‘Unu Ga-adị Nsọ n’Ihi na Nsọ Ka Mụ Onwe M Dị’
“Nsọ ka unu ga-adị: n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m, bụ́ Jehova, Chineke unu, dị.”—LEVITIKỌS 19:2.
1. Olee ụfọdụ ndị nke ụwa na-ewere dị ka ndị dị nsọ?
IHE ka ukwuu n’okpukpe ndị bụ isi n’ụwa nwere ndị ha na-ewere dị ka ndị dị nsọ. Nne bụ́ Teresa, bụ́ onye a ma ama n’India bụ onye a na-elekarị anya dị ka onye dị nsọ n’ihi nraranye ya n’ebe ndị ogbenye nọ. A na-akpọ popu “Nna Dị Nsọ.” Onye malitere òtù ọgbara ọhụrụ nke Katọlik a na-akpọ Opus Dei, bụ́ José María Escrivá, bụ onye ndị Katọlik ụfọdụ na-ele anya dị ka “ihe ilereanya nke ịdị nsọ.” Okpukpe Hindu nwere ndị swami ya, ma ọ bụ ndị ikom dị nsọ. A sọpụụrụ Gandhi dị ka nwoke dị nsọ. Okpukpe Buddha nwere ndị mọnk ya dị nsọ, Alakụba nwekwara onye amụma ya dị nsọ. Ma gịnị kpọmkwem ka ọ pụtara bụ́ ịdị nsọ?
2, 3. (a) Gịnị ka okwu bụ “nsọ” na “ịdị nsọ” pụtara? (b) Gịnị bụ ajụjụ ụfọdụ ọ dị mkpa ka a zaa?
2 A kọwawo okwu ahụ bụ́ “nsọ” dị ka ịbụ “1. . . . nke e jikọtara ya na ike Chineke; nke dị nsọ. 2. Nke e weere ma ọ bụ nke ruru eru ka e nye ya ofufe ma ọ bụ nkwanye ùgwù . . . 3. Ibi ndụ kwekọrọ n’usoro omume okpukpe ma ọ bụ nke ime mmụọ siri ike ma ọ bụ dị elu . . . 4. Nke a kpọrọ aha ma ọ bụ doo iche maka nzube okpukpe.” N’echiche Bible, ịdị nsọ pụtara “ịdị ọcha okpukpe: ido nsọ.” Dị ka akwụkwọ ntụaka Bible bụ́ Insight on the Scriptures si kwuo, “[okwu] Hibru mbụ bụ́ qoʹdhesh na-enye echiche nke ịdị iche, ịpụ iche, ma ọ bụ ido nsọ nye Chineke, . . . ọnọdụ nke ịbụ nke e doro iche maka ijere Chineke ozi.”a
3 E nyere mba Israel iwu ka ha dị nsọ. Iwu Chineke kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova Chineke unu: unu ga-edokwa onwe unu nsọ, wee dị nsọ; n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị.” Ònye bụ Isi Iyi nke ịdị nsọ? Olee otú ndị Israel na-ezughị okè pụrụ isi ghọọ ndị dị nsọ? Ihe mmụta ndị dịkwa aṅaa ka anyị pụrụ ịchọtara onwe anyị taa n’òkù Jehova kpọrọ ka a dị nsọ?—Levitikọs 11:44.
Otú Israel na Isi Iyi nke Ịdị Nsọ Si Nwee Mmekọrịta
4. Olee otú e si mee ihe atụ nke ịdị nsọ Jehova n’Israel?
4 A ga-ewere ihe nile metụtara ofufe ndị Israel fere Jehova Chineke dị ka ihe dị nsọ, mesookwa ha otú ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova n’onwe ya bụ mmalite na isi iyi nke ịdị nsọ. Ihe ndekọ Mosis banyere nkwadebe nke ụlọikwuu ahụ dị nsọ na uwe oyiyi na ihe ịchọ mma ya ji okwu ndị a mechie: “Ha mekwara ihe dị mbara nke okpu nsọ ahụ nke onye nchụàjà, ọ bụ ọlaedo a na-agwaghị agwa, ha dee ihe odide n’elu ya, dị ka egbugbu mgbaaka akara, Ihe nsọ Jehova nwere.” E tinyere ihe a dị mbara nke e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee n’elu ákwà nkụkụ isi nke onye isi nchụàjà, o gosikwara na e doro ya iche maka ije ozi ịdị nsọ pụrụ iche. Ka ha na-ahụ ihe àmà a e dekwasịrị n’elu ya ka ọ na-egbukepụ n’ìhè anyanwụ, a na-echetara ndị Israel banyere ịdị nsọ Jehova mgbe nile.—Ọpụpụ 28:36; 29:6; 39:30.
5. Olee otú a pụrụ isi were ndị Israel na-ezughị okè dị ka ndị dị nsọ?
5 Ma olee otú ndị Israel pụrụ isi ghọọ ndị dị nsọ? Nanị site ná mmekọrịta chiri anya nke ha na Jehova na ofufe dị ọcha ha na-efe ya. Ọ dị ha mkpa inwe ezi ihe ọmụma nke “Onye Nsọ” ahụ iji fee ya ofufe n’ịdị nsọ, n’ịdị ọcha elu ahụ na nke ime mmụọ. (Ilu 2:1-6; 9:10) Ya mere ndị Israel aghaghị iji nzube dị ọcha na obi dị ọcha fee Chineke. Ụdị ofufe ihu abụọ ọ bụla ga-abụ ihe Jehova kpọrọ asị.—Ilu 21:27.
Ihe Mere Jehova Ji Katọọ Israel
6. Olee otú ndị Juu nọ n’ụbọchị Malakaị si mesoo table Jehova?
6 E gosipụtara nke a n’ụzọ doro anya mgbe ndị Israel ji obi abụọ na-eweta àjà ndị na-adịghị mma, ndị nwere nkwarụ n’ụlọ nsọ ahụ. Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Malakaị, Jehova katọrọ onyinye ha na-adịghị mma, sị: “Ọ dịghị ihe unu na-atọ m ụtọ, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, M gaghị anarakwa onyinye ịnata ihu ọma n’aka unu nke ọma. . . . Ma unu onwe unu na-eme ka ọ ghara ịdị nsọ, n’ịsị, Table nke Jehova, ihe e mere ka ọ ghara ịdị nsọ ka ọ bụ, mkpụrụ ya, bụ́ ihe oriri Ya, bụkwa ihe nlelị. Unu asịwokwa, Lee, ka o si bụrụ oké ike ọgwụgwụ! unu afụwokwa ya ná nlelị, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị; unu ewebatawokwa ihe a napụrụ n’ike, na ihe gwọrọ ngwụrọ, na ihe na-arịa ọrịa; otú a ka unu webataworo onyinye ịnata ihu ọma: M̀ ga-anara nke a nke ọma n’aka unu? ka Jehova sịrị.”—Malakaị 1:10, 12, 13.
7. Ọrụ dịgasị aṅaa na-adịghị nsọ ka ndị Juu na-arụ na narị afọ nke ise T.O.A.?
7 Chineke ji Malakaị mee ihe iji katọọ omume aghụghọ nile nke ndị Juu, ma eleghị anya na narị afọ nke ise T.O.A. Ndị nchụàjà na-esetịpụ ihe nlereanya na-adịghị mma, àgwà ha adịghịkwa nsọ ma ọlị. Ndị ahụ, n’ịgbaso idu ndú ahụ, araparaghị n’ụkpụrụ ha, ọbụna ruo n’ókè nke ịgba nwunye ha alụkwaghịm, ọ pụrụ ịbụ ka ha wee nwee ike lụọ ndị nwunye na-ekpere arụsị bụ́ ụmụ agbọghọ karị. Malakaị dere, sị: “Jehova abụrụwo onye àmà n’etiti gị na nwunye ị lụtara n’okorobịa, onye gị onwe gị ghọgbuworo,b ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, na nwunye ọgbụgba ndụ gị. . . . Lezienụ anya n’ime mmụọ unu, ka nwoke gharakwa ịghọgbu nwunye ọ lụtara n’okorobịa. N’ihi na Ọ kpọwo nchụpụ nwunye asị, otú a ka Jehova, bụ́ Chineke nke Israel, sịrị.”—Malakaị 2:14-16.
8. Olee otú echiche nke oge a banyere ịgba alụkwaghịm siworo metụta ụfọdụ ndị n’ọgbakọ ndị Kraịst?
8 N’oge a, n’ọtụtụ mba ebe a pụrụ inweta ịgba alụkwaghịm n’ụzọ dị mfe, ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm arịwo elu. O metụtawo ọbụna ọgbakọ ndị Kraịst. Kama ịchọ enyemaka nke ndị okenye iji merie ihe mgbochi dị iche iche na iji gbalịa mee ka alụmdi na nwunye ha gaa nke ọma, ụfọdụ agbahapụwo ya oké ngwa ngwa. Ọtụtụ mgbe a na-ahapụ ụmụaka ịta ahụhụ mmetụta uche dị ukwuu.—Matiu 19:8, 9.
9, 10. Olee otú anyị kwesịrị isi tụgharịa uche n’ofufe anyị na-efe Jehova?
9 Dị ka anyị hụrụ n’elu, n’ihi ọnọdụ ime mmụọ jọgburu onwe ya nke dị n’ụbọchị Malakaị, Jehova ezoghị ọnụ n’ịkatọ ofufe na-abamighị ime nke ndị Juda ma gosi na ya ga-anara nanị ofufe dị ọcha. Ọ̀ bụ na nke a ekwesịghị ime ka anyị chee echiche n’otú ofufe anyị na-efe Jehova Chineke, bụ́ Eze Onyenwe eluigwe na ala, Isi Iyi nke ezi ịdị nsọ, dịruru ná mma? Ànyị na-ejere Chineke ozi dị nsọ n’ezie? Ànyị na-edebe onwe anyị n’ọnọdụ ime mmụọ dị ọcha?
10 Nke a apụtaghị na anyị aghaghị izu okè, bụ́ nke na-agaghị ekwe omume, ma ọ bụ na anyị kwesịrị iji onwe anyị tụnyere ndị ọzọ. Kama ọ pụtara na onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịdị na-enye Chineke ofufe ya kasị mma dị ka ọnọdụ onye ahụ si dị. Nke a na-ezo aka n’otú ofufe anyị dịruru ná mma. Ozi anyị dị nsọ kwesịrị ịbụ nke kasị mma anyị pụrụ inye—ozi dị nsọ. Olee otú a pụrụ isi mezuo nke ahụ?—Luk 16:10; Ndị Galetia 6:3, 4.
Obi Dị Ọcha Na-eduje n’Ofufe Dị Ọcha
11, 12. Olee ebe àgwà na-adịghị nsọ si amalite?
11 Jisọs kụziri n’ụzọ doro anya na ihe dị n’ime obi ga-apụta ìhè site n’ihe mmadụ na-ekwu ma na-eme. Jisọs gwara ndị Farisii ahụ bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha, ma bụrụ ndị na-adịghị nsọ, sị: “Ụmụ nke ajụala, ùnu ga-esi aṅaa pụọ ikwu ezi ihe, ebe unu bụ ajọ mmadụ? n’ihi na ọnụ site n’ihe nke obi nwebigara ókè na-ekwu okwu.” Ka e mesịrị o gosiri na ajọ ọrụ na-esite n’ajọ echiche ndị dị n’obi, ma ọ bụ mmadụ nke ime. O kwuru, sị: “Ihe nke si n’ọnụ pụta na-esi n’ime obi apụta; ihe ndị a na-emerụkwa mmadụ. N’ihi na n’obi ka ajọ echiche nile, igbu mmadụ nile, ịkwa iko nile nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, ịkwa iko nile, ohi nile, àmà ụgha nile, nkwulu nile, si apụta: ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ.”—Matiu 12:34; 15:18-20.
12 Nke a na-enyere anyị aka ịghọta na omume ndị na-adịghị nsọ abụghị nanị ihe na-apụta na mberede ma ọ bụ ndị na-enweghị ebe mgbakwasị ụkwụ na-ebute ụzọ. Ha bụ ihe na-esi n’echiche na-emerụ emerụ ndị nọworo na-ezo n’ime obi apụta—ọchịchọ nzuzo na ikekwe echiche efu. Ọ bụ ya mere Jisọs pụrụ iji kwuo, sị: “Unu nụrụ na e kwuru, sị, Akwala iko: ma Mụ onwe m sị unu, na nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ịkwa iko nile agbanyeworị mkpọrọgwụ n’ime obi tupu emee ihe ọ bụla. Mgbe ahụ, mgbe ohere ha dapụtara, echiche ndị ahụ na-adịghị nsọ na-aghọ àgwà na-adịghị nsọ. Ịkwa iko nile, idina ụdị onwe, izu ohi, nkwulu, na ndapụ n’ezi ofufe na-aghọ ụfọdụ n’ime ihe ndị pụtara ìhè ọ na-arụpụta.—Matiu 5:27, 28; Ndị Galetia 5:19-21.
13. Olee ihe atụ ụfọdụ nke otú echiche ndị na-adịghị nsọ pụrụ isi duje n’omume ndị na-adịghị nsọ?
13 A pụrụ igosipụta nke a n’ụzọ dị iche iche. Ná mba ụfọdụ, ụlọ ọkụ na-eri ego na-epu dị ka ero, si otú a na-amụba ohere e nwere ịgba chaa chaa. A pụrụ ịnwa mmadụ ọnwụnwa ichigharịkwuru ihe ngwọta ụgha a iji gbalịa ịgwọta nsogbu ego mmadụ nwere. Inwe echiche hiere ụzọ pụrụ idubanye nwanna ịjụ ma ọ bụ ịgwagbu ụkpụrụ Bible ya.c N’ọnọdụ ọzọ, inweta ihe ndị na-akpali mmekọahụ, ma ọ bụ site na TV, vidio, kọmputa, ma ọ bụ akwụkwọ, n’ụzọ dị mfe pụrụ iduba onye Kraịst n’àgwà na-adịghị nsọ. Nanị ihe dị ya mkpa bụ ileghara ihe agha ime mmụọ ya anya, tupu ọ marakwa ya, ọ dabawo n’omume rụrụ arụ. Ma n’ihe ka n’ọtụtụ ọnọdụ ndabanye ná mmehie na-amalite n’uche. Ee, n’ọnọdụ dị ka ndị a, a na-emezu okwu Jemes bụ́: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya. Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ ahụ, mgbe ọ tụwooro ime, o wee mụpụta mmehie.”—Jemes 1:14, 15; Ndị Efesọs 6:11-18.
14. Olee otú ọtụtụ ndị siworo nwetaghachi onwe ha site n’àgwà ha na-adịghị nsọ?
14 N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọtụtụ ndị Kraịst bụ́ ndị na-eme mmehie n’ihi adịghị ike na-egosi ezi nchegharị, ndị okenye na-enwekwa ike iweghachite ndị ahụ n’ụzọ ime mmụọ. Ọbụna ọtụtụ ndị a chụpụrụ n’ihi enweghị nchegharị na-emesịa ghọta onwe ha ma bụrụ ndị kwụrụsighachiri ike n’ọgbakọ. Ha na-abịa ghọta otú Setan si merie ha n’ụzọ dị mfe mgbe ha kwere ka echiche ndị na-adịghị nsọ gbanye mkpọrọgwụ n’ime obi.—Ndị Galetia 6:1; 2 Timoti 2:24-26; 1 Pita 5:8, 9.
Ihe Ịma Aka Ahụ—Iche Adịghị Ike Anyị Nile Ihu
15. (a) N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji chee adịghị ike anyị nile ihu? (b) Gịnị pụrụ inyere anyị aka ikweta adịghị ike anyị nile?
15 Anyị aghaghị ime mgbalị ịmara obi anyị n’ụzọ ziri ezi. Ànyị dị njikere iche adịghị ike anyị nile ihu, ikweta ha, mgbe ahụkwa rụọ ọrụ imeri ha? Ànyị dị njikere ịjụ otu enyi nke na-ekwu eziokwu otú anyị pụrụ isi meziwanye ihe, mgbe ahụkwa ṅaa ntị n’okwu ndụmọdụ ya? Iji nọgide na-adị nsọ anyị aghaghị imeri mmejọ anyị nile. N’ihi gịnị? N’ihi na Setan maara adịghị ike anyị nile. Ọ ga-eji atụmatụ aghụghọ ya nile mee ihe iji kpasuo anyị ime mmehie na àgwà na-adịghị nsọ. Site n’ọrụ aghụghọ ya, ọ na-anwa ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke ka anyị wee bụrụ ndị a na-edokwaghị nsọ na ndị na-abaghị uru maka ofufe Jehova.—Jeremaịa 17:9; Ndị Efesọs 6:11; Jemes 1:19.
16. Mgba dị aṅaa ka Pọl nwere ịgba?
16 Pọl onyeozi nwetara ule na ọnwụnwa ndị nke ya, dị ka ọ gbara akaebe ya n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, sị: “Amatara m na ezi ihe adịghị ebi n’ime m, nke ahụ bụ, n’anụ ahụ m: n’ihi na ịchọ ihe ọma dị nso n’ebe aka m ga-eru, ma ịrụta ihe ọma adịghị nso n’ebe aka m ga-eru. N’ihi na ezi ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme. . . . Mụ na iwu Chineke na-enwekọ obi ụtọ dị ka mmadụ ime m si dị: ma ana m ahụ iwu dị iche n’ihe nile dị m n’ahụ, na-ebu agha megide iwu nke uche m, na-adọtakwa m n’agha nye iwu nke mmehie nke dị n’ihe nile dị m n’ahụ.”—Ndị Rom 7:18-23.
17. Olee otú Pọl si merie na mgba ya megide adịghị ike dị iche iche?
17 Ugbu a isi ihe dị mkpa n’ọnọdụ nke Pọl bụ na o kwetara adịghị ike ya nile. N’agbanyeghị na ha dị, ọ pụrụ ikwu, sị: “Mụ na iwu Chineke na-enwekọ obi ụtọ dị ka mmadụ ime [ime mmụọ] m si dị.” Pọl hụrụ ezi ihe n’anya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Ma ọ ka nwekwara mgba ọ ga-agba, otu mgba ahụ anyị nile nwere—megide Setan, ụwa, na anụ ahụ. Ya mere olee otú anyị pụrụ isi merie n’ọgụ nke ịnọgide na-adị nsọ, ịbụ ndị e kewapụrụ n’ụwa a na echiche ya?—2 Ndị Kọrint 4:4; Ndị Efesọs 6:12.
Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Nọgide Na-adị Nsọ?
18. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-adị nsọ?
18 A dịghị enweta ịdị nsọ site n’ime ihe kasị dị mfe ma ọ bụ site n’imejụ ọchịchọ onwe onye. Ụdị onye dị otú ahụ ga na-eme ngọpụ mgbe nile maka àgwà ya ma na-anwa ibufe ịta ụta ahụ ebe ọzọ. Ikekwe ọ dị anyị mkpa ịmụta ịdị na-ekweta ihe ndị anyị mere ma ghara ịdị ka ụfọdụ ndị na-ekwu na akara aka na-emegide ha n’ihi nzụlite ezinụlọ ma ọ bụ mkpụrụ ndụ ihe nketa ha. Ebe okwu ahụ gbanyere mkpọrọgwụ bụ n’obi onye ahụ. Ọ̀ hụrụ ezi omume n’anya? na-enwe agụụ siri ike maka ịdị nsọ? ọchịchọ maka ngọzi Chineke? Onye ọbụ abụ ahụ mere ka mkpa nke ịdị nsọ doo anya mgbe o kwuru, sị: “Si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị, mee ezi ihe; na-achọsi udo ike, gbasookwa ya.” Pọl onyeozi dere, sị: “Ka ịhụnanya bụrụ ihe nke ihu abụọ na-adịghị n’ime ya. Na-akpọnụ ajọ ihe asị; na-arapara ezi ihe n’ahụ.”—Abụ Ọma 34:14; 97:10; Ndị Rom 12:9.
19, 20. (a) Olee otú anyị pụrụ isi wulite uche anyị? (b) Gịnị ka ọmụmụ ihe onwe onye dị irè na-agụnye?
19 Anyị pụrụ ‘ịrapara ezi ihe n’ahụ’ ma ọ bụrụ na anyị elee ihe anya otú Jehova si ele ihe anya, ọ bụrụkwa na anyị nwere echiche Kraịst. (1 Ndị Kọrint 2:16) Olee otú e si emezu nke a? Site n’ịmụ na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke mgbe nile. E nyela ndụmọdụ a ọtụtụ ugboro! Ma ànyị na-eji ya akpọrọ ihe ruo n’ókè zuru ezu? Dị ka ihe atụ, ị̀ na-amụ magazin a n’ezie, na-atụle akụkụ Bible dị iche iche, tupu ị bịa nzukọ? Mgbe a na-ekwu ịmụ ihe anyị adịghị ekwu nanị ịka akara n’okpuru nkebi ahịrịokwu ole na ole na paragraf nke ọ bụla. A pụrụ igwunyetụ anya n’otu isiokwu dịịrị ọmụmụ ma kaa akara na ya n’ihe dị ka ná nkeji 15. Nke ahụ ọ̀ pụtara na anyị amụwo isiokwu ahụ? N’ezie, ọ pụrụ iwe otu hour ma ọ bụ abụọ iji mụọ ma ghọta abamuru ime mmụọ nke isiokwu nke ọ bụla na-ewepụta.
20 Ikekwe ọ dị anyị mkpa inwe njide onwe onye iji hapụ TV ruo hour ole na ole kwa izu ma tinye uche n’ezie n’ịdị nsọ onwe anyị. Anyị ịmụchi ihe anya na-ewuli anyị elu n’ụzọ ime mmụọ, na-akpasu uche anyị ime mkpebi ndị ziri ezi—mkpebi ndị na-eduje “n’ibi obi nsọ nile.”—2 Pita 3:11; Ndị Efesọs 4:23; 5:15, 16.
21. Ajụjụ dị aṅaa fọrọ ka a zaa ya?
21 Ugbu a ajụjụ bụ, N’ọrụ na àgwà ndị ọzọkwa dị aṅaa ka anyị pụrụ ịdị nsọ dị ka ndị Kraịst, ọbụna dị ka Jehova dị nsọ? Isiokwu na-esonụ ga-enye anyị ihe ụfọdụ anyị ga-echebara echiche.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Akwụkwọ ntụaka a nke nwere mpịakọta abụọ bụ nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Maka ntụle ka zuo ezu nke ihe “ghọgbuworo” pụtara, lee Teta! nke May 8, 1994, peji nke 28, “Ụdị Ịgba Alụkwaghịm Dị Aṅaa Ka Chineke Kpọrọ Asị?”
c Maka inwetakwu ihe ọmụma n’ihe mere ịgba chaa chaa ji bụrụ àgwà na-adịghị nsọ, lee Teta! nke November 8, 1994, peji nke 14-15, nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, bipụtara.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee otú e si mee ka a mata Isi Iyi nke ịdị nsọ n’Israel?
◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ofufe ndị Israel si bụrụ nke na-adịghị nsọ n’ụbọchị Malakaị?
◻ Olee ebe àgwà na-adịghị nsọ si amalite?
◻ Iji dị nsọ, gịnị ka anyị na-aghaghị ịmata?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-adị nsọ?