Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 3/1 p. 14-19
  • Ngọzi Na-adịrị Ndị Na-eche Nche!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ngọzi Na-adịrị Ndị Na-eche Nche!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịbịa Dị Ka Onye Ohi
  • Otú Anyị Pụrụ Isi Mụrụ Anya
  • Oge Na-agwụsị
  • N’agbanyeghị Ihe Merenụ, Mụrụ Anya!
  • “Nọgidenụ Na-eche Nche”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Gosipụta Na Ị Bụ Onye Dị Njikere Maka Ụbọchị Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Mụrụ Anya na “Mgbe Ọgwụgwụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • “Mụrụnụ Anya”
    Ozi Alaeze Anyi—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 3/1 p. 14-19

Ngọzi Na-adịrị Ndị Na-eche Nche!

“Lee, ana m abịa dị ka onye ohi. Ngọzi na-adịrị onye na-eche nche, na-edebekwa uwe ya.”—MKPUGHE 16:15.

1. Ebe ọ bụ na ụbọchị Jehova dị nso, gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya?

OKÉ ụbọchị Jehova dị nso, nke ahụ pụtakwara agha! N’ọhụụ, Jọn onyeozi hụrụ “mmụọ nke ndị mmụọ ọjọọ” yiri awọ ka ha na-apụkwuru “ndị eze,” ma ọ bụ ndị ọchịchị nile, nke ụwa. Ime gịnị? Leenụ, “ime ka ha zukọọ ibu agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile”! Jọn gbakwụnyere, sị: “Ha wee mee ka ha zukọọ n’ebe ahụ nke a na-akpọ n’asụsụ Hibru Ha-Magedọn.”—Mkpughe 16:13-16.

2. Ònye bụ Gọg nke Megọg, gịnịkwa ga-eme mgbe ọ wakporo ndị Jehova?

2 N’isi nso, Jehova ga-akwali akụkụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke usoro ihe a ibibi Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 17:1-5, 15-17) Mgbe ahụ Gọg nke Megọg, Setan bụ́ Ekwensu bụ́ onye a chụdaworo n’ógbè ụwa, ga-achịkọta usuu ndị agha ya ma wakpoo ndị Jehova bụ́ ndị udo, ndị yiri ka ha enweghị nchebe. (Ezikiel 38:1-12) Ma Chineke ga-eme ihe iji napụta ndị ya. Nke ahụ ga-aka ntiwapụ nke ‘ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu’ akara.—Joel 2:31; Ezikiel 38:18-20.

3. Olee otú ị ga-esi akọwa ihe omume ndị e buru amụma ha n’Ezikiel 38:21-23?

3 Ee, Jehova ga-anapụta ndị ya ma bibie akụkụ ikpeazụ nile nke usoro ihe Setan mgbe anyị ruru ọnọdụ ụwa a kpọrọ Ha-Magedọn, ma ọ bụ Amagedọn. Gụọ okwu amụma nke Ezikiel 38:21-23, ma jiri anya nke uche lee ihe ga-emenụ. Jehova na-eji ike ya eme ihe iji weta oké mmiri ozuzo, akụ mmiri igwe na-ebibi ihe, ọkụ na-ere ngwa ngwa, ọrịa na-efe efe na-egbu egbu. Ụjọ na-adị n’ụwa nile ka e tinyere usuu ndị agha Gọg n’ọgba aghara, na-alụso ibe ha agha. A na-egbu ndị iro ọ bụla nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile lanarịrịnụ ka Jehova na-eji ụzọ karịrị ike mmadụ eme ihe iji zọpụta ndị ohu ya. Mgbe “mkpagbu ukwu” ahụ e buru amụma ya mesịworo, ọ dịghị ihe ga-afọdụ n’usoro ihe asọpụrụghị Chineke nke Setan. (Matiu 24:21) Otú ọ dị, ọbụna n’ihe mgbu nke ọnwụ ha, ndị ajọ omume ga-amata onye wetaara ha ọdachi. Chineke anyị nwere mmeri na-ekwu n’onwe ya, sị: “Ha ewee mara na Mụ onwe m bụ Jehova.” Ihe omume ndị a pụrụ iche ga-eme n’ụbọchị anyị, n’ọnụnọ Jisọs.

Ịbịa Dị Ka Onye Ohi

4. N’ụdị dị aṅaa ka Jisọs ga-abịa ibibi ajọ usoro ihe a?

4 Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube sịrị: “Lee, ana m abịa dị ka onye ohi.” Ọbịbịa yiri nke onye ohi ga-ada na mberede, n’oge a na-atụghị anya ya, mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-ehi ụra. Mgbe Jisọs ga-abịa dị ka onye ohi iji bibie ajọ usoro ihe a, ọ ga-echebe ndị mụ anya n’ezie. Ọ gwara Jọn, sị: “Ngọzi na-adịrị onye na-eche nche, na-edebekwa uwe ya, ka ọ ghara ijegharị n’ọtọ, ha wee hụ ihere ya.” (Mkpughe 16:15) Gịnị ka okwu ndị ahụ pụtara? Oleekwa otú anyị pụrụ isi mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ?

5. Nhazi dị aṅaa maka ozi ụlọ nsọ dịrị mgbe Jisọs nọ n’ụwa?

5 N’ozuzu ya, a dịghị agba onye nche ọtọ ma ọ bụrụ na ọ rahụ ụra n’ọrụ ya. Ma nke ahụ mere n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem mgbe Jisọs nọ n’ụwa, e nweekwa ìgwè dị iche iche nke ndị nchụàjà na ndị Livaị jere ozi n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem. Ọ bụ na narị afọ nke 11 T.O.A. ka Eze Devid haziri ọtụtụ narị nke ndị nchụàjà Israel na ọtụtụ puku ndị Livaị na-enye aka ịbụ òtù nke ìgwè 24 mejupụtara. (1 Ihe Emere 24:1-18) Ìgwè nke ọ bụla nwere ihe karịrị otu puku ndị ọrụ a zụrụ azụ mere ókè nke ya n’ilekọta akụkụ dị iche iche nke ozi ụlọ nsọ ọ dịkarịa ala ugboro abụọ n’afọ ruo otu izu zuru ezu n’otu mgbe. Otú ọ dị, n’Ememe Ụlọ Ntu, ìgwè 24 ahụ nile nọ ya maka ọrụ. A chọkwukwara enyemaka n’Ememe Ngabiga.

6. Na gịnị ka Jisọs pụrụ izowo aka mgbe ọ sịrị, “Ngọzi na-adịrị onye na-eche nche, na-edebekwa uwe ya”?

6 Mgbe Jisọs sịrị, “Ngọzi na-adịrị onye na-eche nche, na-edebekwa uwe ya,” ọ pụrụ izoworị aka n’ụkpụrụ a na-agbaso mgbe ahụ nke gụnyere ọrụ iche nche n’ụlọ nsọ ahụ. Mishnah ndị Juu na-asị: “Ndị nchụàjà na-eche nche n’ebe atọ n’Ụlọ Nsọ ahụ: n’Ime Ụlọ nke Abtinas, n’Ime Ụlọ nke Ire Ọkụ, na n’Ime Ụlọ nke Ekwú; ndị livaị na-anọkwa n’ebe iri abụọ na otu: ise n’ọnụ ụzọ ámá ise nke Ugwu Ụlọ Nsọ ahụ, anọ na nkuku anọ ya dị n’ime, ise n’ọnụ ụzọ ámá ise nke Èzí Ụlọ Nsọ ahụ, anọ na nkuku anọ ya dị n’èzí, otu nọkwa n’Ime Ụlọ nke Onyinye, otu kwa nọ n’Ime Ụlọ nke Ákwà Mgbochi, otu na-anọkwa n’azụ Oche Ebere [n’èzí isi mgbidi nke Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile]. Onye isi nke Ugwu Ụlọ Nsọ ahụ na-agazu na nke onye nche ọ bụla, bụ́ onye nwere ọwa ọkụ na-enwu enwu n’ihu ya, ọ bụrụkwa na onye nche ọ bụla eguzoghị ọtọ ma sị ya, ‘Gị onye isi nke Ugwu Ụlọ Nsọ, udo dịrị gị!’ o dookwa anya na ọ nọ na-ehi ụra, ọ ga-akụ ya mkpara ya, o nwekwara ikike ịgba uwe ya ọkụ.”—The Mishnah, Middoth (“Ihe Ọ̀tụ̀tụ̀”), 1, paragraf nke 1-2, nke Herbert Danby sụgharịrị.

7. N’ihi gịnị ka o ji dị ndị nchụàjà na ndị Livaị na-eche nche n’ụlọ nsọ mkpa ịmụrụ anya?

7 Ọtụtụ ndị Livaị na ndị nchụàjà sitere n’ìgwè ndị ahụ na-eje ozi na-amụ anya abalị nile iji chee nche ma gbochie onye ọ bụla na-adịghị ọcha ịbanye n’èzí ụlọ nsọ ahụ. Ebe ọ bụ na “onye isi nke Ugwu Ụlọ Nsọ ahụ,” ma ọ bụ “onye ndú nke ụlọ nsọ ahụ,” na-aga gburugburu ebe nche 24 ahụ nile mgbe a na-eche nche n’abalị, onye nche ọ bụla aghaghị ịmụrụ anya n’ọrụ ya ma ọ bụrụ na ọ chọghị ka e jide ya mgbe ọ na-anọghị na nche.—Ọrụ 4:1.

8. Gịnị bụ uwe ihe atụ nke ndị Kraịst?

8 Ọ dị ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị ohu ibe ha mkpa ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ na ijigide uwe ihe atụ ha. Ndị a bụ ihe àmà a na-ahụ anya nke nhọpụta a họpụtara anyị ije ozi n’ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova. N’ịghọta nke a, anyị nwere mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ Chineke, inyere anyị aka ịrụ ọrụ anyị na ịrụzu ihe ùgwù anyị dị ka ndị nkwusa Alaeze. Ihi ụra n’ọrụ anyị dị ka ndị ozi Chineke ga-etinye anyị n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị Jisọs Kraịst, bụ́ Onye Ndú nke oké ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ jidere. Ọ bụrụ na anyị na-ehi ụra n’ụzọ ime mmụọ n’oge ahụ, a ga-agba anyị ọtọ n’ụzọ ihe atụ ma gbaa uwe ihe atụ anyị ọkụ. Ya mere olee otú anyị pụrụ isi mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ?

Otú Anyị Pụrụ Isi Mụrụ Anya

9. N’ihi gịnị ka iji mbipụta ndị Kraịst na-amụ Bible ji dị oké mkpa?

9 Iji ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ site n’enyemaka nke mbipụta ndị Kraịst bụ ihe na-akpali ịmụ anya ime mmụọ. Ụdị ọmụmụ ihe ahụ ga-akwadebe anyị maka ozi ahụ, ga-enyere anyị aka izute nsogbu, gosikwa anyị ụzọ obi ụtọ agwụghị agwụ. (Ilu 8:34, 35; Jemes 1:5-8) Ọmụmụ ihe anyị kwesịrị izu ezu ma na-aga n’ihu. (Ndị Hibru 5:14–​6:3) Ezi nri a na-eri mgbe nile pụrụ inye aka ime ka anyị mụrụ anya ma dị nkọ. Ọ pụrụ igbochi oké iro ụra nke pụrụ ịbụ ihe àmà nke erighị ihe na-edozi ahụ. Anyị enweghị ihe mere anyị ga-eji bụrụ ndị na-erighị ihe na-emezi ahụ n’ụzọ ime mmụọ ma na-ero ụra, n’ihi na Chineke na-eme ndokwa n’ụba maka nri ime mmụọ site ‘n’ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche’ e tere mmanụ. (Matiu 24:45-47) Iri nri ime mmụọ mgbe nile site n’ọmụmụ ihe onwe onye na nke ezinụlọ bụ otu ụzọ isi mụrụ anya ma “nwee ezi ndụ n’ime okwukwe anyị.”—Taịtọs 1:13.

10. Olee otú nzukọ na mgbakọ dị iche iche nke ndị Kraịst si enyere anyị aka ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ?

10 Nzukọ ndị Kraịst na mgbakọ dị iche iche na-enye aka ime ka anyị mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ. Ha na-enye agbamume na ohere “ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche.” Karịsịa anyị kwesịrị izukọ mgbe nile ka anyị “na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.” Ụbọchị ahụ dị ezigbo nso ugbu a. Ọ bụ “ụbọchị Onyenwe anyị,” mgbe ọ ga-ewepụ ọbụbụeze ya n’ụta. Ọ bụrụ na ụbọchị ahụ dị anyị mkpa n’ezie—o kwesịkwara—anyị ‘agaghị ahapụ nzukọ nke onwe anyị.’—Ndị Hibru 10:24, 25; 2 Pita 3:10.

11. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ozi ndị Kraịst dị oké mkpa n’ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ?

11 Iji obi dum na-ekere òkè n’ozi ndị Kraịst dị oké mkpa nye ịmụ anya ime mmụọ. Iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekerechi òkè anya n’ikwusa ozi ọma ahụ na-eme ka anyị mụrụ anya. Ozi anyị na-enye anyị ọtụtụ ohere ịgwa ndị mmadụ okwu banyere Okwu Chineke, Alaeze ya, na nzube ya nile. Ọ na-eju afọ ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ, mee nletaghachi, ma duzie ọmụmụ Bible ebe obibi ná mbipụta ndị dị ka Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ndị okenye nọ n’Efesọs oge ochie pụrụ ịgba akaebe na Pọl akụziworo ha ihe ‘n’ihu ọha mmadụ, n’ụlọ nke aka ha kwa n’otu n’otu.’ (Ọrụ 20:20, 21) N’ezie, ụfọdụ Ndịàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi nwere nsogbu ahụ ike siri ike nke na-egbochi ozi ha n’ụzọ ụfọdụ, ma ha na-achọta ụzọ ịgwa ndị ọzọ okwu banyere Jehova na ọbụbụeze ya ma nweta oké ọṅụ site n’ime nke ahụ.—Abụ Ọma 145:10-14.

12, 13. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji ezere imebiga ihe ókè n’ihe oriri na ihe ọṅụṅụ?

12 Izere imebiga ihe ókè ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ. Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere ọnụnọ ya, Jisọs gbara ndị ozi ya ume, sị: “Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ wee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà: n’ihi na otú a ka ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile.” (Luk 21:7, 34, 35) Iribiga ihe ókè na mmanya ogbugbu ekwekọghị n’ụkpụrụ Bible. (Deuterọnọmi 21:18-21) Ilu 23:20, 21 na-asị: “Anọla n’etiti ndị na-aṅụbiga mmanya vine ókè; n’etiti ndị na-eribiga anụ ókè: n’ihi na onye na-aṅụbiga mmanya ókè na onye na-eribiga ihe ókè ka a ga-anapụ ihe nile: ọ bụkwa nkịrịka ákwà ka oru ụra ga-eyikwasị mmadụ.”—Ilu 28:7.

13 Ọ bụrụgodị na iribiga ihe ókè na ịṅụbiga mmanya ókè erubeghị n’ọnọdụ ahụ, ha pụrụ ime ka mmadụ na-ero ụra, ọbụna dịrị umengwụ ma leghara ime uche Chineke anya. Dị ka ọ na-adịkarị, a ga-enwe nchegbu ndị metụtara ndụ ezinụlọ, ahụ ike, na ihe ndị ọzọ. Ma, anyị ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị etinye ọdịmma Alaeze n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ma nwee obi ike na Nna anyị nke eluigwe ga-enye anyị ihe na-akpa anyị. (Matiu 6:25-34) Ma ọ bụghị otú ahụ, “ụbọchị ahụ” ga-abịakwasị anyị “dị ka ọnyà,” ikekwe dị ka ọnyà e kpuchiri ekpuchi nke ga-achị anyị n’ụkwụ ma ọ bụ dị ka ọnyà e tinyere ihe ụra, dị ka ndị ahụ na-adọrọ ma jichizie ụmụ anụmanụ na-atụghị anya ya. Nke a agaghị eme ma ọ bụrụ na anyị amụrụ anya, na-amara nnọọ na anyị na-ebi ná “mgbe ọgwụgwụ.”—Daniel 12:4.

14. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-ekpesi ekpere ike?

14 Ikpesi ekpere ike bụ enyemaka ọzọ iji mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ. N’amụma ukwu ya, Jisọs gbakwuru ume, sị: “Ma mụrụnụ anya n’oge ọ bụla, na-arịọ arịrịọ, ka unu wee ka n’ike ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime, na iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.” (Luk 21:36) Ee, ka anyị kpee ekpere ka anyị nwee ike ịnọ n’akụkụ Jehova mgbe nile ma nwee nguzo a nwapụtara anwapụta mgbe Jisọs, Nwa nke mmadụ, bịara ibibi ajọ usoro ihe a. Maka ọdịmma anyị nakwa maka ọdịmma nke ndị kwere ekwe ibe anyị ndị anyị na-ekpere ekpere, ọ dị anyị mkpa ‘ịmụ anya n’ekpere.’—Ndị Kọlọsi 4:2; Ndị Efesọs 6:18-20.

Oge Na-agwụsị

15. Gịnị ka ije ozi anyị dị ka ndị na-ekwusa ezi omume na-arụzu?

15 Ka anyị na-echere oké ụbọchị Jehova, ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị chọrọ ime ike anyị nile n’ozi ya. Ọ bụrụ na anyị ekpesie ekpere ike nye ya banyere nke a, a pụrụ imeghere anyị “ọnụ ụzọ dị ukwuu nke a ga-ejikwa rụsie ọrụ ike.” (1 Ndị Kọrint 16:8, 9) N’oge Chineke kara aka, Jisọs ga-ekpe ikpe ma kewapụ “atụrụ” mere ezi omume kwesịrị ndụ ebighị ebi site n’ebe “ụmụ ewu” na-adịghị asọpụrụ Chineke bụ́ ndị kwesịrị mbibi ebighị ebi nọ. (Jọn 5:22) Ọ bụghị anyị na-ekewapụ atụrụ site n’ụmụ ewu. Ma ije ozi anyị dị ka ndị na-ekwusa ezi omume ugbu a na-enye ndị mmadụ ohere ịhọrọ ndụ ijere Chineke ozi ma si otú ahụ nwee olileanya nke ịbụ ndị e kewapụrụ gaa ná ndụ mgbe Jisọs “ga-abịa n’ebube Ya.” Ịdị mkpụmkpụ nke oge fọdụrụnụ maka usoro ihe a na-eme ka e nwekwuo mkpa maka ọrụ e ji obi nile na-arụ ka anyị na-achọ ndị “e doro ịnata ndụ ebighị ebi.”—Matiu 25:31-46; Ọrụ 13:48.

16. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji bụrụ ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi?

16 Oge gwụnahụrụ ụwa nke ụbọchị Noa, ọ ga-agwụnahụkwa usoro ihe a n’isi nso. Ya mere ka anyị bụrụ ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi. Ọrụ nkwusa anyị na-aga nke ọma, n’ihi na kwa afọ a na-eme ọtụtụ narị puku baptism dị ka ngosipụta nke nrara ha nye Chineke. Ha na-aghọ akụkụ nzukọ Jehova a gọziri agọzi—“ndị Ya, na ìgwè atụrụ nke ọzụzụ anụ Ya.” (Abụ Ọma 100:3) Lee ihe ọṅụ ọ bụ ikere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ nke na-ewetara ọtụtụ olileanya tupu ‘ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu’!

17, 18. (a) Ka anyị na-eme nkwusa, mmeghachi omume dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịtụ anya ya n’ebe ụfọdụ ndị nọ? (b) Gịnị ka e ji n’aka ga-eme ndị ọchị?

17 Dị ka Noa, anyị nwere nkwado na nchebe Chineke. Ee, ndị mmadụ, ndị mmụọ ozi nwoghara enwogha, na ndị Nefilim aghaghị ịkwaworị ozi Noa emo, ma nke ahụ akwụsịghị ya. Taa, ụfọdụ na-akwa emo mgbe anyị na-arụtụ aka n’ihe àmà dị ukwuu na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) Ụdị ịchị ọchị ahụ na-emezu amụma Bible banyere ọnụnọ Kraịst, n’ihi na Pita dere, sị: “Ndị ọchị ga-eji ịchị ọchị bịa na mgbe ikpeazụ, na-aga dị ka agụụ ihe ọjọọ nke aka ha si dị, na-asịkwa, Olee ebe nkwa nke [ọnụnọ, NW] Ya dị? n’ihi na site n’ụbọchị nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-adịgide dị ka ha dịworo site ná mmalite nke okike.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—2 Pita 1:16; 3:3, 4.

18 Ndị ọchị nke oge a pụrụ iche, sị: ‘Ọ dịbeghị ihe gbanwerenụ kemgbe okike. Ndụ na-aga n’ihu, a na-enwe ndị na-eri ihe, ndị na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-alụ di na nwunye, na-azụlitekwa ezinụlọ. Ọ bụrụgodị na Jisọs nọ anọ, ọ gaghị eme ihe e kpere n’ikpe n’oge m.’ Lee ka ha si gahie ụzọ! Ọ bụrụ na ha anwụghị site n’ihe ndị ọzọ ka ọ dịgodị, ụbọchị dị egwu nke Jehova aghaghị ibibi ha dị nnọọ ka mbibi mberede n’Iju Mmiri ahụ wetara njedebe nke otu ajọ ọgbọ n’ụbọchị Noa.—Matiu 24:34.

N’agbanyeghị Ihe Merenụ, Mụrụ Anya!

19. Olee otú anyị kwesịrị isi ele ọrụ anyị nke ime ndị na-eso ụzọ anya?

19 Ọ bụrụ na anyị ararawo onwe anyị nye Jehova, ka a ghara ịranye anyị n’ihi ụra ma ọlị site n’echiche na-ekwesịghị ekwesị. Ugbu a bụ oge ịmụrụ anya, igosi okwukwe n’amụma Chineke, na ịrụzu ọrụ anyị nke ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’ (Matiu 28:19, 20) Ka usoro ihe a na-eche ọgwụgwụ ikpeazụ ya ihu, anyị apụghị inwe ihe ùgwù dị ukwuu karịa ijere Jehova Chineke ozi n’okpuru idu ndú nke Jisọs Kraịst na ikere òkè n’ọrụ zuru ụwa ọnụ nke ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze” tupu ọgwụgwụ ihe nile eruo.—Matiu 24:14; Mak 13:10.

20. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Keleb na Joshua setịpụrụ, gịnịkwa ka ụzọ ha pụtaara anyị?

20 Ụfọdụ n’ime ndị Jehova anọwo na-ejere ya ozi kemgbe ọtụtụ iri afọ, ikekwe ná ndụ ha nile. Ọ bụrụgodị na anyị ka nakweere ezi ofufe na nso nso a karị, ka anyị dịrị ka onye Israel ahụ bụ́ Keleb, onye ‘sozuru Jehova n’azụ.’ (Deuterọnọmi 1:34-36) Ya na Joshua kwadoro nnọọ akwado ịbanye n’Ala Nkwa ahụ ntakịrị oge mgbe a gbapụtasịrị Israel n’agbụ Ijipt. Otú ọ dị, ndị Israel toworo eto n’ozuzu ha enweghị okwukwe, ha aghaghịkwa ịnọ afọ 40 n’ọzara, bụ́ ebe ha nwụchara. Keleb na Joshua so ha die ihe isi ike dị iche iche n’oge ndị ahụ nile, ma ndị ikom abụọ ahụ mesịrị banye n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 14:30-34; Joshua 14:6-15) Ọ bụrụ na anyị ‘esozuo Jehova n’azụ’ ma mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, anyị ga-enwe ọṅụ nke ịbanye ụwa ọhụrụ nke Chineke kwere ná nkwa.

21. Gịnị ga-abụ ahụmahụ anyị ma ọ bụrụ na anyị amụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ?

21 Ihe àmà na-egosi n’ụzọ doro anya na anyị na-ebi ná mgbe ọgwụgwụ nakwa na oké ụbọchị Jehova dị nso. Ugbu a abụghị oge iro ụra na ileghara ime uche Chineke anya. A ga-agọzi anyị nanị ma ọ bụrụ na anyị amụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ ma jigide uwe e ji amata anyị dị ka ndị ozi ndị Kraịst na ndị ohu Jehova. Ka ọ bụrụ mkpebisi ike anyị ‘iche nche, iguzosi ike n’okwukwe, ịbụ ndị ikom, ịdị ike.’ (1 Ndị Kọrint 16:13) Dị ka ndị ohu Jehova, ka onye ọ bụla n’ime anyị guzosie ike ma nwee obi ike. Mgbe ahụ anyị ga-eso ná ndị dị njikere mgbe oké ụbọchị Jehova tiwapụrụ, jiri ikwesị ntụkwasị obi na-eje ozi n’etiti ndị obi ụtọ mụ anya.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Olee otú ị ga-esi akọwa uwe ihe atụ anyị, oleekwa otú anyị pụrụ isi jigide ha?

◻ Gịnị bụ ụfọdụ ụzọ isi mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ?

◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji atụ anya ndị ọchị, oleekwa otú anyị kwesịrị isi ele ha anya?

◻ Olee otú anyị kwesịrị isi ele ọrụ anyị nke ime ndị na-eso ụzọ na mgbe ikpeazụ a anya?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 16]

Ndị Kraịst nwere mmụọ nsọ Chineke inyere ha aka ịmụrụ anya na ịrụ ọrụ ha

[Foto dị na peeji nke 15]

Ì kpebisiwo ike ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ ma jigide uwe ihe atụ gị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya