Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 8/1 p. 15-20
  • “Ghọọkwanụ Ndị Dị Nsọ n’Ibi Obi Nile”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ghọọkwanụ Ndị Dị Nsọ n’Ibi Obi Nile”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndụ Dị Nsọ, Ụgwọ Dị Nsọ
  • Àgwà Dị Nsọ n’Ime Ezinụlọ
  • Ịdị Nsọ na Ndị Òtù Ezinụlọ Anyị Na-ekweghị Ekwe
  • Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Dị Nsọ n’Ime Ọgbakọ?
  • Ịdị Nsọ Anyị Ọ̀ Na-apụta Ìhè  n’Ógbè Ebe Anyị Bi?
  • Ịdị Nsọ n’Ebe Ọrụ na n’Ụlọ Akwụkwọ
  • ‘Unu Ga-adị Nsọ n’Ihi na Nsọ Ka Mụ Onwe M Dị’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • ‘Nsọ, Nsọ, Nsọ Ka Jehova Dị’
    Bịaruo Jehova Nso
  • “Unu Ga-adị Nsọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Gbalịa ‘Ịdị Nsọ n’Egwu Chineke’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 8/1 p. 15-20

“Ghọọkwanụ Ndị Dị Nsọ n’Ibi Obi Nile”

“Dị ka Onye kpọrọ unu dị nsọ, unu onwe unu, ghọọkwanụ ndị dị nsọ n’ibi obi nile dị iche iche; n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Unu ga-adị nsọ; n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị.”—1 PITA 1:15, 16.

1. N’ihi gịnị ka Pita ji kpọkuo ndị Kraịst ka ha dị nsọ?

N’IHI gịnị ka Pita onyeozi ji nye ndụmọdụ ahụ dị n’elu? N’ihi na ọ hụrụ mkpa ọ dị ka onye Kraịst ọ bụla chee echiche ya na omume ya nile nche iji mee ka ha nọgide na-ekwekọ n’ịdị nsọ Jehova. Ya mere, tupu o kwuo ihe ndị ahụ dị n’elu o kwuru, sị: “Keenụ ihe okike a n’úkwù nke uche unu, nweekwanụ anya udo . . . dị ka ụmụ nke ịṅa ntị, unu emekwala onwe unu ka unu dị ka agụụ ihe ọjọọ ahụ si dị, bụ́ nke gụrụ unu na mbụ n’amaghị ihe unu.”—1 Pita 1:13, 14.

2. Gịnị mere ọchịchọ anyị nile ji bụrụ ndị na-adịghị nsọ tupu anyị mụta eziokwu ahụ?

2 Ọchịchọ anyị na mbụ bụ ndị na-adịghị nsọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọtụtụ n’ime anyị gbasoro ụzọ ụwa si eme ihe tupu anyị anakwere eziokwu ndị Kraịst. Pita maara nke a mgbe o dere n’ụzọ doro anya, sị: “Oge nke gasịworo ezuwo ịrụpụta ihe ndị mba ọzọ na-ezube, na ijegharị n’ime agụụ ịkwa iko, agụụ ihe ọjọọ nile, mmanya ogbugbu nile, ite egwu nile, ịṅụbiga mmanya ókè nile, na ikpere arụsị nile jọgburu onwe ha.” N’ezie, Pita edepụtaghị omume ndị na-adịghị nsọ e ji mara ụwa oge anyị a, ebe ọ bụ na a maghị ha n’oge ahụ.—1 Pita 4:3, 4.

3, 4. (a) Olee otú anyị pụrụ isi lụsoo ọchịchọ ọjọọ ọgụ? (b) Ndị Kraịst hà ga-abụrịrị ndị na-enweghị mmetụta uche? Kọwaa.

3 Ị̀ chọpụtara na ọchịchọ ndị a bụ ndị na-amasị anụ ahụ, echiche ịmata ihe, na mmetụta uche? Mgbe anyị kwere ka ihe ndị a nọchie, mgbe ahụ echiche na omume anyị na-aghọ ndị na-adịghị nsọ n’ụzọ dị nnọọ mfe. Nke a na-egosi mkpa ọ dị ikwe ka ike nke uche chịkwaa omume anyị. Pọl si otú a kwupụta ya: “Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere nile nke Chineke na-arịọ unu, ka unu chee ahụ unu n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ, nke bụ ikpe ekpere unu dị ka uche si dị.”—Ndị Rom 12:1, 2.

4 Iji chụọrọ Chineke àjà dị nsọ, anyị aghaghị ikwe ka ike nke uche, ọ bụghị mmetụta uche, chịa anyị. Lee mmadụ ole dabaworo n’omume rụrụ arụ n’ihi na ha kwere ka mmetụta chịkwaa àgwà ha! Nke ahụ apụtaghị na a ga-abịanyụ mmetụta uche anyị; ma ọ bụghị ya, olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ọṅụ n’ozi Jehova? Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmịpụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ kama ọrụ nke anụ ahụ, mgbe ahụ anyị aghaghị ịgbanwe uche anyị gaa n’ụzọ Kraịst si eche echiche.—Ndị Galetia 5:22, 23; Ndị Filipaị 2:5.

Ndụ Dị Nsọ, Ụgwọ Dị Nsọ

5. N’ihi gịnị ka mkpa nke ịdị nsọ ji dịrị Pita n’obi?

5 Gịnị mere mkpa nke ịdị nsọ ndị Kraịst ji dị Pita n’obi otú a? N’ihi na ọ maara nke ọma ụgwọ dị nsọ a kwụworo iji gbapụta agbụrụ mmadụ na-erube isi. O dere, sị: “Unu matara na e jighị ihe a pụrụ imebi, bụ́ ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo, gbapụta unu n’ibi obi efu unu nke nna unu hà nyere unu n’aka ibi; kama e ji ọbara dị oké ọnụ ahịa, dị ka nke nwa atụrụ nke ọrụ ma ọ bụ ntụpọ na-adịghị ya n’ahụ, bụ́ ọbara nke Kraịst.” (1 Pita 1:18, 19) Ee, Isi Iyi nke ịdị nsọ, bụ́ Jehova Chineke, ezitewo Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ “Onye Nsọ ahụ” n’ụwa, ịbịa kwụọ ihe mgbapụta ahụ nke ga-enye ndị mmadụ ohere iso Chineke nwee ezi mmekọrịta.—Jọn 3:16; 6:69; Ọpụpụ 28:36; Matiu 20:28.

6. (a) Gịnị mere na ọ dịghịrị anyị mfe ịchụso àgwà dị nsọ? (b) Gịnị pụrụ inyere anyị aka ijigide àgwà anyị dị nsọ?

6 Otú ọ dị, anyị aghaghị ịghọta na ọ dịghị mfe ibi ndụ dị nsọ mgbe a ka nọ n’ime ụwa Setan rụrụ arụ. Ọ na-esiri ezi ndị Kraịst ọnyà, bụ́ ndị na-agbalị ịlanarị n’usoro ihe ya. (Ndị Efesọs 6:12; 1 Timoti 6:9, 10) Nrụgide nke ọrụ ego, nke mmegide ezinụlọ, nke ịkwa emo n’ụlọ akwụkwọ, na nke nrụgide ndị ọgbọ na-eme ka inwe ọnọdụ ime mmụọ siri ike dị mkpa ka mmadụ wee jigide ịdị nsọ. Nke ahụ na-emesi ike ọrụ dị mkpa nke ọmụmụ ihe onwe onye anyị na anyị ịbịachi nzukọ ndị Kraịst anya na-arụ. Pọl dụrụ Timoti ọdụ, sị: “Jide ihe ilereanya nke okwu na-enye ezi ndụ nke ị nụrụ n’ọnụ m, n’ime okwukwe na ịhụnanya nke dị n’ime Kraịst Jisọs.” (2 Timoti 1:13) Anyị na-anụ okwu ndị ahụ na-enye ezi ndụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na n’ọmụmụ anyị na-amụ Bible n’onwe anyị. Ha pụrụ inyere anyị aka ịdị nsọ n’àgwà anyị n’ọtụtụ ọnọdụ dị iche iche kwa ụbọchị.

Àgwà Dị Nsọ n’Ime Ezinụlọ

7. Olee otú ịdị nsọ kwesịrị isi metụta ndụ ezinụlọ anyị?

7 Mgbe Pita hotara Levitikọs 11:44, o ji okwu Grik bụ́ haʹgi·os mee ihe, bụ́ nke pụtara “nke e kewapụrụ pụọ ná mmehie n’ihi ya kwa bụrụ nke a raara nye Chineke, nke e doro nsọ.” (An Expository Dictionary of New Testament Words, nke W. E. Vine dere) Olee otú nke a kwesịrị isi metụta anyị ná ndụ ezinụlọ ndị Kraịst anyị? Ọ ghaghị ịpụta n’ezie na ndụ ezinụlọ anyị kwesịrị ịdabere n’ịhụnanya, n’ihi na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ịhụnanya nke iji onwe onye achụ àjà bụ mmanụ nke na-eme ka mmekọrịta dị n’etiti di na nwunye na n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ na-aga were were.—1 Ndị Kọrint 13:4-8; Ndị Efesọs 5:28, 29, 33; 6:4; Ndị Kọlọsi 3:18, 21.

8, 9. (a) Ọnọdụ dị aṅaa na-ebilite mgbe ụfọdụ n’ebe obibi onye Kraịst? (b) Olee ndụmọdụ dị mma Bible na-enye n’okwu a?

8 Anyị nwere ike iche na igosipụta ịhụnanya dị otú ahụ ga-adị n’ezinụlọ ndị Kraịst n’etinyeghịrị ya mgbalị. Ma, a ghaghị ikweta na ịhụnanya adịghị adịrucha mgbe nile otú o kwesịrị ịdị n’ebe obibi ụfọdụ nke ndị Kraịst. Ọ pụrụ iyi ka ọ dị mgbe a nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma lee ka ịdị nsọ anyị pụrụ isi belata n’ụzọ dị mfe n’ebe obibi. Mgbe ahụ anyị pụrụ ichezọ na mberede na nwunye ka bụkwa nwanna anyị nwanyị bụ́ onye Kraịst ma ọ bụ na di ka bụkwa otu nwanna nwoke ahụ (na ikekwe ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye) nke yiri ka a na-akwanyere ya ùgwù n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A na-akpasu anyị iwe, ịrụ ụka kpụ ọkụ n’ọnụ pụkwara ibilite. Ụkpụrụ abụọ pụrụ ọbụna igbebata n’ime ndụ anyị. Ọ bụkwaghị mmekọrịta nke di na nwunye yiri Kraịst kama nanị nke nwoke na nwanyị na-ese okwu. Ha echezọọ na e kwesịrị inwe ọnọdụ dị nsọ n’ebe obibi. Ikekwe ha amalite ikwu okwu dị ka ndị ụwa. Lee nnọọ ka okwu dị njọ, nke na-afụ ụfụ n’ahụ pụziri isi si n’ọnụ na-apụta n’ụzọ dị mfe!—Ilu 12:18; tụlee Ọrụ 15:37-39.

9 Otú ọ dị, Pọl na-adụ ọdụ, sị: “Ka okwu ọ bụla nke na-ere ure [Grik, loʹgos sa·prosʹ, “okwu na-emerụ emerụ,” n’ihi ya nke na-adịghị nsọ] ghara isi n’ọnụ unu pụta, kama ihe bụ ezi ihe, iwuli mmadụ elu dị ka ụlọ, dị ka mkpa si dị, ka o wee nye ndị na-anụ ya amara.” Nke ahụ na-ezokwa aka ná ndị nile na-anụ ya n’ebe obibi, tinyere ụmụaka.—Ndị Efesọs 4:29; Jemes 3:8-10.

10. Olee otú ndụmọdụ e nyere n’ịdị nsọ si emetụta ụmụaka?

10 Ugbu a ụkpụrụ nduzi a banyere ịdị nsọ na-emetụtakwa ụmụaka nọ n’ime ezinụlọ ndị Kraịst. Lee ka o si dị mfe ha isi n’ụlọ akwụkwọ lọta wee malite iṅomi okwu nnupụisi na nke enweghị nkwanye ùgwù nke ndị ọgbọ ha bụ́ ndị ụwa! Ụmụaka, unu adabala n’omume nke ụmụ okoro a na-azụghị azụ ndị kparịrị onye amụma Jehova bụ́ ndị nwekwara ndị yiri ha taa bụ ndị ọnụ ha rere ure, ndị na-ekwulu nkwulu. (2 Ndị Eze 2:23, 24) Okwu unu ekwesịghị ịbụ nke rụrụ arụ nke ndị dịbigara umengwụ oké ma ọ bụ ndị na-adịghị ajụ ase banyere iji okwu ndị dị mma eme ihe merụrụ. Dị ka ndị Kraịst, okwu anyị kwesịrị ịdị nsọ, dị ụtọ, na-ewuli elu, dị amara, ma bụrụ nke “e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.” O kwesịrị ime ka a mara anyị dị ka ndị dị iche n’ebe ndị ọzọ nọ.—Ndị Kọlọsi 3:8-10; 4:6.

Ịdị Nsọ na Ndị Òtù Ezinụlọ Anyị Na-ekweghị Ekwe

11. N’ihi gịnị ka ịdị nsọ na-ejighị pụta ịbụ onye ezi omume n’anya onwe onye?

11 Ka anyị na-agbalịsi ike ịdị nsọ, anyị ekwesịghị ime ka anyị ka ndị ọzọ elu ma bụrụ ndị ezi omume karịa ha, karịsịa mgbe a na-emeso ndị òtù ezinụlọ na-ekweghị ekwe. Àgwà obi ọma anyị nke ndị Kraịst kwesịrị inyere ha aka ma ọ dịghị ihe ọzọ ịhụ na anyị dị iche n’ụzọ dị mma, na anyị maara otú e si egosi ịhụnanya na ọmịiko, ọbụna dị ka ezi onye Sameria ahụ dị n’ilu Jisọs mere.—Luk 10:30-37.

12. Olee otú di na nwunye bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi mee ka eziokwu ahụ na-adọrọ adọrọ karị nye di ma ọ bụ nwunye ha?

12 Pita mesiri ike mkpa ọ dị inwe omume kwesịrị ekwesị n’ebe ndị òtù ezinụlọ anyị na-ekweghị ekwe nọ mgbe o degaara ndị Kraịst bụ́ nwunye akwụkwọ, sị: “Otú ahụ, ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu; ka, ọbụna a sị na ụfọdụ ekwenyeghị okwu Chineke, ka e wee site n’ibi obi nwunye ha rite ha n’uru n’ebe a na-ekwughị okwu; mgbe ha na-ele ibi obi unu dị ọcha, ya na egwu.” Onye Kraịst bụ́ nwunye (ma ọ bụkwanụ di) pụrụ ime ka eziokwu ahụ na-adọrọ adọrọ karị nye di ma ọ bụ nwunye ya na-ekweghị ekwe ma ọ bụrụ na àgwà ya dị ọcha, bụrụ nke nchebara echiche, na nke nkwanye ùgwù. Nke a pụtara na e kwesịrị ịdị nro n’usoro ọchịchị Chineke ka a ghara ịgbachi di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe nkịtị ma ọ bụ leghara ya anya.a—1 Pita 3:1, 2.

13. Olee otú ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi pụrụ isi nyere ndị di na-ekweghị ekwe aka mgbe ụfọdụ inwe mmasị n’eziokwu ahụ?

13 Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi pụrụ inye aka mgbe ụfọdụ site n’ịbịa mara di ahụ na-ekweghị ekwe ná mkpakọrịta nkịtị. N’ụzọ dị otú a ọ pụrụ ịhụ na Ndịàmà bụ ndị isi zuru ezu, ndị ezi mmadụ nwere ọtụtụ ihe na-amasị ha tinyere isiokwu ndị ọzọ na-abụghị nanị Bible. N’otu ọnọdụ, onye okenye nwere mmasị n’ihe omume ntụrụndụ nke ịkụ azụ nke otu di. O zuru ezu iji merie ihe mgbochi ahụ. Di ahụ mesịrị ghọọ nwanna e mere baptism. N’ọnọdụ ọzọ, otu di na-ekweghị ekwe nwere mmasị ná nnụnụ canary. Ike agwụghị ndị okenye. Otu n’ime ha mụrụ isiokwu ahụ ka o wee nwee ike ịmalite mkparịta ụka mgbe ọzọ o zutere nwoke ahụ, n’isiokwu kasị amasị onye ahụ bụ di! Ya mere, ịbụ onye dị nsọ apụtaghị ịraparasi ike n’otu ụzọ ma ọ bụ inwe uche chere ihu n’otu ebe.—1 Ndị Kọrint 9:20-23.

Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Dị Nsọ n’Ime Ọgbakọ?

14. (a) Gịnị bụ otu n’ime ụzọ Setan ji eme ihe n’imebi ọgbakọ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi guzogide ọnyà Setan?

14 Setan bụ́ Ekwensu bụ onye nkwutọ, n’ihi na aha Grik maka Ekwensu, bụ́ di·aʹbo·los, pụtara “onye na-ebo ebubo” ma ọ bụ “onye nkwutọ.” Nkwutọ bụ otu n’ime ihe ndị ọ bụ ọkpọka na ha, ọ na-agbalịkwa iji ya eme ihe n’ime ọgbakọ. Ụzọ o ji eme ihe karịsịa bụ asịrị. Ànyị na-ekwe ka anyị bụrụ ndị ọ ghọrịrị n’àgwà a na-adịghị nsọ? Olee otú nke ahụ pụrụ isi mee? Site n’ịmalite ya, ikwughachi ya, ma ọ bụ site n’ịṅa ntị na ya. Ilu ahụ amamihe dị na ya na-ekwu, sị: “Onye na-agbakụta Chineke azụ na-ezisa iseokwu: ọzọ, onye na-ekwu okwu azụ na-ekewa ezi enyi.” (Ilu 16:28) Gịnị bụ ọgwụ asịrị na nkwutọ? Anyị kwesịrị ijide n’aka na okwu anyị na-ewuli elu mgbe nile ma dabere n’ịhụnanya. Ọ bụrụ na anyị achọọ àgwà ndị dị mma kama omume ndị e chere na ha dị njọ nke ụmụnna anyị, mkparịta ụka anyị ga-abụ ihe dị ụtọ mgbe nile na nke ime mmụọ. Cheta na ime nkatọ dị mfe. Onye na-agbakwara gị asịrị banyere ndị ọzọ nwekwara ike ịgbara ndị ọzọ asịrị banyere gị!—1 Timoti 5:13; Taịtọs 2:3.

15. Olee àgwà yiri nke Kraịst ndị ga-enye aka ime ka ndị nile nọ n’ọgbakọ nọgide na-adị nsọ?

15 Iji mee ka ọgbakọ nọgide na-adị nsọ, ọ dị anyị nile mkpa inwe uche Kraịst, anyị makwaara na àgwà ya bụ isi bụ ịhụnanya. Ya mere, Pọl dụrụ ndị Kọlọsi ọdụ ka ha nwee ọmịiko dị ka Kraịst, sị: “Ya mere dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ ndị a hụwokwara n’anya, yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi . . . , werekwanụ amara gbaghara onwe unu . . . ma n’elu ihe ndị a nile yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ́ ihe nkekọ nke izu okè.” Mgbe ahụ o kwukwasịrị: “Ka udo nke Kraịst na-ekpezikwa okwu n’obi unu.” N’ezie site na mmụọ mgbaghara nke a, anyị pụrụ ịnọgide na-enwe ịdị n’otu na ịdị nsọ nke ọgbakọ.—Ndị Kọlọsi 3:12-15.

Ịdị Nsọ Anyị Ọ̀ Na-apụta Ìhè  n’Ógbè Ebe Anyị Bi?

16. N’ihi gịnị ka ofufe anyị dị nsọ kwesịrị iji bụrụ ofufe obi ụtọ?

16 Gịnị banyere ndị agbata obi anyị? Olee otú ha si ele anyị anya? Ànyị na-egbukepụ ọṅụ nke eziokwu ahụ, ka ànyị na-eme ka o yie ibu arọ? Ọ bụrụ na anyị dị nsọ ọbụna dị ka Jehova dị nsọ, mgbe ahụ o kwesịrị ịpụta ìhè n’okwu anyị na n’àgwà anyị. O kwesịrị ido anya na ofufe anyị dị nsọ bụ ofufe obi ụtọ. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova Chineke anyị bụ Chineke obi ụtọ, onye chọrọ ka ndị na-efe ya ofufe nwee ọṅụ. N’ihi ya, onye ọbụ abụ ahụ pụrụ ikwu banyere ndị Jehova n’oge ochie, sị: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha.” Ànyị na-egosipụta obi ụtọ ahụ? Ụmụ anyị hà na-egosipụtakwa afọ ojuju n’ịnọ n’etiti ndị Jehova n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na ná mgbakọ dị iche iche?—Abụ Ọma 89:15, 16; 144:15b.

17. Gịnị ka anyị pụrụ ime n’ụzọ bara uru iji gosi ịdị nsọ guzoziri eguzozi?

17 Anyị pụkwara igosi ịdị nsọ anyị guzoziri eguzozi site na mmụọ imekọ ihe ọnụ anyị na obi ọma onye agbata obi. Ọ na-adị mkpa mgbe ụfọdụ ka ndị agbata obi mekọọ ihe ọnụ, ikekwe iji kpochaa ógbè ebe ha bi ma ọ bụ, dị ka ọ dị ná mba ụfọdụ, inye aka dozie ụzọ dị iche iche. N’akụkụ a, ịdị nsọ anyị pụrụ ịpụta ìhè n’otú anyị si elekọta ubi, ogige, ma ọ bụ ihe onwunwe anyị ndị ọzọ. Ọ bụrụ na anyị ahapụ ihe mkpofu ka ọ tụsasịa ebe nile ma ọ bụ nwee ogige na-adịghị ọcha ma ọ bụ nke a na-edozighị edozi, ikekwe ọbụna nwee ụgbọ ala na-adịghị arụkwa ọrụ ebe mmadụ nile na-ahụ ya, ànyị pụrụ ikwu na anyị ji nkwanye ùgwù na-emeso ndị agbata obi anyị?—Mkpughe 11:18.

Ịdị Nsọ n’Ebe Ọrụ na n’Ụlọ Akwụkwọ

18. (a) Gịnị bụ ọnọdụ siri ike nye ndị Kraịst taa? (b) Olee otú anyị pụrụ isi dị iche pụọ n’ụwa?

18 Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nọ n’obodo Kọrint ahụ na-adịghị nsọ akwụkwọ, sị: “Edegaara m unu n’akwụkwọ ozi m ka unu na ndị na-akwa iko ghara imekọ ihe; ọ bụghị ndị nke ụwa nke a ndị na-akwa iko ma ọlị, ma ọ bụ ndị anyaukwu ya na ndị ya na-apụnara mmadụ ihe, ma ọ bụ ndị ya na-ekpere arụsị: ebe ọ ga-adị unu mkpa isi n’ụwa pụọ ma a sị na unu emee otú a.” (1 Ndị Kọrint 5:9, 10) Nke a bụ ọnọdụ siri ike nye ndị Kraịst, ndị ha na ndị nwere omume rụrụ arụ ma ọ bụ ndị na-enweghị ụkpụrụ omume ọ bụla na-aghaghị imekọ ihe kwa ụbọchị. Nke a bụ oké ule nke iguzosi ike n’ezi ihe, karịsịa n’ọdịbendị ebe ndị a na-akwado iyi egwu mmekọahụ, ịrụ arụ, na akwụwaghị aka ọtọ ma ọ bụ na-agbachi ha nkịtị. N’ọnọdụ a anyị apụghị iwetulata ụkpụrụ anyị iji yie “ndị isi zuru okè” nye ndị nọ anyị gburugburu. Kama nke ahụ, àgwà obi ọma ndị Kraịst anyị nke dịkwa iche kwesịrị ime ka anyị dị iche nye ndị nwere nghọta, nye ndị ghọtara mkpa ime mmụọ ha, ndị na-achọkwa ihe ka mma.—Matiu 5:3; 1 Pita 3:16, 17.

19. (a) Ule ndị dị aṅaa ka unu bụ́ ụmụaka nwere n’ụlọ akwụkwọ? (b) Gịnị ka ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime iji kwadoo ụmụ ha na àgwà ha dị nsọ?

19 N’otu aka ahụ, e nwere ọtụtụ ule na-eche ụmụ anyị ihu n’ụlọ akwụkwọ. Unu ndị mụrụ ụmụ ùnu na-eje eleta ụlọ akwụkwọ ebe ụmụ unu na-eje akwụkwọ? Ùnu maara ụdị ọnọdụ dị n’ebe ahụ? Unu na ndị nkụzi ùnu nwere mmekọrịta dị mma? N’ihi gịnị ka ajụjụ ndị a ji dị mkpa? N’ihi na n’ọtụtụ ógbè ndị mepere emepe n’ụwa, ụlọ akwụkwọ aghọwo ọgbọ ime ihe ike, ọgwụ ọjọọ, na mmekọahụ. Olee otú ụmụ unu pụrụ isi jigide iguzosi ike n’ezi ihe ha ma mee ka àgwà ha nọgide na-adị nsọ ma ọ bụrụ na ha enwetaghị nkwado ọmịiko zuru ezu nke ndị mụrụ ha? N’ụzọ ziri ezi Pọl dọrọ ndị mụrụ ụmụ aka ná ntị, sị: “Ndị bụ́ nna, akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.” (Ndị Kọlọsi 3:21) Otu ụzọ isi mee ka obi fuo ụmụaka bụ ịghara ịghọta nsogbu na ule ndị ha na-enwe kwa ụbọchị. Nkwadebe maka ọnwụnwa ndị dị n’ụlọ akwụkwọ na-amalite n’ọnọdụ ime mmụọ dị n’ebe obibi onye Kraịst.—Deuterọnọmi 6:6-9; Ilu 22:6.

20. N’ihi gịnị ka ịdị nsọ ji dị mkpa nye anyị nile?

20 Ná mmechi, n’ihi gịnị ka ịdị nsọ ji dị anyị nile mkpa? N’ihi na ọ bụ ihe nchebe pụọ ná mwabata nke ụwa Setan na echiche ya. Ọ bụ ngọzi ugbu a, ọ ga-abụkwa n’ọdịnihu. Ọ na-eme ka anyị jide ndụ ahụ nke ga-abụ ndụ n’ezie n’aka n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume. Ọ na-enyere anyị aka inwe ezi nguzo, bụrụ ndị a pụrụ ịbịaru nso, ndị Kraịst na-eso ndị ọzọ ekwurịta okwu—ọ bụghị ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè bụ́ ndị na-adịghị ekwe ekwe. N’igbu ya nkenke, ọ na-eme ka anyị yie Kraịst.—1 Timoti 6:19.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka inwetakwu ihe ọmụma n’isoro di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe na-enwe mmekọrịta n’ụzọ akọ, lee Ụlọ Nche nke August 15, 1990, “Elefurula Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Anya!” peji nke 20-22 na November 1, 1988, peji nke 24-25, paragraf nke 20-22.

Ị̀ Na-echeta?

◻ N’ihi gịnị ka Pita ji hụ mkpa ọ dị ịdụ ndị Kraịst ọdụ n’ịdị nsọ?

◻ Gịnị mere na ọ dịghị mfe ibi ndụ dị nsọ?

◻ Gịnị ka anyị nile pụrụ ime iji meziwanye ịdị nsọ n’ime ezinụlọ?

◻ Ka ọgbakọ wee nọgide na-adị nsọ, olee àgwà na-adịghị nsọ anyị kwesịrị izere?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-adị nsọ n’ebe ọrụ na n’ụlọ akwụkwọ?

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị kwesịrị inwe ọṅụ n’ijere Chineke ozi na n’ọrụ ndị ọzọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya