Chineke Bụ Ebe Mgbaba na Ike M
DỊ KA CHARLOTTE MÜLLER SI KỌỌ
“Afọ itoolu ị nọrọ n’okpuru Hitler bụrụ gị ihe ịja mma,” ka ọkàikpe ahụ bụ́ onye Kọmunist kwuru. “I guzogidere agha n’ezie, ma ugbu a ị na-eguzogide udo anyị!”
Ọ NA-EZO aka ná mkpọrọ mbụ ndị Nazi tụrụ m, nakwa n’ọchịchị ọha na eze na German Democratic Republic. Enweghị m ọnụ okwu na mbụ ma emesịrị m zaa: “Onye Kraịst adịghị agba mbọ maka ezi udo n’otu ụzọ ahụ ndị ọzọ si agba. Nanị na m na-agbalị ịgbaso iwu Bible ịhụ Chineke na onye agbata obi m n’anya. Okwu Chineke na-enyere m aka ịnọgide n’udo n’okwu ọnụ na n’omume.”
N’ụbọchị ahụ, September 4, 1951, ọchịchị Kọmunist tụrụ m mkpọrọ afọ asatọ—jiri otu afọ ghara iru nke ọchịchị Nazi tụrụ.
Mgbe òtù National Socialists na ọchịchị Kọmunist na-akpagbu anyị bụ́ Ndịàmà Jehova, enwetara m nkasi obi n’Abụ Ọma 46:1: “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike, o mewo ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu ná mkpagbu nile.” Nanị Jehova nyere m ike ịtachi obi, ka m na-etinyekwukwa uche n’Okwu ya, otú ahụ ka m na-esiwanye ike.
Ịbụ Onye E Wusiri Ike Maka Ọdịnihu
A mụrụ m na 1912 na Gotha-Siebleben dị na Thuringia, Germany. Ọ bụ ezie na nne na nna m bụ ndị Protestant, nna m nọ na-achọ eziokwu Bible na ọchịchị ezi omume. Mgbe nne na nna m hụrụ “Foto Ihe Nkiri nke Okike” ahụ, obi tọrọ ha ụtọ.a Nna m achọtawo ihe ọ nọworo na-achọ—Alaeze Chineke.
Nne na nna anyị, tinyere anyị bụ́ ụmụ isii, hapụrụ chọọchị na March 2, 1923. Anyị bi na Chemnitz dị na Saxony, n’ebe ahụ anyị sonyeere Ndị Mmụta Bible. (Atọ n’ime ụmụnne m ghọrọ Ndịàmà Jehova.)
Ná nzukọ Ndị Mmụta Bible, a kụmiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ na eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa n’ime uche m, ndị a mejukwara obi nwata m n’obi ụtọ. Nke kasịnụ e nwere ntụziaka a na-enye anyị bụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst, ihe karịrị 50 n’ime anyị, na Sunday, bụ́ nke mụ na nwanne m nwanyị bụ́ Käthe naara ruo nwa oge. Ìgwè anyị gụnyere nwa okoro bụ́ Konrad Franke, onye dokwara maka iso anyị mee mkpagharị na ịmụ abụ. E mesịa, site 1955 ruo 1969, Nwanna Franke jere ozi dị ka onye nlekọta alaka Watch Tower na Germany.
Afọ ndị nke 1920 bụ ndị nke ọgba aghara, mgbe ụfọdụ ọbụna n’etiti ndị Chineke. Ụfọdụ, n’adịghị anakwerekwa Ụlọ Nche dị ka ‘nri n’oge ya,’ megidere ọrụ nkwusa ụlọ n’ụlọ. (Matiu 24:45) Nke a dujere ná ndapụ n’ezi ofufe. Ma ọ bụ kpọmkwem “nri” nke a nyere anyị ike nke dị anyị oké mkpa n’oge ahụ. Dị ka ihe atụ, e nwere isiokwu Ụlọ Nche (Bekee) bụ́ “Ngọzi Na-adịrị Ndị Na-adịghị Atụ Egwu” (1919) na “Ònye Ga-asọpụrụ Jehova?” (1926) Achọrọ m ịsọpụrụ Jehova site n’ọrụ obi ike, ya mere ekesara m ọtụtụ akwụkwọ na akwụkwọ nta Nwanna Rutherford.
Na March 1933, e mere m baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’otu afọ ahụ, a machibidoro ọrụ ikwusa ozi ọma anyị iwu na Germany. N’oge baptism ahụ, e nyere Mkpughe 2:10 dị ka okwu ndụmọdụ maka ọdịnihu: “Atụla ahụhụ nile ị gaje ịhụ egwu: lee, ekwensu gaje ịtụba ụfọdụ n’etiti unu n’ime ụlọ mkpọrọ, ka e wee nwaa unu; unu ga-enwekwa mkpagbu ụbọchị iri. Gosi onwe gị onye kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, M ga-enyekwa gị okpueze ahụ, bụ́ ndụ.” Etinyere m amaokwu a n’obi, n’arụghị ụka na ule ndị siri ike na-echere m. Nke a ghọrọ eziokwu.
N’ihi na anyị nọgidere na-anọpụ iche ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọtụtụ ndị agbata obi anyị na-enyo anyị enyo. Ka otu ntụliaka ọchịchị gasịrị, ndị agha Nazi yi uwe soja nọ n’ihu ụlọ anyị tie mkpu sị, “Ndị sabo bi ebe a!” Isiokwu bụ́ “Atụla Ha Egwu,” nke pụtara ná mbipụta German nke Ụlọ Nche na December 1933, nyere m agbamume pụrụ iche. Achọrọ m ịnọgide na-abụ Onyeàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi ọbụna n’okpuru ọnọdụ ndị kasị sie ike.
Nzaghachi Onye Iro ahụ—Mkpọrọ
O kwere omume ibipụta Ụlọ Nche na nzuzo na Chemnitz ruo oge mgbụsị akwụkwọ nke 1935. Mgbe nke ahụ gasịrị ọ dị mkpa na e buuru ígwè mbipụtaghachi e ji eme ihe gaa Beierfeld dị n’Ugwu Ore, ebe e jiri ya na-ebipụtaghachi akwụkwọ ruo August 1936. Mụ na Käthe kesaara ụmụnna akwụkwọ ndị nna m nyere anyị adres ha. Ihe nile gara nke ọma ruo nwa oge. Ma e mesịrị ndị Gestapo malitere isogharị m, n’August 1936 kwa ha kpaara m aka m n’ụlọ m ma tụọ m nga, bụ́ ebe m nọ chere ikpe.
Na February 1937, ụmụnna ndị nwoke 25 na ndị nwanyị 2—gụnyere mụ onwe m—guzoro n’ihu ụlọikpe pụrụ iche na Saxony. A zọọrọ na nzukọ Ndịàmà Jehova bụ nke nkwatu ọchịchị. Ụmụnna ahụ bipụtaghachiworo Ụlọ Nche nwetara afọ ise n’ụlọ mkpọrọ. E nyere m afọ abụọ.
Kama ịtọhapụ m mgbe m nọsịworo oge m, ndị Gestapo kpaara m aka. Ekwesịrị m idejupụta nkwupụta nke na-ekwu na agakwaghị m abụ Onyeàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike. Ajụwapụrụ m isi, nke mere ka onye isi ahụ jupụta n’ọnụma, malie n’ike, ma nye ikike ka a tụọ m nga. E sepụtara ikike ahụ na foto a. N’ekweghị ka m hụ nne na nna m, a kpụgara m ozugbo n’otu obere ogige ịta ahụhụ maka ụmụ nwanyị na Lichtenburg dị n’osimiri Elbe. N’isi nso mgbe nke ahụ gasịrị ezutere m Käthe. Ọ nọwo n’ogige ịta ahụhụ dị na Moringen kemgbe December 1936, ma mgbe e mechiri ogige ịta ahụhụ ahụ, ya na ọtụtụ ụmụnna nwanyị ndị ọzọ bịara Lichtenburg. Nna m nọkwa na nga, ahụghịkwa m ya ọzọ ruo 1945.
Na Lichtenburg
E kweghị ka m sonyere ndị inyom ndị ọzọ bụ́ Ndịàmà ozugbo, ebe a na-ata ha ahụhụ n’ihi ihe ụfọdụ. N’otu ụlọ nzukọ ndị ahụ, ahụrụ m ìgwè ndị mkpọrọ abụọ—ụmụ nwanyị na-anọdụkarị na table na Ndịàmà na-aghaghị ịnọdụ n’elu oche na-enweghị ihe ndabere n’ụbọchị dum, a gharakwa inye ha ihe ọ bụla iri.b
Anakweere m ọrụ ọ bụla e kenyere m ozugbo, n’olileanya na o nwere otú m ga-esi zute Käthe. Nke ahụ bụkwa kpọmkwem ihe mere. Ọ nọ n’ụzọ ọrụ ya na ndị mkpọrọ abụọ mgbe anyị zutere. N’oké ọṅụ, amakụsiri m ya ike. Ma inyom na-eche nche kpere anyị ozugbo. A gbara anyị ajụjụ, sitekwa n’oge ahụ gaa n’ihu, a ma ụma debe anyị iche. Nke ahụ siri oké ike ịnagide.
Ihe abụọ ọzọ mere na Lichtenburg adịgidewo n’uche m. N’otu oge ndị mkpọrọ nile gaje izukọ n’ogige iji gee otu n’ime okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Hitler na redio. Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova jụrụ, ebe ọ gụnyere ememe ịhụ mba n’anya. Ya mere ndị nche chere paịpụ e ji agbanyụ ọkụ ihu n’ebe anyị nọ, na-agba anyị mwụpụ mmiri ya dị ike sitere n’ígwè nnupụ mmiri ma chụrụ anyị bụ́ ụmụ nwanyị na-enweghị inyeaka site n’okpukpu ụlọ nke anọ gbadata n’ogige ahụ. N’ebe ahụ ka anyị na-aghaghị iguzo, dejuo na mmiri.
N’oge ọzọ e nyere m iwu, mụ na Gertrud Oehme na Gertel Bürlen, iji ọkụ chọọ ogige ụlọ onye isi ụlọ mkpọrọ mma, ebe ụbọchị ọmụmụ Hitler na-eru nso. Anyị jụrụ, na-amata ụzọ aghụghọ Setan nke ịgbalị ịghọrị anyị gaa n’imebi nguzosi ike n’ezi ihe anyị site n’imebi okwukwe n’ihe ndị dị nta. Dị ka ntaramahụhụ, nke ọ bụla n’ime anyị atọ bụ ụmụnna nwanyị bụ́ agbọghọ aghaghị ịnọ nanị ya izu atọ na-esonụ n’ime obere ụlọ nga gbara ọchịchịrị. Ma Jehova nọrọ anyị nso, ọbụna n’ebe dị ụjọ otú a, bụrụkwa ebe mgbaba.
Na Ravensbrück
Na May 1939 e bugara ndị mkpọrọ nọ na Lichtenburg n’ogige ịta ahụhụ Ravensbrück. N’ebe ahụ e kenyere m ọrụ n’ebe ịsa ákwà, mụ na ọtụtụ ụmụnna nwanyị ndị ọzọ bụ́ Ndịàmà. Ngwa ngwa agha dara, anyị gaje ịdị na-eweta ọkọlọtọ swastika, bụ́ nke anyị jụrụ ime. N’ihi ya, e tinyere abụọ n’ime anyị, mụ na Mielchen Ernst, n’ebe ịta ahụhụ. Nke ahụ bụ otu n’ime ụdị ntaramahụhụ kasị njọ, ọ pụtakwara na anyị aghaghị ịrụ ọrụ ike kwa ụbọchị, ọbụna na Sunday, n’agbanyeghị ọnọdụ ihu igwe. Dị ka ọ na-adịkarị, oge kasịnụ a na-anọ bụ ọnwa atọ, ma anyị nọgidere ebe ahụ ruo otu afọ. E wezụga enyemaka Jehova, agaraghị m anọgide ndụ.
Na 1942, ọnọdụ anyị bụ́ ndị mkpọrọ katụrụ mma, e nyekwara m ọrụ dị ka onye ndozi ụlọ maka otu ezinụlọ ndị SS na-ebiteghị anya site n’ogige ahụ. Ezinụlọ ahụ nyere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnwere onwe. Dị ka ihe atụ, otu oge m kpọ ụmụ ha na-eme mkpagharị, ezutere m Josef Rehwald na Gottfried Mehlhorn, ndị mkpọrọ abụọ yi akara triangle odo odo, bụ́ ndị m nwere ike iso gbanwerịta okwu agbamume.c
Afọ Ndị Siri Ike Mgbe Agha Biri
Na 1945 mgbe usuu ndị agha njikọ aka bịakwuru nso, ezinụlọ m na-arụrụ ọrụ gbalagara, aghaghịkwa m iso ha. Tinyere ezinụlọ ndị ọzọ nke ndị SS, ha ghọrọ ìgwè buru ibu na-aga akụkụ ọdịda anyanwụ.
Ụbọchị ole na ole ikpeazụ nke agha ahụ gbara aghara aghara ma jupụta n’ihe ize ndụ. N’ikpeazụ, anyị zutere ụfọdụ ndị soja America bụ́ ndị kwere ka m denye aha n’obodo na-esonụ dị ka onye nweere onwe ya. Ole ndị ka m zutere n’ebe ahụ? Josef Rehwald na Gottfried Mehlhorn. Ha anụwo na Ndịàmà nile si ogige ịta ahụhụ dị na Sachsenhausen eruwo Schwerin ka otu ịzọ ije ọnwụ dị ize ndụ gasịrị. Ya mere anyị atọ zọọrọ ije gawa obodo ahụ, nke ji kilomita 75 dị anya. Lee ihe ọṅụ ọ bụ na Schwerin izute ụmụnna nile ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, ndị lanarịrị ogige ịta ahụhụ, gụnyere Konrad Franke.
Ka ọ na-erule December 1945 ọnọdụ dị ná mba a akawo mma ruo n’ókè nke na m nwere ike iji ụgbọ okporo ígwè mee njem. Ya mere azọpụrụ m ije ụla! Otú ọ dị, njem ahụ gụnyere oge idina n’uko ụgbọ okporo ígwè ahụ na iguzo n’ebe a na-azọkwasị ụkwụ wee na-arịkpu n’ụgbọ. Na Chemnitz, esi m n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ zọpụ ije ịga n’ebe anyị bibu dị ka ezinụlọ. Ma n’okporo ámá ebe usuu ndị soja Nazi guzoburu ma tie mkpu sị, “Ndị sabo bi ebe a!” ọ dịghị otu ụlọ lanarịrị. E ji bọmbụ tụrisịa ebe dum ahụ ndị mmadụ bi. Ma, dị ka ihe obi iru ala nye m, achọtara m nne m, nna m, Käthe, na ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha ka nọ ndụ.
Ọnọdụ akụ̀ na ụba na Germany mgbe agha biri dị imere ebere. Ka o sina dị, ọgbakọ ndị Chineke malitere ito na Germany dum. Watch Tower Society tinyere mgbalị nile n’ịnwa ịkwadebe anyị maka ọrụ nkwusa. A maliteghachiri ọrụ na Betel dị na Magdeburg, nke ndị Nazi mechiburu. N’oge opupu ihe ubi nke 1946, a kpọrọ m òkù ịrụ ọrụ ebe ahụ ma kenye m ọrụ na kichin.
Ọzọkwa n’Okpuru Mmachibido Iwu na Nnwụchi
Magdeburg dị n’akụkụ Germany ahụ nke ndị ọchịchị Kọmunist bịara na-achịkwa. Ha machibidoro ọrụ anyị iwu n’August 31, 1950, wee mechie Betel dị na Magdeburg. Otú ahụ ka ozi m na Betel, nke bụworo oge ọzụzụ bara uru, siri jedebe. Alaghachiri m Chemnitz, na-ekpebisi ike ọbụna n’okpuru ndị ọchịchị Kọmunist ijigidesi eziokwu ahụ aka ike na ịkpọsa Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya ihe a kpọrọ mmadụ nọ na nsogbu nwere.
N’April 1951, mụ na otu nwanna gara Berlin inweta Ụlọ Nche ụfọdụ. Mgbe anyị lọtara, obi lọrọ anyị mmiri ịhụ ka ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ dị na Chemnitz bụ nke ndị uwe ojii yi uwe nkịtị gbara gburugburu. O doro anya na ha na-atụ anya anyị, a nwụchikwara anyị ozugbo.
Mgbe anyị rutere n’ụlọ nga nchere ikpe, eji m akwụkwọ ndị na-egosi na ndị Nazi atụbuwo m mkpọrọ ruo ọtụtụ afọ. N’ihi ya, ndị nche ji nkwanye ùgwù mesoo m omume. Otu n’ime ndị isi nche bụ́ nwanyị kwuru, sị: “Unu bụ Ndịàmà Jehova abụghị ndị mpụ; ụlọ mkpọrọ adịrịghị unu.”
Otu oge ọ batara n’ụlọ nga m, ebe mụ na ụmụnna nwanyị abụọ ọzọ nọ, ma dosara anyị otu ihe na nzuzo n’okpuru otu n’ime àkwà anyị. Gịnị ka ọ bụ? Bible nke ya, bụ́ nke o nyere anyị. N’oge ọzọ, ọ kpọtụụrụ nne na nna m n’ụlọ, ebe ha na-ebiteghị aka site n’ụlọ mkpọrọ ahụ. O wetara ụfọdụ Ụlọ Nche na nri, zoo ha nile n’uwe ya, ma gbebata ha nile n’ọnụ ụlọ nga m.
E nwere ihe ọzọ m ga-achọ icheta. Mgbe ụfọdụ n’ụtụtụ Sunday, anyị na-abụ abụ ọchịchị Chineke anyị n’olu dara oké ụda nke na ndị mkpọrọ ndị ọzọ na-eji obi ụtọ akụrụ abụ nke ọ bụla aka.
Ike na Enyemaka Site n’Aka Jehova
N’oge ikpe ahụ na September 4, 1951, ọkàikpe kwuru okwu ahụ e hotara ná mmalite isiokwu a. Anọrọ m oge mkpọrọ m na Waldheim, e mesịa na Halle, n’ikpeazụkwa na Hoheneck. Otu mkpirikpi ihe ma ọ bụ abụọ mere ga-egosi ụzọ Chineke si bụrụ ebe mgbaba na ike nye anyị bụ́ Ndịàmà Jehova na ụzọ Okwu ya si nye anyị ume.
N’ụlọ mkpọrọ dị na Waldheim, ụmụnna nwanyị nile bụ́ Ndịàmà na-agbakọta mgbe nile n’otu ụlọ nzukọ, nke mere na anyị nwere ike ịdị na-enwe nzukọ ndị Kraịst. E kweghị ka e nwee pensil na akwụkwọ, ma ụmụnna nwanyị ụfọdụ nwetara iberibe ákwà ụfọdụ ma gbalịa ime otu obere ọkọlọtọ nwere isiokwu dịịrị afọ 1953, nke bụ: “Kpọọnụ isiala nye Jehova n’ịma mma nke ịdị nsọ.”—Abụ Ọma 29:2.
Otu n’ime ụmụ nwanyị na-eche nche nwụdere anyị na mberede ma kpee anyị n’egbughị oge. Onye isi ụlọ mkpọrọ ahụ bịara ma gwa abụọ n’ime anyị bụ́ ụmụnna nwanyị ka ha bulie ọkọlọtọ ahụ elu. “Ònye mere ihe a?” ka ọ jụrụ. “Gịnị ka ọ pụtara?”
Otu n’ime ụmụnna nwanyị ahụ chọrọ ikwu na ọ bụ ya ma nara ụta a ga-ata anyị, ma anyị takwụnyeere onwe anyị okwu ngwa ngwa, na-ekwere na anyị nile ga-ekerịta ụta ahụ. Ya mere anyị zara: “Anyị mere ya iji gbaa okwukwe anyị ume.” A napụrụ anyị ọkọlọtọ ahụ, a jụkwara inye anyị nri dị ka ntaramahụhụ. Ma n’oge mkparịta ụka ahụ dum, ụmụnna nwanyị ahụ bugidere ya ka anyị wee kụmie akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ na-agba ume n’uche anyị.
Mgbe e mechiri ụlọ mkpọrọ ụmụ nwanyị dị na Waldheim, e bugara anyị bụ ụmụnna nwanyị na Halle. N’ebe a e kwere ka anyị na-anata ngwugwu, gịnịkwa ka a kwanyere n’otu sịlịpas papa m ziteere m? Isiokwu Ụlọ Nche dị iche iche! M ka pụrụ icheta ndị isiokwu ha bụ “Ezi Ịhụnanya Dị Irè” na “Ụgha Na-eduga ná Mfu nke Ndụ.” Ndị a na isiokwu ndị ọzọ bụ ihe ụtọ n’ezie, mgbe anyị sikwa n’aka otu onye nyefee ha onye ọzọ na nzuzo, onye ọ bụla detuoro onwe ya ihe.
N’oge otu nnyocha, otu n’ime ndị nche hụrụ ihe ndị m detuuru onwe m bụ́ ndị e zoro na matras ahịhịa m. E mesịa, ọ kpọrọ m ịgba m ajụjụ ma sị na ya chọrọ nnọọ ịma ihe isiokwu bụ́ “Atụmanya Maka Ndị Na-atụ Egwu Jehova na 1955” pụtara. Ya onwe ya, bụ́ onye ọchịchị Kọmunist, enwewo nchegbu miri emi banyere ọnwụ onye ndu ya, bụ́ Stalin, na 1953, ọdịnihu yikwara ka ọ gbara ọchịchịrị. Nye anyị, ọdịnihu ga-eweta ihe ịka mma ụfọdụ n’ọnọdụ anyị n’ụlọ mkpọrọ, ma amabeghị m nke ahụ. Eji m obi ike kọwaa na atụmanya maka Ndịàmà Jehova bụ nke kasị mma. N’ihi gịnị? Ehotara m okwu sitere n’akụkụ akwụkwọ nsọ e ji mere isi ihe n’isiokwu ahụ, Abụ Ọma 112:7: “Ọ gaghị esite n’ihe ọjọọ a nụworo tụọ egwu: e doziwo obi ya, ebe ọ na-atụkwasị Jehova obi.”
Jehova Na-anọgide Na-abụ Ebe Mgbaba na Ike M
N’ihi otu ajọ ọrịa, a tọhapụrụ m site n’ụlọ mkpọrọ afọ abụọ tupu oge eruo, na March 1957. Ndị isi ọchịchị East Germany rụgidekwara m ọzọ n’ihi ọrụ m n’ije ozi Jehova. N’ihi ya, na May 6, 1957, eweere m ohere dapụtaranụ gbalaga na West Berlin, esitekwara m n’ebe ahụ gaa West Germany.
O were ọtụtụ afọ tupu m nwetaghachi ahụ ike anụ ahụ m. Ma ruo taa aka m nwere agụụ ime mmụọ dị ukwuu ma na-atụ anya mbipụta ọhụrụ ọ bụla nke Ụlọ Nche. Site n’oge ruo n’oge, m na-enyocha onwe m. M̀ ka na-echekwa maka ihe ime mmụọ? Àzụlitewo m àgwà ndị dị mma? Nnwapụta nke okwukwe m ọ̀ bụ ihe na-ewetara Jehova otuto na nsọpụrụ? Ọ bụ ihe mgbaru ọsọ m ime ihe na-atọ Chineke ụtọ n’ihe nile, ka o wee nọgide na-abụ ebe mgbaba na ike m ruo ebighị ebi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ihe nkiri slide na foto ndị na-emegharị ahụ mejupụtara “Foto Ihe Nkiri” ahụ, na-amalitekwa na 1914, ndị nnọchiteanya Watch Tower Bible and Tract Society gosiri ya ọtụtụ ebe.
b Magazin bụ́ Trost (Nkasi Obi), nke Watch Tower Society na Bern, Switzerland, bipụtara, na May 1, 1940, peji nke 10, kọrọ na n’otu oge ndị inyom bụ́ Ndịàmà Jehova na Lichtenburg enwetaghị nri ehihie ọ bụla ruo ụbọchị 14 n’ihi na ha jụrụ ime ngosi nke nsọpụrụ mgbe a kụrụ abụ ndị Nazi. E nwere Ndịàmà Jehova 300 n’ebe ahụ.
c Akụkọ banyere Josef Rehwald pụtara na Teta! (Bekee) nke February 8, 1993, peji nke 20-23.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ọfịs ndị SS na Ravensbrück
[Ebe E Si Nweta Foto]
N’elu: Stiftung Brandenburgische Gedenkstätten
[Foto dị na peeji nke 26]
Ikike ngafe m iji rụọ ọrụ n’èzí ogige ahụ