nanị na Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya ka onye rabaị ghọrọ . . . onye nkụzi, onye nkwusa, na onye isi ime mmụọ nke ọgbakọ ma ọ bụ ógbè ndị Juu.”

Mgbe ndị rabaị malitere ịgbanwe ọkwá ha ịbụ ọrụ a na-akwụ ụgwọ ọnwa na ha, ụfọdụ kwulitere okwu megide ya. Maimonides, onye rabaị a ma ama nke narị afọ nke 12, bụ́ onye nwetara ihe o ji bie ndụ dị ka onye dọkịta, katọrọ ndị rabaị dị otú ahụ nke ukwuu. “[Ha] setịpụụrụ onwe ha ego ha na-anara ndị mmadụ na ógbè dị iche iche ma mee ka ndị mmadụ na-eche, n’ụzọ ajọ nzuzu, na ọ bụ iwu ma kwesị ekwesị inyere ndị amamihe na ndị ọkà mmụta na ndị na-amụ Torah aka [n’ụzọ ego], n’ihi ya Torah ha bụ aka ọrụ ha. Ma ihe a dum ezighị ezi. E nweghị otu mkpụrụ okwu ọ bụla, ma ọ bụ na Torah ma ọ bụ n’okwu ndị amamihe, ịkwado ya.” (Commentary on the Mishnah, Avot 4:5) Ma ọgbọ ndị dị n’ihu nke ndị rabaị aṅaghị ntị ná nkatọ Maimonides.

Ka okpukpe ndị Juu banyere n’ọgbọ ọgbara ọhụrụ, o kewara gaa n’akụkụ dị iche iche nke nkwenkwe mgbanwe, ọdịnala, na nke achọghị echiche ọgbara ọhụrụ. Nye ọtụtụ ndị Juu, nkwenkwe na omume okpukpe ghọrọ ihe na-eso mmasị ndị ọzọ n’azụ. N’ihi ya, e mebiri ọnọdụ nke onye rabaị. Onye rabaị, n’ụzọ bụ isi, ghọrọ onye isi e chiri echichi nke ọgbakọ, na-arụ ọrụ dị ka onye a na-akwụ ụgwọ nke ji nkụzi na inye ndụmọdụ mere aka ọrụ maka ndị òtù nke ìgwè ya. Otú ọ dị, n’etiti ndị Hasid bụ́ ndị nwere echiche gabigara ókè nke achọghị ihe ọhụrụ, echiche nke onye rabaị ịbụ onye ozizi na onye nlereanya pụtakwuru ìhè ọzọ.

Rịba ama okwu nke Edward Hoffman n’akwụkwọ ya banyere òtù Hasid bụ́ Chabad-Lubavitch: “Ndị Hasid oge mbụ mesikwara ya ike na n’ọgbọ ọ bụla a na-enwe otu onye ndú ndị Juu, onye zaddik [onye ezi omume], onye bụ ‘Mosis’ nke oge ya, onye ihe ọmụma o nwere, na nraranye ya nye ndị ọzọ na-enweghị atụ. Ìgwè ọ bụla nke ndị Hasid chere na, site n’ime nsọ nsọ ya dị egwu, Rebee [okwu Yiddish maka “rabaị”] ha pụrụ ọbụna inwe mmetụta n’ebe iwu nke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nọ. Ọ bụghị nanị na a na-asọpụrụ ya dị ka onye nlereanya site n’okwu ihu ọha ya ndị na-ekpughe ihe, kamakwa ụzọ o si bie ndụ (‘otú o si ekechi eriri akpụkpọ ụkwụ ya,’ dị ka e si kwuo ya) bụ nke a hụtara dị ka nke na-ebuli agbụrụ mmadụ elu ma na-enye ngosipụta zoro ezo nke ụzọ Chineke.”

“Ka A Ghara Ịkpọ Unu Onwe Unu, Rabaị”

Jisọs, onye Juu nke narị afọ mbụ bụ́ onye guzobere Iso Ụzọ Kraịst, biri ndụ n’oge mgbe echiche rabaị nke ndị Farisii malitere iweghara okpukpe ndị Juu. Ọ bụghị onye Farisii, nke o ji abụkwanụ onye a zụrụ n’ụlọ akwụkwọ ha, ma a kpọkwara ya onwe ya Rabaị.—Mak 9:5; Jọn 1:38; 3:2.

N’ịkatọ omume ndị rabaị nke dị n’okpukpe ndị Juu, Jisọs kwuru, sị: “N’oche Mosis ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọdụrụ. Ha na-ahụkwa isi ọnọdụ nile n’oriri nile unu n’anya, na isi oche nile n’ụlọ nzukọ unu, na ekele n’ọma ahịa nile unu, na ka mmadụ na-akpọ ha, Rabaị. Ma ka a ghara ịkpọ unu onwe unu, Rabaị: n’ihi na otu Onye bụ Onye ozizi unu, ma unu onwe unu nile bụ ụmụnna.”—Matiu 23:2, 6-8.

Jisọs dọrọ aka ná ntị megide nkewa ndị ụkọchukwu na ndị aghasa nke na-etolite n’ime okpukpe ndị Juu. Ọ katọrọ inye mmadụ ọkwá ukwu na-ekwesịghị ekwesị. “Otu Onye bụ Onye ozizi unu,” ka o ji anya ike kwuo. Ònye bụ otu Onye a?

Mosis, “onye Jehova maara ihu na ihu” na onye ndị amamihe ahụ n’onwe ha kpọrọ “Rabaị anyị,” bụ nwoke na-ezughị okè. Ọbụna o hiere ụzọ. (Deuterọnọmi 32:48-51; 34:10; Eklisiastis 7:20) Kama ime ka Mosis pụta ìhè dị ka onye nlereanya kasịnụ, Jehova gwara ya, sị: “M ga-eme ka onye amụma, nke dị ka gị, biliere ha site n’etiti ụmụnne ha; M ga-etinyekwa okwu m nile n’ọnụ ya, ọ ga-agwakwa ha okwu nile nke M ga-enye ya n’iwu. Ọ ga-erukwa, na nwoke ọ bụla nke na-agaghị ege ntị okwu m nile nke ọ ga-ekwu n’aha m, Mụ onwe m ga-ajụta ya n’aka ya.”—Deuterọnọmi 18:18, 19.

Amụma ndị dị na Bible na-egosi na okwu ndị a nwere mmezu ha n’ahụ Jisọs, Mesaịa ahụ.a Ọ bụghị nanị na Jisọs “dị ka” Mosis; ọ ka Mosis ukwuu. (Ndị Hibru 3:1-3) Akwụkwọ Nsọ na-ekpughe na a mụrụ Jisọs dị ka nwoke zuru okè, n’adịghịkwa ka Mosis o jeere Chineke ozi ‘n’emehieghị.’—Ndị Hibru 4:15.

Gbasoo Onye Nlereanya Ahụ

Ọmụmụ ihe siri ike nke omume na okwu ọ bụla nke onye rabaị ewetabeghị ndị Juu nso karị n’ebe Chineke nọ. Ọ bụ ezie na mmadụ na-ezughị okè nwere ike ịbụ ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi, ọ bụrụ na anyị amụọ ma ṅomie omume ya ọ bụla, anyị ga-eṅomi ihie ụzọ na ezughị okè ya nile nakwa ebe ndị ọ na-emezi. Anyị ga na-enye onye e kere eke otuto na-ekwesịghị ekwesị karịa Onye Okike.—Ndị Rom 1:25.

Ma Jehova nyere ihe a kpọrọ mmadụ Onye Nlereanya. Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, Jisọs dị adị tupu ya aghọọ mmadụ. N’ezie, a na-akpọ ya “onyinyo nke Chineke ahụ Nke a na-apụghị ịhụ anya, bụrụkwa onye e bụrụ ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:15) Ebe o jeworo ozi n’eluigwe ruo ọtụtụ narị afọ iri a na-akaghị aka dị ka “onye ọkà” nke Chineke, Jisọs nọ n’ọnọdụ kasị mma inyere anyị aka ịbịa mara Jehova.—Ilu 8:22-30; Jọn 14:9, 10.

Ya mere, Pita pụrụ ide, sị: “Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka unu wee soo ijeụkwụ Ya nile.” (1 Pita 2:21) Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ume ka ha “na-elegide Jisọs anya, bụ́ onyendú na onye mmezu nke okwukwe anyị.” Ọ kọwakwara na “akụ̀ nile nke amamihe na ihe ọmụma dị n’ime Ya, bụ́ ihe zoro ezo n’ime Ya.” (Ndị Hibru 12:2; Ndị Kọlọsi 2:3) O nweghị mmadụ ọzọ—ọ bụghị Mosis ma ọ bụ onye amamihe rabaị ọ bụla—kwesịrị nlekwasị anya dị otú ahụ. Ọ bụrụ na a ga-eṅomi onye ọ bụla n’ụzọ chiri anya, ọ bụ Jisọs. Ndị ohu Chineke enweghị mkpa nke utu aha dị ka rabaị, karịsịa n’ihi ihe ọ pụtara n’oge a, ma ọ bụrụ na o nwere onye kwesịrị ka a kpọọ ya Rabaị, ọ bụ Jisọs.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ihe àmà na Jisọs bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa, lee broshuọ bụ́ Will There Ever Be a World Without War?, peji nke 24-30, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 28]

© Brian Hendler 1995. Anyị Ji Ike Mbipụtaghachi Nile

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya