Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 3/1 p. 20-24
  • “Kama Ọlaedo, Achọtara M Diamọnd”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Kama Ọlaedo, Achọtara M Diamọnd”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa Karị
  • Ije Ozi Oge Nile na Gris
  • Ịtachi Obi ná Mmegide
  • Ije Ozi na Betel
  • Ịtachi Obi Ọzọ ná Mmegide
  • Ịṅụrị Ọṅụ ná Mwusawanye Na-aga n’Ihu
  • Ije Ozi n’Okpuru Aka Ịhụnanya Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Inye Jehova Ihe Ruuru Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ihe Gafere Afọ 50 nke ‘Ịgabita’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Enwere M Obi Ụtọ Maka Òkè M Keere ná Nkụzi Bible Zuru Ụwa Ọnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 3/1 p. 20-24

“Kama Ọlaedo, Achọtara M Diamọnd”

DỊ KA MICHALIS KAMINARIS SI KỌỌ

Mgbe m nọsịrị afọ ise na South Africa bụ́ ebe m gararịị ịchọ ọlaedo, eji m ihe bara uru karị na-alọta. Ka m kọọrọ gị banyere akụ̀ na ụba m nwere ugbu a, chọọkwa ikerịta ya.

A MỤRỤ m na 1904 n’àgwàetiti Gris bụ́ Cephalonia dị n’Oké Osimiri Ionia. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị nne na nna m nwụrụ, ya mere m tolitere dị ka onye na-enweghị nne na nna. Achọsiri m ike inweta enyemaka, m kpegakwaara Chineke ekpere ugboro ugboro. Ọ bụ ezie na m na-agachi Chọọchị Gris Orthodox anya, enweghị m ihe ọmụma Bible ma ọlị. Achọtaghị m ngụgụ obi ọ bụla.

Na 1929, ekpebiri m ịkwaga mba ọzọ ma chọọ ndụ ka mma. N’ịhapụ àgwàetiti m nke tọgbọrọ chakoo, abanyere m n’ụgbọ mmiri ga-esi England gaa South Africa. Mgbe anyị nọsịrị ụbọchị 17 n’oké osimiri, erutere m Cape Town, South Africa, bụ́ ebe onye mụ na ya si otu mba goro m ọrụ ozugbo ahụ. Ma, achọtaghị m ngụgụ obi n’akụ̀ na ụba nkịtị.

Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa Karị

Anọruwo m ihe dị ka afọ abụọ na South Africa mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara ebe ọrụ m ma nye m akwụkwọ e ji amụ Bible n’asụsụ Grik. Ọ gụnyere akwụkwọ nta bụ́ Where Are the Dead? na Oppression, When Will It End? M na-echeta nke ọma oké mmasị m ji gụọ ha, ọbụna na-ebu akụkụ akwụkwọ nsọ nile e hotara n’isi. Otu ụbọchị agwara m otu onye ọrụ ibe m, sị: “Achọtawo m ihe m nọworo na-achọ n’afọ ndị a nile. Abịara m Africa maka ọlaedo, ma kama ọlaedo, achọtara m diamọnd.”

Eji m oké ọṅụ mụta na Chineke nwere aha onwe onye, bụ́ Jehova, na e guzobeworị Alaeze ya n’eluigwe, nakwa na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ nke usoro ihe nke a. (Abụ Ọma 83:18; Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10; 24:3-12; 2 Timoti 3:1-5; Mkpughe 12:7-12) Lee ihe na-akpali akpali ọ bụ ịmụta na Alaeze Jehova ga-ewetara agbụrụ nile nke ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi na-adịghị agwụ agwụ! Ihe ọzọ nke masịrị m bụ na a na-ekwusa eziokwu ndị a dị oké ọnụ ahịa n’ụwa nile.—Aịsaịa 9:6, 7; 11:6-9; Matiu 24:14; Mkpughe 21:3, 4.

N’oge na-adịghị anya achọtara m adres alaka Watch Tower Society dị na Cape Town ma nwetakwuo akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Enwere m obi ụtọ karịsịa inweta Bible nke aka m. Ihe m gụrụ kwaliri m ịchọ ịgba àmà. Amalitere m site n’izigara ndị ikwu m, ndị enyi, na ndị m maara n’obodo a mụrụ m bụ́ Lixoúrion mbipụta ndị e ji amụ Bible. Site n’ọmụmụ ihe m, eji m nwayọọ nwayọọ ghọta na iji mee ihe dị Jehova ụtọ mmadụ aghaghị ịrara ndụ ya nye ya. Ya mere emere m otú ahụ n’ekpere ozugbo.

N’otu oge, agara m nzukọ Ndịàmà Jehova, ma ebe ọ bụ na amaghị m Bekee, ọ dịghị ihe m ghọtara. Mgbe m matara na e nwere ọtụtụ ndị Gris bi na Port Elizabeth, akwagara m ebe ahụ, ma enweghị m ike ịchọta Ndịàmà ọ bụla na-asụ Grik. N’ihi ya, ekpebiri m ịlaghachi Gris ka m wee ghọọ onye na-ekwusa ozi ọma oge nile. Ana m echeta ịgwa onwe m, sị, ‘Aga m alaghachi Gris, ọ bụrụgodị na m ga-agba ọtọ laghachi.’

Ije Ozi Oge Nile na Gris

N’oge opupu ihe ubi nke 1934 anọzi m n’ime nnukwu ụgbọ mmiri ndị Itali bụ́ Duilio. Erutere m Marseilles, France, mgbe m nọsịkwara ụbọchị iri n’ebe ahụ, eso m ụgbọ mmiri na-ebu ndị njem bụ́ Patris wee gawa Gris. Ka anyị nọ n’oké osimiri, ụgbọ mmiri ahụ nwere nsogbu injin, n’abalị kwa e nyere iwu ka e budata ụgbọ ndụ n’ime oké osimiri. Mgbe ahụ echetara m ihe m chere banyere ịgba ọtọ laghachi Gris. Otú ọ dị, ụgbọ ndọkpụ ndị Itali mesịrị rute ma dọkpụrụ anyị gaa Naples, Itali. Anyị mesịrị bịarute Piraiévs (Piraeus), Gris.

Esitere m n’ebe ahụ gaa Atens bụ́ ebe m letara alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society. Ná mkparịta ụka nke mụ na Athanassios Karanassios, bụ́ onye nlekọta alaka ahụ, m kwuru ka e nye m ọrụ ime nkwusa oge nile. N’echi ya agawara m Peloponnisos, n’akụkụ ebe ndịda anyanwụ nke mbara ala Gris. E kenyere m ógbè a dum dị ka ókèala nke aka m!

Eji m oké ịnụ ọkụ n’obi malite ọrụ ime nkwusa, na-aga site n’obodo ruo n’obodo, site n’obodo nta ruo n’obodo nta, site n’ugbo ruo n’ugbo, sitekwa n’ụlọ dịpụrụ iche ruo n’ụlọ dịpụrụ iche. N’oge na-adịghị anya Michael Triantafilopoulos sonyeere m, bụ́ onye mere m baptism n’oge okpomọkụ nke 1935—ihe karịrị otu afọ mgbe m malitesịrị ozi oge nile! E nweghị usoro ime njem ọha na eze, ya mere anyị ji ụkwụ gaa ebe nile. Nsogbu anyị kasịnụ bụ mmegide nke ndị ụkọchukwu, ndị pụrụ ime ihe ọ bụla iji kwụsị anyị. N’ihi ya, anyị zutere ajọ mbunobi dị ukwuu. Ma, n’agbanyeghị ihe mgbochi ndị ahụ, a gbara àmà, a kpọsakwara aha Jehova n’ebe nile.

Ịtachi Obi ná Mmegide

Otu ụtụtụ ka m na-eme nkwusa n’ógbè ebe ugwu nke Arcadia, agaruru m obodo nta bụ́ Magouliana. Mgbe otu hour nke ịgba àmà gasịrị, anụrụ m mgbịrịgba chọọchị wee ghọta n’oge na-adịghị anya na ọ bụ m ka ha na-akụrụ mgbịrịgba! Ìgwè na-eme ihe ike gbakọtara n’okpuru idu ndú nke osote bishọp (onye ukwu na chọọchị nke na-esote bishọp n’ọkwá) na chọọchị Grik Orthodox. Emechiri m akpa ozi ọma m ngwa ngwa ma kpegara Jehova ekpere n’ime obi m. Osote bishọp ahụ, ya na ìgwè ụmụaka na-eso ya, chere ihu kpọmkwem n’ebe m nọ. Ọ malitere iti ná mkpu sị, “Lee ya! Lee ya!”

Ụmụaka ahụ gbara m nnọọ gburugburu, ụkọchukwu ahụ pụtakwara n’ihu ma malite iji nnukwu afọ ya na-enu m, na-ekwu na ya achọghị imetụ m aka ‘ka m ghara ịbụ onye e metọrọ.’ O tiri ná mkpu sị, “Kụọ ya ihe! Kụọ ya ihe!” Ma n’oge ahụ kpọmkwem, otu onye uwe ojii pụtara ma kpọrọ anyị abụọ gawa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. E kpere ụkọchukwu ahụ ikpe maka ịkpalite ìgwè na-eme ihe ike, e wee daakwa ya nhá drachma 300 tinyere mmefu ụlọikpe. A tọhapụrụ m.

Mgbe anyị rutere n’ógbè ọhụrụ, anyị mere otu obodo ka ukwuu ebe anyị si amalite ọrụ anyị, anyị sitekwara n’ebe ahụ jezuo ókèala nile dị n’ebe a pụrụ iji ụkwụ garuo n’ime hour anọ. Nke ahụ pụtara na anyị na-ahapụ n’ụtụtụ mgbe chi na-abọchabeghị ma na-alọta mgbe ọchịchịrị gbaworo n’uhuruchi, na-eleta otu obodo nta ma ọ bụ abụọ n’ozuzu ya kwa ụbọchị. Mgbe anyị rụzusịrị obodo nta ndị dị gburugburu, anyị mere nkwusa n’obodo ebe anyị si amalite ma gaakwa n’ihu. A na-ejide anyị mgbe mgbe n’ihi na ndị ụkọchukwu kpaliri ndị mmadụ imegide anyị. N’ógbè bụ́ Parnassus, dị n’etiti Gris, ndị uwe ojii chọrọ m ruo ọtụtụ ọnwa. Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe ha nwụdere m.

Otu ụbọchị mụ na Nwanna Triantafilopoulos nọ na-eme nkwusa n’obodo nta bụ́ Mouríki, n’ógbè Boeotia. Anyị kewara obodo nta ahụ gaa ná nkebi abụọ, amalitekwara m ịrụ ọrụ na ndịda ndị kpọdara akpọda, ebe ọ bụ na m bụ nwata karị. Na mberede anụrụ m mkpu sitere ná mgbada. Ka m na-agbaga n’ebe ahụ, echere m sị, ‘A na-eti Nwanna Triantafilopoulos ihe.’ Ndị obodo nta ahụ agbakọtawo n’ụlọ kọfị dị n’ebe ahụ, otu onye ụkọchukwu na-amali na-amadakwa dị ka oké ehi iwe ji. “Ndị a na-akpọ anyị ‘mkpụrụ Agwọ ahụ,’” ka ọ na-eti ná mkpu.

Onye ụkọchukwu ahụ etijiworị otu mkpara n’isi Nwanna Triantafilopoulos, ọbara sikwa n’ihu ya na-asọdata. Mgbe m hichasịrị ọbara ahụ, anyị jisiri ike si n’ebe ahụ pụọ. Anyị gara ije hour atọ tupu anyị eruo obodo ukwu Thebes. N’ebe ahụ, n’ụlọ ọgwụ a na-adịghị enye mmadụ àkwà, e mere mmerụ ahụ ahụ ọgwụ. Anyị kọọrọ ndị uwe ojii ihe ahụ mere, e wepụkwara ya n’ụlọikpe. Ma, ụkọchukwu ahụ nwere ọtụtụ ndị nkwado, e mesịkwara tọhapụ ya.

Ka anyị na-arụ ọrụ n’obodo Leukas, ụmụazụ nke otu n’ime ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ógbè ahụ “jidere” anyị ma kpọta anyị n’ụlọ kọfị obodo nta ahụ, bụ́ ebe anyị chọpụtara na a na-ebo anyị ebubo n’ụlọikpe nke ndị na-amaghị nke a na-akọ. Onye ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ na ndị ikom ya na-aga anyị gburugburu n’otu n’otu ma na-agwa anyị okwu—na-agba égbè ọnụ n’akwụsịghị akwụsị—ma jiri aka ha kwụkwụchiri akwụchi na-eyi anyị egwu. Mmanya na-egbu ha nile. Okwu ha ji akparị anyị gara n’ihu malite n’ehihie ruo mgbe anyanwụ dara, ma anyị gbachiri nkịtị ma nọgide na-amụmụ ọnụ ọchị ka anyị na-ekwu na aka anyị dị ọcha, na-ekpegakwara Jehova Chineke ekpere n’obi anyị maka enyemaka.

Mgbe chi na-achọ iji ndị uwe ojii abụọ napụtara anyị. Ha kpọgara anyị n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ma mesoo anyị n’ụzọ dị mma. Iji kwadoo ihe o mere, onye ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ bịara n’echi ya ma boo anyị ebubo ịgbasa ụgha megide Eze Gris. Ya mere ndị uwe ojii zigara anyị tinyere mmadụ abụọ kpọ anyị, ịga n’obodo Lamia maka ịgbakwu anyị ajụjụ. A kpọchiri anyị ruo ụbọchị asaa, e mesịakwa tụnye anyị ịga n’aka ma kpọga anyị n’obodo Larissa maka ikpe anyị ikpe.

Ụmụnna anyị ndị Kraịst na Larissa, bụ́ ndị e buwororị ụzọ mee ka ha mara, cheere ka anyị bịarute. Oké ịhụnanya ha gosiri anyị bụ ezi àmà nye ndị nche. Ọkàiwu anyị, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova nke nọbu n’ọkwá lieutenant colonel, bụ onye a ma nke ọma n’obodo. Mgbe ọ pụtara n’ụlọikpe ma kpechite ọnụ anyị, e mere ka o doo anya na ebubo ndị e boro anyị bụ ụgha, a tọhapụkwara anyị.

Ihe ịga nke ọma nke Ndịàmà Jehova na-enwe n’ime nkwusa n’ozuzu ya mere ka mmegide ahụ ka njọ. E tiri iwu na 1938 na 1939 na-amachibido ime ntọghata, ọtụtụ n’ime okwu ikpe ndị e nwere n’ihe iseokwu a gụnyere mụ na Michael. E mesịa, alaka ụlọ ọrụ gwara anyị ka anyị kwụsị ịrụkọ ọrụ ọnụ ka e wee belata anya a na-elekwasị n’ọrụ anyị. O siiri m ike ịrụ ọrụ n’enweghị onye ibe. Ma, n’ịtụkwasị Jehova obi, eji m ụkwụ gazuo ógbè Attica, Boeotia, Phthiotis, Euboea, Aetolia, Acarnania, Eurytania, na ógbè nke Peloponnisos.

Ihe nyeere m aka n’oge a bụ okwu mara mma banyere ịtụkwasị Jehova obi nke ọbụ abụ ahụ: “M na-esite na Gị gbaa ọsọ ịchụ usuu ndị na-apụnara mmadụ ihe; ana m esitekwa na Chineke m wụbiga mgbidi. Ọ bụ Chineke Nke ji ike kee m dị ka ihe okike, Ọ na-emekwa ka ụzọ m zuo okè. Ọ na-edozi ụkwụ m ka ha dị ka ụkwụ nne ele: n’elu ebe m dị elu ka Ọ na-eguzokwa m.”—Abụ Ọma 18:29, 32, 33.

Na 1940, Itali kpọsara agha megide Gris, n’oge na-adịghịkwa anya ka e mesịrị usuu ndị agha Germany wakporo mba ahụ. E tiri iwu ndị agha, a machibidokwara akwụkwọ Watch Tower Society iwu. Ndị ahụ bụ oge siri ike nye Ndịàmà Jehova nọ na Gris; otú o sina dị, ha bawanyere n’ọnụ ọgụgụ n’ụzọ dị egwu—site ná Ndịàmà 178 na 1940 ruo 1,770 ka ọ na-erule ngwụsị Agha Ụwa nke Abụọ na 1945!

Ije Ozi na Betel

Na 1945, akpọrọ m òkù ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova n’Atens. Betel, nke pụtara “Ụlọ Chineke,” dị mgbe ahụ n’ụlọ a na-akwụ ụgwọ ya na Lombardou Street. Ọfịs dị n’okpukpu ụlọ nke mbụ, ebe obibi akwụkwọ dịkwa n’okpukpu ime ala. Otu obere ígwè obibi akwụkwọ na ígwè e ji ebezi ọnụ akwụkwọ dị n’ebe ahụ. Na mbụ ndị na-arụ ọrụ n’ebe obibi akwụkwọ ahụ bụ nanị mmadụ abụọ, ma n’oge na-adịghị anya ndị ọrụ afọ ofufo ndị ọzọ malitere isi n’ụlọ ha abịa inye aka n’ọrụ ahụ.

E weghachiri ikike anyị na isi ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Brooklyn, New York, izirịta ozi na 1945, n’afọ ahụkwa anyị maliteghachiri ibichi Ụlọ Nche anya na Gris. Mgbe ahụ, na 1947, anyị bufere alaka anyị na 16 Tenedou Street, ma ebe obibi akwụkwọ dịgidere na Lombardou Street. E mesịa e bufere ebe obibi akwụkwọ ahụ site na Lombardou Street gaa n’ụlọ mmepụta ihe nke Onyeàmà nwere n’ebe dị ka kilomita ise site n’ebe ahụ. Ya mere ruo oge ụfọdụ, anyị na-agbaga ihu na azụ n’ebe atọ.

Apụrụ m icheta ịhapụ ebe obibi anyị na Tenedou Street tupu chi ọbụbọ ma mee njem gaa n’ebe obibi akwụkwọ ahụ. Mgbe m rụsịrị ọrụ n’ebe ahụ ruo elekere anya mbụ n’ehihie, agara m Lombardou Street bụ́ ebe e bugara akwụkwọ ndị anyị biworo. N’ebe ahụ a na-apịakọta ibé akwụkwọ ndị a ka ha ghọọ magazin, dụọ ha, ma jiri aka bezie ọnụ ha. E mesịa anyị na-ebuga magazin ndị a kwadebesịworo na post ọfịs, buga ha n’okpukpu ụlọ nke atọ, nyere onye na-arụ n’ebe ahụ aka ịhọpụtasị ha, tinyekwa stamp n’elu envelopụ maka izipụ ha.

Ka ọ na-erule 1954 ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova na Gris etoruwo ihe karịrị 4,000, ihe owuwu ndị sara mbara karị dịkwa mkpa. N’ihi ya, anyị kwagara na Betel ọhụrụ dị okpukpu ụlọ atọ n’ebe ndịda Atens na Kartali Street. Na 1958, a gwara m ka m lekọta kichin, nke ahụ bụkwa ọrụ m ruo 1983. Ka ọ dị mgbe ahụ, na 1959, alụrụ m Eleftheria, bụ́ onye bụwooro m onye inyeaka na-eguzosi ike n’ihe n’ozi Jehova.

Ịtachi Obi Ọzọ ná Mmegide

Na 1967 otu ìgwè ndị ọchịchị ndị agha weghaara ọchịchị, e gbochikwara ọrụ ime nkwusa anyị ọzọ. Otú ọ dị, n’ihi ahụmahụ anyị nwebuworo n’ịnagide mmachibido iwu n’ọrụ anyị, anyị mere mgbanwe ngwa ngwa ma gaa n’ihu na nzuzo n’enweghị nsogbu.

Anyị nwere nzukọ anyị n’ebe obibi ndị mmadụ ma jiri akọ jee ozi ụlọ n’ụlọ anyị. Ka o sina dị, e jidere ụmụnna anyị mgbe nile, okwu ikpe mụbakwara. Ndị ọkàiwu anyị na-anọ na njem mgbe nile iji hụ maka ikpe ndị a na-enwe n’akụkụ dị iche iche nke mba ahụ. N’agbanyeghị mmegide ahụ, ihe ka ọtụtụ ná Ndịàmà na-arụchi ọrụ nkwusa ha anya, karịsịa ná ngwụsị izu.

Na Saturday ma ọ bụ Sunday nile mgbe anyị mesịworo nkwusa anyị maka ụbọchị ahụ, a na-eme nnyocha iji hụ onye so n’ìgwè anyị nke na-anọghị ya. Dị ka ọ na-adịkarị, ndị na-anọghị ya na-abụworị ndị e ji eji n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dịkarịsị nso. Ya mere anyị wegaara ha blanket na nri, gbaakwa ha ume. Ọzọ, anyị mere ka ndị ọkàiwu anyị mara, bụ́ ndị pụtaziri n’ihu ndị gbara anyị akwụkwọ na Monday iji kwuchite ọnụ ndị e ji eji. Anyị ji obi ụtọ chee ọnọdụ a ihu n’ihi na anyị na-ahụju anya n’ihi eziokwu ahụ!

N’oge mmachibido iwu ahụ e mechiri ọrụ obibi akwụkwọ anyị na Betel. Ya mere ụlọ mụ na Eleftheria biri ná mpụga Atens ghọrọ ihe yiri ebe obibi akwụkwọ. Eleftheria ji nnukwu ígwè typewriter na-edepụta isiokwu dị iche iche nke Ụlọ Nche. Ọ na-ejikọta ibé akwụkwọ iri n’otu oge n’ígwè typewriter ahụ, ọ ghaghịkwa ịpịsi aka ike ka mkpụrụ akwụkwọ ndị ahụ wee pụta. M na-ejikọtazi peji ndị ahụ ma dụkọta ha ọnụ. Nke a na-aga n’ihu kwa uhuruchi ruo n’etiti abalị. Otu onye uwe ojii bi n’okpukpu ụlọ dị n’okpuru nke anyị, ọ ka na-ejukwa anyị anya ihe mere na ọ dịghị mgbe o nyoro anyị enyo.

Ịṅụrị Ọṅụ ná Mwusawanye Na-aga n’Ihu

E weghachiri ọchịchị onye kwuo uche ya na Gris na 1974, e jikwa ọrụ ime nkwusa anyị gaa n’ihu ọzọ n’ụzọ pụtara ìhè karị. Ma, n’ime afọ asaa e gbochiri ọrụ anyị, anyị nwere mmụba dị ebube nke ihe karịrị Ndịàmà 6,000 ọhụrụ, na-eru ngụkọta nke ihe karịrị ndị nkwusa Alaeze 17,000.

Anyị maliteghachikwara ọrụ obibi akwụkwọ anyị n’ụzọ chiri anya n’ogige alaka ahụ. N’ihi ya, ihe owuwu Betel dị na Kartali Street ghọrọ nke dị oké nta. Ya mere a zụrụ ibé ala dị otu hekta ná mpụga Atens bụ́ Marousi. E wuru ogige Betel gụnyere ọnụ ụlọ ihi ụra 27, otu ụlọ obibi akwụkwọ, ọfịs, na ihe owuwu ndị ọzọ. A raara ndị a nye n’October 1979.

Ka oge na-aga ohere ka ukwuu dị anyị mkpa. Ya mere a zụrụ ibé ala dị hekta 22 n’ihe dị ka kilomita 60 site n’ebe ugwu Atens. Ebe ahụ dị n’Eleona, n’akụkụ ugwu bụ́ ebe a na-anọ ahụ ugwu na ndagwurugwu mmiri na-ede nke ọma. N’ebe ahụ, n’April 1991, anyị raara ihe owuwu ka nnọọ ibu nye, bụ́ nke gụnyere ụlọ 22, nke otu n’ime ha nwere ike ịba mmadụ asatọ.

Mgbe m tinyesịrị ihe karịrị afọ 60 n’ozi oge nile, a ka ji ezi ahụ ike gọzie m. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, m “na-amị mkpụrụ n’isi awọ́.” (Abụ Ọma 92:14) Ana m ekele Jehova karịsịa na adịwo m ndụ iji anya m hụ mmụba dị ukwuu n’ọnụ ọgụgụ ezi ndị na-efe ya ofufe. Aịsaịa onye amụma buru mmụba dị otú ahụ n’amụma, sị: “Ọnụ ụzọ ámá gị nile ga-eghekwa oghe mgbe nile; a gaghị emechi ha n’ehihie ma ọ bụ n’abalị; ka mmadụ wee bubatara gị akụ̀ nke mba dị iche iche.”—Aịsaịa 60:11.

Lee ihe ebube ọ bụ ịhụ ọtụtụ nde mmadụ sitere mba nile ka ha na-enubata ná nzukọ Jehova ma bụrụ ndị a na-akụziri ụzọ ịlanarị gabiga oké mkpagbu ahụ banye n’ụwa ọhụrụ Chineke! (2 Pita 3:13) Apụrụ m ikwu n’eziokwu na ozi oge nile abụrụwo ihe bara uru nye m karịa ihe ọ bụla ụwa a nwere inye. Ee, achọtawo m, ọ bụghị akụ̀ dị oké ọnụ ahịa bụ́ ọlaedo, kama diamọnd ime mmụọ nke meworo ka ndụ m nwee afọ ojuju n’ụzọ na-enweghị atụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Michalis na Eleftheria Kaminaris

(N’aka nri) Ebe obibi akwụkwọ dị na Lombardou Street

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya