Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 6/1 p. 24-27
  • Adịghị Ike Mmadụ Na-ebuli Ike Jehova Elu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Adịghị Ike Mmadụ Na-ebuli Ike Jehova Elu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịnagide Ule
  • Ịnagide Ezughị Okè
  • Ike Ime Nkwusa
  • Ịnagide “Ogwu n’Anụ Ahụ́”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ì Nwere “Ogwu n’Anụ Ahụ”?
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • ‘Ogwu Pọl Nwere n’Anụ Ahụ́ Ya’
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Ịdị Ike n’Agbanyeghị Adịghị Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 6/1 p. 24-27

Adịghị Ike Mmadụ Na-ebuli Ike Jehova Elu

“Onye ọ bụla chere na m bụ nnọọ onye ozi oge nile nwere obi ụtọ na ihu ọchị. Ọ bụ m na-enyere ndị ọzọ aka na nsogbu ha mgbe nile. Otú ọ dị, n’otu oge ahụ, ọ dị m ka m na-anwụ anwụ n’ime. Echiche ndị na-enye nsogbu n’obi na ihe mgbu nke uche na-eri m nri n’ahụ. Amalitere m ikewapụ onwe m n’ebe ndị mmadụ nọ. M chọrọ nnọọ idina n’àkwà n’ụlọ. Ruo ọtụtụ ọnwa, arịọrọ m Jehova ka ọ hapụ m ka m nwụọ.”—Vanessa.

DỊ KA n’ọnọdụ e zoro aka n’elu, ọ bụ nanị ihe a ga-atụ anya ya na mgbe ụfọdụ ndị ohu Jehova ga-enwe mmetụta nke ibi ndụ ‘n’oge ndị a dị oké egwu.’ (2 Timoti 3:1) Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ọbụna na-ada mbà n’obi. (Ndị Filipaị 2:25-27) Mgbe ọ nọtere anya, nkụda mmụọ pụrụ ịnapụ anyị ume, n’ihi na Bible na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị dị umengwụ n’ụbọchị ahụhụ, ike gị pere mpe.” (Ilu 24:10) Ee, mgbe anyị nwere nkụda mmụọ, ike dị anyị mkpa—ikekwe ọbụna ihe Pọl onyeozi kpọrọ “ọkịka nke ike.”—2 Ndị Kọrint 4:7.

Jehova Chineke bụ isi iyi nke ike a na-akparaghị ókè. Nke a pụtara ìhè mgbe anyị nyochara ihe ndị o kere eke. (Ndị Rom 1:20) Dị ka ihe atụ, tụlee anyanwụ. Ụwa na-enweta mwụkwasị na-adịghị akwụsị akwụsị nke ihe dị ka puku ijeri 240 horsepower sitere n’anyanwụ. Ma, ọnụ ọgụgụ a na-anọchite anya nanị ihe dị ka ọkara nke otu ijeri nke ike anyanwụ na-emepụta. Anyanwụ dịkwa nta ma e jiri ya tụnyere kpakpando ndị a maara dị ka supergiant. Otu n’ime ndị a bụ Rigel, otu kpakpando dị n’otu ìgwè kpakpando Orion nke ji okpukpu 50 karịa anyanwụ anyị ukwuu, na-emepụtakwa ike ji okpukpu 150,000 ka ukwuu!

Onye Okike nke isi iyi nke ike eluigwe ndị dị otú ahụ aghaghị inwe n’onwe ya ‘ịba ụba nke ike.’ (Aịsaịa 40:26; Abụ Ọma 8:3, 4) N’ezie, Aịsaịa onye amụma kwuru na Jehova ‘adịghị ada mbà, ike adịghị agwụkwa Ya.’ Chineke dịkwa njikere isoro ndị ọ bụla nke, n’ihi adịghị ike mmadụ, chere na ha na-ada mbà kerịta ike ya. (Aịsaịa 40:28, 29) E mere ihe atụ otú o si eme nke a n’ọnọdụ onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi.

Ịnagide Ule

Pọl gwara ndị Kọrint banyere otu ihe mgbochi nke ọ na-aghaghị ịtachiri obi. Ọ kpọrọ ya “ogwu n’anụ ahụ.” (2 Ndị Kọrint 12:7) Ọ pụrụ ịbụ na “ogwu” a bụ nsogbu ahụ ike, ikekwe ahụzighị ụzọ. (Ndị Galetia 4:15; 6:11) Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na Pọl nọ na-ezo aka ná ndị ozi ụgha na ndị ọzọ na-enye nsogbu bụ́ ndị mara ịbụ onyeozi na ọrụ ya aka. (2 Ndị Kọrint 11:5, 6, 12-15; Ndị Galetia 1:6-9; 5:12) N’agbanyeghị ihe ọ bụ, “ogwu n’anụ ahụ” a nyere Pọl nsogbu n’obi nke ukwuu, o kpekwara ekpere ugboro ugboro ka e wepụ ya.—2 Ndị Kọrint 12:8.

Otú ọ dị, Jehova emeghị ihe Pọl rịọrọ. Kama nke ahụ, ọ gwara Pọl, sị: “Amara m ezuworo gị.” (2 Ndị Kọrint 12:9) Gịnị ka Jehova bu n’uche na nke a? Ọ dị mma, mgbe anyị tụlere ụzọ ime ihe Pọl gara aga nke ịkpagbu ndị Kraịst, ọ bụ nanị site n’amara ka ọ pụdịrị isoro Chineke nwee mmekọrịta—ka ọ fọdụzie ije ozi dị ka onyeozi!a (Tụlee Zekaraịa 2:8; Mkpughe 16:5, 6.) Ọ pụrụ nnọọ ịbụ na Jehova na-agwa Pọl na ihe ùgwù nke ịbụ onye na-eso ụzọ ‘ezuwo.’ Ọ gaghị abụ nke ya na iji ụzọ ọrụ ebube wepụ nsogbu onwe onye nke ndụ ga na-agakọ. N’ezie, ụfọdụ ihe isi ike pụrụ ọbụna ịbịa n’ihi ihe ùgwù ndị ọzọ. (2 Ndị Kọrint 11:24-27; 2 Timoti 3:12) Ka o sina dị, nanị ihe Pọl ga-eme bụ ịtachi obi ‘n’ogwu n’anụ ahụ’ ya.

Otú ọ dị, ọ bụtụghị na Jehova ji obi ịta mmiri na-agbahapụ Pọl. Kama nke ahụ, ọ gwara ya, sị: “E mewo ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” (2 Ndị Kọrint 12:9) Ee, Jehova ga-eji ịhụnanya nye Pọl ume ọ ga-eji anagide ọnọdụ ya. Otú a, “ogwu n’anụ ahụ” nke Pọl ghọrọ ihe mmụta a na-ahụ anya. Ọ kụziiri ya ịdabere n’ike Jehova karịa nke onwe ya. Ihe àmà na-egosi na Pọl mụtara ihe a nke ọma, n’ihi na ụfọdụ afọ n’ihu o degaara ndị Filipaị, sị: “Mụ onwe m mụtara, n’ọnọdụ ọ bụla m nọ, inwezu n’ime ya ihe nile na-akpa m mkpa. Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.”—Ndị Filipaị 4:11, 13.

Gịnị banyere gị? Ị̀ na-atachi obi n’ụdị ụfọdụ nke “ogwu n’anụ ahụ,” ikekwe ọrịa ma ọ bụ ọnọdụ ná ndụ nke na-akpatara gị oké nchegbu? Ọ bụrụ otú ahụ, nwee nkasi obi. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na Jehova agaghị eji ọrụ ebube wepụ ihe mgbochi ahụ, ọ pụrụ inye gị amamihe na obi ike iji nagide ya ka ị nọgidere na-etinye ọdịmma Alaeze n’ihe mbụ ná ndụ.—Matiu 6:33.

Ọ bụrụ na nrịanrịa ma ọ bụ nká na-egbochi gị imezu ókè ị ga-achọ ime n’ọrụ ndị Kraịst, adala mbà. Kama ile ọnwụnwa gị anya na ọ na-ebelata ozi ị na-ejere Jehova, lee ya anya dị ka ohere ịmụba ndabere ị na-adabere na ya. Chetakwa na a na-atụ abamuru nke onye Kraịst n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, ọ bụghị site n’ókè nke ọrụ ya, kama site n’okwukwe na omimi nke ịhụnanya ya. (Tụlee Mak 12:41-44.) Iji mkpụrụ obi gị nile hụ Jehova n’anya pụtara na ị ga-ejere ya ozi n’ike gị nile—ọ bụghị nke onye ọzọ.—Matiu 22:37; Ndị Galetia 6:4, 5.

Ọ bụrụ na “ogwu n’anụ ahụ” nke gị na-agụnye ọnọdụ na-enye nsogbu ná ndụ, dị ka ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya, gbasoo ndụmọdụ Bible: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 55:22) Otu nwanyị onye Kraịst aha ya bụ Sylvia mere nke a. N’ime nanị afọ ole na ole, di ya nwụnahụrụ ya mgbe afọ 50 nke alụmdi na nwunye gasịrị, nakwa ndị òtù ezinụlọ itoolu ndị ọzọ—tinyere ụmụ ụmụ abụọ na-eto eto. “Ma ọ bụghị Jehova,” ka Sylvia na-ekwu, “m ga-erugbu onwe m n’újú. Ma enwetara m nkasi obi dị ukwuu n’ekpere. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na m na-esoro Jehova na-akparịta ụka mgbe nile. Amaara m na ọ na-enye m ike ịtachi obi.”

Lee ka o si na-emesi obi ike ịmara na “Chineke nke nkasi obi nile” pụrụ inye ndị na-eru újú ike ịtachi obi! (2 Ndị Kọrint 1:3; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:13) N’ịghọta nke a, anyị pụrụ ịghọta nkwubi okwu Pọl n’okwu a. O dere, sị: “Adịghị ike nile na ime m ihe ihere nile na mkpa nile na nsogbu nile na oké mkpa nile n’ihi Kraịst dị m ezi mma: n’ihi na mgbe ọ bụla m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.”—2 Ndị Kọrint 12:10.

Ịnagide Ezughị Okè

Anyị nile eketawo ezughị okè site n’aka nne na nna anyị mbụ bụ́ mmadụ. (Ndị Rom 5:12) N’ihi ya, anyị nọ n’agha megide ọchịchọ nke anụ ahụ dara ada. Lee ka ọ pụrụ isi na-akụda obi ịchọpụta na àgwà nke “mmadụ ochie ahụ” jisiri anyị ike karịa ka anyị cheworo! (Ndị Efesọs 4:22-24) N’oge ndị dị otú ahụ anyị pụrụ inwe mmetụta dị ka Pọl onyeozi, onye dere, sị: “Mụ na iwu Chineke na-enwekọ obi ụtọ dị ka mmadụ ime m si dị: ma ana m ahụ iwu dị iche n’ihe nile dị m n’ahụ, na-ebu agha megide iwu nke uche m, na-adọtakwa m n’agha nye iwu nke mmehie nke dị n’ihe nile dị m n’ahụ.”—Ndị Rom 7:22, 23.

N’ebe a kwa, anyị pụrụ inweta ike sitere n’aka Jehova. Mgbe ị na-agbaso adịghị ike onwe onye mgba, ya adịla mgbe ị ga-akwụsị ịgakwuru ya n’ekpere, na-eji obi nile na-achọ mgbaghara ya n’agbanyeghị ugbo ole ị na-aghaghị ịgakwuru ya banyere otu nsogbu ahụ. N’ihi amara ya, Jehova, onye “na-atụzi obi nile” nakwa onye pụrụ ịhụ omimi nke ezi obi gị, ga-enye gị akọ na uche e mere ka ọ dị ọcha. (Ilu 21:2) Site na mmụọ nsọ ya, Jehova pụrụ inye gị ume ịmaliteghachi ọgụ ị na-alụ megide adịghị ike nke anụ ahụ.—Luk 11:13.

Ike sitere n’aka Jehova dịkwa anyị mkpa mgbe anyị na-eme ihe banyere ezughị okè nke ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, onye Kraịst ibe anyị pụrụ ịgwa anyị okwu “n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha.” (Ilu 12:18) Nke a pụrụ iwute anyị nke ukwuu, karịsịa ọ bụrụ na o sitere n’onye anyị chere kwesịrị ịma. Ọ pụrụ inye anyị nsogbu nke ukwuu. Ọbụna ụfọdụ ejiriwo maka ụdị mmehie ihe ndị dị otú ahụ hapụ Jehova—ihie ụzọ kasịnụ!

Otú ọ dị, àgwà guzoziri eguzozi ga-enyere anyị aka ile ezughị okè nke ndị ọzọ anya n’echiche kwesịrị ekwesị. Anyị apụghị ịtụ anya izu okè n’ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè nọ. “Ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke na-adịghị emehie,” ka nwoke ahụ maara ihe bụ́ Solomọn na-echetara anyị. (1 Ndị Eze 8:46) Arthur, onye Kraịst e tere mmanụ bụ́ onye jeere Jehova ozi n’iguzosi ike n’ihe ruo ihe dị ka iri afọ asaa, kwuru, sị: “Adịghị ike n’ohu ibe anyị na-eme ka anyị nwee ebe chọrọ nguzosi ike n’ezi ihe, na-ele ọnọdụ obi ndị Kraịst anyị ule. Ọ bụrụ na anyị ekwere ka ihe ndị mmadụ na-ekwu ma ọ bụ na-eme gbochie anyị ijere Jehova ozi, anyị na-ejere ụmụ mmadụ ozi. E wezụga nke ahụ, ụmụnna anyị aghaghịkwa ịhụ Jehova n’anya. Ọ bụrụ na anyị na-achọ ihe dị mma n’ime ha, n’isi nso anyị na-ahụ na ha adịchadịghị njọ.”

Ike Ime Nkwusa

Tupu ya arịgoro n’eluigwe, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya: “Unu ga-anata ike, mgbe Mmụọ Nsọ ga-abịakwasịworị unu: unu ga-abụkwa ndị àmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.”—Ọrụ 1:8.

N’imezu okwu Jisọs, Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ a ugbu a n’ala 233 gburugburu ụwa. Dị ka otu ìgwè, ha na-etinye ihe karịrị otu ijeri hour kwa afọ n’inyere ndị ọzọ aka inweta ihe ọmụma Jehova. Ịrụzu ọrụ a adịghị adị mfe mgbe nile. N’ụfọdụ ala a machibidoro ọrụ nkwusa Alaeze ahụ iwu ma ọ bụ gbochie ya. Tụleekwa ndị na-arụ ọrụ ahụ—ụmụ mmadụ na-ezughị okè, na-esighị ike, ndị onye nke ọ bụla nwere nsogbu na nchegbu nke ya. N’agbanyeghị nke ahụ ọrụ ahụ na-aga n’ihu, n’ihi ya kwa, n’afọ atọ gara aga, ihe gafere otu nde mmadụ ararawo ndụ ha nye Jehova ma gosipụta nraranye ha site na baptism ime mmiri. (Matiu 28:18-20) N’eziokwu, ọ bụ nanị n’ike Chineke ka a na-arụzu ọrụ a. Jehova kwuru site n’ọnụ Zekaraịa onye amụma, sị: “Ọ bụghị site n’usuu ndị agha, ọ bụghịkwa site n’ike, kama ọ bụ site na Mmụọ m.”—Zekaraịa 4:6.

Ọ bụrụ na ị bụ onye na-ekwusa ozi ọma ahụ, ị na-ekere òkè—n’agbanyeghị ókè o yiruru ihe dị ntakịrị—ná nrụzu ọrụ ahụ dị ebube. N’agbanyeghị ‘ogwu’ ndị ị na-aghaghị ịtachiri obi, ị pụrụ ijide n’aka na Jehova agaghị echefu ‘ọrụ gị na ịhụnanya ahụ ị gosiri n’ebe aha Ya dị.’ (Ndị Hibru 6:10) Ya mere nọgide na-adabere n’Isi Iyi nke ike nile maka nkwado. Cheta, ọ bụ nanị n’ike Jehova ka anyị pụrụ ịtachi obi; a na-eme ka ike ya zuo okè n’adịghị ike anyị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ezie, ebe ọ bụ na “mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke,” ọ bụ ihe àmà nke ebere Chineke na mmadụ ọ bụla pụrụ ịbịadịrị soro ya nwee mmekọrịta.—Ndị Rom 3:23.

[Foto dị na peeji nke 26]

A na-arụzu ọrụ nkwusa ahụ nanị site n’ike Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya