Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 2/1 p. 20-23
  • Obi Ike M n’Ebe Jehova Nọ Kwagidere M

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Obi Ike M n’Ebe Jehova Nọ Kwagidere M
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inweta Obi Ike n’Ebe Jehova Nọ
  • Onye Ọrụ Ime Mmụọ Wusiri Ike
  • Ozi Oge Nile Sara Mbara
  • Ọrụ Ndị E Kenyere M na Betel
  • Ihe Owuwu Betel Anyị
  • Ihe Ùgwù Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa
  • Nke A Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ụzọ Ndụ Kasị Mma Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Òkù A Na-akpọ Mmadụ Niile!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ijere Jehova Ozi Dị Ka Ezinụlọ Dị n’Otu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 2/1 p. 20-23

Obi Ike M n’Ebe Jehova Nọ Kwagidere M

DỊ KA AGENOR DA PAIXÃO SI KỌỌ

Ọrịa ọzịza nke opi akpa ume gburu nanị nwa nwoke anyị, bụ́ Paul, mgbe ọ dị nanị ọnwa 11. Ọnwa atọ n’ihu, n’August 15, 1945, oyi ịba n’ahụ gburu nwunye m hụrụ n’anya nke ukwuu. Adị m afọ 28, ihe otiti ndị a mere ka m nọrọ n’iwe na n’obi mgbu. Ma obi ike m nwere na Jehova na nkwa ya kwagidere m. Ka m kọọ otú m si bịa nwee obi ike a.

SITE n’oge a mụrụ m na Salvador, Bahia State, Brazil, na January 5, 1917, mama m kụziiri m ife “ndị senti” nke Chọọchị Katọlik ofufe. Ọbụna na ọ na-akpọlite mụ na ụmụnne m ndị ikom n’isi ụtụtụ ka anyị nwee ike ikpekọ ekpere ọnụ. Otú ọ dị, ndị mụrụ m na-agakwa nnọkọ candomblé, bụ́ ihe omume voodoo nke ndị Africa na ndị Brazil. Akwanyeere m nkwenkwe ndị a ùgwù, ma enweghị m obi ike ná ndị ahụ a na-akpọ ndị senti nke okpukpe Katọlik ma ọ bụ na candomblé. Ihe kụdara m aka karịsịa bụ ajọ mbunobi agbụrụ a na-egosipụta n’ime okpukpe ndị a.

Ka oge na-aga ụmụnne m ndị nwoke tọrọ m hapụrụ ụlọ ịga chọọ ọrụ. E mesịa nna m gbahapụrụ ezinụlọ anyị. Ya mere mgbe m dị afọ itoolu, aghaghị m ịchọta ọrụ iji nyere nne m na nwanne m nwanyị nke m tọrọ aka. N’ihe dị ka afọ 16 n’ihu, mkparịta mụ na otu onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ n’ụlọ mmepụta ihe ghọrọ oge oké mgbanwe ná ndụ m.

Inweta Obi Ike n’Ebe Jehova Nọ

Ezutere m Fernando Teles na 1942. Ọ na-ekwukarị na ife “ndị senti” ofufe dị njọ. (1 Ndị Kọrint 10:14; 1 Jọn 5:21) Na mbụ egeghị m ya ntị ma ọlị. Ma obi eziokwu ya na mmasị ya n’ebe ndị mmadụ nọ, n’agbanyeghị ụcha ahụ ha, dọọrọ mmasị m, abịakwara m nwee mmasị n’ihe ọmụma o nwere na Bible, karịsịa n’ihe o kwuru banyere Alaeze Chineke na ụwa paradaịs. (Aịsaịa 9:6, 7; Daniel 2:44; Mkpughe 21:3, 4) N’ịhụta mmasị m, o nyere m otu Bible na akwụkwọ ụfọdụ e ji amụ Bible.

Izu ole na ole n’ihu, anakweere m òkù a kpọrọ m ịga otu ọmụmụ Bible ọgbakọ. Ìgwè ahụ nọ na-amụ akwụkwọ bụ́ Religion, nke Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara. Eritere m uru n’ọmụmụ ihe ahụ ma malite ịga nzukọ ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova. Ihe masịrị m karịsịa bụ na e nweghị ajọ mbunobi, na ụzọ e si nabata m ozugbo. N’ihe dị ka oge ahụ, amalitere m ibedo Lindaura. Mgbe m gwara ya banyere ihe m na-amụta, ọ malitere iso m aga nzukọ ndị ahụ.

Ihe ọzọ masịrị m ná nzukọ ndị ahụ bụ mmesi ike a na-emesi ọrụ ime nkwusa. (Matiu 24:14; Ọrụ 20:20) N’inweta agbamume site n’aka ndị ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile, amalitere m ịgwa ndị ọzọ okwu n’ụzọ mberede n’ụgbọ okporo ígwè ka m na-eme njem na-aga ma na-alọta ọrụ. Mgbe m chọtara onye nwere mmasị, m na-anata adres ya ma gaa na nke ya iji gbalịa ịgba ya ume ka ọ zụlite mmasị ahụ.

Ka ọ dị mgbe ahụ, obi ike m nwere n’ebe Jehova na nzukọ o ji eme ihe nọ nọgidere na-eto eto. N’ihi ya, mgbe m ṅasịrị ntị n’okwu Bible banyere nraranye ndị Kraịst, e mere m baptism, n’Oké Osimiri Atlantic, n’April 19, 1943. N’otu ụbọchị ahụ, na nke mbụ ya, ekeere m òkè n’ozi ụlọ n’ụlọ ahụ a na-eje mgbe nile.

Izu abụọ n’ihu, na May 5, mụ na Lindaura lụrụ. E mesịa, n’August 1943, e mere ya baptism ná mgbakọ mbụ Ndịàmà Jehova nwere n’obodo ukwu Salvador. Akwụkwọ bụ́ 1973 Yearbook of Jehovah’s Witnesses kwuru banyere mgbakọ ahụ, sị: “Ndị ụkọchukwu mesịrị mee ka a ghara inwe okwu ihu ọha na Salvador, ma ọ bụghị tupu oké mkpọsa dị mma . . . eweresịa ọnọdụ.” Ihe àmà nke nduzi Jehova n’agbanyeghị mkpagbu siri ike mere ka obi ike m n’ebe ọ nọ sikwuo ike.

Dị ka m kọrọ ná mmalite, nanị afọ abụọ mgbe e mesịrị Lindaura baptism—na ọnwa atọ mgbe ọnwụ nwa anyị nwoke gasịrị—nwunye m hụrụ n’anya nwụrụ. Ọ dị nanị afọ 22. Ma obi ike m nwere n’ebe Jehova nọ kwagidere m n’ọnwa ndị ahụ siri ike.

Onye Ọrụ Ime Mmụọ Wusiri Ike

Na 1946, otu afọ mgbe nwunye m na nwa m nwoke funahụsịworo m, a họpụtara m ịbụ ohu ọmụmụ Bible n’otu ọgbakọ e nwere mgbe ahụ na Salvador. N’otu afọ ahụ, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke malitere n’ọgbakọ ndị dị na Brazil, aghọkwara m onye nduzi mbụ nke ụlọ akwụkwọ ahụ na steti Bahia. E mesịa n’October 1946, e nwere Mgbakọ Ọchịchị Chineke nke “Mba Ndị Nwere Ọṅụ” n’obodo ukwu São Paulo. Onye m na-arụrụ ọrụ kemgbe afọ iri kwuru na ya chọrọ m ma rụgide m ka m ghara ịga. Ma, mgbe m kọwasịịrị ya otú mụ ịga mgbakọ ahụ ga-adịru mkpa nye m, o nyere m ọtụtụ onyinye ma sị m gaa nke ọma na njem ahụ.

E duziri nnọkọ ndị e nwere ná mgbakọ ahụ n’Ebe A Na-ekiri Ihe nke Ógbè São Paulo na Portuguese—asụsụ ndị Brazil—tinyekwara n’asụsụ Bekee, German, Hungarian, Polish, na Russian. Ná mgbakọ ahụ e wepụtara magazin Teta! na Portuguese. Mgbakọ ahụ nyere m oké mkpali—ihe dị ka 1,700 bịara n’okwu ihu ọha—nke na m dejupụtara fọm iji malite ịsụ ụzọ na November 1, 1946.

N’oge ahụ, anyị jiri ígwè phonograph mee ihe n’ụzọ sara mbara n’ọrụ ịsụ ụzọ anyị. Ọtụtụ mgbe anyị na-akpọrọ ndị nwe ụlọ okwu ahụ bụ́ “Nchebe.” E mesịa, anyị na-ekwu, sị: “Iji chebe onwe anyị pụọ n’ebe onye iro a na-adịghị ahụ anya nọ, anyị aghaghị ịrapara n’ahụ enyi bụkwa onye a na-adịghị ahụ anya. Jehova bụ enyi anyị kasị ukwuu, o nwekwara ike karịa onye iro anyị, bụ́ Setan. Ya mere anyị aghaghị ịraparasi ike n’ebe Jehova nọ iji chebe onwe anyị pụọ n’ebe ọ nọ.” Mgbe ahụ anyị na-enyefe akwụkwọ nta bụ́ Protection, nke nyekwuru ihe ọmụma.

Asụrubeghị m ụzọ otu ọnwa mgbe m natara ịkpọ òkù maka ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche n’Ọgbakọ Carioca dị na Rio de Janeiro. Mgbe ụfọdụ anyị chere mmegide siri ike ihu n’ebe ahụ. Otu onye nwe ụlọ wakporo onye òtù m, bụ́ Ivan Brenner, n’otu oge. Ndị agbata obi kpọrọ ndị uwe ojii, a kpọgakwara anyị nile n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii.

N’oge ịgba ajụjụ, onye nwe ụlọ ahụ iwe ji boro anyị ebubo na anyị na-akpaghasị udo. Onye isi ndị uwe ojii nyere ya iwu ka o mechie ọnụ. Onye isi ndị uwe ojii ahụ tụgharịziri n’ebe anyị nọ wee kwuo n’olu dị nro na anyị nweere onwe anyị ịla. O jidere onye ahụ boro anyị ebubo wee gwa ya na ọ dara iwu n’ihi ime mwakpo. Ọnọdụ ndị yiri nke ahụ kwagidere obi ike m nwere n’ebe Jehova nọ.

Ozi Oge Nile Sara Mbara

Na July 1, 1949, enwere m oké ọṅụ ịbụ onye a kpọrọ òkù ije ozi na Betel, dị ka e si akpọ ihe owuwu bụ isi nke Ndịàmà Jehova ná mba. Betel dị na Brazil dị mgbe ahụ na 330 Licínio Cardoso Street, na Rio de Janeiro. N’oge ahụ, e nwere nanị mmadụ 17 n’ezinụlọ Betel dum. Ruo oge ụfọdụ, agara m nzukọ n’Ọgbakọ Engenho de Dentro dị n’ebe ahụ, ma ka e mesịrị, e kenyere m ọrụ dị ka onye isi oche ndị nlekọta na nanị ọgbakọ dị na Belford Roxo, obodo ukwu nke dị kilomita ole na ole site na Rio de Janeiro.

Ngwụsị izu adịghị enye ohere. Na Saturday ana m eji ụgbọ okporo ígwè eme njem aga Belford Roxo, kere òkè n’ozi ubi n’ehihie, ma gazie Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi n’uhuruchi. Ana m esoro ụmụnna nọrọ ruo n’echi ya ma kere òkè n’ozi ubi n’ụtụtụ echi ya. Ana m anọ ya maka okwu ihu ọha sitere na Bible na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ma laghachi na Betel n’ihe dị ka mgbe o ji ọkara gafee elekere anya itoolu n’abalị. Taa, e nwere ọgbakọ 18 na Belford Roxo.

Na 1954, mgbe afọ atọ na ọkara nke usoro ihe omume ahụ gasịrị, e zighachiri m na Rio de Janeiro dị ka onye isi oche ndị nlekọta n’Ọgbakọ São Cristóvão. N’ime afọ iri sochirinụ, esoro m ọgbakọ ahụ jee ozi.

Ọrụ Ndị E Kenyere M na Betel

Ọrụ mbụ m na Betel bụ iwuru nanị ụgbọala Society nwere ụlọ, ụgbọala Dodge nke 1949, bụ́ nke e nyere utu aha bụ́ Chocolate n’ihi àgwà nchara nchara ya. Mgbe e wuchara ụlọ ụgbọala ahụ, e kenyere m ịrụ ọrụ na kichin, ebe m nọ ruo afọ atọ. Mgbe ahụ e zigara m ná Ngalaba Job Press, bụ́ ebe m nọruworo ihe karịrị afọ 40 ugbu a.

Ọtụtụ n’ime ngwá ọrụ obibi akwụkwọ anyị nwere bụ ndị e jitụrụla mee ihe. Dị ka ihe atụ, ruo ọtụtụ afọ anyị nwere otu ígwè obibi akwụkwọ ochie nwere isi mbadamba, nke anyị ji oké mmasị na-akpọ Sera, n’ịgbaso aha nwunye Abraham. E jiriwo ya mee ihe ruo ọtụtụ afọ n’isi ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Brooklyn, New York. E mesịa n’afọ ndị 1950, e ji ụgbọ mmiri buga ya Brazil. N’ebe a, dị ka nwunye Abraham, n’afọ agadi ya ọ mịrị mkpụrụ—n’ụdị magazin Ụlọ Nche na Teta!

Akwụsịbeghị m inwe ihe ijuanya ná mmụba ọnụ ọgụgụ nke mbipụta ndị a na-ebi n’ígwè obibi akwụkwọ dị na Brazil. N’afọ nke 1953 dum, anyị biri magazin 324,400, ma ugbu a ihe a na-ebi karịrị nde atọ kwa ọnwa!

Ihe Owuwu Betel Anyị

Ọ bụrụwo ihe na-akpali akpali eri ọtụtụ afọ ikiri mwusawanye nke ihe owuwu Betel anyị na Brazil. Na 1952 anyị wuru ụlọ obibi akwụkwọ dị okpukpu abụọ n’azụ ebe obibi anyị dị na Rio de Janeiro. Na 1968, e bufeziri Betel n’ụlọ ọhụrụ dị n’obodo ukwu São Paulo. Mgbe anyị kwabara, ihe nile yiri ka ha buru ibu ma saa mbara maka ezinụlọ Betel anyị nke nwere ndị òtù 42. Anyị chere n’ezie na ụlọ a ga-eje ozi maka uto ọdịnihu nile anyị. Ma, e wuru abụọ ndị ọzọ dịcha okpukpu ise na 1971, a zụtakwara ụlọ obibi akwụkwọ dị n’akụkụ ha, wugharịa ya, ma jikọta ya n’ìgwè ihe owuwu a. Ma n’ime afọ ole na ole, mmụba nke ndị mkpọsa Alaeze nọgidere na-arị elu—anyị gafere akara 100,000 na 1975—mere ka e nwekwuo mkpa maka ohere.

Ya mere, e wuru ìgwè ụlọ ọhụrụ ọzọ n’ihe dị ka kilomita 140 site na São Paulo n’ebe dị nso n’obere obodo bụ́ Cesário Lange. Na 1980 e bufere ezinụlọ Betel anyị nwere ndị òtù 170 n’ihe owuwu ọhụrụ ndị a. Kemgbe ahụ ọrụ Alaeze ahụ etowo n’ụzọ dị egwu. Anyị nwere ugbu a ihe karịrị 410,000 na-ekerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa na Brazil! Iji hụ maka mkpa ime mmụọ nke ndị mkpọsa Alaeze ndị a nile, anyị aghaghị ịnọgide na-ewu ụlọ obibi akwụkwọ ndị ọhụrụ iji na-ebi akwụkwọ e ji amụ Bible na ụlọ obibi ndị ọhụrụ iji nye ndị nyere onwe ha n’afọ ofufo na Betel ebe obibi. Anyị nwere ihe dị ka ndị òtù ezinụlọ Betel 1,100 ugbu a!

Ihe Ùgwù Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa

Ana m agụ ozi Betel dị ka ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa. N’ihi ya, ọ bụ ezie na n’afọ okorobịa m chere echiche banyere ịlụgharị nwanyị, ahọọrọ m ilekwasị anya n’ụzọ zuru ezu n’ihe ùgwù ndị m nwere na Betel na n’ọrụ nkwusa. N’ebe a enwewo m obi ụtọ nke iso ọtụtụ ndị na-eto eto jekọọ ozi n’ebe obibi akwụkwọ na nke inye ha ọzụzụ n’ọrụ ndị e kenyere ha. Agbalịwo m imeso ha dị ka a ga-asị na ha bụ ụmụ m ndị ikom. Ịnụ ọkụ n’obi na achọghị ọdịmma onwe onye nanị ha abụrụwo isi iyi nke oké agbamume nye m.

Ihe ùgwù ọzọ abụrụwo ịnụ ụtọ nke mkpakọrịta nke ezigbo ndị mụ na ha biri n’otu ọnụ ụlọ eri ọtụtụ afọ. N’eziokwu, ndịrịta iche n’ụdị onye mmadụ bụ abụrụwo ihe ịma aka mgbe ụfọdụ. Ma amụtara m ịghara ịtụ anya izu okè n’aka ndị ọzọ. Agbalịwo m ịghara ime ka obere ihe ghọọ nsogbu ndị siri ike ma ọ bụ iwere onwe m dị ka onye dị oké mkpa. Ịchị mmehie ihe ndị m mere ọchị enyeworo m aka ịnagide nke ndị ọzọ.

Ihe ùgwù ọzọ dị oké ọnụ ahịa m nwere bụ inwe ike ịga nnukwu mgbakọ mba nile ndị e nwere na United States. Otu n’ime ndị a bụ Mgbakọ “Ozi Ọma Ebighị Ebi,” e nwere n’Ámá Egwuregwu Yankee, New York, na 1963, nke ọzọ bụkwa Mgbakọ Mba Nile nke “Udo n’Elu Ụwa” e nwere n’otu ebe ahụ na 1969. Mgbe m nọ n’ebe ahụ, enwere m ọṅụ nke ileta na nso ebe ahụ isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York!

Ọ bụkwaara m ihe ùgwù ikere òkè—nke mụ na ndị ọzọ na-eme onye mee ibe ya emee—n’ịbụ onye isi oche n’ofufe ụtụtụ nke ezinụlọ Betel ahụ. Ma, ihe ùgwù kasị ukwuu, otu nke wetawooro m oké ọṅụ na agbamume, bụ iwegara ndị nwere obi eziokwu ozi Alaeze ahụ, ọbụna dị ka Nna Ukwu anyị, bụ́ Jisọs Kraịst, mere.

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, echere m ihe ịma aka nke ịda ọrịa Parkinson’s disease. Nlekọta ịhụnanya nke ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị n’ebe a na-elekọta ndị ahụ na-esighị ike dị na Betel abụrụwo isi iyi nke enyemaka na-adịgide adịgide na nkasi obi nye m. Site n’obi ike zuru ezu, ana m ekpe ekpere ka Jehova nye m ume iji nọgide na-eme ike m nile maka nke ezi ofufe ya.

[Foto dị na peeji nke 23]

Alaka Brazil ebe m bi ugbu a

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Mụ na nwunye m, onye nwụrụ na 1945

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya