Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 10/1 p. 24-28
  • Ijere Jehova Ozi Dị Ka Ezinụlọ Dị n’Otu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ijere Jehova Ozi Dị Ka Ezinụlọ Dị n’Otu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmụta Eziokwu Bible
  • Obi Ụtọ n’Ozi Oge Nile
  • Inwe Mgbanwe ná Ndụ M
  • Nhọrọ Ndị Ụmụ Anyị Mere
  • Ụzọ Inwe Ihe Ịga nke Ọma
  • Nke A Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ụzọ Ndụ Kasị Mma Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Òkù A Na-akpọ Mmadụ Niile!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Obi Ike M n’Ebe Jehova Nọ Kwagidere M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 10/1 p. 24-28

Ijere Jehova Ozi Dị Ka Ezinụlọ Dị n’Otu

DỊ KA ANTONIO SANTOLERI SI KỌỌ

Nna m dị afọ 17 mgbe ọ hapụrụ Itali na 1919. Ọ kwagara Brazil ije chọọ ndụ ka mma. Ka oge na-aga, ọ bịara nwee ebe a na-akpụ isi ná ntakịrị obodo dị n’ime ime obodo São Paulo.

OTU ỤBỌCHỊ na 1938, mgbe m dị afọ asaa, nna m nwetara nsụgharị Bible Brasileira site n’aka otu nwoke bịara n’ụlọ ahịa ya. Afọ abụọ n’ihu nne m dara oké ọrịa ma rịagide ọrịa ruo mgbe ọ nwụrụ. Nna m dakwara ọrịa, ya mere anyị nile—nne m, nna m, nwanne m nwanyị bụ́ Ana, na mụ—gara soro ndị ikwu anyị biri n’obodo ukwu bụ́ São Paulo.

N’oge m na-aga akwụkwọ na São Paulo, aghọrọ m onye na-agụ akwụkwọ nke ukwuu, karịsịa akwụkwọ akụkọ ihe mere eme. Ọ masịrị m na n’ime ha a na-ezo aka na Bible site n’oge ruo n’oge. Otu akwụkwọ nke akụkọ e chepụtara echepụta m gbazitere site n’ọ́bá akwụkwọ ọha dị na São Paulo zoro aka n’Ozizi Elu Ugwu ọtụtụ ugboro. Ọ bụ mgbe ahụ ka m kpebiri inweta Bible iji gụọ ozizi ahụ n’onwe m. Achọgharịrị m Bible ahụ nna m nwetara ọtụtụ afọ gara aga wee mesịa chọta ya n’ala ala otu igbe bụ́ ebe ọ tọgbọworo ruo afọ asaa.

Ezinụlọ anyị bụ ndị Katọlik, ya mere ọ dịtụbeghị mgbe a gbara m ume ịgụ Bible. Ugbu a, n’onwe m, amụtara m ịsapeta isiakwụkwọ na amaokwu ya. Eji m oké obi ụtọ gụọ ọ bụghị nanị Ozizi Elu Ugwu ahụ kama akwụkwọ Matiu nile nakwa akwụkwọ Bible ndị ọzọ. Ihe kasị masị m bụ ụda nke eziokwu nke e ji kọọ ozizi na ọrụ ebube Jisọs.

N’ịmata otú okpukpe Katọlik si dị iche n’ihe m na-agụta n’ime Bible, amalitere m ije Chọọchị Presbyterian, Ana sonyekwaara m. Ma, m ka nwere mmetụta nke ịtọgbọ chakoo n’ime obi m. Ruo ọtụtụ afọ anọwo m na-achọsi Chineke ike. (Ọrụ 17:27) N’otu abalị kpakpando pụtara, mgbe m nọ na-eche echiche, echere m, sị, ‘Gịnị mere m ji nọrọ n’ebe a? Gịnị bụ nzube nke ndụ?’ Achọtara m ebe nọpụrụ iche n’azụ ụlọ, gbuo ikpere n’ala, ma kpee ekpere, sị, ‘Onyenwe anyị Chineke! Ị̀ bụ ònye? Olee otú m pụrụ isi mara gị?’ Azịza bịara ntakịrị oge ka ọ gasịrị.

Ịmụta Eziokwu Bible

Otu ụbọchị na 1949, otu nwa agbọghọ bịakwutere nna m ka o si n’ụgbọala na-arịtu. O nyefere ya magazin Ụlọ Nche na Teta! Ọ tụrụ ụtụ Ụlọ Nche ma gwa ya ka ọ bịa n’ụlọ anyị, na-akọwa na ya nwere ụmụ abụọ na-aga Chọọchị Presbyterian. N’oge nwanyị ahụ bịara, ọ hapụụrụ Ana akwụkwọ bụ́ Children wee malitere ya ọmụmụ Bible. Ka e mesịrị esonyere m n’ọmụmụ ihe ahụ.

Na November 1950 anyị gara mgbakọ Ndịàmà Jehova anyị mbụ. N’ebe ahụ e wepụtara akwụkwọ bụ́ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu,” anyị gakwara n’ihu n’ọmụmụ Bible anyị na-eji akwụkwọ ahụ eme ihe dị ka ihe nduzi anyị. N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị anyị chọpụtara na anyị achọtawo eziokwu ahụ, n’April 1951 e mekwara anyị baptism ná ngosipụta nke nraranye anyị nye Jehova. Nna m mere nraranye ya afọ ụfọdụ n’ihu ma nwụọ n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke na 1982.

Obi Ụtọ n’Ozi Oge Nile

Na January 1954, mgbe m ka dị nanị afọ 22, a nabatara m maka ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, nke a na-akpọ Betel. Mgbe m rutere n’ebe ahụ, o juru m anya ịchọpụta na ọ bụ nwoke ji nanị afọ abụọ tọọ m, bụ́ Richard Mucha, bụ onye nlekọta alaka. Na 1955, mgbe mkpa bilitere maka ndị ohu sekit, dị ka e si akpọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị n’oge ahụ, eso m na mmadụ ise a kpọrọ ikere òkè n’ozi a.

Ebe e kenyere m ọrụ bụ n’obodo Rio Grande do Sul. E nwere nanị ọgbakọ 8 nke Ndịàmà Jehova mgbe m malitere, ma n’ime ọnwa 18 e guzobere ọgbakọ ọhụrụ 2 na ìgwè 20 nọpụrụ iche. Taa n’ógbè a, e nwere sekit 15 nke Ndịàmà Jehova, nke ọ bụla na-enwe ihe dị ka ọgbakọ 20! Ná ngwụsị nke 1956, a gwara m na e kewaala sekit m ụzọ anọ nke ndị ohu sekit anọ ga na-eleta. N’oge ahụ a gwara m ka m laghachite Betel maka ọrụ ọhụrụ.

N’ijuanya na obi ụtọ m, e kenyere m ọrụ n’ebe ugwu Brazil dị ka ohu distrikti, onye ozi na-ejegharị ejegharị nke na-eleta ọtụtụ sekit. Mgbe ahụ Brazil nwere ndị ozi 12,000 nke Ndịàmà Jehova, mba ahụ nwekwara distrikti abụọ. Richard Wuttke letara ebe ndịda, m nwekwa distrikti dị n’ebe ugwu. Na Betel a zụrụ anyị maka iji ígwè projector egosi ihe nkiri nke Ndịàmà Jehova mepụtara, bụ́ The New World Society in Action na The Happiness of the New World Society.

N’oge ndị ahụ ime njem dị nnọọ iche. Ọ dịghị otu n’ime Ndịàmà nwere ụgbọala, ya mere eji m ụgbọ epeepe, ụgbọ amara, ụgbọala oké ehi na-adọkpụ, ịnyịnya, trọk, gwongworo, na ụgbọelu n’otu oge, mee njem. Ọ bụ ihe na-akpali akpali ifefere oké ọhịa Amazon iji ruo Santarém, bụ́ obodo ukwu dị n’agbata Belém n’ọnụ Amazon na Manaus, bụ́ isi obodo Amazonas State. N’oge ahụ ndị ohu distrikti nwere mgbakọ sekit ole na ole ha ga-eleta, n’ihi ya ana m eji oge m dị ukwuu egosi ihe nkiri Society. N’obodo ukwu ndị buru ibu karị, ọtụtụ narị bịara.

Ihe kasị masị m n’ebe ugwu Brazil bụ ógbè Amazon. Ka m nọ na-eleta ebe ahụ n’April 1957, Osimiri Amazon na alaka ya nile jubigara ókè. Enwere m ihe ùgwù nke igosi otu n’ime ihe nkiri ahụ n’oké ọhịa ahụ, na-agbasapụ ebe ihe nkiri ahụ ga na-egosi bụ nke m ji aka m mee n’agbata osisi abụọ. E si ná ntakịrị ụgbọ mmiri nwere injin dị n’osimiri dị nso nweta ike eletrik maka ígwè projector ahụ. Ọ bụ ihe nkiri mbụ nke ihe ka ọtụtụ ná ndị na-ege ntị kiritụworo.

N’oge na-adịghị anya alaghachiri m n’ozi Betel, n’afọ na-esokwa, na 1958, enwere m ihe ùgwù nke ije Mgbakọ Mba Nile “Uche Chineke” nke Ndịàmà Jehova wuru ewu, nke e mere na New York City. Ndị si ala 123 so na 253,922 mmadụ jupụtara Ámá Egwuregwu Yankee na Polo Grounds dị ya nso n’ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ were ụbọchị asatọ.

Inwe Mgbanwe ná Ndụ M

Ntakịrị oge ka m laghachisịrị Betel, amatara m Clara Berndt, anyị lụkwara na March 1959. E kenyere anyị ọrụ sekit n’obodo Bahia, bụ́ ebe anyị jere ozi ruo ihe dị ka otu afọ. Mụ na Clara ka ji ọṅụ na-echeta ịdị umeala n’obi, ile ọbịa, ịnụ ọkụ n’obi, na ịhụnanya nke ụmụnna nọ n’ebe ahụ; ha dara ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe ma baa ọgaranya ná mkpụrụ Alaeze. Mgbe ahụ a tụfere anyị São Paulo State. Ọ bụ n’ebe ahụ, na 1960, ka nwunye m tụụrụ ime, anyị aghaghịkwa ịhapụ ozi oge nile.

Anyị kpebiri ịkwaga otu ebe n’obodo Santa Catarina, bụ́ ebe a mụrụ nwunye m. Nwa anyị nwoke, bụ́ Gerson, bụ nke mbụ n’ime ụmụ ise anyị. Gilson sochiri ya na 1962, Talita na 1965, Tárcio na 1969, na Janice na 1974. Site n’enyemaka Jehova na ndụmọdụ ọma ọ na-enye, anyị nwere ike imeri ihe ịma aka nke ịzụlite ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”—Ndị Efesọs 6:4.

Anyị na-ewere nwa anyị nke ọ bụla dị ka nke dị oké ọnụ ahịa. Ọbụ abụ ahụ kwupụtara echiche anyị nnọọ nke ọma: “Lee, ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ.” (Abụ Ọma 127:3) N’agbanyeghị nsogbu, anyị elekọtawo ụmụ anyị dị ka anyị ga-esi lekọta ihe ọ bụla bụ́ “ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa,” na-eburu n’uche ntụziaka ndị a na-achọta n’Okwu ya. Nkwụghachi ụgwọ ya adịwo ọtụtụ. O nyere anyị ọṅụ a na-apụghị iji ọnụ kọọ mgbe ha ise ná nsochi, iche iche, ji onwe ha kwupụta ọchịchọ ha ịbụ ndị e mere baptism ná ngosipụta nke nraranye ha nye Jehova.—Eklisiastis 12:1.

Nhọrọ Ndị Ụmụ Anyị Mere

Anyị ṅụrịrị oké ọṅụ mgbe Gerson, ngwa ngwa mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ n’ihe ọmụmụ data processing, kwuru na ya chọrọ ije ozi na Betel, si otú a na-ahọrọ ozi oge nile kama ọrụ ego. Ma ndụ Betel adịghịrị Gerson mfe na mbụ. Mgbe anyị letasịrị ya mgbe ọ ka nọsịrị nanị ọnwa anọ na Betel, ihu ya gbarụrụ agbarụ ka anyị na-apụ metụrụ m n’ahụ nke ukwuu. N’enyo ụgbọala anyị e ji ahụ ihe dị n’azụ, ahụrụ m ya ka ọ nọ na-ele anyị ruo mgbe anyị gafere ebe mbụ ụzọ ahụ gbagọrọ. Anya mmiri juru m anya nke na mụ aghaghị ịkwụsị n’akụkụ ụzọ tupu anyị agaa n’ihu na njem ụla anyị dị kilomita 700.

Gerson mesịrị bịa n’ezie nụ ụtọ Betel. Mgbe ọ nọsịrị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ isii n’ebe ahụ, ọ lụrụ Heidi Besser, ha jekọkwara ozi na Betel ruo afọ abụọ ọzọ. Mgbe ahụ Heidi tụụrụ ime, ha aghaghịkwa ịhapụ. Nwa ha nwanyị, bụ́ Cintia, nke dị afọ isii ugbu a, na-eso ha n’ihe omume ha nke Alaeze.

Oge na-adịghị anya ka anyị jesịrị nke mbụ jee leta Gerson na Betel, Gilson, bụ́ onye ka nọsịrị afọ mbụ ya n’ihe ọmụmụ ụkpụrụ azụmahịa, kwuru na ya chọkwara ije ozi n’ebe ahụ. Atụmatụ ya bụ ịmaliteghachi ihe ọmụmụ azụmahịa ya ma ọ nọsịa otu afọ na Betel. Ma atụmatụ ya gbanwere, ọ nọgidekwara n’ozi Betel. Na 1988 ọ lụrụ Vivian Gonçalves, bụ́ onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile. Kemgbe ahụ, ha anọwo na-ejekọ ozi ọnụ na Betel.

Ọṅụ anyị gara n’ihu mgbe nwa anyị nke atọ, bụ́ Talita, họọrọ ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ na 1986 mgbe ọ mụsịrị ịtụ ụkpụrụ ụlọ. Afọ atọ n’ihu a kpọkwara ya na Betel. Na 1991 ọ lụrụ José Cozzi, bụ́ onye nọworo na-eje ozi na Betel ruo afọ iri. Ha nọgidere n’ebe ahụ dị ka di na nwunye.

Obi tọkwara mụ na nwunye m ụtọ ọzọ mgbe Tárcio, bụ́ onye na-esote, kwughachikwara otu okwu ahụ anyị nụrụla ugboro atọ, “Papa, achọrọ m ịga Betel.” A nabatara akwụkwọ ịchọ ọrụ ya, na 1991 ya onwe ya kwa malitekwara ozi Betel, bụ́ ebe ọ nọgidere ruo 1995. Obi dị anyị ụtọ na o ji ume ntorobịa ya kwalite ọdịmma Alaeze Jehova n’ụzọ dị otú a ruo ihe karịrị afọ atọ.

Nwa ikpeazụ anyị, bụ́ Janice, mere mkpebi ya ijere Jehova ozi, e meekwa ya baptism mgbe ọ dị afọ 13. N’oge ọ na-aga akwụkwọ, o jere ozi ruo otu afọ dị ka ọsụ ụzọ inyeaka. Mgbe ahụ, na September 1, 1993, ọ malitere dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile n’ọgbakọ anyị n’ebe a n’obodo Gaspar.

Ụzọ Inwe Ihe Ịga nke Ọma

Gịnị bụ isi ihe dị n’ime ka ezinụlọ dị n’otu n’ofufe Jehova? Ekweghị m na ọ dị usoro bụ o kwuchaa o bie. Jehova enyewo ndụmọdụ n’Okwu ya ka ndị Kraịst mụrụ ụmụ gbasoo, ya mere otuto nile kwesịrị ịgara ya maka ihe ọma ndị anyị nwetaworo. Nanị ihe anyị mere bụ ịgbalị ịgbaso ntụzi ya. (Ilu 22:6) Ụmụ anyị nile si n’aka m keta mmetụta uche ndị Latin, sitekwa n’aka nne ha keta mmụọ ndị Germany. Ma ihe kasị mkpa ha nwetara site n’aka anyị bụ ihe nketa ime mmụọ.

Ndụ ezinụlọ anyị hiwere isi n’ọdịmma Alaeze. Idebe ọdịmma ndị a n’ọnọdụ mbụ adịghị mfe. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ihe isi ike ịdị na-enwechi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya mgbe nile, ma ike agwụghị anyị. Malite n’ụbọchị ndị mbụ nke ndụ ha, a kpọtara nwa nke ọ bụla ná nzukọ ndị Kraịst nakwa mgbakọ dị iche iche. Nanị nrịanrịa ma ọ bụ ụfọdụ ọnọdụ mberede ndị ọzọ na-egbochi anyị ije. Tụkwasị, n’oge ha dị na nwata, ụmụaka ahụ sonyeere anyị n’ozi ndị Kraịst.

Mgbe ha dị ihe dị ka afọ iri, ụmụaka ahụ malitere ikwu okwu n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Anyị nyeere ha aka ịkwadebe okwu mbụ ha, na-agba ha ume iji ndepụta mee ihe kama ihe odide a ga-agụ agụ. Ka oge na-aga, onye ọ bụla kwadebere okwu nke ya. Ọzọkwa, mgbe ha nọ n’agbata afọ 10 na 12, nke ọ bụla malitere ikerechi òkè anya n’ozi. Nke a bụ nanị ụzọ ndụ ha maara.

Nwunye m, bụ́ Clara, keere òkè dị mkpa n’ịzụlite ụmụ anyị. Kwa abalị, mgbe ha dị nnọọ na nwata—oge nwatakịrị na-amịkọrọ ihe nile a kụziiri ya dị ka ogbo—Clara gụụrụ ha otu akụkọ Bible ma soro nke ọ bụla kpee ekpere. O jiri akwụkwọ bụ́ Site Na Paradais Etufuru Rue Paradais Enweghachiri, Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti, na Akwukwọm nke Akukọ Bible mee ihe nke ọma.a Mgbe e wepụtara ha, anyị jikwa ihe enyemaka ndị a na-ege ege na ndị a na-ekiri ekiri nke Ndịàmà Jehova wepụtara mee ihe.

Ahụmahụ anyị dị ka nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-anwapụta na ụmụaka chọrọ nlebara anya kwa ụbọchị. Ịhụnanya siri ike, mmasị onwe onye, na oge buru ibu so ná mkpa ndị bụ isi nke ndị na-eto eto. Ọ bụghị nanị na anyị lere ya anya dị ka ibu ọrụ anyị dị ka ndị mụrụ ụmụ igbo mkpa ndị a ruo n’ókè anyị nwere ike kama anyị nwetara obi ụtọ dị ukwuu n’ime otú ahụ.

N’eziokwu, ọ bụ ihe na-enye ndị mụrụ ụmụ afọ ojuju ịhụ mmezu nke okwu ndị dị n’Abụ Ọma 127:3-5: “Lee, ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ: ụgwọ ọrụ Ọ na-akwụ ka mkpụrụ nke afọ bụ. Dị ka akụ́ n’aka dike, otú a ka ụmụ a mụrụ na mgbe okorobịa dị. Onye ihe na-agara nke ọma ka nwoke ahụ bụ nke chịrịwooro akụ́ ahụ kpojuo akpa akụ́ ya.” Ijere Jehova ozi dị ka ezinụlọ dị n’otu akpataworo anyị n’ezie ịṅụrị ọṅụ!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara ha nile.

[Foto dị na peeji nke 26]

Antonio Santoleri na ezinụlọ ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya