Akara Aka Ọ̀ Na-achịkwa Ndụ Gị?
“ALA NÒ DON.” N’asụsụ Bambara nke Mali, Ọdịda Anyanwụ Africa, nke a pụtara, “Ọ bụ ọrụ aka Chineke.” Okwu ndị dị otú a bụ nnọọ ihe a na-ekwukarị n’akụkụ ahụ nke ụwa. N’asụsụ Wolof, a na-ekwu, sị, “Yallah mo ko def” (Chineke mere ya). N’otu ire okwu ndị agbụrụ Dogon, ha na-asị, “Ama biray” (Chineke kpatara ya).
Okwu ndị a nwere ndị yiri ha n’ala ndị ọzọ. Okwu ndị dị ka, “Oge ya eruola” na, “Ọ bụ uche Chineke bụ ndị a na-anụkarị mgbe ọ bụla ọnwụ ma ọ bụ ọdachi kpara ike. N’Ọdịda Anyanwụ Africa, okwu ndị dị ka “Mmadụ kaa, Chineke akagharịa” bụ nke a na-edekarị n’ụgbọ njem ọha, a na-edekwasịkwa ha n’ụlọ ahịa dị iche iche. Nye ọtụtụ ndị, ha bụ nanị atụmatụ okwu. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe ha na-egosipụta nkweta ná nkwenkwe akara aka gbamiri mkpọrọgwụ.
Gịnị nnọọ bụ nkwenkwe akara aka? Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-akọwa ya dị ka “nkwenkwe nke na ikike nke ụmụ mmadụ na-apụghị ịchịkwa na-ekpebi ihe ndị na-emenụ.” Gịnị bụ “ikike” ndị a? Ọtụtụ puku afọ gara aga, ndị Babilọn kwenyere na ọdịdị nke kpakpando mgbe a mụrụ mmadụ na-emetụta akara aka ya n’ụzọ siri ike. (Tụlee Aịsaịa 47:13.) Ndị Gris kwenyere na akara aka dị n’aka chi nwanyị atọ dị ike bụ́ ndị kpara, tụọ n’ọ̀tụ̀tụ̀, ma gbubie eriri nke ndụ. Otú ọ dị, ọ bụ ndị ọkà mmụta okpukpe nke Krisendọm chepụtara echiche bụ na Chineke n’onwe ya na-ekpebi akara aka mmadụ!
Dị ka ihe atụ, “Senti” Augustine jụrụ “echiche ụgha na nke jọgburu onwe ya” nke ndị na-agụ kpakpando. N’aka nke ọzọ, ọ rụrụ ụka na “ikwupụta na Chineke dị, ma n’otu oge ahụkwa ịgọnarị na Ọ maara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, bụ ihe nzuzu kasị pụta ìhè.” Ọ zọọrọ na ka Chineke wee bụrụ onye pụrụ ime ihe nile n’ezie, ọ ghaghị “ịmara ihe nile tupu ha emee” ‘n’ebughị ụzọ kpebie ihe nile.’ Ma, Augustine ji ịnụ ọkụ n’obi rụọ ụka na n’agbanyeghị ọmụma Chineke bu ụzọ mara ihe nile na-emenụ, ụmụ mmadụ ka nwere nnwere onwe ime nhọrọ.—The City of God, Akwụkwọ nke Ise, Isi nke 7-9.
Ọtụtụ narị afọ n’ihu, ọkà mmụta okpukpe Protestant bụ́ John Calvin weere okwu ahụ gakwuo n’ihu, na-arụ ụka na ọ bụ ezie na ụfọdụ bụ ndị “[Chineke] nyere akara aka ịbụ ụmụ na ndị nketa nke alaeze eluigwe,” e nyere ndị ọzọ akara aka ịbụ “ndị ọ ga-ewesa iwe ya”!
Taa, a na-eji nkweta n’akara aka akpọrọ oké ihe n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Tụlee ahụmahụ nke Ousmane, nwa okorobịa nọ n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Ọ bụworị otu n’ime ụmụ akwụkwọ ndị kasị mara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ, ma mgbe o lere ule ikpeazụ ya, ọ dara! Nke a pụtara ọ bụghị nanị ịgụ otu klas ugboro abụọ kamakwa inweta mmechuihu n’ihu ezinụlọ na ndị enyi ya. Otu enyi ya gbalịrị ịgụgụ ya site n’ikwu na ọ bụ uche Chineke. Nne Ousmane takwara akara aka ụta n’otu aka ahụ maka ọdịda ya.
Na mbụ Ousmane nwere obi ụtọ ịnakwere mgbalị ha mere inwe ọmịiko. E kwuwerị, ọ bụrụ na ọdịda ya n’ezie bụ uche Chineke, ọ dịghị ihe ọ gaara emeli iji gbochie ya. Ma nna ya nwere echiche dị iche. Ọ gwara Ousmane na ụta dịịrị ya maka ịda ule ahụ—ọ bụghị Chineke. Ousmane dara nanị n’ihi na o legharawo ọmụmụ ihe ya anya.
N’ịbụ onye a kwara okwukwe o nwere n’akara aka aka, Ousmane kpebiri iji aka ya nyochaa okwu ahụ. Anyị na-akpọ gị òkù ugbu a ime otú ihe ahụ site n’ịtụle isiokwu na-esonụ.